Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ezi Ofufe Na-eme Ka Ndị Mmadụ Dị n’Otu

Ezi Ofufe Na-eme Ka Ndị Mmadụ Dị n’Otu

Ezi Ofufe Na-eme Ka Ndị Mmadụ Dị n’Otu

Ọ BỤ ezie na okpukpe n’ozuzu ya na-ekewasịkarị ihe a kpọrọ mmadụ, ofufe nke nanị ezi Chineke ahụ nwere ikike nke ime ka ndị mmadụ dị n’otu. Mgbe Israel bụ mba Chineke họpụtara, a dọtara ọtụtụ ndị Jentaịl nwere ezi obi n’ezi ofufe. Dị ka ihe atụ, Rut hapụrụ chi dị iche iche nke obodo ya bụ́ Moab ma gwa Naomi, sị: “Ndị gị ga-abụ ndị m, Chineke gị ga-abụkwa Chineke m.” (Rut 1:16) Ka ọ na-erule na narị afọ mbụ O.A., ọnụ ọgụgụ buru ibu nke ndị Jentaịl aghọwo ndị na-efe ezi Chineke ahụ ofufe. (Ọrụ 13:48; 17:4) Ka e mesịrị, mgbe ndị ozi Jisọs malitere iji ozi ọma ahụ aga n’ebe ndị dị anya, e jikọtakwara ndị ọzọ nwere obi eziokwu n’ofufe nke ezi Chineke ahụ. “Unu siri n’arụsị chigharịkwute Chineke, ịbụ ohu Chineke Nke dị ndụ Nke bụkwa onye eziokwu,” ka Pọl onyeozi dere. (1 Ndị Tesalọnaịka 1:9) Ofufe nke ezi Chineke ahụ ò nwere ikike dị otú ahụ nke ime ka a dị n’otu taa?

Ndị na-arụ ụka na-esi ọnwụ na o zighị ezi ikwu banyere “ndị na-efe ezi ofufe” ma ọ bụ “ezi Chineke ahụ.” Ha pụrụ iche otú ahụ n’ihi na ha amaghị ebe ọ bụla a pụrụ isi mụta eziokwu. Ma ndị na-achọ eziokwu bụ́ ndị a zụlitere n’ụzọ dị iche iche achọpụtawo na ofufe abụghị ihe mmadụ ga na-efe otú masịrị ya. Nanị onye ruru eru inweta ofufe anyị bụ Onye Okike nke ihe nile—Jehova Chineke. (Mkpughe 4:11) Ọ bụ ezi Chineke ahụ, o rukwaara ya ikpebi otú e kwesịrị isi na-efe ya ofufe.

Iji nyere anyị aka ịghọta ihe ọ chọrọ n’aka anyị, Jehova enyewo anyị ihe ọmụma ya site n’Okwu ya, bụ́ Bible. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mmadụ nile nọ n’ụwa nwere Bible n’ozuzu ya ma ọ bụ akụkụ ya ụfọdụ. Ọzọkwa, Ọkpara Chineke kwuru, sị: “Ọ bụrụ na unu onwe unu anọgide n’okwu m, . . . unu ga-amarakwa eziokwu.” (Jọn 8:31, 32) N’ihi ya, a pụrụ ịmara eziokwu ahụ. Ọtụtụ nde ndị nwere obi eziokwu bụ́ ndị sitere n’okpukpe dị iche iche jikwa obi ike na-anakwere eziokwu a, a na-emekwa ka ha dị n’otu n’ezi ofufe.—Matiu 28:19, 20; Mkpughe 7:9, 10.

Ịdị n’Otu Zuru Ụwa Ọnụ n’Oge Anyị!

Otu amụma dị ịrịba ama nke dị n’akwụkwọ Bible bụ́ Zefanaịa na-ekwu banyere mbịakọta ọnụ nke ndị a zụlitere n’ụzọ dịgasị iche iche. Ọ na-asị: “Mgbe ahụ ka [Jehova Chineke ga-enye ndị dị iche iche mgbanwe gaa n’asụsụ dị ọcha, NW], ka ha nile wee kpọkuo aha Jehova, ife Ya n’otu ubu.” (Zefanaịa 3:9) Lee ihe atụ mara mma nke ndị gbanwere agbanwe na-ejere Chineke ozi n’ịdị n’otu nke a bụ!

Olee mgbe nke a ga-eme? Zefanaịa 3:8 na-asị: “Cherenụ m, (ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta), cherenụ ụbọchị mgbe M ga-ebili ọtọ ịkwata ihe: n’ihi na ikpe m bụ ime ka mba nile zukọta, ka M wee chịkọta alaeze nile ịwụsa ha oké iwe m, bụ́ ọnụma nile nke iwe m; n’ihi na a ga-eji ọkụ nke ekworo m ripịa ụwa nke a nile.” Ee, ọ bụ n’oge ahụ Jehova na-eme ka mba dị iche iche zukọta tupu ya awụsa ha oké iwe ya ka ọ ga-enye ndị dị umeala n’obi bi n’ụwa mgbanwe gaa n’asụsụ dị ọcha. Oge ahụ bụ ugbu a, n’ihi na a nọworị na-eme ka mba nile zụkọọ n’agha nke oké ụbọchị ahụ nke Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile n’Amagedọn.—Mkpughe 16:14, 16.

Iji mee ka ndị ya dị n’otu, Jehova na-enye ha asụsụ dị ọcha. Asụsụ ọhụrụ a na-agụnye nghọta kwesịrị ekwesị nke eziokwu Bible banyere Chineke na nzube ya. Ịsụ asụsụ ahụ dị ọcha na-agụnye ikwere eziokwu ahụ, ịkụziri ya ndị ọzọ, na ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’iwu na ụkpụrụ Chineke. Ọ chọrọ ịjụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-akpata nkewa na iwepụ àgwà ịchọ ọdịmma onwe onye nanị n’obi, dị ka ịkpa ókè agbụrụ na ịhụ mba n’anya na-akpata nkewa bụ́ ihe e ji mara ụwa a. (Jọn 17:14; Ọrụ 10:34, 35) Ndị nile nwere obi eziokwu bụ́ ndị hụrụ eziokwu ahụ n’anya, pụrụ ịmụta asụsụ a. Tụlee otú e si mee ka mmadụ ise ahụ a kpọtụrụ aha n’isiokwu bu ụzọ—ndị nọbu ebe dị anya site n’ebe ibe ha nọ n’ihe banyere okpukpe—dịrị n’otu ugbu a n’ofufe nke nanị otu ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova.

Ha Dị n’Otu n’Ezi Ofufe

Mgbe Fidelia, bụ́ onye Roman Katọlik ahụ ji okpukpe ya kpọrọ ihe zụtara Bible maka ihe omume ụlọ akwụkwọ nke nwa ya nwanyị, ọ gwara ụkọchukwu ka o jiri ya kọwaara ya ihe meworo ụmụ ya ise nwụrụ anwụ. “Lee ihe mmechuihu ọ bụ!” ka ọ na-ekwu. Ya mere, mgbe Ndịàmà Jehova kpọtụụrụ ya, ọ jụrụ ha otu ajụjụ ahụ. Mgbe ọ gụtasịrị na Bible nke ya ihe bụ́ eziokwu banyere ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ, ọ ghọtara otú chọọchị ya siworo duhie ya. Ọ mụtara na ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla, n’ihi ya kwa, ha adịghị ata ahụhụ na Limbo ma ọ bụ n’ebe ọ bụla ọzọ. (Abụ Ọma 146:4; Eklisiastis 9:5) Fidelia tụfuru ihe oyiyi okpukpe ya nile, hapụ chọọchị ahụ, ma malite ịmụ Bible. (1 Jọn 5:21) Ruo afọ iri gara aga, o nwewo mmasị ịkụziri ndị ọzọ eziokwu nke Akwụkwọ Nsọ.

Tara bụ́ onye si Kathmandu kwagara ná mba ebe e nwere ụlọ nsọ ole na ole nke ndị Hindu. N’ihi ya, ọ gara otu chọọchị Metọdist na-enwe olileanya na ọ ga-egbo mkpa ime mmụọ ya. Ma ọ chọtaghị azịza ọ bụla nye ajụjụ ya banyere nhụjuanya nke mmadụ. Mgbe ahụ, Ndịàmà Jehova kpọtụụrụ ya ma kwuo ka ha mụọrọ ya Bible. Tara na-asị: “Abịara m ghọta na ọ pụghị ịbụ Chineke nke ịhụnanya na-akpata nhụjuanya nile nke dị n’ụwa . . . Atụmanya nke ụwa ọhụrụ, nke udo na ịdị n’otu ga-adị na ya nyere m obi ụtọ.” (Mkpughe 21:3, 4) Tara bibiri ihe oyiyi okpukpe Hindu ya, kwụsị ịgbaso omenala okpukpe nke ala ya, ma chọta ezi obi ụtọ n’inye aka n’igbo mkpa ime mmụọ nke ndị ọzọ dị ka Onyeàmà Jehova.

Panya, bụ́ onye Buddha, bụ dibịa afa mgbe mbụ Ndịàmà Jehova kpọtụụrụ ya na Bangkok, n’ihi ya, amụma ndị dị na Bible masịrị ya. Panya kọrọ, sị: “Mgbe m mụtara ihe mere ọnọdụ ndị dị n’ụwa ugbu a ji dị iche n’otú Onye Okike zubere na mbụ ka ọ dịrị nakwa otú o siworo mee ndokwa imezi ihe ndị jụrụ ya na ọbụbụeze ya mebiri, ọ dị ka a ga-asị na e kpupụrụ m ákwà n’anya. Ihe nile metụtara ozi Bible kwekọrọ nnọọ ekwekọ. Abịara m nwee ịhụnanya n’ebe Jehova nọ dị ka onye dị adị; nke a kpaliri m ime ihe m maara na o ziri ezi. Ọ dị m ọkụ n’obi inyere ndị ọzọ aka ịhụ ọdịiche dị n’etiti amamihe nke mmadụ na nke Chineke. Ezi amamihe agbanwewo ndụ m n’ezie.”

Ka oge na-aga, Virgil malitere inwe obi abụọ dị ukwuu banyere nkwenkwe okpukpe ya. Kama ikpegara Chineke ekpere maka ụzọ isi nyere ndị isi ojii aka nakwa maka òtù o weere na ọ bụ òtù na-akpa ókè agbụrụ bụ́ nke yiri ka ọ na-akpalite ịkpọ ndị ọcha asị, o kpere ekpere maka eziokwu ahụ, n’agbanyeghị ihe ọ bụ, n’agbanyeghị ebe ọ dị. “Mgbe m tetara n’ụra n’echi ya ka m kpesichara ekpere ike nye Chineke,” ka Virgil na-echeta, “ahụrụ m otu magazin Ụlọ Nche n’ụlọ m. . . . Ọ ghaghị ịbụ na e si n’okpuru ibo ụzọ fabata ya.” N’oge na-adịghị anya, ọ malitere iso Ndịàmà Jehova na-amụchi Bible anya. Ọ gara n’ihu, sị: “Na nke mbụ ya ná ndụ m, enwere m afọ ojuju. . . . Amalitere m inwetụ olileanya.” N’oge na-adịghị anya, Virgil sooro ndị ahụ na-agwa ndị mmadụ banyere nanị ezi olileanya e nwere bụ́ nke a kọwara n’Okwu Chineke, bụ́ Bible, dịrị n’otu.

A kpaliri mmasị Charo bụ́ onye si Latin America mgbe otu Onyeàmà aha ya bụ Gladys hụrụ na ọ na-enwe ihe isi ike n’ilekọta ụmụ ya ndị obere ma malite inyere ya aka site n’ịkpọrọ ya na-aga ahịa. Ka oge na-aga, Charo nakweere ihe Gladys gwara ya banyere ya—ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu. Ọ tụrụ Charo n’anya mgbe ọ mụtara site na Bible ya na ọ bụghị ndị ọma nile ga-aga eluigwe kama na Jehova ga-ejikwa ndụ ebighị ebi gọzie ụmụ mmadụ ga-anọ n’elu ụwa. (Abụ Ọma 37:11, 29) Charo anọwo na-eso ndị ọzọ ekerịta olileanya a eri afọ 15 gara aga.

Cheedị banyere ụwa dum ịbụ nke ndị nwere obi eziokwu ma dị n’otu n’ofufe nke Jehova, bụ́ nanị ezi Chineke ahụ, bijupụtara! Nke a abụghị echiche efu. Ọ bụ ihe Jehova kweworo ná nkwa. Site n’ọnụ onye amụma ya bụ́ Zefanaịa, Chineke sịrị: “M ga-emekwa ka otu ndị e wedara n’ala nke na-enweghịkwa ike fọdụ n’etiti gị, ha ga-agbabakwa n’aha Jehova. . . . [Ha] agaghị eme ajọ omume, ha agaghị ekwukwa okwu [ụgha]; a gaghị ahụkwa ire aghụghọ n’ọnụ ha: . . . ọ dịghịkwa onye ga na-eme ka ha maa jijiji.” (Zefanaịa 3:12, 13) Ọ bụrụ na nkwa a masịrị gị, buru n’uche agbamume Bible bụ́: “Chọọnụ Jehova, unu nile ndị dị umeala n’obi bi n’ụwa, ndị rụworo ihe O kpere n’ikpe; chọọnụ ezi omume, chọọnụ umeala n’obi: eleghị anya a ga-ezobe unu n’ụbọchị iwe Jehova.”—Zefanaịa 2:3.