Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mgbakọ—Ihe Ọṅụ Ndị Na-egosipụta na Anyị Bụ Òtù Ụmụnna

Mgbakọ—Ihe Ọṅụ Ndị Na-egosipụta na Anyị Bụ Òtù Ụmụnna

Guzonụ Dị Ka Ndị Zuru Okè, Ndị Kwezuwokwara Ihe Nile

Mgbakọ—Ihe Ọṅụ Ndị Na-egosipụta na Anyị Bụ Òtù Ụmụnna

JOSEPH F. RUTHERFORD nke dị afọ 50, bụ́ onye ahụ na-esighị ike ka ọ nọsịrị ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu afọ na mkpọrọ a tụrụ ya n’ụzọ na-ezighị ezi, ji obi ụtọ na-eje ozi dị ka onye na-enyere ndị ọbịa aka na họtel. O ji ume ya nile na-ebu igbe ma na-enyere ndị Kraịst ibe ya aka ịga n’ọnụ ụlọ ndị e nyere ha na họtel. Mmadụ abụọ n’ime ndị ya na ha nọburu n’otu ọnụ ụlọ n’ụlọ mkpọrọ—Ndị Mmụta Bible ibe ya—nyere nnukwu ìgwè mmadụ chọrọ ebe obibi ụlọ n’efu. Ebe nile nọgidere na-ekwo ekwo ruo mgbe ọ gafere etiti abalị. Ha nile nwere obi ụtọ. Gịnị ka a na-aga ime?

Ọ bụ n’afọ 1919, Ndị Mmụta Bible (ndị a maara taa dị ka Ndịàmà Jehova) ka sikwa n’oge mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ pụta. Iji mee ka òtù ụmụnna ha nwetaghachi ume, ha na-aga inwe otu mgbakọ na Cedar Point, Ohio, U.S.A., malite na September 1 ruo 8, 1919. N’ụbọchị ikpeazụ nke mgbakọ ahụ, mmadụ 7,000 bụ́ ndị nwere oké mkpali gere ntị nke ọma ka Nwanna Rutherford ji okwu ndị a na-agba onye nke ọ bụla n’ime ndị bịara mgbakọ ahụ ume, sị: “Ị bụ onye nnọchianya nke Eze kachasị ndị eze nile na Onyenwenụ kachasị ndị nwenụ nile, ị na-amara ndị mmadụ ọkwa [banyere] . . . alaeze dị ebube nke Onyenwe anyị.”

N’etiti ndị Jehova, mgbakọ dịwara laa azụ n’oge Israel oge ochie. (Ọpụpụ 23:14-17; Luk 2:41-43) Mgbakọ ndị dị otú ahụ bụ oge ọṅụ, na-enyere mmadụ nile nọ na ya aka ịtụkwasị uche n’Okwu Chineke. N’otu aka ahụ, mgbakọ Ndịàmà Jehova n’oge a na-ehiwe isi n’ihe ime mmụọ. Nye ndị ji ezi obi na-ekiri ihe na-emenụ, mgbakọ ndị dị otú ahụ na-enye ọṅụ na-enye ihe àmà a na-apụghị ịgbagha agbagha na ihe nkekọ siri ike nke òtù ụmụnna ndị Kraịst na-eme ka Ndịàmà dị n’otu.

Mgbalị Ndị A Na-eme Iji Gaa

Ndị Kraịst nke oge a na-aghọta na mgbakọ ha bụ oge iji nweta ume ọhụrụ ime mmụọ na ntụziaka n’Okwu Chineke. Ha na-ewere nzukọ ukwu ndị a dị ka ụzọ dị oké mkpa e si enyere ha aka ‘iguzo dị ka ndị zuru okè ndị kwezuwokwara ihe nile Chineke na-achọ.’ (Ndị Kọlọsi 4:12) N’ihi ya, Ndịàmà ji obi ha dum akwado mgbakọ ndị a, na-eme mgbalị dị ukwuu iji gaa ha.

Ọ na-achọ okwukwe na imeri ihe mgbochi ndị yiri ugwu n’aka ụfọdụ ndị iji nwee ike ịnọ ná mgbakọ ndị dị otú ahụ. Dị ka ihe atụ, tụlee ihe banyere otu Onyeàmà meworo agadi bi n’Austria. Ọ bụ ezie na ọ na-arịa ọrịa shuga nke chọkwara na a ga na-agba ya ọgwụ insulin kwa ụbọchị, ọ hụrụ na ya gazuru ụbọchị nile nke mgbakọ distrikti e nwere ná mba ya. N’India, o siiri otu nnukwu ezinụlọ bụ́ Ndịàmà bụ́ ndị dara ogbenye ọnụ ntụ ike ịga otu mgbakọ. Otu onye n’ime ezinụlọ ahụ nyere aka. “Ebe ọ bụ na achọghị m ka ihe omume ahụ kwaa anyị,” ka o kwuru, “erere m ọla ntị ọlaedo m iji kwado njem ahụ n’ụzọ ego. O ruru àjà a chụrụ maka ya ebe ọ bụ na mkpakọrịta anyị nwere na ahụmahụ ndị anyị nụrụ wusiri okwukwe anyị ike.”

Na Papua New Guinea, otu ìgwè ndị nwere mmasị a na-emebeghị baptism kpebisiri ike ịga otu mgbakọ distrikti e nwere n’isi obodo ahụ. Ha jekwuuru otu nwoke nọ n’obodo ha nke nwere ụgbọ njem ọha na eze ma jụọ ya ego ole ọ ga-ana ha iji buga ha ná mgbakọ ahụ. Ebe ọ bụ na ego ole ọ gwara ha karịrị akpa ha, ha mere ndokwa ịrụ ọrụ n’ụlọ nwoke ahụ, na-arụgharịrị ya kichin ya. N’ụzọ dị otú a, ha gara mgbakọ distrikti ahụ ma rite uru site n’ịnọ ya n’usoro ihe omume ahụ dum.

Ịdị anya abụghị nsogbu a na-apụghị imeri emeri nye Ndịàmà Jehova na-ezube ịga mgbakọ. Na 1978, iji gaa otu mgbakọ e nwere na Lille, France, otu onye na-eto eto si Poland ji ịnyịnya ígwè mee njem dị kilomita 1,200 n’ime ụbọchị isii. N’oge okpomọkụ nke 1997, Ndịàmà abụọ si Mongolia mere njem dị kilomita 1,200 iji gaa mgbakọ ndị Kraịst na Irkutsk, Russia.

Ezigbo Òtù Ụmụnna Nọ n’Ọrụ

Ịdị n’otu na ịbụ òtù ụmụnna nke Ndịàmà na-egosipụta ná mgbakọ ha na-apụta nnọọ ìhè nye ndị ji ezi obi na-ekiri ihe na-emenụ. Ọ masịwo ọtụtụ mmadụ na ndị bịara mgbakọ adịghị ele mmadụ anya n’ihu nakwa na ezi ịhụnanya dị ọbụna n’etiti ndị ọ pụrụ ịbụ na nke ahụ bụ nke mbụ ha na-ezute onwe ha.

Ná mgbakọ mba nile e nwere n’Australia na nso nso a, otu onye na-edugharị ndị nleta bụ́ onye ya na ndị bịara mgbakọ nọkọrịtara ruo otu izu chọrọ ịnọnyekwuru ha iji nụkwuo ụtọ mkpakọrịta ha. N’ịbụ onye ịhụnanya na ịdị n’otu ha kpaliri, o juru ya anya na ha mekọrọ nnọọ ihe nke ọma, ebe ọ bụ na ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime ha amabughị onwe ha. Mgbe ọ chọrọ ịla, ọ kpọrọ ha. N’ịkpọ ha “ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị,” ọ malitere ikele ha, ma anya mmiri rujuru ya anya ekweghị ya kwuchaa ihe ọ chọrọ ikwu, o bepụkwara ákwá.

Na 1997, Sri Lanka nwere mgbakọ distrikti mbụ ya e ji asụsụ atọ mee ihe na ya n’otu nnukwu ámá egwuregwu. E ji asụsụ Bekee, Sinhalese, na Tamil mee ihe n’usoro ihe omume ahụ dum n’otu oge. N’ụwa nke esemokwu agbụrụ na-arịwanye elu na ya, mgbakọ dị otú ahụ nke ìgwè atọ na-asụ asụsụ dịrịtara iche mere dị ịrịba ama. Otu onye uwe ojii jụrụ otu nwanna nwoke, sị: “Olee ndị na-eduzi mgbakọ a—ndị Sinhalese, ndị Tamil, ka ọ bụ ndị Bekee?” “Ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ha na-eduzi mgbakọ a,” ka nwanna ahụ zara ya. “Anyị nile na-emekọ ya ọnụ.” Nwoke ahụ ekweghị. Mgbe ìgwè atọ ahụ na-asụ asụsụ dịrịtara iche sonyere n’ekpere mmechi, “Amen” ha sịkọrọ ọnụ adazuokwa n’ámá egwuregwu ahụ dum, a kpaliri ndị ahụ bịara mgbakọ ịkụ aka. O siri ike ịhụ onye na-ebeghị ákwá n’etiti ndị ahụ bịaranụ. Ee, n’ezie, mgbakọ bụ ihe ọṅụ ndị na-egosipụta na anyị bụ òtù ụmụnna.—Abụ Ọma 133:1. *

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 14 Lee peeji nke 66-77, 254-282 nke akwụkwọ bụ́ Jehovah’s Witnesses—Proclaimers of God’s Kingdom, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.