Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Ihe Bara Ezigbo Uru?

Olee Ihe Bara Ezigbo Uru?

Olee Ihe Bara Ezigbo Uru?

Inwe ihe bara ezigbo uru pụrụ ịbụ ihe na-akpali akpali. Ma gịnị ka nke ahụ pụrụ ịbụ? Ọ̀ bụ ego buru ibu? Ka ọ̀ bụ ọla dị oké ọnụ ahịa ma ọ bụ nke mara nnọọ mma? Ka ọ̀ bụ ịbụ onye a ma ama na onye a na-anụ aha ya? Ọtụtụ mmadụ ji ihe ndị a kpọrọ ihe nke ukwuu. Inwe ha pụrụ ime ka mmadụ nweta ihe ndị na-akpa ya, mee ka ndụ ya nwekwuo nzube, ma ọ bụ gboo mkpa uche nke ịbụ onye a na-asọpụrụ na onye rụzuru ihe. Ànyị na-agbalịsi ike inweta ihe ndị dị otú ahụ, na-enwe olileanya na ha ga-eme ka anyị nweta ihe mgbaru ọsọ na ọchịchọ ndị anyị na-enwe maka ọdịnihu?

N’AKỤKỤ ka ukwuu, ndị mmadụ na-eji ihe akpọrọ ihe na-adabere n’otú o si egbo mkpa ha ma ọ bụ na-emeju ọchịchọ ha. Anyị na-eji ihe ndị na-eme ka anyị na-enwe mmetụta nke ịbụ ndị ihe dịịrị mma ma na-eme ka anyị na-atụ anya ọdịnihu dị nchebe, akpọrọ ihe nke ukwuu. Anyị na-ewere ihe ndị na-eme ozugbo ka anyị nwee ahụ efe, ahụ iru ala, ma ọ bụ bụrụ ndị a ma ama, dị ka ihe ndị dị oké ọnụ ahịa. Ma, iwere ihe n’ihe bara uru na-adabere n’ọchịchọ ma ọ bụ mmasị anyị na-agbanwe agbanwe bụ ihe na-enweghị ezi ndabere na ihe a na-elepụghị anya n’ihu mee. N’ezie, a na-eji ihe anyị ghọtara dị ka ihe kasị akpa anyị amata ihe bara uru n’ezie.

Gịnị kasị akpa anyị? Ihe ọ bụla nke na-adịghị enye otu ihe bụ́ isi—ndụ—abaghị uru. E wezụga ndụ, anyị agaghị adị adị. Eze Solomọn nke Israel oge ochie dere, sị: “Ndị nwụrụ anwụ adịghị ama ihe ọ bụla . . . Ọ dịghị ọrụ, ma ọ bụ iche echiche, ma ọ bụ ihe ọmụma, ma ọ bụ amamihe, dị [na Sheol, NW, ili nkịtị nke ihe a kpọrọ mmadụ].” (Eklisiastis 9:5, 10) Ọ bụrụ na anyị anwụọ, a na-amanye anyị ịhapụ ihe nile anyị nwere. N’ihi ya, ihe kasị akpa anyị bụ inweta ihe ga-echekwa ndụ anyị. Gịnị ga-eme nke ahụ?

Gịnị Ga-echekwa Ndụ Anyị?

“Ego bụ ndo,” ka Eze Solomọn kwuru. (Eklisiastis 7:12) Ọ bụrụ na anyị nwere ego zuru ezu, anyị pụrụ ịzụta ihe oriri na ụlọ na-enye ntụsara ahụ. Ego pụrụ ime ka anyị nwee ike ịnụ ụtọ ime njem gaa n’ebe ndị dị anya. Ọ pụrụ ịzụtara anyị ihe ndị na-akpa anyị mgbe anyị na-apụghịzi ịrụ ọrụ n’ihi ime agadi ma ọ bụ ịbụ ndị na-adịghịzi ike. Inwe ego bara ọtụtụ uru. Ma, ego apụghị ichekwa ndụ anyị. Pọl onyeozi dụrụ Timoti ọdụ, sị: “Na-enye ndị bụ́ ọgaranya n’oge dị ugbu a iwu, ka ha ghara ịtụkwasị uche ha n’ihe dị elu, gharakwa ịtụkwasị obi n’ihe ahụ a na-ejighị aka, bụ́ akụ̀, kama ka ha tụkwasị obi na Chineke.” (1 Timoti 6:17) Ego nile dị n’ụwa apụghị ịzụtara anyị ndụ.

Tụlee ahụmahụ nke otu nwoke aha ya bụ Hitoshi. N’ịbụ onye a zụlitere n’ezinụlọ dara ogbenye, Hitoshi nwere oké ọchịchọ ịba ọgaranya. O kwenyesiri ike n’ike ego nwere nke na o chere ọbụna na a pụrụ iji ya zụta obi ndị mmadụ. E mesịa, otu nwoke bịara n’ụlọ Hitoshi ma jụọ ya ma ọ̀ maara na Jisọs Kraịst nwụrụ n’ihi ya. Ajụjụ a mere ka Hitoshi chọkwuo ịmata ihe n’ihi na o chere na ọ dịghị onye ga-anwụ n’ihi mmadụ dị ka ya. Ọ gara gee otu okwu ihu ọha dabeere na Bible, o jukwara ya anya ịnụ ndụmọdụ nke ‘ime ka anya na-ele otu ebe.’ Onye kwuru okwu ahụ kọwara na anya na-ele “otu ebe” bụ nke e lepụrụ n’ọdịnihu na nke e lekwasịrị n’ihe ime mmụọ. (Luk 11:34) Kama ịdọgbuwe onwe ya maka ego, Hitoshi malitere ibute ihe ime mmụọ ụzọ ná ndụ ya.

Ihe onwunwe pụkwara ime ka anyị kwụsitụ ike ma nwetụ nchebe. Inwe ihe n’ụba pụrụ ime ka anyị ghara ịdị na-echegbu onwe anyị banyere ihe ndị na-akpa anyị kwa ụbọchị. Inwe ụlọ dị mma n’ebe magburu onwe ya pụrụ ime ka anyị na-enwe mmetụta nke ịbụ ndị rụzuru ihe. Inwe uwe ndị na-ewu ewu na ụgbọala mara mma pụrụ ime ka ndị ọzọ nwewa mmasị n’ebe anyị nọ.

Anyị ‘ịhụ ezi ihe ná ndọgbu nile anyị na-adọgbu onwe anyị n’ọrụ’ bụ ngọzi. (Eklisiastis 3:13) Anyị inwe ihe n’ụba pụkwara ime ka ndị anyị hụrụ n’anya nwee ike ‘izuru ike, rie ihe, ṅụọ ihe ọṅụṅụ, ma kporie ndụ.’ Otú ọ dị, uru ihe onwunwe na-aba anaghị adịte aka. N’ịdọ aka ná ntị Jisọs Kraịst nyere banyere anyaukwu, o kwuru, sị: “Ọ bụghị n’ihe o nwebigara ókè ka ndụ mmadụ dị, o sighị n’ihe o nwere pụta.” (Luk 12:15-21) Ihe onwunwe, otú ọ sọrọ ya ya haruo ma ọ bụ baruo n’uru, apụghị ime ka anyị jide ndụ n’aka.

Dị ka ihe atụ, Liz lụrụ otu nwoke bụ́ aka ji akụ̀. Ọ na-akọ, sị: “Anyị nwere ebe obibi mara mma na ụgbọala nta abụọ, ọnọdụ akụ̀ na ụba anyị nyekwara anyị ohere inwere onwe anyị ịnụ ụtọ ihe ọ bụla ụwa na-enye n’ụzọ ihe onwunwe . . . N’ụzọ na-eju nnọọ anya, aka m na-echegbu onwe m banyere ego.” Ọ na-akọwa, sị: “E nwere ọtụtụ ihe ga-efunahụ anyị. O yiri ka ọ na-abụ ka ị na-enweta ihe, otú ahụ ka ị ga na-enwekwu mmetụta nke ịbụ onye na-anọghị ná nchebe.”

Ọtụtụ mmadụ jikwa ịbụ onye a ma ama na onye a na-anụ aha ya akpọrọ ihe nke ukwuu n’ihi na ha pụrụ ime ka mmadụ bụrụ onye a na-enye otuto na nsọpụrụ. N’ụwa taa, ọrụ a na-enwe ihe ịga nke ọma na ya na-abụ nke a na-enwekarị mmasị na ya. Ịzụlite nkà ndị pụrụ iche pụrụ inyere anyị aka imere onwe anyị aha. Ndị ọzọ pụrụ ito anyị, jiri echiche anyị na-akpọrọ ihe nke ukwuu, ma na-achọsi ike inweta ihu ọma anyị. Ihe a nile pụrụ ịbụ ihe na-akpali akpali ma na-enye afọ ojuju. Otú ọ dị, n’ikpeazụ, ọ na-apụ n’anya. Solomọn nwere ebube na ike nile onye eze pụrụ inwe, ma o mere mkpesa, sị: “Ọ dịghị ncheta dịịrị onye maara ihe, dị ka ọ na-esighị adịrị onye nzuzu, . . . ha nile ga-abụ ihe e chezọrọ echezọ.” (Eklisiastis 2:16) Ịbụ onye a ma ama ma ọ bụ onye a na-anụ aha ya adịghị enye ndụ.

Otu ọkpụ ihe aha ya bụ́ Celo bịara jiri otu ihe dị nnọọ oké ọnụ ahịa karịa ịbụ onye a ma ama kpọrọ ihe nke ukwuu. N’ịbụ onye nwere nkà, ọ bịara ruo eruo ịga ụlọ akwụkwọ nke ọ nọ na ya meziwanye nkà ya. N’oge na-adịghị anya, ụlọ ọrụ mgbasa ozi na ndị na-enyocha ọrụ nkà bịara jawa ọrụ ya mma. E debere ọtụtụ n’ime ihe ndị ọ kpụrụ n’obodo ndị bụ́ isi na Europe. Celo na-akọ, sị: “Aghaghị m ikweta na ruo oge ụfọdụ, ọrụ nkà bụ ihe kasị mkpa ná ndụ m. Otú ọ dị, abịara m ghọta na a ga-eji mụ ịnọgide n’ọrụ m tụnyere mmadụ ịnwa ijere nna ukwu abụọ ozi. (Matiu 6:24) Ekwenyesiri m ike na ihe kasị mkpa m pụrụ ime bụ ikwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke. N’ihi ya, ekpebiri m n’onwe m ịkwụsị ọrụ m dị ka ọkpụ ihe.”

Gịnị Kasị Baa Uru?

Ebe ọ bụ na ọ dịghị ihe nwere nzube ma ọ bụ baa uru ma ọ bụrụ na ọ dịghị enye ndụ, gịnị ka anyị pụrụ inweta nke ga-eme ka anyị jide n’aka na anyị ga-anọgide na-adị ndụ? Ndụ nile si n’aka Jehova Chineke. (Abụ Ọma 36:9) N’ezie, “ọ bụ n’ime Ya onwe ya ka anyị na-adị ndụ, na-ejegharịkwa, na-adịkwa.” (Ọrụ 17:28) Ọ na-enye ndị ọ hụrụ n’anya ndụ ebighị ebi dị ka onyinye. (Ndị Rom 6:23) Gịnị ka anyị na-aghaghị ime iji ruo eruo inweta onyinye a?

Inweta onyinye nke ndụ ebighị ebi na-adabere n’anyị iso Jehova na-enwe mmekọrịta chiri anya. Ya mere, ihu ọma ya bara uru karịa ihe ọ bụla ọzọ anyị pụrụ inwe. Mgbe anyị nwere ya, anyị na-enwe atụmanya nke ezigbo obi ụtọ nke na-adịru mgbe ebighị ebi. Otú ọ dị, ọ bụrụ na anyị enweghị ihu ọma Chineke, anyị ga-enweta mbibi ebighị ebi. N’ihi ya, o doro anya na ihe ọ bụla nke ga-enyere anyị aka iso Jehova na-enwe ezi mmekọrịta bụ ihe bara oké uru.

Ihe Anyị Na-aghaghị Ime

Ihe ịga nke ọma anyị na-adabere n’anyị inwe ihe ọmụma. Ebe e si enweta ezi ihe ọmụma bụ́ n’Okwu Jehova, bụ́ Bible. Ọ bụ nanị ya na-agwa anyị ihe anyị na-aghaghị ime iji na-eme Chineke obi ụtọ. N’ihi ya, ọ dị anyị mkpa iji nlezianya na-amụ Akwụkwọ Nsọ. Mgbalị anyị ji ịdị uchu na-eme iji mụta ihe nile anyị nwere ike ịmụta banyere Jehova Chineke na Jisọs Kraịst na-eme ka anyị nweta ‘ihe ọmụma nke bụ́ ndụ ebighị ebi.’ (Jọn 17:3) Ihe ọmụma dị otú ahụ bụ akụ̀ dị oké ọnụ ahịa a ga-eji kpọrọ ihe!—Ilu 2:1-5.

Ihe ọmụma anyị na-enweta n’Okwu Chineke na-akwadebe anyị iwere nzọụkwụ na-eso ya—igosipụta okwukwe n’ebe Jisọs Kraịst nọ. Jehova ekwuwo na ndị nile na-abịakwute ya aghaghị isi n’ebe Jisọs nọ na-abịakwute ya. (Jọn 14:6) N’ezie, “nzọpụta adịghịkwa n’onye ọ bụla ọzọ.” (Ọrụ 4:12) Nzọpụta anyị ga-enweta n’ikpeazụ ga-adabere, ọ bụghị ‘n’ọlaọcha ma ọ bụ ọlaedo, kama n’ọbara dị oké ọnụ ahịa nke Kraịst.’ (1 Pita 1:18, 19) Anyị aghaghị igosipụta okwukwe anyị site n’ikwere n’ozizi Jisọs na ịgbaso ihe nlereanya ya. (Ndị Hibru 12:1-3; 1 Pita 2:21) Leekwa ka àjà ya si bụrụ ihe bara nnọọ uru! Iji uru ya mee ihe na-ekpebi ọdịnihu ebighị ebi nke ihe nile a kpọrọ mmadụ. Mgbe e ji ya mee ihe n’ụzọ zuru ezu maka ọdịmma anyị, a ga-enye anyị onyinye ahụ bara uru n’ezie bụ́ ndụ ebighị ebi.—Jọn 3:16.

Jisọs kwuru, sị: “Ị ga-ewere obi gị dum, werekwa mkpụrụ obi gị dum, werekwa uche gị dum, hụ Onyenwe anyị Chineke gị n’anya.” (Matiu 22:37) Ịhụ Jehova n’anya na-apụta na ‘anyị ga-edebe ihe nile O nyere n’iwu.’ (1 Jọn 5:3) Ihe o nyere n’iwu na-achọ na anyị ga-anọpụ iche n’ụwa, nọgide na-akpa àgwà ziri ezi, ma jiri iguzosi ike n’ihe na-akwado Alaeze ya. Ọ bụ otú ahụ ka anyị si ‘ahọrọ ndụ’ kama ịhọrọ ọnwụ. (Deuterọnọmi 30:19) Ọ bụrụ na anyị ‘abịaruo Chineke nso, ọ ga-abịarukwa anyị nso.’—Jemes 4:8.

Mmadụ ịbụ onye e mesiri obi ike na o nwere ihu ọma Chineke dị oké ọnụ ahịa karịa akụ̀ nile dị n’ụwa. Ndị nwere ya bụ ndị kasị baa ọgaranya n’ụwa! Ya mere, ka anyị na-agbalịsi ike inweta akụ̀ bara ezigbo uru—ihu ọma Jehova. N’ezie, ka anyị buru ndụmọdụ Pọl onyeozi n’uche: “Na-agbaso ezi omume, nsọpụrụ Chineke, okwukwe, ịhụnanya, ntachi obi, ịdị nwayọọ. Na-agbasi mgba ọma nke okwukwe ike, jide ndụ ebighị ebi aka.”—1 Timoti 6:11, 12.

[Foto ndị dị na peeji nke 21]

Gịnị ka i ji akpọrọ ihe nke ukwuu? Ọ̀ bụ ego, ihe onwunwe, ịbụ onye a ma ama, ka ọ̀ dị ihe ọzọ ọ bụ?

[Foto dị na peeji nke 23]

Ọ dị anyị mkpa iji nlezianya na-amụ Akwụkwọ Nsọ