Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Na-eje Ije ‘n’Ụzọ nke Izi Ezi’

Na-eje Ije ‘n’Ụzọ nke Izi Ezi’

Na-eje Ije ‘n’Ụzọ nke Izi Ezi’

“Ọ GA-ADỊRỊ [onye ezi omume] mma,” ka Aịsaịa onye amụma kwuru, “n’ihi na mkpụrụ omume ha nile ka ha ga-eri.” Aịsaịa kwukwara, sị: “Ụzọ onye ezi omume na-eso bụ izi ezi nile.” (Aịsaịa 3:10; 26:7) N’ụzọ doro anya, ka omume anyị wee na-amịpụta mkpụrụ dị mma, anyị aghaghị ịdị na-eme ihe dị mma n’anya Chineke.

Otú ọ dị, olee otú anyị pụrụ isi na-eje ije n’ụzọ nke izi ezi? Ngọzi ndị dị aṅaa ka anyị pụrụ ịtụ anya inweta site n’ime otú ahụ? Oleekwa otú ndị ọzọ pụrụ isi rite uru site n’anyị ime ihe kwekọrọ n’ụkpụrụ ezi omume Chineke? N’isi 10 nke akwụkwọ Bible bụ́ Ilu, Eze Solomọn nke Israel oge ochie zara ajụjụ ndị a ka ọ na-egosi ọdịiche dị n’etiti onye ezi omume na onye na-emebi iwu. N’ime otú ahụ, o ji okwu ahụ bụ́ “onye [ndị] ezi omume” mee ihe ugboro 13. Itoolu n’ime ha pụtara n’amaokwu 15 ruo na nke 32. N’ihi ya, ịtụle Ilu 10:15-32 ga-abụ ihe na-agba ume. *

Jidesie Ịdọ Aka ná Ntị Ike

Solomọn na-ezo aka n’ịdị mkpa nke ezi omume. Ọ na-asị: “Akụ̀ nke ọgaranya bụ obodo ya siri ike: mbibi nke ndị na-enweghị ike bụ ogbenye ha bụ. Ọrụ onye ezi omume na-eduba ná ndụ; ihe omume nke onye na-emebi iwu na-eduba ná mmehie.”Ilu 10:15, 16.

Akụ̀ na ụba pụrụ ịbụ ihe nchebe pụọ n’ihe ụfọdụ a na-ejighị n’aka ná ndụ, dị nnọọ ka obodo e wusiri ike si echebetụ ndị bi n’ime ya. Ịda ogbenye pụkwara ịkpata mbibi mgbe ihe ndị a na-atụghị anya ha mere. (Eklisiastis 7:12) Otú ọ dị, ọ pụkwara ịbụ na eze ahụ maara ihe na-atụpenye anyị azụ banyere ihe ize ndụ ndị metụtara ma ịba ọgaranya ma ịda ogbenye. Ọgaranya pụrụ ịchọ ịtụkwasị obi kpam kpam n’akụ̀ ya, na-eche na akụ̀ ya ‘dị ka mgbidi dị elu.’ (Ilu 18:11) Ogbenye pụkwara inwe echiche hiere ụzọ nke bụ́ na ogbenye ọ bụ na-eme ka ọdịnihu ya ghara inwe isi. N’ụzọ dị otú a, ha abụọ ahapụ imere onwe ha aha ọma n’ebe Chineke nọ.

N’aka nke ọzọ, ma onye ezi omume ò nwere ihe onwunwe dị ukwuu ma ọ bụ nke dị nta, ihe omume ya ziri ezi na-eduba ná ndụ. N’ụzọ dị aṅaa? N’ụdị na ọ na-enwe afọ ojuju n’ihe o nwere. Ọ dịghị ekwe ka ọnọdụ akụ́ na ụba ya metụta aha ọma o nwere n’ebe Chineke nọ. Ma onye ezi omume ọ̀ bara ọgaranya ma ọ̀ dara ogbenye, ụzọ ndụ ya na-ewetara ya obi ụtọ ugbu a na olileanya nke ndụ ebighị ebi n’ọdịnihu. (Job 42:10-13) Onye na-emebi iwu adịghị erite uru ọbụna ma a sị na o nwere akụ̀. Kama inwe ekele maka uru akụ̀ ya bara n’ichebe ya ma na-ebi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’uche Chineke, ọ na-eji ya akwalite ndụ nke mmehie.

“Ụzọ iru ná ndụ ka onye na-edebe ịdọ aka ná ntị bụ,” ka eze Israel ahụ gara n’ihu ikwu, “ma onye na-ahapụ ịba mba na-eme ka mmadụ kpafuo.” (Ilu 10:17) Otu ọkà mmụta Bible na-atụ aro na a pụrụ ịghọta amaokwu a n’ụzọ abụọ. Ọ pụrụ ịpụta na onye na-anakwere ịdọ aka ná ntị ma na-achụso ezi omume nọ n’ụzọ nke ndụ, ebe onye na-ahapụ ịba mba na-esi n’ụzọ ahụ kpafuo. Amaokwu ahụ pụkwara ịpụta na “onye na-anakwere ịdọ aka ná ntị na-egosi ụzọ na-eduga ná ndụ [nye ndị ọzọ n’ihi na ihe nlereanya ọma ya na-abara ha uru], ma onye ọ bụla na-ajụ mgbazi na-eduhie ndị ọzọ.” (Ilu 10:17, New International Version) N’ọnọdụ nke ọ bụla, lee ka o si dị oké mkpa ka anyị jigidesie ịdọ aka ná ntị ike ma ghara ịhapụ ịba mba!

Jiri Ịhụnanya Dochie Ịkpọasị

Solomọn tụziri ilu nwere ngalaba abụọ nke echiche ha yirịtara, akụkụ nke abụọ na-emesi nke mbụ ike. Ọ na-asị: “Onye na-ekpuchi ịkpọasị nwere egbugbere ọnụ okwu ụgha.” Ọ bụrụ na mmadụ kpọrọ onye ọzọ asị n’obi ya ma were okwu ire ụtọ ma ọ bụ otuto ọnụ efu na-ekpuchi ya, ọ na-aghọ aghụghọ—o nwere “egbugbere ọnụ okwu ụgha.” Eze ahụ maara ihe na-atụkwasị na nke a, sị: “Onye na-eme ka akụkọ ọjọọ pụta, onye ahụ bụ onye nzuzu.” (Ilu 10:18) Kama ikpuchi ịkpọasị ha, ụfọdụ na-ebo onye ha kpọrọ asị ebubo ụgha ma ọ bụ na-agbasa okwu nkatọ banyere onye ahụ. Nke a bụ nzuzu n’ihi na akụkọ ahụ e ji na-akatọ ya adịghị agbanwe ihe onye ahụ bụ n’ezie. Onye ji nghọta gee onye nkwutọ ahụ ntị ga-abịakwa hụ ebumnobi ọjọọ ahụ, ùgwù ọ na-akwanyere ya ga-ebelatakwa. N’ụzọ dị otú a, onye na-agbasa akụkọ ọjọọ bụ onwe ya ka ọ na-eme.

Ihe ziri ezi ime bụ ịghara ịghọgbu ma ọ bụ ikwutọ mmadụ. Chineke gwara ụmụ Israel, sị: “Akpọla nwanne gị asị n’obi gị.” (Levitikọs 19:17) Jisọs dụkwara ndị na-ege ya ntị ọdụ, sị: “Na-ahụnụ [ọbụna] ndị iro unu n’anya, na-ekpekwa ekpere nye ndị na-esogbu unu; ka unu wee bụrụ ụmụ nke Nna unu Nke bi n’eluigwe.” (Matiu 5:44, 45) Lee ka o si ka mma ime ka obi anyị jupụta n’ịhụnanya kama ịbụ n’ịkpọasị!

‘Gbochie Egbugbere Ọnụ Gị Abụọ’

N’imesi ike mkpa ọ dị ịchịkwa irè, eze ahụ maara ihe kwuru, sị: “N’ọtụtụ okwu njehie adịghị akwụsị: ma onye na-egbochi egbugbere ọnụ ya abụọ bụ onye nwere uche.”Ilu 10:19.

“Onye nzuzu na-emekwa ka okwu baa ụba.” (Eklisiastis 10:14) Ọnụ ya “na-ekwukwa okwu uche gbagọrọ agbagọ.” (Ilu 15:2) Nke a abụghị ikwu na onye ekwurekwu ọ bụla bụ onye nzuzu. Ma lee ka o si bụrụ ihe dị mfe onye na-ekwu oké okwu ịbụ onye e ji agbasa asịrị! A pụrụ ịsị na okwu nzuzu na-akpatakarị mmebi aha, mkpasu iwe, mmebi nke mmekọrịta mmadụ na ibe ya, na ọbụna mmerụ ahụ nkịtị. “N’ebe okwu bara ụba, mmehie adịghị akọ ụkọ.” (Ilu 10:19, An American Translation) Ọzọkwa, ọ na-abụ ihe mgbakasị ahụ ịnọ onye na-etinye ọnụ n’okwu nile ọ nụrụ nso. Ka anyị ghara ịdị na-ekwu ọtụtụ okwu.

E wezụga izere okwu ụgha nanị, onye na-egbochi egbugbere ọnụ ya na-eme omume dị ka onye nwere uche. Ọ na-eche echiche tupu ya ekwuo okwu. N’ịbụ onye ịhụnanya maka ụzọ Jehova na ezi ọchịchọ inyere mmadụ ibe ya aka kpaliri, ọ na-eche banyere mmetụta okwu ya ga-enwe n’ebe ndị ọzọ nọ. Ọ na-eji ịhụnanya na obiọma ekwu okwu. Ọ na-atụgharị n’uche otú ọ ga-esi mee ka ihe ọ na-ekwu bụrụ ihe na-adọrọ mmasị ma na-enye aka. Okwu ya na-adị ka “mkpụrụ osisi apple ọlaedo n’ime nkata ọlaọcha”—nke e ji nkà na nkwanye ùgwù ekwu mgbe nile.—Ilu 25:11.

“Na-azụ Ọtụtụ Mmadụ”

“Ọlaọcha a họpụtara ahọpụta ka ire onye ezi omume bụ,” ka Solomọn gara n’ihu ikwu, “obi ndị na-emebi iwu dị ka ihe nta.” (Ilu 10:20) Ihe onye ezi omume na-ekwu bụ eziokwu—dị ka ọlaọcha a họpụtara ahọpụta nke a nụchara nke ọma, nke na-enweghịkwa ntụpọ. N’ezie, nke a bụ eziokwu banyere ndị ohu Jehova ka ha na-enye ndị ọzọ ihe ọmụma na-azọpụta ndụ nke Okwu Chineke. Onye Nkụzi Ukwu ha, bụ́ Jehova Chineke, eziwo ha ihe ma ‘nye ha ire nke ndị mmụta, ka ha wee mara iwere okwu kwagide onye dara mbà.’ (Aịsaịa 30:20; 50:4) N’ezie, ire ha dị ka ọlaọcha a họpụtara ahọpụta ka ha na-ekwusa eziokwu Bible. Lee ka okwu ha si bụrụ ihe dị oké ọnụ ahịa n’ụzọ na-enweghị atụ nye ndị nwere obi eziokwu karịa ka ebumnobi nke onye na-emebi iwu bụ! Ka ọ na-anụ anyị ọkụ n’obi ikwu banyere Alaeze Chineke na oké ọrụ nile nke Chineke.

Onye ezi omume bụụrụ ndị nọ ya nso ngọzi. “Egbugbere ọnụ abụọ nke onye ezi omume na-azụ ọtụtụ mmadụ,” ka Solomọn gara n’ihu ikwu, “ma ndị gbagọrọ agbagọ n’uche ha na-anwụ n’ihi na obi amamihe kọrọ ha.”Ilu 10:21.

Olee otú ‘onye ezi omume si na-azụ ọtụtụ mmadụ’? Okwu Hibru e ji mee ihe n’ebe a na-enye echiche nke “ịzụ atụrụ.” Echiche ọ na-enye bụ nke idu ndú nakwa nke inye ume ọhụrụ, dị nnọọ ka onye ọzụzụ atụrụ n’oge ochie si elekọta atụrụ ya. (1 Samuel 16:11; Abụ Ọma 23:1-3; Abụ nke Abụ 1:7) Onye ezi omume na-eduzi ma ọ bụ na-eduga ndị ọzọ n’ụzọ nke ezi omume, okwu ya na-enyekwa ndị na-anụ ya ume ọhụrụ. N’ihi ya, ha na-ebi ndụ na-enye obi ụtọ na afọ ojuju karị, ha pụkwara ọbụna inweta ndụ ebighị ebi.

Otú ọ dị, gịnị banyere onye nzuzu? N’ihi ịbụ onye obi amamihe kọrọ, ọ na-egosipụta na ya enweghị ezi ebumnobi ma ọ bụ nchegbu banyere ihe ndị ga-esi n’ụzọ ndụ ya pụta. Onye dị otú ahụ na-eme ihe masịrị ya, n’achọghị ịma ihe ga-esi n’ime ya pụta. N’ihi ya, ọ na-ata ahụhụ n’ihi ihe o metara. Ebe onye ezi omume na-enye aka eme ka ndị ọzọ dị ndụ, onye obi amamihe kọrọ apụghịdị idebe onwe ya ndụ.

Jụ Ime Ihe Nzube Ọjọọ

Ụdị ihe ndị na-amasị mmadụ na ihe ndị na-adịghị amasị ya bụ ihe na-egosikarị ụdị mmadụ onye ahụ bụ. N’ikwupụta eziokwu a, eze Israel ahụ, na-asị: “Ọ dịịrị onye nzuzu dị ka igwuri egwu, bụ́ ime ihe nzube ọjọọ, otú a ka amamihe dịkwaara onye nghọta.”Ilu 10:23.

Ụfọdụ na-ele ime ihe ọjọọ anya dị ka igwuri egwu, ma ọ bụ ihe egwuregwu, ha na-eme ya nanị maka “mkpori ndụ.” Ndị dị otú ahụ adịghị agụ Chineke n’onye mmadụ nile ga-aza ajụjụ n’ihu ya, ha adịghịkwa ahụ ịdị njọ nke ụzọ ndụ ha. (Ndị Rom 14:12) Echiche ha na-ehie ụzọ ruo n’ókè nke ha iche na Chineke adịghị ahụ omume ọjọọ ha. Dị ka a pụrụ isi kwuo ya, site n’omume ha, ha na-asị: “Ọ dịghị Chineke ọ bụla dị.” (Abụ Ọma 14:1-3; Aịsaịa 29:15, 16) Lee ihe nzuzu nke ahụ bụ!

N’aka nke ọzọ, onye nwere nghọta na-aghọta na ime ihe nzube ọjọọ abụghị igwuri egwu. Ọ maara na ọ na-ewute Chineke, ọ pụkwara imebi mmekọrịta ya na ya. Àgwà dị otú ahụ bụ nzuzu n’ihi na ọ na-anapụ mmadụ ùgwù onwe onye, na-emebi alụmdi na nwunye, na-emerụ ma obi ma ahụ, na-edugakwa n’ejighị ihe ime mmụọ kpọrọ ihe. Anyị ga-abụ ndị maara ihe ịjụ ime ihe nzube ọjọọ ma zụlite ịhụnanya n’ebe amamihe dị dị ka anyị si azụlite ya n’ebe nwanne anyị nwanyị anyị hụrụ n’anya nke ukwuu nọ.—Ilu 7:4.

Na-ewu n’Elu Ntọala Kwesịrị Ekwesị

N’ime ka uru mmadụ iwukwasị ndụ ya na ntọala kwesịrị ekwesị bara pụta ìhè, Solomọn na-ekwu, sị: “Ihe onye na-emebi iwu na-atụ ụjọ ya, nke ahụ ga-abịakwute ya: ma ihe ndị ezi omume na-achọsi ike ka a ga-enye ha. Mgbe oké ifufe na-efebiga, onye na-emebi iwu anọghịkwa: ma onye ezi omume bụ ntọala ebighị ebi.”Ilu 10:24, 25.

Onye na-emebi iwu pụrụ ime ka ndị ọzọ na-atụ oké ụjọ. Otú ọ dị, n’ikpeazụ, ihe ọ na-atụ ụjọ ya na-abịakwasị ya. Ebe ọ bụ na ọ tọghị ntọala n’ụkpụrụ ezi omume, o yiri ụlọ na-akwụsighị ike bụ́ nke na-ada ma ajọ oké ifufe fee. Ọ na-ada mbà ma o nwee nrụgide. N’aka nke ọzọ, onye ezi omume dị ka nwoke ahụ mere ihe kwekọrọ n’okwu Jisọs. Ọ bụ “nwoke nwere uche, onye wuru ụlọ ya n’elu oké nkume.” Jisọs sịrị, “mmiri wee zoo, osimiri ruokwa, ifufe feekwa, wee makwasị ụlọ ahụ; ma ọ daghị: n’ihi na a tọrọ ntọala ya n’elu oké nkume.” (Matiu 7:24, 25) Onye dị otú ahụ kwụ chịm—echiche ya na omume ya gbagidesiri mkpọrọgwụ ike n’ụkpụrụ Chineke.

Tupu ya agaa n’ihu n’igosipụta ọdịiche dị n’etiti onye na-emebi iwu na onye ezi omume, eze ahụ maara ihe nyere ịdọ aka ná ntị dị nkenke ma dị mkpa. Ọ na-asị: “Dị ka mmanya gbara ụka si adị n’ebe ezé dị, na dị ka anwụrụ ọkụ si adị n’ebe anya dị, otú a ka onye umengwụ na-adị n’ebe ndị na-ezi ya ozi nọ.” (Ilu 10:26) Mmanya gbara ụka na-egbu ezé. Acetic acid dị n’ime ya na-eme ka ọ na-agba agba na ntì, ọ pụkwara igbu ezé. Anwụrụ ọkụ na-afụ ụfụ n’anya. N’otu aka ahụ, onye ọ bụla goro onye umengwụ ọrụ ma ọ bụ jiri ya mee onye nnọchianya ya gaje ịbụ onye a kpasuru iwe, ọ ga-enwekwa mfu.

‘Ebe Siri Ike Ka Ụzọ Jehova Bụ’

Eze Israel ahụ gara n’ihu, sị: “Egwu Jehova na-atụkwasị ụbọchị ná ndụ mmadụ: ma afọ nile nke ndị na-emebi iwu ga-adị mkpụmkpụ. Nchere ndị ezi omume ga-abụ ọṅụ: ma olileanya ndị na-emebi iwu ga-ala n’iyi.”Ilu 10:27, 28.

Egwu Chineke na-edu onye ezi omume, ọ na-agbalịkwa ime ihe na-atọ Jehova ụtọ site n’echiche, okwu ọnụ, na omume ya. Chineke na-elekọta ya ma na-emezu atụmanya ezi omume ya. Otú ọ dị, onye na-emebi iwu na-ebi ndụ asọpụrụghị Chineke. Mgbe ụfọdụ ọ pụrụ iyi ka e mezuru olileanya ya, ma ọ bụ nanị ruo nwa oge, n’ihi na ime ihe ike ma ọ bụ ọrịa nke ụzọ ndụ ya kpatara na-egbubikarị ndụ ya n’ike. N’ụbọchị ọnwụ ya, olileanya ya nile na-akụ afọ n’ala.—Ilu 11:7.

“Ebe siri ike n’ebe onye zuru okè nọ ka ụzọ Jehova bụ,” ka Solomọn na-ekwu, “ma ọ bụ mbibi n’ebe ndị na-arụ ajọ ihe nọ.” (Ilu 10:29) N’ebe a, ụzọ Jehova na-ezo aka, ọ bụghị n’ụzọ nke ndụ bụ́ nke anyị kwesịrị ije ije na ya, kama n’ụzọ Chineke si emeso ihe a kpọrọ mmadụ ihe. “Oké nkume ahụ, ihe zuru okè ka ọrụ Ya bụ,” ka Mosis kwuru, “n’ihi na ụzọ Ya nile bụ ikpe ziri ezi.” (Deuterọnọmi 32:4) Ụzọ Chineke ndị ziri ezi pụtara nchebe nye onye ezi omume na mbibi nye onye na-emebi iwu.

Lee ebe siri ike nke Jehova ghọwooro ndị ya! “A gaghị ewezụga onye ezi omume n’ọnọdụ ya ruo mgbe ebighị ebi: ma ndị na-emebi iwu agaghị ebi n’ụwa. Ọnụ onye ezi omume na-amị amamihe dị ka mkpụrụ: ma ire nke na-ekwu okwu ịgbakụta Chineke azụ, a ga-ebipụ ya. Egbugbere ọnụ abụọ nke onye ezi omume maara ihe na-atọ ụtọ: ma ọnụ ndị na-emebi iwu na-ekwu okwu ịgbakụta Chineke azụ.”Ilu 10:30-32.

N’ezie ndị ezi omume bụ ndị na-enwe ihe ịga nke ọma na ndị a gọziri agọzi n’ihi na ha na-eje ije n’ụzọ nke izi ezi. N’ezie, “ngọzi Jehova, nke ahụ na-eme mmadụ ọgaranya, ọ dịghị atụkwasịkwa ya ihe mwute.” (Ilu 10:22) Mgbe ahụ, ka anyị na-elezi anya ime ihe n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ Chineke. Ka anyị na-egbochikwa egbugbere ọnụ anyị abụọ ma jiri ire anyị na-azụ ndị ọzọ site n’ịgwa ha eziokwu na-azọpụta ndụ nke Okwu Chineke ma na-eduzi ha gaa n’ụzọ nke ezi omume.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

[Foto dị na peeji nke 26]

Ire pụrụ ịdị ka “ọlaọcha a họpụtara ahọpụta”