Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Gịnị ka ife Jehova “n’ime mmụọ” pụtara?

Mgbe Jisọs Kraịst na-agbara otu nwanyị Sameria bịara isere mmiri n’olulu mmiri Jekọb nke dị nso n’obodo Saịka àmà, ọ sịrị: “Chineke bụ Mmụọ: ndị na-akpọkwa isiala nye Ya aghaghị ịkpọ isiala n’ime mmụọ na eziokwu.” (Jọn 4:24) A ghaghị ife ezi ofufe ‘n’eziokwu’ n’echiche bụ́ na o kwesịrị ikwekọ n’ihe Jehova Chineke kpugheworo na Bible banyere onwe ya na nzube ya. Ozi anyị na-ejere Chineke aghaghịkwa ịbụ nke e ji obi dị ọkụ, ma ọ bụ ịnụ ọkụ n’obi na-eje, nke obi jupụtara n’ịhụnanya na okwukwe na-akpali. (Taịtọs 2:14) Otú ọ dị, ihe a na-ekwu na-egosi na okwu Jisọs banyere ‘ife Chineke n’ime mmụọ’ gụnyere ihe karịrị nnọọ ọnọdụ uche nke anyị ji ejere Jehova ozi.

Nkwurịta okwu Jisọs so nwanyị ahụ nwee n’olulu mmiri ahụ abụghị banyere iji ịnụ ọkụ n’obi ma ọ bụ ejighị ịnụ ọkụ n’obi na-efe ofufe. Ọbụna a pụrụ iji ịnụ ọkụ n’obi na nraranye na-efe ofufe ụgha. N’ụzọ megidere nke ahụ, mgbe Jisọs kwusịrị na a pụghị ife Nna ya n’ugwu Sameria ma ọ bụ n’ụlọ nsọ Jerusalem—bụcha ebe ndị a na-ahụ anya—ọ rụtụrụ aka n’ụzọ ọhụrụ e si efe ofufe bụ́ nke dabeere n’ụdị onye Chineke bụ n’ezie. (Jọn 4:21) Ọ sịrị: “Chineke bụ Onye bụ́ mmụọ.” (Jọn 4:24, Charles B. Williams) Ezi Chineke abụghị onye a pụrụ ịhụ anya ma ọ bụ metụ aka. Ofufe ya ehiweghị isi n’ụlọ nsọ a na-ahụ anya ma ọ bụ n’ugwu. N’ihi ya, Jisọs zoro aka n’ụdị ofufe nke karịrị ihe anya na-ahụ.

Tụkwasị n’ịbụ nke e fere n’eziokwu, ofufe a na-anara nke ọma gajekwa ịbụ nke mmụọ nsọ na-eduzi—mmụọ Chineke a na-adịghị ahụ anya nke nọ n’ọrụ. “Mmụọ Nsọ na-enyocha ihe nile,” ka Pọl onyeozi dere, “ọbụna ihe nile dị omimi nke Chineke.” Ọ gbakwụnyere, sị: “Anyị onwe anyị anataghị mmụọ nke ụwa, kama ọ bụ Mmụọ Nke sitere na Chineke; ka anyị wee mata ihe nile Chineke weere amara nye anyị.” (1 Ndị Kọrint 2:8-12) Iji fee Chineke n’ụzọ ọ na-anara nke ọma, anyị aghaghị inwe mmụọ ya ma bụrụ ndị ọ na-eduzi. Ọzọkwa, ọ dị oké mkpa na mmụọ, ma ọ bụ ọnọdụ uche anyị, ga-ekwekọ na nke ya site n’ịmụ Okwu ya na itinye ya n’ọrụ.

[Foto dị na peeji nke 28]

Fee Chineke “n’ime mmụọ na eziokwu”