Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Ọ Ga-abịarukwa Unu Nso”

“Ọ Ga-abịarukwa Unu Nso”

“Ọ Ga-abịarukwa Unu Nso”

“[Chineke anọghị] n’ebe dị anya n’ebe onye ọ bụla n’ime anyị nọ.”—ỌRỤ 17:27.

1, 2. (a) Mgbe anyị lere anya n’eluigwe nke jupụtara na kpakpando, ajụjụ dị aṅaa ka anyị pụrụ ịjụ banyere Onye Okike? (b) Olee otú Bible si emesi anyị obi ike na ụmụ mmadụ abụghị ndị na-abaghị n’ihe n’anya Jehova?

Ọ̀ DỊTỤWO mgbe i lere anya n’eluigwe n’abalị ihu igwe gbachapụrụ agbachapụ ma jupụta na kpakpando, ibobo anwụọ gị n’ahụ́? Ọnụ ọgụgụ buru ibu nke kpakpando na ịdị obosara nke mbara igwe na-akpali egwu. N’eluigwe na ala a buru oké ibu, ụwa dị nnọọ ka kpọm. Nke a ọ̀ pụtara na Onye Okike, bụ́ “Onye kachasị ihe nile elu n’elu ụwa nile,” dị elu gabiga ókè ichewe banyere ụmụ mmadụ ma ọ bụ nọrọ n’ebe dị oké anya ma bụrụ onye dị mgbagwoju anya nke na ụmụ mmadụ apụghị ịmata ya?—Abụ Ọma 83:18.

2 Bible na-emesi anyị obi ike na ụmụ mmadụ abụghị ndị na-abaghị n’ihe n’anya Jehova. N’ezie, Okwu Chineke na-agba anyị ume ịchọ ya, na-asị: “Ọ nọghị n’ebe dị anya n’ebe onye ọ bụla n’ime anyị nọ.” (Ọrụ 17:27; 1 Ihe E Mere 28:9) N’ezie, ọ bụrụ na anyị emee ihe iji bịaruo Chineke nso, ọ ga-eme ihe banyere mgbalị anyị. N’ụzọ dị aṅaa? Okwu ndị dị n’isiokwu anyị dịịrị afọ 2003 na-enye azịza a na-agba ume: “Ọ ga-abịarukwa unu nso.” (Jems 4:8) Ka anyị tụlee ụfọdụ n’ime ngọzi ndị magburu onwe ha Jehova na-awụsa ndị bịaruru ya nso.

Onyinye Jehova n’Onwe Ya Na-enye

3. Onyinye dị aṅaa ka Jehova na-enye ndị bịaruru ya nso?

3 Nke mbụ, ndị ohu Jehova nwere onyinye dị oké ọnụ ahịa nke o debeere ndị ya. Ike, akụ̀ na ụba, na agụmakwụkwọ nile nke a na-enweta n’usoro ihe a apụghị ime ka e nweta onyinye a. Ọ bụ onyinye Jehova n’onwe ya na-enye nanị ndị nọ ya nso. Gịnị ka ọ bụ? Okwu Chineke na-aza, sị: “Ọ bụrụ . . . na ọ bụ nghọta ka ị na-eweliri olu gị; ọ bụrụ na ị chọọ ya dị ka ọlaọcha, ọ bụrụkwa na ọ bụ dị ka akụ̀ zoro ezo ka ị na-egwupụta ya: mgbe ahụ ka ị ga-aghọta egwu Jehova, ọ bụkwa ihe ọmụma Chineke ka ị ga-achọta. N’ihi na Jehova na-enye amamihe.” (Ilu 2:3-6) Cheedị banyere ụmụ mmadụ na-ezughị okè inwe ike ịchọta “ihe ọmụma Chineke”! E ji onyinye ahụ—ihe ọmụma a na-achọta n’Okwu Chineke—tụnyere “akụ̀ zoro ezo.” N’ihi gịnị?

4, 5. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji jiri “ihe ọmụma Chineke” tụnyere “akụ̀ zoro ezo”? Nye ihe atụ.

4 Otu ihe bụ na ihe ọmụma Chineke bara uru nke ukwuu. Otu n’ime ngọzi ya ndị kasị dịrị oké ọnụ ahịa bụ atụmanya nke ndụ ebighị ebi. (Jọn 17:3) Ma ihe ọmụma ahụ na-eme ka ndụ anyị ka mma ọbụna ugbu a. Dị ka ihe atụ, n’ihi iji nlezianya na-amụ Okwu Chineke, anyị achọpụtawo azịza nye ajụjụ ndị dị mkpa dị ka: Gịnị bụ aha Chineke? (Abụ Ọma 83:18) Gịnị n’ezie bụ ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ? (Eklisiastis 9:5, 10) Gịnị bụ nzube Chineke maka ụwa na ihe a kpọrọ mmadụ? (Aịsaịa 45:18) Anyị achọpụtawokwa na ụzọ kasị mma isi bie ndụ bụ site n’itinye ndụmọdụ Bible amamihe dị na ya n’ọrụ. (Aịsaịa 30:20, 21; 48:17, 18) N’ụzọ dị otú a, anyị na-enwe ezi nduzi nke na-enyere anyị aka ịnagide nchegbu dị iche iche nke ndụ na ibi ụdị ndụ nke na-akwalite ezi obi ụtọ na afọ ojuju. Karịsịa, ọmụmụ anyị na-amụ Okwu Chineke enyeworo anyị aka ịbịa mara àgwà ndị magburu onwe ha nke Jehova na ịbịaru ya nso. Olee ihe pụrụ ịba uru karịa iso Jehova na-enwe mmekọrịta chiri anya bụ́ nke dabeere ‘n’ihe ọmụma Chineke’?

5 E nwere ihe ọzọ mere a pụrụ iji jiri ihe ọmụma Chineke tụnyere “akụ̀ zoro ezo.” Dị ka ọtụtụ akụ̀ dị oké ọnụ ahịa, ọ kọtụrụ ụkọ n’ụwa a. N’ime ijeri mmadụ isii bi n’ụwa, ọ bụ ihe dị ka nde mmadụ isii bụ́ ndị na-efe Jehova ofufe, ma ọ bụ ihe dị ka 1 onye n’ime 1,000 mmadụ, chọtarala “ihe ọmụma Chineke.” Iji maa atụ otú o si bụrụ ihe ùgwù pụrụ iche ịmara eziokwu nke Okwu Chineke, tụlee nanị otu ajụjụ dabeere na Bible: Gịnị na-eme ụmụ mmadụ mgbe ha nwụrụ? Anyị maara site n’Akwụkwọ Nsọ na mkpụrụ obi na-anwụ anwụ nakwa na ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla. (Ezikiel 18:4) N’agbanyeghị nke ahụ, ihe ka ọtụtụ n’okpukpe ndị dị n’ụwa nwere nkwenkwe ụgha bụ́ na ọ dị ihe dị n’ime mmadụ nke na-anọgide na-adị ndụ mgbe a nwụsịrị. Ọ bụ nkwenkwe bụ́ isi nke okpukpe ndị mejupụtara Krisendọm. Ọ bụkwa nkwenkwe bụ́ isi n’okpukpe Alakụba, okpukpe Buddha, okpukpe Hindu, okpukpe Jain, okpukpe ndị Juu, okpukpe Shinto, okpukpe Sikh, na okpukpe Tao. Cheedị banyere nke ahụ—e ji otu nkwenkwe ụgha a na-eduhie ọtụtụ nde mmadụ!

6, 7. (a) Nanị ole ndị pụrụ ịchọta “ihe ọmụma Chineke”? (b) Olee ihe atụ na-egosi na Jehova agọziwo anyị site n’ime ka anyị ghọta ihe ọtụtụ “ndị amamihe na ndị nwere ọgụgụ isi” na-adịghị aghọta?

6 Gịnị mere ọtụtụ ndị achọtabeghị “ihe ọmụma Chineke”? Ọ bụ n’ihi na mmadụ apụghị ịghọta ihe Okwu Chineke pụtara nke ọma n’enwetaghị enyemaka Ya. Cheta, ihe ọmụma a bụ onyinye. Ọ bụ nanị ndị dị njikere iji ezi obi na obi umeala na-enyocha Okwu ya ka Jehova na-enye ya. Ndị dị otú ahụ nwere ike ghara ‘ịma ihe n’ụzọ anụ ahụ́.’ (1 Ndị Kọrint 1:26) Ọbụna a pụrụ ile ọtụtụ n’ime ha anya dị ka “ndị na-agụghị oké akwụkwọ na ndị nkịtị” dị ka ụwa si ele ihe anya. (Ọrụ 4:13) Otú ọ dị, nke ahụ adịghị mkpa. Jehova na-eji “ihe ọmụma Chineke” akwụghachi anyị ụgwọ n’ihi àgwà ndị ọ hụrụ n’ime anyị.

7 Tụlee otu ihe atụ. Ọtụtụ ndị ọkà mmụta na Krisendọm ebipụtawo ọtụtụ akwụkwọ na-akọwa Bible. Akwụkwọ ntụaka ndị dị otú ahụ pụrụ ịkọwa ihe ndị gbara akụkọ ndị a kọrọ gburugburu, kọwaa ihe okwu Hibru na nke Grik ndị e ji mee ihe pụtara, na ihe ndị ọzọ. N’agbanyeghị mmụta ha nile, ndị ọkà mmụta dị otú ahụ hà achọtawo “ihe ọmụma Chineke”? Ọ dị mma, hà ghọtara isiokwu nke Bible nke ọma—igosipụta oruru o ruuru Jehova ịbụ ọkaaka site n’Alaeze eluigwe ya? Hà maara na Jehova Chineke abụghị akụkụ nke Atọ n’Ime Otu? Ma anyị nwere nghọta ziri ezi banyere ihe ndị ahụ. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na Jehova agọziwo anyị site n’ime ka anyị ghọta eziokwu ime mmụọ ọtụtụ “ndị amamihe na ndị nwere ọgụgụ isi” na-adịghị aghọta. (Matiu 11:25) Lee ka Jehova si agọzi ndị nọ ya nso!

“Jehova Na-echebe Ndị Nile Na-ahụ Ya n’Anya”

8, 9. (a) Olee otú Devid si kọwaa ngọzi ọzọ ndị nọ Jehova nso na-enweta? (b) N’ihi gịnị ka nchebe Chineke ji dị ezi Ndị Kraịst mkpa?

8 Ndị nọ Jehova nso na-enweta ngọzi ọzọ—nchebe Chineke. Ọbụ abụ bụ́ Devid, bụ́ onye nsogbu na-abụghịrị ihe ọhụrụ, dere sị: “Jehova dị nso ndị nile na-akpọku Ya, bụ́ ndị nile na-akpọku Ya n’eziokwu. Ihe dị ndị na-atụ egwu Ya ụtọ ka Ọ ga-eme; ọ bụkwa ntiku ha ka Ọ ga-anụ, wee zọpụta ha. Jehova [na-echebe, NW] ndị nile na-ahụ Ya n’anya.” (Abụ Ọma 145:18-20) Ee, Jehova nọ ndị hụrụ ya n’anya nso, n’ihi ya kwa, ọ pụrụ ịza mkpu ha na-etiku ya maka enyemaka ngwa ngwa.

9 N’ihi gịnị ka nchebe Chineke ji dị anyị mkpa? Tụkwasị n’inwe mmetụta nke ibi ‘n’oge a pụrụ iche nke siri ike obibi,’ ezi Ndị Kraịst bụ ndị bụ́ isi Onye Iro ukwu nke Jehova bụ́ Setan Ekwensu lekwasịrị anya. (2 Timoti 3:1) Onye iro ahụ dị aghụghọ kpebisiri ike ‘iripịa’ anyị. (1 Pita 5:8) Setan na-akpagbu, na-arụgide, ma na-anwa anyị ọnwụnwa. Ọ na-achọkwa ọnọdụ uche na nke obi ndị ọ pụrụ iji mee ihe. O nwere ihe o bu n’obi eme ya: ime ka okwukwe anyị daa mbà na iripịa anyị n’ụzọ ime mmụọ. (Mkpughe 12:12, 17) Ebe anyị nwere onye iro dị otú ahụ dị ike nke anyị ga-alụso ọgụ, ọ́ bụghị ihe na-emesi obi ike ịmara na “Jehova na-echebe ndị nile na-ahụ ya n’anya”?

10. (a) Olee otú Jehova si echebe ndị ya? (b) Olee ụdị nchebe kasị mkpa, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

10 Otú ọ dị, olee otú Jehova si echebe ndị ya? Nkwa o kwere ichebe anyị apụtaghị na anyị ga-ebi ndụ na-enweghị nsogbu n’usoro ihe a; ọ pụtaghịkwa na iwu ji ya ịrụrụ anyị ọrụ ebube. Otú o sina dị, Jehova na-echebe ndị ya n’ụzọ nkịtị dị ka otu ìgwè. E kwuwerị, ọ gaghị ekwe ka Ekwensu kpochapụ ezi ofufe n’ụwa! (2 Pita 2:9) Karịsịa, Jehova na-echebe anyị n’ụzọ ime mmụọ. Ọ na-eji ihe ndị dị anyị mkpa iji tachie obi n’ọnwụnwa na iji chebe mmekọrịta anyị na ya akwadebe anyị. N’ikpeazụ, ọ bụ nchebe ime mmụọ bụ nke kasị mkpa. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ọ bụrụhaala na anyị na Jehova nwere mmekọrịta, ọ dịghị ihe ọ bụla—ọbụna ọnwụ—nke pụrụ imerụ anyị ahụ́ n’ụzọ na-adịgide adịgide.—Matiu 10:28.

11. Ndokwa ndị dị aṅaa ka Jehova meworo iji chebe ndị ya n’ụzọ ime mmụọ?

11 Jehova emewo ndokwa bara ụba maka nchebe ime mmụọ nke ndị nọ ya nso. Site n’Okwu ya, bụ́ Bible, ọ na-enye anyị amamihe ịnagide ọnwụnwa dịgasị iche iche. (Jems 1:2-5) Itinye ndụmọdụ ndị dị irè a na-achọta n’Akwụkwọ Nsọ n’ọrụ ga-echebe anyị. Tụkwasị na nke ahụ, Jehova na-enye “ndị na-arịọ ya mmụọ.” (Luk 11:13) Mmụọ ahụ bụ ikike kasị ike n’eluigwe na ala, n’ihi ya ọ pụrụ ịkwadebe anyị n’ezie imeri ule ma ọ bụ ọnwụnwa ọ bụla nke pụrụ ịbịara anyị. Jehova na-enye anyị “onyinye n’ụdị mmadụ” site n’aka Kraịst. (Ndị Efesọs 4:8) Ndị ikom a ruru eru n’ụzọ ime mmụọ na-agbalịsi ike igosipụta ọmịiko miri emi nke Jehova n’inyere ndị ha na ha na-efekọ ofufe aka.—Jems 5:14, 15.

12, 13. (a) N’ụzọ dị aṅaa ka Jehova si enye anyị nri ime mmụọ n’oge kwesịrị ekwesị? (b) Olee otú ndokwa ndị Jehova na-eme maka ọdịmma ime mmụọ anyị na-adị gị?

12 Jehova na-enye anyị ihe ọzọ iji chebe anyị: nri ime mmụọ n’oge kwesịrị ekwesị. (Matiu 24:45) Site n’akwụkwọ ndị e biri ebi, gụnyere magazin Ụlọ Nche na Teta!, nakwa nzukọ na mgbakọ dị iche iche, Jehova na-enye anyị ihe ndị dị anyị mkpa mgbe ha dị anyị mkpa. Ị̀ pụrụ icheta otu oge mgbe ị nụrụ otu ihe ná nzukọ Ndị Kraịst ma ọ bụ ná mgbakọ dị iche iche nke metụrụ gị n’obi ma wusie gị ike ma ọ bụ kasie gị obi? Ọ̀ dịtụwo mgbe ị gụrụ otu isiokwu n’otu n’ime akwụkwọ ndị ahụ a kpọtụrụ aha n’elu ma chee na ọ bụ gị ka e bu n’uche dee ya’?

13 Otu n’ime ngwa ọrụ ndị kasị dị irè nke Setan ji eme ihe bụ nkụda mmụọ, a gụpụghịkwa anyị ná mmetụta ọ na-enwe. Ọ maara nke ọma na oké nkụda mmụọ pụrụ ime ka anyị ghara inwe ume, ọbụna na-eme ka anyị ghara inwe ihe nchebe. (Ilu 24:10) Ebe ọ bụ na Setan na-agbalị iji mmetụta na-ezighị ezi ndị anyị na-enwe eme ihe, enyemaka dị anyị mkpa. Ugboro ugboro, e bipụtawo isiokwu ndị na-enyere anyị aka imeri nkụda mmụọ na magazin Ụlọ Nche na Teta! Otu nwanna nwanyị Onye Kraịst dere banyere otu n’ime isiokwu ndị dị otú ahụ, sị: “Ana m agụ isiokwu ahụ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ kwa ụbọchị, anya mmiri ka na-agbakwa m. Ana m edebe ya n’akụkụ ihe ndina m ka o wee nwee ike iru m aka mgbe ọ bụla m nwere nkụda mmụọ. Site n’isiokwu ndị dị ka ndị a, ọ pụrụ ịdị m nnọọ ka aka nchebe Jehova ọ̀ na-amakụ m.” * Ọ̀ bụ na anyị adịghị enwe ekele n’ebe Jehova nọ maka inye anyị nri ime mmụọ n’oge ya? Cheta, ndokwa ya maka ọdịmma ime mmụọ anyị bụ ihe àmà na-egosi na ọ nọ anyị nso ma jiri ịhụnanya na-echebe anyị.

Ịbịakwute “Onye Na-anụ Ekpere”

14, 15. (a) Ngọzi dị aṅaa ka Jehova na-eji aka ya enye ndị nọ ya nso? (b) N’ihi gịnị ka mmadụ inwere onwe ya ịbịakwute Jehova n’ekpere ji bụrụ ihe ùgwù dị ịrịba ama?

14 Ị̀ chọpụtatụwo na ka ụmụ mmadụ na-enweta ike ọkpụkpụ aka na ike ọchịchị, ha na-abụkarị ndị ọ na-esiri ndị nọ n’okpuru ha ike ịbịakwute? Otú ọ dị, gịnị banyere Jehova Chineke? Ọ̀ nọ nnọọ n’ebe dị anya nke na ọ gaghị enwe mmasị n’okwu ụmụ mmadụ nkịtị na-agwa ya? Ọ dịghị ma ọlị! Onyinye nke ekpere bụ ngọzi ọzọ Jehova na-enye ndị nọ ya nso. Ịbụ ndị nweere onwe ha ịbịakwute “Onye na-anụ ekpere” bụ n’ezie ihe ùgwù dị ịrịba ama. (Abụ Ọma 65:2) N’ihi gịnị?

15 Iji maa atụ: Onyeisi nke nnukwu ụlọ ọrụ nwere ọtụtụ ibu ọrụ. Ọ na-ekpebi ihe ndị ọ ga-ahụ maka ha n’onwe ya na ndị ọ ga-enyefe ndị ọzọ. N’otu aka ahụ, Eze Na-achị eluigwe na ala nweere onwe ya ikpebi ihe ndị ọ ga-ahụ maka ha n’onwe ya na ndị ọ ga-enyefe ndị ọzọ. Cheedị banyere ihe nile Jehova nyefeworo n’aka Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya, bụ́ Jizọs. E nyewo Ọkpara ahụ “ikike ikpe ikpe.” (Jọn 5:27) E mewo ka ndị mmụọ ozi “nọrọ n’okpuru ya.” (1 Pita 3:22) E nyewo Jizọs mmụọ nsọ Jehova nke dị ike nke ukwuu inyere ya aka iduzi ndị na-eso ụzọ ya n’ụwa. (Jọn 15:26; 16:7) N’ihi ya, Jizọs pụrụ ikwu, sị: “E nyewo m ikike nile n’eluigwe na n’elu ụwa.” (Matiu 28:18) Otú ọ dị, mgbe a bịara n’ekpere anyị, Jehova ahọrọwo ịhụ maka ya n’onwe ya. Ọ bụ ya mere Bible ji agwa anyị ka anyị na-ekpegara nanị Jehova ekpere anyị, na-eme ya n’aha Jizọs.—Abụ Ọma 69:13; Jọn 14:6, 13.

16. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji nwee obi ike na Jehova na-aṅa ntị n’ekpere anyị n’ezie?

16 Jehova ọ̀ na-aṅa ntị n’ekpere anyị n’ezie? A sị na o nweghị mmasị n’ekpere anyị, ọ gaaraghị agba anyị ume ma ọlị ‘ịnọgidesi ike n’ekpere’ ma ọ bụ ịtụkwasị ya ibu arọ na nchegbu anyị. (Ndị Rom 12:12; Abụ Ọma 55:22; 1 Pita 5:7) Ndị ohu kwesịrị ntụkwasị obi n’oge Bible nwere obi ike zuru ezu na Jehova na-aṅa ntị n’ekpere. (1 Jọn 5:14) Ya mere, ọbụ abụ ahụ bụ́ Devid kwuru, sị: “[Jehova] ga-anụkwa olu m.” (Abụ Ọma 55:17) Anyị onwe anyị nwekwara ọtụtụ ihe mere anyị ga-eji nwee obi ike na Jehova nọ nso, dị njikere ịnụ echiche na nchegbu anyị nile.

Jehova Na-akwụghachi Ndị Ohu Ya Ụgwọ

17, 18. (a) Olee otú ozi ndị Jehova kere eke nwere ọgụgụ isi ji ikwesị ntụkwasị obi na-eje na-adị ya? (b) Kọwaa otú Ilu 19:17 si egosi na Jehova na-ama banyere omume obi ebere ndị anyị na-eme.

17 Ihe ụmụ mmadụ nkịtị pụrụ ime ma ọ bụ ghara ime adịghị emetụta ọnọdụ Jehova dị ka Eze Eluigwe na Ala. Otú o sina dị, Jehova bụ Chineke nwere ekele. O ji ozi ndị o kere eke nwere ọgụgụ isi ji ikwesị ntụkwasị obi na-eje kpọrọ ihe. (Abụ Ọma 147:11) Ya mere, nke a bụ uru ọzọ ndị nọ Jehova nso na-erite: Ọ na-akwụghachi ndị ohu ya ụgwọ.—Ndị Hibru 11:6.

18 Bible na-egosi n’ụzọ doro anya na Jehova ji ihe ndị na-efe ya ofufe na-eme akpọrọ ihe. Dị ka ihe atụ, anyị na-agụ, sị: “Onye na-ebinye Jehova ihe ka onye na-emere onye na-enweghị ike amara bụ, ọ bụkwa mmeso ọma ya ka Ọ ga-akwụghachi ya.” (Ilu 19:17) E gosipụtara otú Jehova si eji obi ebere echebara ndị na-enweghị ike echiche n’Iwu Mozis. (Levitikọs 14:21; 19:15) Olee otú ọ na-adị Jehova mgbe anyị ṅomiri ebere ya n’otú anyị si emeso ndị na-enweghị ike ihe? Mgbe anyị na-enye ndị na-enweghị ike ihe, n’achọghị ka ha kwụghachi anyị ya, Jehova na-ele ya anya dị ka ego anyị binyere Ya. Jehova na-ekwe nkwa iji ihu ọma na ngọzi kwụọ ụgwọ ahụ. (Ilu 10:22; Matiu 6:3, 4; Luk 14:12-14) Ee, mgbe anyị gosiri ọmịiko n’ebe ndị anyị na ha na-efekọ ofufe bụ́ ndị nọ ná mkpa nọ, ọ na-emetụ Jehova n’obi. Lee ka anyị si enwe ekele ịmara na Nna anyị nke eluigwe na-ama banyere omume obi ebere ndị anyị na-eme!—Matiu 5:7.

19. (a) N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji jide n’aka na Jehova ji ihe ndị anyị na-eme n’ọrụ nkwusa na nke ime ndị na-eso ụzọ akpọrọ ihe? (b) Olee otú Jehova si akwụ ụgwọ maka ozi e jere n’ịkwado Alaeze ya?

19 Jehova ji ihe ndị anyị na-eme n’ihi Alaeze ya kpọrọ ihe karịsịa. Mgbe anyị bịaruru Jehova nso, ọ bụ nnọọ ihe dị otú o kwesịrị na anyị ga-achọ iji oge, ume, na ihe onwunwe anyị mee ihe iji kere òkè zuru ezu dị ka o kwere mee n’ọrụ nkwusa Alaeze na nke ime ndị na-eso ụzọ. (Matiu 28:19, 20) Mgbe ụfọdụ, ọ pụrụ ịdị anyị ka ihe anyị na-arụzu ọ̀ dị nta. Obi anyị na-ezughị okè pụrụ ọbụna ime ka anyị chewe ma Jehova o nwere obi ụtọ ná mgbalị anyị. (1 Jọn 3:19, 20) Ma Jehova ji onyinye ọ bụla sitere n’obi nke ịhụnanya kpaliri—n’agbanyeghị otú ọ dịruru ná nta—akpọrọ ihe. (Mak 12:41-44) Bible na-emesi anyị obi ike, sị: “Chineke abụghị onye ajọ omume ichefu ọrụ unu na ịhụnanya unu gosiri maka aha ya.” (Ndị Hibru 6:10) N’ezie, Jehova na-echeta ọbụna ozi kasị nta anyị jere iji kwado Alaeze ya ma na-akwụghachi anyị ụgwọ maka ya. Tụkwasị ná ngọzi ime mmụọ ndị bara ụba anyị ga-enweta ugbu a, anyị pụrụ ilepụ anya n’ihu gaa n’ọṅụ nke ndụ a ga-adị n’ime ụwa ọhụrụ na-abịanụ, bụ́ ebe Jehova ga-eji mmesapụ aka saghee aka ya ma mejuo ọchịchọ ezi omume nke ndị nile nọ ya nso!—Abụ Ọma 145:16; 2 Pita 3:13.

20. N’ime afọ 2003 dum, olee otú anyị pụrụ isi buru okwu ndị dị n’isiokwu dịịrị afọ anyị n’uche, gịnịkwa ga-esi na ya pụta?

20 N’ime afọ 2003 dum, ka anyị na-ajụ onwe anyị ma ànyị na-anọgide na-eme mgbalị ịbịaru Nna anyị nke eluigwe nso. Ọ bụrụ na anyị na-eme otú ahụ, anyị pụrụ ijide n’aka na ọ ga-eme dị ka o kwere ná nkwa. E kwuwerị, ‘Chineke apụghị ịgha ụgha.’ (Taịtọs 1:2) Ọ bụrụ na ị bịaruo ya nso, ọ ga-abịaru gị nso. (Jems 4:8) Gịnịkwa ga-esi na ya pụta? Ọ bụ ngọzi bara ụba ugbu a na atụmanya nke ịnọgide na-abịaru Jehova nso ruo mgbe ebighị ebi!

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 13 Ihe e kwuru banyere isiokwu bụ́ “Jehova Ka Obi Anyị Ukwuu,” dị ná mbipụta Ụlọ Nche nke May 1, 2000, peeji nke 28-31.

Ị̀ Na-echeta?

• Onyinye dị aṅaa ka Jehova na-enye ndị na-abịaru ya nso?

• Ndokwa ndị dị aṅaa ka Jehova na-eme iji chebe ndị ya n’ụzọ ime mmụọ?

• N’ihi gịnị ka mmadụ inwere onwe ya ịbịakwute Jehova n’ekpere ji bụrụ ihe ùgwù dị ịrịba ama?

• Olee otú Bible si egosi na Jehova ji ozi ndị o kere eke nwere ọgụgụ isi ji ikwesị ntụkwasị obi na-eje akpọrọ ihe?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 15]

Jehova agọziwo anyị site n’ime ka anyị ghọta eziokwu ime mmụọ

[Foto ndị dị na peeji nke 16, 17]

Jehova na-enye nchebe ime mmụọ

[Foto dị na peeji nke 18]

Jehova nọ nso, dị njikere ịnụ ekpere anyị nile