Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

N’ihi gịnị ka Bible ji kwuo na mmadụ kwesịrị iti mkpu ma ọ bụrụ na a chọọ idina ya n’ike?

Onye ọ bụla nke na-enwebeghị ahụmahụ nke oké egwu ịbụ onye e ji obi ọjọọ dinaa n’ike na-akpata apụtụghị ịghọta otú o si etighasị ndụ mmadụ. Ahụmahụ ahụ na-emenye onye ahụ e dinara n’ike egwu nke ukwuu nke na ọ pụrụ inye ya nsogbu n’obi ruo ogologo ndụ ya fọdụrụnụ. * Otu nwa agbọghọ bụ́ Onye Kraịst bụ́ onye onye na-edina mmadụ n’ike wakporo afọ ole na ole gara aga na-akọ, sị: “Ụdị egwu tụrụ m n’abalị ahụ nakwa mkpasasị uche m nọgidere na-enwe kemgbe ahụ abụghị ihe e ji ọnụ akọ.” N’ụzọ kwere nghọta, ọtụtụ ndị na-ahọrọ ịghara ọbụna iche banyere ihe a na-emenye egwu. N’agbanyeghị nke ahụ, iyi egwu nke ndina n’ike dị adị n’ajọ ụwa a.

Bible ezoghị ọnụ n’ịkọ banyere ndị e dinara n’ike na ndị a chọrọ idina n’ike n’oge gara aga. (Jenesis 19:4-11; 34:1-7; 2 Samuel 13:1-14) Ma o nyekwara ndụmọdụ banyere ihe mmadụ kwesịrị ime mgbe a chọrọ idina ya n’ike. A na-achọta ihe Iwu ahụ na-ekwu banyere nke a na Deuterọnọmi 22:23-27. Nke a metụtara ọnọdụ abụọ. Na nke mbụ, nwoke hụrụ nwa agbọghọ n’obodo ma soro ya dinaa. Otú ọ dị, nwanyị ahụ etighị mkpu maka enyemaka. N’ihi ya, e kpebiri na ikpe mara ya “n’ihi na o tighị mkpu n’obodo.” A sị na o tiri mkpu, ndị nọ nso pụrụ inwewo ike ịbịa napụta ya. N’ọnọdụ nke abụọ, nwoke hụrụ nwa agbọghọ n’ọhịa, bụ́ ebe ọ nọ “jigide ya n’ike, soro ya dinaa.” Iji zọọ onwe ya, nwanyị ahụ “tiri mkpu, ma ọ dịghị onye nzọpụta o nwere.” N’adịghị ka nwanyị ahụ e kwuru banyere ya n’ọnọdụ nke mbụ ahụ, o doro anya na nwanyị a ekwenyeghị n’omume nke onye mwakpo ahụ. O guzogidesiri ya ike, na-eti mkpu maka enyemaka, ma ọ karịrị ya ike. Mkpu o tiri gosiri na o kwenyeghị; ikpe ime ihe ọjọọ amaghị ya.

Ọ bụ ezie na Ndị Kraịst taa anọghị n’okpuru Iwu Mozis, ụkpụrụ ndị dị na ya na-enye ha nduzi. Ihe ndekọ ahụ a kpọtụrụ uche n’elu na-emesi ike mkpa ọ dị iguzogide ya na iti mkpu maka enyemaka. A ka na-ele mmadụ iti mkpu mgbe a na-achọ idina ya n’ike anya dị ka ihe amamihe dị na ya. Otu ọkachamara n’ihe banyere igbochi mpụ kwuru, sị: “Ọ bụrụ na a wakpoo nwanyị, ngwá agha kasị mma o nwere ka bụ iti mkpu.” Nwanyị iti mkpu pụrụ ịdọta uche ndị ọzọ, bụ́ ndị pụziri inyere ya aka, ma ọ bụ ọ pụrụ imenye onye ahụ na-awakpo ya egwu ma mee ka ọ pụọ. Otu nwa agbọghọ bụ́ Onye Kraịst nke onye na-edina mmadụ n’ike wakporo kwuru, sị: “Eji m ike m nile tie mkpu, ọ hapụkwara m. Mgbe ọ bịawara ọzọ, etiri m mkpu ma gbalaga. Tupu mgbe ahụ, echewo m mgbe mgbe sị, ‘Olee otú iti mkpu pụrụ isi nyere m aka mgbe nwoke gbara dimkpa jidere m na-ebu n’uche ime nanị otu ihe?’ Ma achọpụtawo m na ọ dị irè!”

Ọbụna n’ọnọdụ dị mwute nke a karịrị nwanyị ike ma dinaa ya n’ike, ọnwụ o siri na mkpu o tiri maka enyemaka abụghị n’efu. N’ụzọ dị iche, ọ na-egosi na o mere ihe nile ọ pụrụ ime iji guzogide onye mwakpo ahụ. (Deuterọnọmi 22:26) N’agbanyeghị na e dinara ya n’ike, ọ ka pụrụ inwe akọ na uche dị ọcha, ùgwù onwe onye, ma bụrụ onye obi siri ike na ya dị ọcha n’anya Chineke. Ahụmahụ ahụ na-emenye ụjọ pụrụ ime ka ọ nọgide na-enwe nsogbu mmetụta uche, ma ịmara na ya mere ihe nile ya pụrụ ime iji guzogide mwakpo ahụ ga-enyere ya aka nke ukwuu iji nwayọọ nwayọọ na-agbake.

N’ịghọta ụzọ a pụrụ isi tinye ihe dị na Deuterọnọmi 22:23-27 n’ọrụ, anyị aghaghị ịghọta na ihe ndekọ a dị mkpirikpi ekwughị ihe a ga-eme n’ọnọdụ ọ bụla pụrụ ịdapụta. Dị ka ihe atụ, ọ dịghị ekwu banyere ọnọdụ ebe nwanyị ahụ a wakporo na-apụghị iti mkpu n’ihi na ọ dara ogbi, tụbọọ atụbọọ, ma ọ bụ bụrụ onye oké ụjọ ji ma ọ bụ onye a manyere ịghara iti mkpu site n’iji aka kpuchie ma ọ bụ iji teepu machie ọnụ. Otú ọ dị, ebe ọ bụ na Jehova nwere ike ịtụle ihe nile merenụ, gụnyere ihe e bu n’obi, ọ na-eji nghọta na ikpe ziri eme ihe n’ọnọdụ ndị dị otú ahụ, n’ihi na “ụzọ Ya nile bụ ikpe ziri ezi.” (Deuterọnọmi 32:4) Ọ maara kpọmkwem ihe merenụ nakwa mgbalị onye ahụ e dinara n’ike mere iji guzogide onye wakporo ya. N’ihi ya, onye e dinara n’ike nke na-enweghị ike iti mkpu ma o mere ihe nile o nwere ike ime n’ọnọdụ ndị ọ nọ na ha, pụrụ ịhapụrụ Jehova okwu.—Abụ Ọma 55:22; 1 Pita 5:7.

N’agbanyeghị nke ahụ, ụfọdụ ndị inyom bụ́ Ndị Kraịst bụ́ ndị a wakporo ma dinaa n’ike nọgidere na-enwe obi ọmụma ikpe. N’ịtụgharị uche banyere ihe merenụ, ha na-eche na ha gaara emekwu ihe iji gbochie nke ahụ ime. Otú ọ dị, kama ịtawa onwe ha ụta, ndị dị otú ahụ pụrụ ikpegara Jehova ekpere, rịọ maka enyemaka, ma nwee obi ike na ọ ga-egosipụta obiọma sitere n’ịhụnanya ya n’ebe ha nọ.—Ọpụpụ 34:6; Abụ Ọma 86:5.

N’ihi ya, ndị inyom bụ́ Ndị Kraịst bụ́ ndị na-anagide ihe mgbu nke uche n’ihi mwakpo nke onye na-edina mmadụ n’ike wakporo ha pụrụ inwe obi ike na Jehova na-aghọta nke ọma mwute ha na-enwe. Okwu Chineke na-emesi ha obi ike, sị: “Jehova nọ nso ndị obi ha tiwara etiwa, Ọ na-azọpụtakwa ndị a zọpịaworo n’ime mmụọ ha.” (Abụ Ọma 34:18) Ha pụrụ inwetakwu enyemaka iji nagide mkpasasị uche ha site n’ịnakwere ezi nghọta na nkwado ndị kwere ekwe ibe ha nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst ji obiọma na-enye ha. (Job 29:12; 1 Ndị Tesalonaịka 5:14) Ọzọkwa, mgbalị ndị ahụ a wakporo n’ike na-eme iji nọgide na-enwe echiche ziri ezi ga-enyere ha aka inwe “udo nke Chineke nke karịrị echiche nile.”—Ndị Filipaị 4:6-9.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Ọ bụ ezie na isiokwu a na-ekwu banyere ndị inyom e dinara n’ike, ụkpụrụ ndị a tụlere na ya metụtakwara ndị ikom a na-achọ idina n’ike.