Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jehova—Chineke nke Kwesịrị Ka A Mara Ya

Jehova—Chineke nke Kwesịrị Ka A Mara Ya

Jehova—Chineke nke Kwesịrị Ka A Mara Ya

Ọ̀ PỤRỤ ịbụ na ọ dị ihe dị mkpa na-efunahụ gị ná ndụ? Ọ bụrụ na i nwere ihe ọmụma dị nta banyere Chineke, mgbe ahụ, n’ezie ọ dị. N’ihi gịnị? N’ihi na, dị ka ọtụtụ nde mmadụ chọpụtaworo, ịmara Chineke nke Bible na-eweta abamuru ndị gbara ọkpụrụkpụ ná ndụ. A na-amalite irite uru ndị a ozugbo, ọ na-adịgidekwa ruo n’ọdịnihu.

Jehova Chineke, bụ́ Onye chepụtara Bible, chọrọ ka anyị bịa mara ya. Ọbụ abụ ahụ dere, sị: “Ka ha wee mara na Gị onwe gị, Onye aha Gị bụ Jehova, nanị Gị, bụ Onye kachasị ihe nile elu n’elu ụwa nile.” Ọ ghọtara na anyị ịmara ya bụ nnọọ maka ọdịmma anyị. “Mụ onwe m bụ Jehova, Chineke gị, Onye na-ezi gị ime ihe na-aba uru.” Olee otú anyị si erite uru site n’ịmara Jehova Chineke, bụ́ Onye Kachasị Ihe Nile Elu?—Abụ Ọma 83:18; Aịsaịa 48:17.

Otu ezigbo uru anyị na-erite bụ na anyị na-enweta nduzi banyere otú anyị ga-esi na-edozi nsogbu ndị anyị na-enwe kwa ụbọchị, na-enwe olileanya siri ike maka ọdịnihu, na obi iru ala. Ọzọkwa, ịmara Jehova nke ọma na-akpali anyị ịzụlite àgwà dị iche banyere ihe ndị kasị mkpa ndị mmadụ n’ụwa nile na-eche ihu taa. Olee ihe ndị ha bụ?

Ndụ Gị Ò Nwere Nzube?

N’agbanyeghị ọganihu dị ịrịba ama ihe a kpọrọ mmadụ nweworo na nkà na ụzụ, ndị mmadụ n’otu n’otu taa ka na-ajụ otu ajụjụ ndị ahụ dị mkpa: ‘N’ihi gịnị ka m ji nọrọ n’ebe a? Ebee ka m na-aga? Gịnị bụ nzube nke ndụ?’ Ọ bụrụ na mmadụ enwetaghị azịza ndị na-eju afọ, ndụ ya agaghị enwe ezi nzube. Ọtụtụ mmadụ hà na-achọpụta erughị eru a? Nnyocha e mere na Germany ná ngwụsị afọ ndị 1990 gosiri na ọkara nke ndị zaghachiri n’ajụjụ a jụrụ ha na-eche mgbe mgbe ma ọ bụ mgbe ụfọdụ na o yiri ka ndụ enweghị nzube. Ikekwe e nwere ọnọdụ yiri nke ahụ n’ebe i bi.

Ọ bụrụ na mmadụ enweghị nzube ná ndụ, ọ pụtara na o nweghị ntọala siri ike ọ ga-ewukwasị ihe mgbaru ọsọ ya. Ọtụtụ ndị na-anwa imeju ebe ndị a ha na-erughị eru site n’ịchụso ọrụ na-aga nke ọma ma ọ bụ site n’ịkpakọba akụ̀ na ụba. Ma, mmetụta nke ịbụ onye tọgbọ chakoo ha na-enwe pụrụ ịbụ ihe na-enye nsogbu n’obi. Enweghị nzube ná ndụ na-enyedị ụfọdụ ndị nsogbu n’obi nke na ha adịghịzi achọ ịdị ndụ. Otú ahụ ka ọ dị otu ọmarịcha nwa agbọghọ bụ́ onye, dị ka akwụkwọ akụkọ bụ́ International Herald Tribune si kọọ, a zụlitere “n’ezinụlọ bara nnọọ ọgaranya ma nwee ùgwù na-enweghị atụ.” Ọ bụ ezie na ọ nọ n’ikpo akụ̀, owu nọ na-ama ya, ọ dịkwa ya ka ndụ ya enweghị isi. Ọ ṅụrụ ọgwụ ụra, e buruzie ya n’ozu. Ị pụrụ ịma ndị ọzọ owu na-ama bụ́ ndị nwụrụ n’ụzọ dị mwute.

Otú ọ dị, ị̀ nụtụla ebe ndị mmadụ na-ekwu na sayensị pụrụ ịgwa anyị ihe nile banyere ndụ? Akwụkwọ akụkọ a na-ebipụta kwa izu na Germany bụ́ Die Woche na-ekwu, sị: “N’agbanyeghị otú sayensị pụrụ ikwuru eziokwu, ọ dịghị ike n’ụzọ ime mmụọ. Ozizi evolushọn yiri ihe ụmụaka, ọbụna physics nke nwere ngalaba dịgasị iche iche, tinyere imerime ihe ndị siri ike nkọwa banyere ya, adịghị enye nkasi obi na nchebe.” Ihe ndị sayensị chọpụtaworo enyewo aka nke ukwuu n’ịkọwa ndụ n’ụdị ya dịgasị iche iche nakwa n’ịkọwa usoro ndị sitere n’okike bụ́ ndị na-eme ka a nọgide na-adị ndụ. N’agbanyeghị nke ahụ, sayensị apụghị ịgwa anyị ihe mere anyị ji nọrọ n’ebe a na ebe anyị na-aga. Ọ bụrụ na anyị adabere nanị na sayensị, a gaghị aza ajụjụ ndị anyị na-ajụ banyere nzube nke ndụ. Ihe si na ya apụta bụ, dị ka akwụkwọ akụkọ bụ́ Süddeutsche Zeitung si kọọ, “mkpa nduzi nke zuru ebe nile.”

Olee onye nọ n’ọnọdụ ka mma inye nduzi dị otú ahụ karịa Onye Okike? Ebe ọ bụ ya debere ụmụ mmadụ n’ụwa na mbụ, ọ ghaghị ịma ihe mere ha ji nọrọ n’ebe a. Bible na-akọwa na Jehova kere ụmụ mmadụ ka ha wee nwee ike ịmụjupụta ụwa ma lekọta ya, na-abụ ndị e nyefere ya n’aka. N’ihe omume ha nile, ụmụ mmadụ gaje igosipụta àgwà ya ndị dị ka ikpe ziri ezi, amamihe, na ịhụnanya. Ozugbo anyị ghọtara ihe mere Jehova ji kee anyị, anyị na-amata ihe mere anyị ji nọrọ n’ebe a.—Jenesis 1:26-28.

Gịnị Ka Ị Pụrụ Ime?

Gịnị ma ọ bụrụ na, n’oge gara aga, i nwetaghị azịza na-eju afọ nye ajụjụ ndị bụ́: ‘N’ihi gịnị ka m ji nọrọ n’ebe a? Ebee ka m na-aga? Gịnị bụ nzube nke ndụ?’ Bible na-atụ aro ka ị bịa mara Jehova nke ọma. N’ezie, Jizọs kwuru, sị: “Nke a pụtara ndụ ebighị ebi, ha inweta ihe ọmụma banyere gị, bụ́ nanị ezi Chineke ahụ, nakwa banyere onye ahụ i zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.” A na-agbakwa gị ume ịzụlite àgwà ndị na-enye Chineke nsọpụrụ, karịsịa ịhụnanya, na ime ka ibi ndụ n’Alaeze Mezaịa Chineke nke na-abịanụ bụrụ ihe mgbaru ọsọ gị. Mgbe ahụ, ị ga-enwe nzube ná ndụ na olileanya dị ebube e ji n’aka maka ọdịnihu. Ajụjụ ndị ahụ bụ́ isi nọworo na-enye gị nsogbu n’obi ruo ugbu a ga-abụ ndị a zara ma eleghị anya.—Jọn 17:3; Eklisiastis 12:13.

Olee otú nke ahụ ga-esi enwe mmetụta n’ahụ́ gị? Hans bụ nwoke nke kwesịrị ịma. * Ọtụtụ afọ gara aga, o nwere nkwenkwe nkịtị banyere Chineke, ma okwukwe Hans adịghị emetụta ndụ ya. Hans nwere mmasị n’ọgwụ ọjọọ, ndị inyom na-eme omume rụrụ arụ, ụmụ obere mpụ, na ọgba tum tum. “Ma ndụ m tọgbọ chakoo, o jughị m afọ n’ezie,” ka ọ na-akọwa. Mgbe Hans dị ihe dị ka afọ 25, o kpebiri ịmara Chineke n’onwe ya site n’iji nlezianya gụọ Bible. Ozugbo Hans matara Jehova nke ọma ma ghọta ihe bụ́ nzube nke ndụ, ọ gbanwere ụzọ ndụ ya, e meekwa ya baptizim dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova. Ọ nọwo na-eje ozi oge nile n’ime afọ iri gara aga. O kwuru n’ezoghị ọnụ, sị: “Ijere Jehova ozi bụ ụzọ ndụ kasị mma. Ọ dịghị ihe ọ bụla ọzọ a ga-eji tụnyere ya. Ịmara Jehova emewo ka m nwee nzube ná ndụ.”

N’ezie, ọ bụghị nanị nzube nke ndụ bụ ihe na-enye ọtụtụ ndị nsogbu n’obi. Ka ọnọdụ ụwa na-akawanye njọ, ihe ọzọ dị mkpa na-enyekwu ndị mmadụ nsogbu n’obi.

N’ihi Gịnị Ka O Ji Mee?

Mgbe ọdachi dabaara mmadụ, otu ajụjụ na-adịkarị ya n’obi na-abụ: N’ihi gịnị ka o ji mee? Inwe ike ịnagide ọdachi n’ụzọ mmetụta uche na-adabere ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu n’ịmara azịza bụ́ eziokwu nye ajụjụ ahụ. Ọ bụrụ na e nwetaghị azịza na-eju afọ, nhụjuanya ahụ na-adịgide, onye ahụ na-ahụju anya pụkwara inwe obi ilu. Were ahụmahụ Bruni dị ka ihe atụ.

“Ụfọdụ afọ gara aga, nwa m nwanyị nwụrụ,” ka Bruni, onye bụzi nne katatụworo ahụ́, na-akọwa. “Ekweere m na Chineke, n’ihi ya, agakwuuru m ụkọchukwu nọ n’ógbè anyị iji nweta nkasi obi. Ọ gwara m na Chineke akpọrọwo Susanne gaa eluigwe, bụ́ ebe ọ bụzi mmụọ ozi. Ọ bụghị nanị na ọnwụ ya tisasịrị ndụ m kamakwa abịara m kpọọ Chineke asị maka ịkpọrọ ya.” Ihe mgbu na nhụjuanya Bruni dịgidere ruo ọtụtụ afọ. “E mesịa, otu n’ime Ndịàmà Jehova gosiri m site na Bible na ọ dịghị ihe mere m ga-eji kpọọ Chineke asị. Jehova akpọrọghị Susanne gaa eluigwe, ọ bụghịkwa mmụọ ozi. Ihe kpatara ọrịa ya bụ ezughị okè mmadụ. Susanne nọ n’ụra ọnwụ, na-echere ka Jehova kpọlite ya n’ọnwụ. Amụtakwara m na O mere ụmụ mmadụ ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi n’ụwa paradaịs, na a ga-emezu nzube ahụ n’isi nso. Ozugbo m malitere ịghọta ụdị onye Jehova bụ n’ezie, abịarukwuru m ya nso, ihe mgbu m malitekwara ibelata.”—Abụ Ọma 37:29; Ọrụ 24:15; Ndị Rom 5:12.

Ọdachi na-emetụta ọtụtụ nde mmadụ n’otu ụzọ ma ọ bụ n’ụzọ ọzọ: ọdachi onwe onye, agha, ụnwụ nri, ma ọ bụ ọdachi na-emere onwe ya. Bruni nwetara ahụ́ efe ozugbo ọ hụrụ site na Bible na ọ bụghị Jehova ka ụta dịịrị maka ọdachi, na ọ dịghị mgbe ọ bụla o zubere ka ihe a kpọrọ mmadụ na-ahụju anya, nakwa na ọ ga-eme ka ihe ọjọọ kwụsị n’isi nso. Eziokwu ahụ bụ́ na ajọ omume na-arịwanye elu bụ ihe ama na-egosi na anyị na-ebi ugbu a “n’ụbọchị ikpeazụ” nke usoro ihe a. Mgbanwe dị ịrịba ama nke ga-eme ka ihe ka mma bụ́ nke anyị nile na-atụ anya ya dị ezi nso.—2 Timoti 3:1-5; Matiu 24:7, 8.

Ịmara Chineke

Hans na Bruni amabughị Chineke nke ọma. Ha kweere na ya n’amachaghị banyere ya. Mgbe ha wepụtara oge iji mara Jehova nke ọma, mgbalị ha rụpụtara ihe dị mma. Ha nwetara azịza ndị dabara adaba nye ajụjụ ndị kasị mkpa n’oge anyị a. Nke a mere ka obi ruo ha ala, meekwa ka ha nwee olileanya e ji n’aka maka ọdịnihu. Ọtụtụ nde ndị ohu Jehova enwewo ahụmahụ yiri nke ahụ.

Ịmara Jehova na-amalite site n’iji nlezianya na-atụle Bible, bụ́ nke na-agwa anyị banyere ya nakwa banyere ihe ọ na-achọ n’aka anyị. Nke ahụ bụ ihe ụfọdụ ndị mere na narị afọ mbụ. Ọkọ akụkọ ihe mere eme na dibịa bụ́ Luk kọrọ na ndị nọ n’ọgbakọ ndị Juu dị na Biria, Gris, “ji ọchịchọ obi siri nnọọ ike nabata okwu ahụ [site n’aka Pọl na Saịlas], jiri nlezianya na-enyocha Akwụkwọ Nsọ kwa ụbọchị iji mara ma ihe ndị a hà dị otú ahụ.”—Ọrụ 17:10, 11.

Ndị Kraịst narị afọ mbụ zukọkwara ọnụ n’ọgbakọ dị iche iche. (Ọrụ 2:41, 42, 46; 1 Ndị Kọrint 1:1, 2; Ndị Galeshia 1:1, 2; 2 Ndị Tesalonaịka 1:1) Otú ahụ ka ọ dị taa. Ọgbakọ dị iche iche nke Ndịàmà Jehova na-ezukọ ọnụ maka nzukọ ndị a haziri n’ụzọ pụrụ iche iji nyere ndị mmadụ aka ịbịarukwu Jehova nso na inwe ọṅụ n’ijere ya ozi. Ị ga-eritekwa uru ọzọ site n’iso Ndịàmà nọ n’ógbè unu na-akpakọrịta. Ebe ọ bụ na ụmụ mmadụ na-eji nke nta nke nta adị ka Chi ha na-efe, Ndịàmà Jehova na-egosipụta—ọ bụ ezie na ọ bụ n’ụzọ a kpaara ókè—àgwà ndị Jehova n’onwe ya na-egosipụta. N’ihi ya, iso Ndịàmà na-ezukọ na-enyere anyị aka ịmatakwu Jehova nke ọma karị.—Ndị Hibru 10:24, 25.

Nke ahụ ò yiri itinye mgbalị dị ukwuu nanị iji mara otu Onye? Ọ chọrọ mgbalị n’ezie. Ma, ọ́ bụghị otú ahụ ka ọ dị n’ọtụtụ ihe ndị ị na-achọ inweta ná ndụ? Chegodị banyere mgbalị ọkachamara n’egwuregwu na-etinye n’inye onwe ya ọzụzụ. Dị ka ihe atụ, lee ihe Jean-Claude Killy, bụ́ onye France ritere ọlaedo maka iji mkpara ice na-agba ọsọ n’elu ice n’egwuregwu Olympic, na-ekwu banyere ihe ọ na-ewe iji bụrụ onye ga-enwe ihe ịga nke ọma n’asọmpi egwuregwu nke ọtụtụ mba na-enwe: “Ị ghaghị ịmalite afọ 10 tupu oge eruo ma mee atụmatụ maka ya ruo ọtụtụ afọ ma na-echebara ya echiche kwa ụbọchị . . . Ọ bụ ọrụ e ji uche na ọkpụkpụ aka arụ ụbọchị 365 n’afọ.” Oge na mgbalị nile ahụ bụ nanị iji sọọ mpi n’ọsọ pụrụ iwe nanị minit iri! Lee ka ihe a pụrụ inweta site n’ịmara Jehova si dị ukwuu—ma na-adịgide adịgide—karị.

Mmekọrịta nke Na-echiwanye Anya

Ọ̀ dị onye ga-achọ ka ihe dị mkpa funahụ ya ná ndụ? Ọ dịghị onye ọ bụ. N’ihi ya, ọ bụrụ na ọ na-adị gị ka ndụ gị enweghị ezi nzube ma ọ bụ ọ bụrụ na ị na-atụ anya inweta nkọwa banyere ihe mere ọdachi ji eme, mgbe ahụ, kpebisie ike ịmara Jehova, bụ́ Chineke nke Bible. Ịmara banyere ya pụrụ nnọọ ịgbanwe ndụ gị n’ụzọ ka mma ma na-adịgide adịgide.

Ọ̀ dị mgbe anyị ga-akwụsị ịmụ banyere Jehova? Ihe ndị nọworo na-ejere ya ozi ruo ọtụtụ iri afọ mụtaworo banyere ya na ihe ọhụrụ ndị ha nọgidere na-amụta banyere ya ka na-atụ ha n’anya. Ịmụta ihe ndị dị otú ahụ na-enye anyị obi ụtọ ma na-eme ka anyị na-abịarukwu ya nso mgbe nile. Ka anyị kwenye n’echiche Pọl onyeozi, bụ́ onye dere, sị: “Lee ịdị omimi nke akụ̀ na amamihe na ihe ọmụma nke Chineke! Lee otú ikpe ya si bụrụ ndị a na-apụghị inyochapụta enyochapụta na otú ụzọ ya si bụrụ ndị a na-apụghị ịchọpụta achọpụta! N’ihi na ‘ònye mataworo uche Jehova, ma ọ bụ ònye ghọworo onye ndụmọdụ ya?’”—Ndị Rom 11:33, 34.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 12 A gbanwewo aha ndị ahụ.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 5]

Ndị mmadụ n’otu n’otu ka na-ajụ otu ajụjụ ndị ahụ dị mkpa: ‘N’ihi gịnị ka m ji nọrọ n’ebe a? Ebee ka m na-aga? Gịnị bụ nzube nke ndụ?’

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 6]

“Ozugbo m malitere ịghọta ụdị onye Jehova bụ n’ezie, abịarukwuru m ya nso”

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 7]

“Ijere Jehova ozi bụ ụzọ ndụ kasị mma. Ọ dịghị ihe ọ bụla ọzọ a ga-eji tụnyere ya. Ịmara Jehova emewo ka m nwee nzube ná ndụ”