Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Tụkwasị Jehova Obi Gị Nile

Tụkwasị Jehova Obi Gị Nile

Tụkwasị Jehova Obi Gị Nile

“Ndị maara aha Gị ga-atụkwasị Gị obi.”—ABỤ ỌMA 9:10.

1, 2. Olee ụfọdụ ihe ndị mmadụ na-atụkwasị obi maka nchebe n’ụzọ na-enweghị isi?

TAA, mgbe ọtụtụ ihe na-eme ka ihe siere anyị ike, ọ bụ ihe dị otú o kwesịrị ịchọ onye ma ọ bụ ihe ga-enye anyị nchebe. Ụfọdụ na-eche na inwekwu ego ga-eme ka ọdịnihu ha bụrụ nke e ji n’aka, ma n’eziokwu, ego bụ ebe mgbaba a na-ejighị nnọọ n’aka. Bible na-ekwu, sị: “Onye na-atụkwasị obi n’akụ̀ ya, onye ahụ ga-ada.” (Ilu 11:28) Ndị ọzọ na-elegara ndị ndú bụ́ mmadụ anya, ma ọbụna ndị kasị mma n’ime ha na-emehie ihe. N’ikpeazụkwa, ha nile na-anwụ. N’ụzọ amamihe dị na ya, Bible na-asị: “Unu atụkwasịla obi n’ahụ́ ndị a maara aha ha, ma ọ bụ n’ahụ́ nwa nke mmadụ, onye ọ na-adịghị nzọpụta o nwere.” (Abụ Ọma 146:3) Okwu ndị ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ na-adọkwa anyị aka ná ntị megide ịtụkwasị obi ná mgbalị nke onwe anyị. Anyị onwe anyị kwa bụ nanị ‘ụmụ nke mmadụ.’

2 Aịzaịa onye amụma katọrọ ndị ndú mba Izrel n’oge ya n’ihi na ha tụkwasịrị obi ‘n’ebe mgbaba nke okwu ụgha.’ (Aịsaịa 28:15-17) Ka ha na-achọ nchebe, ha sooro mba ndị ha na ha gbara agbata obi jikọọ aka. Njikọ ndị dị otú ahụ bụ ndị a na-apụghị ịtụkwasị obi—ụgha. N’ụzọ yiri nke ahụ, ọtụtụ ndị ndú okpukpe taa na-eso ndị ọchịchị enwe mmekọrịta. Njikọ ndị ahụ ga-abụkwa “ụgha.” (Mkpughe 17:16, 17) Ha agaghị eweta nchebe na-adịgide adịgide.

Ezi Ihe Nlereanya nke Jọshụa na Keleb

3, 4. Olee otú ihe Jọshụa na Keleb kọrọ si dị iche n’ihe ndị nledo iri ndị nke ọzọ kọrọ?

3 Oleezi ebe anyị kwesịrị ilega anya maka nchebe? Ọ bụ n’otu ebe ahụ Jọshụa na Keleb legara anya n’oge Mozis. N’oge na-adịghị anya mgbe a tọhapụsịrị Izrel n’Ijipt, mba ahụ bịara dị njikere ịbanye Kenan, bụ́ Ala Nkwa ahụ. E zipụrụ ndị ikom 12 iledo ala ahụ, mgbe ụbọchị 40 gasịkwara, ha lọghachiri iji kọọ ihe ha jetara. Ọ bụ nanị mmadụ abụọ, bụ́ Jọshụa na Keleb, kwuru okwu ọma banyere atụmanya Izrel nwere ịbanye Kenan. Ndị ọzọ kwetara na ala ahụ bụ ihe a na-achọsi ike ma kwuo, sị: “Ndị bi n’ala ahụ dị ike, e wusikwara obodo nile ha ike . . . Anyị apụghị ịrịgo imegide ndị ahụ, n’ihi na ndị dị ike ka ha bụ karịa anyị.”—Ọnụ Ọgụgụ 13:27, 28, 31.

4 Ụmụ Izrel ṅara ndị nledo iri ahụ ntị ma malite ịtụ egwu, ruo n’ókè nke ịtamu ntamu megide Mozis. N’ikpeazụ, Jọshụa na Keleb ji oké mkpali kwuo, sị: “Ala ahụ nke anyị gabigaworo n’ime ya iledo ya, ala ahụ dị mma nke ukwuu nke ukwuu. Ọ bụrụ na ihe anyị atọọ Jehova ụtọ, Ọ ga-emekwa ka anyị baa n’ala nke a, Ọ ga-enyekwa anyị ya; bụ́ ala nke mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru n’ime ya. Nanị, unu enupụkwala isi n’aka Jehova, unu onwe unu atụkwala egwu ndị ala ahụ.” (Ọnụ Ọgụgụ 14:6-9) N’agbanyeghị nke ahụ, ụmụ Izrel jụrụ ige ntị, n’ihi ya kwa, e kweghị ka ha banye n’Ala Nkwa ahụ n’oge ahụ.

5. N’ihi gịnị ka Jọshụa na Keleb ji kọọ akụkọ ọma?

5 N’ihi gịnị ka Jọshụa na Keleb ji kọọ akụkọ ọma ebe ndị nledo iri ahụ kọrọ nke ọjọọ? Ndị nledo 12 ahụ dum hụrụ obodo ndị ahụ e wusiri ike na mba ndị ahụ kwụ chịm. Mmadụ iri ahụ kwuru eziokwu n’ịsị na Izrel adịghị ike ruo n’ókè nke imeri ala ahụ. Jọshụa na Keleb makwaara nke ahụ. Otú ọ dị, mmadụ iri ahụ lere ihe anya otú mmadụ si ele ihe anya. N’aka nke ọzọ, Jọshụa na Keleb tụkwasịrị Jehova obi. Ha ahụwo ọrụ ndị dị ike ọ rụrụ n’Ijipt, n’Oké Osimiri Uhie, n’akụkụ Ugwu Saịnaị. Leenụ, ọtụtụ iri afọ mgbe e mesịrị, nanị akụkọ banyere ihe ndị ahụ zuru iji kpalie Rehab nke Jeriko itinye ndụ ya n’ihe ize ndụ n’ihi ndị Jehova! (Joshua 2:1-24; 6:22-25) Jọshụa na Keleb, bụ́ ndị ji anya ha hụ ihe ndị Jehova rụrụ, nwere obi ike zuru ezu na Chineke ga-anọgide na-alụrụ ndị ya ọgụ. Afọ iri anọ mgbe e mesịrị, e gosipụtara na ha tụkwasịrị obi n’ebe kwesịrị ekwesị mgbe ọgbọ ọhụrụ nke ụmụ Izrel, n’okpuru idu ndú Jọshụa, zọọrọ njem banye Kenan ma merie ala ahụ.

Ihe Mere Anyị Kwesịrị Iji Tụkwasị Jehova Obi Kpam Kpam

6. N’ihi gịnị ka Ndị Kraịst taa ji na-enwe nrụgide, ònyekwa ka ha kwesịrị ịtụkwasị obi?

6 ‘N’oge ndị a pụrụ iche nke siri ike obibi,’ anyị onwe anyị, dị ka ụmụ Izrel, na-eche ndị iro dị ike karịa anyị ihu. (2 Timoti 3:1) A na-arụgide anyị n’omume, n’ụzọ ime mmụọ nakwa, mgbe ụfọdụ, ọbụna n’ụzọ anụ ahụ́. Anyị apụghị iguzogide nrụgide ndị ahụ n’ike nke aka anyị, ebe ọ bụ na ha na-esi n’aka onye karịrị mmadụ ike, bụ́ Setan Ekwensu. (Ndị Efesọs 6:12; 1 Jọn 5:19) Oleezi ebe anyị pụrụ inweta enyemaka? N’ekpere o kpekuru Jehova, otu nwoke kwesịrị ntụkwasị obi n’oge ochie kwuru, sị: “Ndị maara aha Gị ga-atụkwasị Gị obi.” (Abụ Ọma 9:10) Ọ bụrụ na anyị maara Jehova n’ezie ma ghọta ihe aha ya pụtara, anyị ga-atụkwasị ya nnọọ obi otú Jọshụa na Keleb si tụkwasị ya obi.—Jọn 17:3.

7, 8. Olee otú ihe ndị e kere eke si eme ka anyị nwee ihe ndị mere anyị ga-eji tụkwasị Jehova obi? (b) Olee ihe ndị Bible kwuru mere anyị ga-eji tụkwasị Jehova obi?

7 N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị ịtụkwasị Jehova obi? Otu n’ime ihe ndị mere Jọshụa na Keleb ji mee otú ahụ bụ n’ihi na ha ahụwo ebe ndị o gosipụtara ike ya. Anyị onwe anyị ahụwokwa ya. Dị ka ihe atụ, tụlee ihe ndị Jehova kere, gụnyere mbara igwe, na ọtụtụ ijeri ụyọkọ kpakpando ndị dị na ya. Nnukwu ikike ndị sitere n’okike Jehova na-achịkwa na-egosi na ọ bụ, n’ezie, Onye Pụrụ Ime Ihe Nile. Ka anyị na-atụgharị uche n’ihe ndị dị ebube e kere eke, anyị aghaghị ikwenyere Job, bụ́ onye kwuru banyere Jehova, sị: “Ònye ga-eme ka Ọ laghachi azụ? Ònye ga-asị Ya, Gịnị ka Ị na-eme?” (Job 9:12) N’eziokwu, ọ bụrụ na anyị na Jehova kwụ, ọ dịghị onye nọ n’eluigwe na ala anyị kwesịrị ịtụ egwu.—Ndị Rom 8:31.

8 Tụleekwa Okwu Jehova, bụ́ Bible. Ebe a e si enweta amamihe Chineke mgbe nile dị ike n’inyere anyị aka ịkwụsị omume ọjọọ ma mee ka ndụ anyị kwekọọ n’uche Jehova. (Ndị Hibru 4:12) Ọ bụ na Bible ka anyị si mara Jehova n’aha ma hụ ihe aha ya pụtara. (Ọpụpụ 3:14, NW) Anyị bịara mata na Jehova pụrụ ịghọ ihe ọ bụla ọ chọrọ—Nna na-ahụ n’anya, Onyeikpe ezi omume, Onye Agha na-enwe mmeri—iji mezuo nzube ya. Anyị na-ahụkwa otú okwu ya si emezu mgbe nile. Ka anyị na-amụ Okwu Chineke, a na-akpali anyị ikwu, dị ka ọbụ abụ ahụ kwuru, sị: “Atụkwasịwo m okwu Gị obi.”—Abụ Ọma 119:42; Aịsaịa 40:8.

9. Olee otú ihe mgbapụta ahụ na mbilite n’ọnwụ Jizọs si eme ka ntụkwasị obi anyị nwere n’ebe Jehova nọ sikwuo ike?

9 Ihe mgbapụta ahụ bụ ihe ọzọ mere a ga-eji tụkwasị Jehova obi. (Matiu 20:28) Lee ka o si magbuo onwe ya na Chineke zitere Ọkpara ya ịnwụ dị ka ihe mgbapụta n’ihi anyị! Ihe mgbapụta ahụ dịkwa ike n’ezie. Ọ na-ekpuchi mmehie nke ihe nile a kpọrọ mmadụ bụ́ ndị chegharịrị ma jiri ezi obi chigharịkwute Jehova. (Jọn 3:16; Ndị Hibru 6:10; 1 Jọn 4:16, 19) Otu n’ime ihe ndị e mere iji kwụọ ihe mgbapụta ahụ bụ ịkpọlite Jizọs n’ọnwụ. Ọrụ ebube ahụ, bụ́ nke ọtụtụ narị ndị ji anya ha hụ ya gbara akaebe ya, bụ ihe ọzọ mere a ga-eji tụkwasị Jehova obi. Ọ bụ ihe mmesi obi ike na olileanya anyị agaghị akụ afọ n’ala.—Ọrụ 17:31; Ndị Rom 5:5; 1 Ndị Kọrint 15:3-8.

10. Olee ihe ndị metụtara onwe onye mere anyị ga-eji tụkwasị Jehova obi?

10 Ihe ndị a bụ nanị ụfọdụ n’ime ihe ndị mere anyị pụrụ ma kwesị iji tụkwasị Jehova obi kpam kpam. E nwere ọtụtụ ihe ndị ọzọ, ụfọdụ n’ime ha bụ ndị metụtara onwe onye. Dị ka ihe atụ, site n’oge ruo n’oge, anyị nile na-eche ọnọdụ ndị tara akpụ ihu ná ndụ. Ka anyị na-achọ nduzi Jehova n’idozi ha, anyị na-ahụ otú nduzi ahụ si dị irè. (Jems 1:5-8) Ka anyị na-adabere n’ebe Jehova nọ ná ndụ anyị na-adị kwa ụbọchị ma na-ahụ ezi ihe na-esi na ya apụta, otú ahụ ka anyị na-atụkwasịkwu ya obi.

Devid Tụkwasịrị Jehova Obi

11. Devid tụkwasịrị Jehova obi n’agbanyeghị ọnọdụ ndị dị aṅaa?

11 Devid nke Izrel oge ochie bụ otu onye nke tụkwasịrị Jehova obi. Eze Sọl, bụ́ onye chọrọ igbu Devid, na usuu ndị agha dị ike nke Filistia, bụ́ ndị na-anwa imeri Izrel, yiri Devid egwu. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ lanahụrụ, ọbụnakwa nwee mmeri. N’ihi gịnị? Devid n’onwe ya na-akọwa, sị: “Jehova bụ ìhè m na nzọpụta m; ònye ka m ga-atụ egwu? Jehova bụ ebe siri ike nke ndụ m; ònye ka m ga-atụ oké egwu?” (Abụ Ọma 27:1) Anyị onwe anyị kwa ga-enwe ihe ịga nke ọma ma ọ bụrụ na anyị atụkwasị Jehova obi n’otu aka ahụ.

12, 13. Olee otú Devid si gosi na anyị kwesịrị ịtụkwasị Jehova obi ọbụna mgbe ndị mmegide ji ire ha mere ngwá agha ha ji alụso anyị ọgụ?

12 N’otu oge, Devid kpere ekpere, sị: “Chineke, nụrụ olu m n’ịtụgharị uche m: na-echezi ndụ m ka ọ pụọ n’oké egwu nke onye iro. Ị ga-ezopụ m n’izu nzuzo nke ndị na-eme ihe ọjọọ: n’ìgwè ndị na-arụ ajọ ihe: ndị mụworo ire ha dị ka mma agha, ha edowo akụ́ ha, bụ́ okwu dị ilu: ịgba onye zuru okè [“onye na-enweghị ụta,” NW] akụ́ n’ebe nzuzo dị iche iche.” (Abụ Ọma 64:1-4) Anyị ejighị n’aka ihe kpaliri Devid ide okwu ndị a. Ma anyị maara na taa, ndị mmegide ‘na-amụ ire ha’ n’ụzọ yiri nke ahụ, na-eji okwu eme ihe dị ka ngwá agha. Ha ‘na-agba’ Ndị Kraịst na-enweghị ụta akụ́, na-eji okwu ọnụ ma ọ bụ ihe ndị e dere ede eme ihe dị ka “akụ́” iji kọwahie anyị. Ọ bụrụ na anyị atụkwasị Jehova obi n’ụzọ siri ike, gịnị ga-esi na ya pụta?

13 Devid gara n’ihu ikwu, sị: “Chineke na-agba ha akụ́; na mberede ka ntigbu nile ha bụ. E wee mee ka ha sụọ ngọngọ, ebe ire nke aka ha na-emegide ha . . . Onye ezi omume ga-aṅụrị na Jehova, gbabakwa n’ime Ya.” (Abụ Ọma 64:7-10) Ee, ọ bụ ezie na ndị iro na-amụ ire ha megide anyị, n’ikpeazụ, “ire nke aka ha na-emegide ha.” N’ikpeazụ, Jehova na-eme ka ihe ga-esi na ya pụta bụrụ ihe ọma, ka ndị tụkwasịworo ya obi wee nwee ike ịṅụrị ọṅụ na Ya.

E Gosi na Hezekaịa Tụkwasịrị Obi n’Ebe Kwesịrị Ekwesị

14. (a) Hezekaịa tụkwasịrị Jehova obi n’agbanyeghị ọnọdụ ọjọọ dị aṅaa? (b) Olee otú Hezekaịa si gosi na ya ekwetaghị ụgha ahụ Asiria ghara?

14 Eze Hezekaịa bụ onye ọzọ e gosiri na ọ tụkwasịrị obi n’ebe kwesịrị ekwesị. N’oge Hezekaịa na-achị, usuu ndị agha dị ike nke Asiria yiri Jeruselem egwu. Usuu ndị agha ahụ emeriwo ọtụtụ mba ndị ọzọ. Ọbụna o meriwo obodo ndị dị na Juda ruo mgbe ọ fọdụrụ nanị Jeruselem, Senakerib tukwara ọnụ na ya ga-emerikwa obodo ahụ. Site n’ọnụ Rabshake, o mere ka ọ pụta ìhè—n’ụzọ ziri ezi—na ịtụkwasị Ijipt obi maka enyemaka ga-abụ ihe efu. Otú ọ dị, o kwuziri, sị: “Ekwela ka Chineke gị, Onye gị onwe gị na-atụkwasị obi, rafuo gị, sị, A gaghị enye Jeruselem n’aka eze Asiria.” (Aịsaịa 37:10) Otú ọ dị, Hezekaịa maara na Jehova adịghị arafu mmadụ. N’ihi ya, o kpere ekpere, na-asị: “Jehova, bụ́ Chineke anyị, zọpụta anyị n’aka [Asiria], ka alaeze nile nke ụwa wee mara na Gị onwe gị bụ Jehova, nanị Gị.” (Aịsaịa 37:20) Jehova gere ntị n’ekpere Hezekaịa. N’otu abalị, otu mmụọ ozi gburu ndị agha 185,000 nke Asiria. E bibighị Jeruselem, Senakerib hapụkwara ala Juda. Ndị nile nụrụ ihe a merenụ bịara mata banyere ịdị ukwuu Jehova.

15. Olee nanị ihe pụrụ inye aka kwadebe anyị maka ọnọdụ ọ bụla tara akpụ nke anyị pụrụ ịchọta onwe anyị na ya n’ụwa a na-akwụghị chịm?

15 Taa, dị ka Hezekaịa, anyị nọ n’ọnọdụ yiri nke agha. N’ọnọdụ nke anyị, agha ahụ bụ nke ime mmụọ. N’agbanyeghị nke ahụ, dị ka ndị agha ime mmụọ, ọ dị anyị mkpa ịzụlite nkà ndị ga-eme ka anyị lanahụ. Ọ dị anyị mkpa ịtụ anya mwakpo ma jikere ejikere ka anyị wee nwee ike ime ka ha ghara iru anyị ahụ́. (Ndị Efesọs 6:11, 12, 17) N’ụwa a na-akwụghị chịm, ọnọdụ pụrụ ịgbanwe na mberede. A pụrụ inwe ọgba aghara obodo na mberede. Mba ndị a maara dị ka ndị na-ekwe okpukpe nọrọ pụrụ ịghọ ndị na-adịghịzi ekwe okpukpe nọrọ. Ọ gwụla ma anyị kwadebe onwe anyị, dị ka Hezekaịa, site n’inwe ntụkwasị obi siri nnọọ ike n’ebe Jehova nọ, ka anyị ga-adị njikere maka ihe ọ bụla pụrụ ime.

Gịnị Ka Ịtụkwasị Jehova Obi Pụtara?

16, 17. Olee otú anyị si egosi na anyị tụkwasịrị Jehova obi?

16 Ịtụkwasị Jehova obi abụghị nanị ihe e ji ọnụ ekwu. Ọ bụ ihe anyị ji obi eme ma jiri omume na-egosipụta ya. Ọ bụrụ na anyị tụkwasịrị Jehova obi, anyị ga-atụkwasị obi kpam kpam n’Okwu ya, bụ́ Bible. Anyị ga na-agụ ya kwa ụbọchị, na-atụgharị uche na ya, ma na-ekwe ka ọ na-eduzi ndụ anyị. (Abụ Ọma 119:105) Ịtụkwasị Jehova obi na-agụnyekwa ịtụkwasị obi n’ike nke mmụọ nsọ. Site n’enyemaka nke mmụọ nsọ, anyị pụrụ ịmị mkpụrụ ndị na-atọ Jehova ụtọ, anyị pụkwara ifopụ àgwà ndị gbanyeworo mkpọrọgwụ. (1 Ndị Kọrint 6:11; Ndị Galeshia 5:22-24) N’ihi ya, site n’enyemaka nke mmụọ nsọ, ọtụtụ ndị enwewo ike ịkwụsị ise siga ma ọ bụ ịṅụ ọgwụ ọjọọ. Ndị ọzọ akwụsịwo ibi ndụ rụrụ arụ. Ee, ọ bụrụ na anyị tụkwasịrị Jehova obi, anyị ga na-eme ihe n’ike ya, ọ bụghị n’ike anyị.—Ndị Efesọs 3:14-18.

17 Ọzọkwa, ịtụkwasị Jehova obi pụtara ịtụkwasị ndị ọ tụkwasịrị obi obi. Dị ka ihe atụ, Jehova emewo ndokwa ka “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche” na-elekọta ihe ndị metụtara Alaeze ahụ n’ụwa. (Matiu 24:45-47) Anyị adịghị anwa ime echiche nke anyị, anyị adịghịkwa eleghara nhọpụta ahụ e mere anya, n’ihi na anyị tụkwasịrị obi ná ndokwa Jehova. Ọzọkwa, ndị okenye na-eje ozi n’ọgbakọ Ndị Kraịst dị n’ógbè dị iche iche, dịkwa ka Pọl onyeozi si kwuo, ọ bụ mmụọ nsọ họpụtara ha. (Ọrụ 20:28) Site n’ịkwado ndokwa nke inwe ndị okenye n’ọgbakọ, anyị na-egosikwa na anyị tụkwasịrị Jehova obi.—Ndị Hibru 13:17.

Na-agbaso Ihe Nlereanya Pọl

18. Olee otú Ndị Kraịst taa si agbaso ihe nlereanya Pọl, ma olee ebe ha na-adịghị atụkwasị obi?

18 Pọl onyeozi chere ọtụtụ nrụgide ihu n’ozi ya, dị nnọọ ka anyị na-eme. N’oge ya, a kọwahiere Iso Ụzọ Kraịst nye ndị ọchịchị, ọ gbalịkwara mgbe ụfọdụ ime ka a mara nke bụ́ eziokwu ma ọ bụ ime ka ọrụ nkwusa ahụ guzosie ike n’ụzọ iwu. (Ọrụ 28:19-22; Ndị Filipaị 1:7) Taa, Ndị Kraịst na-agbaso ihe nlereanya ya. N’ebe ọ bụla o kwere mee, anyị na-enyere ndị ọzọ aka ịmata banyere ọrụ anyị, na-eji ụzọ ọ bụla kwere omume eme ihe. Anyị na-arụkwa ọrụ iji gbachitere ozi ọma ahụ ma mee ka o guzosie ike n’ụzọ iwu. Otú ọ dị, anyị adịghị atụkwasị obi anyị dum ná mgbalị ndị dị otú ahụ, n’echiche bụ́ na anyị adịghị ewere ya na anyị inwe ihe ịga nke ọma ma ọ bụ ịkụ afọ n’ala na-adabere n’okwu ikpe ịlara anyị ma ọ bụ n’ịbụ ndị ọha na eze na-ekwu okwu ọma banyere ha. Kama nke ahụ, ọ bụ Jehova ka anyị na-atụkwasị obi. Anyị na-echeta agbamume o nyere Izrel oge ochie, sị: “N’ịnọ jụụ na n’ịtụkwasị obi ka ịdị ike unu ga-adị.”—Aịsaịa 30:15.

19. Mgbe a na-akpagbu ụmụnna anyị, olee otú e siworo gosi na obi ha tụkwasịrị Jehova kwesịrị ekwesị?

19 N’oge ụfọdụ n’akụkọ ihe mere eme anyị nke oge a, a machibidowo ọrụ anyị iwu ma ọ bụ tinye ihe mgbochi na ya n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ na n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Europe, n’akụkụ ụfọdụ nke Eshia na Africa, nakwa ná mba ndị dị n’Ebe Ndịda na n’Ebe Ugwu America. Nke a ọ̀ pụtara na obi anyị tụkwasịrị Jehova enweghị isi? Ee e. Ọ bụ ezie na o kwewo mgbe ụfọdụ ka a kpagbuo anyị n’ụzọ kpụ ọkụ n’ọnụ n’ihi nzube o lere anya dị ka nke kwesịrị ekwesị, Jehova ejiriwo ịhụnanya wusie ndị ahụ a kpagburu ike. Ka a na-akpagbu ha, ọtụtụ Ndị Kraịst egosipụtawo okwukwe na ntụkwasị obi n’ebe Chineke nọ n’ụzọ magburu onwe ya.

20. Ọ bụ ezie na nnwere onwe iwu kwadoro pụrụ ịbara anyị uru, olee ihe ndị anyị na-agatụghị akwụsị ime?

20 N’aka nke ọzọ, n’ala ka ọtụtụ, a nabatara ọrụ anyị n’ụzọ iwu, mgbe ụfọdụkwa, a na-ekwu okwu ọma banyere anyị n’usoro mgbasa ozi. Anyị na-enwe ekele maka nke a ma na-aghọta na nke a na-emezukwa nzube Jehova. N’ịbụ ndị Jehova gọziri, anyị na-eji nnwere onwe ahụ ka ukwuu ejere ya ozi n’ihu ọha na n’ụzọ zuru ezu, ọ bụghị iji ya na-akwalite ụzọ ndụ nke aka anyị. Otú ọ dị, anyị agatụghị akwụsị nnọpụiche anyị, selata aka n’ọrụ nkwusa anyị, ma ọ bụ si n’ụzọ ọ bụla ọzọ selata aka n’ozi anyị na-ejere Jehova, nanị n’ihi na anyị chọrọ ka ndị ọchịchị na-ekwu okwu ọma banyere anyị. Anyị bụ ndị Alaeze Mezaịa ga-achị, anyị dụnyesikwaara ọbụbụeze Jehova úkwù ike. Olileanya anyị abụghị n’usoro ihe a, kama ọ bụ n’ụwa ọhụrụ, bụ́ ebe Alaeze eluigwe nke Mezaịa ga-abụ nanị ọchịchị ga na-achị ụwa. Bọmbụ, ma ọ bụ mgbọ ogbunìgwè, ma ọ bụkwanụ ọbụna mwakpo nuklia apụghị ịkwa ọchịchị ahụ aka ma ọ bụ si n’eluigwe kwatuo ya. A pụghị imeri ya emeri, ọ ga-emezukwa nzube Jehova ji guzobe ya.—Daniel 2:44; Ndị Hibru 12:28; Mkpughe 6:2.

21. Olee ụzọ anyị kpebisiri ike ịgbaso?

21 Pọl na-ekwu, sị: “Anyị abụghị ụdị ndị na-asụla azụ gaa ná mbibi, kama ụdị ndị na-enwe okwukwe gaa n’ichebe mkpụrụ obi ndụ.” (Ndị Hibru 10:39) Ya mere, ka anyị nile jiri ikwesị ntụkwasị obi na-ejere Jehova ozi ruo ọgwụgwụ. Anyị nwere ọtụtụ ihe mere anyị ga-eji na-atụkwasị Jehova obi ugbu a nakwa ruo mgbe nile ebighị ebi.—Abụ Ọma 37:3; 125:1.

Gịnị Ka Ị Mụtara?

• N’ihi gịnị ka Jọshụa na Keleb ji welata akụkọ ọma?

• Olee ụfọdụ n’ime ihe ndị mere anyị ji kwesị ịtụkwasị Jehova obi kpam kpam?

• Gịnị ka ịtụkwasị Jehova obi pụtara?

• Gịnị ka anyị kpebisiri ike ime n’ihi ịtụkwasị Jehova obi?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 15]

N’ihi gịnị ka Jọshụa na Keleb ji kọọ akụkọ dị mma?

[Foto ndị dị na peeji nke 16]

Ihe ndị e kere eke na-eme ka anyị nwee ezigbo ihe mere anyị ga-eji na-atụkwasị Jehova obi

[Ebe E Si Nweta Foto]

Foto atọ a: Site n’aka Anglo-Australian Observatory, ọ bụ David Malin sere ha

[Foto dị na peeji nke 18]

Ịtụkwasị Jehova obi pụtara ịtụkwasị ndị ọ tụkwasịrị obi obi