Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ime Mkpebi Ihe Ịma Aka A Na-apụghị Izere Ezere

Ime Mkpebi Ihe Ịma Aka A Na-apụghị Izere Ezere

Ime Mkpebi Ihe Ịma Aka A Na-apụghị Izere Ezere

“Ọ DỊGHỊ ihe siri ike, n’ihi ya kwa, dị oké ọnụ ahịa karịa inwe ike ime mkpebi,” ka eze ukwu France, bụ́ Napoleon Bonaparte nke narị afọ nke 19 kwuru n’otu oge. Ị pụrụ ikweta akụkụ abụọ nke ihe ahụ o kwuru ebe ọ bụ na ndị mmadụ n’ozuzu na-eji inwe ikike nke ịchịkwa ndụ ha akpọrọ ihe. N’otu oge ahụ, ha achọpụtawo na ime mkpebi anaghị adị mfe mgbe ụfọdụ.

Ma ọ̀ dị mfe ma ò siri ike, ime mkpebi bụ ihe a na-apụghị izere ezere. Anyị na-eche ime mkpebi ihu kwa ụbọchị. Mgbe anyị tetasịrị ụra n’ụtụtụ, anyị aghaghị ikpebi ihe anyị ga-eyi, ihe anyị ga-eri n’ụtụtụ, na otú anyị ga-esi eme ọtụtụ ihe ndị ọzọ n’ụbọchị ahụ. Ihe ka ọtụtụ ná mkpebi ndị a adịchaghị mkpa. Anyị adịchaghị eche echiche ugboro abụọ banyere ha. Ọ dịghị echukarị anyị ụra ma hà bụ ndị amamihe dị na ha ma ọ bụ na ha abụghị.

N’aka nke ọzọ, mkpebi ụfọdụ na-emetụta nnọọ ọtụtụ ihe. Ọtụtụ ndị na-eto eto n’ụwa nke taa aghaghị ikpebi ihe mgbaru ọsọ ha ga-achụso. Ha pụrụ ikpebi ụdị agụmakwụkwọ dị ha mkpa nakwa ókè ha ga-agụru. E mesịa, ihe ka ọtụtụ n’ime ha ga-ekpebi ma hà ga-alụ di ma ọ bụ nwunye ma ọ bụ na ha agaghị alụ. Ndị chọrọ ịbanye n’alụmdi na nwunye aghaghị ikpebi: ‘Ètoruola m ịlụ di ma ọ bụ nwunye? Ụdị onye òtù ọlụlụ dị aṅaa ka m chọrọ, ma ọ bụ nke kasị mkpa, ụdị onye òtù ọlụlụ dị aṅaa dị m mkpa?’ Nhọrọ nke onye òtù ọlụlụ na-enwe mmetụta siri ike ná ndụ anyị karịa mkpebi ndị ọzọ.

Ọ dị mkpa ime mkpebi ndị amamihe dị na ha n’okwu ndị dị oké mkpa, ebe ọ bụ na anyị inwe obi ụtọ dabeere n’ụzọ buru ibu n’anyị ime otú ahụ. Ụfọdụ ndị pụrụ iche na ha ruru nnọọ eru ime ụdị mkpebi ndị ahụ, ha pụkwara ịjụ enyemaka mgbe a chọrọ inyere ha aka. Nke ahụ ọ̀ bụ ihe amamihe dị na ya? Ka anyị hụ.

[Ebe E Si Nweta Foto dị na peeji 3]

Napoleon: Site n’akwụkwọ bụ́ The Pictorial History of the World