Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Onyenwe Anyị, Kụziere Anyị Otú E Si Ekpe Ekpere”

“Onyenwe Anyị, Kụziere Anyị Otú E Si Ekpe Ekpere”

“Onyenwe Anyị, Kụziere Anyị Otú E Si Ekpe Ekpere”

“Otu n’ime ndị na-eso ụzọ ya sịrị ya: ‘Onyenwe anyị, kụziere anyị otú e si ekpe ekpere.’”—LUK 11:1.

1. N’ihi gịnị ka otu n’ime ndị na-eso ụzọ Jizọs ji rịọ Jizọs ka ọ kụziere ha otú e si ekpe ekpere?

N’OTU oge na 32 O.A., otu onye na-eso ụzọ Jizọs hụrụ ya ka Ọ na-ekpe ekpere. Ọ pụghị ịnụ ihe Jizọs na-agwa Nna ya, n’ihi na ma eleghị anya Ọ na-ekpe ya n’ime obi. Otú o sina dị, mgbe Jizọs kpechara, onye ahụ na-eso ụzọ gwara ya, sị: “Onyenwe anyị, kụziere anyị otú e si ekpe ekpere.” (Luk 11:1) Gịnị kpaliri arịrịọ a? Ekpere so n’ihe ndị Juu na-eme mgbe nile ná ndụ na n’ofufe ha. E nwekwara ọtụtụ ekpere n’akwụkwọ Abụ Ọma na n’ebe ndị ọzọ n’Akwụkwọ Nsọ Hibru. Ya mere, onye ahụ na-eso ụzọ adịghị arịọ ka a kụziere ya ihe ọ na-amaghị ma ọ bụ ihe ọ na-emetụbeghị. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọ maara banyere ekpere mmezu iwu nke ndị ndú okpukpe ndị Juu. Ma ugbu a o kiriwo Jizọs ka ọ na-ekpe ekpere, ọ chọpụtakwara ma eleghị anya na e nwere nnukwu ọdịiche n’etiti ekpere ime nsọ nsọ nke ndị rabaị na ụzọ Jizọs si kpee ekpere.—Matiu 6:5-8.

2. (a) Gịnị na-egosi na Jizọs ebughị n’uche ka anyị na-ekpeghachi ekpere nlereanya ahụ kpọmkwem otú o si kpee ya? (b) N’ihi gịnị ka anyị ji nwee mmasị n’ịma otú e si ekpe ekpere?

2 Ihe dị ka ọnwa 18 tupu mgbe ahụ, n’Ozizi Elu Ugwu ya, Jizọs enyewo ndị na-eso ụzọ ya ihe nlereanya ekpere ha ga na-adabere na ya. (Matiu 6:9-13) Ikekwe onye a na-eso ụzọ anọghị ya n’oge ahụ, n’ihi ya, Jizọs ji obiọma kwughachi isi ihe ndị dị mkpa n’ekpere nlereanya ahụ. Otu ihe pụtara ìhè bụ na o kwughachighị ya kpọmkwem otú o si kwuo ya na mbụ, na-egosi na ọ dịghị akụzi ekpere okpukpe a ga na-agụ n’isi. (Luk 11:1-4) Dị ka onye ahụ na-eso ụzọ nke a na-akpọghị aha, anyị chọkwara ka a kụziere anyị otú e si ekpe ekpere ka ekpere anyị wee na-adọtakwu anyị nso n’ebe Jehova nọ. Ya mere, ka anyị tụlee akụkụ ka zuo ezuo nke ekpere nlereanya ahụ, dị ka Matiu si dekọọ ya. Ihe mejupụtara ya bụ arịrịọ asaa, bụ́ ndị atọ n’ime ha metụtara nzube Chineke, ebe anọ metụtara mkpa ime mmụọ na nke anụ ahụ́ anyị. N’isiokwu a, anyị ga-atụle arịrịọ atọ mbụ.

Nna Na-ahụ n’Anya

3, 4. Gịnị ka anyị ịkpọ Jehova “Nna anyị” pụtara?

3 Site ná mmalite, Jizọs gosiri na ekpere anyị kwesịrị igosipụta mmekọrịta chiri anya ma bụrụ nke na-egosi nkwanye ùgwù nke anyị na Jehova. N’ikwu okwu n’ụzọ bụ́ isi maka abamuru nke ndị na-eso ụzọ ya bụ́ ndị nọdebere ya n’akụkụ ugwu ahụ, Jizọs gwara ha ka na na-akpọ Jehova “Nna anyị nke bi n’eluigwe.” (Matiu 6:9) Dị ka otu ọkà mmụta si kwuo, ma Jizọs ò kwuru okwu n’ụdị asụsụ Hibru ọtụtụ ndị na-asụ ma ọ bụ n’Aramaic, okwu o ji mee ihe maka “Nna” yiri okwu na-egosi nkekọ chiri anya nke nwatakịrị ji eme ihe, bụ́ ‘okwu ụmụaka.’ Ịkpọ Jehova “Nna anyị” na-egosi mmekọrịta na-ekpo ọkụ, nke dabeere ná ntụkwasịrịta obi.

4 Site n’ịsị “Nna anyị,” anyị na-ekwetakwa na anyị bụ akụkụ nke otu nnukwu ezinụlọ nke ndị ikom na ndị inyom bụ́ ndị nakweere Jehova dị ka Onye Na-enye Ndụ. (Aịsaịa 64:8; Ọrụ 17:24, 28) E kuchiri Ndị Kraịst e ji mmụọ nsọ mụta dị ka “ụmụ Chineke,” ọ bụkwa Ya ka ha pụrụ ‘itiku mkpu, sị: “Aba, Nna!”’ (Ndị Rom 8:14, 15) Ọtụtụ nde mmadụ aghọwo ndị enyi ha na-eguzosi ike n’ihe. Ndị a ararawo ndụ ha nye Jehova ma gosipụta nraranye ha site na baptizim ime mmiri. “Atụrụ ọzọ” a nile pụkwara ịbịakwute Jehova n’aha Jizọs ma kpọọ Ya “Nna anyị.” (Jọn 10:16; 14:6) Anyị pụrụ ijekwuru Nna anyị nke eluigwe mgbe nile n’ekpere iji too ya, iji kelee ya maka ngosipụta nile nke ịdị mma ya n’ebe anyị nọ, nakwa iji bugara ya ibu arọ anyị, na-enwe obi ike na ọ na-eche banyere anyị.—Ndị Filipaị 4:6, 7; 1 Pita 5:6, 7.

Ịhụnanya Maka Aha Jehova

5. Gịnị bụ arịrịọ mbụ nke ekpere nlereanya ahụ, n’ihi gịnịkwa ka nke a ji kwesị ekwesị?

5 Arịrịọ o ji malite gosiri ozugbo ihe kwesịrị ibute ụzọ. Ọ na-ekwu, sị: “Ka e doo aha gị nsọ.” (Matiu 6:9) Ee, ido aha Jehova nsọ kwesịrị ịbụ isi nchegbu anyị n’ihi na anyị hụrụ ya n’anya, anyị adịghịkwa enwe mmasị ịnụ nkọcha nile a na-akọcha aha ya. Nnupụisi Setan na ya ịraba di na nwunye mbụ ahụ n’inupụrụ Jehova Chineke isi wetaara aha Ya nkọcha site n’ime ka e nwee obi abụọ banyere otú Chineke si egosipụta ọbụbụeze eluigwe na ala ya. (Jenesis 3:1-6) Ọzọkwa, kemgbe ọtụtụ narị afọ, omume na ozizi na-eme ihere nke ndị na-azọrọ na ha na-anọchite anya ya ewetaworo aha Jehova nkọcha.

6. Gịnị ka anyị na-agaghị eme ma ọ bụrụ na anyị na-ekpe ekpere ka e doo aha Jehova nsọ?

6 Ekpere anyị maka ido aha Jehova nsọ na-egosi ebe anyị kwụ n’ihe iseokwu ahụ metụtara ọbụbụeze eluigwe na ala—na anyị na-akwadosi ike oruru o ruuru Jehova ịchị eluigwe na ala. Jehova chọrọ ka ndị e kere eke nwere ọgụgụ isi bụ́ ndị ji ọchịchọ obi na ọṅụ na-edo onwe ha n’okpuru ọbụbụeze ya n’ihi ịhụnanya ha nwere n’ebe ọ nọ ma hụ ihe nile aha ya pụtara n’anya, biri n’eluigwe na ala. (1 Ihe E Mere 29:10-13; Abụ Ọma 8:1; 148:13) Ịhụnanya anyị maka aha Jehova ga-enyere anyị aka izere ime ihe ọ bụla pụrụ iwetara aha nsọ ya nkọcha. (Ezikiel 36:20, 21; Ndị Rom 2:21-24) Ebe ọ bụ na udo nke eluigwe na ala na ndị bi n’ime ha dabeere n’ido aha Jehova nsọ na iji ịhụnanya na-edo onwe onye n’okpuru ọbụbụeze ya, ekpere anyị bụ́ “ka e doo aha gị nsọ” bụ ngosipụta nke obi ike anyị nwere na a ga-emezu nzube Jehova bụ́ nke ga-ewetara ya otuto.—Ezikiel 38:23.

Alaeze nke Anyị Na-ekpe Ekpere Maka Ya

7, 8. (a) Gịnị bụ Alaeze ahụ nke Jizọs kụziiri anyị ikpe ekpere banyere ya? (b) Gịnị ka anyị na-amụta banyere Alaeze a n’akwụkwọ Daniel na Mkpughe?

7 Arịrịọ nke abụọ n’ekpere nlereanya ahụ bụ: “Ka alaeze gị bịa.” (Matiu 6:10) Arịrịọ a na nke bu ya ụzọ nwere njikọ chiri anya. Ihe Jehova ga-eji edo aha ya nsọ bụ Alaeze Mezaịa ahụ, bụ́ ọchịchị eluigwe ya, nke Ọkpara ya, bụ́ Jizọs Kraịst, bụ Eze ya a họpụtara n’ụzọ kwesịrị ekwesị. (Abụ Ọma 2:1-9) Amụma Daniel kọwara Alaeze Mezaịa ahụ dị ka “nkume” e si n’otu “ugwu” wapụta. (Daniel 2:34, 35, 44, 45) Ugwu ahụ na-anọchi anya ọbụbụeze eluigwe na ala nke Jehova, n’ihi ya, nkume Alaeze ahụ bụ ngosipụta ọhụrụ nke ịchịisi eluigwe na ala nke Jehova. N’amụma ahụ, nkume ahụ mesịrị “ghọọ oké ugwu, jupụta ụwa nke a nile,” na-egosi na Alaeze Mezaịa ahụ ga-anọchi anya ọbụbụeze Chineke n’ịchị ụwa.

8 Ndị ha na Kraịst ga-eso chịa n’ọchịchị Alaeze a bụ 144,000 ndị ọzọ “e si n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ zụta” iso ya chịa dị ka ndị eze na ndị nchụàjà. (Mkpughe 5:9, 10; 14:1-4; 20:6) Daniel na-akpọ ndị a “ndị nsọ nke Onye ahụ nke kachasị ihe nile elu,” bụ́ ndị ha na Kraịst, dị ka Onyeisi ha, natara “alaeze ahụ, na ọchịchị ahụ, na ịdị ukwuu nke alaeze nile n’okpuru eluigwe nile . . . alaeze ya bụ alaeze ebighị ebi, ọchịchị nile ga-efekwa Ya, nụ olu Ya.” (Daniel 7:13, 14, 18, 27) Nke a bụ ọchịchị eluigwe ahụ nke Kraịst kụziiri ụmụazụ ya ikpe ekpere banyere ya.

N’ihi Gịnị Ka A Ka Ga-eji Na-ekpe Ekpere Ka Alaeze ahụ Bịa?

9. N’ihi gịnị ka o ji kwesị ekwesị ka anyị na-ekpe ekpere ka Alaeze Chineke bịa?

9 N’ekpere nlereanya ya, Kraịst kụziiri anyị ikpe ekpere ka Alaeze Chineke bịa. Mmezu nke amụma Bible na-egosi na e guzobere Alaeze Mezaịa ahụ n’eluigwe na 1914. * Mgbe ahụ, ọ̀ ka kwesịrị ekwesị anyị ịdị na-ekpe ekpere ka Alaeze ahụ “bịa”? Kpọmkwem. N’ihi na n’amụma Daniel, Alaeze Mezaịa ahụ, nke nkume sere onyinyo ya, na-aga izute ọchịchị ụmụ mmadụ, nke otu nnukwu ihe oyiyi sere onyinyo ya. Nkume ahụ ka ga-adakwasị ihe oyiyi ahụ, na-akụri ya ka ọ ghọọ ntụ. Amụma Daniel na-ekwu, sị: “Ọ bụkwa ọbụbụeze ya ka a na-agaghị ahapụrụ ndị ọzọ; ọ ga-etipịa alaeze ndị a nile mee ka ha gwụsịa, ma ya onwe ya ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi.”—Daniel 2:44.

10. N’ihi gịnị ka o ji agụsi anyị agụụ ike ka Alaeze Chineke bịa?

10 Ọ na-agụsi anyị agụụ ike ịhụ ka Alaeze Chineke bịakwasịrị ajọ usoro ihe Setan n’ihi na nke a ga-apụta ido aha nsọ Jehova nsọ na iwepụ ndị nile na-emegide ọbụbụeze Chineke. Anyị na-ekpesi ekpere ike, sị: “Ka alaeze gị bịa,” anyị sokwa Jọn onyeozi na-asị: “Amen! Bịa, Onyenwe anyị Jizọs.” (Mkpughe 22:20) Ee, ka Jizọs bịa doo aha Jehova nsọ ma gosipụta oruru o ruuru Ya ịbụ eze, ka okwu ọbụ abụ ahụ wee nwee ike imezu nke bụ́: “Ka ha wee mara na Gị onwe gị, Onye aha Gị bụ Jehova, nanị Gị, bụ Onye kachasị ihe nile elu n’elu ụwa nile.”—Abụ Ọma 83:18.

“Ka Uche Gị Meekwa”

11, 12. (a) Gịnị ka anyị na-arịọ mgbe anyị na-ekpe ekpere ka uche Chineke “meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe”? (b) Gịnị ọzọ ka ekpere anyị ka uche Jehova mee pụtara?

11 Ọzọ, Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ikpe ekpere, sị: “Ka uche gị meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.” (Matiu 6:10) Eluigwe na ụwa malitere ịdị n’ihi uche Jehova. Ndị e kere eke dị ike nọ n’eluigwe na-eti mkpu, sị: “I kwesịrị ekwesị, Jehova, ọbụna Chineke anyị, ịnata otuto na nsọpụrụ na ike, n’ihi na i kere ihe nile, ọ bụkwa n’ihi ọchịchọ gị ka ha ji dịrị, ka e jikwa kee ha.” (Mkpughe 4:11) Jehova nwere nzube maka “ihe ndị dị n’eluigwe na ihe ndị dị n’ụwa.” (Ndị Efesọs 1:8-10) Site n’ikpe ekpere ka uche Chineke mee, ihe anyị na-arịọ Jehova bụ ka o mezuo nzube ya. Tụkwasị na nke ahụ, anyị si otú ahụ na-egosi na ọ na-agụsi anyị agụụ ike ịhụ ka a na-eme uche Chineke n’eluigwe na ala.

12 Site n’ekpere a, anyị na-egosipụtakwa na anyị dị njikere ibi ndụ anyị n’ụzọ kwekọrọ n’uche Jehova. Jizọs kwuru, sị: “Ihe oriri m bụ ka m mee uche nke onye ahụ zitere m nakwa ka m rụchaa ọrụ ya.” (Jọn 4:34) Dị ka Jizọs, ọ na-atọ anyị bụ́ Ndị Kraịst raara onwe ha nye ụtọ ime uche Chineke. Ịhụnanya anyị nwere n’ebe Jehova na Ọkpara ya nọ na-akpali anyị ibi ndụ anyị “ọ bụkwaghị maka ọchịchọ mmadụ, kama maka uche Chineke.” (1 Pita 4:1, 2; 2 Ndị Kọrint 5:14, 15) Anyị na-agbalịsi ike izere ime ihe ndị anyị maara na ha megidere uche Jehova. (1 Ndị Tesalonaịka 4:3-5) Site n’ịzụpụta oge maka ọgụgụ na ọmụmụ Bible, anyị ‘na-anọgide na-aghọta ihe uche Jehova bụ,’ bụ́ nke gụnyere anyị ikerechi òkè anya n’ikwusa “ozi ọma nke a nke alaeze.”—Ndị Efesọs 5:15-17; Matiu 24:14.

Uche Jehova n’Eluigwe

13. Olee otú e si na-eme uche Chineke ogologo oge tupu Setan enupụ isi?

13 A nọ na-emezu uche Jehova n’eluigwe ogologo oge tupu otu n’ime ụmụ ya ndị bụ́ mmụọ enupụrụ ya isi ma ghọọ Setan. Akwụkwọ Ilu gosiri Ọkpara Chineke e bu ụzọ mụọ dị ka amamihe a kọwara dị ka mmadụ. Ọ na-egosi na ruo ọtụtụ afọ a na-apụghị ịgụta ọnụ, Ọkpara Chineke mụrụ nanị ya nọ ‘na-aṅụrị ọṅụ n’ihu ya mgbe nile,’ (NW) na-enwe obi ụtọ ime uche Nna ya. Mgbe e mesịrị, ọ ghọrọ “onye ọkà” nke Jehova n’ike ihe nile dị “n’eluigwe na n’elu ụwa, ihe ndị a pụrụ ịhụ anya na ihe ndị a na-apụghị ịhụ anya.” (Ilu 8:22-31; Ndị Kọlọsi 1:15-17) Jehova ji Jizọs mee ihe dị ka Okwu ya, ma ọ bụ Ọnụ Na-ekwuru ya.—Jọn 1:1-3.

14. Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta n’Abụ Ọma nke 103 banyere otú ndị mmụọ ozi si emezu uche Jehova n’eluigwe?

14 Ọbụ abụ ahụ na-egosi na ihe nile e kere eke nọ n’okpuru ọbụbụeze Jehova nakwa na ìgwè ndị mmụọ ozi na-ege ntị ná ntụziaka na iwu ya. Anyị na-agụ, sị: “Jehova emewo ka ocheeze Ya guzosie ike n’eluigwe; [ọbụbụeze, NW] Ya na-achịkwa ihe nile. Gọzienụ Jehova, ndị mmụọ ozi Ya, unu ndị dike dị ike, ndị na-eme okwu Ya, n’ige ntị olu nke okwu Ya. Gọzienụ Jehova, usuu ndị agha Ya nile; unu ndị na-ejere Ya ozi, ndị na-eme ihe na-atọ Ya ụtọ. Gọzienụ Jehova, unu ọrụ Ya nile, n’ebe nile Ọ na-achị [ma ọ bụ, “n’ebe nile ọbụbụeze ya ruru”].”—Abụ Ọma 103:19-22.

15. Olee otú Jizọs ịnata ike Alaeze si metụta ime uche Chineke n’eluigwe?

15 Mgbe Setan nupụsịrị isi, ọ ka nwere ike ịbanye n’eluigwe, dị ka e gosiri n’akwụkwọ Job. (Job 1:6-12; 2:1-7) Otú ọ dị, akwụkwọ Mkpughe buru amụma na oge na-abịa mgbe a ga-achụpụ Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya n’eluigwe. Ihe àmà na-egosi na oge ahụ bịara obere oge ka Jizọs Kraịst natasịrị ike Alaeze na 1914. Kemgbe ahụ, ndị nnupụisi ahụ enweghịzi ọnọdụ n’eluigwe. A kpaara ha ókè ịnọ nanị n’ụwa. (Mkpughe 12:7-12) Ọ dịghịzi olu onye mgbagha okwu a na-anụ n’eluigwe, ihe a na-anụ bụ nanị olu ndị gbakọrọ aka na-eto “Nwa atụrụ ahụ,” bụ́ Kraịst Jizọs, na ndị ji ido onwe onye n’okpuru na-eto Jehova. (Mkpughe 4:9-11) N’ezie, a na-emezu uche Jehova n’eluigwe.

Uche Jehova Maka Ụwa

16. Olee otú ekpere nlereanya ahụ si emegide ozizi Krisendọm banyere olileanya nke ihe a kpọrọ mmadụ?

16 Chọọchị dị iche iche nke Krisendọm na-agụpụ ụwa ná nzube Chineke, na-azọrọ na ndị ọma nile ga-aga eluigwe. Ma Jizọs kụziiri anyị ikpe ekpere, sị: “Ka alaeze gị bịa. Ka uche gị meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.” (Matiu 6:10) Ọ̀ dị ụzọ ọ bụla a pụrụ isi kwuo na a na-eme uche Jehova n’ụzọ zuru ezu taa n’ụwa nke ime ihe ike, ikpe na-ezighị ezi, ọrịa, na ọnwụ jupụtara? Ọ dịghị ma ọlị! N’ihi ya, anyị kwesịrị ịdị na-ekpesi ekpere ike ka uche Chineke mee n’ụwa, n’ikwekọ ná nkwa ahụ Pita onyeozi dekọrọ, nke bụ́: “E nwere eluigwe ọhụrụ [ọchịchị Alaeze Mezaịa ahụ site n’aka Kraịst] na ụwa ọhụrụ [ọha mmadụ bụ́ ndị ezi omume] ndị anyị na-echere dị ka nkwa ya si dị, ezi omume gajekwa ibi n’ime ha.”—2 Pita 3:13.

17. Gịnị bụ nzube Jehova maka ụwa?

17 Jehova nwere nzube o ji kee ụwa. O nyere Aịzaịa onye amụma ike mmụọ nsọ ide, sị: “Otú a ka Jehova Nke keworo eluigwe sịrị; Ya onwe ya bụ Chineke: Onye kpụworo ụwa, mee ya; Ya onwe ya mere ka o guzosie ike, ọ bụghị ihe tọgbọrọ n’efu ka O kere ya, ọ bụ ka e wee biri n’ime ya ka Ọ kpụrụ ya: Mụ onwe m bụ Jehova; ọ dịghịkwa Chineke ọzọ dị.” (Aịsaịa 45:18) Chineke tinyere di na nwunye mbụ ahụ n’ogige bụ́ paradaịs ma nye ha iwu, sị: “Mụọnụ ọmụmụ, baanụ ụba, jupụta ụwa, buda ya n’okpuru onwe unu.” (Jenesis 1:27, 28; 2:15) O doro nnọọ anya na nzube Onye Okike bụ ka agbụrụ mmadụ zuru okè bụ́ ndị na-eme ezi omume ma jiri obi ụtọ na-edo onwe ha n’okpuru ọbụbụeze Jehova, biri n’ụwa ma dị ndụ ebighị ebi na Paradaịs nke Kraịst kwere ná nkwa.—Abụ Ọma 37:11, 29; Luk 23:43.

18, 19. (a) Gịnị ka a na-aghaghị ime tupu uche Chineke emee n’ụwa n’ụzọ zuru ezu? (b) Olee akụkụ ndị ọzọ nke ekpere nlereanya Jizọs ndị anyị ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

18 A pụghị imezu nzube Jehova maka ụwa n’ụzọ zuru ezu ma ọlị mgbe ndị ikom na ndị inyom na-enupụrụ ọbụbụeze ya isi ka nọ n’ụwa. N’iji ìgwè ndị mmụọ dị ike bụ́ ndị Kraịst na-eduzi eme ihe, Chineke ‘ga-ebibi ndị na-ebibi ụwa.’ A ga-ekpochapụ ajọ usoro ihe nile nke Setan, ya na okpukpe ụgha ya, ọchịchị ya rụrụ arụ, azụmahịa anyaukwu na nke akwụwaghị aka ọtọ ya, na ndị agha ya na-ebibi ihe, ruo mgbe ebighị ebi. (Mkpughe 11:18; 18:21; 19:1, 2, 11-18) A ga-egosipụta oruru o ruuru Jehova ịbụ eze dookwa aha ya nsọ. Ihe a nile ka anyị na-ekpe ekpere maka ha mgbe anyị na-asị: “Nna anyị nke nọ n’eluigwe, ka e doo aha gị nsọ. Ka alaeze gị bịa. Ka uche gị meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.”—Matiu 6:9, 10.

19 Otú ọ dị, n’ekpere nlereanya ya, Jizọs gosiri na anyị pụkwara ikpe ekpere banyere ihe ndị metụtara anyị onwe anyị. A ga-atụle akụkụ ndị a nke ntụziaka o nyere banyere ekpere n’isiokwu na-esonụ.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 9 Lee isi nke 6 nke akwụkwọ bụ́ Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel!, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

Ná Ntụleghachi

• N’ihi gịnị ka o ji kwesị ekwesị anyị ịkpọ Jehova “Nna anyị”?

• N’ihi gịnị ka o ji dị oké mkpa ka anyị na-ekpe ekpere ka e doo aha Jehova nsọ?

• N’ihi gịnị ka anyị ji ekpe ekpere ka Alaeze Chineke bịa?

• Gịnị ka ọ pụtara mgbe anyị na-ekpe ekpere ka uche Chineke mee n’ụwa dị ka ọ na-eme n’eluigwe?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 9]

Ekpere Jizọs dị nnọọ iche n’ekpere ime nsọ nsọ nke ndị Farisii

[Foto dị na peeji nke 10]

Ndị Kraịst na-ekpe ekpere ka Alaeze Chineke bịa, ka e doo aha ya nsọ, ka e meekwa uche ya