Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Ohu” nke Kwesịrị Ntụkwasị Obi Ma Nwee Uche

“Ohu” nke Kwesịrị Ntụkwasị Obi Ma Nwee Uche

“Ohu” nke Kwesịrị Ntụkwasị Obi Ma Nwee Uche

“Ònye n’ezie bụ ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche, bụ́ onye nna ya ukwu mere onye na-elekọta ezinụlọ ya?”—MATIU 24:45.

1, 2. N’ihi gịnị ka o ji dị oké mkpa ka anyị na-enweta nri ime mmụọ n’ụzọ chiri anya taa?

N’EHIHIE Tuesday Naịsan 11, 33 O.A., ndị na-eso ụzọ Jizọs welitere ajụjụ nke nwere ihe dị ukwuu ọ pụtara nye anyị taa. Ha jụrụ ya, sị: “Gịnị ga-abụkwa ihe ịrịba ama nke ọnụnọ gị nakwa nke ngwụsị nke usoro ihe a?” Ná nzaghachi, Jizọs buru otu amụma dị ịrịba ama. O kwuru banyere oge ọgba aghara bụ́ mgbe a ga-enwe agha, ụnwụ nri, ala ọma jijiji, na ọrịa. Nke ahụ ga-abụkwa nanị “mmalite ihe ụfụ nke nhụjuanya.” Ihe ndị ka njọ ka ga-abịa. Lee atụmanya na-emenye egwu nke ahụ bụ!—Matiu 24:3, 7, 8, 15-22; Luk 21:10, 11.

2 Kemgbe 1914, e mezuwo akụkụ ka ukwuu nke amụma Jizọs. “Ihe ụfụ nke nhụjuanya” abịakwasịwo ihe a kpọrọ mmadụ n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị nnọọ ukwuu. Ma, ọ dịghị ezi Ndị Kraịst mkpa ịtụ egwu. Jizọs kwere nkwa na ya ga-eji nri ime mmụọ na-edozi ahụ́ na-azụ ha. Ebe Jizọs nọ n’eluigwe ugbu a, olee otú o siworo mee ndokwa ka anyị, bụ́ ndị nọ n’ụwa ebe a, na-enweta nri ime mmụọ?

3. Ndokwa dị aṅaa ka Jizọs meworo ka anyị wee na-enweta ‘nri n’oge kwesịrị ekwesị’?

3 Jizọs n’onwe ya zoro aka n’azịza nke ajụjụ ahụ. Ka ọ na-ebu oké amụma ya, ọ jụrụ, sị: “Ònye n’ezie bụ ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche, bụ́ onye nna ya ukwu mere onye na-elekọta ezinụlọ ya, inye ha nri ha n’oge kwesịrị ekwesị?” O kwuziri, sị: “Obi ụtọ na-adịrị ohu ahụ ma ọ bụrụ na nna ya ukwu abịarute wee hụ ya ka ọ na-eme otú ahụ! N’ezie asị m unu, Ọ ga-eme ya onye na-elekọta ihe nile o nwere.” (Matiu 24:45-47) Ee, a ga-enwe “ohu” nke e nyere ọrụ inye nri ime mmụọ, “ohu” nke ga-abụ ma onye na-ekwesị ntụkwasị obi ma onye nwere uche. Ohu ahụ ọ̀ bụ nanị otu onye, otu onye n’otu oge, ka ọ̀ dị ihe ọzọ ọ bụ? Ebe ọ bụ na ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi na-enye nri ime mmụọ nke dị oké mkpa, ọ ga-abụ maka ọdịmma anyị ịchọ azịza ya.

Otu Onye Ka Ọ̀ Bụ Òtù?

4. Olee otú anyị si mara na “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche” apụghị ịbụ otu onye?

4 “Ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche” apụghị ịbụ otu onye. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ohu ahụ malitere inye nri ime mmụọ laa azụ na narị afọ mbụ, dịkwa ka Jizọs kwuru, ohu ahụ ka ga na-eme otú ahụ mgbe Nna Ukwu ahụ ga-abịarute na 1914. Nke ahụ ga-abụ otu onye iji ikwesị ntụkwasị obi jee ozi ruo ihe dị ka afọ 1,900. Ọbụna Metusela adịrughị ogologo ndụ otú ahụ!—Jenesis 5:27.

5. Kọwaa ihe mere na okwu ahụ bụ́ “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche” adịghị ezo aka n’ebe Onye Kraịst nke ọ bụla nọ.

5 Mgbe ahụ, ọ̀ pụrụ ịbụ na n’echiche sara mbara okwu ahụ bụ́ “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche” na-ezo aka n’Onye Kraịst nke ọ bụla? Ọ bụ ezie na Ndị Kraịst nile aghaghị ikwesị ntụkwasị obi ma nwee uche; otú ọ dị, n’ụzọ doro anya, Jizọs bu ihe karịrị nke ahụ n’uche mgbe o kwuru banyere “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche.” Olee otú anyị si mara nke ahụ? Ọ bụ n’ihi na o kwuru na “ọ bụrụ na nna ya ukwu abịarute,” ọ ga-eme ya “onye na-elekọta ihe nile o nwere.” Olee otú a ga-esi mee Onye Kraịst nke ọ bụla onye na-elekọta ihe nile—ihe “nile” Onyenwe ya nwere? Ọ gaghị ekwe omume!

6. Olee otú e zubere ka mba Izrel si na-arụ ọrụ dị ka “ohu” Chineke?

6 Mgbe ahụ, nanị nkwubi okwu ezi uche dị na ya bụ na Jizọs na-ezo aka n’ebe otu òtù Ndị Kraịst nọ dị ka “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche.” À pụrụ inwe otu ohu nke ọtụtụ ndị mejupụtara? Ee. Narị afọ asaa tupu oge Kraịst, Jehova zoro aka n’ebe mba dum nke Izrel nọ dị ka “ndị àmà m” na “ohu m nke M họpụtara.” (Aịsaịa 43:10) Onye ọ bụla so ná mba Izrel site na 1513 T.O.A., bụ́ mgbe e nyere Iwu Mozis, ruo na Pentikọst 33 O.A., bụ akụkụ nke òtù ohu a. Ihe ka ọtụtụ ná ndị Izrel ekereghị òkè kpọmkwem n’ilekọta ihe omume nke mba ahụ ma ọ bụ ịhazi usoro nri ime mmụọ ya. Jehova ji ndị eze, ndị ikpe, ndị amụma, na ndị Livaị rụzuo ọrụ ndị ahụ. N’agbanyeghị nke ahụ, dị ka otu mba, Izrel ga-anọchi anya ọbụbụeze Jehova ma kpọsaa otuto ya n’etiti mba nile. Onye Izrel ọ bụla gaje ịbụ onye àmà nke Jehova.—Deuterọnọmi 26:19; Aịsaịa 43:21; Malakaị 2:7; Ndị Rom 3:1, 2.

A Chụọ Otu “Ohu”

7. N’ihi gịnị ka e ji jụ mba Izrel oge ochie dị ka “ohu” Chineke?

7 Ebe Izrel bụ “ohu” Chineke ọtụtụ narị afọ gara aga, ọ̀ bụ ya bụkwa ohu ahụ nke Jizọs kwuru banyere ya? Ee e, n’ihi na n’ụzọ dị mwute, Izrel oge ochie mesịrị bụrụ mba na-ekwesịghị ntụkwasị obi na nke na-enweghị uche. Pọl chịkọtara ọnọdụ ahụ mgbe o hotara okwu Jehova gwara mba ahụ, sị: “A na-ekwulu aha Chineke n’ihi unu n’etiti ndị mba ọzọ.” (Ndị Rom 2:24) N’ezie, Izrel ruru ọ̀tụ̀tụ̀ kasị elu nke nnupụisi weworo ogologo oge site n’ịjụ Jizọs, bụ́ nke mere ka Jehova jụ ha.—Matiu 21:42, 43.

8. Olee mgbe a họpụtara otu “ohu” ịnọchi anya Izrel, n’ọnọdụ ndị dịkwa aṅaa ka nke a weere ọnọdụ?

8 Ekwesịghị ntụkwasị obi dị n’otú a nke “ohu” ahụ, bụ́ Izrel, apụtaghị na ọ dịghịzi mgbe ndị ji ikwesị ntụkwasị obi na-efe ofufe ga-enweta nri ime mmụọ. Na Pentikọst 33 O.A., ụbọchị 50 ka Jizọs nwụsịrị, a wụsara ihe dị ka ndị na-eso ụzọ 120 mmụọ nsọ n’otu ọnụ ụlọ dị n’ụlọ elu na Jeruselem. N’oge ahụ, a mụrụ mba ọhụrụ. N’ụzọ kwesịrị ekwesị, a kpọsara ọmụmụ ya mgbe ndị so na ya ji anyaike malite ịgwa ndị bi na Jeruselem banyere “ihe ndị dị ebube nke Chineke.” (Ọrụ 2:11) N’ụzọ dị otú a, mba ọhụrụ ahụ, mba ime mmụọ, ghọrọ “ohu” ahụ nke ga-akpọsa ebube Jehova gwa mba nile ma na-enye nri n’oge kwesịrị ekwesị. (1 Pita 2:9) N’ụzọ dabara adaba, a bịara na-akpọ ya “Izrel nke Chineke.”—Ndị Galeshia 6:16.

9. (a) Olee ndị mejupụtara “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche”? (b) Ole ndị bụ “ezinụlọ” ahụ?

9 Onye ọ bụla so ‘n’Izrel nke Chineke’ bụ Onye Kraịst e ji mmụọ nsọ tee mmanụ nke raara onwe ya nye e mere baptizim na onye nwere olileanya eluigwe. N’ihi ya, okwu bụ́ ‘ohu na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche’ na-ezo aka ná ndị nile so ná mba ahụ e tere mmanụ dị ka otu òtù nọ n’ụwa n’oge ọ bụla malite na 33 O.A. ruo ugbu a, dị nnọọ ka onye Izrel ọ bụla dị ndụ n’oge ọ bụla malite na 1513 T.O.A. ruo na Pentikọst 33 O.A. so n’òtù ohu e nwere tupu oge Ndị Kraịst. Otú ọ dị, ole ndị bụ “ezinụlọ” ahụ, bụ́ ndị na-enweta nri ime mmụọ site n’aka ohu ahụ? Na narị afọ mbụ O.A., Onye Kraịst ọ bụla nwere olileanya eluigwe. N’ihi ya, ezinụlọ ahụ bụkwa Ndị Kraịst e tere mmanụ, ma e lee ha anya, ọ bụghị dị ka otu òtù, kama n’otu n’otu. Nri ime mmụọ sitere n’aka ohu ahụ dị ha nile mkpa, gụnyere ndị nọ n’ọnọdụ ibu ọrụ n’ọgbakọ.—1 Ndị Kọrint 12:12, 19-27; Ndị Hibru 5:11-13; 2 Pita 3:15, 16

“Nye Onye nke Ọ Bụla Ọrụ Ya”

10, 11. Olee otú anyị si mara na ọ bụghị ndị nile so n’òtù ohu ahụ nwere otu ụdị ọrụ?

10 Ọ bụ ezie na ọ bụ “Izrel nke Chineke” bụ ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche nke e nyere ọrụ, onye ọ bụla so na ya nwekwara ibu ọrụ nke onwe ya. Okwu Jizọs nke e dekọrọ na Mak 13:34 mere ka nke a doo anya. O kwuru, sị: “Ọ dị ka nwoke na-eje mba ọzọ nke hapụrụ ụlọ ya wee nye ndị ohu ya ikike, nye onye nke ọ bụla ọrụ ya, wee nye onye nche ọnụ ụzọ iwu ka ọ nọgide na-eche nche.” Ya mere, onye ọ bụla so n’òtù ohu ahụ nwetara ọrụ—ịmụba ihe Kraịst nwere n’ụwa. Onye nke ọ bụla na-arụ ọrụ a dị ka ikike na ohere o nwere hà.—Matiu 25:14, 15.

11 Ọzọkwa, Pita onyeozi gwara Ndị Kraịst e tere mmanụ nke oge ya, sị: “Ruo n’ókè onye nke ọ bụla nataworo onyinye, jirinụ ya na-ejere ibe unu ozi dị ka ezi ndị nlekọta ụlọ nke obiọma na-erughịrị mmadụ nke Chineke bụ́ nke a na-egosipụta n’ụzọ dị iche iche.” (1 Pita 4:10) N’ihi ya, ndị ahụ e tere mmanụ nwere ibu ọrụ nke ijerịtara ibe ha ozi, na-eji onyinye Chineke nyere ha na-eme ihe. Ọzọkwa, okwu Pita na-egosi na ọ bụghị Ndị Kraịst nile ga-enwe otu ụdị ikike, ibu ọrụ, ma ọ bụ ihe ùgwù. Otú ọ dị, onye nke ọ bụla so n’òtù ohu ahụ pụrụ ịtụnye ụtụ n’ụzọ ụfọdụ n’uto nke mba ime mmụọ ahụ. N’ụzọ dị aṅaa?

12. Olee otú onye nke ọ bụla so n’òtù ohu ahụ, ma ọ bụ nwoke ma ọ bụ nwanyị, si tụnye ụtụ n’uto nke ohu ahụ?

12 Nke mbụ, ọ bụ ọrụ dịịrị onye ọ bụla ịbụ onye àmà nke Jehova, na-ekwusa ozi ọma nke Alaeze ahụ. (Aịsaịa 43:10-12; Matiu 24:14) Kpọmkwem tupu ya arịgoo n’eluigwe, Jizọs nyere ndị nile na-eso ụzọ ya kwesịrị ntụkwasị obi, ma ndị ikom ma ndị inyom, iwu ịbụ ndị na-ezi ihe. O kwuru, sị: “Ya mere gaanụ mee ndị nke mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, na-eme ha baptizim n’aha nke Nna na nke Ọkpara na nke mmụọ nsọ, na-ezi ha ka ha debe ihe nile m nyeworo unu n’iwu. Ma, lee! m nọnyeere unu ụbọchị nile ruo ọgwụgwụ nke usoro ihe.”—Matiu 28:19, 20.

13. Ihe ùgwù dị aṅaa ka ndị nile e tere mmanụ nwere?

13 Mgbe a chọtara ndị na-eso ụzọ ọhụrụ, a ga-eji nlezianya kụziere ha idebe ihe nile Kraịst nyere ndị na-eso ụzọ ya n’iwu. Ka oge na-aga, ndị nakweere ya ruru eru izi ndị ọzọ ihe. E nyere ndị pụrụ isonye n’òtù ohu ahụ nri ime mmụọ na-edozi ahụ́ n’ọtụtụ mba. Ndị Kraịst nile e tere mmanụ, ma ndị ikom ma ndị inyom, keere òkè n’ịrụ ọrụ nke ime ndị na-eso ụzọ. (Ọrụ 2:17, 18) Ọrụ a ga-aga n’ihu site na mgbe mbụ ohu ahụ malitere ọrụ ya ruo n’ọgwụgwụ nke usoro ihe a.

14. Nanị ole ndị ka e nyere ihe ùgwù nke izi ihe n’ọgbakọ, oleekwa otú ndị inyom e tere mmanụ bụ́ ndị kwesịrị ntụkwasị obi si lee nke ahụ anya?

14 Ndị e mere baptizim ọhụrụ bụ́ ndị e tere mmanụ ghọrọ akụkụ nke ohu ahụ, n’agbanyeghịkwa onye ziri ha ihe na mbụ, ha natakwuru ntụziaka site n’aka ndị nọ n’ọgbakọ bụ́ ndị ruru ihe Akwụkwọ Nsọ chọrọ maka ije ozi dị ka ndị okenye. (1 Timoti 3:1-7; Taịtọs 1:6-9) Ndị ikom a a họpụtara ahọpụta si otú a nwee ihe ùgwù nke ịtụnye ụtụ n’uto nke mba ahụ n’ụzọ pụrụ iche. Ndị inyom bụ́ Ndị Kraịst e tere mmanụ eweghị iwe n’ihi na ọ bụ nanị ndị ikom bụ́ Ndị Kraịst ka e nyere ọrụ izi ihe n’ọgbakọ. (1 Ndị Kọrint 14:34, 35) Kama nke ahụ, ha nwere obi ụtọ irite uru site n’ịrụsi ọrụ ike nke ndị ikom so n’ọgbakọ ahụ, nweekwa ekele maka ihe ùgwù ndị inyom nwere, gụnyere nke iwegara ndị ọzọ ozi obi ụtọ. Taa, ụmụnna nwanyị ndị e tere mmanụ bụ́ ndị na-anụ ọkụ n’obi na-egosipụta otu ụdị àgwà obi umeala dị otú ahụ, ma ndị okenye a họpụtara ahọpụta hà so ná ndị e tere mmanụ ma ọ bụ na ha esoghị.

15. Gịnị bụ otu n’ime ebe ndị bụ́ isi e si nweta nri ime mmụọ na narị afọ mbụ, oleekwa ndị butere ụzọ n’inye ya?

15 Nri ime mmụọ bụ́ isi e nyere na narị afọ mbụ sitere kpọmkwem n’akwụkwọ ozi nke ndịozi na ndị ọzọ na-eso ụzọ bụ́ ndị na-edu ndú. E kesara akwụkwọ ozi ndị ha dere—karịsịa ndị so n’akwụkwọ 27 e dere n’ike mmụọ nsọ bụ́ ndị mejupụtara Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst—n’ọgbakọ dị iche iche, ihe ịrụ ụka adịghịkwa ya na ha ghọrọ ebe ndị okenye nọ n’ọgbakọ dị iche iche gbakwasịrị ụkwụ na-ezi ihe. N’ụzọ dị otú a, ndị nnọchianya nke ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi kesara nri ime mmụọ nye Onye Kraịst ọ bụla nwere ezi obi. Òtù ohu nke narị afọ mbụ ahụ kwesịrị ntụkwasị obi n’ọrụ e nyere ya.

“Ohu” ahụ Ka Narị Afọ 19 Gasịrị

16, 17. Olee otú òtù ohu ahụ si gosipụta na ya ji ikwesị ntụkwasị obi rụọ ọrụ e nyere ya n’afọ ndị bu 1914 ụzọ?

16 Gịnị banyere taa? Mgbe ọnụnọ Jizọs malitere na 1914, ọ̀ hụrụ òtù Ndị Kraịst e tere mmanụ bụ́ ndị ji ikwesị ntụkwasị obi na-enye nri n’oge kwesịrị ekwesị? N’ezie, ọ hụrụ. A pụrụ ịmata òtù a nke ọma n’ihi mkpụrụ ọma ndị ọ na-amịpụta. (Matiu 7:20) Kemgbe ahụ, akụkọ ihe mere eme egosipụtawo na ọ bụ ha bụ ohu ahụ n’ezie.

17 Mgbe Jizọs bịarutere, ezinụlọ nke ihe dị ka mmadụ 5,000 mejupụtara nọ na-arụsi ọrụ ike n’ịgbasa eziokwu Bible. Ndị ọrụ ahụ dị ole na ole, ma ohu ahụ ji ụzọ ọhụrụ dị iche iche mee ihe iji gbasaa ozi ọma ahụ. (Matiu 9:38) Dị ka ihe atụ, e mere ndokwa ka a na-ebipụta okwu ndị dabeere n’isiokwu Bible dị iche iche n’ihe ruru akwụkwọ akụkọ 2,000. N’ụzọ dị otú a, eziokwu nke Okwu Chineke ruru ọtụtụ iri puku ndị na-agụ akwụkwọ ntị n’otu oge. Tụkwasị na nke ahụ, a kwadebere usoro ihe omume na-ewe awa asatọ nke gụnyere ihe nkiri slide nwere àgwà dị iche iche na sinima. Site n’usoro ọgbara ọhụrụ a, e ziri ihe karịrị nde mmadụ itoolu na kọntinent atọ ozi Bible site ná mmalite nke Okike ruo ná ngwụsị nke Ọchịchị Puku Afọ Kraịst. Akwụkwọ ndị e biri ebi bụ usoro ọzọ e ji mee ihe. Dị ka ihe atụ, na 1914, e bipụtara ihe dị ka 50,000 nke magazin a.

18. Olee mgbe Jizọs mere ohu ahụ onye nlekọta nke ihe nile o nwere, n’ihi gịnịkwa?

18 Ee, mgbe Nna Ukwu ahụ bịarutere, ọ hụrụ ohu ya na-ekwesị ntụkwasị obi ka o ji nlezianya na-azụ ezinụlọ ahụ, na-ekwusakwa ozi ọma ahụ. Ibu ọrụ ka ukwuu na-echere ohu ahụ ugbu a. Jizọs kwuru, sị: “N’ezie asị m unu, Ọ ga-eme ya onye na-elekọta ihe nile o nwere.” (Matiu 24:47) Jizọs mere nke a na 1919 mgbe ohu ahụ gafesịrị oge ule. Otú ọ dị, n’ihi gịnị ka “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche” ji nweta ibu ọrụ ndị ka ukwuu? Ọ bụ n’ihi na ihe ndị Nna Ukwu ahụ nwere mụbara. E chiri Jizọs eze na 1914.

19. Kọwaa otú e siworo na-egbo mkpa ime mmụọ nke “oké ìgwè mmadụ” ahụ.

19 Gịnị bụ ihe ndị Nna Ukwu ahụ e chiri eze ọhụrụ nwere bụ́ ndị ọ họpụtara ohu ya na-ekwesị ntụkwasị obi ilekọta? Ọ bụ ihe ime mmụọ nile O nwere n’ụwa. Dị ka ihe atụ, afọ iri abụọ ka e chisịrị Kraịst eze na 1914, a matara “oké ìgwè mmadụ” nke “atụrụ ọzọ.” (Mkpughe 7:9; Jọn 10:16) Ha abụghị ndị e tere mmanụ so ‘n’Izrel nke Chineke,’ kama ha bụ ndị ikom na ndị inyom nwere ezi obi, ndị nwere olileanya elu ala, bụ́ ndị hụrụ Jehova n’anya ma na-achọ ijere ya ozi dị nnọọ ka ndị ahụ e tere mmanụ na-eme. Dị ka a pụrụ isi kwuo ya, ha na-agwa “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche,” sị: “Anyị na unu ga-ayịkọ jee, n’ihi na anyị anụwo na Chineke nọnyeere unu.” (Zekaraịa 8:23) Ndị Kraịst a e mere baptizim ọhụrụ sokwa ndị e tere mmanụ so n’ezinụlọ ahụ na-eri otu nri ime mmụọ ahụ na-edozi ahụ́, òtù abụọ ahụ anọwokwa na-ekerịta nri ime mmụọ a kemgbe ahụ. Lee ka nke a siworo bụụrụ ndị so ‘n’oké ìgwè mmadụ’ ahụ ngọzi!

20. Òkè dị aṅaa ka “oké ìgwè mmadụ” ahụ kerewooro n’ịmụba ihe onwunwe nke Onyenwe ha?

20 Ndị so ‘n’oké ìgwè mmadụ’ ahụ ji obi ụtọ na-esonyere òtù ohu ahụ e tere mmanụ dị ka ndị nkwusa nke ozi ọma ahụ. Ka ha na-eme nkwusa, ihe ndị Nna Ukwu ahụ nwere n’ụwa na-amụba, na-eme ka ọrụ ndị “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche” nwere na-ebukwu ibu. Ka ọnụ ọgụgụ nke ndị na-achọ eziokwu ahụ na-amụba, ọ bịara dị mkpa inwe ebe obibi akwụkwọ ndị e wusawanyere ewusawanye iji nwee ike na-ebipụta akwụkwọ ndị e ji amụ Bible n’ụzọ zuru ezu. E guzobere alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova n’ọtụtụ ala. E zigara ndị ozi ala ọzọ “n’akụkụ kasị anya n’ụwa.” (Ọrụ 1:8) Site n’ihe dị ka puku ise nke ndị e tere mmanụ na 1914, ọnụ ọgụgụ nke ndị na-eto Chineke amụbawo ruo ihe karịrị nde isii taa, nke ihe ka ọtụtụ n’ime ha so ‘n’oké ìgwè mmadụ.’ N’ezie, ihe onwunwe nke Eze ahụ amụbawo ọtụtụ okpukpu kemgbe e chiri ya eze na 1914!

21. Olee ilu abụọ anyị ga-atụle n’ihe ọmụmụ na-esonụ?

21 Ihe a nile na-egosi na ohu ahụ abụwo ma nke ‘na-ekwesị ntụkwasị obi, ma nke nwere uche.’ Kpọmkwem mgbe o kwusịrị banyere “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche,” Jizọs tụrụ ilu abụọ bụ́ ndị gosipụtara àgwà abụọ ahụ: ilu ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke ndị nwere uche na ndị dị nzuzu na ilu talent. (Matiu 25:1-30) Ha na-akpali mmasị anyị! Gịnị ka ilu ndị ahụ pụtara nye anyị taa? Anyị ga-atụle ajụjụ a n’isiokwu na-esonụ.

Gịnị Ka I Chere?

• Olee ndị mejupụtara “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche”?

• Ole ndị bụ “ezinụlọ” ahụ?

• Olee mgbe a họpụtara ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi ilekọta ihe onwunwe nke Onyenwe ha, n’ihi gịnịkwa ka o ji bụrụ mgbe ahụ?

• Olee ndị nyeworo aka mụbaa ihe onwunwe nke Onyenwe ha n’iri afọ ndị na-adịbeghị anya, ọ̀ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 10]

Òtù ohu ahụ nke narị afọ mbụ ji ikwesị ntụkwasị obi rụọ ọrụ ya