Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Na-elegide Anya ná Nkwụghachi Ụgwọ Ahụ?

Ị̀ Na-elegide Anya ná Nkwụghachi Ụgwọ Ahụ?

Ị̀ Na-elegide Anya ná Nkwụghachi Ụgwọ Ahụ?

ỌRỊA ahụ na-eji nwayọọ nwayọọ agbasa. Ná mmalite, ọ na-ebelata otú akụkụ anya mmadụ na-ahụru ihe. Ọ bụrụ na a gwọghị ya, ọ pụrụ ịgbasa ruo n’etiti anya. N’ikpeazụ, ọ pụrụ ime ka onye ahụ kpuo ìsì kpam kpam. Gịnị ka ọ bụ? Ọ bụ ọrịa anya bụ́ glaucoma—ọrịa kasị akpata ikpu ìsì.

Dị nnọọ ka anyị pụrụ ịkwụsị ịhụ ụzọ nwayọọ nwayọọ na n’ụzọ na-apụtachaghị ìhè, anyị pụrụ itụfu ikike ịhụ ụzọ nke dị oké ọnụ ahịa karị—ikike ịhụ ụzọ ime mmụọ anyị. Ya mere, ọ dị mkpa ka anyị na-elegide anya n’ihe ime mmụọ.

Ilegide Anya ná Nkwụghachi Ụgwọ Ahụ

Otu n’ime “ihe ndị a na-adịghị ahụ anya” bụ ụgwọ ọrụ dị ebube nke ndụ agwụghị agwụ, bụ́ nke Jehova na-enye ndị na-eguzosi ike n’ihe nye ya. (2 Ndị Kọrint 4:18) N’eziokwu, isi ihe mere Ndị Kraịst ji ejere Chineke ozi bụ na ha hụrụ ya n’anya. (Matiu 22:37) Ka o sina dị, Jehova chọrọ ka anyị na-atụ anya ụgwọ ọrụ anyị. Ọ chọrọ ka anyị hụ ya dị ka Nna nke na-emesapụ aka, onye “na-akwụghachi ndị na-achọsi ya ike ụgwọ ọrụ.” (Ndị Hibru 11:6) N’ihi ya, ndị maara Chineke n’ezie ma hụ ya n’anya na-eji nkwa ngọzi ya akpọrọ ihe ma na-atụsi anya mmezu ha ike.—Ndị Rom 8:19, 24, 25.

Ọtụtụ ndị na-agụ akwụkwọ a na nke ya na ya na-agakọ, bụ́ Teta!, na-enwe obi ụtọ ịhụ ihe osise na-egosi ụwa Paradaịs nke na-abịanụ. N’ezie, anyị amaghị kpọmkwem ihe ụwa Paradaịs ahụ ga-adị ka ya, ihe osise ndị ahụ bụkwa nanị ihe osise nkịtị ndị dabeere n’akụkụ Bible ndị dị ka Aịsaịa 11:6-9. N’agbanyeghị nke ahụ, otu nwanyị Onye Kraịst kwuru, sị: “Mgbe m na-ahụ ihe osise Paradaịs ahụ na-abịanụ n’Ụlọ Nche na Teta!, ana m eleru ha anya nke ọma, dị ka mmadụ ga-esi kirie broshuọ na-akọwa ebe nleta. Ana m agbalị ịhụ onwe m ebe ahụ n’ihi na nke a bụ ebe m nwere olileanya n’ezie ịnọ mgbe oge Chineke ruru.”

Pọl onyeozi nwekwara mmetụta yiri nke ahụ banyere “ọkpụkpọ nke elu” ya. O leghị onwe ya anya dị ka onye jideworo ya, n’ihi na ọ ghaghị ikwesị ntụkwasị obi ruo ọgwụgwụ. Ma ọ nọgidere ‘na-amatị onwe ya gaa n’ihe ndị dị n’ihu.’ (Ndị Filipaị 3:13, 14) N’otu aka ahụ, Jizọs tachiri obi ruo ọnwụ n’elu osisi ịta ahụhụ “n’ihi ọṅụ ahụ e setịpụrụ n’ihu ya.”—Ndị Hibru 12:2.

Ọ̀ dịtụla mgbe i nwere obi abụọ ma ị̀ ga-abanye n’ụwa ọhụrụ ahụ? N’ezie, ọ dị mma ịghara inwebiga obi ike ókè, ebe ọ bụ na anyị inweta ihe mgbata n’ọsọ nke ndụ ahụ dabeere n’anyị ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi ruo ọgwụgwụ. (Matiu 24:13) Ya mere, ọ bụrụ na anyị na-agbalị ike anyị ime ihe Chineke na-achọ, anyị kwesịrị nnọọ inwe obi ike na anyị ga-enweta ụgwọ ọrụ ahụ. Cheta na Jehova ‘achọghị ka e bibie onye ọ bụla kama ọ na-achọ ka mmadụ nile ruo nchegharị.’ (2 Pita 3:9) Ọ bụrụ na anyị atụkwasị Jehova obi, ọ ga-enyere anyị aka iru ihe mgbaru ọsọ anyị. N’ezie, o megidere ụdị onye ọ bụ bụ́ ya ịchọ ihe ga-eme ka ndị ji ezi obi na-agbalị ime ihe na-atọ ya ụtọ ghara iru eru.—Abụ Ọma 103:8-11; 130:3, 4; Ezikiel 18:32.

Ịma otú Jehova si ele ndị ya anya na-enye anyị olileanya—àgwà dị mkpa ka okwukwe. (1 Ndị Kọrint 13:13) Okwu Grik a sụgharịrị ịbụ “olileanya” n’ime Bible, na-enye echiche nke iji ịnụ ọkụ n’obi “na-atụ anya ihe ọma.” N’ibu ụdị olileanya ahụ n’obi, Pọl onyeozi dere, sị: “Anyị chọrọ ka onye ọ bụla n’ime unu na-egosi otu ịdị uchu ahụ iji wee nwee obi ike zuru ezu n’olileanya ahụ ruo ọgwụgwụ, ka unu wee ghara ịdị umengwụ, kama bụrụnụ ndị na-eṅomi ndị ahụ sitere n’okwukwe na ndidi na-eketa nkwa ndị e kwere.” (Ndị Hibru 6:11, 12) Rịba ama na ọ bụrụ na anyị anọgide jiri ikwesị ntụkwasị obi na-ejere Jehova ozi, anyị pụrụ inwe obi ike na anyị ga-enweta ihe anyị na-ele anya ya. N’adịghị ka atụmanya ụwa, olileanya a ‘adịghị eduga ná mmechuihu.’ (Ndị Rom 5:5) N’ihi ya, olee otú anyị pụrụ isi mee ka olileanya anyị na-egbukepụ egbukepụ ma na-elegide anya na ya?

Ụzọ Isi Mee Ka Ikike Ịhụ Ụzọ Ime Mmụọ Anyị Ka Mma

Anya nkịtị anyị apụghị ilegide ihe abụọ n’otu oge. Otú ahụ ka ọ dịkwa ikike ịhụ ụzọ ime mmụọ anyị. Ilegide anya n’ihe ndị dị n’usoro ihe dị ugbu a ga-eme nnọọ ka ụwa ọhụrụ Chineke kwere ná nkwa na-adị inyoghi inyoghi n’uche anyị. Ka oge na-aga, ụwa ọhụrụ a dị inyoghi inyoghi pụrụ ịkwụsị ịdọrọ mmasị anyị ma si otú a pụọ anyị nnọọ n’uche kpam kpam. Lee ọdachi nke ahụ ga-abụ! (Luk 21:34) N’ihi ya, lee ka o si dị mkpa na anyị ga-enwe ‘anya na-elegide otu ebe’—nke na-elegide Alaeze Chineke na ụgwọ ọrụ nke ndụ ebighị ebi!—Matiu 6:22.

Inwe anya na-elegide otu ebe adịghị adị mfe mgbe nile. Nsogbu ndị a na-enwe kwa ụbọchị na-adọrọ uche anyị, ihe ndọpụ uche—ọbụna ọnwụnwa—pụkwara ịnọchiri anyị ụzọ. N’ọnọdụ ndị a, olee otú anyị pụrụ isi na-elegide anya n’Alaeze ahụ na ná nkwa ụwa ọhụrụ Chineke n’elegharaghị ihe ndị ọzọ dị mkpa anya? Ka anyị tụlee ụzọ atọ.

Na-amụ Okwu Chineke kwa ụbọchị. Ịgụchi Bible anya na ịmụ akwụkwọ ndị dabeere na Bible na-enyere anyị aka ime ka uche anyị dịgide n’ihe ime mmụọ. N’eziokwu, anyị pụrụ ịmụwo Okwu Chineke ruo ọtụtụ afọ, ma anyị aghaghị ịnọgide na-amụ ya, dị nnọọ ka ọ dị mkpa anyị ịnọgide na-eri nri iji nọgide na-adị ndụ. Anyị adịghị akwụsị iri nri nanị n’ihi na anyị eriwo nri ọtụtụ puku ugboro n’oge gara aga. Ya mere, n’agbanyeghị otú anyị maruuru Bible, ọ dị anyị mkpa ịdị na-erichi nri ime mmụọ si na ya anya iji mee ka olileanya anyị nọgide na-egbukepụ egbukepụ na ka okwukwe anyị na ịhụnanya anyị nọgide na-esi ike.—Abụ Ọma 1:1-3.

Jiri ekele na-atụgharị uche n’Okwu Chineke. N’ihi gịnị ka ntụgharị uche ji dị mkpa? Ọ bụ n’ihi ihe abụọ. Nke mbụ, ntụgharị uche na-enyere anyị aka ime ka ihe anyị na-agụ bamie anyị n’ụmị na ịzụlite ekele si n’obi maka ya. Nke abụọ, ntụgharị uche na-egbochi anyị ichefu Jehova, ọrụ ya ndị dị ebube, na olileanya nke o setịpụrụ n’ihu anyị. Iji maa atụ: Ụmụ Izrel ndị ha na Mozis so hapụ Ijipt ji anya ha hụ ngosipụta nke ike dị egwu nke Jehova. Ha nwetara nchebe ịhụnanya ya ka ọ na-eduga ha n’ihe nketa ha. Ma, ozugbo ụmụ Izrel rutere n’ịkpa ka ha na-aga Ala Nkwa ahụ, ha malitere ime mkpesa, si otú a gosi na ha enwetụghị okwukwe. (Abụ Ọma 78:11-17) Gịnị bụ nsogbu ha?

Ndị ahụ hapụrụ ilegide Jehova na olileanya dị ebube o debere ha n’ihu anya ma lekwasị anya ná ntụsara ahụ́ na nchegbu anụ ahụ́ ha nwere mgbe ahụ. N’agbanyeghị ihe ịrịba ama ọrụ ebube ndị ha ji anya ha hụ, ọtụtụ ndị Izrel ghọrọ ndị mkpesa na-enweghị okwukwe. ‘Ha chezọrọ ọrụ Jehova nile ngwa ngwa,’ ka Abụ Ọma 106:13, na-ekwu. Nleghara anya dị otú ahụ a na-apụghị ịgọpụ agọpụ mere ka ọgbọ ahụ ghara ịba n’Ala Nkwa ahụ.

N’ihi ya, mgbe ị na-agụ Akwụkwọ Nsọ ma ọ bụ akwụkwọ ndị e ji amụ Bible, wepụta oge iji tụgharịa uche n’ihe ị na-agụ. Ntụgharị uche dị otú ahụ dị mkpa maka ahụ́ ike na uto ime mmụọ gị. Dị ka ihe atụ, mgbe ị na-agụ Abụ Ọma nke 106, nke e hotara ná mgbubiri n’elu, tụgharịa uche n’àgwà dị iche iche nke Jehova. Rịba ama otú o si gosi ndị Izrel ndidi na obi ebere. Hụ otú o si mee ihe nile ọ pụrụ ime iji nyere ha aka iru Ala Nkwa ahụ. Rịba ama otú ha si nọgide na-enupụrụ ya isi. Chegodị banyere oké mwute na ihe mgbu Jehova nwere ka ndị na-enwetụdịghị ekele nwara obi ebere ya na ndidi ya ruo ebe ọ kwụsịrị. Ọzọkwa, site n’ịtụgharị uche n’amaokwu nke 30 na nke 31, ndị kọwara nkwụsi ike na nguzosi ike Fineas maka ezi omume, anyị na-enwe mmesi obi ike na Jehova adịghị echefu ndị na-eguzosi ike n’ihe nye ya nakwa na ọ na-akwụghachi ha ụgwọ ọrụ n’ụba.

Na-etinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ ná ndụ gị. Ka anyị na-agbaso ụkpụrụ Bible, anyị na-ahụ n’onwe anyị na ndụmọdụ Jehova dị irè. Ilu 3:5, 6 na-ekwu, sị: “Tụkwasị Jehova obi gị nile, adaberekwala nghọta gị: N’ụzọ gị nile mara Ya, Ya onwe ya ga-emekwa ka okporo ụzọ gị nile zie ezie.” Chegodị otú ụzọ ndụ rụrụ arụ nke ọtụtụ ndị siworo kpatara ha nsogbu uche, nke mmetụta uche, na nke anụ ahụ́. Site n’itinye aka n’ihe ụtọ ndị na-adịru nwa oge, ndị dị otú ahụ na-ata ahụhụ si na ya pụta ruo ọtụtụ afọ—ọbụna ná ndụ ha nile. N’ụzọ dị nnọọ iche, ndị na-aga ije “n’ọnụ ụzọ ámá dị warara,” na-anụrụtụ ụtọ otú ndụ n’ime ụwa ọhụrụ ga-adị, nke a na-agbakwa ha ume ịnọgide n’okporo ụzọ na-eduba ná ndụ.—Matiu 7:13, 14; Abụ Ọma 34:8.

Itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ pụrụ ịbụ ihe ịma aka. Mgbe ụfọdụ, ihe ngwọta Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị pụrụ iyi ihe ga-eweta ahụ́ efe ozugbo mgbe e nwere ọnọdụ na-ama aka. Dị ka ihe atụ, n’oge ihe isi ike nke ego, a pụrụ ịnwa anyị itinye ihe ndị metụtara Alaeze n’ọnọdụ nke abụọ. Otú ọ dị, ndị nwere okwukwe ma na-elegide anya n’ihe ime mmụọ na-enwe obi ike na n’ikpeazụ “ọ ga-adịrị ndị na-atụ egwu Chineke mma.” (Eklisiastis 8:12) Ọ pụrụ ịbụ na, mgbe ụfọdụ, Onye Kraịst aghaghị ịrụ ọrụ ma a gbasaa ọrụ, ma ọ dịghị mgbe ọ ga-adị ka Ịsọ, bụ́ onye ledara ihe ndị dị nsọ anya, na-ewezụga ha n’ụsọ dị ka ihe ndị na-adịghị mkpa.—Jenesis 25:34; Ndị Hibru 12:16.

Jizọs kọwara nke ọma ihe ndị bụ́ ibu ọrụ anyị dị ka Ndị Kraịst. Anyị gaje ‘ịnọgide buru ụzọ na-achọ alaeze ahụ na ezi omume Chineke.’ (Matiu 6:33) Ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, Jehova ga-egosi anyị ịhụnanya ya dị ka nna site n’ịhụ na anyị na-enweta ihe ndị dị anyị mkpa n’ụzọ ihe onwunwe. N’ezie, ọ chọghị ka anyị buru ibu arọ nke ichegbu onwe anyị banyere ihe ndị o kwuru na ya ga-ahụ maka ha. Nchegbu gabigara ókè dị otú ahụ pụrụ ịdị ka ọrịa anya glaucoma ime mmụọ—nke, ọ bụrụ na e leghara ya anya, ga-eji nwayọọ nwayọọ mee ka anyị na-ahụ nanị mkpa ihe anụ ahụ́ ma n’ikpeazụ mee ka anyị kpuo ìsì n’ụzọ ime mmụọ. Ọ bụrụ na anyị anọgide n’ọnọdụ ahụ, ụbọchị Jehova ga-abịakwasị anyị “dị ka ọnyà.” Lee ọdachi nke ahụ ga-abụ!—Luk 21:34-36.

Na-elegide Anya n’Ihe Dị Ka Jọshụa

Ka anyị na-elegide anya n’olileanya Alaeze anyị dị ebube, na-etinye ibu ọrụ ndị ọzọ n’ọnọdụ kwesịịrị ha. Site n’ịnọgide na-enwe usoro ọmụmụ ihe chiri anya, ịtụgharị uche, na itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ, anyị pụrụ ịnọgide na-enwe obi ike n’olileanya anyị dị ka Jọshụa nwere. Ka o dubatasịrị ụmụ Izrel n’Ala Nkwa ahụ, o kwuru, sị: “Ma unu amawo n’obi unu nile na n’ime mkpụrụ obi unu nile, na ọ dịghị otu ihe dapụrụ n’ezi ihe nile nke Jehova, bụ́ Chineke unu, kwuru banyere unu; ha nile emeworo unu, ọ dịghị otu ihe dapụrụ n’ime ya.”—Joshua 23:14.

Ka olileanya Alaeze ahụ gbaa gị ume, ka ọ na-emekwa gị obi ụtọ ụbọchị nile ka ọ na-apụta ìhè n’echiche, mmetụta, mkpebi, na n’ọrụ gị nile.—Ilu 15:15; Ndị Rom 12:12.

[Foto dị na peeji nke 21]

Ọ̀ dịtụla mgbe i nwere obi abụọ ma ị̀ ga-abanye n’ụwa ọhụrụ ahụ?

[Foto dị na peeji nke 22]

Ntụgharị uche bụ akụkụ dị mkpa nke ọmụmụ Bible

[Foto ndị dị na peeji nke 23]

Na-elegide anya n’ihe ndị metụtara Alaeze ahụ