Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

2 Ndị Kọrint 6:14, olee ndị Pọl na-ezo aka n’ebe ha nọ mgbe o ji okwu bụ́ “ndị na-ekweghị ekwe” mee ihe?

2 Ndị Kọrint 6:14, anyị na-agụ, sị: “Unu na ndị na-ekweghị ekwe ekekọtala onwe unu n’ụzọ na-ekwekọghị ekwekọ.” Ọ bụrụ na anyị atụlee okwu ndị gbara ya gburugburu, o doro anya na Pọl na-ekwu banyere ndị na-anọghị nnọọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst. Amaokwu Bible ndị ọzọ ebe Pọl ji okwu ahụ bụ́ “onye na-ekweghị ekwe” ma ọ bụ “ndị na-ekweghị ekwe” mee ihe na-akwado nghọta a.

Dị ka ihe atụ, Pọl baara Ndị Kraịst mba n’ihi ịga n’ụlọikpe “n’ihu ndị na-ekweghị ekwe.” (1 Ndị Kọrint 6:6) N’ebe a, ndị na-ekweghị ekwe bụ ndị ikpe na-ekpe ikpe n’usoro ikpe nke Kọrint. N’akwụkwọ ozi ya nke abụọ, Pọl kwuru na Setan ‘emewo ka uche ndị na-ekweghị ekwe kpuo ìsì.’ E ji “ákwà mkpuchi” kpuchie anya ndị dị otú ahụ na-ekweghị ekwe pụọ n’ozi ọma ahụ. Ndị a na-ekweghị ekwe egosighị mmasị ọ bụla n’ijere Jehova ozi, ebe ọ bụ na Pọl kọwara na mbụ, sị: “Mgbe e chigharịkwuuru Jehova, a na-ewepụ ákwà mkpuchi ahụ.”—2 Ndị Kọrint 3:16; 4:4.

Ụfọdụ ndị na-ekweghị ekwe na-etinye aka ná mmebi iwu ma ọ bụ n’ikpere arụsị. (2 Ndị Kọrint 6:15, 16) Otú ọ dị, ọ bụghị ha nile na-emegide ndị ohu Jehova. Ụfọdụ na-egosi mmasị n’eziokwu ahụ. Ọtụtụ nwere di ma ọ bụ nwunye bụ́ Ndị Kraịst ma nwee obi ụtọ ha na ha ibi. (1 Ndị Kọrint 7:12-14; 10:27; 14:22-25; 1 Pita 3:1, 2) Otú ọ dị, Pọl ji okwu ahụ bụ́ “onye na-ekweghị ekwe” mee ihe ugboro ugboro iji kọwaa ndị mmadụ bụ́ ndị, dị ka e kwuru n’elu, na-anọghị n’ọgbakọ Ndị Kraịst, bụ́ nke “ndị kwere n’Onyenwe anyị” mejupụtara.—Ọrụ 2:41; 5:14; 8:12, 13.

Ụkpụrụ ahụ dị ná 2 Ndị Kọrint 6:14 bụ ihe nduzi bara uru nye Ndị Kraịst n’akụkụ nile nke ndụ ma bụrụ nke a na-ehotakarị dị ka nke na-enye ndụmọdụ amamihe dị na ya maka Ndị Kraịst na-achọ di ma ọ bụ nwunye. (Matiu 19:4-6) Onye Kraịst raara onwe ya nye, e mere baptizim na-eji amamihe ghara ịchọ di ma ọ bụ nwunye n’etiti ndị na-ekweghị ekwe, ebe ọ bụ na ụkpụrụ, ihe mgbaru ọsọ, na nkwenkwe nke ndị na-ekweghị ekwe dị nnọọ iche na nke ezi Onye Kraịst.

Otú ọ dị, gịnị banyere ndị na-amụ Bible ma na-eso ọgbakọ Ndị Kraịst na-akpakọrịta? Gịnị banyere ndị bụ́ ndị nkwusa a na-emebeghị baptizim? Hà bụ ndị na-ekweghị ekwe? Ee e. E kwesịghị ịkpọ ndị nabataworo eziokwu nke ozi ọma ahụ ma na-enwe ọganihu iji ruo eruo maka baptizim ndị na-ekweghị ekwe. (Ndị Rom 10:10; 2 Ndị Kọrint 4:13) Tupu e mee ya baptizim, a kpọrọ Kọniliọs “nwoke obi ya dị ọcha, bụkwa onye na-atụ egwu Chineke.”—Ọrụ 10:2.

Mgbe ahụ, ọ̀ ga-abụ ihe amamihe dị na ya Onye Kraịst ịchọ ibedo na ịlụ onye a nabataworo dị ka onye nkwusa a na-emebeghị baptizim, ebe ọ bụ na, n’ịkapị ya ọnụ, ndụmọdụ Pọl e dekọrọ ná 2 Ndị Kọrint 6:14 apụghị imetụta ọnọdụ ahụ? Ee e, nke ahụ abụghị ihe amamihe dị na ya ime. N’ihi gịnị? N’ihi ndụmọdụ a kapịrị ọnụ Pọl nyere banyere Ndị Kraịst di ha nwụrụ. Pọl dere, sị: “O nweere onwe ya ịlụ onye ọ chọrọ, nanị n’ime Onyenwe anyị.” (1 Ndị Kọrint 7:39) N’ikwekọ na ndụmọdụ ahụ, a gbara Ndị Kraịst raara onwe ha nye ume ịchọ di ma ọ bụ nwunye nanị n’etiti ndị nọ “n’ime Onyenwe anyị.”

Gịnị ka okwu ahụ bụ́ “n’ime Onyenwe anyị” na okwu yiri ya bụ́ “n’ime Kraịst” pụtara? Pọl kwuru banyere ndị nọ “n’ime Kraịst” ma ọ bụ “n’Onyenwe anyị” ná Ndị Rom 16:8-10 nakwa ná Ndị Kọlọsi 4:7. Ọ bụrụ na ị gụọ amaokwu ndị ahụ, ị ga-ahụ na ndị dị otú ahụ bụ ‘ndị ọrụ ibe anyị,’ ‘ndị a nwapụtara anwapụta,’ ‘ụmụnna anyị anyị hụrụ n’anya,’ ‘ndị ozi na-ekwesị ntụkwasị obi,’ na ‘ndị ohu ibe anyị.’

Olee mgbe mmadụ na-aghọ “ohu n’ime Onyenwe anyị”? Nke ahụ na-eme mgbe o ji obi ya mee ihe onye bụ́ ohu na-aghaghị ime ma jụ onwe ya. Jizọs kọwara, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla chọrọ iso m n’azụ, ya jụ onwe ya ma bulie osisi ịta ahụhụ ya, nọgidekwa na-eso m.” (Matiu 16:24) Mmadụ na-amalite iso Kraịst ma doo onwe ya kpam kpam n’okpuru uche Chineke mgbe ọ raara onwe ya nye Chineke. E mesịa, ọ na-enyefe onwe ya maka baptizim ma ghọọ onye ozi a họpụtara ahọpụta nwere nguzo a nwapụtara anwapụta n’ihu Jehova Chineke. * Ya mere, ‘ịlụ nanị n’ime Onyenwe anyị’ pụtara ịlụ onye gosipụtaworo na ya bụ onye kwere ekwe n’ezie, “ohu nke Chineke na nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst” raara onwe ya nye.—Jems 1:1.

Onye ya na Ndịàmà Jehova na-amụ Bible bụ́ onye na-enwekwa ọganihu dị mma n’ụzọ ime mmụọ kwesịrị ka a jaa ya mma. Otú ọ dị, ọ rarabeghị onwe ya nye Jehova ma kpebie ibi ndụ nke ije ozi na ịchụ onwe onye n’àjà. Ọ ka na-eme mgbanwe ndị dị mkpa. Ọ dị ya mkpa imecha mgbanwe ndị gbara ọkpụrụkpụ a chọrọ iji ghọọ Onye Kraịst raara onwe ya nye, e mere baptizim tupu ya echewe echiche ime mgbanwe ọzọ gbakwara ọkpụrụkpụ, dị ka alụmdi na nwunye.

Ọ̀ ga-abụ ihe amamihe dị na ya Onye Kraịst ibedo onye yiri ka ọ̀ na-enwe ọganihu dị mma n’ọmụmụ Bible ya—ikekwe n’ebumnobi nke ichere ruo mgbe o mere baptizim tupu ya alụọ ya? Ee e. Ọ bụrụ na onye a na-amụrụ Bible amara na Onye Kraịst rarawooro onwe ya nye na-achọ ịlụ ya ma na ọ gaghị eme otú ahụ ruo mgbe ya mere baptizim, ọ pụrụ imetụta ebumnobi onye ahụ a na-amụrụ Bible.

Dị ka ọ na-adịkarị, mmadụ na-abụ onye nkwusa a na-emebeghị baptizim nanị nwa oge, ruo mgbe o nwere ọganihu ruo n’ịbụ onye e mere baptizim. Ya mere, ndụmọdụ ahụ dị n’elu ịlụ nanị n’ime Onyenwe anyị abụghị nke ezi uche na-adịghị na ya. Otú ọ dị, gịnị ma ọ bụrụ na mmadụ eruwo ogo ịlụ di ma ọ bụ nwunye, bụrụ onye a zụliteworo n’ezinụlọ Ndị Kraịst, bụrụ onye rụsiworo ọrụ ike n’ọgbakọ ruo ọtụtụ afọ ma na-eje ozi dị ka onye nkwusa a na-emebeghị baptizim? Ọ bụrụ otú ahụ, gịnị gbochiworo ya ịrara ndụ ya nye Jehova? Gịnị mere o ji ala azụ? Ọ̀ na-enwe obi abụọ? Ọ bụ ezie na ọ bụghị onye na-ekweghị ekwe, a pụghị ikwu na ọ nọ “n’ime Onyenwe anyị.”

Ndụmọdụ Pọl banyere alụmdi na nwunye bụ maka abamuru anyị. (Aịsaịa 48:17) Mgbe mmadụ abụọ na-achọ ịlụ onwe ha rarawooro onwe ha nye Jehova, nkwa ha kwere onwe ha n’alụmdi na nwunye ha na-enwe ntọala ime mmụọ siri ike. Ha nwere otu ụkpụrụ na otu ihe mgbaru ọsọ. Nke a na-atụnye ụtụ dị ukwuu n’inwe alụmdi na nwunye obi ụtọ. Ọzọkwa, site ‘n’ịlụ n’ime Onyenwe anyị,’ mmadụ na-egosi na ya na-eguzosi ike n’ihe nye Jehova, nke ahụ na-edugakwa ná ngọzi ndị na-adịgide adịgide, n’ihi na ‘n’ebe onye na-eguzosi ike n’ihe nọ, Jehova ga-egosi Onwe ya onye na-eguzosi ike n’ihe.’—Abụ Ọma 18:25, NW.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 10 Nye Ndị Kraịst e tere mmanụ bụ́ ndị Pọl degaara akwụkwọ ozi a na mbụ, ịbụ “ohu n’ime Onyenwe anyị” gụnyekwara ịnata ite mmanụ dị ka ụmụ ndị ikom Chineke na ụmụnna Kraịst.

[Foto dị na peeji nke 31]

‘N’ebe onye na-eguzosi ike n’ihe nọ, Jehova ga-egosi Onwe ya onye na-eguzosi ike n’ihe’