Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

‘Ụkpụrụ Jehova’ Apụghị Ịda Ada

‘Ụkpụrụ Jehova’ Apụghị Ịda Ada

‘Ụkpụrụ Jehova’ Apụghị Ịda Ada

“M ga-akọ akụkọ ụkpụrụ: Jehova sịrị m, Ọkpara m ka gị onwe gị bụ . . . Rịọ m, na aga m enye gị mba nile ka ha bụrụ ihe nketa gị.”—ABỤ ỌMA 2:7, 8.

1. Gịnị bụ ọdịiche dị n’etiti nzube Chineke na nke mba nile?

JEHOVA CHINEKE nwere nzube maka ihe a kpọrọ mmadụ na ụwa. Mba nile nwekwara nzube. Ma lee ka nzube ndị a sị dịrịta nnọọ iche! Anyị kwesịrị ịtụ anya nke a, n’ihi na Chineke na-ekwu, sị: “Dị ka eluigwe si dị elu karịa ụwa, otú a ka ụzọ m nile dị elu karịa ụzọ nile unu, ọ bụkwa otú a ka echiche m nile dị elu karịa echiche nile unu.” Nzube Chineke aghaghị imezu n’ihi na ọ gara n’ihu ikwu, sị: “Dị ka oké mmiri ozuzo na snow si esi n’eluigwe ezo, ma ọ bụghị n’ebe ahụ ka ọ na-alaghachi, ma ọ bụrụ na o bughị ụzọ desịa ala, wee mee ka o mee ihe omume, ka o puokwa ihe opupu; o wee were mkpụrụ nye ọgha mkpụrụ, werekwa nri nye onye na-eri ihe; otú a ka okwu m dị nke na-esi n’ọnụ m pụta: ọ gaghị alaghachikwute m n’efu, ma ọ bụrụ na o bughị ụzọ mezuo ihe tọrọ m ụtọ, wee gaa nke ọma n’ihe M zigara ya.”—Aịsaịa 55:9-11.

2, 3. Gịnị ka e mere ka o doo anya n’abụ ọma nke abụọ, ma ajụjụ ndị dị aṅaa na-ebilite?

2 E mere ka o doo anya n’abụ ọma nke abụọ na nzube Chineke banyere Eze Mezaịa ya ga-emezu. E nyere onye rọrọ ya, bụ́ Eze Devid nke Izrel oge ochie, ike mmụọ nsọ Chineke ibu amụma na a ga-enwe oge dị ịrịba ama mgbe mba nile ga-eme mkpọtụ. Ndị ọchịchị ha ga-eguzogide Jehova Chineke na Onye ya E Tere Mmanụ. Otú ọ dị, ọbụ abụ ahụ bụkwara, sị: “M ga-akọ akụkọ banyere ụkpụrụ: Jehova sịrị m, Ọkpara m ka gị onwe gị bụ; . . . Rịọ m, na aga m enye gị mba nile ka ha bụrụ ihe nketa gị, na nsọtụ ụwa ka ha bụrụ ihe onwunwe gị.”—Abụ Ọma 2:7, 8.

3 Gịnị ka ‘ụkpụrụ Jehova’ ga-apụtara mba nile? Olee otú o si metụta ihe a kpọrọ mmadụ n’ozuzu? N’ezie, gịnị ka ihe omume ndị a pụtara nye ndị nile na-atụ egwu Chineke bụ́ ndị na-agụ abụ ọma nke abụọ?

Mba Nile Emee Oké Mkpọtụ

4. Olee otú ị ga-esi chịkọta isi ihe ndị dị n’Abụ Ọma 2:1, 2?

4 N’izo aka n’ihe mba nile na ndị ọchịchị ha na-eme, ọbụ abụ ahụ malitere abụ ya site n’ịbụ, sị: “N’ihi gịnị ka mba nile meworo oké mkpọtụ? N’ihi gịnịkwa ka ndị nile dị n’ụwa na-atụgharị ihe efu uche? Ndị eze nke ụwa na-eguzo onwe ha, ndị isi na-agbakọtakwa ìzù, imegide Jehova, na imegide onye Ya e tere mmanụ.”—Abụ Ọma 2:1, 2. *

5, 6. “Ihe efu” dị aṅaa ka ndị nọ n’ụwa nọworo ‘na-atụgharị n’uche’?

5 “Ihe efu” dị aṅaa ka ndị nile nọ n’ụwa n’oge a ‘na-atụgharị n’uche’? Kama ịnakwere Onye Chineke E Tere Mmanụ—Mezaịa, ma ọ bụ Kraịst ahụ—mba nile anọgidewo ‘na-atụgharị uche’ otú ha ga-esi mee ka ike ha dịgide. Okwu ndị a nke abụ ọma nke abụọ mezukwara na narị afọ mbụ O.A. mgbe ndị ọchịchị Juu na ndị ọchịchị Rom gbakọtara aka gbuo Eze Chineke A Họpụtara Ahọpụta, bụ́ Jizọs Kraịst. Otú ọ dị, mmezu ya bụ́ isi malitere na 1914 mgbe e chiri Jizọs echichi dị ka Eze eluigwe. Kemgbe ahụ, ọ dịbeghị ọchịchị ọ bụla n’ụwa nke nakweere Eze Chineke e mere ka ọ nọkwasị n’ocheeze.

6 Gịnị ka ọ pụtara mgbe ọbụ abụ ahụ jụrụ ‘ihe mere ndị nile dị n’ụwa ji na-atụgharị ihe efu n’uche’? Ọ bụ nzube ha bụ ihe efu; ọ na-agakwa ịkụ afọ n’ala. Ha apụghị iweta udo na ịdị n’otu n’ụwa a. N’agbanyeghị nke ahụ, ha na-eru n’ókè nke imegide ịchịisi Chineke. N’ezie, ha ejikọwo aka na-enupụ isi ma gbakọta ọnụ megide Onye Kasị Ihe Nile Elu na Onye ya E Tere Mmanụ. Lee ihe nzuzu nke ahụ bụ!

Eze Jehova nke Na-enwe Mmeri

7. N’ekpere, olee otú ụmụazụ Jizọs ndị oge mbụ si jiri Abụ Ọma 2:1, 2 mee ihe?

7 Ụmụazụ Jizọs ji okwu nke Abụ Ọma 2:1, 2 mee ihe n’ebe ọ nọ. N’ịbụ ndị a kpagburu n’ihi okwukwe ha, ha kpere ekpere, sị: “Eze Onyenwe anyị [Jehova], ị bụ Onye mere eluigwe na ụwa na oké osimiri na ihe nile dị n’ime ha, onye sitekwara na mmụọ nsọ kwuo n’ọnụ nna nna anyị Devid, bụ́ ohu gị sị, ‘N’ihi gịnị ka mba nile ji na-agba oké aghara, ndị dị iche iche ana-atụgharịkwa uche n’ihe efu? Ndị eze nke ụwa eguzorowo, ndị na-achị achị gbakọtakwara ọnụ dị ka otu onye imegide Jehova na imegide onye o tere mmanụ.’ Ọbụna otú ahụ, ma Herọd [Antipas] ma Pọntiọs Paịlet tinyere ndị nke ndị mba ọzọ nakwa ndị Izrel zukọtara n’ezie n’obodo a imegide ohu gị dị nsọ, bụ́ Jizọs, onye i tere mmanụ.” (Ọrụ 4:24-27; Luk 23:1-12) * Ee, a gbara izu megide ohu Chineke e tere mmanụ bụ́ Jizọs na narị afọ mbụ. Otú ọ dị, abụ ọma a ga-enwe mmezu ọzọ ọtụtụ narị afọ ka e mesịrị.

8. Olee otú Abụ Ọma 2:3 si metụta mba ndị nke oge a?

8 Mgbe ndị Izrel oge ochie nwere eze bụ́ mmadụ, dị ka Devid, mba ndị na-ekpere arụsị gbakọtara ọnụ megide Chineke na onye ya e tere mmanụ nke e mere ka ọ nọkwasị n’ocheeze. Ma gịnị banyere oge anyị? Mba ndị nke oge a achọghị ime ihe Jehova na Mezaịa ahụ chọrọ. N’ihi ya, e kwuru na ha sịrị: “Ka anyị tijie agbụ nile ha, tụfuo ụdọ nile ha n’ahụ́ anyị.” (Abụ Ọma 2:3) Ndị ọchịchị na mba nile ga-emegide ihe mgbochi ọ bụla Chineke na Onye ya E Tere Mmanụ tinyere. N’ezie, mgbalị ọ bụla a ga-eme iji tijie agbụ na iji tụfuo ụdọ ndị dị otú ahụ ga-akụ afọ n’ala.

Jehova Na-akwa Ha Emo

9, 10. N’ihi gịnị ka Jehova ji na-akwa mba nile emo?

9 Jehova achọghị ịma banyere mgbalị ọ bụla ndị ọchịchị mba nile na-eme iguzobe ọchịchị nke ha. Abụ ọma nke abụọ gara n’ihu ikwu, sị: “Onye na-anọdụ n’eluigwe na-achị ọchị: Onyenwe anyị na-akwa ha emo.” (Abụ Ọma 2:4) Chineke na-aga n’ihu imezu nzube ya ka à ga-asị na ndị ọchịchị ndị a adịghị ihe ha bụ. Ọ na-achị nlelị ha ọchị ma na-akwa ha emo. Ha tuwe ọnụ banyere ihe ha chọrọ ime. N’anya Jehova, ha bụ ihe ọchị. Ọ na-achị mmegide ha na-enweghị isi ọchị.

10 N’ebe ọzọ n’abụ ọma, Devid na-ezo aka n’ebe ndị mmadụ na mba ndị bụ́ ndị iro nọ ma na-abụ, sị: “Gị onwe gị kwa, Jehova, Chineke nke usuu nile nke ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, teta ileta mba nile: emerela ndị na-aghọ aghụghọ n’ajọ ihe amara. Ha na-alaghachi n’anyasị, na-agbọ ụja dị ka nkịta, na-aga obodo gburugburu. Lee, ha ji ọnụ ha na-asụpụta okwu; mma agha dị n’egbugbere ọnụ ha: n’ihi na ònye na-anụ? bụ ihe ha kwuru. Ma Gị onwe gị, Jehova, ga-achị ha ọchị; ị ga-akwa mba nile emo.” (Abụ Ọma 59:5-8) Jehova na-achị itu ọnụ na mgbagwoju anya nke mba nile n’omume nzuzu ha megide ya ọchị.

11. Gịnị ga-eme mgbe mba nile gbalịrị imegide nzube Chineke?

11 Okwu dị n’Abụ Ọma nke 2 na-ewusi okwukwe anyị ike na Chineke pụrụ imeri ihe ịma aka ọ bụla. Anyị pụrụ inwe obi ike na ọ na-emezu uche ya mgbe nile nakwa na ọ dịghị mgbe ọ ga-agbahapụ ndị ohu ya na-eguzosi ike n’ihe. (Abụ Ọma 94:14) Ya mere, gịnị ga-eme mgbe mba nile mere mgbalị imegide nzube Jehova? Dị ka abụ ọma a si kwuo, Chineke “ga-agwa ha okwu n’iwe,” dị ka à ga-asị na ọ bụ oké égbè eluigwe na-ebigbọ. Ọzọkwa, “n’iwe ya dị ọkụ,” dị ka à ga-asị na ọ bụ oké anwụrụ ọkụ nke àmụ̀mà, “ọ ga-eme ka ha maa jijiji.”—Abụ Ọma 2:5.

E Mee Ka Eze Chineke Guzosie Ike

12. Abụ Ọma 2:6 na-ezo aka ná nnọkwasị n’ocheeze dị aṅaa?

12 Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ihe ọzọ Jehova kwuru site n’ọnụ ọbụ abụ ahụ kpasuru mba nile iwe. Chineke na-ekwu, sị: “Ma mụ onwe m emewo ka eze m guzosie ike n’elu Zaịọn, bụ́ ugwu nsọ m.” (Abụ Ọma 2:6) Ugwu Zaịọn bụ ugwu nke dị na Jeruselem bụ́ ebe a nọ chie Devid echichi dị ka eze Izrel nile. Ma Eze Mezaịa ahụ agaghị anọkwasị n’ocheeze n’obodo ahụ ma ọ bụ n’ebe ọzọ n’ụwa. N’ezie, Jehova emewo ka Jizọs Kraịst guzosie ike dị ka Eze Mezaịa n’Ugwu Zaịọn nke eluigwe.Mkpughe 14:1.

13. Ọgbụgba ndụ dị aṅaa ka Jehova soro Ọkpara ya gbaa?

13 Eze Mezaịa ahụ na-ekwu okwu ugbu a. Ọ na-asị: “M ga-akọ akụkọ banyere ụkpụrụ [Jehova, bụ́ onye soworo Ọkpara ya gbaa ndụ maka Alaeze]: Jehova [Chineke] sịrị m, Ọkpara m ka gị onwe gị bụ; Mụ onwe m amụwo gị taa.” (Abụ Ọma 2:7) Kraịst zoro aka n’ọgbụgba ndụ Alaeze ahụ mgbe ọ gwara ndịozi ya, sị: “Unu bụ ndị rapawooro m n’ahụ́ n’ọnwụnwa m dị iche iche; mụ na unu na-agbakwa ndụ, dị nnọọ ka mụ na Nna m gbaworo ndụ, maka alaeze.”—Luk 22:28, 29.

14. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na Jizọs nwere ikike a na-apụghị ịgbagha agbagha ịbụ eze?

14 Dị ka e buru n’amụma n’Abụ Ọma 2:7, Jehova mere ka a mara Jizọs dị ka Ọkpara Ya mgbe e mere ya baptizim nakwa site n’ịkpọlite ya n’ọnwụ gaa ná ndụ mmụọ. (Mak 1:9-11; Ndị Rom 1:4; Ndị Hibru 1:5; 5:5) Ee, Eze nke Alaeze eluigwe bụ Ọkpara Chineke mụrụ nanị ya. (Jọn 3:16) Dị ka onye si n’eriri Eze Devid, Jizọs nwere ikike a na-apụghị ịgbagha agbagha ịbụ eze. (2 Samuel 7:4-17; Matiu 1:6, 16) Dị ka abụ ọma a si gosi, Chineke na-agwa Ọkpara ya, sị: “Rịọ m, na aga m enye gị mba nile ka ha bụrụ ihe nketa gị, na nsọtụ ụwa ka ha bụrụ ihe onwunwe gị.”—Abụ Ọma 2:8.

15. N’ihi gịnị ka Jizọs ji rịọ ka e nye ya mba nile dị ka ihe nketa?

15 Eze ahụ—Ọkpara Chineke n’onwe ya—na-esote Jehova n’ọkwá. Jizọs bụ onye Jehova a nwapụtara anwapụta, nke na-eguzosi ike n’ihe, nakwa onye a pụrụ ịdabere na ya. Ọzọkwa, Jizọs nwere ihe nketa dị ka Ọkpara Chineke. N’ezie, Jizọs Kraịst “bụ onyinyo nke Chineke a na-apụghị ịhụ anya, onye e buru ụzọ mụọ n’ime ihe nile e kere eke.” (Ndị Kọlọsi 1:15) Nanị ihe ọ ga-eme bụ ịrịọ maka ya, Chineke ‘ga-enyekwa ya mba nile dị ka ihe nketa ya na nsọtụ nke ụwa dị ka ihe onwunwe ya.’ Jizọs rịọrọ arịrịọ a dị ka onye ‘ihe na-atọ ya ụtọ dị n’ebe ụmụ mmadụ nọ’ nakwa n’ihi ọchịchọ ya siri ike imezu uche Nna ya nke eluigwe banyere ụwa na ihe a kpọrọ mmadụ.—Ilu 8:30, 31.

Ụkpụrụ Jehova Megide Mba Nile

16, 17. Dị ka Abụ Ọma 2:9 gosiri, gịnị na-echere mba nile?

16 Ebe ọ bụ na abụ ọma nke abụọ na-enwe mmezu ya ugbu a, n’oge ọnụnọ a na-adịghị ahụ anya nke Jizọs Kraịst, gịnị na-echere mba nile? N’isi nso, Eze ahụ ga-emezu ihe Chineke kwuru bụ́: “Ị ga-eji mkpanaka ígwè tijisie ha [mba nile]; dị ka ihe ọkpụite kpụrụ ka a ga-atụpịa ha.”—Abụ Ọma 2:9.

17 Mkpanaka nke eze ndị oge ochie bụ ihe na-anọchi anya ikike eze. E ji ígwè mee ụfọdụ mkpanaka, dị ka nke e kwuru okwu ya n’abụ ọma a. Ihe atụ e ji mee ihe n’ebe a na-egosi otú Kraịst bụ́ Eze ga-esi bibie mba nile n’ụzọ dị mfe. Ịkụsi ígwè ike n’arịa ụrọ nke ọkpụite kpụrụ ga-akụrisi ya, kụpịa ya kpam kpam.

18, 19. Iji nweta ihu ọma Chineke, gịnị ka ndị eze nke ụwa kwesịrị ime?

18 Ọ̀ bụ iwu na ndị ọchịchị nke mba nile aghaghị izute mbibi dị otú ahụ? Ee e, n’ihi na ọbụ abụ ahụ ji okwu ndị a rịọ ha arịrịọ, sị: “Ndị eze, nweenụ uche: ka a dọọ unu aka ná ntị, ndị ikpe nke ụwa.” (Abụ Ọma 2:10) A kpọrọ ndị eze òkù ka ha ṅaa ntị, ka ha jiri nghọta mee ihe. Ha kwesịrị ịghọta na atụmatụ ha bụ ihe efu, n’adịghị ka ihe Alaeze Chineke ga-eme maka abamuru nke ihe a kpọrọ mmadụ.

19 Iji nweta ihu ọma Chineke, ndị eze nke ụwa aghaghị ịgbanwe ụzọ ndụ ha. A dụrụ ha ọdụ ka ha ‘were egwu fee Jehova ofufe, werekwa ọma jijiji tegharịa egwú ọṅụ.’ (Abụ Ọma 2:11) Gịnị ma ọ bụrụ na ha emee otú ahụ? Kama ịnọ na-eme oké mkpọtụ, ma ọ bụ na-enwe uche mgbasasị, ha pụrụ ịṅụrị ọṅụ n’ihi atụmanya nke Eze Mezaịa ahụ ga-eche ha n’ihu. Ọ ga-adị mkpa ka ndị ọchịchị nke ụwa hapụ mpako na mfụli elu ha na-egosipụta n’ịchịisi ha. Ọzọkwa, ha aghaghị ime mgbanwe n’egbughị oge ma gosipụta na ha ghọtara nkarị na-enweghị atụ nke ọbụbụeze Jehova karịrị nke ha na ike a na-apụghị ịma aka nke Chineke na Eze Mezaịa ya.

“Sutụnụ Onye A Họpụtaworo Ọnụ”

20, 21. Gịnị ka ọ pụtara bụ́ ‘isutụ onye ahụ a họpụtara ọnụ’?

20 Abụ Ọma nke 2 na-akpọ ndị ọchịchị nke mba dị iche iche òkù obi ebere. Kama ịgbakọ ọnụ iji gosipụta mmegide, a dụrụ ha ọdụ, sị: “Sutụnụ onye a họpụtaworo ọnụ, ka ọ [Jehova Chineke] ghara iwe iwe, unu wee laa n’iyi n’ụzọ, n’ihi na iwe ya ga-ere ọkụ na mgbe nta.” (Abụ Ọma 2:12a) E kwesịrị ịṅa Eze Onyenwe anyị Jehova ntị mgbe ọ tụrụ ụkpụrụ. Mgbe Chineke mere ka Ọkpara ya nọkwasị n’ocheeze, ndị ọchịchị nke ụwa gaara akwụsịwo ‘ịtụgharị ihe efu n’uche.’ Ha gaara anakwerewo Eze ahụ ozugbo ma rubere ya nnọọ isi.

21 N’ihi gịnị ka a ga-eji ‘sutụ onye ahụ a họpụtara ọnụ’? Mgbe e dere abụ ọma a, isutụ ọnụ bụ ngosipụta nke ọbụbụenyi, e jikwa ya anabata ndị ọbịa n’ụlọ, bụ́ ebe a pụrụ ile ha ọbịa nke ọma. Isutụ ọnụ pụkwara ịbụ ihe na-egosi ikwesị ntụkwasị obi. (1 Samuel 10:1) N’amaokwu a nke abụ ọma nke abụọ, Chineke na-enye mba dị iche iche iwu ka ha sutụ Ọkpara ya ọnụ dị ka Eze e tere mmanụ ma ọ bụ nabata ya.

22. Ndị ọchịchị nke mba nile kwesịrị ịṅa ntị n’ịdọ aka ná ntị dị aṅaa?

22 Ndị na-ajụ ịnakwere ikike nke Eze Chineke họpụtara na-elelị Jehova. Ha adịghịkwa anakwere ọbụbụeze eluigwe na ala nke Jehova Chineke na ikike o nwere ịhọpụta Eze kasị mma maka ihe a kpọrọ mmadụ. Ndị ọchịchị nke mba nile ga-achọpụta na Chineke ga-ewesa ha iwe na mberede, mgbe ha na-agbalị imezu atụmatụ ha. “Iwe ya ga-ere ọkụ na mgbe nta,” ngwa ngwa na n’ụzọ a na-apụghị iguzogide eguzogide. Ndị ọchịchị nke mba nile kwesịrị iji ekele nakwere ịdọ aka ná ntị a ma mee ihe kwekọrọ na ya. Ime otú ahụ ga-apụta ndụ.

23. A ka nwere oge maka ndị mmadụ n’otu n’otu ime gịnị?

23 Abụ ọma a nke yiri ihe nkiri na-emechi, na-asị: “Ndị ihe na-agara nke ọma ka ha bụ, bụ́ ndị nile na-agbaba n’ime ya [Jehova].” (Abụ Ọma 2:12b) A ka nwere oge maka ndị mmadụ n’otu n’otu inweta nchebe. Nke ahụ bụ eziokwu ọbụna nye ndị ọchịchị dị iche iche bụ́ ndị nọworo na-akwado atụmatụ nke mba nile. Ha pụrụ ịgbaba n’ime Jehova, bụ́ onye na-enye nchebe n’okpuru ịchịisi Alaeze. Ma ha aghaghị ime ihe tupu Alaeze Mezaịa ahụ etipịasịa mba ndị na-emegide ya.

24. Olee otú anyị pụrụ isi bie ndụ na-eju afọ ọbụna n’ime ụwa a nọ ná nsogbu?

24 Ọ bụrụ na anyị ejiri ịdị uchu na-amụ Akwụkwọ Nsọ ma na-etinye ndụmọdụ ya n’ọrụ ná ndụ anyị, anyị pụrụ ibi ndụ na-eju afọ karị ọbụna ugbu a n’ụwa a nọ ná nsogbu. Itinye ndụmọdụ Akwụkwọ Nsọ n’ọrụ na-eme ka e nwekwuo mmekọrịta ezinụlọ obi ụtọ na nnwere onwe pụọ n’ọtụtụ nchekasị na egwu ndị na-adakwasị ụwa a. Ịgbaso ụkpụrụ Bible na-eme ka anyị nwee obi ike na anyị na-eme ihe na-atọ Onye Okike ụtọ. Ọ dịghị onye ọzọ ma ọ́ bụghị Eze Eluigwe na Ala pụrụ ikwe nkwa “ndụ dị ugbu a na nke ahụ gaje ịbịa” mgbe o kpochapụsịrị ndị na-emegide ezi ihe site n’ịjụ ịchịisi Alaeze ya n’ụwa.—1 Timoti 4:8.

25. Ebe ọ bụ na ‘ụkpụrụ Jehova’ apụghị ịda ada, gịnị ka anyị pụrụ ịtụ anya na ọ ga-eme n’oge anyị?

25 ‘Ụkpụrụ Jehova’ apụghị ịda ada. Dị ka Onye Okike anyị, Chineke maara ihe kasị mma maka ihe a kpọrọ mmadụ, ọ ga-emezukwa nzube ya iji udo, afọ ojuju, na nchebe na-adịgide adịgide gọzie ụmụ mmadụ na-erube isi n’okpuru Alaeze nke Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya. Banyere oge anyị, Daniel onye amụma dere, sị: “N’ụbọchị ha, bụ́ eze ndị a, ka Chineke nke eluigwe ga-eme ka otu alaeze bilie, nke a gaghị emebi emebi ruo mgbe ebighị ebi . . . ọ ga-etipịa alaeze ndị a nile mee ka ha gwụsịa, ma ya onwe ya ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi.” (Daniel 2:44) N’ezie, ugbu a bụ oge ‘isutụ Onye a họpụtaworo ọnụ’ ma jeere Eze Onyenwe anyị Jehova ozi!

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 Na mbụ, ọ bụ Eze Devid bụ ‘onye ahụ e tere mmanụ,’ “ndị eze nke ụwa” bụkwa ndị ọchịchị Filistia bụ́ ndị chịkọtara ndị agha ha imegide ya.

^ par. 7 Amaokwu ndị ọzọ nke Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst na-egosikwa na Jizọs bụ Onye Chineke E Tere Mmanụ nke e kwuru banyere ya n’abụ ọma nke abụọ. Nke a na-apụta ìhè site n’iji Abụ Ọma 2:7 tụnyere Ọrụ 13:32, 33 na Ndị Hibru 1:5; 5:5. Leekwa Abụ Ọma 2:9 na Mkpughe 2:27.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

• “Ihe efu” dị aṅaa ka mba nile ‘na-atụgharị n’uche’?

• N’ihi gịnị ka Jehova ji na-akwa mba nile emo?

• Gịnị bụ ụkpụrụ Chineke megide mba nile?

• Gịnị ka ọ pụtara bụ́ ‘isutụ onye a họpụtaworo ọnụ’?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 16]

Devid bụrụ abụ banyere mmeri nke Eze Mezaịa ahụ

[Foto dị na peeji nke 17]

Ndị ọchịchị na ndị Izrel gbakọrọ izu megide Jizọs Kraịst

[Foto dị na peeji nke 18]

E mewo ka Kraịst nọkwasị n’ocheeze dị ka Eze n’Ugwu Zaịọn nke eluigwe