Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jiri Ihe Mgbaru Ọsọ Ime Mmụọ Wetara Onye Okike Gị Otuto

Jiri Ihe Mgbaru Ọsọ Ime Mmụọ Wetara Onye Okike Gị Otuto

Jiri Ihe Mgbaru Ọsọ Ime Mmụọ Wetara Onye Okike Gị Otuto

“MGBE mmadụ na-amaghị ọdụ ụgbọ mmiri ọ na-aga, o nweghị ifufe na-abụ ezi ifufe.” Okwu a nke a sịrị na ọ bụ ọkà ihe ọmụma narị afọ mbụ bụ́ onye Rom kwuru ya, na-ezo aka n’eziokwu bụ́ na ka ndụ wee nwee ebe o chere ihu, ihe mgbaru ọsọ dị oké mkpa.

Bible na-enye ihe atụ nke ndị maara mkpa ọ dị isetịpụ ihe mgbaru ọsọ. N’ịrụ ọrụ ruo ihe dị ka afọ 50, Noa ‘wuru ụgbọ maka ịzọpụta ezinụlọ ya.’ Onye amụma bụ́ Mozis “legidere anya n’ụgwọ ọrụ a ga-akwụ ya.” (Ndị Hibru 11:7, 26) Onye nọchiri Mozis, bụ́ Jọshụa, nwetara ihe mgbaru ọsọ nke Chineke setịpụrụ bụ́ imeri ala Kenan.—Deuterọnọmi 3:21, 22, 28; Joshua 12:7-24.

Na narị afọ mbụ O.A., ihe ịrụ ụka adịghị ya na okwu Jizọs bụ́ na “a ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi” nwere mmetụta dị ukwuu n’ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ nke Pọl onyeozi. (Matiu 24:14) N’ịbụ onye ozi na ọhụụ ọ natara kpọmkwem site n’aka Onyenwe anyị Jizọs nakwa ọrụ e nyere ya nke “iburu aha [Jizọs] gakwuru mba ndị ọzọ” kpaliri, Pọl keere òkè dị oké mkpa n’iguzobe ọtụtụ ọgbakọ Ndị Kraịst n’Asia Minor nile nakwa na Europe.—Ọrụ 9:15; Ndị Kọlọsi 1:23.

Ee, ndị ohu Jehova kemgbe ụwa anọwo na-esetịpụ ihe mgbaru ọsọ ma na-eru ha, n’ụzọ na-ewetara Chineke otuto. Olee otú anyị pụrụ isi setịpụ ihe mgbaru ọsọ taa? Ihe mgbaru ọsọ ndị dị aṅaa ka anyị pụrụ ịgbalịsi ike iru, nzọụkwụ ndị dịkwa aṅaa dị irè ka anyị pụrụ iwere iji ruo ha?

Ebumnobi Ziri Ezi Dị Oké Mkpa

A pụrụ isetịpụ ihe mgbaru ọsọ n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ akụkụ ọ bụla nke ndụ, e nwekwara ndị ji ihe mgbaru ọsọ kpọrọ ihe n’ụwa a. Otú ọ dị, ihe mgbaru ọsọ ọchịchị Chineke na oké ọchịchọ nke ụwa abụghị otu ihe. Ebumnobi bụ́ isi e ji esetịpụ ọtụtụ ihe mgbaru ọsọ n’ụwa bụ oké ọchịchọ maka akụ̀ na ụba na agụụ na-adịghị ebi ebi maka ọkwá na ike. Lee ka ọ ga-esi bụrụ ihie ụzọ ịchụso ihe mgbaru ọsọ nke inweta ike na ịbụ onye a ma ama! Ihe mgbaru ọsọ ndị na-ewetara Jehova Chineke otuto na ofufe anyị na-efe ya na ihe ndị metụtara Alaeze ahụ nwere nnọọ njikọ. (Matiu 6:33) A na-esetịpụ ihe mgbaru ọsọ ndị dị otú ahụ n’ihi ịhụnanya maka Chineke na ụmụ mmadụ ibe anyị, ha na-enwekwa nsọpụrụ Chineke dị ka nzube ha.—Matiu 22:37-39; 1 Timoti 4:7.

Ka ebumnobi anyị dịrị ọcha ka anyị na-esetịpụ ma na-achụso ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ, ma hà bụ inweta ihe ùgwù ije ozi ma ọ bụ inwekwu ọganihu ime mmụọ onwe onye. N’agbanyeghị nke ahụ, mgbe ụfọdụ, a dịghị eru ọbụna ihe mgbaru ọsọ ndị e bu ezi ihe n’obi setịpụ. Olee otú anyị pụrụ isi setịpụ ihe mgbaru ọsọ ma nwee nnọọ ike iru ha?

A Ghaghị Inwe Ọchịchọ Siri Ike

Tụlee otú Jehova si rụzuo ọrụ nke ike eluigwe na ala. Jehova ji okwu bụ́ “anyasị wee dị, ụtụtụ wee dị,” kewaa oge okike ndị sochiri onwe ha. (Jenesis 1:5, 8, 13, 19, 23, 31) Ná mmalite nke oge okike ọ bụla, ọ maara ihe mgbaru ọsọ, ma ọ bụ ebumnobi ya, maka ụbọchị ahụ. Chineke mezukwara nzube ya nke ike ihe. (Mkpughe 4:11) “Mkpụrụ obi [Jehova] achọsiwokwa ike, O wee mee ya,” ka nna ochie bụ́ Job kwuru. (Job 23:13) Lee ka ọ na-aghaghị isiwo bụrụ ihe afọ ojuju nye Jehova ịhụ “ihe nile ọ bụla O mere” ma kwuo na ha “dị mma nke ukwuu”!—Jenesis 1:31.

Ka anyị wee ruo ihe mgbaru ọsọ anyị, anyị onwe anyị kwa aghaghị inwe ọchịchọ siri ike iru ha. Gịnị ga-enyere anyị aka inwe ọchịchọ siri ike dị otú ahụ? Ọbụna mgbe ụwa ka bụ ihe tọgbọrọ n’efu na ihe tọgbọrọ nkịtị, Jehova pụrụ ịhụ otú ọ ga-emesị dị—ọmarịcha ọla dị ná mbara igwe, nke na-ewetara ya otuto na nsọpụrụ. N’ụzọ yiri nke ahụ, anyị pụrụ ịzụlite ọchịchọ anyị imezu ihe anyị kpebiri ime site n’ịtụgharị uche n’ihe ndị ga-esi n’iru ihe mgbaru ọsọ anyị pụta na abamuru ya. Nke ahụ bụ ahụmahụ Tony bụ́ onye dị afọ 19. O chefutụghị mmasị mbụ o nwere mgbe o letara otu alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Europe. Site mgbe ahụ gaa n’ihu, ajụjụ dị n’uche Tony bụ, ‘Gịnị ka ọ ga-adị ka ya ibi na ije ozi n’ebe dị otú a?’ Tony akwụsịtụghị iche otú nke ahụ ga-esi kwe omume, ọ nọgidekwara na-eme mgbalị iji ruo ya. Lee ka o si nwee obi ụtọ afọ ole na ole ka e mesịrị mgbe a nabatara akwụkwọ o dejupụtara ije ozi n’alaka ụlọ ọrụ ahụ!

Anyị iso ndị ọzọ ruworo otu ihe mgbaru ọsọ na-akpakọrịta pụkwara ime ka anyị nwee ọchịchọ iru ya. Jayson, bụ́ onye dị afọ 30, enweghị mmasị n’ikere òkè n’ozi ubi ná mmalite nke afọ iri na ụma ya. Ma mgbe o si n’ụlọ akwụkwọ sekọndrị pụta, o ji ịnụ ọkụ n’obi banye ozi ọsụ ụzọ, si otú ahụ na-aghọ onye nkwusa Alaeze oge nile. Gịnị nyeere Jayson aka ịzụlite ọchịchọ ịsụ ụzọ? Ọ na-aza, sị: “Iso ndị ọzọ sụworo ụzọ na-ekwurịta okwu na iso ha na-arụ n’ozi nwere mmetụta dị ukwuu n’ahụ́ m.”

Idetu Ihe Mgbaru Ọsọ Anyị Edetu Pụrụ Inye Aka

Echiche nkịtị na-edo anya mgbe anyị kwupụtara ya ekwupụta. Solomọn kwuru na okwu kwesịrị ekwesị pụrụ ịdị ike ka ndụdụ n’inye nduzi ná ndụ. (Eklisiastis 12:11) Mgbe e dere okwu ndị ahụ ede, ha na-enwe mmetụta siri ike n’uche na n’obi. Ọ́ bụghị nke ahụ mere Jehova ji nye ndị eze Izrel iwu idepụtaghachi Iwu ahụ n’onwe ha? (Deuterọnọmi 17:18) N’ihi ya, anyị pụrụ ịchọ idetu ihe mgbaru ọsọ anyị na otú anyị ga-esi eru ha edetu, na-edepụta ihe mgbochi dị iche iche anyị na-atụ anya izute na ụzọ anyị ga-esi merie ha. Ọ pụkwara inye aka ma ọ bụrụ na anyị amata isiokwu ndị anyị na-aghaghị ịmara nke ọma, nkà ndị dị anyị mkpa inweta, na mmadụ ndị pụrụ inyere anyị aka ma kwado anyị.

Isetịpụrụ onwe ya ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ kasiri Geoffrey obi, bụ́ onye ọsụ ụzọ pụrụ iche nke jeworo ozi ruo ogologo oge n’ókèala dịpụrụ adịpụ dị n’otu mba Eshia. Ọdachi dakwasịrị ya mgbe nwunye ya nwụrụ na mberede. Mgbe o nwetatụrụ onwe ya, Geoffrey kpebiri itinye onwe ya kpam kpam n’ozi ọsụ ụzọ ya site n’isetịpụ ihe mgbaru ọsọ. Mgbe o detusịrị atụmatụ ya n’akwụkwọ, o jiri ekpere setịpụ ihe mgbaru ọsọ nke ịmalite ọmụmụ Bible atọ ka ọ na-erule ná ngwụsị ọnwa. Kwa ụbọchị, ọ tụleghachiri ozi ya, kwa ụbọchị iri ọ bụlakwa, o nyochara ọganihu ya. Ò ruru ihe mgbaru ọsọ ya? Site n’inye akụkọ ozi bu ọmụmụ Bible ọhụrụ anọ, o ji ọṅụ zaa ee!

Setịpụ Ihe Mgbaru Ọsọ Ndị A Ga-eru Ngwa Ngwa Dị Ka Ihe Nnwale

Ná mmalite, ihe mgbaru ọsọ ụfọdụ pụrụ iyi ndị a na-apụghị iru eru. Nye Tony, bụ́ onye a kpọtụrụ aha ná mmalite, ije ozi n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova yiri nrọ nkịtị. Nke ahụ bụ n’ihi na ọ nọwo na-ebi ndụ na-ezighị ezi, ọbụna ọ rarabeghị onwe ya nye Chineke. Ma Tony kpebiri ime ka ndụ ya kwekọọ n’ụzọ Jehova ma mee ka ọ bụrụ ihe mgbaru ọsọ ya iru eru maka baptizim. Mgbe o rusịrị ihe mgbaru ọsọ ahụ, o setịpụrụ ihe mgbaru ọsọ nke ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka na nke oge nile, na-akanye ụbọchị ndị ọ ga-achọ ịmalite akara na kalenda. Mgbe ọ sụworo ụzọ ruo oge ụfọdụ, ije ozi n’alaka ụlọ ọrụ eyighịzi ihe mgbaru ọsọ a na-apụghị iru eru.

Anyị onwe anyị kwa pụrụ ime nke ọma ikerisị ihe mgbaru ọsọ anyị ndị ga-ewe ogologo oge gaa n’ihe mgbaru ọsọ ndị a pụrụ iru ngwa ngwa. Ihe mgbaru ọsọ ndị ahụ dị n’etiti pụrụ ịbụ ihe nnwale ndị a pụrụ iru eru ka a na-agbalị iru ihe mgbaru ọsọ ga-ewe ogologo oge. Ịdị na-atụle mgbe nile ọganihu anyị na-enwe n’iru ihe nnwale ndị ahụ pụrụ inyere anyị aka ime ka uche anyị dịgide n’otu ebe. Ikpegara Jehova ekpere ugboro ugboro banyere atụmatụ anyị ga-enyekwara anyị aka ịnọgide na-achụso ihe mgbaru ọsọ anyị. “Na-ekpenụ ekpere n’akwụsịghị akwụsị,” ka Pọl onyeozi dụrụ n’ọdụ.—1 Ndị Tesalonaịka 5:17.

Mkpebi Siri Ike na Nnọgidesi Ike Dị Mkpa

N’agbanyeghị atụmatụ ndị e chere echiche nke ọma mee na ọchịchọ siri ike anyị nwere imezu ha, anyị apụghị iru ihe mgbaru ọsọ ụfọdụ. Lee mwute onye na-eso ụzọ bụ́ Jọn Mak na-aghaghị inwewo mgbe Pọl onyeozi na-achọghị ịkpọ ya mee njem ozi ala ọzọ nke abụọ Pọl! (Ọrụ 15:37-40) Mak aghaghị ịmụrụ ihe site n’ihe mwute a mere ya ma mezigharịa ihe mgbaru ọsọ ya iji mụbaa ozi ya. Ihe àmà na-egosi na o mere otú ahụ. Mgbe e mesịrị, Pọl kwuru okwu ọma banyere Mak, o sokwa Pita onyeozi nwee mkpakọrịta chiri anya na Babilọn. (2 Timoti 4:11; 1 Pita 5:13) Ikekwe, ihe ùgwù kasịnụ o nwere bụ nke ide ihe ndekọ sitere n’ike mmụọ nsọ banyere ndụ na ozi Jizọs.

Ka anyị na-achụso ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ, anyị onwe anyị pụkwara inwe ihe ndọghachi azụ. Kama inwe nkụda mmụọ, anyị aghaghị ịtụleghachi, inyochagharị, na ịgbanwegharị ihe. Mgbe e nwere ihe mgbochi, ọ dị anyị mkpa iji mkpebi siri ike na nnọgidesi ike na-etinye mgbalị. “Tụrụ ọrụ gị nile ruo Jehova ahụ́, echiche gị nile ewee guzosie ike,” ka Eze Solomọn na-emesi anyị obi ike.—Ilu 16:3.

N’agbanyeghị nke ahụ, mgbe ụfọdụ, ọnọdụ e nwere na-eme ka ịchụso ihe mgbaru ọsọ ụfọdụ yie ihe na-enweghị isi. Dị ka ihe atụ, nsogbu ahụ́ ike ma ọ bụ ibu ọrụ ezinụlọ pụrụ ime ka anyị ghara iru ihe mgbaru ọsọ ụfọdụ. Ka anyị ghara ichefu eziokwu ahụ bụ́ na ihe mgbaru ọsọ kasịnụ bụ ndụ ebighị ebi—n’eluigwe ma ọ bụ na Paradaịs n’elu ụwa. (Luk 23:43; Ndị Filipaị 3:13, 14) Olee otú e si eru nke a? “Onye na-eme uche Chineke na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi,” ka Jọn onyeozi dere. (1 Jọn 2:17) Ọ bụ ezie na ọnọdụ anyị nwere ike ghara ikwe ka anyị ruo otu ihe mgbaru ọsọ, anyị ka pụrụ ‘ịtụ egwu Chineke, debekwa ihe nile O nyere n’iwu.’ (Eklisiastis 12:13) Ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ na-enyere anyị aka ilekwasị anya n’ime uche Chineke. N’ihi ya, ka anyị jiri ha na-ewetara Onye Okike anyị otuto.

[Igbe dị na peeji nke 22]

Ihe Mgbaru Ọsọ Ime Mmụọ Ndị A Ga-atụle

○ Ịgụ Bible kwa ụbọchị

○ Ịgụ mbipụta ọ bụla nke Ụlọ Nche na Teta!

○ Ime ka ekpere anyị ka mma

○ Igosipụta mkpụrụ nke mmụọ nsọ

○ Ịgbalị iru eru maka ihe ùgwù ije ozi ka ukwuu

○ Ịdịkwu irè n’ime nkwusa na izi ihe

○ Ịzụlite nkà ndị dị ka iji telifon agba àmà, ịgba àmà n’oge a na-anọghị n’ozi, na ịgba àmà n’ógbè azụmahịa