Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịchọta Ndụmọdụ Kasị Baa Uru

Ịchọta Ndụmọdụ Kasị Baa Uru

Ịchọta Ndụmọdụ Kasị Baa Uru

NDỤ na-aga nke ọma bụ n’ezie ihe a na-achọsi ike. Ezi ndụmọdụ na ọchịchọ ime ihe kwekọrọ na ya bụ ihe ndị bụ́ isi n’inweta ndụ dị otú ahụ n’ụwa a nke nọ ná mgbagwoju anya. Otú ọ dị, ọ bụghị mgbe nile ka ụmụ mmadụ dịworo njikere ige ntị na ndụmọdụ bara uru. Ọtụtụ ndị azọrọwo na mmadụ kwesịrị ibi ndụ dị ka o si chọọ. N’ezie, ihe ndekọ Bible na-egosi na Setan, bụ́ onye iro mbụ nke ọbụbụeze Chineke, kwere ụmụ mmadụ mbụ nkwa nnwere onwe. Jenesis 3:5 dekọrọ ihe ọ gwara Iv: “Chineke maara na n’ụbọchị unu ga-eri mkpụrụ sitere [n’osisi ịma ezi ihe na ihe ọjọọ], mgbe ahụ ka a ga-emeghe anya unu, unu ewee dị ka Chineke, na-ama ezi ihe na ihe ọjọọ.”

Mgbe nke ahụ gasịrị, Adam na Iv hà biri ndụ nwere ihe ịga nke ọma, n’enwetaghị ajọ ihe ndị si n’omume ha pụta, bụrụ ndị nanị echiche nke onwe ha na-eduzi? Ọ dịghị ma ọlị. Ihe si na ha ịzọrọ na ha ma ezi ihe na ihe ọjọọ pụta wetaara ha ndakpọ olileanya ozugbo. N’ụzọ ziri ezi, Chineke gbahapụrụ ha, ha malitekwara ibi ndụ ahụhụ n’ezughị okè, ọnwụ abụrụkwa ihe ikpeazụ ọ rụpụtaara ha. (Jenesis 3:16-19, 23) Ọnwụ na-emetụta anyị nile. Bible na-ekwu, sị: “Mmehie sitere n’otu mmadụ [Adam] bata n’ụwa, ọnwụ esitekwa ná mmehie, ọnwụ ewee si otú ahụ gbasaa ruo mmadụ nile n’ihi na ha nile emehiewo.”—Ndị Rom 5:12.

Ọ bụ ezie na nhọrọ Adam na Iv kpatara ihe ndị dị njọ, ọtụtụ ekwetabeghị na ọ bụ ihe amamihe dị na ya itinye ndụmọdụ sitere n’aka Onye mere mmadụ n’ọrụ. Otú ọ dị, Bible na-ekwu na ya “sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke, baakwa uru,” ọ pụkwara inyere anyị aka ‘iru eru n’ụzọ zuru ezu, bụrụ ndị a kwadebere n’ụzọ zuru ezu maka ezi ọrụ ọ bụla.’ (2 Timoti 3:16, 17) Anyị ga-enwe obi ụtọ n’ezie karị ma ọ bụrụ na anyị agbasoo ndụmọdụ dị n’ime Bible. Ndụ ezinụlọ bụ ebe bụ́ isi nke a metụtara.

Ikwesị Ntụkwasị Obi n’Alụmdi na Nwunye

Dị ka Bible si kwuo, Chineke zubere ka alụmdi na nwunye bụrụ ihe na-adịgide adịgide. (Jenesis 2:22-24; Matiu 19:6) Ọzọkwa, Akwụkwọ Nsọ na-ekwu na ‘e kwesịghị imerụ ihe ndina alụmdi na nwunye,’ nke pụtara na e kwesịghị imerụ nkekọ a site n’iso onye na-abụghị di ma ọ bụ nwunye mmadụ nwee mmekọahụ. (Ndị Hibru 13:4) Otú ọ dị, dị ka ị maara ma eleghị anya, ọtụtụ alụmdi na nwunye taa adịghị eru ihe a a chọrọ ha n’aka. Ụfọdụ ndị nwere àgwà nke iso ndị na-abụghị onye òtù ọlụlụ ha eme mfegharị n’ebe ọrụ. Ndị ọzọ na-aghara ndị ezinụlọ ha ụgha iji nwee ike ịnọnyere onye ha nwere ndọrọ mmekọahụ n’ebe ọ nọ na-abụghị onye òtù ọlụlụ ha. Ọbụna ụfọdụ na-agbahapụ onye òtù ọlụlụ ha iji binyere onye ka onye òtù ọlụlụ ha bụrụ okorobịa ma ọ bụ agbọghọbịa, na-ekwu na nke ahụ na-eme ka ha na-ele onwe ha anya dị ka ụmụ okorobịa ma ọ bụ ụmụ agbọghọbịa ma na-eme ha obi ụtọ karị, dị ka o mere n’ọnọdụ Verónica, bụ́ onye a kpọtụrụ aha n’isiokwu bu nke a ụzọ.

Otú o sina dị, mkpebi siri ike nke ime onwe onye obi ụtọ n’agbanyeghị ihe ọ ga-ewe agaghị eweta obi ụtọ na-adịgide adịgide. Ronald pụrụ ịgba akaebe nke ahụ. N’ikwere na ya pụrụ ime ka ndụ ya ka mma, ọ hapụrụ nwunye ya iji soro nwanyị ya na ya nọworo na-eme enyi na nzuzo ruo afọ isii bụ́ onye mụwooro ya ụmụ abụọ malite ezinụlọ ọzọ. Otú ọ dị, obere oge ka o wetasịrị alụmdi na nwunye ya ná njedebe, nwanyị ahụ ya na ya nọworo na-eme enyi hapụrụ ya! N’ikpeazụ, Ronald gara binyere ndị mụrụ ya. Ọ kọwara ọnọdụ ya dị ka “nke na-eme ihere.” Nke ahụ bụ nanị otu ihe atụ. Omume dị otú ahụ nke ịchọ ọdịmma onwe onye nanị na-akwalite akpatawo mmụba na-enweghị atụ nke ịgba alụkwaghịm na ndakpọ ezinụlọ, na-akpatara ọnụ ọgụgụ mmadụ a na-apụghị ịgụta ọnụ—ma ndị toworo eto ma ụmụaka—nhụjuanya.

N’aka nke ọzọ, itinye ndụmọdụ Bible n’ọrụ na-arụpụta ezi obi ụtọ. Nke ahụ mere n’ọnọdụ Roberto, bụ́ onye na-ekwu, sị: “N’ihi ndụmọdụ Bible, ahapụghị m nwunye m. Anyị adịghị enweta ezi obi ụtọ site n’ịdaba n’ọnwụnwa n’ebe onye na-abụghị onye òtù ọlụlụ anyị nọ, ọ bụrụgodị na onye ahụ yiri onye na-adọrọ adọrọ. Nkụzi Bible enyeworo m aka iji nwunye m kpọrọ ihe, bụ́ onye mụ na ya biworo ruo ọtụtụ afọ.” Ndụmọdụ Bible bụ́ “ka nwoke gharakwa ịghọgbu nwunye ọ lụtara n’okorobịa” rụrụ ọrụ dị mkpa ná ndụ Roberto. (Malakaị 2:15) N’akụkụ ndị ọzọ dị aṅaa ka anyị pụrụ irite uru na ndụmọdụ Chineke?

Nzụlite nke Ụmụ Anyị

Iri afọ ole na ole gara aga, echiche bụ́ na n’ịzụ ụmụ ha ndị nne na nna ekwesịghị ịkpara ụmụ ha ókè n’ọtụtụ ihe ghọrọ ihe a ma ama. O yiri ka ọ̀ bụ ihe ezi uche dị na ya ịhapụ ụmụaka ka ha na-eme mkpebi nke ha banyere otú ha ga-esi na-eche echiche ma na-akpa àgwà. Nzube ya bụ iji zere ịkpagbu ntolite ha. N’ụfọdụ ebe, e guzobere ọbụna usoro mmụta ndị na-enwechaghị iwu nchịkwa bụ́ nke, gụnyere ihe ndị ọzọ, na-enye ụmụ akwụkwọ ohere ikpebi ma hà ga-amụ ihe ma ọ bụ na ha agaghị amụ, ha pụkwara ịhọrọ ókè ha ga-enweru ntụrụndụ ma ọ bụ nara ntụziaka. Ụkpụrụ nke otu ụlọ akwụkwọ dị otú ahụ bụ “ịhapụ ụmụaka ka ha na-eme otú masịrị ha n’enweghị okenye ga-agwa ha ihe ha ga-eme.” Taa, ụfọdụ ndị ndụmọdụ n’akparamàgwà ụmụ mmadụ ka na-arụ ụka na inye ụdị ịdọ aka ná ntị ụfọdụ abaghị uru, ọbụna n’ebe ndị nne na nna lere ya anya dị ka ihe dị mkpa inye ịdọ aka ná ntị ịhụnanya.

Gịnị siworo na ya pụta? E nwere ọtụtụ ndị kweere na ụdị ọzụzụ nke ikwe ka ụmụaka na-eme otú masịrị ha emewo ka ụmụaka nwere onwe ha gabiga ókè. Ha na-eche na nke a akpatawo mmụba nke ime mpụ na ịṅụ ọgwụ ọjọọ. Otu nnyocha e mere na United States kpughere na ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ pasent 70 nke ndị a gbara ajụjụ ọnụ chere na ụmụaka na ndị na-eto eto adịghị enwetacha nduzi nne na nna zuru ezu. Mgbe ha na-agbalị ịkọwa ihe na-akpata ịgba égbè n’ụlọ akwụkwọ na mpụ ndị ọzọ dị egwu ndị nọ n’afọ iri na ụma na-eme, ọtụtụ na-ebo ya “ndị nne na nna ịghara ịchịkwa ụmụ ha.” Ọbụnakwa mgbe ọ na-akpatachaghị ọdachi, ndị nne na nna na ụmụ ha na-aghọrọ mkpụrụ dị ilu azụghị nwa nke ọma na-amịpụta.

Gịnị ka Bible nwere ikwu na nke a? Ndụmọdụ sitere n’Akwụkwọ Nsọ bụ na ndị nne na nna kwesịrị iji ikike ha mee ihe n’ịhụnanya nakwa ná nkwụsi ike. Bible na-ekwu, sị: “Uche gbagọrọ agbagọ bụ ihe e kekọtaworo n’obi nwata; ma mkpanaka nke ịdọ aka ná ntị ga-eme ka ọ dị anya n’ebe ọ nọ.” (Ilu 22:15) N’ezie, ịdọ aka ná ntị nile ndị nne na nna na-enye kwesịrị ikwekọ n’ọnọdụ ndị e nwere. Ịdị nwayọọ, njide onwe onye, na nchebara echiche kwesịrị ịchịkwa ịdọ aka ná ntị ọ bụla e nyere. N’ụzọ dị otú a, ọ ga-abụ ihe àmà nke ịhụnanya. Ndị nne na nna iji ikike ha eme ihe n’ụzọ ịhụnanya, n’abụghị n’obi ịta mmiri, ga-akasị mee ka e nwee ihe ịga nke ọma.

Itinye ndụmọdụ a n’ọrụ na-arụpụta ezi ihe ndị a hụrụ anya. Arturo, nwoke gbara afọ 30 nke bi na Mexico bụ́ onye lụrụ nwanyị n’oge na-adịbeghị anya na-ekwu, sị: “Papa m mere ka o doo mụ na ụmụnne m anya na ọ bụ ya na mama m na-achịkwa ezinụlọ anyị. Ọ dịghị mgbe ha lara azụ n’ịdọ anyị aka ná ntị. N’agbanyeghị nke ahụ, ha na-ewepụta oge iso anyị kwurịta okwu. Ugbu a, dị ka onye toworo eto, eji m ndụ kwụsiri ike m na-ebi kpọrọ ihe, amakwaara m na ihe kpatara ya karịsịa bụ ezi nduzi m nwetara.”

Jiri Ndụmọdụ Kasị Baa Uru Mee Ihe

Okwu Chineke, bụ́ Bible, nwere ndụmọdụ kasị baa uru ihe a kpọrọ mmadụ nwetụrụla. Ọ bụghị nanị ndokwa ezinụlọ ka nduzi ya na-achịkwa. Ọ na-enye aka ịkwadebe anyị n’ọtụtụ ụzọ n’ihi na ọ na-akụziri anyị otú anyị ga-esi na-akpa àgwà n’ụwa ebe ihe ka n’ọnụ ọgụgụ na-adịghị njikere ịnakwere eziokwu bụ́ na Isi Iyi kasịnụ nke ihe ọmụma kwesịrị ịchịkwa ndụ ha maka abamuru ha.

Jehova Chineke, Onye Okike nke ihe a kpọrọ mmadụ, nyere mmesi obi ike a site n’ọnụ ọbụ abụ ahụ bụ́ Devid, sị: “M ga-eme ka i nwee uche, M ga-ezikwa gị ihe n’ụzọ nke ị ga-eje ije n’ime ya: M ga-adụ gị ọdụ, anya m ga-adịkwasịkwa gị n’ahụ́.” (Abụ Ọma 32:8) Ị̀ pụrụ ichetụ n’echiche ihe ọ pụtara bụ́ Onye Okike ilegide anyị anya iji chebe anyị pụọ n’ihe ize ndụ? Otú ọ dị, ajụjụ dịịrị onye ọ bụla n’ime anyị bụ: M̀ ga-eji obi umeala nakwere nduzi nchebe Jehova?’ Okwu ya ji ịhụnanya na-agwa anyị, sị: “Tụkwasị Jehova obi gị nile, adaberekwala nghọta gị: n’ụzọ gị nile mara Ya, Ya onwe ya ga-emekwa ka okporo ụzọ gị nile zie ezie.”—Ilu 3:5, 6.

Ịmata Jehova na-achọ mgbalị na ịnọgidesi ike n’ihe, n’agbanyeghị nke ahụ, ihe a kpọrọ mmadụ pụrụ ịmata ya site na Bible. Ụzọ ndụ ọ chọrọ ka anyị gbasoo “nwere nkwa maka ndụ dị ugbu a na nke ahụ gaje ịbịa.” Ọ bụ n’ezie ụzọ isi rite uru dị ukwuu n’ihi abamuru ndị anyị ga-enweta na ya.—1 Timoti 4:8; 6:6.

Ọ bụrụ na i nwere mmasị n’ihe ọmụma ndị a na-enweta na Bible nakwa ná ngọzi ndị na-abịa site n’ibi ndụ kwekọrọ na ha, mee ka ịgụ na ịtụgharị uche n’Okwu Chineke bụrụ ihe mbụ ná ndụ gị. Ime otú ahụ ga-enyere gị aka ịnagide ihe ịma aka ndị nke oge a na ndị nke ga-abịa n’ọdịnihu n’ụzọ gara nke ọma. Tụkwasị na nke ahụ, ị ga-enwe olileanya nke ibi n’ụwa ọhụrụ nke Chineke, bụ́ ebe mmadụ nile ga-abụ ndị Jehova ziri ihe, udo ha abaakwa ụba.—Aịsaịa 54:13.

[Foto dị na peeji nke 5]

Ndụmọdụ Bible pụrụ iwusi nkekọ alụmdi na nwunye ike

[Foto ndị dị na peeji nke 6]

Ndụmọdụ Bible bụ ihe ndabere maka ezi nduzi, n’agbanyeghị nke ahụ, ọ na-enye ohere maka inwe ntụrụndụ

[Foto ndị dị na peeji nke 7]

Ndị na-etinye ndụmọdụ Bible n’ọrụ pụrụ ibi ndụ a haziri ahazi