Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị A Na-akpagbu Ma Ha Enwee Obi Ụtọ

Ndị A Na-akpagbu Ma Ha Enwee Obi Ụtọ

Ndị A Na-akpagbu Ma Ha Enwee Obi Ụtọ

“Obi ụtọ na-adịrị unu mgbe ndị mmadụ na-akọcha unu ma na-akpagbu unu, jirikwa ụgha na-ekwu ụdị ihe ọjọọ ọ bụla megide unu n’ihi m.”—MATIU 5:11.

1. Mmesi obi ike dị aṅaa ka Jizọs nyere ụmụazụ ya banyere obi ụtọ na mkpagbu?

MGBE mbụ Jizọs zipụrụ ndịozi ya ikwusa Alaeze ahụ, ọ dọrọ ha aka ná ntị na a ga-emegide ha. Ọ gwara ha, sị: “Mmadụ nile ga-akpọkwa unu asị n’ihi aha m.” (Matiu 10:5-18, 22) Otú ọ dị, tupu mgbe ahụ, n’Ozizi Elu Ugwu ya, o mesiri ndịozi ya na ndị ọzọ obi ike na mmegide dị otú ahụ apụtachaghị na obi ụtọ miri emi ha nwere ga-anọ n’ihe ize ndụ. N’ezie, Jizọs jikọtara ọbụna inwe obi ụtọ na ịbụ ndị a kpagburu dị ka Ndị Kraịst! Olee otú mkpagbu pụrụ isi weta obi ụtọ?

Ndị Na-ata Ahụhụ n’Ihi Ezi Omume

2. Dị ka Jizọs na Pita onyeozi si kwuo, olee ụdị ịta ahụhụ na-eweta obi ụtọ?

2 Okwu obi ụtọ nke asatọ Jizọs kwuru bụ: “Obi ụtọ na-adịrị ndị a kpagbuworo n’ihi ezi omume, ebe ọ bụ na alaeze nke eluigwe bụ nke ha.” (Matiu 5:10) Ịta ahụhụ n’onwe ya adịghị eweta ọṅụ. Pita onyeozi dere, sị: “Gịnị bụ uru dị na ya ma ọ bụrụ na, mgbe unu na-emehie ma bụrụ ndị a na-ama ụra, unu atachie obi? Ma ọ bụrụ na, mgbe unu na-eme ihe ọma ma na-ata ahụhụ, unu atachie obi, nke a bụ ihe dị mma n’ebe Chineke nọ.” Ọ gara n’ihu ikwu, sị: “Otú ọ dị, ka onye ọ bụla n’ime unu ghara ịta ahụhụ dị ka onye na-egbu ọchụ ma ọ bụ onye ohi ma ọ bụ onye ajọ omume ma ọ bụ dị ka onye na-enyonye anya n’ihe ndị gbasara ndị ọzọ. Ma ọ bụrụ na ọ na-ata ahụhụ dị ka Onye Kraịst, ka ihere ghara ime ya, kama ka ọ nọgide na-enye Chineke otuto n’aha nke a.” (1 Pita 2:20; 4:15, 16) Dị ka okwu Jizọs na-egosi, ahụhụ na-eweta obi ụtọ mgbe a na-ata ya n’ihi ezi omume.

3. (a) Gịnị ka ịbụ onye a kpagburu n’ihi ezi omume pụtara? (b) Mmetụta dị aṅaa ka mkpagbu nwere n’ahụ́ Ndị Kraịst oge mbụ?

3 A na-eji ime uche Chineke na irubere iwu ya isi amata ezigbo ezi omume. Ya mere, ịta ahụhụ n’ihi ezi omume pụtara ịta ahụhụ n’ihi na mmadụ na-eguzogide nrụgide nke imebi ụkpụrụ Chineke ma ọ bụ ihe ọ chọrọ n’aka anyị. Ndị ndu ndị Juu kpagburu ndịozi n’ihi ịjụ ịkwụsị ikwusa oziọma n’aha Jizọs. (Ọrụ 4:18-20; 5:27-29, 40) Nke a ò mere ka ọṅụ ha belata ma ọ bụ ka ha kwụsị ime nkwusa? Ọ dịghị ma ọlị! “[Ha] si n’ihu Sanhedrin ahụ pụọ, na-aṅụrị ọṅụ n’ihi na a gụwo ha ná ndị ruru eru ịbụ ndị a ga-emenye ihere n’ihi aha ya. Kwa ụbọchị kwa, n’ụlọ nsọ na site n’ụlọ ruo n’ụlọ, ha nọgidere n’esepụghị aka na-ezi ihe ma na-akpọsa ozi ọma banyere Kraịst, bụ́ Jizọs.” (Ọrụ 5:41, 42) Mkpagbu a wetaara ha ọṅụ ma mee ka ịnụ ọkụ n’obi ha nwere n’ọrụ ime nkwusa dịghachi ọhụrụ. Ndị Rom mesịrị kpagbuo Ndị Kraịst oge mbụ n’ihi na ha jụrụ ikere òkè n’ofufe eze ukwu.

4. Olee ihe ụfọdụ ndị mere e ji akpagbu Ndị Kraịst?

4 N’oge a, a kpagbuwo Ndịàmà Jehova n’ihi na ha jụrụ ịkwụsị ikwusa “ozi ọma nke a nke alaeze.” (Matiu 24:14) Mgbe a machibidoro nzukọ Ndị Kraịst ha iwu, ha na-adị njikere ịta ahụhụ kama ịkwụsị izukọta ọnụ dị ka Bible nyere n’iwu. (Ndị Hibru 10:24, 25) A kpagbuwo ha n’ihi nnọpụiche Ndị Kraịst ha ma ọ bụ n’ihi ịjụ iji ọbara eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. (Jọn 17:14; Ọrụ 15:28, 29) Ka o sina dị, nguzo a siri ike ndị Chineke nke oge a na-ewere maka ezi omume na-ewetara ha nnọọ udo nke obi na obi ụtọ.—1 Pita 3:14.

Ndị A Na-akọcha n’Ihi Kraịst

5. N’ihi ihe dị aṅaa bụ́ isi ka e ji akpagbu ndị Jehova taa?

5 Okwu obi ụtọ nke itoolu Jizọs tụlere n’Ozizi Elu Ugwu ya na-ekwukwa banyere mkpagbu. O kwuru, sị: “Obi ụtọ na-adịrị unu mgbe ndị mmadụ na-akọcha unu ma na-akpagbu unu, jirikwa ụgha na-ekwu ụdị ihe ọjọọ ọ bụla megide unu n’ihi m.” (Matiu 5:11) Isi ihe mere e ji akpagbu ndị Jehova bụ na ha abụghị akụkụ nke ajọ usoro ihe a. Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “A sị na unu bụ akụkụ nke ụwa, ụwa gaara ahụ ihe bụ́ nke ya n’anya. Ma n’ihi na unu abụghị akụkụ nke ụwa, kama ahọpụtawo m unu n’ụwa, n’ihi nke a ụwa na-akpọ unu asị.” (Jọn 15:19) N’otu aka ahụ, Pita onyeozi kwuru, sị: “N’ihi na unu anọgideghị soro ha na-agba ọsọ n’otu ndụ ịla n’iyi a, ọ na-eju ha anya, ha na-agakwa n’ihu na-ekwujọ unu.”—1 Pita 4:4.

6. (a) N’ihi gịnị ka e ji akọcha ma na-akpagbu ihe ahụ fọdụrụ na ndị enyi ha? (b) Nkọcha dị otú ahụ ọ̀ na-ebelata obi ụtọ anyị?

6 Anyị ahụwo na a kpagburu Ndị Kraịst oge mbụ n’ihi na ha jụrụ ịkwụsị ime nkwusa n’aha Jizọs. Kraịst nyere ụmụazụ ya ọrụ, sị: “Unu ga-agbakwa àmà banyere m . . . ruo n’akụkụ kasị anya n’ụwa.” (Ọrụ 1:8) N’ịbụ ndị ndị enyi ha na-eguzosi ike n’ihe bụ́ “oké ìgwè mmadụ” ahụ na-enyere aka, ihe ahụ fọdụrụ n’ụmụnna Kraịst e tere mmanụ bụ́ ndị na-ekwesị ntụkwasị obi ejiriwo ịnụ ọkụ n’obi rụọ ọrụ ahụ. (Mkpughe 7:9) Ya mere, Setan na-ebuso “ndị fọdụrụ n’ime mkpụrụ ya [mkpụrụ nke “nwanyị” ahụ, bụ́ akụkụ nke eluigwe nke nzukọ Chineke] agha, bụ́ ndị na-edebe ihe ndị Chineke nyere n’iwu, ndị nwekwara ọrụ ịgba àmà banyere Jizọs.” (Mkpughe 12:9, 17) Dị ka Ndịàmà Jehova, anyị na-agbara Jizọs, bụ́ Eze na-achị achị ugbu a nke ọchịchị Alaeze ahụ, nke ga-ebibi ọchịchị ụmụ mmadụ bụ́ ndị na-anọchiri ụwa ọhụrụ ezi omume Chineke ụzọ, àmà. (Daniel 2:44; 2 Pita 3:13) Ọ bụ n’ihi nke a ka e ji akọcha ma na-akpagbu anyị, ma anyị na-enwe obi ụtọ na anyị na-ata ahụhụ n’ihi aha Kraịst.—1 Pita 4:14.

7, 8. Gịnị ka ndị mmegide ji ụgha kwuo banyere Ndị Kraịst oge mbụ?

7 Jizọs kwuru na ụmụazụ ya kwesịrị iwere onwe ha dị ka ndị nwere obi ụtọ ọbụna mgbe e ji “ụgha na-ekwu ụdị ihe ọjọọ ọ bụla” megide ha n’ihi ya. (Matiu 5:11) Ọ bụ nnọọ otú a ka e mere Ndị Kraịst oge mbụ. Mgbe a kpọchiri Pọl onyeozi na Rom ihe dị ka n’agbata afọ 59 na 61 O.A., ndị ndu ndị Juu nọ n’ebe ahụ kwuru banyere Ndị Kraịst, sị: “N’eziokwu n’ihe metụtara ịrọ òtù a, anyị maara na a na-ekwugide ya n’ebe nile.” (Ọrụ 28:22) E boro Pọl na Saịlas ebubo nke ịbụ ndị “kpuworo elu ụwa mmadụ bi ihu,” na-eme “ihe megidere ụkpụrụ iwu Siza.”—Ọrụ 17:6, 7.

8 N’ide banyere Ndị Kraịst n’oge Alaeze Ukwu Rom, ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ K. S. Latourette kwuru, sị: “Ebubo e boro ha dịgasị iche iche. N’ihi na ha jụrụ ikere òkè n’ememe ndị ọgọ mmụọ, a kpọrọ ha ndị na-ekweghị na Chineke dị. N’ihi na ha adịghị ekere òkè n’ihe ka ukwuu n’ihe omume obodo—ememe ndị ọgọ mmụọ, ihe omume ntụrụndụ ọha na eze . . .—a kwara ha emo dị ka ndị kpọrọ agbụrụ mmadụ asị. . . . E kwuru na ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị na-ezukọta n’abalị . . . nakwa na ha na-enwe mmekọahụ rụrụ arụ. . . . Eziokwu ahụ bụ́ na ọ bụ nanị ndị kwere ekwe na-eme [Ememe Ncheta nke ọnwụ Kraịst] kpalitere asịrị bụ́ na Ndị Kraịst na-eji nwatakịrị achụ àjà ma ṅụọ ọbara ya, riekwa anụ ya.” Tụkwasị na nke ahụ, n’ihi na Ndị Kraịst oge mbụ jụrụ ikere òkè n’ofufe eze ukwu, e boro ha ebubo na ha bụ ndị iro nke Ọchịchị.

9. Olee otú Ndị Kraịst narị afọ mbụ si meghachi omume n’ebubo ụgha ndị e boro ha, oleekwa ọnọdụ e nwere taa?

9 Ebubo ụgha ndị ahụ egbochighị Ndị Kraịst oge mbụ ịrụzu ọrụ ha nke ikwusa ozi ọma nke Alaeze ahụ. N’agbata afọ 60 na 61 O.A., Pọl nwere ike ikwu banyere “ozi ọma” ahụ nke “na-amị mkpụrụ ma na-aba ụba n’ụwa nile,” nke e ‘kwusawokwara n’etiti ihe nile e kere eke dị n’okpuru eluigwe.’ (Ndị Kọlọsi 1:5, 6, 23) Otu ihe ahụ na-emekwa taa. A na-ebo Ndịàmà Jehova ebubo ụgha, ọbụna dị ka e boro Ndị Kraịst narị afọ mbụ. N’agbanyeghị nke ahụ, taa ọrụ ikwusa ozi Alaeze ahụ na-aga nke ọma ma na-ewetara ndị na-arụ ya obi ụtọ dị ukwuu.

Inwe Obi Ụtọ Ịbụ Ndị A Kpagburu Dị Ka A Kpagburu Ndị Amụma

10, 11. (a) Olee otú Jizọs si mechie okwu obi ụtọ itoolu ya, n’ihi gịnịkwa? (b) N’ihi gịnị ka e ji kpagbuo ndị amụma? Nye ihe atụ.

10 Jizọs mechiri okwu obi ụtọ ya nke itoolu site n’ikwu, sị: “Na-aṅụrịnụ ọṅụ . . . , n’ihi na n’ụzọ dị otú ahụ ka ha kpagburu ndị amụma bu unu ụzọ.” (Matiu 5:12) A nabataghị ndị amụma Jehova zigara ịdọ ụmụ Izrel na-ekwesịghị ntụkwasị obi aka ná ntị nke ọma, a kpagbukwara ha ọtụtụ ugboro. (Jeremaịa 7:25, 26) Pọl onyeozi gbara akaebe banyere nke a, na-ede, sị: “Gịnị ọzọkwa ka m ga-ekwu? N’ihi na oge ga-agwụnahụ m ma ọ bụrụ na m gaa n’ihu ịkọ banyere . . . ndị amụma ndị ọzọ, bụ́ ndị sitere n’okwukwe . . . [nata] ọnwụnwa nke ha site n’ịkwa emo na ịpịa ihe, n’ezie, karịa nke ahụ, site n’agbụ na ụlọ mkpọrọ.”—Ndị Hibru 11:32-38.

11 N’oge ọchịchị nke ajọ Eze Ehab na nwunye ya bụ́ Jezibel, e ji mma agha gbuo ọtụtụ ndị amụma Jehova. (1 Ndị Eze 18:4, 13; 19:10) E tinyere Jeremaịa onye amụma n’ọtọsị ma mesịa tụba ya n’olulu apịtị. (Jeremaịa 20:1, 2; 38:6) A tụbara Daniel onye amụma n’olulu ọdụm. (Daniel 6:16, 17) A kpagburu ndị amụma a nile dịrị ndụ tupu oge Ndị Kraịst n’ihi na ha gbachiteere ofufe dị ọcha nke Jehova. Ndị ndu okpukpe ndị Juu kpagburu ọtụtụ ndị amụma. Jizọs kpọrọ ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii “ụmụ nke ndị gburu ndị amụma.”—Matiu 23:31.

12. N’ihi gịnị ka anyị, dị ka Ndịàmà Jehova, ji ewere ya dị ka ihe ùgwù ịbụ ndị a kpagburu dị ka e si kpagbuo ndị amụma oge ochie?

12 Taa, dị ka Ndịàmà Jehova, a na-akpagbukarị anyị n’ihi na anyị ji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma Alaeze ahụ. Ndị iro anyị na-ebo anyị ebubo na anyị “na-eji ike eme ntọghata,” ma anyị maara na a katọkwara ndị bu anyị ụzọ bụ́ ndị ji ikwesị ntụkwasị obi fee Jehova n’ụzọ yiri nke ahụ. (Jeremaịa 11:21; 20:8, 11) Anyị na-ewere ya dị ka ihe ùgwù ịta ahụhụ n’ihi otu ihe ahụ mere ndị amụma kwesịrị ntụkwasị obi nke oge ochie ji taa ahụhụ. Jems onye na-eso ụzọ dere, sị: “Ụmụnna m, werenụ ndị amụma, bụ́ ndị kwuru okwu n’aha Jehova, dị ka ihe nlereanya nke nhụjuanya na inwe ndidi. Lee! Anyị na-akpọ ndị tachiworo obi ndị obi ụtọ.”—Jems 5:10, 11.

Ezi Ihe Ndị Mere A Ga-eji Nwee Obi Ụtọ

13. (a) N’ihi gịnị ka mkpagbu na-ejighị eme ka anyị daa mbà? (b) Gịnị na-enyere anyị aka iguzosi ike, gịnịkwa ka nke a na-egosi?

13 Kama ịbụ ndị mmegide mere ka ha daa mbà, anyị na-abụ ndị a kasiri obi site n’icheta na anyị na-agbaso nzọụkwụ nke ndị amụma, Ndị Kraịst oge mbụ na Kraịst Jizọs n’onwe ya. (1 Pita 2:21) Anyị na-enweta afọ ojuju dị ukwuu site n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị dị ka okwu Pita onyeozi nke na-esonụ: “Ndị m hụrụ n’anya, ka ọkụ nke na-agba n’etiti unu, nke na-eme ịbụrụ unu ọnwụnwa, ghara iju unu anya, dị ka à ga-asị na ihe a na-amaghị ama na-adakwasị unu. Ọ bụrụ na a na-akọcha unu n’ihi aha Kraịst, obi dị unu ụtọ, n’ihi na mmụọ nke ebube, ọbụna mmụọ nke Chineke, na-adịkwasị unu.” (1 Pita 4:12, 14) Anyị maara site n’ahụmahụ na anyị nwere ike iguzosi ike n’okpuru mkpagbu nanị n’ihi na mmụọ Jehova na-adịkwasị anyị ma na-ewusi anyị ike. Nkwado nke mmụọ nsọ bụ ihe àmà na-egosi na ngọzi Jehova na-adịkwasị anyị, nke a na-ewetakwara anyị obi ụtọ dị ukwuu.—Abụ Ọma 5:12; Ndị Filipaị 1:27-29.

14. Olee ihe ndị mere anyị ga-eji na-aṅụrị ọṅụ maka ịbụ ndị a na-akpagbu n’ihi ezi omume?

14 Ihe ọzọ mere mmegide na mkpagbu n’ihi ezi omume ji eme ka anyị nwee obi ụtọ bụ na ọ na-egosi na anyị na-ebi ndụ ná nsọpụrụ Chineke dị ka ezi Ndị Kraịst. Pọl onyeozi dere, sị: “A ga-akpagbukwa ndị nile na-achọ ibi ndụ ná nsọpụrụ Chineke ná mmekọrịta nke ha na Kraịst Jizọs.” (2 Timoti 3:12) Ihe kasị enye anyị obi ụtọ bụ icheta na iguzosi ike n’ezi ihe anyị n’okpuru ule na-enyekwu azịza maka ịma aka Setan nke bụ́ na ihe nile Jehova kere eke na-ejere Ya ozi n’ihi ọdịmma onwe ha nanị. (Job 1:9-11; 2:3, 4) Anyị na-aṅụrị ọṅụ na anyị na-ekere òkè, n’agbanyeghị otú o si dị nta, n’igosi na ọbụbụeze ezi omume Jehova ziri ezi.—Ilu 27:11.

Na-amalinụ Elu n’Ọṅụ n’Ihi Ụgwọ Ọrụ Ahụ

15, 16. (a) Olee ihe Jizọs kwuru na ọ bụ ya mere anyị ga-eji ‘na-aṅụrị ọṅụ, na-amalikwa elu n’ọṅụ’? (b) Ụgwọ ọrụ dị aṅaa ka a kwadebeere Ndị Kraịst e tere mmanụ n’eluigwe, oleekwa otú a ga-esi kwụọ ndị enyi ha bụ́ “atụrụ ọzọ” ụgwọ ọrụ?

15 Jizọs kwuru ihe ọzọ mere anyị ga-eji na-aṅụrị ọṅụ n’ihi ịbụ ndị a na-ekwutọ ma na-akpagbu dị ka e mere ndị amụma oge ochie. Ná ngwụsị nke okwu obi ụtọ ya nke itoolu, Jizọs kwuru, sị: “Na-aṅụrịnụ ọṅụ, na-amalikwanụ elu n’ọṅụ, ebe ọ bụ na ụgwọ ọrụ unu dị ukwuu n’eluigwe.” (Matiu 5:12) Pọl onyeozi dere, sị: “Ụgwọ ọrụ nke mmehie na-akwụ bụ ọnwụ, ma onyinye nke Chineke na-enye bụ ndụ ebighị ebi site na Kraịst Jizọs Onyenwe anyị.” (Ndị Rom 6:23) Ee, ‘ụgwọ ọrụ ahụ dị ukwuu’ bụ ndụ, ọ bụghịkwa ụgwọ ọrụ anyị pụrụ ịrụta n’ọrụ. Ọ bụ onyinye e nyere n’efu. Jizọs kwuru na ụgwọ ọrụ ahụ dị “n’eluigwe” n’ihi na o sitere n’aka Jehova.

16 Ndị e tere mmanụ ga-anata “okpueze bụ́ ndụ,” ya bụ, nye ha, iso Kraịst nweta ndụ anwụghị anwụ. (Jems 1:12, 17) Ndị nwere olileanya elu ala, bụ́ “atụrụ ọzọ” ahụ, na-atụ anya iketa ndụ ebighị ebi na paradaịs elu ala. (Jọn 10:16; Mkpughe 21:3-5) Nye òtù abụọ ahụ, ha arụtaghị “ụgwọ ọrụ” ahụ n’ọrụ. Ma ndị e tere mmanụ ma “atụrụ ọzọ” ahụ na-anata ụgwọ ọrụ ha site “n’oké obiọma ahụ na-erughịrị mmadụ” nke Jehova, bụ́ nke kpaliri Pọl onyeozi ikwu, sị: “Ekele dịrị Chineke maka onyinye ya a na-apụghị ịkọwa akọwa nke ọ na-enye n’efu.”—2 Ndị Kọrint 9:14, 15.

17. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji na-enwe obi ụtọ mgbe a na-akpagbu anyị ma ‘na-amali elu n’ọṅụ’ n’ụzọ ihe atụ?

17 Pọl onyeozi degaara Ndị Kraịst, bụ́ ndị Eze Ukwu Nero na-aga ịkpagbu ụfọdụ n’ime ha n’ụzọ obi ọjọọ n’oge na-adịghị anya, akwụkwọ ozi, sị: “Ka anyị na-enwe aṅụrị mgbe anyị nọ ná mkpagbu, ebe anyị maara na mkpagbu na-arụpụta ntachi obi; ntachi obi, n’aka nke ya, na-arụpụta ọnọdụ a nwapụtara anwapụta; ọnọdụ ahụ a nwapụtara anwapụta, n’aka nke ya, na-arụpụta olileanya, olileanya ahụ adịghịkwa eduga ná mmechuihu.” O kwukwara, sị: “Na-aṅụrịnụ ọṅụ n’olileanya ahụ. Na-atachinụ obi n’ime mkpagbu.” (Ndị Rom 5:3-5; 12:12) Ma olileanya anyị ọ̀ bụ n’eluigwe ma ọ bụ n’ụwa, ụgwọ ọrụ anyị maka ikwesị ntụkwasị obi n’okpuru ule dị nnọọ ukwuu karịa ihe ọ bụla ruuru anyị. Ọṅụ anyị nwere n’ihi atụmanya anyị nke ịdị ndụ ebighị ebi iji na-ejere Nna anyị na-ahụ n’anya, bụ́ Jehova, ozi ma na-enye ya otuto n’okpuru Eze anyị bụ́ Jizọs Kraịst enweghị atụ. N’ụzọ ihe atụ, anyị ‘na-amali elu n’ọṅụ.’

18. Olee ihe a pụrụ ịtụ anya ya n’aka mba dị iche iche ka ọgwụgwụ na-eru nso, gịnịkwa ka Jehova ga-eme?

18 N’ala ụfọdụ, a kpagbuwo Ndịàmà Jehova ma ka na-akpagbukwa ha. N’amụma ya banyere ọgwụgwụ nke usoro ihe a, Jizọs dọrọ ezi Ndị Kraịst aka ná ntị, sị: “Mba nile ga-akpọkwa unu asị n’ihi aha m.” (Matiu 24:9) Ka anyị na-eru nso n’oge ọgwụgwụ, Setan ga-eme ka mba dị iche iche gosipụta ịkpọasị ha n’ebe ndị Jehova nọ. (Ezikiel 38:10-12, 14-16) Nke a ga-egosi na oge eruwo ka Jehova mee ihe. “M ga-emekwa Onwe m ka M dị ukwuu, m ga-edokwa Onwe m nsọ, mee ka a mara Mụ onwe m n’anya ọtụtụ mba; ha ewee mara na Mụ onwe m bụ Jehova.” (Ezikiel 38:23) Jehova ga-esi otú a doo aha ukwu ya nsọ ma napụta ndị ya ná mkpagbu. Ya mere, “obi ụtọ na-adịrị onye nọgidere na-atachi obi.”—Jems 1:12.

19. Ka anyị nọ na-echere oké “ụbọchị Jehova,” gịnị ka anyị kwesịrị ime?

19 Ka oké “ụbọchị Jehova” na-abịarukwu nso, ka anyị na-aṅụrị ọṅụ n’ihi na “a gụwo [anyị] ná ndị ruru eru ịbụ ndị a ga-emenye ihere” n’ihi aha Jizọs. (2 Pita 3:10-13; Ọrụ 5:41) Dị ka Ndị Kraịst oge mbụ, ka anyị nọgide “n’esepụghị aka na-ezi ihe ma na-akpọsa ozi ọma banyere Kraịst” na ọchịchị Alaeze ya ka anyị nọ na-echere ụgwọ ọrụ anyị n’ime ụwa ọhụrụ ezi omume nke Jehova.—Ọrụ 5:42; Jems 5:11.

Ná Ntụleghachi

• Gịnị ka ịta ahụhụ n’ihi ezi omume pụtara?

• Mmetụta dị aṅaa ka mkpagbu nwere n’ahụ́ Ndị Kraịst oge mbụ?

• N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na a na-akpagbu Ndịàmà Jehova dị ka a kpagburu ndị amụma oge ochie?

• N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji ‘na-aṅụrị ọṅụ, na-amalikwa elu n’ọṅụ’ n’ihi ịbụ ndị a na-akpagbu?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 16, 17]

“Obi ụtọ na-adịrị unu mgbe ndị mmadụ na-akọcha unu ma na-akpagbu unu”

[Ebe E Si Nweta Foto]

Ìgwè nọ n’ụlọ mkpọrọ: Chicago Herald-American