Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Na-eje Ije n’Ụzọ nke Iguzosi Ike n’Ezi Ihe

Na-eje Ije n’Ụzọ nke Iguzosi Ike n’Ezi Ihe

Na-eje Ije n’Ụzọ nke Iguzosi Ike n’Ezi Ihe

“Ma mụ onwe m, n’izu okè [ma ọ bụ, “n’iguzosi ike n’ezi ihe m”] ka m ga-eje ije.”—ABỤ ỌMA 26:11.

1, 2. (a) N’ihi gịnị ka iguzosi ike n’ezi ihe nke mmadụ ji bụrụ akụkụ dị mkpa nke ihe iseokwu metụtara ọbụbụeze Chineke? (b) Olee otú ihe e kere eke nwere ọgụgụ isi pụrụ isi gosipụta na ha na-akwado ọbụbụeze Jehova?

MGBE Setan nupụrụ isi n’ogige Iden, o welitere ihe iseokwu metụtara eluigwe na ala banyere iru eru Chineke ịchị ihe nile O kere eke. Obere oge ka nke a gasịrị, ọ zọọrọ na ụmụ mmadụ ga-ejere Chineke ozi nanị ma ọ bụrụ na ime otú ahụ ga-abara ha uru. (Job 1:9-11; 2:4) Ya mere, iguzosi ike n’ezi ihe nke mmadụ aghọwo akụkụ dị mkpa nke ihe iseokwu metụtara ọbụbụeze eluigwe na ala nke Jehova.

2 Ọ bụ ezie na ọbụbụeze Chineke adabereghị n’iguzosi ike n’ezi ihe nke ndị o kere eke, ụmụ mmadụ na ụmụ Chineke ndị bụ́ mmụọ pụrụ igosipụta ebe ha kwụ n’ihe iseokwu a. N’ụzọ dị aṅaa? Ọ bụ site n’iguzosi ike n’ezi ihe ma ọ bụ ịghara ime otú ahụ. Ya mere, iguzosi ike n’ezi ihe mmadụ bụ ihe dị oké mkpa nke a pụrụ ịdabere na ya kpee onye ahụ ikpe.

3. (a) Gịnị ka Job na Devid chọrọ ka Jehova nyochaa ma kpee ikpe? (b) Olee ajụjụ ndị na-ebilite banyere iguzosi ike n’ezi ihe?

3 Job ji obi ike kwuo, sị: “Ka [Jehova] tụọ m n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ezi omume, ka Chineke marakwa izu ókè [ma ọ bụ, “iguzosi ike n’ezi ihe m”].” (Job 31:6) Ọ bụ iguzosi ike n’ezi ihe ka Eze Devid nke Izrel oge ochie rịọrọ Jehova ka o nyochaa mgbe o kpere ekpere, sị: “Kpee m ikpe, Jehova, n’ihi na mụ onwe m ejewo ije n’izu okè [ma ọ bụ “n’iguzosi ike n’ezi ihe m”]: ọ bụkwa na Jehova ka m tụkwasịworo obi, ụkwụ m adịghị agbụchapụ.” (Abụ Ọma 26:1) Lee ka o si dị oké mkpa ka anyị onwe anyị kwa na-eje ije n’ụzọ nke iguzosi ike n’ezi ihe! Ma gịnị bụ iguzosi ike n’ezi ihe, gịnịkwa ka ọ pụtara bụ́ ije ije n’ụzọ ya? Gịnị ga-enyere anyị aka ịnọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe?

‘Ejewo M Ije n’Iguzosi Ike n’Ezi Ihe M’

4. Gịnị bụ iguzosi ike n’ezi ihe?

4 Iguzosi ike n’ezi ihe na-enye echiche nke ịkwụwa aka ọtọ, ịbụ onye a na-apụghị ịta ụta, izi ezi, na ịbụ onye na-enweghị ntụpọ. Otú ọ dị, iguzosi ike n’ezi ihe karịrị nanị ime ihe ziri ezi. Ọ bụ ime omume dị mma ma ọ bụ iji obi dum rara onwe onye nye Chineke. Setan gbaghara izi ezi nke ebumnobi Job mgbe ọ gwara Chineke, sị: “Otú ọ dị, biko, setịpụ aka Gị, metụ ọkpụkpụ [Job] metụkwa anụ ahụ́ ya, ọ ghaghịkwa ịgbakụta Gị azụ n’ihu Gị.” (Job 2:5) Tụkwasị n’omume kwesịrị ekwesị, iguzosi ike n’ezi ihe chọrọ ezi ebumnobi.

5. Gịnị na-egosi na iguzosi ike n’ezi ihe adịghị achọ ka anyị zuo okè?

5 Otú ọ dị, ịnọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe achọghị mmadụ izu okè. Eze Devid ezughị okè, o mekwara mmehie ndị dị oké njọ ugboro ugboro n’oge ndụ ya. N’agbanyeghị nke ahụ, Bible na-ekwu na ọ bụ nwoke nke jere ije “n’izu okè [ma ọ bụ, “n’iguzosi ike n’ezi ihe”] nke obi.” (1 Ndị Eze 9:4) N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na Devid hụrụ Jehova n’anya. Ọ raara obi ya nye Chineke. Ọ dị njikere ịnakwere mmejọ ya, nabata ịdọ aka ná ntị ma dozie ụzọ ya. N’ezie, iguzosi ike n’ezi ihe Devid pụtara ìhè ná nrara o ji obi ya dum rara onwe ya nye Chineke ya, bụ́ Jehova, na ịhụnanya sitere n’obi o nwere n’ebe Ọ nọ.—Deuterọnọmi 6:5, 6.

6, 7. Gịnị ka ije ije n’iguzosi ike n’ezi ihe gụnyere?

6 Iguzosi ike n’ezi ihe emetụtaghị nanị otu akụkụ nke àgwà ụmụ mmadụ, dị ka ife ofufe. O metụtara ụzọ ndụ anyị dum. Devid “jegharịrị” n’iguzosi ike n’ezi ihe ya. “Ngwaa bụ́ ‘jegharịa’ na-apụta ‘ụzọ ndụ’ ma ọ bụ ‘otú mmadụ si ebi ndụ,’” ka The New Interpreter’s Bible na-ekwu. N’ikwu banyere “ndị zuru okè n’ụzọ [ha],” ọbụ abụ ahụ bụrụ, sị: “Ndị ihe na-agara nke ọma ka ndị na-echebe ihe àmà [Chineke] nile bụ, ndị na-ewere obi ha nile chọọ Ya. Ee, ha emeghị ajọ omume; n’ụzọ Ya nile ka ha na-eje ije.” (Abụ Ọma 119:1-3) Iguzosi ike n’ezi ihe chọrọ ka anyị na-achọ mgbe nile ime uche Chineke na ije ije n’ụzọ ya.

7 Ije ije n’iguzosi ike n’ezi ihe chọrọ ịrara onwe onye nye Chineke, ọbụna mgbe ọnọdụ na-adịghị mma. Mgbe anyị tachiri obi n’ọnwụnwa, guzosie ike n’agbanyeghị nhụjuanya ma ọ bụ guzogide ọnwụnwa sitere n’ụwa nke na-adịghị asọpụrụ Chineke, iguzosi ike n’ezi ihe anyị na-apụta ìhè. Anyị ‘na-eme ka obi Jehova ṅụrịa’ n’echiche bụ́ na ọ na-enwe ike ịzaghachi onye na-ata ya ụta okwu. (Ilu 27:11) Ya mere, e nwere ezi ihe mere anyị pụrụ iji mee mkpebi yiri nke Job: “Ruo mgbe m kubiri ume m gaghị esi n’ebe m nọ wezụga izu okè [ma ọ bụ, “iguzosi ike n’ezi ihe m”].” (Job 27:5) Abụ Ọma nke 26 na-egosi ihe ga-enyere anyị aka ije ije n’iguzosi ike n’ezi ihe.

“Nụchaa Akụrụ M Abụọ na Obi M”

8. Gịnị ka ị na-amụta site n’arịrịọ Devid ka Jehova nwaa akụrụ na obi ya?

8 Devid kpere ekpere, sị: “Nwaa m, Jehova, nwapụtakwa m; nụchaa akụrụ m abụọ na obi m.” (Abụ Ọma 26:2) Akụrụ dị n’ime ime ahụ́. N’ụzọ ihe atụ, akụrụ na-anọchi anya echiche na mmetụta ndị kasị mie emie nke mmadụ. Obi ihe atụ bụ mmadụ ime n’ozuzu—mkpali, mmetụta, na ọgụgụ isi ya. Mgbe Devid rịọrọ Jehova ka ọ nwaa ya, ihe o kpere ekpere ya n’ezie bụ ka o nyochaa echiche na mmetụta ya ndị kasị mie emie.

9. Olee otú Jehova si anụcha akụrụ na obi ihe atụ anyị?

9 Devid rịọrọ ka a nụchaa akụrụ na obi ya. Olee otú Jehova si anụcha ihe anyị bụ n’ime? Devid bụrụ, sị: “M ga-agọzi Jehova, Onye dụworo m ọdụ: ọzọ, akụrụ m abụọ na-adọ m aka ná ntị n’abalị nile.” (Abụ Ọma 16:7) Gịnị ka nke ahụ pụtara? Ọ pụtara na ndụmọdụ Chineke ruru n’akụkụ ndị kasị mie emie nke ahụ́ Devid ma dịgide n’ebe ndị ahụ, na-agbazi echiche na mmetụta ya ndị kasị mie emie. Otú ahụkwa ka ọ pụrụ imere anyị ma ọ bụrụ na anyị ejiri ekele na-atụgharị uche na ndụmọdụ anyị na-enweta site n’Okwu Chineke, n’aka ndị nnọchianya ya, na site ná nzukọ ya ma kwe ka ọ dịgide n’ime anyị. Ikpegara Jehova ekpere mgbe nile ka o si otú a nụchaa anyị ga-enyere anyị aka ije ije n’iguzosi ike n’ezi ihe.

‘Ebere Gị Dị n’Ihu M’

10. Gịnị nyeere Devid aka ije ije n’eziokwu Chineke?

10 “Ebere Gị dị n’ihu anya m,” ka Devid gara n’ihu ikwu, “ejegharịwokwa m n’eziokwu Gị.” (Abụ Ọma 26:3) Devid maara omume obi ebere Chineke nke ọma, o jikwa ekele tụgharịa uche na ha. “Gọzie Jehova, mkpụrụ obi m,” ka ọ bụrụ n’abụ, “echezọkwala mmeso ọma Ya Ọ na-emeso gị.” N’icheta otu n’ime “mmeso” Chineke, Devid gara n’ihu ikwu, sị: “Jehova na-emere ndị nile a na-emegbu ezi omume nile na ihe nile O kpere n’ikpe. Ọ na-eme ka Mozis mara ụzọ Ya nile, Ọ na-emekwa ka ụmụ Izrel mara omume Ya nile.” (Abụ Ọma 103:2, 6, 7) Eleghị anya, Devid nọ na-eche banyere mmegbu ndị Ijipt megburu ndị Izrel n’oge Mozis. Ya bụrụ otú ahụ, ịtụgharị uche n’otú Jehova si mee ka Mozis mara ụzọ nnapụta ya aghaghị imetụwo Devid n’obi ma mee ka o kpebisie ike ije ije n’eziokwu Chineke.

11. Gịnị pụrụ inyere anyị aka ije ije n’ụzọ nke iguzosi ike n’ezi ihe?

11 Ịmụchi Okwu Chineke anya na ịtụgharị uche n’ihe anyị na-amụta n’ime ya ga-enyekwara anyị aka ije ije n’ụzọ nke iguzosi ike n’ezi ihe. Dị ka ihe atụ, icheta na Josef gbara ọsọ mgbe nwunye Pọtịfa nwara ya ọnwụnwa ime omume rụrụ arụ ga-akpali anyị n’ezie ịgbanahụ ọnwụnwa ndị dị otú ahụ n’ebe ọrụ, n’ụlọ akwụkwọ, ma ọ bụ n’ebe ọ bụla ọzọ. (Jenesis 39:7-12) Gịnị banyere mgbe e ji ohere nke inwe ọganihu ihe onwunwe ma ọ bụ nke ịbụ onye a ma ama na inwe ike n’ụwa nwaa anyị ọnwụnwa? Anyị nwere ihe nlereanya nke Mozis, bụ́ onye jụrụ ebube nile nke Ijipt. (Ndị Hibru 11:24-26) Ihe ịrụ ụka adịghị ya na iburu ntachi obi nke Job n’uche ga-enyere anyị aka ikpebisikwu ike ịnọgide na-eguzosi ike n’ihe nye Jehova n’agbanyeghị ọrịa ma ọ bụ ọdachi. (Jems 5:11) Gịnị ma ọ bụrụ na a kpagbuo anyị? Icheta nnọọ ahụmahụ Daniel nwere n’olulu ọdụm ga-eme ka anyị nwee obi ike!—Daniel 6:16-22.

“Mụ na Mmadụ Efu Anọkọghị”

12, 13. Ụdị mkpakọrịta ndị dị aṅaa ka anyị kwesịrị izere?

12 N’izo aka n’ihe ọzọ mere ka ọ nọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe, Devid kwuru, sị: “Mụ na mmadụ efu anọkọghị; mụ na ndị ihu abụọ adịghị abakọkwa. Akpọwo m mkpọkọta ndị na-eme ihe ọjọọ asị, mụ na ndị na-emebi iwu adịghị anọkọkwa.” (Abụ Ọma 26:4, 5) Devid agaghị anwa anwa soro ndị na-emebi iwu nọkọọ. Ọ kpọrọ mkpakọrịta ọjọọ asị.

13 Gịnị banyere anyị? Ànyị na-ajụ iso mmadụ efu anọkọ site n’ihe omume telivishọn, ihe nkiri vidio, sinima, ógbè Intanet, ma ọ bụ site n’ụzọ ndị ọzọ? Ànyị na-agbara ndị ihu abụọ ọsọ? Ụfọdụ ndị n’ụlọ akwụkwọ ma ọ bụ n’ebe ọrụ anyị pụrụ ime ka hà bụ ndị enyi anyị iji mezuo nzube ọjọọ ha. Ànyị chọrọ n’ezie iso ndị na-adịghị eje ije n’eziokwu nke Chineke na-akpachi anya? Ọ bụ ezie na ha ga na-eme ka hà bu ezi ihe n’obi, ndị si n’ezi ofufe dapụ pụkwara izochi ebumnobi ha bụ́ ịdọpụ anyị n’ijere Jehova ozi. Gịnị ma ọ bụrụ na e nwere ndị nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst bụ́ ndị na-ebi ụdị ndụ abụọ? Ha onwe ha kwa na-ezochi ihe ha bụ n’ezie. Jayson, bụ́ onye na-eje ozi ugbu a dị ka ohu na-eje ozi, nwere ndị enyi dị otú ahụ mgbe ọ na-eto eto. Ọ na-ekwu banyere ha, sị: “Otu ụbọchị, otu n’ime ha gwara m, sị: ‘Ihe anyị na-eme ugbu a adịghị ihe o mere n’ihi na mgbe usoro ihe ọhụrụ ga-abịa, anyị ga-abụ ndị nwụrụ anwụ. Anyị agaghị ama na ọ dị ihe na-efunahụ anyị.’ Okwu dị otú ahụ meghere m anya. Achọghị m ịbụ onye nwụrụ anwụ mgbe usoro ihe ọhụrụ ga-abịa.” Jayson ji amamihe gbubie mkpakọrịta ya na ndị dị otú ahụ. “Ka a ghara iduhie unu,” ka Pọl onyeozi na-adọ aka ná ntị. “Mkpakọrịta ọjọọ na-emebi àgwà bara uru.” (1 Ndị Kọrint 15:33) Lee ka o si dị oké mkpa ka anyị zere mkpakọrịta ọjọọ!

‘M Ga-akọ Akụkọ Banyere Oké Ọrụ Gị Nile’

14, 15. Olee otú anyị pụrụ isi ‘na-agba ebe ịchụàjà Jehova gburugburu’?

14 “Aga m akwọ ọbụ aka m abụọ n’emeghị ihe ọjọọ; wee gbaa ebe ịchụàjà Gị gburugburu otú a, Jehova,” ka Devid gara n’ihu ikwu. N’ihi gịnị? “Ime ka e gee ntị olu ekele, na ịkọ akụkọ banyere oké ọrụ Gị nile.” (Abụ Ọma 26:6, 7) Devid chọrọ ịnọgide na-eme omume dị ọcha ka o wee nwee ike ife Jehova ofufe na ịkpọsa nrara ọ raara onwe ya nye Chineke.

15 Ihe nile metụtara ezi ofufe n’ụlọikwuu ahụ nakwa mgbe e mesịrị n’ụlọ nsọ ahụ bụ “ihe atụ nakwa onyinyo nke ihe eluigwe.” (Ndị Hibru 8:5; 9:23) Ebe ịchụàjà ahụ sere onyinyo uche Jehova n’ịnakwere àjà Jizọs Kraịst maka mgbapụta nke ihe a kpọrọ mmadụ. (Ndị Hibru 10:5-10) Anyị na-akwọ aka anyị abụọ n’emeghị ihe ọjọọ ma ‘na-agba ebe ịchụàjà Jehova gburugburu’ site n’igosipụta okwukwe n’àjà ahụ.—Jọn 3:16-18.

16. Olee otú ịkọrọ ndị ọzọ banyere oké ọrụ Chineke si abara anyị uru?

16 Mgbe anyị chere echiche banyere ihe nile ihe mgbapụta ahụ mere ka ha kwe omume, ọ̀ bụ na obi anyị adịghị ejupụta n’ekele nye Jehova na Ọkpara ọ mụrụ nanị ya? Ya mere, ka anyị jiri obi ekele mee ka ndị ọzọ mara oké ọrụ Chineke—site n’okike nke mmadụ n’ogige Iden ruo ná mweghachi nke ihe nile n’ụwa ọhụrụ Chineke. (Jenesis 2:7; Ọrụ 3:21) Leekwa ihe nchebe ime mmụọ ọrụ nkwusa Alaeze na nke ime ndị na-eso ụzọ bụ! (Matiu 24:14; 28:19, 20) Ịdị na-arụsị ya ike na-eme ka olileanya anyị maka ọdịnihu na-egbukepụ egbukepụ, na-eme ka okwukwe anyị nwere ná nkwa Chineke sie ike, na-emekwa ka ịhụnanya anyị nwere n’ebe Jehova na ndị mmadụ ibe anyị nọ mie emie.

“Ahụwo M Ebe Obibi nke Ụlọ Gị n’Anya”

17, 18. Gịnị kwesịrị ịbụ àgwà anyị n’ebe nzukọ Ndị Kraịst dị?

17 Ụlọikwuu ahụ, ya na ebe ịchụàjà ya, bụ ebe a nọ fee Jehova n’Izrel. N’igosipụta obi ụtọ o nwere ịnọ n’ebe ahụ, Devid kpere ekpere, sị: “Jehova, ahụwo m ebe obibi nke ụlọ Gị n’anya, ya na ọnọdụ nke ebe obibi nke ebube Gị.”Abụ Ọma 26:8.

18 Ọ̀ na-amasị anyị izukọ n’ebe ndị anyị na-anọ amụ ihe banyere Jehova? Ụlọ Nzukọ Alaeze ọ bụla na usoro ihe omume ime mmụọ ya chiri anya na-eje ozi dị ka ebe ezi ofufe hiwere isi n’obodo. Tụkwasị na nke ahụ, kwa afọ, anyị na-enwe mgbakọ distrikti, mgbakọ sekit, na ụbọchị mgbakọ pụrụ iche. A na-atụle “ihe àmà” Jehova ná nzukọ ndị dị otú ahụ. Ọ bụrụ na anyị amụta ‘ịhụ ha n’anya nke ukwuu,’ ọ ga na-agụsi anyị agụụ ike ịga nzukọ, anyị ga na-egekwa ntị mgbe anyị nọ n’ebe ndị ahụ. (Abụ Ọma 119:167) Lee ka o si bụrụ ihe na-enye ume ọhụrụ iso ndị kwere ekwe ibe anyị na-anọkọ bụ́ ndị nwere mmasị n’ọdịmma anyị na ndị na-enyere anyị aka ịnọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe!—Ndị Hibru 10:24, 25.

‘Achịkọtala Ndụ M’

19. Olee mmehie ndị Devid na-achọghị ka ikpe ha ma ya?

19 N’ịmara nke ọma ihe pụrụ isi n’ịghara ije ije n’ụzọ nke eziokwu Chineke pụta, Devid rịọrọ, sị: “Achịkọtala mkpụrụ obi m na ndị mmehie n’otu, achịkọtakwala ndụ m na ndị ọbara n’otu: ndị nzube ọjọọ dị n’aka ha, aka nri ha jupụtakwara n’iri ngo.” (Abụ Ọma 26:9, 10) Devid achọghị ka a gụkọta ya na ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke, bụ́ ndị ikpe nzube ọjọọ ma ọ bụ iri ngo mara.

20, 21. Gịnị pụrụ iduba anyị n’ụzọ nke ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke?

20 Ihe jupụtara n’ụwa taa bụ omume rụrụ arụ. Telivishọn, magazin, na ihe nkiri sinima na-akwalite omume rere ure—“ịkwa iko, adịghị ọcha, omume rụrụ arụ.” (Ndị Galeshia 5:19) Ụfọdụ abụwo ndị ikiri ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ, bụ́ ndị na-edubakarị n’omume rụrụ arụ, riri ahụ́. Ọ na-adịrị ndị na-eto eto mfe karị ịdaba n’omume ndị dị otú ahụ. N’ala ụfọdụ, iyi oge mkpapụ bụ omenala, a na-arụgidekwa ndị nọ n’afọ iri na ụma iche na ha aghaghị iyi oge mkpapụ. Ọtụtụ ndị na-eto eto azụlitewo mmekọrịta ịhụnanya, ọ bụ ezie na ha erubeghị ịlụ di ma ọ bụ nwunye. Iji mejụọ agụụ mmekọahụ ha na-amalite inwe, n’oge na-adịghị anya, ha na-etinye aka n’omume rụrụ arụ ruo n’ókè nke ịkwa iko.

21 Ndị toro eto pụkwara nnọọ ịdaba n’omume ndị na-adịghị mma. Omume akwụwaghị aka ọtọ n’achụmnta ego na ọchịchọ ime mkpebi ndị dabeere n’ọchịchọ onwe onye nanị na-egosipụta eguzosighị ike n’ezi ihe. Nanị ihe ije ije n’ụzọ nke ụwa ga-eme bụ ime ka anyị nọrọ Jehova ebe dị anya. Ka anyị “kpọọ ihe ọjọọ asị ma hụ ezi ihe n’anya” ma nọgide na-eje ije n’ụzọ nke iguzosi ike n’ezi ihe.—Emọs 5:15.

“Gbapụta M, Mekwaara M Amara”

22-24. (a) Agbamume dị aṅaa ka ị na-ahụ n’okwu mmechi nke Abụ Ọma nke 26? (b) Ihe ize ndụ dị aṅaa ka anyị ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

22 Devid mechiri okwu ọ na-agwa Chineke, na-asị: “Ma mụ onwe m, n’izu okè [ma ọ bụ, “n’iguzosi ike n’ezi ihe m”] ka m ga-eje ije: gbapụta m mekwaara m amara. Ụkwụ m eguzowo n’ala dị larịị: n’ime mkpọkọta mmadụ nile ka m ga-agọzi Jehova.” (Abụ Ọma 26:11, 12) Mkpebi siri ike Devid mere ịnọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe na arịrịọ ya ka a gbapụta ya nwere njikọ chiri anya. Lee ka nke ahụ si bụrụ ihe na-agba ume! N’agbanyeghị ọnọdụ mmehie anyị, Jehova ga-enyere anyị aka ma ọ bụrụ na anyị ekpebisie ike ije ije n’iguzosi ike n’ezi ihe.

23 Ka ụzọ ndụ anyị na-egosi na anyị na-akwanyere ọbụbụeze Chineke ùgwù ma jiri ya kpọrọ ihe n’akụkụ nile nke ndụ anyị. Onye ọ bụla n’ime anyị pụrụ iji ekpere rịọ Jehova ka o nyochaa ma nụchaa echiche na mmetụta ya ndị kasị mie emie. Anyị pụrụ idebe eziokwu ya n’ihu anyị mgbe nile site n’iji ịdị uchu na-amụ Okwu ya. Ya mere, ka anyị gbalịsie ike izere mkpakọrịta ọjọọ ma na-agọzi Jehova n’etiti mkpọkọta ya. Ka anyị jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ekere òkè n’ọrụ nkwusa Alaeze na nke ime ndị na-eso ụzọ, n’ekweghị mgbe ọ bụla ka ụwa tinye mmekọrịta dị oké ọnụ ahịa nke anyị na Chineke n’ihe ize ndụ. Ka anyị na-eme ike anyị nile ije ije n’ụzọ nke iguzosi ike n’ezi ihe, anyị pụrụ inwe obi ike na Jehova ga-emere anyị amara.

24 Ebe ọ bụ na iguzosi ike n’ezi ihe gụnyere akụkụ nile nke ndụ, ọ dị anyị mkpa ịmata otu ihe ize ndụ na-egbu mmadụ—iji ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. A ga-atụle nke a n’isiokwu na-esonụ.

Ị̀ Na-echeta?

• N’ihi gịnị ka ọ pụrụ iji zie ezie ikpe ihe e kere eke nwere ọgụgụ isi ikpe na-adabere n’iguzosi ike n’ezi ihe ha?

• Gịnị bụ iguzosi ike n’ezi ihe, gịnịkwa ka ije ije n’ụzọ ya gụnyere?

• Gịnị ga-enyere anyị aka ije ije n’ụzọ nke iguzosi ike n’ezi ihe?

• Iji nọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe, ihe ize ndụ ndị dị aṅaa ka anyị na-aghaghị ịmata ma zere?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 14]

Ị̀ na-arịọ Jehova mgbe nile ka o nyochaa echiche gị ndị kasị mie emie?

[Foto dị na peeji nke 14]

Ị̀ na-edebe oké ọrụ ebere Jehova n’ihu anya gị?

[Foto ndị dị na peeji nke 15]

Anyị ịnọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe n’agbanyeghị ule na-eme ka obi Jehova ṅụrịa

[Foto ndị dị na peeji nke 17]

Ị̀ na-eji ndokwa ndị Jehova meworo iji nyere gị aka ije ije n’iguzosi ike n’ezi ihe na-eme ihe?