Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Na-anabata Enyemaka Jehova?

Ị̀ Na-anabata Enyemaka Jehova?

Ị̀ Na-anabata Enyemaka Jehova?

“Jehova bụ onye inyeaka m; agaghị m atụ egwu.”—NDỊ HIBRU 13:6.

1, 2. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa anyị ịnakwere enyemaka na nduzi Jehova ná ndụ anyị?

KA E were ya na ị na-eme njem gafere otu ụzọ dị n’elu nnukwu ugwu. Otú ọ dị, nanị gị esoghị, otu onye ekwetawo iso gị iji duzie gị, ọ bụkwa onye nduzi kasị mma ị pụrụ ịchọta. Ọ maara nnọọ ụzọ ahụ karịa gị ma dị ike karịa gị, ma o ji ndidi na-aga n’akụkụ gị. Ya ahụ na ị na-azọhie ụkwụ mgbe ụfọdụ. N’ihi nchegbu o nwere ka ị ghara imerụ ahụ́, ya agwa gị ka ya jide gị n’aka iji nyere gị aka gafere otu ebe dị nnọọ ize ndụ. Ị̀ ga-ajụ enyemaka ya? Ọ dịghị ma ọlị! I nwere ike imerụ ahụ́.

2 Dị ka Ndị Kraịst, anyị na-eme njem n’ụzọ na-ara ahụ́ ngafere. Ànyị ga-agarịrị ije n’ụzọ ahụ dị mkpagide nanị anyị? (Matiu 7:14) Ee e, Bible na-egosi na Onye Nduzi kasị mma anyị pụrụ ịchọta, bụ́ Jehova Chineke, na-ekwe ka ụmụ mmadụ soro ya na-eje ije. (Jenesis 5:24; 6:9) Jehova ọ̀ na-enyere ndị ohu ya aka ka ha na-eje ije n’ụzọ a? Ọ na-ekwu, sị: “Mụ onwe m, Jehova, Chineke gị, na-ejidesi aka nri gị ike, bụ́ Onye na-asị gị, Atụla egwu, Mụ onwe m enyeworo gị aka.” (Aịsaịa 41:13) Dị ka onye nduzi ahụ e kwuru banyere ya n’ihe atụ anyị, Jehova ji obiọma na-achọ inyere ndị na-achọ iso ya eje ije aka na ịbụ enyi ha. N’ezie, ọ dịghị onye n’ime anyị ga-achọ ịjụ enyemaka ya!

3. Olee ajụjụ ndị anyị ga-atụle n’ihe ọmụmụ a?

3 N’isiokwu bu ụzọ, anyị tụlere ụzọ anọ Jehova si nyere ndị ya aka n’oge ochie. Ò si otú ahụ enyere ndị ya aka taa? Oleekwa otú anyị pụrụ isi jide n’aka na anyị nabatara enyemaka ọ bụla dị otú ahụ? Ka anyị tụlee ajụjụ ndị a. Site n’ime otú ahụ, anyị pụrụ inwekwu obi ike na Jehova n’ezie bụ Onye Inyeaka anyị.—Ndị Hibru 13:6.

Enyemaka Ndị Mmụọ Ozi

4. N’ihi gịnị ka ndị ohu Chineke taa pụrụ iji nwee obi ike na ndị mmụọ ozi ga-enyere ha aka?

4 Ndị mmụọ ozi hà na-enyere ndị ohu Jehova nke oge a aka? Ee, ha na-eme otú ahụ. Ọ bụ eziokwu na taa ha adịghị apụta otú a ga-ahụ ha anya iji napụta ndị na-efe ezi ofufe n’ihe ize ndụ. Ọbụna n’oge Bible, ọ bụ nanị n’oge ụfọdụ ka ndị mmụọ ozi nyeere ndị ohu Chineke aka n’ụzọ dị otú ahụ. Ụmụ mmadụ ahụghị ihe ka ọtụtụ n’ime ihe ndị ha mere, dịkwa ka a na-adịghị ahụ ha taa. Otú o sina dị, ndị ohu Chineke bụ́ ndị ghọtara na ndị mmụọ ozi nọ ya ịkwado ha hụtara nke ahụ dị ka ihe na-agba nnọọ ume. (2 Ndị Eze 6:14-17) Anyị nwere ezi ihe mere anyị ga-eji nwee mmetụta yiri nke ahụ.

5. Olee otú Bible si egosi na ndị mmụọ ozi na-ekere òkè n’ọrụ nkwusa ahụ taa?

5 Ndị mmụọ ozi Jehova nwere mmasị karịsịa n’ọrụ pụrụ iche nke metụtara anyị. Gịnị ka ọrụ ahụ bụ? Anyị pụrụ ịchọta azịza ya ná Mkpughe 14:6: “M wee hụ mmụọ ozi ọzọ ka ọ na-efegharị n’etiti eluigwe, o nwekwara ozi ọma ebighị ebi ịkpọsa dị ka ozi obi ụtọ nye ndị bi n’elu ụwa, nyekwa mba na ebo na asụsụ na ndị ọ bụla.” ‘Ozi ọma ebighị ebi a’ na ozi ọma nke alaeze, bụ́ nke, dị ka Jizọs buru n’amụma, ‘a ga-ekwusa n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba nile’ tupu ọgwụgwụ usoro ihe a abịa, nwere njikọ. (Matiu 24:14) N’ezie, ndị mmụọ ozi adịghị emere ndị mmadụ nkwusa n’onwe ha. Ọ bụ ụmụ mmadụ ka Jizọs nyere ọrụ a dị mkpa. (Matiu 28:19, 20) Ọ́ bụghị ihe na-agba ume ịmara na ka anyị na-arụzu ọrụ ahụ, ndị mmụọ ozi dị nsọ, bụ́ ndị maara ihe ma dị ike, na-enyere anyị aka?

6, 7. (a) Gịnị na-egosi na ndị mmụọ ozi na-akwado anyị n’ọrụ nkwusa anyị? (b) Olee ihe anyị pụrụ ime iji jide n’aka na anyị ga-enweta nkwado ndị mmụọ ozi Jehova?

6 E nwere ọtụtụ ihe àmà nke nkwado ndị mmụọ ozi n’ọrụ anyị. Dị ka ihe atụ, anyị na-anụkarị na ka ha na-eje ozi ha, Ndịàmà Jehova na-ezute ndị kpere ekpere n’oge na-adịbeghị anya maka enyemaka Chineke iji chọta eziokwu ahụ. Ihe ndị dị otú ahụ na-eme ọtụtụ ugboro nke na anyị apụghị ileghara ha anya dị ka ihe ndị mere ná ndabara. N’ihi enyemaka dị otú ahụ sitere n’aka ndị mmụọ ozi, ọtụtụ mmadụ na-amụta ime ihe ‘mmụọ ozi ahụ na-efegharị n’etiti eluigwe’ kpọsara: “Na-atụnụ Chineke egwu, na-enyekwa ya otuto.”—Mkpughe 14:7.

7 Ọ̀ na-agụsi gị agụụ ike inweta nkwado nke ndị mmụọ ozi dị ike nke Jehova? Mgbe ahụ, mee ihe nile i nwere ike ime n’ozi gị. (1 Ndị Kọrint 15:58) Ka anyị ji ọchịchọ obi na-ewepụta onwe anyị ije ozi a pụrụ iche sitere n’aka Jehova, anyị pụrụ ijide n’aka na ndị mmụọ ozi ya ga-enyere anyị aka.

Enyemaka Site n’Aka Onyeisi Ndị Mmụọ Ozi

8. Ọkwá dị aṅaa dị elu ka Jizọs nwere n’eluigwe, n’ihi gịnịkwa ka nke ahụ ji emesi anyị obi ike?

8 Jehova na-enyekwara anyị aka site n’aka ụdị mmụọ ozi ọzọ. Mkpughe 10:1 na-akọwa otu ‘mmụọ ozi dị ike’ ma dị egwu bụ́ onye ‘ihu ya dị ka anyanwụ.’ Ihe àmà na-egosi na mmụọ ozi a a hụrụ n’ọhụụ na-ese onyinyo Jizọs Kraịst ahụ e mere ka ọ dị ebube n’ike eluigwe ya. (Mkpughe 1:13, 16) Jizọs ọ̀ bụ mmụọ ozi n’ezie? Ee, a pụrụ ịkpọ ya mmụọ ozi n’ihi na ọ bụ onyeisi ndị mmụọ ozi. (1 Ndị Tesalonaịka 4:16) Gịnị bụ onyeisi ndị mmụọ ozi? Okwu ahụ pụtara “mmụọ ozi kasịnụ.” Ọ bụ Jizọs kachasị ike n’ime ụmụ Jehova nile bụ́ mmụọ. Jehova enyewo ya ike ịchịkwa usuu ndị mmụọ ozi Ya nile. N’ezie, onyeisi ndị mmụọ ozi a bụ onye enyemaka dị ike. N’ụzọ ndị dị aṅaa?

9, 10. (a) Olee otú Jizọs si eje ozi dị ka “onye inyeaka” anyị mgbe anyị mere mmehie? (b) Enyemaka dị aṅaa ka anyị pụrụ ịchọta n’ihe nlereanya Jizọs?

9 Jọn onyeozi meworo agadi dere, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla emee mmehie, anyị nwere onye inyeaka nọ n’ebe Nna ahụ nọ, bụ́ Jizọs Kraịst, onye ezi omume.” (1 Jọn 2:1) N’ihi gịnị ka Jọn ji kwuo na Jizọs bụ “onye inyeaka” anyị karịsịa mgbe anyị ‘mere mmehie’? Anyị na-emehie kwa ụbọchị, mmehie na-edugakwa n’ọnwụ. (Eklisiastis 7:20; Ndị Rom 6:23) Otú ọ dị, Jizọs nyere ndụ ya dị ka àjà n’ihi mmehie anyị. Ọ nọkwa n’akụkụ Nna anyị na-eme ebere iji na-arịọ arịrịọ n’ihi anyị. Enyemaka dị otú ahụ dị onye ọ bụla n’ime anyị mkpa. Olee otú anyị pụrụ isi nabata ya? Ọ dị anyị mkpa ichegharị site ná mmehie anyị ma rịọ maka mgbaghara mmehie ná ndabere nke àjà Jizọs. Ọ dịkwa anyị mkpa izere imeghachi mmehie ndị anyị mere.

10 Tụkwasị n’ịnwụ n’ihi anyị, Jizọs setịpụụrụ anyị ihe nlereanya zuru okè. (1 Pita 2:21) Ihe nlereanya ya na-eduzi anyị, na-enyere anyị aka iduzi nzọụkwụ anyị ka anyị wee nwee ike izere ime mmehie ndị dị oké njọ ma nwee ike ịdị na-eme ihe na-atọ Jehova Chineke ụtọ. Obi ọ́ dịghị anyị ụtọ na anyị nwere enyemaka dị otú ahụ? Jizọs kwere ụmụazụ ya nkwa na a ga-enye ha ihe inyeaka ọzọ.

Enyemaka nke Mmụọ Nsọ

11, 12. Gịnị bụ mmụọ Jehova, olee otú ọ dịruru n’ike, n’ihi gịnịkwa ka o ji dị anyị mkpa taa?

11 Jizọs kwere nkwa, sị: “M ga-arịọkwa Nna ahụ, ọ ga-enyekwa unu ihe inyeaka ọzọ ka ọ dịnyere unu ruo mgbe ebighị ebi, bụ́ mmụọ nke eziokwu ahụ, nke ụwa na-apụghị ịnata.” (Jọn 14:16, 17) ‘Mmụọ nke eziokwu a,’ ma ọ bụ mmụọ nsọ, abụghị onye kama ọ bụ ike—ike Jehova nọ n’ọrụ. Ike ya enweghị atụ. Ọ bụ ike Jehova ji mee ihe n’ike eluigwe na ala, ịrụ oké ọrụ ebube dị iche iche, nakwa ikpughe uche ya site n’ọhụụ. Ebe ọ bụ na Jehova adịghị eji mmụọ ya eme ihe n’ụzọ ndị a pụtara ìhè taa, ọ̀ pụtara na ọ dịghị anyị mkpa?

12 Ọ dịghị ma ọlị! ‘N’oge a pụrụ iche nke siri ike obibi,’ mmụọ Jehova dị anyị mkpa karịa mgbe ọ bụla ọzọ. (2 Timoti 3:1) Ọ na-ewusi anyị ike ịnagide ọnwụnwa. Ọ na-enyere anyị aka ịzụlite àgwà ndị magburu onwe ha bụ́ ndị na-adọta anyị nso n’ebe Jehova na ụmụnna ime mmụọ anyị nọ. (Ndị Galeshia 5:22, 23) Oleezi otú anyị pụrụ isi na-erite uru n’enyemaka a magburu onwe ya sitere n’aka Jehova?

13, 14. (a) N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji jide n’aka na Jehova ji ọchịchọ obi na-enye ndị ya mmụọ nsọ ya? (b) Omume dị aṅaa pụrụ igosi na anyị adịghị anabata onyinye nke mmụọ nsọ n’ezie?

13 Nke mbụ, ọ dị anyị mkpa ikpe ekpere maka mmụọ nsọ. Jizọs kwuru, sị: “Ọ bụrụ na unu, ọ bụ ezie na unu bụ ndị ajọ omume, maara ụzọ isi nye ụmụ unu ezi onyinye, lee ka Nna unu nke nọ n’eluigwe ga-esi nye ndị na-arịọ ya mmụọ nsọ karị!” (Luk 11:13) Ee, Jehova bụ Nna kasị mma a pụrụ ichetụ n’echiche. Ọ bụrụ na anyị ejiri okwukwe na obi anyị dum na-arịọ ya maka mmụọ nsọ, ọ bụ ihe a na-agatụghị eche n’echiche na ọ ga-ajụ inye anyị onyinye a. Mgbe ahụ, ajụjụ bụ, Ànyị na-arịọ maka ya? Anyị nwere ezi ihe mere anyị ga-eji na-arịọ arịrịọ maka ya n’ekpere anyị kwa ụbọchị.

14 Nke abụọ, anyị na-anabata onyinye ahụ site n’ime ihe kwekọrọ ná nduzi ya. Iji maa atụ: Ka e were ya na Onye Kraịst na ọchịchọ nke ikiri ihe na-akpali agụụ mmekọahụ na-alụ. O kpewo ekpere ka mmụọ nsọ nyere ya aka iguzogide àgwà a rere ure. Ọ chọwo ndụmọdụ ndị okenye, ha adụọkwa ya ọdụ ime ihe ụfọdụ, izere ọbụna ịga nso ebe ihe ndị dị otú ahụ na-emerụ emerụ dị. (Matiu 5:29) Gịnị ma ọ bụrụ na o leghara ndụmọdụ ha anya ma nọgide na-ekiri ihe ndị dị otú ahụ mgbe ọ bụla a nwara ya ọnwụnwa ime otú ahụ? Ọ̀ na-eme ihe kwekọrọ n’ekpere o kpere ka mmụọ nsọ nyere ya aka? Ka ọ̀ nọ n’ihe ize ndụ nke ime ihe ga-ewute mmụọ Chineke ma bụrụ onye a na-agaghịzi na-enye onyinye a? (Ndị Efesọs 4:30) N’ezie, ọ dị anyị nile mkpa ime ihe nile anyị pụrụ ime iji hụ na anyị nọgidere na-enweta enyemaka a magburu onwe ya site n’aka Jehova.

Enyemaka Site n’Okwu Chineke

15. Olee otú anyị pụrụ isi gosi na anyị ji Bible kpọrọ ihe?

15 Bible abụwo ebe ndị ohu Jehova na-ekwesị ntụkwasị obi si enweta enyemaka kemgbe ọtụtụ narị afọ. Otú ọ dị, kama ileda Akwụkwọ Nsọ anya, ọ dị anyị mkpa iburu n’uche na ọ bụ isi iyi dị ike nke enyemaka. Ịnabata enyemaka ahụ na-achọ mgbalị. Ọ dị anyị mkpa ime ka ọgụgụ Bible soro n’ihe anyị na-eme mgbe nile.

16, 17. (a) Olee otú Abụ Ọma 1:2, 3 si akọwa nkwụghachi ụgwọ nke ịgụ iwu Chineke? (b) Olee otú Abụ Ọma 1:3 si egosi na anyị aghaghị ịrụsi ọrụ ike?

16 Abụ Ọma 1:2, 3 na-ekwu banyere onye na-atụ egwu Chineke, sị: “N’iwu Jehova ka ihe ụtọ ya dị; ọ bụkwa n’iwu Ya ka ọ na-atụgharị uche ehihie na abalị. Ọ ga-adịkwa ka osisi a kụworo n’akụkụ iyi jupụtara na mmiri, nke na-amị mkpụrụ ya na mgbe ya, ọzọ, akwụkwọ ya adịghị akpọnwụ; ihe ọ bụlakwa nke ọ na-eme, ọ na-eme ka ọ gaa nke ọma.” Ị̀ ghọtara ihe akụkụ Akwụkwọ Nsọ a na-ekwu? Ọ dị mfe ịgụ okwu ndị ahụ ma kwubie na ha na-ese onyinyo ebe mara mma ma dị jụụ—osisi na-enye ndò nke na-eto n’akụkụ mmiri. Lee ka ọ ga-esi bụrụ ihe na-eru ahụ́ ala ihi ụra ehihie n’ebe dị otú ahụ! Ma abụ ọma a adịghị agba anyị ume iche echiche banyere izu ike. Ọ na-ese onyinyo ihe dị nnọọ iche, nke na-enye echiche nke ịrụsi ọrụ ike. N’ụzọ dị aṅaa?

17 Rịba ama na osisi a na-ekwu banyere ya ebe a abụghị nanị osisi na-enye ndò nke puru n’onwe ya n’akụkụ mmiri. Ọ bụ osisi na-amị mkpụrụ, nke a kpachapụrụ anya ‘kụọ’ n’ebe a họọrọ—“n’akụkụ iyi jupụtara na mmiri.” N’ubi mkpụrụ osisi, onye nwe ya pụrụ igwu ọwa mmiri ndị ga-ebuga mmiri na mkpọrọgwụ osisi ya. Ihe a na-ekwu ò doola gị anya ugbu a? Ọ bụrụ na anyị ana-ama akwụkwọ n’ụzọ ime mmụọ dị ka osisi ahụ, ọ bụ n’ihi na a rụwo ọrụ dị ukwuu n’ihi anyị. Anyị nọ ná nzukọ nke na-ewetara anyị mmiri dị ọcha nke eziokwu ahụ, ma anyị aghaghị ime òkè nke anyị. Ọ dị anyị mkpa ime ihe iji na-amịrị mmiri a dị oké ọnụ ahịa, na-atụgharị uche ma na-eme nnyocha ndị dị mkpa iji mee ka eziokwu nke Okwu Chineke dịrị n’uche na n’obi anyị. N’ụzọ dị otú ahụ, anyị onwe anyị kwa ga-amịpụta ezi mkpụrụ.

18. Gịnị dị mkpa iji chọta azịza Bible nke ajụjụ anyị?

18 Bible agaghị abara anyị uru ma ọ bụrụ na ọ nọ na shelf na-ekpo ntụ. Ọ bụghịkwa ọgwụ, ma ọ bụ ọtụmọkpọ—dị ka à ga-asị na anyị pụrụ imechi anya anyị mepee Bible ma tụọ anya inweta azịza nke ajụjụ anyị na peeji ọ bụla meperenụ. Mgbe anyị nwere mkpebi anyị ga-eme, ọ dị anyị mkpa igwupụta “ihe ọmụma Chineke” ka a ga-asị na anyị na-egwu akụ̀ dị oké ọnụ ahịa e liri n’ala. (Ilu 2:1-5) Ọ na-adịkarị mkpa iji ịdị uchu na nlezianya mee nnyocha iji chọta ndụmọdụ Akwụkwọ Nsọ nke ga-egbo mkpa anyị kpọmkwem. Anyị nwere ọtụtụ akwụkwọ ndị dabeere na Bible bụ́ ndị ga-enyere anyị aka ná nnyocha anyị. Ka anyị ji ịdị uchu jiri ha na-egwu amamihe ndị dị oké ọnụ ahịa nke Okwu Chineke, anyị na-erite uru n’enyemaka Jehova n’ezie.

Enyemaka Site n’Aka Ndị Kwere Ekwe Ibe Anyị

19. (a) N’ihi gịnị ka a pụrụ iji lee isiokwu ndị dị n’Ụlọ Nche na Teta! anya dị ka enyemaka sitere n’aka ndị kwere ekwe ibe anyị? (b) Olee otú otu isiokwu pụtara n’otu n’ime akwụkwọ anyị siworo nyere gị aka?

19 Ndị ohu Jehova bụ́ ụmụ mmadụ abụwo mgbe nile isi iyi nke enyemaka nye ibe ha. Jehova ọ̀ gbanwewo? Ọ dịghị ma ọlị. Obi abụọ adịghị ya na onye ọ bụla n’ime anyị pụrụ icheta mgbe anyị nwetara kpọmkwem enyemaka dị anyị mkpa nke bịara n’oge kwesịrị ekwesị site n’aka ndị kwere ekwe ibe anyị. Dị ka ihe atụ, ị̀ pụrụ icheta ụfọdụ isiokwu ndị pụtara n’Ụlọ Nche ma ọ bụ Teta! bụ́ ndị kasiri gị obi mgbe nkasi obi dị gị mkpa ma ọ bụ nyere gị aka idozi otu nsogbu ma ọ bụ imeri ihe ịma aka nye okwukwe gị? Jehova wetaara gị enyemaka ahụ site n’aka “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche” bụ́ onye e kenyere ọrụ nke inye ‘nri n’oge kwesịrị ekwesị.’—Matiu 24:45-47.

20. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka ndị okenye si egosi na ha bụ “onyinye n’ụdị mmadụ”?

20 Otú ọ dị, ndị kwere ekwe ibe anyị na-enyekarịrị anyị aka n’onwe ha. Otu okenye pụrụ ime ihe omume ruru anyị n’obi, ma ọ bụ mee nleta ọzụzụ atụrụ nyeere anyị aka ịgafe oge siri ike, ma ọ bụ jiri obiọma nye anyị ndụmọdụ nke nyeere anyị aka ịhụ na imeri otu adịghị ike. Otu Onye Kraịst nwere ekele dere banyere enyemaka o nwetara site n’aka otu okenye, sị: “N’ozi ubi, o wepụtara oge iji jụpụta m ihe dị m n’obi. N’abalị bọtara ụbọchị ahụ, ekpegaara m Jehova ekpere, na-arịọ ya ka o nyere m aka ịhụ onye m pụrụ ịgwa otú ọ dị m. N’ụbọchị ahụ, nwanna a gwara m okwu n’ụzọ ọmịiko. O nyeere m aka ịhụ otú Jehova siworo na-enyere m aka ruo ọtụtụ afọ. Ana m ekele Jehova maka izitere m okenye a.” N’ụzọ nile dị otú a, ndị okenye na-egosi na ha bụ “onyinye n’ụdị mmadụ,” bụ́ ndị Jehova nyere site n’aka Jizọs Kraịst inyere anyị aka ịtachi obi n’ụzọ nke ndụ.—Ndị Efesọs 4:8.

21, 22. (a) Gịnị ka a na-arụpụta mgbe ndị nọ n’ọgbakọ tinyere ndụmọdụ ahụ a na-achọta ná Ndị Filipaị 2:4 n’ọrụ? (b) N’ihi gịnị ka ọbụna obere omume obiọma ji baa uru?

21 E wezụga ndị okenye, Onye Kraịst ọ bụla na-ekwesị ntụkwasị obi ga-achọ itinye iwu ahụ e dere n’ike mmụọ nsọ bụ́ ‘ilekwasị anya, ọ bụghị n’igosi mmasị onwe onye nanị n’ihe ndị metụtara ya, kamakwa n’igosi mmasị onwe onye n’ihe ndị metụtara ndị ọzọ,’ n’ọrụ. (Ndị Filipaị 2:4) Mgbe ndị nọ n’ọgbakọ tinyere ndụmọdụ ahụ n’ọrụ, ọ na-arụpụta omume obiọma. Dị ka ihe atụ, ọdachi gbara mkpị dakwasịrị otu ezinụlọ. Nna nwe ụlọ kpọ nwa ya nwanyị ka na-eto eto gaa ịzụta ihe n’ụlọ ahịa. Ka ha na-alọta, ha nwere ihe mberede ụgbọala. Nwa ya nwanyị nwụrụ; nna ya merụrụ ahụ́ nke ukwuu. Mgbe o si ụlọ ọgwụ lọta, na mbụ nkwarụ o nwere dị nnọọ ukwuu nke na ọ pụghị ime ihe ọ bụla n’onwe ya. Uche gbasasịrị nnọọ nwunye ya nke na nanị ya apụghị ilekọta ya. N’ihi ya, otu di na nwunye nọ n’ọgbakọ ha kpọọrọ di na nwunye a na-eru újú ma lekọta ha ruo ọtụtụ izu.

22 N’ezie, ọ bụghị nanị mgbe ọdachi dị otú ahụ mere ma ọ bụ mgbe mmadụ chụrụ onwe ya n’ájá otú ahụ ka a na-egosipụta obiọma. Ụfọdụ enyemaka ndị anyị na-enweta na-adị nnọọ nta karịa nke ahụ. Ma, n’agbanyeghị otú omume obiọma ahụ dịruru nta, anyị na-enwe ekele maka ya, ọ̀ bụ na anyị adịghị enwe? Ị̀ pụrụ icheta mgbe okwu obiọma ma ọ bụ omume nwanna nwoke ma ọ bụ nwanna nwanyị chere echiche mee bụụrụ gị nnọọ enyemaka dị gị mkpa? Jehova na-esikarị n’ụzọ ndị dị otú ahụ elekọta anyị.—Ilu 17:17; 18:24.

23. Olee otú Jehova si ele ya anya mgbe anyị na-agbalị inyerịtara ibe anyị aka?

23 Ọ̀ ga-amasị gị ka Jehova na-eji gị eme ihe inyere ndị ọzọ aka? A na-eche gị ihe ùgwù ahụ n’ihu. N’ezie, Jehova na-eji mgbalị dị otú ahụ akpọrọ ihe. Okwu ya na-asị: “Onye na-ebinye Jehova ihe ka onye na-emere onye na-enweghị ike amara bụ, ọ bụkwa mmeso ọma ya ka Ọ ga-akwụghachi ya.” (Ilu 19:17) Ọṅụ dị ukwuu na-abịa site n’inye ụmụnna anyị onwe anyị. (Ọrụ 20:35) Ma ọṅụ nke inyere ndị ọzọ aka n’ụzọ dị otú ahụ ma agbamume nke inweta enyemaka dị otú ahụ adịghị nke na-abịara ndị kpachaara anya na-ekewapụ onwe ha. (Ilu 18:1) N’ihi ya, ka anyị na-ezukọta mgbe nile ná nzukọ Ndị Kraịst ka anyị wee nwee ike ịgbarịta ibe anyị ume.—Ndị Hibru 10:24, 25.

24. Gịnị mere na anyị ekwesịghị iche na ọ dị ihe funahụrụ anyị n’ihi na anyị ahụghị ọrụ ebube ndị pụtara ìhè Jehova rụrụ n’oge gara aga?

24 Ọ́ bụghị ihe na-enye obi ụtọ ịtụgharị uche n’ụzọ ndị Jehova si enyere anyị aka? Ọ bụ ezie na anyị ebighị n’oge Jehova nọ na-arụ ọrụ ebube ndị pụtara ìhè iji mezuo nzube ya, ọ dịghị anyị mkpa iche na ọ dị ihe funahụrụ anyị. Ihe dị mkpa n’ezie bụ na Jehova na-enyere anyị nile aka mgbe enyemaka dị anyị mkpa ka anyị wee nwee ike ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi. Ọ bụrụkwa na anyị ejiri okwukwe na-atachikọta obi, anyị ga-adị ndụ ịhụ ọrụ Jehova ndị kasị pụọ iche ma dị ebube n’akụkọ ihe mere eme nile! Ka anyị kpebisie ike ịnabata ma jiri enyemaka ịhụnanya Jehova na-eme ihe n’ụzọ zuru ezu ka anyị wee nwee ike ikwughachi ihe ahụ dị n’isiokwu dịịrị afọ 2005: “Inyeaka m na-esi n’aka Jehova bịa.”—Abụ Ọma 121:2.

Gịnị Ka I Chere?

Olee otú Jehova si enyere anyị aka mgbe enyemaka dị anyị mkpa taa—

• site n’aka ndị mmụọ ozi?

• site ná mmụọ nsọ ya?

• site n’Okwu ya e dere n’ike mmụọ nsọ?

• site n’aka ndị kwere ekwe ibe anyị?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 18]

Ọ bụ ihe na-agba ume ịmara na ndị mmụọ ozi na-akwado anyị n’ọrụ nkwusa anyị

[Foto dị na peeji nke 21]

Jehova pụrụ iji otu n’ime ndị kwere ekwe ibe anyị mee ihe iji wetara anyị nkasi obi dị anyị mkpa