Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ụbọchị Ngụsị Akwụkwọ—Ụbọchị Magburu Onwe Ya

Ụbọchị Ngụsị Akwụkwọ—Ụbọchị Magburu Onwe Ya

Ụbọchị Ngụsị Akwụkwọ—Ụbọchị Magburu Onwe Ya

“ỤBỌCHỊ taa amaka. Ebe nile na-egbukepụ egbukepụ. Ihu igwe gbachapụrụ agbachapụ. Ahịhịa ndụ jupụtara ebe nile. Anyị na-anụ ube ụmụ nnụnụ. Ụbọchị taa magburu onwe ya, ọ dịghịkwa ihe ga-emebi ya. Jehova abụghị Chineke na-agha agha. Ọ bụ Chineke nke ngọzi.”

Nwanna Samuel Herd, bụ́ onye so n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova, ji okwu ndị a malite usoro ihe omume ngụsị akwụkwọ nke klas nke 117 nke Watchtower Bible School of Gilead. Ọ bụ na September 11, 2004. Usoro ihe omume ọma ahụ gụnyere ndụmọdụ ndị na-ewuli elu dabeere na Bible tinyere ahụmahụ ụmụ akwụkwọ ahụ nwere nakwa ahụmahụ ndị ozi ala ọzọ. Ee, ọ bụ ụbọchị magburu onwe ya nye mmadụ 6,974 nile bịara ememe ahụ n’Ebe Agụmakwụkwọ Watchtower dị na Patterson, New York, na n’ihe owuwu ndị dị na Brooklyn nakwa na Wallkill, bụ́ ndị geere ihe a na-ekwu n’ígwè okwu na ndị kiriri ya na TV.

Okwu Agbamume Nye Ụmụ Akwụkwọ Ahụ

John Kikot, bụ́ onye so na Kọmitii Alaka United States, kwuru okwu ndị na-agba ume n’isiokwu bụ́ “Nọgide Na-enwe Ọṅụ Dị Ka Onye Ozi Ala Ọzọ.” O mere ka ọ pụta ìhè na e ji ọṅụ mara ụmụ akwụkwọ Gilead, dị ka ọ pụtara ìhè n’ụbọchị ngụsị akwụkwọ a. Ntụziaka ndị sitere n’Akwụkwọ Nsọ ha nwetara n’oge agụmakwụkwọ ha wetaara ụmụ akwụkwọ ahụ ọṅụ, ha nọzikwa n’ọnọdụ nke inyere ndị ọzọ aka inweta ọṅụ yiri nke ahụ. N’ụzọ dị aṅaa? Site n’inyefe onwe ha n’ozi ha dị ka ndị ozi ala ọzọ. Jizọs kwuru, sị: “A na-enwe obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enwe n’ịnara ihe.” (Ọrụ 20:35) Ka ha na-eṅomi Jehova Chineke, bụ́ “Chineke onye obi ụtọ” nke na-emesapụ aka na onye na-enye ndị ọzọ eziokwu ahụ, ndị ozi ala ọzọ ọhụrụ ahụ ga-enwe ike ịnọgide na-enwe ọṅụ.—1 Timoti 1:11.

Ọkà okwu sochirinụ n’usoro ihe omume ahụ bụ onye ọzọ so n’Òtù Na-achị Isi, bụ́ David Splane, onye isiokwu ya bụ “Olee Otú Gị na Ndị Ọzọ Ga-esi Na-adị ná Mma?” Obi abụọ adịghị ya na ọ bụ ihe dị mma ma dị ụtọ ibikọ n’otu, ọ bụ ezie na nke a pụrụ ịchọ mmadụ ịghọ “ihe nile n’ebe ụdị mmadụ nile nọ.” (1 Ndị Kọrint 9:22; Abụ Ọma 133:1) Nwanna Splane kwuru na ụmụ akwụkwọ ahụ na-agụsị akwụkwọ na ọtụtụ ndị ọzọ ga na-emekọ ihe n’ozi ala ọzọ ha—ndị ógbè ahụ, ndị ozi ala ọzọ ibe ha, ụmụnna nọ n’ọgbakọ ọhụrụ ha, nakwa ndị na-ahazi ọrụ nkwusa na izi ihe n’alaka ụlọ ọrụ. Ọ tụrụ aro ndị dị irè banyere otú mmadụ na ndị ọzọ ga-esi na-enwe ezi mmekọrịta ruo n’ókè o kwere mee: Mụta asụsụ ógbè ahụ, mata omenala ha, mata mgbe ndị ozi ala ọzọ ibe gị chọrọ ịnọrọ onwe ha, na-erubekwara ndị na-edu ndu isi.—Ndị Hibru 13:17.

Mgbe nke ahụ gasịrị, onye nkụzi Gilead bụ́ Lawrence Bowen jụrụ, sị, “Gịnị Ka Ị Na-eche?” O chetaara ụmụ akwụkwọ ahụ na ndị ‘na-ekpe ikpe na-adabere n’ọdịdị elu ahụ́’ anabataghị Jizọs dị ka Mezaịa ahụ. (Jọn 7:24) Dị ka ụmụ mmadụ na-ezughị okè, ọ dị mmadụ nile mkpa ịnọ na nche megide ‘iche echiche nke mmadụ’ kama iche “echiche Chineke.” (Matiu 16:22, 23) Ọbụna ndị ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe aghaghị ịnọgide na-agbazi echiche ha. Dị ka ụgbọ mmiri nọ n’oké osimiri, ịgbazi echiche gị ugbu a pụrụ ikpebi ma ị̀ ga-eru ihe mgbaru ọsọ gị ka ụgbọ gị ọ̀ ga-ekpu n’ụzọ ime mmụọ. Ịnọgide na-amụ Bible ma na-echebara ihe ndị gbara ihe ndị a na-ekwu gburugburu echiche na-enyere anyị aka iche “echiche Chineke.”

Wallace Liverance, bụ́ onye nkụzi ọzọ n’Ụlọ Akwụkwọ Gilead mechiri akụkụ a nke usoro ihe omume ahụ. Isiokwu ya bụ́ “Gịnị Ka Ị Ga-azụ?” dabeere n’Aịsaịa 55:1. Ọ gbara ụmụ akwụkwọ ahụ ume ‘ịzụta’ ume ọhụrụ, ọṅụ, na afọ ojuju nke ozi amụma Chineke maka oge anyị na-enye. Amụma Aịzaịa ji okwu Chineke a tụnyere mmiri, mmanya na mmiri ara ehi. Olee otú a pụrụ isi zụta ya “n’ejighị ego n’ahụghị ọnụ ahịa”? Nwanna Liverance kọwara na ọ bụ site n’ige ntị n’amụma Bible na iji echiche na ụzọ Chineke na-edochi echiche na ụzọ ndị na-ekwekọghị n’Akwụkwọ Nsọ. (Aịsaịa 55:2, 3, 6, 7) Site n’ime nke a, ndị ozi ala ọzọ ọhụrụ ahụ pụrụ ịnọgide n’ozi ala ọzọ ha. Ụmụ mmadụ na-ezughị okè na-echekarị na obi ụtọ dabeere n’ịgbalịsi ike ịchọta ntụsara ahụ́ n’ụzọ ihe onwunwe. “Anakwerela echiche ahụ,” ka ọkà okwu ahụ gbara ume. “Ekwela ka echiche ahụ metụta gị. Jide n’aka na ị na-ewepụta oge maka ọmụmụ ihe miri emi nke Okwu amụma Chineke. Ọ pụrụ inye gị ume ọhụrụ, wusie gị ike ma wetara gị ọṅụ n’ozi ala ọzọ gị.”

Ahụmahụ Ndị Na-enye Obi Ụtọ Sitere n’Ọnụ Ụmụ Akwụkwọ ahụ na Ajụjụ Ọnụ

Ụmụ akwụkwọ ahụ keere òkè chiri anya n’ọrụ nkwusa ahụ. Ná mkparịta ụka nke Mark Noumair, bụ́ onye nkụzi ọzọ nke Gilead, duziri, ọtụtụ n’ime ụmụ klas ahụ mere ihe ngosi nke ahụmahụ ndị ha nwere bụ́ ndị mere ka isiokwu bụ́ “Ihere Ozi Ọma ahụ Adịghị Eme Ha” pụta ìhè. (Ndị Rom 1:16) Ndị bịara ememe ahụ nwere obi ụtọ ịhụ otú ndị ozi a nwere ahụmahụ si gbaa àmà site n’ụlọ ruo n’ụlọ, n’okporo ámá nakwa n’ebe azụmahịa. Ụmụ akwụkwọ ndị maara asụsụ ndị ọzọ mere ihe iji ozi ọma ahụ jekwuru ndị na-asụ asụsụ ndị ahụ n’ókèala ọgbakọ ha. Ndị ọzọ jiri akwụkwọ ndị dabeere na Bible bụ́ ndị Ndịàmà Jehova bipụtara mee ihe, na-eji akwụkwọ ndị dị otú ahụ eme ihe ná nletaghachi na mgbe ha na-amalite ọmụmụ Bible ebe obibi. ‘Ihere emeghị’ ha ikwusa ozi ọma ahụ.

Nwanna William Nonkes, bụ́ onye na-arụ ọrụ ná Ngalaba Ije Ozi, gbara ndị ozi ala ọzọ nwere ahụmahụ si Burkina Faso, Latvia na Russia ajụjụ ọnụ. Ha nyere ndụmọdụ ndị bara uru bụ́ ndị hiwere isi n’isiokwu bụ́ “Jehova Na-eji Ịhụnanya Enye Ndị Na-ekwesị Ntụkwasị Obi Ụgwọ Ọrụ.” Otu n’ime ụmụnna ndị a gbara ajụjụ ọnụ gbara ụmụ akwụkwọ ahụ ume icheta narị ndị agha atọ Gidiọn. Onye agha nke ọ bụla rụrụ ọrụ nke mere ka mwakpo Gidiọn wakporo ndị iro ya gaa nke ọma. (Ndị Ikpe 7:19-21) N’ụzọ yiri nke ahụ, a na-akwụghachi ndị ozi ala ọzọ bụ́ ndị nọgidere n’ozi ha ụgwọ.

“Ghọọ Ihe Nile n’Ebe Ụdị Mmadụ Nile Nọ” bụ isiokwu e mere ka ọ pụta ìhè n’ajụjụ ọnụ nke Samuel Roberson, bụ́ onye nkụzi na Patterson, duziri. Ọ gbara mmadụ anọ so na Kọmitii Alaka, bụ́ ndị si Senegal, Guam, Liberia, na Madagascar, ajụjụ ọnụ. Ngụkọta nke ndị ozi ala ọzọ dị otu narị na iri asaa na-eje ozi n’ala ndị a. Site n’ihe ndị ha kwuru, ụmụ akwụkwọ ahụ na-agụsị akwụkwọ hụrụ otú Kọmitii Alaka si enyere ndị ozi ala ọzọ ọhụrụ aka ime mgbanwe iji kwekọọ n’ihe a na-eme n’ebe ndị e kenyere ha ọrụ. Nke ahụ na-apụtakarị ịmụ omenala ndị na-ekwekọghị n’ihe a na-eme n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa. Dị ka ihe atụ, n’ala ụfọdụ, ọ bụ ihe a na-ahụkarị bụ́ ụmụ nwoke, gụnyere ndị nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst, ijide aka dị ka ndị enyi ka ha na-aga n’okporo ụzọ. N’ebe ụfọdụ alaka ụlọ ọrụ Guam na-elekọta, a na-enye ndị mmadụ ụdị nri ndị a na-adịghị erikebe. Ma, ọ marala ndị ọzọ ahụ́, ọ pụkwara ịmara ndị ozi ala ọzọ ọhụrụ ahụ́.

Guy Pierce, bụ́ onye so n’Òtù Na-achị Isi, kwuru okwu n’isiokwu bụ́ “Nọgide Na-eguzosi Ike n’Ihe Nye ‘Alaeze nke Onyenwe Anyị.’” O chetaara ndị ahụ bịaranụ, sị: “Jehova nwere nzube o ji kee ihe. O nwere ihe o bu n’obi kee ihe ndị o kere. Nzube ya banyere ụwa a agbanwebeghị. Ọ na-eru mmezu ya n’ike n’ike. Ọ dịghị ihe pụrụ igbochi ya.” (Jenesis 1:28) Nwanna Pierce gbara mmadụ nile ume iji iguzosi ike n’ihe na-edo onwe ha n’okpuru ọbụbụeze Chineke n’agbanyeghị ihe isi ike ndị biliteworo n’ihi mmehie nke nwoke mbụ ahụ, bụ́ Adam. “Anyị bi n’oge ikpe. Oge anyị nwere iji wegara ndị obi ha ziri ezi eziokwu ahụ dị mkpirikpi. Jiri oge ahụ mee ihe nke ọma site n’iwegara ndị ọzọ ozi ọma Alaeze ahụ,” ka Nwanna Pierce gbara ume. Ndị ji iguzosi ike n’ihe na-akwado Alaeze Chineke pụrụ ijide n’aka na ọ nọnyeere ha.—Abụ Ọma 18:25.

Ná mmechi, onyeisi oche gụpụtara ozi ekele ndị sitere n’alaka ụlọ ọrụ gburugburu ụwa. Mgbe ahụ o nyere ụmụ akwụkwọ ahụ na-agụsị akwụkwọ diplọma ha, otu n’ime ha gụrụ akwụkwọ ozi nke klas ahụ dere, bụ́ nke gosipụtara ekele ha nwere maka ọzụzụ ha nwetara. Ọ bụ mmechi kwesịrị ekwesị maka ụbọchị ahụ magburu onwe ya nke ndị nile bịaranụ ga-echeta ruo ogologo oge.

[Igbe dị na peeji nke 23]

IHE BANYERE KLAS AHỤ

Ọnụ ọgụgụ mba ha si bịa: 11

Ọnụ ọgụgụ mba e zigara ha: 22

Ọnụ ọgụgụ ụmụ akwụkwọ: 48

Nkezi afọ ndụ ha: 34.8

Nkezi afọ ha nọworo n’eziokwu: 18.3

Nkezi afọ ha nọworo n’ozi oge nile: 13.4

[Foto dị na peeji nke 24]

Klas nke 117 Na-agụsị Akwụkwọ nke Watchtower Bible School of Gilead

Ná ndepụta dị n’okpuru, e nyere ahịrị ndị ahụ nọmba site n’ihu gaa n’azụ, e depụtakwara aha ha site n’aka ekpe gaa n’aka nri n’ahịrị nke ọ bụla.

(1) Thompson, E.; Norvell, G.; Powell, T.; Kozza, M.; McIntyre, T. (2) Reilly, A.; Clayton, C.; Allan, J.; Blanco, A.; Muñoz, L.; Rustad, N. (3) Guerrero, Z.; Garcia, K.; McKerlie, D.; Ishikawa, T.; Blanco, G. (4) McIntyre, S.; Cruz, E.; Guerrero, J.; Ritchie, O.; Avellaneda, L.; Garcia, R. (5) Powell, G.; Fiskå, H.; Muñoz, V.; Baumann, D.; Shaw, S.; Brown, K.; Brown, L. (6) Shaw, C.; Reilly, A.; Peloquin, C.; Münch, N.; McKerlie, D.; Ishikawa, K. (7) Münch, M.; Peloquin, J.; Kozza, T.; Avellaneda, M.; Allan, K.; Ritchie, E.; Norvell, T. (8) Cruz, J.; Baumann, H.; Clayton, Z.; Fiskå, E.; Thompson, M.; Rustad, J.