Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ebe Ezi Ofufe na Ikpere Arụsị Sọrịtara Mpi

Ebe Ezi Ofufe na Ikpere Arụsị Sọrịtara Mpi

Ebe Ezi Ofufe na Ikpere Arụsị Sọrịtara Mpi

RUO ihe karịrị otu narị afọ, ndị ọkà mmụta ihe ochie emewo ọtụtụ nnyocha ná mkpọmkpọ ebe nke Efesọs oge ochie nke dị n’ụsọ oké osimiri ebe ọdịda anyanwụ Turkey. E wughachiwo ọtụtụ ihe owuwu, ndị ọkà mmụta sayensị amụwokwa ma kọwaa ọtụtụ ihe ndị a chọtara. N’ihi ya, Efesọs bụ otu n’ime ebe ndị kasị adọta mmasị ndị njem nleta na Turkey.

Gịnị ka a chọpụtaworo banyere Efesọs? Olee otú a pụrụ isi kọwaa taa nnukwu obodo oge ochie ahụ na-adọrọ mmasị? Ileta ma mkpọmkpọ ebe Efesọs ma Ebe Ndebe Ihe Ochie Efesọs dị na Vienna, Austria, ga-enyere anyị aka ịghọta otú ezi ofufe na ife arụsị si sọrịta mpi n’Efesọs. Ka anyị buru ụzọ tụlee ihe ụfọdụ banyere Efesọs.

Ebe A Chọsiri Ike

E ji ọgba aghara na nkwagharị mara Europe na Eshia na narị afọ nke 11 T.O.A. Ọ bụ mgbe ahụ ka ndị Gris bụ́ ndị Ionia malitere iweghara ebe ọdịda anyanwụ nke ụsọ oké osimiri Asia Minor. Ndị mbụ biri ebe ahụ zutere ndị na-efe chi nne, bụ́ chi a ga-emecha mara dị ka Atemis nke Efesọs.

N’etiti narị afọ nke asaa T.O.A., ndị Cimmeria na-awagharị awagharị na-esi n’ógbè Oké Osimiri Ojii dị n’ebe ugwu abịa ịkwakọrọ ihe n’Asia Minor. Ka e mesịrị, n’ihe dị ka 550 T.O.A., Eze Croesus nke Lydia, bụ́ onye ọchịchị dị ike nke e ji nnukwu akụ̀ ya mara, malitere ịchị. Ka ọ na-amụba Alaeze Ukwu Peasia, Eze Saịrọs meriri obodo ndị Ionia, gụnyere Efesọs.

Na 334 T.O.A., Alexander nke Masedonia malitere ibuso Peasia agha, si otú ahụ ghọọ onye ọchịchị ọhụrụ nke Efesọs. Mgbe nnwụchu ọnwụ Alexander gasịrị na 323 T.O.A., ndị ọchịagha ya malitere ịzọ Efesọs. Na 133 T.O.A., Attalus nke Atọ, bụ́ eze Pagamọm na-enweghị nwa, nyere ndị Rom Efesọs, na-eme ka ọ ghọọ akụkụ nke ógbè ndị Rom n’Eshia.

Ezi Ofufe na Ikpere Arụsị Asọrịta Mpi

Mgbe Pọl onyeozi bịara n’Efesọs ná ngwụsị nke njem ozi ala ọzọ ya nke abụọ na narị afọ mbụ O.A., obodo ahụ nwere ihe dị ka narị puku mmadụ atọ bi na ya. (Ọrụ 18:19-21) N’oge njem ozi ala ọzọ ya nke atọ, Pọl laghachiri Efesọs ma kwuo okwu n’atụghị egwu banyere Alaeze Chineke n’ụlọ nzukọ ndị Juu dị n’ebe ahụ. Otú ọ dị, mgbe ọnwa atọ gasịrị, mmegide sitere n’aka ndị Juu kara njọ, Pọl kpebikwara ikwu okwu kwa ụbọchị n’ụlọ mgbakọ nke ụlọ akwụkwọ Taịranọs. (Ọrụ 19:1, 8, 9) Ọrụ nkwusa ya gara n’ihu ruo afọ abụọ, tinyere oké ọrụ dị ike, dị ka ịgwọ ọrịa n’ụzọ ọrụ ebube na ịchụpụ ndị mmụọ ọjọọ. (Ọrụ 19:10-17) Ka a sịkwa ihe mere ọtụtụ ndị ji ghọọ ndị kwere ekwe! Ee, okwu Jehova meriri, nke na ọtụtụ na-emebu mgbaasị ji aka ha gbaa akwụkwọ ha ndị dị oké ọnụ ahịa ọkụ.—Ọrụ 19:19, 20.

Ihe ịga nke ọma Pọl nwere n’ime nkwusa abụghị nanị na ọ kpaliri ọtụtụ ịhapụ ofufe nke chi nwanyị Atemis kama ọ kpasukwara ndị na-akwado ikpere arụsị dị otú ahụ iwe nke ukwuu. Ịkpụ ụlọ arụsị ọlaọcha nke Atemis bụ achụmnta ego na-eweta uru. N’ịbụ ndị e yiri ahịa ha egwu, Dimitriọs kpaliri ndị na-akpụ ọlaọcha ịkpa aghara.—Ọrụ 19:23-32.

Ọgba aghara ahụ mesịrị ruo n’ókè nke ìgwè mmadụ ahụ iti mkpu ruo awa abụọ, na-asị: “Atemis nke ndị Efesọs dị ukwuu!” (Ọrụ 19:34) Mgbe ọgba aghara ahụ belatara, Pọl gbara Ndị Kraịst ibe ya ume ọzọ ma gaa n’ihu na njem ya. (Ọrụ 20:1) Otú ọ dị, ọpụpụ ọ pụrụ gawa Masedonia egbochighị ọdịda maliterela amalite nke ofufe Atemis.

Ụlọ Nsọ Atemis Adakasịa

Ofufe Atemis gbanyesiri mkpọrọgwụ ike n’Efesọs. Tupu oge Eze Croesus, chi a kasị efe ofufe n’ebe ahụ bụ chi nne bụ́ Cybele. Site n’ịkọ akụkọ ifo otú Cybele na chi ndị Gris si nwee njikọ, Croesus bu n’uche ihiwe chi nke ma ndị Gris ma ndị na-abụghị ndị Gris ga-anabata. Site ná nkwado ya, n’etiti narị afọ nke isii T.O.A., a malitere ịrụ ụlọ nsọ nke chi ga-anọchi Cybele, bụ́ Atemis.

Ụlọ nsọ ahụ bụ ihe owuwu dị ịrịba ama ndị Gris wuru. Ọ dịbeghị mgbe e jiri nnukwu blọk mabụl wuo ụdị ihe owuwu a ma ọ bụ nke buru ibu ka ya. E ji ọkụ bibie ụlọ nsọ ahụ na 356 T.O.A. Ụlọ nsọ ahụ nke e wughachiri ewughachi bụ́ nke makwara mma ka nke bu ya ụzọ mekwara ka ọtụtụ ndị nweta ọrụ ma dọta mmasị ndị njem ala nsọ. N’ịbụ nke e wuru n’ebe dị mita iri asaa na atọ n’obosara na otu narị na iri mita abụọ na asaa n’ogologo, ụlọ nsọ ahụ e wughachiri ewughachi dị ihe dị ka mita iri ise n’obosara na otu narị mita na ise n’ogologo. E lere ya anya dị ka otu n’ime ihe ịtụnanya asaa nke ụwa. Otú ọ dị, ọ bụghị mmadụ nile nwere mmasị na ya. Ọkà ihe ọmụma bụ́ Heracleitus nke Efesọs ji paseeji gbara ọchịchịrị nke na-eduga n’ebe ịchụàjà nke ụlọ nso ahụ tụnyere ọchịchịrị nke omume rụrụ arụ, o lekwara omume ndị a na-eme n’ụlọ nsọ ahụ anya dị ka ndị ka nke anụ ọhịa njọ. Otú ọ dị, nye ọtụtụ ndị, ebe nsọ Atemis n’Efesọs yiri ihe na-agatụghị apụ n’anya. Ma akụkọ ihe mere eme gosiri na ọ pụrụ n’anya. Akwụkwọ bụ́ Ephesos—Der neue Führer (Efesọs—Ihe Nduzi Ọhụrụ) na-ekwu, sị: “Ka ọ na-erule narị afọ nke abụọ, ofufe Atemis na nke chi ndị ọzọ a ma ama pụrụ n’anya.”

Na narị afọ nke atọ O.A., oké ala ọma jijiji kpara Efesọs aka ọjọọ. Ọzọkwa, ndị Goth si n’ógbè Oké Osimiri Ojii ji ụgbọ mmiri bịa kwakọrọ akụ̀ ndị dị oké ọnụ ahịa nke ụlọ nsọ Atemis, ha mesịkwara mụnye ụlọ nsọ ahụ ọkụ. Akwụkwọ ahụ a ka kpọpụrụ aha na-ekwu, sị: “N’ịbụ onye e meriri na onye na-echebelighị ebe obibi ya, olee otú a pụrụ isi lee Atemis anya dị ka onye nchebe nke obodo?”—Abụ Ọma 135:15-18.

N’ikpeazụ, ná ngwụsị nke narị afọ nke anọ O.A., Eze Ukwu Theodosius nke Mbụ mere ka “Iso Ụzọ Kraịst” ghọọ okpukpe mba ahụ. N’oge na-adịghị anya, ụlọ nsọ Atemis ahụ a na-akwanyeburu ùgwù ghọrọ ebe ndị mmadụ na-akụrụ okwute ha ji ewu ụlọ. Ofufe nke Atemis pụrụ n’anya kpamkpam. Otu onye a na-akpọghị aha nke hụrụ mkpọmkpọ ebe ahụ kwuru banyere uri e ji eto ụlọ nsọ ahụ dị ka ihe ịtụnanya nke ụwa oge ochie, sị: “Ọ bụzi nnọọ mkpọmkpọ ebe tọgbọrọ n’efu.”

Site n’Ịbụ Atemis Gaa n’Ịbụ “Nne nke Chukwu”

Pọl dụrụ ndị okenye nke ọgbakọ dị n’Efesọs ọdụ na mgbe ya pụsịrị “nkịta ọhịa ndị obi tara mmiri” ga-apụta nakwa na ndị ikom ga-esite n’etiti ha bilie ma “na-ekwu ihe ndị gbagọrọ agbagọ.” (Ọrụ 20:17, 29, 30) Nke ahụ bụ nnọọ ihe merenụ. Ihe ndị mere eme na-ekpughe na ofufe ụgha jupụtara n’Efesọs n’ụdị Iso Ụzọ Kraịst adịgboroja.

Na 431 O.A., e nwere nzukọ nke atọ nke ndị isi chọọchị n’Efesọs, bụ́ ebe a tụlere ọdịdị Kraịst. Ephesos—Der neue Führer na-akọwa, sị: “Ndị Alexandria bụ́ ndị kweere na Kraịst abụghị ihe ọ bụla ọzọ ma ọ́ bụghị chi . . . nwere mmeri zuru ezu.” Nke ahụ mebiri ọtụtụ ihe. “Mkpebi ahụ e mere n’Efesọs, nke buliri Meri site n’ọkwá nke nne nke Kraịst gaa na nke nne nke Chukwu, abụghị nanị na o mere ka a malite ife Meri ofufe kamakwa ọ kpatara oké nkewa mbụ e nwere na chọọchị. . . . Arụmụka ahụ ka na-aga n’ihu taa.”

Ya mere, e ji ofufe Meri “nne nke Chukwu” dochie ofufe Cybele na Atemis. Dị ka akwụkwọ ahụ na-ekwu, “Ofufe Meri . . . ka bụ omenala n’Efesọs, bụ́ nke e jikọtara ya na Ofufe Atemis.”

Ofufe Atemis Apụọ n’Anya

Mgbe ofufe Atemis pụsịrị n’anya, Efesọs dara. Ala ọma jijiji, ịba, na ájá nke jiri nwayọọ nwayọọ na-agbachi ọdụ ụgbọ mmiri ya mere ka ndụ n’obodo ahụ na-esiwanye ike.

Ka ọ na-erule narị afọ nke asaa O.A., okpukpe Alakụba amalitela ịgbasa. Ihe Alakụba mere abụghị nanị ijikọta ebo ndị Arab n’okpuru ya. Ìgwè ndị Arab wakporo Efesọs na narị afọ nke asaa na nke asatọ O.A. Efesọs pụrụ n’anya mgbe ájá gbachiri ọdụ ụgbọ mmiri ya kpamkpam, obodo ahụ aghọọkwa mkpọmkpọ ebe. Nanị ihe fọdụrụ n’ebe ahụ bụ́bu obodo ukwu magburu onwe ya bụ otu obere ógbè aha ya bụ Aya Soluk (nke a na-akpọzi Selçuk).

Ịgagharị ná Mkpọmkpọ Ebe nke Efesọs

Iji hụ ebube nke Efesọs oge ochie, mmadụ pụrụ ịga nleta ná mkpọmkpọ ebe ya. Ọ bụrụ na i si n’ụzọ mbata nke ebe mgbago malite ngagharị gị, ị ga-ahụ ebe magburu onwe ya site n’Okporo Ámá Curetes ruo n’Ọ́bá akwụkwọ Celsus. N’aka nri nke okporo ámá ahụ, Odeum—obere ebe ihe nkiri e wuru na narị afọ nke abụọ O.A.—ga-adọrọ mmasị gị. N’ịbụ nke na-aba ihe dị ka otu puku na narị mmadụ ise, o yiri ka ọ bụghị nanị na e jiri ya mee ihe dị ka ebe ndị kansụl obodo na-ezukọ kamakwa dị ka ebe ntụrụndụ ọha na eze. Ihe owuwu ndị dị ka ebe nzukọ obodo bụ́ ebe a na-anọ atụle ihe ndị metụtara obodo, ụlọ nsọ Hadrian, ụfọdụ olulu mmiri ọha na eze, na ụlọ ndị dị n’akụkụ ugwu—bụ́ ebe obibi nke ndị oké ozu n’Efesọs—dịgasị n’akụkụ abụọ nke Okporo Ámá Curetes.

N’ịbụ nke e wuru na narị afọ nke abụọ O.A., ịma mma nke nnukwu Ọ́bá Akwụkwọ Celsus ga-adọrọ mmasị gị. E debere ọtụtụ akwụkwọ mpịakọta ya n’oghere ndị dị ná nnukwu ọnụ ụlọ ịgụ akwụkwọ ya. Ihe anọ a kpụrụ akpụ bụ́ ndị dị n’ihu ya na-adọrọ adọrọ na-egosi àgwà anọ a na-atụ anya ha n’aka onye ọrụ ọchịchị nọ n’ọkwá dị elu dị ka Celsus, ha bụ: Sophia (amamihe), Arete (omume ọma), Ennoia (nraranye), na Episteme (ihe ọmụma ma ọ bụ nghọta). A pụrụ ịhụ ihe ndị ahụ a kpụrụ akpụ ndị mbụ ha n’Ebe Ndebe Ihe Ochie Efesọs dị na Vienna. Na nso ihu ọ́bá akwụkwọ ahụ, e nwere otu nnukwu ọnụ ụzọ na-eduga n’ámá ezumezu Tetragonos, bụ́ ọma ahịa. Ndị mmadụ na-anọ na-azụrụ ahịa ha n’ámá a buru oké ibu, bụ́ nke ebe mkpagharị e kpuchiri elu ha ekpuchi gbara gburugburu.

Ebe ọzọ bụ Okporo Ụzọ Mabụl, bụ́ nke na-eduga ná nnukwu ebe ihe nkiri. N’ihi mwusawanye ikpeazụ e wusawanyere ebe ahụ n’oge ọchịchị alaeze ukwu Rom, ebe ihe nkiri ahụ bara ihe dị ka puku mmadụ iri abụọ na ise. E ji ọtụtụ ide, ihe a tụrụ n’ahụ́ ájá na ihe a kpụrụ akpụ chọọ ihu ya mma. Ị pụrụ ịhụ nke ọma oké ọgba aghara Dimitriọs onye na-akpụ ọlaọcha kpalitere n’etiti ìgwè mmadụ ahụ zukọrọ ebe ahụ.

Okporo ámá nke si ná nnukwu ebe ihe nkiri ahụ gaa n’ọdụ ụgbọ mmiri obodo ahụ mara mma dị egwu. Ọ dị ihe dị ka narị mita ise n’ogologo na mita iri na otu n’obosara, bụrụ nke e ji ide chọọ akụkụ abụọ ya mma. E wukwara ebe mmega ahụ́ nke ebe ihe nkiri na ebe mmega ahụ́ nke ọdụ ụgbọ mmiri, bụ́ ndị e wuru iji na-enye ahụ́ ọzụzụ, n’okporo ámá a. Nnukwu ọnụ ụzọ dị ná ngwụsị nke okporo ámá ahụ bụ ebe anyị si pụọ, ọ bụkwa n’ebe a ka obere ngagharị anyị n’otu n’ime mkpọmkpọ ebe ndị kasị adọrọ mmasị n’ụwa bịara ná njedebe. Ihe atụ e ji osisi mee nke obodo ukwu a mere ihe akụkọ na ọtụtụ ihe ọkpụkpụ dị n’Ebe Ndebe Ihe Ochie Efesọs dị na Vienna.

Ịgagharị n’ebe a na-edebe ihe ochie na ịhụ ihe ọkpụkpụ nke Atemis nke Efesọs ga-eme ka mmadụ chee echiche banyere ntachi obi nke Ndị Kraịst oge mbụ n’Efesọs. Ha biri n’obodo nke jupụtara ná mgbaasị na nke ịkpọasị okpukpe mechiri anya. Ozi Alaeze ahụ nwetara mmegide kpụ ọkụ n’ọnụ site n’aka ndị na-efe Atemis. (Ọrụ 19:19; Ndị Efesọs 6:12; Mkpughe 2:1-3) N’ebe jọrọ njọ otú ahụ, ezi ofufe gbanyere mkpọrọgwụ. Ofufe a nke ezi Chineke ahụ ga-enwekwa mmeri mgbe okpukpe ụgha nke oge anyị pụrụ n’anya, dị nnọọ ka ofufe nke Atemis oge ochie.—Mkpughe 18:4-8.

[Map/Foto dị na peeji nke 26]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

MASEDONIA

Oké Osimiri Ojii

ASIA MINOR

Efesọs

Oké Osimiri Mediterenian

IJIPT

[Foto dị na peeji nke 27]

Mkpọmkpọ ebe nke ụlọ nsọ Atemis

[Foto ndị dị na peeji nke 28, 29]

1. Ọ́bá Akwụkwọ Celsus

2. Foto a nọ nso see Arete

3. Okporo Ụzọ Mabụl, nke na-eduga ná nnukwu ebe ihe nkiri