Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Mmụọ Ozi Otú Ha Si Emetụta Ndụ Anyị

Ndị Mmụọ Ozi Otú Ha Si Emetụta Ndụ Anyị

Ndị Mmụọ Ozi Otú Ha Si Emetụta Ndụ Anyị

MGBE Daniel onye amụma na-akọwa ọhụụ ọ hụrụ banyere ezinụlọ ndị mmụọ ozi Chineke, o dere, sị: “[Otu puku ụzọ otu puku ndị mmụọ ozi] na-ejere [Chineke] ozi, [puku iri ụzọ puku iri], na-eguzokwa ọtọ n’ihu Ya.” (Daniel 7:10) Amaokwu a na-egosi nzube Chineke ji kee ndị mmụọ ozi. Ọ bụ ka ha wee na-ejere ya ozi ma dịrị njikere ime ihe ndị ọ gwara ha mee.

Chineke na-eji ndị mmụọ ozi arụ ọrụ ụfọdụ metụtara ụmụ mmadụ. Anyị ga-atụle otú o si eji ha agba ndị ya ume ma na-echebe ha, otú o si eji ha ezi ndị mmadụ ozi, na otú o si eji ha emezu ikpe ya n’ahụ́ ndị ajọ omume.

Ndị Mmụọ Ozi Na-agba Ndị Chineke Ume Ma Na-echebe Ha

Kemgbe ndị mmụọ ozi hụrụ okike nke ụwa na mmadụ abụọ mbụ bụ́ mmadụ, ha egosiwo mmasị dị ukwuu n’ebe ihe a kpọrọ mmadụ nọ. Mgbe Jizọs Kraịst na-ekwu okwu dị ka amamihe a kọwara dị ka mmadụ, o kwuru tupu ya aghọọ mmadụ, sị: “Ihe na-atọ m ụtọ dịkwa n’ebe ụmụ mmadụ nọ.” (Ilu 8:31) Bible na-agwakwa anyị na “ndị mmụọ ozi na-achọ inyonye anya” n’eziokwu ndị e kpugheere ndị amụma Chineke banyere Kraịst nakwa ọdịnihu.—1 Pita 1:11, 12.

Ka oge na-aga, ndị mmụọ ozi chọpụtara na ihe ka ọtụtụ n’ihe a kpọrọ mmadụ anaghị efe Onye okike ha na-ahụ n’anya ofufe. Lee nnọọ otú nke ahụ na-aghaghị isiwo wute ndị mmụọ ozi a na-ekwesị ntụkwasị obi! N’aka nke ọzọ, mgbe ọ bụla onye mmehie chegharịrị ma laghachikwute Jehova, “ọṅụ na-adị n’etiti ndị mmụọ ozi.” (Luk 15:10) Ndị mmụọ ozi na-enwe nchegbu dị ukwuu banyere ọdịmma nke ndị na-ejere Chineke ozi, ọtụtụ mgbe, Jehova ejiwokwa ha gbaa ndị ohu ya na-ekwesi ntụkwasị obi nọ n’ụwa ume ma chebe ha. (Ndị Hibru 1:14) Tụlee ihe atụ ụfọdụ.

Ndị mmụọ ozi abụọ nyeere onye ezi omume bụ́ Lọt na ụmụ ya nwanyị abụọ aka ịlanahụ mbibi nke ajọ obodo abụọ bụ́ Sọdọm na Gọmọra site n’ịkpọpụ ha ebe ahụ. * (Jenesis 19:1, 15-26) Ọtụtụ narị afọ ka nke ahụ gasịrị, a tụbara Daniel onye amụma n’olulu ọdụm, ma ọ dịghị ihe mere ya. N’ihi gịnị? O kwuru, sị: “Chineke m ezitewo mmụọ ozi Ya, wee kpuchite ọnụ ọdụm ndị a.” (Daniel 6:22) Ndị mmụọ ozi nyeere Jizọs aka mgbe ọ malitere ozi ya n’ụwa. (Mak 1:13) Obere oge tupu Jizọs anwụọ, mmụọ ozi pụtakwara n’ihu ya ma mee ka “ọ dị ike.” (Luk 22:43) Lee nnọọ otú aka ahụ ndị mmụọ ozi nyeere Jizọs na-aghaghị isiwo gbaa ya ume n’oge ndị ahụ dị oké mkpa ná ndụ ya! Mmụọ ozi tọhapụkwara Pita onyeozi n’ụlọ mkpọrọ.—Ọrụ 12:6-11.

Ndị mmụọ ozi, hà na-echebe anyị taa? Ọ bụrụ na anyị efee Jehova dị ka Okwu ya si kwuo, a na-emesi anyị obi ike na ndị mmụọ ozi ya dị ike a na-adịghị ahụ anya, ga na-echebe anyị. Bible na-ekwe nkwa, sị: “Mmụọ ozi nke Jehova na-ama ụlọikwuu ya gburugburu ndị na-atụ egwu Ya, o wee dọpụta ha.”—Abụ Ọma 34:7.

Otú ọ dị, anyị aghaghị ịghọta na ọ bụ Chineke kpọmkwem ka ndị mmụọ ozi na-ejere ozi, ọ bụghị ụmụ mmadụ. (Abụ Ọma 103:20, 21) Ha na-eme ihe Chineke gwara ha mee, ọ bụghị ihe ụmụ mmadụ gwara ha ma ọ bụ rịọ ha ka ha mee. N’ihi ya, onye anyị ga-akpọku maka enyemaka bụ Jehova Chineke, ọ bụghị ndị mmụọ ozi. (Matiu 26:53) Otú ọ dị, ebe ọ bụ na anyị adịghị ahụ ndị mmụọ ozi anya, anyị agaghị ekwuli ókè Chineke na-ejiru ha enyere ndị mmadụ aka n’ọnọdụ dị iche iche. Ma, anyị maara na Jehova ‘na-egosi Onwe ya onye dị ike n’akụkụ ndị obi ha zuru okè n’ebe Ọ nọ.’ (2 Ihe E Mere 16:9; Abụ Ọma 91:11) E mesikwara anyị obi ike na “n’agbanyeghị ihe ọ bụ nke anyị na-arịọ dị ka uche ya si dị, ọ [Chineke] na-anụ olu anyị.”—1 Jọn 5:14.

Akwụkwọ Nsọ na-agwakwa anyị na ọ bụ nanị Chineke ka anyị kwesịrị ikpegara ekpere ma fee ofufe. (Ọpụpụ 20:3-5; Abụ Ọma 5:1, 2; Matiu 6:9) Ndị mmụọ ozi kwesịrị ntụkwasị obi na-agba anyị ume ime otú ahụ. Dị ka ihe atụ, mgbe Jọn onyeozi chọrọ ịkpọ isiala nye otu mmụọ ozi, mmụọ ozi ahụ baara ya mba, sị: “Kpachara anya! Emela ya! . . . Kpọọ isiala nye Chineke.”—Mkpughe 19:10.

Ndị Mmụọ Ozi Na-ezi Ndị Mmadụ Ozi Sitere n’Aka Chineke

Okwu ahụ bụ́ “mmụọ ozi” pụtara “onye ozi,” nke ahụ bụkwa ụzọ ọzọ ndị mmụọ ozi si ejere Chineke ozi— dị ka ndị ọ na-ezi ozi ka ha gaa zie ndị mmadụ. Dị ka ihe atụ, “e sitere n’ebe Chineke nọ ziga mmụọ ozi Gebriel n’obodo Galili nke a na-akpọ Nazaret.” N’ihi gịnị? Ka ọ gaa zie otu nwa agbọghọ aha ya bụ Meri na ọ bụ ezie na ọ maghị nwoke, ọ ga-atụrụ ime ma mụọ nwa nwoke a ga-akpọ Jizọs. (Luk 1:26-31) E zigakwara otu mmụọ ozi ka ọ gaa zie ndị ọzụzụ atụrụ nọ n’ọhịa na a mụọla “Kraịst Onyenwe anyị.” (Luk 2:8-11) N’otu aka ahụ, ndị mmụọ ozi ziri Ebreham, Mozis, Jizọs, na ndị ọzọ e kwuru banyere ha na Bible ozi sitere n’aka Chineke.—Jenesis 18:1-5, 10; Ọpụpụ 3:1, 2; Luk 22:39-43.

Olee otú ndị mmụọ ozi si arụ ọrụ dị ka ndị ozi Chineke taa? Tụlee ọrụ ahụ Jizọs buru n’amụma na ndị na-eso ụzọ ya ga-arụ tupu ọgwụgwụ nke usoro ihe a. O kwuru, sị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.” (Matiu 24:3, 14) Kwa afọ, Ndịàmà Jehova na-eji ihe karịrị otu ijeri awa ezi ozi ọma Alaeze Chineke. Ma, ị̀ maara na ndị mmụọ ozi so na-arụ ọrụ a? Jọn onyeozi kwuru banyere otu ọhụụ ọ hụrụ, sị: “M wee hụ mmụọ ozi ọzọ . . . , o nwekwara ozi ọma ebighị ebi ịkpọsa dị ka ozi obi ụtọ nye ndị bi n’elu ụwa, nyekwa mba na ebo na asụsụ na ndị ọ bụla.” (Mkpughe 14:6, 7) Akụkụ Akwụkwọ Nsọ a na-eme ka ọrụ kasị mkpa ndị mmụọ ozi na-arụrụ ụmụ mmadụ taa pụta ìhè.

Ndịàmà Jehova na-ahụ ihe àmà na-egosi na ndị mmụọ ozi na-eduzi ha ka ha na-aga site n’ụlọ ruo n’ụlọ n’ọrụ nkwusa ha. Ha na-ezutekarị ndị ka kpepụrụ ekpere ka mmadụ bịa nyere ha aka ịghọta nzube Chineke. N’ihi nduzi nke ndị mmụọ ozi nakwa ọrụ Ndịàmà n’onwe ha na-arụ, ọtụtụ narị puku mmadụ na-aghọ ndị ohu Jehova kwa afọ. Ọchịchọ anyị bụ ka i soro rite uru n’ọrụ a na-azọpụta ndụ nke ndị mmụọ ozi na-eduzi.

Ndị Mmụọ Ozi Na-emezu Ikpe Chineke

Ọ bụ ezie na e nyeghị ndị mmụọ ozi ike ikpe ụmụ mmadụ ikpe, ha adịghị ele nanị anya anya. (Jọn 5:22; Ndị Hibru 12:22, 23) Ha mezuru ikpe Chineke n’oge ndị gara aga. Dị ka ihe atụ, Chineke ji ndị mmụọ ozi lụso ndị Ijipt oge ochie, bụ́ ndị jichiri ndị Izrel, ọgụ. (Abụ Ọma 78:49) Ọ bụkwa n’otu abalị ka “mmụọ ozi nke Jehova” tigburu otu narị puku na iri puku ndị agha asatọ na ise n’ọmụma ụlọikwuu ndị iro nke ndị Chineke.—2 Ndị Eze 19:35.

Chineke ga-ejikwa ndị mmụọ ozi mezuo ikpe ya n’ọdịnihu. Jizọs ga-abịa “ya na ndị mmụọ ozi ya dị ike, n’ọkụ na-enwu enwu, ka ọ na-eweta ịbọ ọbọ n’isi ndị na-amaghị Chineke na ndị na-adịghị erube isi n’ozi ọma.” (2 Ndị Tesalonaịka 1:7, 8) Ma, ọ bụ nanị ndị na-aṅaghị ntị n’ozi ọma a na-ezisa ugbu a n’ụwa nile site n’enyemaka nke ndị mmụọ ozi, ka a ga-ebibi. Ọ dịghị ihe ga-eme ndị na-achọ Chineke ma na-erube isi n’ihe Akwụkwọ Nsọ na-akụzi.—Zefanaịa 2:3.

Lee nnọọ obi ụtọ anyị pụrụ inwe maka ndị mmụọ ozi a kwesịrị ntụkwasị obi, bụ́ ndị na-eme ihe ọ bụla Chineke gwara ha mee! Jehova na-eji ha enyere ndị ohu ya nọ n’ụwa bụ́ ndị na-ekwesị ntụkwasị obi aka ma na-echebe ha. Nke a na-akasi anyị nnọọ obi n’ihi na e nwere ajọ ndị mmụọ e kere eke a na-akpọ ndị mmụọ ọjọọ, bụ́ ndị na-achọ imerụ anyị ahụ́.

Ndị Mmụọ Ọjọọ —Ole Ndị Ka Ha Bụ?

Na narị afọ 15 sochiri nduhie Setan duhiere Iv n’ogige Iden, ndị mmụọ ozi Chineke hụrụ na Setan bụ́ Ekwensu eduhiela mmadụ nile nọ n’ụwa pụọ n’ebe Chineke nọ, ma e wezụga mmadụ ole na ole kwesịrị ntụkwasị obi dị ka Ebel, Ịnọk, na Noa. (Jenesis 3:1-7; Ndị Hibru 11:4, 5, 7) Ụfọdụ ndị mmụọ ozi dụnyekwaara Setan úkwù. Bible kpọrọ ha ndị mmụọ nupụrụ isi “n’ụbọchị Noa.” (1 Pita 3:19, 20) Olee otú ha si gosipụta nnupụisi ha?

N’oge Noa, ọnụ ọgụgụ a na-akpọghị aha nke ndị mmụọ ozi nupụrụ isi hapụrụ ebe obibi ha n’ezinụlọ Chineke dị n’eluigwe, gbadata n’ụwa ma nwoghara ahụ́ mmadụ. N’ihi gịnị? Ha zụlitere agụụ iso ụmụ nwanyị nwee mmekọahụ. Nke a mere ka ha mụta ụmụ ndị a kpọrọ ndị Nefilim, bụ́ ndị ghọrọ ndị dike na-eme ihe ike. Ọzọkwa, “ihe ọjọọ nke mmadụ hiri nne n’ụwa, Ọ hụkwa na nchepụta nile ọ bụla nke echiche obi ya bụ nanị ihe ọjọọ ogologo ụbọchị nile.” Otú ọ dị, Jehova Chineke ekweghị ka mmebi a a na-emebi ụmụ mmadụ gaa n’ihu. O wetara Iju Mmiri zuru ụwa ọnụ, bụ́ nke kpochapụrụ ndị ajọ mmadụ nile na ndị Nefilim ahụ. Nanị ụmụ mmadụ e chebere bụ ndị ohu Chineke kwesịrị ntụkwasị obi.—Jenesis 6:1-7, 17; 7:23.

Iju Mmiri ahụ egbughị ndị mmụọ ozi ahụ nupụrụ isi. Ha nwoghapụrụ ahụ́ mmadụ ha ma laghachi n’eluigwe dị ka ndị mmụọ. Malite mgbe ahụ gawa, a kpọwaziri ha ndị mmụọ ọjọọ. Ha sonyeere Setan bụ́ Ekwensu, bụ́ onye a na-akpọ “onye na-achị ndị mmụọ ọjọọ.” (Matiu 12:24-27) Ndị mmụọ ọjọọ na-achọ ka ụmụ mmadụ na-efe ha ofufe dị nnọọ ka nna ha ukwu bụ́ Ekwensu na-achọ.

Ndị mmụọ ọjọọ dị ize ndụ, ma anyị ekwesịghị ịtụ ha ụjọ. A kpaara ike ha ókè. Mgbe ndị mmụọ ozi ahụ nupụrụ isi laghachiri n’eluigwe, a nabataghachighị ha n’ezinụlọ ndị mmụọ ozi kwesịrị ntụkwasị obi nke Chineke. Kama nke ahụ, Chineke kwụsịrị inye ha ìhè ime mmụọ ya, ha enweghịzi olileanya maka ọdịnihu. N’ezie, e debere ha n’ọchịchịrị ime mmụọ bụ́ nke a maara dị ka Tatarọs. (2 Pita 2:4) Jehova debere ha ‘n’agbụ ebighị ebi,’ nke mere ka ha nọrọ n’ọchịchịrị ime mmụọ. Ọzọkwa, ha enweghịzi ike inwoghara ahụ́ mmadụ.—Jud 6.

Gịnị Ka I Kwesịrị Ime?

Ndị mmụọ ọjọọ hà ka nwere ike n’ahụ́ ụmụ mmadụ? Ee, ha na-egosipụta ike ha site n’iji “nzupụta ọjọọ dị iche iche,” eme ihe, ụdị ndị ahụ onye na-achị ha bụ́ Setan bụ́ Ekwensu na-eji eme ihe. (Ndị Efesọs 6:11, 12) Ma, site n’ịgbaso ndụmọdụ nke Okwu Chineke, anyị pụrụ iguzosi ike megide ndị mmụọ ọjọọ. Ọzọkwa, ndị mmụọ ozi dị ike na-echebe ndị hụrụ Chineke n’anya.

Lee ka o si dị mkpa ịmụta ihe Chineke chọrọ gị n’aka bụ́ ndị e dere n’Akwụkwọ Nsọ ma mee ha! Ị pụrụ ịmụtakwu ihe Bible na-ezi site n’ịkpọtụrụ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị ma ọ bụ idetara ndị na-ebipụta magazin a akwụkwọ. Ndịàmà Jehova ga-enwe obi ụtọ iduziri gị ọmụmụ Bible n’efu nakwa n’oge ga-adị gị mma.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 7 Na Bible, a na-akọwa ndị mmụọ ozi dị ka ndị ikom tozuru etozu. Oge nile ndị mmadụ hụrụ ha, ha pụtara dị ka ndị ikom.

[Igbe dị na peeji nke 6]

NDI MMỤỌ OZI—OTÚ E SI HAZIE HA

Jehova haziri ezinụlọ buru ibu nke ndị mmụọ ozi ya n’ụzọ na-esonụ:

Mmụọ ozi kasị nwee ikike ma nọrọ n’ọkwá kasị elu bụ Maịkel onyeisi ndị mmụọ ozi, ma ọ bụ Jizọs Kraịst. (1 Ndị Tesalonaịka 4:16; Jud 9) Ndị seraf, ndị cherub, na ndị mmụọ ozi ndị ọzọ nọ n’okpuru ya.

Ndị seraf nọ n’ọkwá dị nnọọ elu ná ndokwa Chineke. Ha na-ejere Chineke ozi n’ocheeze ya. Ọrụ ha gụnyere ikwupụta ịdị nsọ Chineke na ime ka ndị ya nọgide na-adị ọcha n’ụzọ ime mmụọ.—Aịsaịa 6:1-3, 6, 7.

Ndị cherub na-anọ nso n’ocheeze Chineke ma na-akwado ịdị ebube ya.—Abụ Ọma 80:1; 99:1; Ezikiel 10:1, 2.

Ndị mmụọ ozi ndị ọzọ na-anọchi anya Jehova, ha na-emekwa uche ya.

[Foto dị na peeji nke 4]

Ndị mmụọ ozi kpọpụrụ Lọt na ụmụ ya nwanyị ka a ghara ibibi ha

[Foto dị na peeji nke 5]

Mgbe Jọn onyeozi chọrọ ịkpọ isiala nye mmụọ ozi, mmụọ ozi ahụ gwara ya, sị: “Emela ya!”

[Foto dị na peeji nke 6]

Ndị mmụọ ozi na-emezu ikpe Chineke

[Foto dị na peeji nke 7]

Ị̀ na-erite uru n’ọrụ nkwasa nke ndị mmụọ ozi na-eduzi?