Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

‘Jaa Ghọọrọ M Nzọpụta’

‘Jaa Ghọọrọ M Nzọpụta’

“Anyị Aghaghị Irubere Chineke Isi Dị Ka Onye Na-achị Achị Karịa Mmadụ”

‘Jaa Ghọọrọ M Nzọpụta’

NDỊ Jehova nwere nhọrọ chere ha ihu ime. Hà ga-erubere eze ọjọọ nke Ijipt oge ochie isi? Ka hà ga-erubere Jehova Chineke isi, hapụ mba ahụ ha na-agbara ohu ma gaa biri n’Ala Nkwa ahụ?

N’ihi na Fero Ijipt jụwara isi ịhapụ ndị Jehova ka ha laa, Chineke tiri mba ahụ Ihe Otiti Iri. Lee ka nke a si gosipụta ike ya! Chi dị iche iche nke ndị Ijipt emelighị ihe ọ bụla iji gbochie ihe otiti ndị ahụ.

Mgbe a gwara Fero ka ọ hapụ ndị Chineke ka ha laa, ọ jụrụ n’ụzọ mkparị, sị: “Ònye bụ Jehova, na m ga-ege ntị n’olu Ya izipụ Izrel? amaghị m Jehova, ọzọkwa, m gaghị ezipụ Izrel.” (Ọpụpụ 5:2) N’ihi ya, e tiri ndị Ijipt ihe otiti ndị a: (1) mmiri ha ịghọ ọbara, (2) awọ, (3) anwụ nta, (4) odudu, (5) ajọ ọrịa nke na-efe efe n’ahụ́ anụmanụ, (6) ihe ofifi na-agbapu agbapu, ma ọ bụ etuto, n’ahụ́ mmadụ na n’ahụ́ anụmanụ, (7) akụ́ mmiri ígwé, (8) igurube, (9) ọchịchịrị, na (10) ọnwụ nke ụmụ nile e buru ụzọ mụọ n’Ijipt, nke gụnyere ọkpara Fero. N’ikpeazụ, Fero hapụrụ ndị Hibru ka ha laa. O nyedịrị ha iwu ka ha laa!—Ọpụpụ 12:31, 32.

Ihe dị ka nde mmadụ atọ—ndị ikom, ndị inyom, na ụmụntakịrị bụ́ ndị Izrel na ọtụtụ ndị gwara ọgwa—lawara ozugbo. (Ọpụpụ 12:37, 38) Ma, n’oge na-adịghị anya, Fero na ndị agha ya dị ike chụwara ha. Ndị Izrel yiri ka hà tọrọ atọ n’agbata Oké Osimiri Uhie, ajọ ọzara, na ndị agha Fero. N’agbanyeghị nke ahụ, Mozis gwara ndị Izrel, sị: “Unu atụla egwu, guzonụ onwe unu n’ebe a, hụ nzọpụta Jehova.”—Ọpụpụ 14:8-14.

Jehova kewara Oké Osimiri Uhie ahụ n’ụzọ ọrụ ebube ka ndị Izrel nwee ike ịgbalaga. Ma, mgbe ndị Ijipt chụụrụ ha banye, Chineke mere ka mmiri ahụ lọghachi. “[Jehova tụfuru] ụgbọala Fero nile na usuu ndị agha ya . . . n’oké osimiri.” (Ọpụpụ 14:26-28; 15:4) Ọjụjụ Fero dị mpako jụrụ ịsọpụrụ Jehova dugara ya n’ịnwụ ọnwụ ike.

Jehova nọ n’Oké Osimiri Uhie gosi na ya bụ “onye agha.” (Ọpụpụ 15:3) Ihe ndekọ ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ kwuru, sị: “Izrel wee hụ aka ukwu nke Jehova ji megide ndị Ijipt, ndị Izrel wee tụọ egwu Jehova, kwere na Jehova.” (Ọpụpụ 14:31; Abụ Ọma 136:10-15) Iji kelee Chineke site n’ala ala obi ha, ndị ikom sooro Mozis bụọ abụ mmeri, ebe Miriam bụ́ nwanne Mozis duuru ndị inyom tee egwú. *

Jehova Ka Bụ Onye Nnapụta

Ndị ohu Jehova nke oge a pụrụ isi ná nnapụta ahụ dị ịrịba ama Chineke napụtara ndị ya mụta ihe ndị pụrụ iwusi okwukwe ha ike. Otu n’ime ihe ndị ha pụrụ ịmụta bụ na Jehova nwere ike a na-akparaghị ókè, ọ pụkwara ịkwado ndị ya n’ụzọ zuru ezu. N’abụ mmeri Mozis na ndị Izrel bụrụ, ha ji obi ụtọ bụọ, sị: “Jehova, aka nri Gị, nke dị ebube n’ike, Jehova, aka nri Gị na-etipịa onye iro.”—Ọpụpụ 15:6.

Ihe ọzọ ha pụrụ ịmụta bụ na Onye Pụrụ Ime Ihe Nile nwere ọchịchọ siri ike ichebe ndị ya. Ndị Izrel bụrụ abụ, sị: “Ike m na abụ ọma m ka Jaa bụ, O wee ghọọrọ m nzọpụta; Onye a bụ Chineke m, m ga-emekwa Ya ka Ọ dị elu.” Ihe ọzọkwa ha ka pụrụ ịmụta na ya bụ na ọ dịghị onye ga-egbochili Jehova Chineke imezu uche ya. N’abụ mmeri ahụ ndị ohu Chineke a na-apụtara anapụta bụrụ, ha kwuru, sị: “Ònye dị ka gị n’etiti chi nile, Jehova? Ònye dị ka Gị, dị ebube n’ịdị nsọ? Onye a na-atụ egwu n’otuto nile, na-eme ihe ebube dị iche iche.”—Ọpụpụ 15:2, 11.

Ndị ọchịchị ụwa nke oge a na-akpagbu ndị Jehova, dịkwa ka Fero Ijipt oge ochie mere. Ndị ndú dị mpako pụrụ ‘ikwu okwu dị iche iche megide Onye ahụ nke kachasị ihe nile elu, ọ bụkwa ndị nsọ nke Onye ahụ nke kachasị ihe nile elu ka ha [“ga-anọgide na-enye nsogbu,” NW].’ (Daniel 7:25; 11:36) Ma, Jehova na-emesi ndị ya obi ike, sị: “Ọ dịghị ihe agha ọ bụla a kpụworo imegide [unu] ga-aga nke ọma: ọzọ, ire ọ bụla nke ga-ebili imegide [unu] n’ikpe ka [unu] ga-ama ikpe. Nke a bụ ihe nketa nke ndị ohu Jehova.”—Aịsaịa 54:17.

Ndị nile na-emegide Chineke ga-akụ afọ n’ala, otú ahụ Fero na ndị agha ya kụrụ. Nnapụta Jehova napụtara ndị ya, dị ka otú o si napụta ụmụ Izrel site n’Ijipt, gosiri na o ziri ezi ịgbaso ụkpụrụ ahụ ndịozi Jizọs kwupụtara, nke bụ́: “Anyị aghaghị irubere Chineke isi dị ka onye na-achị achị karịa mmadụ.”—Ọrụ 5:29.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 8 Lee 2006 Calendar of Jehovah’s Witnesses, January/February.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 9]

Ị̀ MAARA?

• Jehova mere ka oké ifufe fee n’otu abalị dum ka ụmụ Izrel wee gafee Oké Osimiri Uhie ahụ n’ala akọrọ.—Ọpụpụ 14:21, 22.

• Ọtụtụ nde ndị Izrel ịgafe Oké Osimiri Uhie ahụ n’obere oge dị otú ahụ gaara achọ ụzọ dị otu kilomita na ọkara ma ọ bụ karịa n’obosara.

[Foto ndị dị na peeji nke 9]

Chi ụgha dị iche iche nke Ijipt akwụsịlighị Ihe Otiti Iri ahụ Jehova tiri ndị Ijipt

[Ebe E Si Nweta Foto]

Ihe atọ ahụ a kpụrụ akpụ: Foto e sere n’ihi ikike a natara Ebe Ndebe Ihe Ochie Britain