Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Enyela Ekwensu Ohere

Enyela Ekwensu Ohere

Enyela Ekwensu Ohere

“Unu enyekwala Ekwensu ohere.”—NDỊ EFESỌS 4:27.

1. N’ihi gịnị ka ụfọdụ jirila chewe ma Ekwensu ọ̀ dị adị?

RUO ọtụtụ narị afọ, ọtụtụ mmadụ lere Ekwensu anya dị ka onye nwere mpi nke ụkwụ ya wara njakpa, bụ́ onye yi uwe uhie ma jiri fọk na-adụba ndị mmehie n’ọkụ ala mmụọ. Bible ekwughị ihe ndị dị otú ahụ. Otú ọ dị, o doro anya na echiche na-ezighị ezi ndị dị otú ahụ emeela ka ọtụtụ nde mmadụ chewe ma Ekwensu ọ̀ dị adị ma ọ bụ mee ka ha na-eche na ọ bụ nanị ihe ọjọọ dị n’obi mmadụ.

2. Olee ihe ụfọdụ Akwụkwọ Nsọ kwuru banyere Ekwensu?

2 Bible gwara anyị banyere onye jiri anya ya hụ Ekwensu na ihe àmà doro anya na-egosi na ọ dị adị. Jizọs Kraịst hụrụ ya n’ógbè ndị mmụọ n’eluigwe, ya na ya kwurịtakwara okwu n’ụwa. (Job 1:6; Matiu 4:4-11) Ọ bụ ezie na Akwụkwọ Nsọ agwaghị anyị ihe bụ aha mbụ nke mmụọ a e kere eke, ọ na-akpọ ya Ekwensu (nke pụtara “Onye Nkwutọ”) n’ihi na o kwutọrọ Chineke. A na-akpọkwa ya Setan (nke pụtara “Onye Nguzogide”), ebe ọ bụ na ọ na-eguzogide Jehova. A kpọrọ Setan bụ́ Ekwensu “agwọ mbụ ahụ,” ikekwe n’ihi na o ji agwọ duhie Iv. (Mkpughe 12:9; 1 Timoti 2:14) A makwaara ya dị ka “ajọ onye ahụ.”—Matiu 6:13. *

3. Olee ajụjụ anyị ga-atụle?

3 Dị ka ndị ohu Jehova, anyị achọghị iyi Setan, bụ́ onye iro ukwu nke nanị ezi Chineke ahụ, n’ụzọ ọ bụla. N’ihi ya, anyị aghaghị ịṅa ntị na ndụmọdụ a Pọl onyeozi nyere: “Unu enyekwala Ekwensu ohere.” (Ndị Efesọs 4:27) Ebe ọ dị otú ahụ, olee ụfọdụ àgwà Setan nwere ndị anyị na-agatụghị eṅomi?

Eṅomila Ajọ Onye Nkwutọ Ahụ

4. Olee otú “ajọ onye ahụ” si kwutọọ Chineke?

4 Aha ahụ bụ́ “ajọ onye ahụ” kwesịịrị Ekwensu, n’ihi na ọ bụ onye nkwutọ. Nkwutọ bụ okwu ụgha, nke e bu ihe ọjọọ n’obi kwuo, na nke e kwuru iji mebie aha mmadụ. Chineke nyere Adam iwu, sị: “Mkpụrụ nke sitere n’osisi ịma ezi ihe na ihe ọjọọ, gị erila mkpụrụ sitere na ya: n’ihi na n’ụbọchị ị ga-eri mkpụrụ sitere na ya ị ghaghị ịnwụ anwụ.” (Jenesis 2:17) A gwara Iv banyere nke a, ma Ekwensu si n’ọnụ agwọ gwa ya, sị: “Ọ dịghị ọnwụ unu na-aghaghị ịnwụ: n’ihi na Chineke maara na n’ụbọchị unu ga-eri mkpụrụ sitere na ya, mgbe ahụ ka a ga-emeghe anya unu, unu ewee dị ka Chineke, na-ama ezi ihe na ihe ọjọọ.” (Jenesis 3:4, 5) Nke ahụ bụ ajọ nkwutọ megide Jehova Chineke!

5. N’ihi gịnị ka o ji kwesị ekwesị ka Daịọtrefis zaa ajụjụ maka nkwutọ ya?

5 E nyere ụmụ Izrel iwu, sị: “Ejegharịla n’etiti ụmụnna gị dị ka onye na-agba àmà ọjọọ.” (Levitikọs 19:16) Jọn onyeozi kwuru banyere otu onye nkwutọ n’oge ya, sị: “Ọ dị ihe m degaara ọgbakọ, ma Daịọtrefis, onye na-achọ ịnọ n’ọkwá mbụ n’etiti ha, adịghị eji nkwanye ùgwù anabata ihe ọ bụla si anyị n’aka. Ọ bụ nke ahụ mere na, ọ bụrụ na mụ abịa, m ga-echeta ọrụ ya ndị ọ gara n’ihu na-arụ, jiri ajọ okwu na-ekwugheri ekwugheri banyere anyị.” (3 Jọn 9, 10) Daịọtrefis nọ na-ekwutọ Jọn ma kwesị ịza ajụjụ maka ya. Olee Onye Kraịst na-ekwesị ntụkwasị obi nke ga-achọ ịdị ka Daịọtrefis ma ṅomie Setan, bụ́ ajọ onye nkwutọ ahụ?

6, 7. N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị izere ikwutọ onye ọ bụla?

6 A na-ekwutọkarị ndị ohu Jehova ma na-ebo ha ebubo ụgha. “Ndị isi nchụàjà na ndị odeakwụkwọ nọgidere na-ebili ọtọ ma na-ebosi [Jizọs] ebubo ike.” (Luk 23:10) Ananaịas Nnukwu Onye Nchụàjà na ndị ọzọ boro Pọl ebubo ụgha. (Ọrụ 24:1-8) Bible kwukwara na Setan bụ onye “na-ebo ụmụnna anyị ebubo . . . , onye na-ebo ha ebubo ehihie na abalị n’ihu Chineke anyị.” (Mkpughe 12:10) Ụmụnna ahụ a na-ebo ebubo ụgha bụ Ndị Kraịst e tere mmanụ nọ n’ụwa n’ụbọchị ikpeazụ ndị a.

7 Ọ dịghị Onye Kraịst kwesịrị ikwutọ onye ọ bụla ma ọ bụ bo ya ebubo ụgha. Ma, nke ahụ pụrụ ime ma ọ bụrụ na anyị ebughị ụzọ matachaa ihe nile merenụ tupu anyị agbawa akaebe megide mmadụ. N’Iwu Mozis, ịma ụma gbaa àmà ụgha banyere mmadụ pụrụ ịkpatara onye ahụ boro mmadụ ebubo ọnwụ. (Ọpụpụ 20:16; Deuterọnọmi 19:15-19) Ọzọkwa, “onye àmà okwu ụgha nke na-ekupụ okwu ụgha dị iche iche dị ka ume” so n’ihe ndị bụ́ ihe arụ n’anya Jehova. (Ilu 6:16-19) N’ihi ya, anyị kwesịrị nnọọ izere iṅomi onyeisi ndị nkwutọ na ndị na-ebo ebubo ụgha.

Agbasola Ụzọ nke Ogbu Mmadụ Mbụ Ahụ

8. Olee otú Ekwensu si bụrụ “ogbu mmadụ mgbe ọ malitere”?

8 Ekwensu bụ ogbu mmadụ. Jizọs kwuru, sị: “Onye ahụ bụ ogbu mmadụ mgbe ọ malitere.” (Jọn 8:44) Setan abụwo ogbu mmadụ malite mgbe mbụ ahụ o duhiere Adam na Iv site n’ime ka ha gbakụta Chineke azụ. Ọ kpataara di na nwunye mbụ ahụ na ụmụ ha ọnwụ. (Ndị Rom 5:12) Ọ dị mma iburu n’uche na ọ bụ nanị onye dị adị pụrụ ime ihe dị otú ahụ, ọ bụghị ihe ọjọọ dị n’obi mmadụ.

9. Dị ka 1 Jọn 3:15 si gosi, olee otú anyị pụrụ isi ghọọ ndị ogbu mmadụ?

9 Otu n’ime Iwu Iri ahụ e nyere Izrel kwuru, sị: “Gị egbula mmadụ.” (Deuterọnọmi 5:17) Pita onyeozi degaara Ndị Kraịst akwụkwọ, sị: “Ka onye ọ bụla n’ime unu ghara ịta ahụhụ dị ka onye na-egbu ọchụ.” (1 Pita 4:15) N’ihi ya, ebe anyị bụ ndị ohu Jehova, anyị agaghị egbu mmadụ. Ma, ikpe ga-ama anyị n’ihu Chineke ma ọ bụrụ na anyị kpọrọ Onye Kraịst ibe anyị asị ruo n’ókè nke ịchọ ka ọ nwụọ. Jọn onyeozi dere, sị: “Onye ọ bụla nke kpọrọ nwanna ya asị bụ ogbu mmadụ, unu makwaara na ọ dịghị ogbu mmadụ nke ndụ ebighị ebi na-adịgide n’ime ya.” (1 Jọn 3:15) E nyere ndị Izrel iwu, sị: “Akpọla nwanne gị asị n’obi gị.” (Levitikọs 19:17) Ka anyị na-adị ngwa idozi nsogbu ọ bụla dị n’etiti anyị na onye kwere ekwe ibe anyị, ka ogbu mmadụ ahụ bụ́ Setan wee ghara ibibi ịdị n’otu anyị dị ka Ndị Kraịst.—Luk 17:3, 4.

Guzogidesie Onyeisi Ndị Ụgha ahụ Ike

10, 11. Gịnị ka anyị na-aghaghị ime iji guzogidesie onyeisi ndị ụgha, bụ́ Setan, ike?

10 Ekwensu bụ onye ụgha. Jizọs kwuru, sị: “Mgbe ọ na-ekwu okwu ụgha, ọ na-ekwu dị ka ọchịchọ obi ya si dị, n’ihi na ọ bụ onye ụgha, bụrụkwa nna nke ụgha.” (Jọn 8:44) Setan ghaara Iv ụgha, ma Jizọs bịara n’ụwa ịgbara eziokwu àmà. (Jọn 18:37) Iji guzogidesie Ekwensu ike dị ka ndị na-eso ụzọ Kraịst, anyị agaghị agha ụgha ma ọ bụ duhie mmadụ. Anyị aghaghị ‘ịdị na-ekwu eziokwu.’ (Zekaraịa 8:16; Ndị Efesọs 4:25) “Jehova, Chineke nke eziokwu” na-agọzi nanị Ndịàmà ya na-ekwu eziokwu. Ndị na-emebi iwu enweghị ike ịnọchi anya ya.—Abụ Ọma 31:5; 50:16; Aịsaịa 43:10.

11 Ọ bụrụ na obi dị anyị ụtọ na eziokwu Bible emeela ka anyị nwere onwe anyị pụọ n’ụgha Setan, anyị ga-anọgidesi ike n’Iso Ụzọ Kraịst, bụ́ “ụzọ nke eziokwu.” (2 Pita 2:2; Jọn 8:32) Ozizi nile nke Ndị Kraịst bụ “eziokwu nke ozi ọma ahụ.” (Ndị Galeshia 2:5, 14) Nzọpụta anyị dabeere nnọọ ‘n’ije ije n’eziokwu ahụ’—irubere ya isi na iguzogidesi “nna nke ụgha” ahụ ike.—3 Jọn 3, 4, 8.

Guzogide Onye Mbụ ahụ Si n’Ezi Ofufe Dapụ

12, 13. Olee otú anyị kwesịrị isi na-emeso ndị si n’ezi ofufe dapụ ihe?

12 Mmụọ ahụ nke ghọrọ Ekwensu dị mgbe ọ nọ n’eziokwu. Ma Jizọs kwuru na ‘o guzosighị ike n’eziokwu, n’ihi na eziokwu adịghị n’ime ya.’ (Jọn 8:44) Onye mbụ a si n’ezi ofufe dapụ anọgidewo na-eguzogide “Chineke nke eziokwu.” Ụfọdụ Ndị Kraịst narị afọ mbụ dabara “n’ọnyà nke Ekwensu,” ma eleghị anya kwe ka o duhie ha, ha ahapụkwa eziokwu ahụ. N’ihi ya, Pọl gbara onye ọrụ ibe ya bụ́ Timoti ume ka o jiri ịdị nwayọọ na-ezi ha ihe ka ha wee nwee ike inwetaghachi onwe ha n’ụzọ ime mmụọ ma pụọ n’ọnyà Setan. (2 Timoti 2:23-26) Otú ọ dị, ọ ka nnọọ mma ijigidesi eziokwu ahụ ike ma gharadị ịbụ ndị echiche ndị si n’ezi ofufe dapụ matara n’ọnyà amata.

13 N’ihi na di na nwunye mbụ ahụ ṅara Ekwensu ntị ma kwere ụgha ya, ha si n’ezi ofufe dapụ. N’ihi ya, ànyị kwesịrị ịṅa ndị si n’ezi ofufe dapụ ntị, gụọ akwụkwọ ha, ma ọ bụ nyochaa ebe ha na-edebe ihe ọmụma n’Intanet? Ọ bụrụ na anyị hụrụ Chineke na eziokwu n’anya, anyị agaghị eme otú ahụ. Anyị ekwesịghị ikwe ka ndị si n’ezi ofufe dapụ bata n’ụlọ anyị ma ọ bụdị kelee ha ekele, n’ihi na ime otú ahụ ga-eme ka anyị ‘keta òkè n’ajọ ọrụ ha.’ (2 Jọn 9-11) Ka anyị ghara ikwe mgbe ọ bụla ka Ekwensu ghọgbute anyị site n’ime ka anyị gbahapụ “ụzọ nke eziokwu” nke Ndị Kraịst iji gbasoo ndị ozizi ụgha bụ́ ndị na-achọ iwebata “echiche ndị na-ebibi ihe” ma na-achọ ‘iji okwu ndị e leziri anya chepụta ghọgbuo anyị.’—2 Pita 2:1-3, Byington.

14, 15. Olee ịdọ aka ná ntị Pọl nyere ndị okenye si Efesọs na onye ọrụ ibe ya bụ́ Timoti?

14 Pọl gwara ndị okenye ọgbakọ si Efesọs, sị: “Na-elezinụ onwe unu na ìgwè atụrụ ahụ dum anya, bụ́ nke mmụọ nsọ họpụtaworo unu ịbụ ndị nlekọta n’etiti ya, ka unu na-azụ ọgbakọ Chineke dị ka atụrụ, bụ́ nke o ji ọbara nke Ọkpara ya zụta. Amaara m na mgbe m pụsịrị, nkịta ọhịa ndị obi tara mmiri ga-abata n’etiti unu, ha agaghịkwa emeso ìgwè atụrụ ahụ ihe n’ụzọ dị nro, ndị ikom ga-esitekwa n’etiti unu onwe unu bilie ma na-ekwu ihe ndị gbagọrọ agbagọ iji dọrọ ndị ahụ na-eso ụzọ iso ha n’azụ.” (Ọrụ 20:28-30) Ka oge na-aga, ndị dị otú ahụ si n’ezi ofufe dapụ ma “na-ekwu ihe ndị gbagọrọ agbagọ” biliri.

15 N’ihe dị ka afọ 65 O.A., onyeozi ahụ gbara Timoti ume ka ọ “na-ejizi okwu nke eziokwu ahụ ejizi.” Pọl dere, sị: “Ma zere okwu nzuzu bụ́ ndị na-emerụ ihe dị nsọ; n’ihi na ha ga-anọgide na-ajọwanye njọ n’asọpụrụghị Chineke, okwu ha ga-agbasakwa dị ka ure anụ ahụ́. Haịmeniọs na Faịlitọs so n’ime ha. Ndị a kpọmkwem ewezụgawo onwe ha n’eziokwu ahụ, na-asị na mbilite n’ọnwụ ewereworị ọnọdụ; ha na-ekpukwa okwukwe nke ụfọdụ ndị ihu.” Ndapụ n’ezi ofufe amalitela mgbe ahụ! Pọl kwukwara, sị: “N’agbanyeghị nke ahụ, ntọala siri ike nke Chineke nọgidere na-eguzosi ike.”—2 Timoti 2:15-19.

16. N’agbanyeghị aghụghọ nke onye mbụ ahụ si n’ezi ofufe dapụ, n’ihi gịnị ka anyị jiworo na-ekwesị ntụkwasị obi nye Chineke na Okwu ya?

16 Setan ejirila ndị si n’ezi ofufe dapụ mee ihe ugboro ugboro iji metọọ ezi ofufe—ma o nwebeghị ihe ịga nke ọma. N’ihe dị ka afọ 1868, Charles Taze Russell malitere iji nlezianya enyocha ozizi ndị gbanyerela mkpọrọgwụ na chọọchị dị iche iche nke Krisendọm ma chọpụta ebe ndị a kọwahiere Akwụkwọ Nsọ. Russell na mmadụ ole na ole ndị ọzọ na-achọ eziokwu ahụ hiwere klas ọmụmụ Bible na Pittsburgh, Pennsylvania, U.S.A. N’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu narị afọ na iri anọ garalanụ kemgbe ahụ, ihe ọmụma ndị ohu Jehova nwere banyere Chineke na Okwu ya amụbaala, otú ahụkwa ka ọ dị ịhụnanya ha nwere maka Chineke na Okwu ya. N’agbanyeghị aghụghọ nke onye mbụ ahụ si n’ezi ofufe dapụ, ịmụ anya ime mmụọ nke ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche enyeworo ezi Ndị Kraịst a aka ikwesị ntụkwasị obi nye Jehova na Okwu ya.—Matiu 24:45.

Ya Adịla Mgbe Ị Ga-ekwe Ka Onye ahụ Na-achị Ụwa Nwee Ike n’Ebe Ị Nọ

17-19. Gịnị bụ ụwa nke dị n’ike aka Ekwensu, n’ihi gịnịkwa ka anyị na-ekwesịghị iji hụ ya n’anya?

17 Ụzọ ọzọ Setan si achọ ịmata anyị n’ọnyà bụ ịkpali anyị ịhụ ụwa a—ọha mmadụ na-eme mmehie bụ́ ndị e kewapụrụ n’ebe Chineke nọ—n’anya. Jizọs kpọrọ Ekwensu “onye na-achị ụwa” ma sị: “O nweghịkwa ike n’ebe m nọ.” (Jọn 14:30) Ya adịla mgbe Setan ga-enwe ike n’ebe anyị nọ! Otú ọ dị, anyị maara na “ụwa dum dị n’ike aka nke ajọ onye ahụ.” (1 Jọn 5:19) Ọ bụ ya mere Ekwensu ji nwee ike ikwe nkwa inye Jizọs “alaeze nile nke ụwa” ma ọ bụrụ na o mee otu omume ịdapụ n’ezi ofufe nke bụ́ ịkpọ isiala nye ya—bụ́kwanụ ihe Ọkpara Chineke na-ekwetụghị ime. (Matiu 4:8-10) Ụwa nke Setan na-achị kpọrọ ụmụazụ Kraịst asị. (Jọn 15:18-21) Ka a sịkwa ihe mere Jọn onyeozi ji dọọ anyị aka ná ntị ịghara ịhụ ụwa n’anya!

18 Jọn dere, sị: “Ahụla ụwa ma ọ bụ ihe ndị dị n’ụwa n’anya. Ọ bụrụ na onye ọ bụla ahụ ụwa n’anya, ịhụnanya maka Nna ahụ adịghị n’ime ya; n’ihi na ihe ọ bụla dị n’ụwa—ọchịchọ nke anụ ahụ́ na ọchịchọ nke anya na oké ngosi nke ihe mmadụ ji ebi ndụ—adịghị esite ná Nna ahụ, kama ọ na-esite n’ụwa. Ọzọkwa, ụwa na-agabiga, otú ahụkwa ka ọ dị ọchịchọ ya, ma onye na-eme uche Chineke na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.” (1 Jọn 2:15-17) Anyị ekwesịtụghị ịhụ ụwa n’anya, n’ihi na ụzọ ndụ ọ na-akwalite kwekọrọ n’ọchịchọ anụ ahụ́ na-emehie emehie na nke megidere nnọọ ụkpụrụ Jehova Chineke.

19 Gịnị ma ọ bụrụ na anyị hụrụ ụwa a n’anya n’ime obi anyị? Ya bụrụ otú ahụ, ka anyị rịọ Chineke n’ekpere ka o nyere anyị aka iwepụ ịhụnanya dị otú ahụ na ọchịchọ anụ ahụ́ ndị ha na ya so n’obi anyị. (Ndị Galeshia 5:16-21) N’ezie anyị ga-agbalịsi ike ịnọgide “n’enweghị ntụpọ n’ebe ụwa dị” ma ọ bụrụ na anyị echeta na ọ bụ “ndị mmụọ ọjọọ [nọ] n’ebe ndị dị n’eluigwe” bụ ndị a na-adịghị ahụ anya “na-achị ụwa” nke ọha mmadụ na-eme ajọ omume.—Jems 1:27; Ndị Efesọs 6:11, 12; 2 Ndị Kọrint 4:4.

20. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na anyị “abụghị akụkụ nke ụwa”?

20 Jizọs kwuru banyere ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ha abụghị akụkụ nke ụwa, dị nnọọ ka m na-abụghị akụkụ nke ụwa.” (Jọn 17:16) Ndị Kraịst e tere mmanụ na ndị enyi ha raara onwe ha nye na-agbalịsi ike ịnọgide na-adị ọcha n’omume na n’ụzọ ime mmụọ, ghara ịbụ akụkụ nke ụwa a. (Jọn 15:19; 17:14; Jems 4:4) Ụwa ajọ omume a kpọrọ anyị asị n’ihi na anyị abụghị akụkụ ya, nakwa n’ihi na anyị bụ ‘ndị na-ekwusa ezi omume.’ (2 Pita 2:5) N’eziokwu, anyị bi n’ụwa nke gụnyere ndị na-akwa iko, ndị bụ́ di ma ọ bụ nwunye na-akwa iko, ndị na-apụnara mmadụ ihe, ndị na-ekpere arụsị, ndị ohi, ndị ụgha, na ndị aṅụrụma. (1 Ndị Kọrint 5:9-11; 6:9-11; Mkpughe 21:8) Ma anyị anaghị ekuru “mmụọ nke ụwa” dị ka ikuku, n’ihi na ọ bụghị mmụọ mmehie a na-achịkwa ihe anyị na-eme.—1 Ndị Kọrint 2:12.

Enyela Ekwensu Ohere

21, 22. Olee otú ị pụrụ isi tinye ndụmọdụ Pọl nyere ná Ndị Efesọs 4:26, 27 n’ọrụ?

21 Kama ịbụ ndị “mmụọ nke ụwa” na-akwali, mmụọ nsọ Chineke, nke na-amịpụta àgwà ndị dị ka ịhụnanya na njide onwe onye, na-eduzi anyị. (Ndị Galeshia 5:22, 23) Àgwà ndị a na-enyere anyị aka iguzogide mwakpo Ekwensu na-awakpo okwukwe anyị. Ekwensu na-achọ ka ‘iwe ọkụ duba anyị n’ime ihe ọjọọ,’ ma mmụọ nsọ Chineke na-enyere anyị aka ‘ịhapụ iwe iwe, hapụkwa ọnụma.’ (Abụ Ọma 37:8) Ọ bụ ezie na mgbe ụfọdụ anyị pụrụ inwe ezi ihe mere anyị ga-eji wee iwe, ma Pọl dụrụ anyị ọdụ, sị: “Weenụ iwe, ma unu emehiekwala; ka anyanwụ ghara ịda n’ebe unu nọ n’ọnọdụ mkpasu iwe, unu enyekwala Ekwensu ohere.”—Ndị Efesọs 4:26, 27.

22 Iwe anyị pụrụ iduga anyị n’ime mmehie ma ọ bụrụ na anyị anọgide na-ewe iwe. Anyị iwe iwe otú ahụ ga-enye Ekwensu ohere ime ka e nwee esemokwu n’ọgbakọ ma ọ bụ kpalie anyị ime ihe na-ezighị ezi. N’ihi ya, anyị kwesịrị idozi esemokwu dị n’etiti anyị na ndị ọzọ ngwa ngwa n’ụzọ Chineke kwadoro. (Levitikọs 19:17, 18; Matiu 5:23, 24; 18:15, 16) Ya mere, ka anyị kwe ka mmụọ nsọ Chineke na-eduzi anyị, na-ejide onwe anyị ma ghara ikwe mgbe ọ bụla ka ọbụna iwe nwere ezi ihe kpatara ya mee ka anyị nwee obi ilu, echiche ọjọọ ma ọ bụ mkpọrọmasị n’ebe onye ọzọ nọ.

23. Olee ajụjụ ndị anyị ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

23 Anyị atụlewo àgwà ụfọdụ Ekwensu nwere ndị anyị na-ekwesịghị iṅomi. Ma ụfọdụ ndị na-agụ akwụkwọ a pụrụ ịdị na-ajụ, sị: Ànyị kwesịrị ịtụ Setan egwu? Gịnị mere o ji akpatara Ndị Kraịst mkpagbu? Oleekwa otú anyị pụrụ isi zere ịbụ ndị Ekwensu ghọgburu?

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 2 Lee usoro isiokwu bụ́ “Ekwensu Ọ̀ Dị Adị?” ndị dị n’Ụlọ Nche November 15, 2005.

Gịnị Ka Ị Ga-aza?

• N’ihi gịnị ka anyị na-ekwesịghị iji kwutọọ onye ọ bụla?

• N’ikwekọ n’ihe e dere na 1 Jọn 3:15, olee otú anyị pụrụ isi zere ịbụ ndị ogbu mmadụ?

• Olee otú anyị kwesịrị isi na-ele ndị si n’ezi ofufe dapụ anya, n’ihi gịnịkwa?

• N’ihi gịnị ka anyị na-ekwesịghị iji hụ ụwa n’anya?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 23]

Ọ dịghị mgbe anyị ga-ekwe ka Ekwensu mebie ịdị n’otu anyị dị ka Ndị Kraịst

[Foto ndị dị na peeji nke 24]

N’ihi gịnị ka Jọn ji gbaa anyị ume ịghara ịhụ ụwa n’anya?