Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Guzogide Setan, Ọ Ga-agbapụkwa!

Guzogide Setan, Ọ Ga-agbapụkwa!

Guzogide Setan, Ọ Ga-agbapụkwa!

“Doonụ onwe unu n’okpuru Chineke; ma na-eguzogidenụ Ekwensu, ọ ga-agbapụkwa n’ebe unu nọ.”—JEMS 4:7.

1, 2. (a) Olee àgwà Ekwensu nwere nke pụtara ìhè n’okwu e dekọrọ n’Aịsaịa isi 14? (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-atụle?

EKWENSU bụ nnọọ ezigbo onye mpako. E gosipụtara mpako ya n’okwu ndị onye amụma Chineke bụ́ Aịzaịa dekọrọ. Ihe karịrị otu narị afọ tupu Babilọn aghọọ ike ọchịchị na-achị ụwa, e kwuru banyere ndị Jehova dị ka ndị na-agwa “eze Babilọn” okwu ndị a: “Gị onwe gị wee sị n’obi gị, N’eluigwe ka m ga-arịgo, n’elu kpakpando nile nke Chineke [eze ndị si n’eriri Eze Devid] ka m ga-ebuli ocheeze m . . . m ga-eyi Onye kachasị ihe nile elu.” (Aịsaịa 14:3, 4, 12-15; Ọnụ Ọgụgụ 24:17) Mpako nke “eze Babilọn” yiri mmụọ nke Setan, bụ́ “chi nke usoro ihe a.” (2 Ndị Kọrint 4:4) Ma mpako Setan ga-akpatara ya ọdachi, otú ahụ usoro ndị ọchịchị Babilọn si nnọọ daa ọdịda ihere.

2 Ma ruo oge nile Ekwensu dị ndụ, anyị pụrụ ịnọgide na-ajụ ajụjụ ndị dị ka: Ànyị kwesịrị ịtụ Setan egwu? N’ihi gịnị ka o ji akpali ndị mmadụ ịkpagbu Ndị Kraịst? Olee otú anyị pụrụ isi zere ịbụ ndị Ekwensu ghọgburu?

Ànyị Kwesịrị Ịtụ Ekwensu Egwu?

3, 4. N’ihi gịnị ka Ndị Kraịst e tere mmanụ na ndị enyi ha na-ejighị atụ Ekwensu egwu?

3 Okwu ndị a Jizọs Kraịst kwuru na-agba nnọọ Ndị Kraịst e tere mmanụ ume: “Atụla egwu banyere ihe ndị ị na-aga ịta ahụhụ ha. Lee! Ekwensu ga-anọgide na-atụba ụfọdụ n’ime unu n’ụlọ mkpọrọ ka e wee lee unu ule n’ụzọ zuru ezu, ka unu wee nweekwa mkpagbu ruo ụbọchị iri. Gosipụta na ị na-ekwesị ntụkwasị obi ọbụna ruo ọnwụ, m ga-enyekwa gị okpueze bụ́ ndụ.” (Mkpughe 2:10) Ndị e tere mmanụ na ndị enyi ha bụ́ ndị nwere olileanya ibi n’ụwa anaghị atụ Ekwensu egwu. Ọ bụghị obi ike ha bu pụta ụwa mere ha ji ghara ịdị na-atụ ya egwu. Ọ bụ n’ihi na ha na-atụ Chineke egwu ma na-asọpụrụ ya, ‘na-agbabakwa na ndò nku ya.’—Abụ Ọma 34:9; 36:7.

4 Ndị soro ụzọ Jizọs Kraịst n’oge mbụ bụ́ ndị na-adịghị atụ egwu nọgidere na-ekwesị ntụkwasị obi ruo ọnwụ n’agbanyeghị ihe ndị ha tara ahụhụ ha. Ha atụghị egwu ihe Setan bụ́ Ekwensu nwere ike ime, n’ihi na ha maara na Jehova agaghị agbahapụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi nye Ya. N’otu aka ahụ, ka Ndị Kraịst e tere mmanụ na ndị enyi ha na-enweta mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ, ha kpebisiri ike ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi nye Chineke. Otú ọ dị, Pọl onyeozi gosiri na Ekwensu nwere ike ịkpata ọnwụ. Nke ahụ ò kwesịrị ime ka anyị tụwa ụjọ?

5. Gịnị ka anyị na-amụta ná Ndị Hibru 2:14, 15?

5 Pọl kwuru na Jizọs ‘ketara òkè n’ọbara na anụ ahụ́’ ka o wee “site n’ọnwụ ya mee ka ọ ghara ịdị bụ́ onye ahụ nke nwere ihe e ji akpata ọnwụ, ya bụ, Ekwensu; ka o wee tọhapụkwa ndị nile ji maka egwu ọnwụ bụrụ ndị e doro ịnọ n’ohu ná ndụ ha nile.” (Ndị Hibru 2:14, 15) Ebe Setan bụ “onye ahụ nke nwere ihe e ji akpata ọnwụ,” ọ chịkwara Judas Iskarịọt ma jiri ndị ndú ndị Juu na ndị Rom mee ihe iji kpọgbuo Jizọs. (Luk 22:3; Jọn 13:26, 27) Otú ọ dị, site n’ọnwụ ịchụàjà Jizọs, ọ tọhapụrụ ụmụ mmadụ na-eme mmehie n’aka Setan ma mee ka o kwe anyị omume inweta ndụ ebighị ebi.—Jọn 3:16.

6, 7. Olee otú ikike Setan nwere ịkpata ọnwụ hà?

6 Olee otú ikike Ekwensu nwere ịkpata ọnwụ hà? Kemgbe Setan malitere ime ajọ omume, ụgha na idu ndú ya akpatawo ọnwụ n’etiti ụmụ mmadụ. Nke a bụ n’ihi na Adam mehiere ma bufeere ezinụlọ mmadụ mmehie na ọnwụ. (Ndị Rom 5:12) Ọzọkwa, ndị na-ejere Setan ozi n’elu ala akpagbuwo ndị na-efe Jehova, mgbe ụfọdụ ruo ọnwụ, ọbụna dị ka ha mere Jizọs Kraịst.

7 N’agbanyeghị nke ahụ, anyị ekwesịghị iche na Ekwensu pụrụ igbu onye ọ bụla ọ chọrọ igbu. Chineke na-echebe ndị nke Ya, ọ dịghịkwa mgbe ọ ga-ekwe ka Setan kpochapụ ndị nile na-efe Ya ezi ofufe n’ụwa. (Ndị Rom 14:8) N’ezie, Jehova na-ekwe ka a kpagbuo ndị ya, ọ na-ekwekwa ka ụfọdụ nwụọ n’ihi mwakpo Ekwensu wakporo ha. N’agbanyeghị nke ahụ, Akwụkwọ Nsọ na-enye ndị aha ha dị ‘n’akwụkwọ ncheta’ Chineke olileanya magburu onwe ya nke mbilite n’ọnwụ—ọ dịghịkwa ihe Ekwensu pụrụ ime iji gbochie mbilite n’ọnwụ dị otú ahụ!—Malakaị 3:16; Jọn 5:28, 29; Ọrụ 24:15.

N’ihi Gịnị Ka Setan Ji Akpagbu Anyị?

8. N’ihi gịnị ka Ekwensu ji akpagbu ndị ohu Chineke?

8 Ọ bụrụ na anyị bụ ndị ohu na-ekwesị ntụkwasị obi nke Chineke, e nwere otu isi ihe mere Ekwensu ji akpagbu anyị. Ihe ọ chọrọ bụ ime ka anyị mebie okwukwe anyị. Anyị na Nna anyị nke eluigwe na-emekọrịta ihe n’ụzọ magburu onwe ya, Setan chọkwara imebi ya. Nke a ekwesịghị iju anyị anya. N’Iden, Jehova buru amụma na iro ga-adị n’etiti “nwanyị” ihe atụ ya na “agwọ” ahụ nakwa n’etiti “mkpụrụ” ha abụọ. (Jenesis 3:14, 15) Akwụkwọ Nsọ na-akpọ Ekwensu “agwọ ochie ahụ” ma na-ekpughe na o nweziri nanị nwa oge, nakwa na ọ na-ewe oké iwe. (Mkpughe 12:9, 12) Ebe iro ahụ dị n’etiti “mkpụrụ” abụọ ahụ ka na-aga n’ihu, ndị ji ikwesị ntụkwasị obi na-ejere Jehova ozi pụrụ ịtụ anya inweta mkpagbu. (2 Timoti 3:12) Ị̀ maara isi ihe mere Setan ji akpagbu ndị Chineke otú ahụ?

9, 10. Olee ihe iseokwu Ekwensu welitere, oleekwa njikọ ya na omume ụmụ mmadụ nwere?

9 Ekwensu welitere ihe iseokwu nke ọbụbụeze eluigwe na ala. O welitekwara ihe iseokwu ọzọ yiri nke ahụ site n’ịma aka na ụmụ mmadụ apụghị ikwesị ntụkwasị obi nye Onye Okike ha. Setan kpagburu nwoke ezi omume ahụ bụ́ Job. N’ihi gịnị? Ọ bụ iji mee ka Job kwụsị ikwesị ntụkwasị obi nye Jehova. Ekwensu ji nwunye Job na ‘ndị nkasi obi atọ ya na-eweta ọnọdụ ọjọọ’ rụọ ọrụ n’oge ahụ imezu nzube ya. Dị ka e gosiri n’akwụkwọ Job, Ekwensu mara Chineke aka, kwuo na ọ dịghị mmadụ ga-ekwesị ntụkwasị obi nye Ya ma ọ bụrụ na e kwe ka Setan nwaa onye ahụ ọnwụnwa. Ma Job nọgidere na-ekwesị ntụkwasị obi, si otú ahụ gosi na Setan bụ onye ụgha. (Job 1:8-2:9; 16:2; 27:5; 31:6) Ekwensu na-akpagbu Ndịàmà Jehova taa n’ihi na ọ chọrọ ime ka ha kwụsị ikwesị ntụkwasị obi ma gosi na ihe o kwuru bụ eziokwu.

10 Anyị ịmara na Ekwensu na-akpagbu anyị n’ihi na ọ na-agba mbọ ime ka anyị kwụsị ikwesị ntụkwasị obi nye Chineke pụrụ nnọọ inyere anyị aka inwe obi ike ma dị ike. (Deuterọnọmi 31:6) Chineke anyị bụ Eze Eluigwe na Ala, ọ ga-enyekwara anyị aka ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi nye ya. Ka anyị na-agbalị mgbe nile ime ka obi Jehova ṅụrịa site n’ikwesị ntụkwasị obi nye ya, na-enye ya ihe ọ ga-eji zaghachi ajọ onye ọta ụta ahụ, bụ́ Setan bụ́ Ekwensu, okwu.—Ilu 27:11.

“Napụta Anyị n’Aka Ajọ Onye Ahụ”

11. Gịnị ka arịrịọ ahụ bụ́ “Ewebatakwala anyị n’ime ọnwụnwa” pụtara?

11 Ikwesị ntụkwasị obi nye Chineke adịghị mfe; ọ na-achọ mmadụ ikpesi ekpere ike. Okwu ndị dị n’ekpere nlereanya ahụ na-enyere anyị nnọọ aka. N’akụkụ ya ụfọdụ, Jizọs kwuru, sị: “Ewebatakwala anyị n’ime ọnwụnwa, kama gbapụta [ma ọ bụ, “napụta”] anyị n’aka ajọ onye ahụ.” (Matiu 6:13) Jehova anaghị anwa anyị ọnwụnwa ime mmehie. (Jems 1:13) Otú ọ dị, mgbe ụfọdụ, Akwụkwọ Nsọ na-ekwu na Jehova mere ma ọ bụ kpata ihe mgbe nanị ihe o mere bụ ikwe ka ihe ahụ mee. (Rut 1:20, 21) Ya mere, ọ bụrụ na anyị ekpee ekpere otú ahụ Jizọs kwuru ka anyị na-ekpe, anyị na-arịọ Jehova ka ọ ghara ikwe ka anyị daa mgbe a na-anwa anyị ọnwụnwa. Ọ gaghịkwa ekwe, n’ihi na Akwụkwọ Nsọ gwara anyị okwu ndị a na-emesi obi ike: “Chineke na-ekwesị ntụkwasị obi, ọ gaghịkwa ekwe ka a nwaa unu gabiga ihe unu pụrụ ịnagide, kama mgbe ọnwụnwa ahụ bịara ọ ga-emekwa ụzọ mgbapụ ka unu wee nwee ike idi ya.”—1 Ndị Kọrint 10:13.

12. N’ihi gịnị ka anyị ji ekpe ekpere, sị: “Napụta anyị n’aka ajọ onye ahụ”?

12 Mgbe Jizọs kpọtụchara ọnwụnwa aha n’ekpere nlereanya ahụ, o kwuru n’ụzọ dabara adaba, sị: “Napụta anyị n’aka ajọ onye ahụ.” Ụfọdụ nsụgharị Bible na-agụ, sị: “Napụta anyị n’ihe ọjọọ” (King James Version; Revised Standard Version) ma ọ bụ “Chebe anyị pụọ n’ihe ọjọọ.” (Contemporary English Version) Otú ọ dị, n’Akwụkwọ Nsọ, a na-ejikarị okwu ahụ bụ́ “napụta” eme ihe mgbe a na-ekwu banyere ndị mmadụ, Oziọma Matiu kpọkwara Ekwensu “Onye Ọnwụnwa,” nke na-egosi na ọ bụ onye dị adị. (Matiu 4:3, 11) N’ihi ya, ọ dị anyị mkpa ikpe ekpere ka a napụta anyị n’aka “ajọ onye ahụ,” bụ́ Setan bụ́ Ekwensu. Ọ na-agbalị ịnwata anyị ime mmehie megide Chineke. (1 Ndị Tesalonaịka 3:5) Mgbe anyị rịọrọ arịrịọ ahụ bụ́, “Napụta anyị n’aka ajọ onye ahụ,” anyị na-arịọ Nna anyị nke eluigwe ka o duzie anyị ma nyere anyị aka ka Ekwensu wee ghara ịnwata anyị.

Ekwela Ka Ekwensu Ghọgbuo Gị

13, 14. Olee ihe mere o ji dị mkpa ka ndị Kọrint gbanwee otú ha si na-emeso otu nwoke nọ n’ọgbakọ ha nke na-emebu omume rụrụ arụ ihe?

13 Mgbe Pọl gbara Ndị Kraịst nọ na Kọrint ume ka ha na-agbaghara ndị ọzọ, o dere, sị: “Ihe ọ bụla unu ji obiọma gbaghara onye ọ bụla, m na-emekwa otú ahụ. N’eziokwu, nye m, ihe ọ bụla m jiworo obiọma gbaghara, ma ọ bụrụ na ejiwo m obiọma gbaghara ihe ọ bụla, ọ bụrụwo n’ihi unu n’ihu anya Kraịst; ka Setan wee ghara ịghọgbu anyị, n’ihi na anyị abụghị ndị na-amaghị atụmatụ ya.” (2 Ndị Kọrint 2:10, 11) Ekwensu nwere ike ịghọgbu anyị n’ụzọ dị iche iche, ma olee ihe mere Pọl ji kwuo ihe ahụ o kwuru n’elu?

14 Pọl baara ndị Kọrint mba n’ihi na ha kwere ka otu nwoke na-eme omume rụrụ arụ nọgide n’ọgbakọ. Nke a aghaghị ịtọwo Setan ụtọ, n’ihi na o mere ka a kọchaa ọgbakọ ahụ maka ịnabata “ụdị ịkwa iko nke na-adịghị ọbụna n’etiti ndị mba ọzọ.” E mesịrị chụọ onye mmehie ahụ n’ọgbakọ. (1 Ndị Kọrint 5:1-5, 11-13) Nwoke ahụ mechara chegharịa. Ọ bụrụ na ndị Kọrint ajụ ịgbaghara nwoke ahụ ma nabata ya, Ekwensu ga-aghọgbu ha n’ụzọ ọzọ. N’ụzọ dị aṅaa? Ha ga-abụ ndị dị obi ọjọọ na ndị na-adịghị eme ebere, dị nnọọ ka Setan. Ọ bụrụ na nwoke ahụ chegharịrị echegharị abụrụ “onye e lodara site n’inwebiga mwute ókè,” ya akwụsịkwa kpamkpam ime mgbalị ime ihe ziri ezi, Chineke anyị na-eme ebere, bụ́ Jehova, ga-ajụ ndị okenye ọgbakọ ahụ ajụjụ karịsịa maka nke a. (2 Ndị Kọrint 2:7; Jems 2:13; 3:1) N’ezie, ọ dịghị Onye Kraịst ga-achọ iṅomi Setan site n’ịdị obi ọjọọ, na ịbụ onye na-adịghị eme ebere.

Ekike Agha Sitere n’Aka Chineke Na-echebe Anyị

15. Olee agha anyị na-ebu, gịnịkwa ka anyị na-aghaghị ime ma ọ bụrụ na anyị ga-emeri?

15 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka a napụta anyị n’aka Ekwensu, anyị aghaghị ibu agha ime mmụọ megide ìgwè ndị mmụọ ọjọọ. Iji merie n’agha siri ike otú ahụ, anyị aghaghị ike “ekike agha zuru ezu nke sitere na Chineke.” (Ndị Efesọs 6:11-18) Ekike agha a gụnyere “ihe mgbochi obi bụ́ ezi omume.” (Ndị Efesọs 6:14) Eze Sọl nke Izrel oge ochie nupụụrụ Chineke isi nke mere ka Chineke nara ya mmụọ nsọ ya. (1 Samuel 15:22, 23) Ma, ọ bụrụ na anyị ana-eme ezi omume ma kee ekike agha ime mmụọ zuru ezu, anyị ga-enwe mmụọ nsọ Chineke, a ga-echebekwa anyị pụọ n’aka Setan na ajọ ndị mmụọ ozi ya, bụ́ ndị mmụọ ọjọọ, mgbe ọ dị anyị mkpa.—Ilu 18:10.

16. Olee otú anyị pụrụ isi nọgide na-enweta nchebe pụọ n’aka ndị mmụọ ọjọọ?

16 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka a nọgide na-echebe anyị pụọ n’aka ndị mmụọ ọjọọ, ịgụchi na ịmụchi Okwu Chineke anya, na-eji akwụkwọ ndị a na-enye anyị site n’aka “onye ahụ na-elekọta ụlọ nke na-ekwesị ntụkwasị obi” eme ihe nke ọma, so n’ihe ndị dị anyị mkpa. (Luk 12:42) Anyị ga-esi otú ahụ nwee ọtụtụ ihe ime mmụọ ndị dị mma anyị ga na-eche banyere ha, n’ikwekọ na ndụmọdụ Pọl bụ́: “Ụmụnna m, ihe ọ bụla nke bụ́ eziokwu, ihe ọ bụla nke kwesịrị nchebara echiche, ihe ọ bụla nke bụ́ ezi omume, ihe ọ bụla nke dị ọcha, ihe ọ bụla nke na-akpali ịhụnanya, ihe ọ bụla nke a na-ekwu okwu ọma banyere ya, omume ọma ọ bụla dịnụ na ihe ọ bụla dịnụ nke kwesịrị otuto, nọgidenụ na-atụle ihe ndị a.”—Ndị Filipaị 4:8.

17. Olee ihe ndị ga-enyere anyị aka ịdị irè n’ịkpọsa ozi ọma ahụ?

17 Jehova na-eme ka o kwe anyị omume ‘iyiri akpụkpọ ụkwụ bụ́ ngwá ọrụ nke ozi ọma nke udo n’ụkwụ anyị.’ (Ndị Efesọs 6:15) Ikerechi òkè anya ná nzukọ Ndị Kraịst na-akwadebe anyị ịkpọsa ozi ọma Alaeze Chineke. Lee otú o si enye anyị ọṅụ inyere ndị ọzọ aka ịmụta eziokwu Chineke, ha enwerekwa onwe ha n’ụzọ ime mmụọ! (Jọn 8:32) “Mma agha nke mmụọ nsọ, ya bụ, okwu Chineke,” dị anyị ezigbo mkpa iji jiri ya na-echebe onwe anyị pụọ n’ozizi ụgha ma ‘na-ekpu ihe ndị gbanyesiri mkpọrọgwụ ike ihu.’ (Ndị Efesọs 6:17; 2 Ndị Kọrint 10:4, 5) Iji Okwu Chineke e dere ede, bụ́ Bible, eme ihe nke ọma, na-enyere anyị aka ịkụzi eziokwu ahụ ma na-eme ka Ekwensu ghara iji aghụghọ ya nweta anyị.

18. Olee otú anyị pụrụ isi ‘guzosie ike megide nzupụta ọjọọ dị iche iche nke Ekwensu’?

18 Pọl malitere okwu ya banyere ekike agha ime mmụọ anyị site n’ikwu, sị: “Nọgidenụ na-enweta ike n’ime Onyenwe anyị nakwa n’ịdị ike nke ume ya. Yikwasịnụ ekike agha zuru ezu nke sitere na Chineke ka unu wee nwee ike iguzosi ike megide nzupụta ọjọọ dị iche iche nke Ekwensu.” (Ndị Efesọs 6:10, 11) Okwu Grik a sụgharịrị ịbụ “iguzosi ike” metụtara onye agha ịkwụsi ike n’ebe ọ kwụ. Anyị na-akwụsị ike n’agha ime mmụọ, n’agbanyeghị na Setan na-eji ụzọ aghụghọ dị iche iche eme ihe iji tisaa ịdị n’otu anyị, gwagbuo ozizi anyị, ma ọ bụ mee ka anyị kwụsị iguzosi ike n’ezi ihe nye Chineke. Ma ka ọ dị ugbu a, atụmatụ Ekwensu agabeghị nke ọma—ọ dịghịkwanụ mgbe ọ ga-aga nke ọma! *

Guzogide Ekwensu, Ọ Ga-agbapụkwa n’Ebe Ị Nọ

19. Olee otu ụzọ anyị ga-esi guzogidesie Ekwensu ike?

19 Anyị pụrụ imeri n’agha ime mmụọ anyị na-alụ megide Ekwensu na ndị mmụọ ọjọọ ọ na-achịkwa. Ọ dịghị ihe mere anyị ga-eji tụwa Setan egwu, n’ihi na onye na-eso ụzọ bụ́ Jems dere, sị: “Doonụ onwe unu n’okpuru Chineke; ma na-eguzogidenụ Ekwensu, ọ ga-agbapụkwa n’ebe unu nọ.” (Jems 4:7) Otu ụzọ anyị ga-esi guzogidesie Setan na ndị mmụọ ọjọọ na-akwado ya ike bụ ịghara inwe ihe jikọrọ anyị na mgbaasị ma ọ bụ majik na ndị na-eme ha. Akwụkwọ Nsọ gosiri n’ụzọ doro anya na ndị ohu Jehova aghaghị ịjụ ịgba afa, ịgụ kpakpando, ịjụ ndị mmụọ ase, na mgbaasị. Ọ bụrụ na anyị na-arụsi ọrụ ike ma dị ike n’ụzọ ime mmụọ, anyị ekwesịghị ịtụ ụjọ na mmadụ ga-akọ anyị ọgwụ.—Ọnụ Ọgụgụ 23:23; Deuterọnọmi 18:10-12; Aịsaịa 47:12-15; Ọrụ 19:18-20.

20. Olee otú anyị pụrụ isi guzogide Ekwensu?

20 Anyị ‘na-eguzogide Ekwensu’ site n’ịgbaso ụkpụrụ na eziokwu Bible na site n’iguzogidesi Setan ike. Ụwa na-eme uche Setan n’ihi na ọ bụ ya bụ chi ya. (2 Ndị Kọrint 4:4) N’ihi ya, anyị na-ajụ àgwà ndị e ji mara ụwa, ndị dị ka mpako, ịchọ ọdịmma onwe onye nanị, omume rụrụ arụ, ime ihe ike, na ịhụ ihe onwunwe n’anya. Anyị maara na Ekwensu gbara ọsọ mgbe Jizọs guzogidere ọnwụnwa ya site n’iji Akwụkwọ Nsọ eme ihe mgbe ọ na-anwa ya n’ala ịkpa. (Matiu 4:4, 7, 10, 11) N’otu aka ahụ, anyị ga-emeri Setan, ya ‘agbapụkwa n’ebe anyị nọ’ ma ọ bụrụ na anyị edoo onwe anyị n’okpuru Jehova kpamkpam ma dabere n’ebe Ọ nọ site n’ikpe ekpere. (Ndị Efesọs 6:18) Ebe Jehova Chineke na Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya na-akwado anyị, ọ dịghị onye ga-emerụli anyị ahụ́ n’ụzọ ga-adịgide adịgide—ọbụna Ekwensu!—Abụ Ọma 91:9-11.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 18 Iji nwetakwuo ihe ọmụma banyere ekike ime mmụọ sitere n’aka Chineke, lee Ụlọ Nche, May 15, 1992, peeji nke 21-23.

Gịnị Ka Ị Ga-aza?

• Ànyị kwesịrị ịtụ Setan bụ́ Ekwensu egwu?

• N’ihi gịnị ka Setan ji akpagbu Ndị Kraịst?

• N’ihi gịnị ka anyị ji ekpe ekpere ka a napụta anyị n’aka “ajọ onye ahụ”?

• Olee otú anyị ga-esi merie n’agha ime mmụọ anyị na-alụ?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 26]

Ndị soro ụzọ Kraịst n’oge mbụ bụ́ ndị na-adịghị atụ egwu kwesịrị ntụkwasị obi ruo ọnwụ

[Foto dị na peeji nke 27]

Ekwensu enweghị ike igbochi mbilite n’ọnwụ nke ndị nọ ná ncheta Jehova

[Foto dị na peeji nke 28]

Ị̀ na-ekpe ekpere ka a napụta gị n’aka “ajọ onye ahụ”?

[Foto dị na peeji nke 29]

Ì yi “ekike agha zuru ezu nke sitere na Chineke”?