Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Esta

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Esta

Okwu Jehova Dị Ndụ

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Esta

ATỤMATỤ a enweghị ike ịkụ afọ n’ala. A ga-ekpochapụrịrị ndị Juu nile. N’otu ụbọchị a kara aka, a ga-egbuchapụ ndị Juu nile nọ n’otu alaeze ukwu bụ́ nke sitere n’India ruo Etiopia. Nke ahụ bụ ihe onye mere atụmatụ ahụ chere. Ma ọ dị otu ihe dị oké mkpa o chefuru. Chineke nke eluigwe pụrụ ịnapụta ndị ya n’ọnọdụ ọ bụla jọgburu onwe ya ha nọ na ya. A kọrọ otú e si napụta ha n’akwụkwọ Bible bụ́ Esta.

Ọ bụ nwoke onye Juu kataworo ahụ́ onye aha ya bụ Mọdekaị dere ya. Ihe e dekọrọ n’akwụkwọ Esta bụ ihe omume ndị were afọ iri na asatọ, ọ bụkwa ihe ndị mere n’oge ọchịchị Eze Ahasuerọs, ma ọ bụ Xerxes nke Mbụ nke Peshia. Akụkọ a na-akpali akpali na-egosi otú Jehova si zọpụta ndị ya n’atụmatụ arụrụala ndị iro ha mere n’agbanyeghị na ndị ya bi n’ebe dịgasị iche iche n’otu nnukwu alaeze ukwu. Akụkọ a na-ewusi okwukwe nke ndị Jehova ike, bụ́ ndị na-ejere ya ozi dị nsọ taa na narị ala abụọ na iri atọ na ise. Ọzọkwa, ụfọdụ ndị a kọrọ akụkọ ha n’akwụkwọ Esta setịpụụrụ anyị ihe nlereanya ndị anyị ga-eṅomi, ebe ndị ọzọ bụ ndị anyị na-ekwesịghị ịgbaso ihe nlereanya ha. N’eziokwu, “okwu Chineke dị ndụ ma na-akpa ike.”—Ndị Hibru 4:12.

NWUNYE EZE GA-EMERỊRỊ IHE

(Esta 1:1–5:14)

N’afọ nke atọ nke ọchịchị ya (493 T.O.A.), Eze Ahasuerọs kpọrọ ndị na-enyere ya aka n’ọchịchị oriri. Vashti, bụ́ nwunye eze, nke a maara n’ihi mma ya, kpasuru eze iwe, a napụkwara ya ọnọdụ ya. N’ime ụmụ agbọghọ nile na-amaghị nwoke bụ́ ndị mara mma e nwere n’obodo ahụ, a họọrọ Hadasa bụ́ nwa agbọghọ bụ́ onye Juu ịnọchi Vashti. O mere ihe nwa nwanne nna ya bụ́ Mọdekaị kwuru site n’ime ka a ghara ịmata na ya bụ onye Juu, ọ zakwara aha ndị Peshia bụ́ Esta.

Ka oge na-aga, e buliri otu nwoke dị mpako aha ya bụ Heman n’ọkwá praịm minista. Ọjụjụ Mọdekaị jụrụ ‘iruru ala na ịkpọrọ Heman isiala’ kpasuru Heman iwe nke na o mere atụmatụ ikpochapụ ndị Juu nile nọ n’Alaeze Ukwu Peshia. (Esta 3:2) Heman mere ka Ahasuerọs kweta n’atụmatụ ya, o mekwara ka eze nye iwu ka e gbuchapụ ndị Juu. Mọdekaị yiiri ‘ákwà mkpe, kpokwasịkwa ntụ n’ahụ́ ya.’ (Esta 4:1) Esta ga-emerịrị ihe. Ọ kpọrọ nanị eze na praịm minista ya oriri. Mgbe ha ji obi ụtọ bịa, Esta rịọrọ ha ka ha bịa oriri ọzọ n’echi ya. Ọṅụ juru Heman obi. Otú ọ dị, ọ na-ewe ya iwe na Mọdekaị adịghị asọpụrụ ya. Heman mere atụmatụ igbu Mọdekaị tupu ya agaa oriri a kpọrọ ya n’echi ya.

A Zaa Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

1:3-5—Oriri ahụ ò were otu narị ụbọchị na iri asatọ? Ihe odide ahụ ekwughị na oriri ahụ were ogologo oge hà otú ahụ kama o kwuru na eze gosiri ndị isi ọchịchị ya akụ̀ na ụba ya na ịma mma nke alaeze ya ruo otu narị ụbọchị na iri asatọ. Eleghị anya, eze ji ogologo oge ahụ gosi ndị a ma ama ebube nke alaeze ya ma mee ka ha kweta na ya pụrụ ime ihe ndị ya mere atụmatụ ya ime. Ya bụrụ otú ahụ, ọ pụrụ ịbụ na amaokwu nke 3 na nke 5 na-ezo aka n’oriri were ụbọchị asaa e mere ná ngwụsị nnọkọ ahụ nke were otu narị ụbọchị na iri asatọ.

1:8—Olee otú o si bụrụ na ‘ọ dịghị onye a rụgidere arụgide dị ka iwu si dị n’ihe banyere ịṅụ mmanya’? N’oge oriri ahụ, Eze Ahasuerọs nyere ndị mmadụ ohere ime ihe dị iche n’ihe yiri ka ọ̀ bụ omenala ndị Peshia nke bụ́ ịgwa mmadụ ókè ọ ga-aṅụru mmanya mgbe a bịara ụdị ememe a. Otu akwụkwọ na-ekwu, sị: “Ha pụrụ ịṅụ ókè ha chọrọ.”

1:10-12—Gịnị mere Vashti bụ́ nwunye eze ji jụ ịga za òkù eze kpọrọ ya? Ụfọdụ ndị ọkà mmụta na-ekwu na nwunye eze ekweghị aga n’ihi na ọ chọghị mkparị n’aka ndị ọbịa eze bụ́ ndị ṅụraworo mmanya anya. O nwekwara ike ịbụ na nwunye eze a mara mma elu ahụ́ bụ onye isi ike. N’agbanyeghị na Bible ekwughị ihe mere o ji mee otú ahụ, ndị ikom maara ihe n’oge ahụ chere na e kwesịrị inye ya ntaramahụhụ n’ihi isi ike ahụ o meere di ya nakwa n’ihi na ihe nlereanya ọjọọ Vashti ga-akụziri ndị nwunye nọ n’ógbè ndị dị na Peshia inupụwara di ha isi.

2:14-17—Esta ò sooro eze nwee mmekọahụ rụrụ arụ? Azịza ya bụ ee e. Ihe ndekọ ahụ kwuru na n’ụtụtụ, a na-akpọga ụmụ nwanyị ndị a kpọtaara eze n’ụlọ nke abụọ nke ọnaozi eze, bụ́ “onye na-edebe ndị iko nwanyị,” na-elekọta. Ụmụ nwanyị ndị ha na eze nọrọ n’abalị na-esi otú a ghọọ ndị iko ya nwanyị ma ọ bụ ndị nwunye ya. Otú ọ dị, a kpọgaghị Esta n’ụlọ a na-elekọta ndị iko nwanyị ma ha na eze nọsịa. Mgbe a kpọrọ Esta ịga hụ Ahasuerọs, “eze wee hụ Esta n’anya karịa ndị inyom ahụ nile, o wee nata amara na ebere n’ihu ya karịa ụmụ agbọghọ ahụ nile ndị na-amaghị nwoke.” (Esta 2:17) Olee otú o si nweta “amara na ebere” Ahasuerọs? Ọ bụkwa otu ụzọ ahụ o si nweta amara nke ndị ọzọ. “Nwa agbọghọ ahụ wee dị mma n’anya [Hegaị], e wee meere ya ebere n’ihu ya.” (Esta 2:8, 9) Hegaị meere ya amara nanị n’ihi ihe ọ hụrụ—mma ya na àgwà ọma ya. N’ezie, “Esta wee na-anata amara n’anya ndị nile na-ahụ ya anya.” (Esta 2:15) N’otu aka ahụ, ihe eze hụrụ n’Esta masịrị ya, nke ahụ mekwara ka ọ hụ ya n’anya.

3:2; 5:9—Gịnị mere Mọdekaị ji jụ ịkpọrọ Heman isiala? Ọ bụghị ihe ọjọọ onye Izrel ịkwanyere onye nọ n’ọkwá dị elu ùgwù site n’ịkpọrọ ya isiala. Otú ọ dị, o nwere ihe mere Mọdekaị ji jụ ịkpọrọ Heman isiala. Heman bụ onye Egag, ikekwe ọ bụ onye Amalek, Jehova ekwuwokwa na a ga-ekpochapụ ndị Amalek. (Deuterọnọmi 25:19) N’obi Mọdekaị, ịkpọrọ Heman isiala ga-egosi na ya na-asọpụrụ mmadụ karịa Jehova. Ọ jụwara isi ịkpọrọ ya isiala ma mee ka a mata na ya bụ onye Juu.—Esta 3:3, 4.

Ihe Mmụta Ndị Dịịrị Anyị:

2:10, 20; 4:12-16. Esta nabatara nduzi na ndụmọdụ onye tozuru okè nke na-efe Jehova nyere ya. Ọ ga-abụ ihe amamihe dị na ya anyị ‘irubere ndị na-edu ndú n’etiti anyị isi, na-anọkwa n’okpuru ha.’—Ndị Hibru 13:17.

2:11; 4:5. Anyị kwesịrị ‘ilekwasị anya, ọ bụghị n’igosi mmasị onwe onye nanị n’ihe ndị metụtara anyị, kamakwa n’igosi mmasị onwe onye n’ihe ndị metụtara ndị ọzọ.’—Ndị Filipaị 2:4.

2:15. Esta gosiri na ya enweghị anyaukwu nakwa na ya nwere njide onwe onye site n’ịghara ịrịọ ka e nyekwuo ya ọla ma ọ bụ uwe ndị mara mma karịa nke Hegaị chọrọ inye ya. Ọ bụ “mmadụ zoro ezo nke obi n’uwe na-apụghị ire ure bụ́ mmụọ dị jụụ na nke dị nwayọọ” mere Esta ji nweta amara eze.—1 Pita 3:4.

2:21-23. Esta na Mọdekaị setịpụrụ ezi ihe nlereanya nke ‘mmadụ ido onwe ya n’okpuru ikike ndị ka elu.’—Ndị Rom 13:1.

3:4. Mgbe ụfọdụ, ọ pụrụ ịbụ ihe amamihe dị na ya ịghara ime ka a mata ndị anyị bụ, dị ka Esta mere. Otú ọ dị, mgbe a chọrọ ka anyị kwụsie ike n’okwu ndị dị oké mkpa, dị ka igosi na ọ bụ Jehova kwesịrị ịchị achị nakwa anyị ịnọgide na-eme ezi ihe, egwu agatụghị eme ka anyị ghara ime ka ndị mmadụ mara na anyị bụ Ndịàmà Jehova.

4:3. Mgbe ọnwụnwa bịara anyị, anyị kwesịrị ikpegara Jehova ekpere ka o nye anyị ume na amamihe iji nagide ya.

4:6-8. Mọdekaị gbalịrị ịhụ na eze kagburu atụmatụ Heman mere ikpochapụ ha.—Ndị Filipaị 1:7.

4:14. Obi ike Mọdekaị nwere na Jehova kwesịrị nṅomi.

4:16. Ihe mere Esta ji jiri obi ike na ikwesị ntụkwasị obi mee ihe banyere ọnọdụ nke gaara eme ka ọ nwụọ bụ n’ihi na ọ dabesiri ike na Jehova. Ọ dị oké mkpa ka anyị mụta ịdabere na Jehova karịa ịdabere n’onwe anyị.

5:6-8. Iji nweta amara Ahasuerọs, Esta kpọrọ ya oriri nke ugboro abụọ. Esta ji akọ mee ihe, anyị kwesịkwara ịdị akọ.—Ilu 14:15.

EGWÚ AMALITE ỊDAGHARỊ AGHARA AGHARA

(Esta 6:1–10:3)

Ka oge na-aga, egwú dagharịrị. A kwụgburu Heman n’osisi o mere ka e ji kwụgbuo Mọdekaị, onye ahụ Heman chọrọ ka a kwụgbuo ghọziri praịm minista! Oleekwanụ banyere atụmatụ ahụ e mere igbuchapụ ndị Juu? Nke a aghaghịkwa ịgbanwe n’ụzọ dị ịrịba ama.

Esta na-ekwesị ntụkwasị obi gaghachiri ikwuchitere ndị ya. O tinyere ndụ ya n’ihe ize ndụ ịgakwuru eze iji rịọ ya ka ọ chọọ otú ọ ga-esi meghasịa atụmatụ ahụ Heman mere. Ahasuerọs maara ihe ọ ga-eme. Ya mere, mgbe ụbọchị e zubere igbuchapụ ndị Juu mechara ruo, ọ bụghịzi ndị Juu ka e gburu kama ọ bụ ndị ahụ chọrọ igbu ha. Mọdekaị nyere iwu ka a na-eme Ememe Purim kwa afọ iji na-echeta oké nnapụta a a napụtara ha. Dị ka osote Eze Ahasuerọs, Mọdekaị “na-achọrọ ndị ya ọdịmma, na-agwakwa mkpụrụ ya nile okwu udo.”—Esta 10:3.

A Zaa Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

7:4—Olee otú ‘ihe ga-esi funahụ eze’ ma ọ bụrụ na e kpochapụ ndị Juu? Site n’iji akọ mee ka eze mara na e nwere ike ire ndị Juu dị ka ndị ohu, Esta mere ka o doo eze anya na igbu ha ga-efu ya ihe. Puku mkpụrụ ọlaọcha iri nke Heman kwere nkwa inye eze dị ala karịa ego ọ ga-enweta ma ọ bụrụ na atụmatụ Heman bụ ka e ree ndị Juu dị ka ndị ohu. Ọ bụrụ na e mezuru atụmatụ ahụ, ọ ga-apụta na a ga-egbukwa nwunye eze.

7:8—Gịnị mere ndị ọnaozi eze ji kpuchie ihu Heman? O yiri ka ọ̀ na-enye echiche na ihe ahụ Heman mere bụ ihe ihere ma ọ bụ na ihe ọjọọ na-aga ịdakwasị ya. Dị ka otu akwụkwọ ntụaka si kwuo, “ndị oge ochie na-ekpuchi isi ndị a na-aga igbu.”

8:17—Olee otú o si bụrụ na ‘ọtụtụ ndị mmadụ n’ime ndị dị iche iche nke ala ahụ nọ na-aghọ ndị Juu’? Ihe àmà na-egosi na ọtụtụ ndị Peshia sonyeere ndị Juu n’ihi na ha chere na iwu ahụ a gbanwere na-egosi na Chineke nọnyeere ndị Juu. E jikwa otu ụkpụrụ ahụ mee ihe n’imezu otu amụma dị n’akwụkwọ Zekaraịa. Ọ na-ekwu, sị: “Ndị ikom iri ga-esi n’asụsụ nile nke mba nile jide, ọbụna ijide ọnụ ọnụ ala uwe nwoke bụ́ onye Juu, sị, Anyị na unu ga-ayịkọ jee, n’ihi na anyị anụwo na Chineke nọnyeere unu.”—Zekaraịa 8:23.

9:10, 15, 16—Ọ bụ ezie na iwu ahụ kwadoro ha ịkwakọrọ ihe onwunwe, olee ihe mere na ndị Juu akwakọrọghị ihe onwunwe nke ndị ha gburu? Ọjụjụ ha jụrụ ime otú ahụ mere ka o doo anya na nzube ha bụ ichebe onwe ha ọ bụghị iji baa ọgaranya.

Ihe Mmụta Ndị Dịịrị Anyị:

6:6-10. “N’ihu ntipịa ka mpako na-aga, ọ bụkwa n’ihu ịsụ ngọngọ ka ịdị elu nke mmụọ mmadụ na-aga.”—Ilu 16:18.

7:3, 4. Ànyị na-eji obi ike eme ka a mata na anyị bụ Ndịàmà Jehova, ọbụna ma ọ bụrụ na ime otú ahụ ga-akpatara anyị mkpagbu?

8:3-6. Anyị pụrụ, ma kwesịkwa ịrịọ ndị ọchịchị na ndị ụlọikpe ka ha chebe anyị pụọ n’aka ndị iro anyị.

8:5. Esta ji akọ zere ikwu na eze so mee iwu ahụ e tiri iji kpochapụ ndị Juu. N’otu aka ahụ, anyị kwesịrị iji akọ mee ihe mgbe anyị na-agbara ndị ọchịchị àmà.

9:22. Anyị ekwesịghị ichefu ndị ogbenye nọ n’etiti anyị.—Ndị Galeshia 2:10.

Jehova Ga-emeghere Ndị Ya ‘Ohere Ma Napụta Ha’

Mọdekaị zoro aka n’ihe mere Chineke ji mee ka Esta ruo n’ọnọdụ nke ịbụ nwunye eze. Mgbe e yiri ndị Juu egwu, ha buru ọnụ ma kpee ekpere maka enyemaka. Nwunye eze gara ịhụ eze mgbe eze na-akpọghị ya, o nwetakwara amara n’ihu ya n’oge nke ọ bụla. N’otu abalị dị oké mkpa, ụra ekweghị atụ eze. N’ezie, akwụkwọ Esta kọrọ banyere otú Jehova si gbanwee ihe n’ihi ndị ya.

Akụkọ a na-akpali akpali banyere Esta bụụrụ nnọọ anyị, bụ́ ndị na-ebi na “mgbe ọgwụgwụ ihe ndị a,” ihe agbamume. (Daniel 12:4) “N’ikpeazụ nke ụbọchị ndị a,” ma ọ bụ ná ngwụsị nke oge ọgwụgwụ, Gọg nke Megọg—Setan bụ́ Ekwensu—ga-awakpo ndị Jehova n’ụzọ kpụ ọkụ n’ọnụ. Nzube ya ga-abụ ikpochapụ ndị nile na-efe ezi ofufe. Ma dị ka o mere n’oge Esta, Jehova ga-emeghere ndị na-efe ya ofufe ‘ohere ma napụta ha.’—Ezikiel 38:16-23; Esta 4:14.

[Foto dị na peeji nke 10]

Mgbe Esta na Mọdekaị nọ n’ihu Ahasuerọs