Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Nọgidenụ Na-enwe Uche Ziri Nnọọ Ezi”

“Nọgidenụ Na-enwe Uche Ziri Nnọọ Ezi”

“Nọgidenụ Na-enwe Uche Ziri Nnọọ Ezi”

“Onye na-enweghị uche na-ekwere okwu nile ọ bụla: ma onye nwere ezi uche na-aghọta ijeụkwụ ya.”—ILU 14:15.

1, 2. (a) Gịnị ka ihe mere Lọt na Sọdọm na-akụziri anyị? (b) Gịnị ka okwu ahụ bụ́ ‘nọgidenụ na-enwe uche ziri ezi’ pụtara?

MGBE Ebreham gwara Lọt ka o buru ụzọ họrọ ala, anya Lọt gara n’ógbè mmiri na-ede nke ọma bụ́ nke “dị ka ubi Jehova a gbara ogige.” Nhọpụta Lọt “họpụtaara onwe ya gburugburu ala nile nke Jọdan” ma maa ụlọikwuu ya na nso Sọdọm, gosiri na ọ ghaghị ichewo na ebe ahụ bụ ebe kasị mma ya na ezinụlọ ya ga-ebi. Otú ọ dị, otú ihe dị n’anya pụrụ iduhie mmadụ, n’ihi na “ndị Sọdọm [ndị bụ́] ndị ọjọọ na ndị mmehie megide Jehova nke ukwuu,” bi nso ebe ahụ. (Jenesis 13:7-13) Ka oge na-aga, ọtụtụ ihe funahụrụ Lọt na ezinụlọ ya. Ya na ụmụ ya ndị inyom mesịrị gaa biri n’ọgba. (Jenesis 19:17, 23-26, 30) Ebe ahụ nke yiburu ka ọ mara nnọọ mma mesịrị bụrụ ebe jọgburu onwe ya.

2 Ndị Chineke taa ga-amụta ezigbo ihe site n’akụkọ banyere ihe mere Lọt. Mgbe anyị chọrọ ime mkpebi, anyị aghaghị ịmụrụ anya iji mata ihe ize ndụ ndị a pụrụ inwe ma kpachara anya iji zere ịbụ ndị otú ihe dị n’anya duhiere. N’ihi ya, n’ụzọ dabara adaba, Okwu Chineke na-agba anyị ume, sị: “Nọgidenụ na-enwe uche ziri nnọọ ezi.” (1 Pita 1:13) Okwu Grik a sụgharịrị n’ebe a ịbụ ‘nọgidenụ na-enwe uche ziri ezi’ pụtara n’ụzọ nkịtị, “ka anya doo unu.” Dị ka ọkà mmụta Bible bụ́ R.C.H. Lenski si kwuo, ịbụ onye anya doro bụ “inwe ahụ́ iru ala, inwe uche zuru okè, bụ́ ihe ndị pụrụ inyere anyị aka ịtụle ihe nke ọma ma nwee ike ime mkpebi ziri ezi.” Ka anyị tụlee ọnọdụ ụfọdụ ndị pụrụ ibilite, bụ́ ndị ga-achọ ka anya doo anyị tupu anyị emee mkpebi.

Inyocha Ohere Dapụtaranụ Iji Chụọ Nta Ego

3. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ka anyị kpachara anya mgbe a tụụrụ anyị aro ihe anyị ga-eji kpata ego?

3 Ka e were ya na otu onye a na-akwanyere ùgwù, ikekwe onye gị na ya so na-efe Jehova, gwara gị banyere ohere dapụtaranụ iji chụọ nta ego. Obi siri ya ike na ego dị na ya, ya agbaakwa gị ume ka i mee ngwa ngwa ka ohere ahụ ghara ifunahụ gị. Ị pụrụ ịmalite ichewe otú nke ahụ ga-esi mee ka ihe dịrị gị na ezinụlọ gị mma, ikekwe ọbụna na-eche na nke a ga-enyere gị aka itinyekwu oge n’ijere Jehova ozi. Otú ọ dị, Ilu 14:15 na-adọ aka ná ntị, sị: “Onye na-enweghị uche na-ekwere okwu nile ọ bụla: ma onye nwere ezi uche na-aghọta ijeụkwụ ya.” N’ihi obi ụtọ mmadụ na-enwekarị mgbe ọ na-achọ ịmalite ihe ọhụrụ e ji akpata ego, ọ pụrụ ime ka o chee na ihe ize ndụ adịchaghị na ya ma ọ bụkwanụ leghara ihe ize ndụ ndị dị na ya anya kpamkpam. Ọ pụkwara ime ya ka ọ ghara icheta na ọ dịghị ụzọ ọ bụla e si achụta ego nke e ji n’aka. (Jems 4:13, 14) N’ọnọdụ dị otú a, ọ dị nnọọ oké mkpa ka mmadụ nwee uche ziri nnọọ ezi!

4. Olee otú anyị pụrụ isi ‘ghọta ijeụkwụ anyị’ mgbe anyị na-atụle azụmahịa mmadụ tụụrụ anyị aro ya?

4 Onye maara ihe na-eji nlezianya enyocha aro a tụụrụ ya banyere otú ọ ga-esi kpata ego tupu ya ekpebie ihe ọ ga-eme. (Ilu 21:5) Ime nnyocha dị otú ahụ na-emekarị ka a hụ ihe ize ndụ ndị a na-agaraghị ahụ ma e lee ya anya elu elu. Weregodị dị ka ihe atụ, otu onye chọrọ ibiri ego iji malite ahịa ma gwa gị na ya ga-enye gị ọmụrụnwa buru ibu ma ọ bụrụ na gị ebinye ya ego. Ihe ahụ o kwere nkwa inye gị pụrụ iyi ihe na-adọ akpịrị, ma olee ihe ize ndụ ndị dị na ya? Onye ahụ na-ebi gị ego ọ̀ ga-akwụghachi gị ego gị n’agbanyeghị ma ahịa ya ọ̀ gara nke ọma ma ọ̀ kụrụ afọ n’ala, ka ò kwere nkwa ịkwụghachi gị ego gị nanị ma ọ bụrụ na atụmatụ ya agaa nke ọma? N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ị̀ ga-edili ya ma ọ bụrụ na ego gị efunahụ gị ma ahịa ahụ kụọ afọ n’ala? Ị pụkwara ịjụ, sị: “Olee ihe mere o ji na-ana ndị mmadụ ego? Ndị ụlọ akụ̀ hà lere ahịa ahụ anya dị ka ihe dị ize ndụ?” Ịnọdụ ọdụ chebaara ihe ndị a echiche ga-enyere gị aka ịtụle atụmatụ ahụ nke ọma.—Ilu 13:16; 22:3.

5. (a) Olee ihe amamihe dị na ya nke Jeremaịa mere mgbe ọ zụrụ otu ibe ala? (b) N’ihi gịnị ka o ji aba uru ide ihe nile e kwekọrịtara na ha banyere azụmahịa ede?

5 Mgbe Jeremaịa onye amụma zụụrụ ibe ala n’aka nwa nwanne nna ya, bụ́ onye na-efekwa Jehova ofufe, e dere ya ede n’ihu ndị akaebe. (Jeremaịa 32:9-12) Taa, onye maara ihe ga-ahụ na e dere nkwekọrịta azụmahịa nile ọ banyere na ha, ọbụnadị nke dị n’etiti ya na ndị ikwu ya na ndị kwere ekwe ibe ya, n’akwụkwọ. * Inwe akwụkwọ ebe e dekọrọ ihe nile e kwekọrịtara na ha na-enye aka egbochi nghọtahie ma mee ka unu dịgide n’otu. N’aka nke ọzọ, ịghara ide ya ede so akpatakarị nsogbu azụmahịa n’etiti ndị Jehova. Ọ dị mwute ikwu na nsogbu ndị dị otú ahụ pụrụ ịkpata obi mgbawa, obi ilu, ọbụna mebie mmekọrịta mmadụ na Jehova.

6. N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị izere anyaukwu?

6 Anyị aghaghịkwa izere anyaukwu. (Luk 12:15) Mmadụ ịtụ anya na ya ga-erite uru dị ukwuu n’ahịa ọ chọrọ ịbanye na ya pụrụ ime ka ọ ghara ịhụ ihe ize ndụ dị n’azụmahịa a na-enyo enyo. Ọbụna ụdị ọnyà a amawo ụfọdụ ndị nwere ezigbo ihe ùgwù n’ozi Jehova. Okwu Chineke na-adọ anyị aka ná ntị, sị: “Ka ụzọ ndụ unu bụrụ nke ịhụnanya ego na-adịghị na ya, ka unu nọ na-enwe afọ ojuju n’ihe ndị dị ugbu a.” (Ndị Hibru 13:5) Mgbe Onye Kraịst na-eme atụmatụ ịmalite ihe e ji achụ nta ego, o kwesịrị ịjụ, sị, ‘Ọ̀ dị mkpa n’ezie ka m tinye aka n’ihe a e ji akpata ego?’ Ibi ndụ dị mfe nke hiwere isi n’ofufe Jehova ga-echebe anyị pụọ ‘n’ihe ọjọọ nile.’—1 Timoti 6:6-10.

Ihe Ịma Aka Ndị Na-eche Ndị Kraịst Na-alụbeghị Di Ma Ọ Bụ Nwunye Ihu

7. (a) Ihe ịma aka ndị dị aṅaa ka ọtụtụ Ndị Kraịst na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye na-eche ihu? (b) Olee ihe jikọrọ nhọrọ anyị mere n’ihe banyere alụmdi na nwunye na ịkwụsị ike n’akụkụ Chineke?

7 Ọ na-agụ ọtụtụ ndị ohu Jehova agụụ ịlụ di ma ọ bụ nwunye, ma ha achọtabeghị ndị kwesịrị ekwesị. N’ala ụfọdụ, e nwere ọtụtụ ihe ndị na-arụgide mmadụ ịlụ di ma ọ bụ nwunye. N’agbanyeghị nke ahụ, ndị kwesịrị ọlụlụ n’etiti ndị kwere ekwe pụrụ ịdị ole na ole. (Ilu 13:12) Otú ọ dị, Ndị Kraịst ghọtara na irube isi n’iwu Bible bụ́ ka ‘a lụọ nanị n’ime Onyenwe anyị’ bụ mmadụ igosipụta na ya kwụ n’akụkụ Jehova. (1 Ndị Kọrint 7:39) Iji nagide nrụgide ma merie ọnwụnwa ndị ha na-eche ihu, Ndị Kraịst na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye kwesịrị inwe uche ziri nnọọ ezi.

8. Nrụgide dị aṅaa ka nwa agbọghọ Shulem ahụ nwere, oleekwa otú ụmụ nwanyị bụ́ Ndị Kraịst pụrụ isi chee ihe ịma aka yiri ya ihu taa?

8 N’Abụ nke Abụ, otu nwa agbọghọ a kpọrọ nwa agbọghọ Shunem dọọrọ mmasị otu eze. Eze ahụ ji akụ̀ na ụba, ebube, na ịma mma ya chọọ ịrata nwa agbọghọ ahụ n’agbanyeghị na o nwere nwa okorobịa nwa agbọghọ ahụ hụrụ n’anya. (Abụ nke Abụ 1:9-11; 3:7-10; 6:8-10, 13) Ọ bụrụ na ị bụ nwa agbọghọ bụ́ Onye Kraịst, ị pụrụ ịdọta mmasị nke ụfọdụ ndị ị na-enweghị mmasị n’ebe ha nọ. Onye gị na ya na-arụkọ ọrụ, ikekwe onye ọnụ na-eru n’okwu n’ebe ị na-arụ ọrụ, nwere ike ịdị na-aja gị mma, na-emere gị ihe ọma, ma na-achọ ka gị na ya na-anọ. Kpachara anya maka okwu ire ụtọ ndị dị otú ahụ. Ọ bụ ezie na ọ bụghị mgbe nile ka ndị dị otú ahụ ga-achọ ka gị na ha kpawa, ma ọ bụ ka gị na ha nwee mmekọahụ, ọtụtụ mgbe, ihe ndị a na-abụ ebumnobi ha. Dị ka nwa agbọghọ Shulem ahụ, bụrụ “mgbidi.” (Abụ nke Abụ 8:4, 10) Jụ ndị dị otú ahụ na mmasị ha. Mee ka o doo ndị ọrụ ibe gị anya site ná mmalite na ị bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova ma were ohere ọ bụla dapụtaranụ na-agbara ha àmà. Nke ahụ ga-abụrụ gị ihe nchebe.

9. Olee ihe ize ndụ ụfọdụ dị n’iso onye ị na-amaghị na-akpachi anya n’Intanet? (Leekwa igbe dị na peeji nke 25.)

9 Ebe mmadụ pụrụ isi chọta onye ọ ga-alụ n’Intanet na-ewuzi ebe nile. Ụfọdụ na-ele ya anya dị ka ụzọ isi mata ndị ha na-agaraghị amata. Otú ọ dị, iso onye ị na-amaghị na-enwe mmekọrịta dị nnọọ ize ndụ. N’Intanet, ọ pụrụ isi ike ịmata okwu bụ́ eziokwu na nke bụ́ ụgha. (Abụ Ọma 26:4) Ọ bụghị onye ọ bụla sị na ya bụ ohu Jehova bụ ya n’eziokwu. Tụkwasị na nke ahụ, mmadụ pụrụ ịmalite iso onye ọ hụrụ n’Intanet na-enwe mmekọrịta chiri anya ngwa ngwa, nke ahụ pụkwara igbochi ya ime mkpebi ziri ezi. (Ilu 28:26) Ma ọ̀ bụ site n’Intanet ma ọ̀ bụ site n’ụzọ ọ bụla ọzọ, ọ bụ ihe amamihe na-adịghị na ya mmadụ iso onye ọ na-amachaghị na-akpachi anya.—1 Ndị Kọrint 15:33.

10. Olee otú Ndị Kraịst pụrụ isi gbaa ndị kwere ekwe ibe ha na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye ume?

10 Jehova “nwere mmetụta dị nnọọ nro” n’ahụ́ ndị ohu ya. (Jems 5:11) Ọ maara na ihe ịma aka ndị na-eche Ndị Kraịst ihu, bụ́ ndị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye n’ihi na ha ahụbeghị onye ha ga-alụ, na-akụda mmụọ mgbe ụfọdụ, o jikwa ikwesị ntụkwasị obi ha kpọrọ ihe. Olee otú ndị ọzọ pụrụ isi gbaa ha ume? Anyị kwesịrị ịdị na-aja ha mma mgbe nile n’ihi nrubeisi ha na mmụọ ịchụ onwe onye n’àjà. (Ndị Ikpe 11:39, 40) Anyị pụkwara ịkpọ ha mgbe anyị na-eme atụmatụ maka nnọkọ ndị na-ewuli elu. Ì meela nke ahụ n’oge na-adịbeghị anya? Tụkwasị na nke a, anyị pụrụ ikpe ekpere banyere ha, na-arịọ Jehova ka o nyere ha aka ịkwụsi ike n’akụkụ ya ma bụrụ ndị na-enweta ọṅụ n’ozi ha na-ejere ya. Ka anyị gosi na anyị ji ndị a kwesịrị ntụkwasị obi nye Jehova kpọrọ ihe site n’igosi ezi mmasị n’ebe ha nọ.—Abụ Ọma 37:28.

Ịnagide Nsogbu Ahụ́ Ike

11. Ihe ịma aka dị aṅaa ka ajọ nsogbu ahụ́ ike na-eche anyị n’ihu?

11 Ọ na-enye anyị nsogbu n’obi nke ukwuu mgbe anyị ma ọ bụ ndị anyị hụrụ n’anya dara ezigbo ọrịa. (Aịsaịa 38:1-3) N’agbanyeghị na anyị ga-achọ ka a gwọọ anyị ihe na-arịa anyị, ọ dị oké mkpa ka anyị gbasoo ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ. Dị ka ihe atụ, Ndị Kraịst na-elezi anya irube isi n’iwu Bible bụ́ ka e zere ọbara, ha adịghịkwa ekwe ka e lee ha ahụ́ ma ọ bụ gwọọ ha n’ụzọ metụtara mgbaasị. (Ọrụ 15:28, 29; Ndị Galeshia 5:19-21) Ọ pụrụ isiri ndị na-amaghị ihe ọ bụla banyere nkà ọgwụ na ahụ́ ike ike ịmata ụdị ọgwụgwọ ndị kwesịrị ekwesị. Gịnị pụrụ inyere anyị aka inwe uche ziri nnọọ ezi?

12. Olee otú Onye Kraịst pụrụ isi jiri ezi uche mee ihe mgbe ọ na-atụle otú ọ ga-esi agwọ onwe ya?

12 “Onye nwere ezi uche na-aghọta ijeụkwụ ya” site n’ime nnyocha na Bible na n’akwụkwọ Ndị Kraịst bipụtara. (Ilu 14:15) N’obodo ebe ndị dọkịta na ụlọ ọgwụ ndị e nwere dị ole na ole, ndị dọkịta mgbọrọgwụ, bụ́ ndị na-eji ọgwụ Igbo agwọ ọrịa, pụrụ ịbụ nanị ndị a pụrụ inweta ngwa ngwa. Ọ bụrụ na anyị na-atụle ma ànyị ga-agakwuru ndị dibịa mkpọrọgwụ, anyị pụrụ ịchọta ihe ọmụma na-enye aka n’Ụlọ Nche nke February 15, 1988 peeji nke 27-30. Ọ ga-enyere anyị aka ịmata ihe ize ndụ ndị anyị ga-ezere. Dị ka ihe atụ, ọ pụrụ ịdị anyị mkpa ịchọpụta ihe ndị na-esonụ: À maara dibịa mgbọrọgwụ ahụ dị ka onye na-eme mgbaasị? Otú o si agwọ ọrịa ọ̀ na-egosi na o kweere na ọ bụ ndị chi e mehiere (ma ọ bụ mmụọ nke ndị nna ochie nwụrụ anwụ) ma ọ bụ onye iro nke na-ata amoosu kpatara ọrịa ma ọ bụ ọnwụ ahụ? Ọ̀ na-achụ, na-agọ mmụọ, ma ọ bụ na-agba afa mgbe ọ na-akwadebe ọgwụ ahụ ma ọ bụ na-achọ ka e mee ihe ndị a tupu a ṅụọ ọgwụ ahụ? (Deuterọnọmi 18:10-12) Ime nnyocha ndị dị otú a ga-enyere anyị aka ịgbaso ndụmọdụ sitere n’ike mmụọ nsọ, bụ́: “Na-anwapụtanụ ihe nile; na-ejisikwanụ aka ike n’ihe dị mma.” * (1 Ndị Tesalonaịka 5:21) Iji ezi uche eme ihe ga-enyere anyị aka.

13, 14. (a) Olee otú anyị pụrụ isi jiri ezi uche na-eme ihe mgbe a bịara n’ilekọta ahụ́ ike anyị? (b) N’ihi gịnị ka ezi uche ji dị mkpa mgbe anyị na ndị ọzọ na-ekwurịta ihe banyere ahụ́ ike ma ọ bụ ụzọ anyị si agwọ onwe anyị?

13 Ọ dị mkpa iji ezi uche eme ihe n’ihe ọ bụla anyị na-eme ná ndụ, gụnyere n’ịhụ maka ahụ́ ike anyị. (Ndị Filipaị 4:5) Ilebara ahụ́ ike anyị anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị na-egosi na anyị ji ndụ dị oké ọnụ ahịa e nyere anyị kpọrọ ihe. Mgbe anyị na-arịa ọrịa, anyị kwesịrị ilebara onwe anyị anya. Otú ọ dị, ọ dịghị mgbe a ga-enwe ahụ́ ike zuru okè ruokwa mgbe oge ruru ka Chineke ‘gwọọ mba nile.’ (Mkpughe 22:1, 2) Anyị aghaghị ilezi anya ka anyị ghara ịdị na-echegbubiga onwe anyị ókè banyere ahụ́ ike anyị nke na anyị ga-ewezụga ihe ka mkpa, bụ́ ozi anyị na-ejere Jehova, n’akụkụ.—Matiu 5:3; Ndị Filipaị 1:10.

14 Anyị kwesịkwara iji ezi uche na-eme ihe mgbe anyị na-akọrọ ndị ọzọ ihe banyere ahụ́ ike anyị na ụzọ anyị si agwọ onwe anyị. Nke a ekwesịghị ịbụ ihe anyị ga na-ekwukarị banyere ya mgbe anyị bịara nzukọ Ndị Kraịst ma ọ bụ mgbe anyị gara mgbakọ. Tụkwasị na nke ahụ, ime mkpebi banyere otú mmadụ ga-achọ ka e si gwọọ ya na-emetụtakarị ụkpụrụ Bible na akọ na uche onye ahụ nakwa mmekọrịta ya na Jehova. N’ihi ya, ọ ga-abụ ihe na-adịghị egosi ịhụnanya ịmanye onye kwere ekwe ibe anyị ịnakwere echiche anyị ma ọ bụ manye ya ileghara ihe akọ na uche ya na-agwa ya anya. Ọ bụ ezie na a pụrụ ịgakwuru ndị tozuru okè nọ n’ọgbakọ maka enyemaka, Onye Kraịst nke ọ bụla aghaghị ‘ibu ibu nke aka ya’ mgbe a bịara n’ime mkpebi, ‘onye ọ bụla n’ime anyị ga-azakwa Chineke ajụjụ maka onwe ya.’—Ndị Galeshia 6:5; Ndị Rom 14:12, 22, 23.

Mgbe Ihe Na-esiri Anyị Ike

15. Olee otú ihe isi ike pụrụ isi wetara anyị ihe ịma aka?

15 Ihe isi ike pụrụ ime ka ohu Jehova kwuo okwu ma ọ bụ mee ihe n’ụzọ amamihe na-adịghị na ya. (Eklisiastis 7:7) Mgbe ọnwụnwa bịara Job, Job bịara nwetụ echiche na-ezighị ezi, a gbazikwara echiche ya. (Job 35:2, 3; 40:6-8) Ọ bụ ezie na “Mozis, dị umeala n’obi nke ukwuu, karịa mmadụ nile ndị nọ n’elu ala,” n’otu oge, a kpasuru ya iwe, o kwukwara okwu n’iwe. (Ọnụ Ọgụgụ 12:3; 20:7-12; Abụ Ọma 106:32, 33) Devid jidere nnọọ onwe ya ịghara igbu Eze Sọl, ma mgbe Nebal kparịrị ya ma gwa ndị ikom ya okwu ọjọọ, iwe were Devid, ọ fọkwara nke nta ka o mee ihe ezi uche na-adịghị na ya. Ọ bụ nanị mgbe Abigail batara n’okwu ahụ ka ọ ghọtara onwe ya, si otú ahụ zere imehie ihe, bụ́ nke gaara akpata oké ọdachi.—1 Samuel 24:2-7; 25:9-13, 32, 33.

16. Gịnị pụrụ inyere anyị aka izere iji iwe eme ihe?

16 Anyị onwe anyị pụkwara inwe ihe isi ike bụ́ nke pụrụ ime ka anyị mee ihe mgbe ụfọdụ n’ụzọ ezi uche na-adịghị na ya. Iji nlezianya na-atụle echiche ndị ọzọ, dị ka Devid mere, pụrụ inyere anyị aka izere ime ihe n’iwe bụ́ nke ga-eme ka anyị mee nnọọ mmehie. (Ilu 19:2) Tụkwasị na nke ahụ, Okwu Chineke na-adụ anyị ọdụ, sị: “Maanụ jijiji [ma ọ bụ weenụ iwe], emehiekwala: sinụ otú a n’obi unu n’elu ihe ndina unu, wee dere duu.” (Abụ Ọma 4:4) Ọ bụrụ na o kwe mee, ọ bụ ihe amamihe dị na ya ka anyị chere ruo mgbe obi jụụrụ anyị tupu anyị emee ihe ma ọ bụ mee mkpebi. (Ilu 14:17, 29) Anyị pụrụ ikpekusi Jehova ekpere ike, “udo nke Chineke nke karịrị echiche nile ga-echekwa obi [anyị] na ike iche echiche [anyị] nche site na Kraịst Jizọs.” (Ndị Filipaị 4:6, 7) Udo a nke Chineke ga-eme ka obi jụrụ anyị ma mee ka anyị nwee echiche ziri nnọọ ezi.

17. N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị ịdabere na Jehova iji nwee echiche ziri nnọọ ezi?

17 N’agbanyeghị mgbalị nile anyị na-eme iji zere ihe ize ndụ na iji mee ihe n’ụzọ amamihe dị na ya, anyị nile na-ehie ụzọ. (Jems 3:2) O kwere omume na anyị na-aga ime ihe na-ezighị ezi n’amatụghị na ihe anyị na-aga ime ezighị ezi. (Abụ Ọma 19:12, 13) E wezụga nke ahụ, dị ka mmadụ, anyị apụghị iduzi nzọụkwụ anyị n’adabereghị na Jehova, ọ dịghịkwa anyị n’aka ime otú ahụ. (Jeremaịa 10:23) Lee nnọọ ka anyị si nwee obi ụtọ na Jehova na-emesi anyị obi ike, sị: “M ga-eme ka i nwee uche, M ga-ezikwa gị ihe n’ụzọ nke ị ga-eje ije n’ime ya: M ga-adụ gị ọdụ, anya m ga-adịkwasịkwa gị n’ahụ́.” (Abụ Ọma 32:8) Ee, site n’enyemaka Jehova, anyị pụrụ inwe echiche ziri nnọọ ezi.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 Iji nwetakwuo ihe ọmụma banyere ide ihe ndị e kwekọrịtara na ha tupu a banye n’azụmahịa ede, lee Ụlọ Nche nke August 1, 1997, peeji nke 30-31; August 15, 1987, peeji nke 25-26; na Teta! August 8, 1984, peeji nke 14-17, ndị Ndịàmà Jehova bipụtara.

^ par. 12 Ihe ọmụma ndị a ga-abakwara ndị na-atụle iji ụzọ ụfọdụ, bụ́ ndị ndị ọzọ na-enyo enyo agwọ ọrịa ụfọdụ na-arịa ha.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

Olee otú anyị pụrụ isi nọgide na-enwe echiche ziri ezi

• mgbe mmadụ tụụrụ anyị aro ihe anyị ga-eme kpata ego?

• mgbe anyị na-achọ onye anyị ga-alụ?

• mgbe anyị na-arịa ọrịa?

• mgbe ihe na-esiri anyị ike?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Igbe dị na peeji nke 25]

Ị̀ Pụrụ Ịdabere na Ya?

Ndị mepụtara ebe mmadụ pụrụ isi chọta onye ọ ga-alụ n’Intanet kwuru ihe na-esonụ n’Intanet iji gọrọ isi ha:

“N’agbanyeghị ezigbo mgbalị nile anyị na-eme, ọ naghị adị mfe ịmata onye mmadụ bụ n’ezie.”

“Anyị adịghị ekwe gị nkwa na ihe ọmụma dị n’ebe a bụcha nnọọ eziokwu, ma ọ bụ baa uru.”

“Echiche, ndụmọdụ, okwu, aro, ma ọ bụ ihe ọmụma ma ọ bụ ihe ndị ọzọ e dere n’ebe a bụ echiche nke ndị anyị si n’aka ha nweta ihe ọmụma . . . e kwesịchaghị ịdabere na ha.”

[Foto dị na peeji nke 23]

“Onye nwere ezi uche na-aghọta ijeụkwụ ya”

[Foto ndị dị na peeji nke 24, 25]

Olee otú ụmụnna nwanyị pụrụ isi ṅomie nwa agbọghọ Shulem?

[Foto dị na peeji nke 26]

“Na-anwapụtanụ ihe nile; na-ejisikwanụ aka ike n’ihe dị mma”