Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Job

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Job

Okwu Jehova Dị Ndụ

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Job

NNA ochie bụ́ Job biri n’ala Uz, ebe bụ́ Arebia ugbu a. Ọtụtụ ndị Izrel bi n’Ijipt n’oge ahụ. N’agbanyeghị na Job abụghị onye Izrel, o fere Jehova Chineke ofufe. Bible kwuru banyere ya, sị: “Ọ dịghị onye dị ka ya n’ụwa, ọ bụ nwoke zuru okè, ziekwa ezie, nke na-atụ egwu Chineke, na-esikwa n’ihe ọjọọ wezụga onwe ya.” (Job 1:8) Ọ ga-abụrịrị n’oge ohu Jehova a ma ama bụ́ Josef nwa Jekọb nwụrụla na tupu Mozis amalite ije ozi dị ka onye amụma.

Ma eleghị anya Mozis, bụ́ onye e chere na ọ bụ ya dere akwụkwọ Job, matara ihe banyere Job mgbe ọ nọrọ afọ 40 na Midian, nke dị nso n’ala Uz. Ọ pụrụ ịbụ na Mozis nụrụ ihe banyere afọ ndị ikpeazụ nke Job mgbe ndị Izrel nọ nso na Uz, ná ngwụsị nke afọ 40 ha nọrọ n’ọzara. * Otú e si dee ahụmahụ Job n’akwụkwọ mara nnọọ mma nke na e lere akụkọ ahụ anya dị ka nke e ji nkà dee. E wezụgakwa nke ahụ, ọ na-aza ajụjụ ndị dị ka: Gịnị mere ndị ezi mmadụ ji ata ahụhụ? Gịnị mere Jehova ji kwere ka ajọ omume dịrị? Mmadụ na-ezughị okè ọ̀ pụrụ ikwesị ntụkwasị obi nye Chineke? Dị ka otu akụkụ nke Okwu Chineke e dere n’ike mmụọ nsọ, ozi dị n’akwụkwọ Job dị ndụ ma na-akpa ike, ọbụna taa.—Ndị Hibru 4:12.

‘KA ỤBỌCHỊ A MỤRỤ M LAA N’IYI’

(Job 1:1–3:26)

Otu ụbọchị, Setan mara ikwesị ntụkwasị obi Job n’ebe Chineke nọ aka. Jehova nyere ohere maka ihe ịma aka ahụ ma kwe ka Setan wetara Job ọdachi dị iche iche. Ma Job jụrụ ‘ịgbakụta Chineke azụ.’—Job 2:9.

Ndị enyi atọ Job bịara iji ‘gosi ya ebere.’ (Job 2:11) Ha sooro ya nọdụ ala n’ekwughị ihe ọ bụla ruo mgbe Job buru ụzọ kwuo okwu, sị: “Ka ụbọchị nke a mụrụ m n’ime ya laa n’iyi.” (Job 3:3) Ọ sịrị na ọ gaara akara ya mma ma a sị na ya “dị ka ụmụ ọhụrụ nke na-ahụghị ìhè,” ma ọ bụ ndị nwụrụ n’afọ.—Job 3:11, 16.

A Zaa Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

1:4—Ụmụ Job, hà mere ememe ncheta ụbọchị ọmụmụ? Ee e, ha emeghị ya. Asụsụ mbụ e ji mee ihe maka “ụbọchị” na nke e ji mee ihe maka “ụbọchị ncheta ọmụmụ” dị iche, nke ọ bụla nwere ihe dị iche ọ pụtara. (Jenesis 40:20) Na Job 1:4, e ji okwu ahụ bụ́ ‘ụbọchị’ mee ihe maka oge dị malite mgbe chi bọrọ ruo mgbe chi jiri. O yiri ka ụmụ asaa Job ndị nwoke hà na-ewepụta ụbọchị asaa iji nwee nzukọ ezinụlọ kwa afọ. Ka ha na-aga na nke ibe ha otu otu, nke ọ bụla n’ime ụmụ ya ndị nwoke kpọrọ ụmụnne ya oriri “n’ụbọchị ya.”

1:6; 2:1—Olee ndị e kwere ka ha guzo n’ihu Jehova? Ọkpara Chineke mụrụ nanị ya, bụ́ Okwu ahụ; ndị mmụọ ozi kwesịrị ntụkwasị obi; na “ụmụ Chineke” bụ́ ndị mmụọ ozi nupụrụ isi, tinyere Setan bụ́ Ekwensu, so ná ndị bịara guzo onwe ha n’ihu Jehova. (Jọn 1:1, 18) A chụpụghị Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya n’eluigwe ruo mgbe ntakịrị oge gasịrị ka e guzobesịrị Alaeze Chineke n’afọ 1914. (Mkpughe 12:1-12) Site n’ikwe ka ha guzo n’ihu ya, Jehova mere ka ndị mmụọ nile o kere eke mata aka ahụ Setan mara ya na ihe iseokwu ndị o welitere.

1:7; 2:2—Jehova, ọ̀ gwara Setan okwu ihu na ihu? Bible akọwaghị ọtụtụ ihe banyere otú Jehova na-esi agwa ndị mmụọ ozi okwu. Otú ọ dị, onye amụma bụ́ Maịkaịa nọ n’ọhụụ hụ otu mmụọ ozi ka ya na Jehova na-ekwurịta okwu ihu na ihu. (1 Ndị Eze 22:14, 19-23) N’ihi ya, o yiri ka Jehova ọ̀ gwara Setan okwu n’enweghị onye kwuchiteere ya.

1:21—N’ụzọ dị aṅaa ka Job pụrụ isi laghachi “n’afọ nne” ya? Ebe ọ bụ na Jehova Chineke “weere ájá sitere n’ala” kpụọ mmadụ, e ji okwu ahụ bụ́ “nne” mee ihe n’ebe a n’ụzọ ihe atụ maka ụwa.—Jenesis 2:7.

2:9Olee otú obi pụrụ ịdịwo nwunye Job mgbe ọ gwara di ya ka ọ kọchaa Chineke ma nwụọ? Ihe ndị funahụrụ Job funahụrụ nwunye ya. Ọ ghaghị iwutewo ya ịhụ di ya gbasiburu ike ka ajọ ọrịa kụdara ya. Ụmụ ya ọ hụrụ n’anya nwụnahụrụ ya. Ọ pụrụ ịbụ na isi gbaghasịrị ya nnọọ n’ihi ihe ndị a nke na o chetaghịkwa ihe kasị mkpa—bụ́ mmekọrịta ha na Chineke.

Ihe Mmụta Ndị Dịịrị Anyị:

1:8-11; 2:3-5. Akụkọ Job na-egosi na ikwesị ntụkwasị obi abụghị nanị ime ezi omume na ikwu okwu ziri ezi, kamakwa na ọ gụnyere mmadụ ibu ezi ihe n’obi na-ejere Jehova ozi.

1:21, 22. Site n’anyị ikwesị ntụkwasị obi nye Jehova mgbe ihe dị mma nakwa mgbe e nwere nsogbu, anyị pụrụ ime Setan onye ụgha.—Ilu 27:11.

2:9, 10. Dị ka Job, anyị kwesịrị ịnọgidesi ike n’okwukwe ọ bụrụgodị na ndị ezinụlọ anyị ejighị ozi anyị na-ejere Jehova kpọrọ ihe ma ọ bụ rụgide anyị imebi ma ọ bụ ịjụ okwukwe anyị.

2:13. Ndị enyi Job enweghị ihe na-akasi obi ha nwere ikwu banyere Chineke na nkwa ya n’ihi na ha eleghị ihe anya otú Chineke si ele ya.

“RUO MGBE M KUBIRI UME M GAGHỊ ESI N’EBE M NỌ WEZỤGA IZU OKÈ M!”

(Job 4:1–31:40)

Ihe bụ́ isi n’ihe nile ndị enyi Job atọ kwuru bụ na ọ ga-abụrịrị na Job mere oké ihe ọjọọ mere Chineke ji nye ya ntaramahụhụ dị njọ dị otú ahụ. Elifaz buru ụzọ kwuo okwu. Bildad esochie Elifaz ma kwuo okwu na-agba agba ná ntị karịa nke Elifaz. Okwu nke Zofa na-agbadị agba ná ntị karịa nke ha abụọ.

Job ekwetaghị okwu ụgha ahụ ndị enyi ya kwuru. Ebe ọ na-apụghị ịghọta ihe mere Chineke ji kwere ka ya na-ata ahụhụ, o tinyere uche gabiga ókè n’igosi na ya bụ onye ezi omume. N’agbanyeghị nke ahụ, Job ka hụrụ Chineke n’anya, o kwukwara, sị: “Ruo mgbe m kubiri ume m gaghị esi n’ebe m nọ wezụga izu okè m.”—Job 27:5.

A Zaa Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

7:1; 14:14—Gịnị ka “obubu agha” pụtara? Ahụhụ Job nọ na-ata hiri nne nke na o lere ndụ ya anya dị ka ọrụ mmanye. (Job 10:17) Ebe ọ bụ na oge mmadụ ga-eji nọọ na Shiol—site n’oge ọ nwụrụ ruo mgbe a ga-akpọlite ya n’ọnwụ—bụ oge a na-amanye onye ahụ amanye ịnọ, Job ji oge ahụ tụnyere ọrụ mmanye.

7:9, 10; 10:21; 16:22—Okwu ndị a hà na-egosi na Job ekweghị ná mbilite n’ọnwụ? Okwu ndị a bụ maka ọdịnihu dị nso nke Job. Gịnịzi ka ọ na-ekwu? Otu ihe ọ pụrụ ịpụta bụ na ọ bụrụ na ọ nwụọ, ọ dịghịzikwa ndị ha na ya dịkọrọ ndụ ga-ahụ ya ọzọ. N’anya ha, ọ gaghị alaghachi ọzọ n’ụlọ ya ma ọ bụkwanụ a mata ya ọzọ ruo oge Chineke kara aka. Ọ pụkwara ịbụ na ihe Job bu n’uche bụ na ọ dịghị onye pụrụ isi na Shiol laghachi n’onwe ya. Ihe gosiri na Job kwenyere ná mbilite n’ọnwụ ga-adị n’ọdịnihu bụ ihe e dere na Job 14:13-15.

10:10—Olee otú Jehova si ‘wụsị Job dị ka mmiri ara ma mee ka ọ rahụ arahụ dị ka cheese’? Nke a bụ nkọwa e ji uri kọwaa otú e si kpụọ Job n’afọ nne ya.

19:20—Gịnị ka Job bu n’uche mgbe o kwuru sị, “M wee were akpụkpọ ezé m wepụga onwe m”? Site n’ikwu na ihe ya ji wepụga onwe ya bụ akpụkpọ nke ihe o doro anya na o nweghị akpụkpọ, ọ pụrụ ịbụ na Job na-ekwu na ọ dịghị nnọọ ihe ya ji lanahụ.

Ihe Mmụta Ndị Dịịrị Anyị:

4:7, 8; 8:5, 6; 11:13-15. Anyị ekwesịghị ịdị ngwa iche na onye na-ata ahụhụ na-enweta ụgwọ ọrụ nke ihe o metara nakwa na Chineke na-eweso onye ahụ iwe.

4:18, 19; 22:2, 3. Ndụmọdụ anyị kwesịrị ịdabere n’Okwu Chineke, ọ bụghị n’echiche nke aka anyị.—2 Timoti 3:16.

10:1. Ihe mgbu kpasasịrị Job uche, nke na o chetaghị ihe ndị ọzọ pụrụ ịkpata ahụhụ ọ na-ata. Anyị ekwesịghị inwe obi ilu mgbe anyị na-ata ahụhụ, karịsịa ebe ọ bụ na anyị maara nke ọma ihe ndị kpatara ya.

14:7, 13-15; 19:25; 33:24. Olileanya mbilite n’ọnwụ pụrụ iwusi anyị ike mgbe anyị na-agabiga ọnwụnwa ọ bụla Setan pụrụ iwetara anyị.

16:5; 19:2. Okwu anyị kwesịrị ịgba ndị ọzọ ume ma wusie ha ike, o kwesịghị ịkpasu ha iwe.—Ilu 18:21.

22:5-7. Ndụmọdụ e nyere dabere n’ebubo efu e boro mmadụ abaghị uru, ọ na-emebikwa ihe.

27:2; 30:20, 21. Mmadụ ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi apụtaghị na ọ ga-ezurịrị okè. Job katọrọ Chineke n’ụzọ na-ezighị ezi.

27:5. Ọ bụ nanị Job pụrụ iwezụga izu okè ya n’ihi na mmadụ ikwesị ntụkwasị obi na-adabere n’otú onye ahụ hụruru Chineke n’anya. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịhụ na anyị nwere ịhụnanya siri ike n’ebe Jehova nọ iji nọgide na-ekwesị ntụkwasị obi nye ya.

28:1-28. Ụmụ mmadụ maara ebe akụ̀ ndị dị n’ụwa dị. Ka ha na-achọ ha, amamihe ha na-eduga ha n’igwu ala ruo ebe ọ na-adịghị nnụnụ anya na-aghọ nkọ na-eri ibe ya nke anya ya ga-eru na ya. Ma amamihe Chineke na-abịa site n’ịtụ egwu Jehova.

29:12-15. Anyị kwesịrị iji obi anyị nile meere ndị nọ ná mkpa ebere.

31:1, 9-28. Job setịpụụrụ anyị ihe nlereanya n’ihi na o zeere ịchụ nwanyị, ịkwa iko, ikpe na-ezighị ezi na iji obi ọjọọ na-emeso ndị ọzọ ihe, ịhụ ihe onwunwe n’anya, na ikpere arụsị.

M WEE CHEGHARỊA N’ELU ÁJÁ NA NTỤ’

(Job 32:1–42:17)

Otu nwa okorobịa a na-akpọ Elaịhu ji nnọọ ndidi na-ege ntị n’arụmụka ahụ kemgbe. Ọ malitere ikwu ihe bụ́ uche ya. Ọ gbaziri Job na mmadụ atọ ahụ na-ekwugide Job olu.

Ozugbo Elaịhu kwuchara okwu, Jehova sitere n’oké ifufe zaghachi. O kwughị ihe kpatara ahụhụ Job. Otú ọ dị, Onye Pụrụ Ime Ihe Nile mere ka Job mara ike na amamihe dị ukwuu O nwere site n’ịjụ ya ajụjụ dị iche iche. Job kwetara na ya kwuru okwu n’enweghị nghọta ma kwuo, sị: “N’ihi nke a ka m na-ajụ onwe m ajụ, wee chegharịa n’elu ájá na ntụ.” (Job 42:6) Ka ọnwụnwa Job gwụsịrị, a gọziri ya n’ihi ikwesị ntụkwasị obi ya.

A Zaa Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

32:1-3—Olee mgbe Elaịhu bịara? Ebe ọ bụ na Elaịhu nụrụ ihe nile e kwuru, ọ ghaghị ịbụ na ọ nọdụrụ ala n’ebe ọ na-anụ ihe a na-ekwu tupu Job ekwuo okwu ka ndị enyi ya jisịrị ụbọchị asaa lee ya sọ anya.—Job 3:1, 2.

34:7—Olee otú Job si dị ka onye “na-aṅụ ịchị ọchị dị ka mmiri”? N’ihi ahụhụ Job nọ na ya, o weere emo ndị ọbịa ya atọ kwara na ọ bụ ya ka ha na-akwa ya, ma n’ezie, ọ bụ Chineke ka ha na-ekwugide. (Job 42:7) N’ihi ya, ọ na-aṅụ ịchị ọchị dị ka onye ji obi ụtọ na-aṅụ mmiri.

Ihe Mmụta Ndị Dịịrị Anyị:

32:8, 9. Ime okenye nanị adịghị eme ka mmadụ mara ihe. Mmadụ ịghọta Okwu Chineke na ịbụ onye mmụọ ya na-eduzi na-eme ka onye ahụ nweta amamihe.

34:36. Anyị na-egosi na anyị na-ekwesị ntụkwasị obi mgbe a nwara anyị ọnwụnwa “ruo mgbe ebighị ebi,” ma ọ bụ ruo n’isi, n’otu ụzọ ma ọ bụ n’ụzọ ọzọ.

35:2. Elaịhu gere ntị nke ọma ma ghọta ihe a na-ekwu tupu ya ekwuwe okwu. (Job 10:7; 16:7; 34:5) Tupu ndị okenye ọgbakọ enyewe ndụmọdụ, ha aghaghị ige ntị nke ọma, nụ ihe nile merenụ ma ghọta akụkụ nile nke okwu ahụ.—Ilu 18:13.

37:14; 38:1-39:30. Ịtụgharị uche n’ọrụ ndị dị ike Jehova rụrụ—bụ́ ihe ndị na-egosi ike na amamihe ya—na-eme ka anyị dị umeala n’obi ma na-eme ka anyị mara na igosi na o ruuru Jehova ịbụ Eze eluigwe na ala dị mkpa karịa ihe ọ bụla anyị chọrọ.—Matiu 6:9, 10.

40:1-4. Mgbe anyị chọrọ ikwugide Onye Pụrụ Ime Ihe Nile, anyị kwesịrị ‘ịtụkwasị aka anyị n’ọnụ anyị.’

40:15–41:34. Otobo na agụiyi nwere ike dị ukwuu! Iji nọgide na-ejere Chineke ozi, bụ́ onye na-enye anyị ike, ike sitere n’aka Onye Okike nke anụ ndị a dị ike dịkwa anyị mkpa.—Ndị Filipaị 4:13.

42:1-6. Ịnụ okwu Jehova na ịbụ onye e chetaara ngosipụta nke ike ya mere ka Job ‘hụ Chineke,’ ma ọ bụ ghọta eziokwu banyere ya. (Job 19:26) Nke a gbanwere echiche ya. Mgbe e ji Akwụkwọ Nsọ gbazie anyị olu, anyị kwesịrị ịnakwere mmejọ anyị ma mee mgbanwe.

Nwee Ụdị “Ntachi Obi Job”

Akwụkwọ Job gosiri n’ụzọ doro anya na ọ bụghị Chineke na-akpata ahụhụ ụmụ mmadụ na-ata. Ọ bụ Setan na-akpata ya. Nkwere Chineke kweere ka ihe ọjọọ dịrị na-enye anyị ohere igosipụta ebe anyị kwụ n’ihe iseokwu banyere ọbụbụeze Jehova na nke ikwesị ntụkwasị obi anyị.

Dị ka Job, ndị nile hụrụ Jehova n’anya ga-enwetarịrị ọnwụnwa. Akụkọ banyere Job na-emesi anyị obi ike na anyị pụrụ ịtachi obi. Ọ na-echetara anyị na nsogbu anyị agaghị adịru mgbe ebighị ebi. Jems 5:11 na-ekwu, sị: “Unu anụwo banyere ntachi obi Job, unu ahụwokwa ihe Jehova mesịrị mee.” Jehova gọziri Job maka ikwesị ntụkwasị obi nye ya. (Job 42:10-17) Lee olileanya dị ebube anyị nwere—ịdị ndụ ebighị ebi n’ime Paradaịs n’elu ala! N’ihi ya, ka anyị kpebisie ike ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi dị ka Job.—Ndị Hibru 11:6.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 Akwụkwọ Job kọrọ ihe mere n’ime ihe karịrị otu narị afọ na iri anọ, n’agbata afọ 1657 na 1473 T.O.A.

[Foto ndị dị na peeji nke 16]

Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site ná “ntachi obi Job”?