Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Isi Ihe Ndị Sitere ná Nkebi Mbụ nke Akwụkwọ Abụ Ọma

Isi Ihe Ndị Sitere ná Nkebi Mbụ nke Akwụkwọ Abụ Ọma

Okwu Jehova Dị Ndụ

Isi Ihe Ndị Sitere ná Nkebi Mbụ nke Akwụkwọ Abụ Ọma

OLEE aha dabara adaba a ga-enye akwụkwọ Bible nke ihe kasị dịrị na ya bụ abụ ndị e ji too Onye Okike anyị, bụ́ Jehova Chineke? Ọ dịghị nnọọ aha ga-adaba adaba karịa Abụ Ọma. Akwụkwọ a bụ́ nke kasị too ogologo na Bible nwere abụ ndị a haziri nke ọma bụ́ ndị kwupụtara àgwà ndị magburu onwe ha Chineke nwere na oké ọrụ ndị ọ rụrụ, o nwekwara ọtụtụ amụma. Ọtụtụ n’ime abụ ndị dị na ya gosiri otú obi dị ndị dere ha mgbe ha na-ata ahụhụ. Ihe ndị e dere na ha bụ ihe ndị mere n’ihe dị ka otu puku afọ—malite n’ụbọchị onye amụma bụ́ Mozis ruo mgbe ndị Izrel si ná ndọrọ n’agha lọta. Ndị dere ya bụ Mozis, Eze Devid, na ndị ọzọ. A sịrị na ọ bụ onye nchụàjà bụ́ Ezra haziri ya otú ọ dị ugbu a.

Site n’oge ochie, e kewara akwụkwọ Abụ Ọma ụzọ ise: (1) Abụ Ọma 1-41; (2) Abụ Ọma 42-72; (3) Abụ Ọma 73-89; (4) Abụ Ọma 90-106; and (5) Abụ Ọma 107-150. Isiokwu a ga-atụle nkebi nke mbụ ahụ. E kwuru na ọ bụ Eze Devid nke Izrel oge ochie dere Abụ Ọma nile dị ná nkebi a, ma e wezụga atọ. A maghị ndị dere Abụ Ọma nke 1, 10, na nke 33.

“Ọ BỤ CHINEKE M, NA OKÉ NKUME M”

(Abụ Ọma 1:1–24:10)

Mgbe abụ ọma nke mbụ kwusịrị na onye ihe ụtọ ya dị n’iwu Jehova bụ onye ihe na-agara nke ọma, abụ ọma nke abụọ malitere nnọọ ikwu banyere Alaeze ahụ. * Ihe kasị dịrị ná nkebi nke a nke Abụ Ọma bụ arịrịọ ndị a rịọrọ Chineke. Dị ka ihe atụ, Abụ Ọma nke 3-5, 7, 12, 13, na nke 17, bụ arịrịọ ndị onye dere ha rịọrọ Chineke ka Ọ napụta ya n’aka ndị iro ya. Abụ Ọma nke 8 kwuru otú Jehova si dị ukwuu na otú mmadụ si pee mpe.

Mgbe Devid na-akọwa Jehova dị ka Onye Nchebe nke ndị ya, ọ bụrụ, sị: “Ọ bụ Chineke m, na oké nkume m, ana m agbaba n’ime Ya.” (Abụ Ọma 18:2) E toro Jehova dị ka Onye Okike na Onye Na-enye Iwu n’Abụ Ọma nke 19, too ya dị ka Onye Nzọpụta n’Abụ Ọma nke 20, tookwa ya dị ka Onye Nzọpụta nke Eze ya e tere mmanụ n’Abụ Ọma nke 21. Abụ Ọma nke 23 kọwara ya dị ka Nnukwu Onye Ọzụzụ Atụrụ, ebe Abụ Ọma nke 24 kọwara ya dị ka Eze dị ebube.

A Zaa Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

2:1, 2—Olee “ihe efu” nke mba nile na-atụgharị n’uche? “Ihe efu” ahụ bụ nchegbu ndị ọchịchị bụ́ mmadụ nọgidere na-enwe banyere otú ha ga-esi nọgide n’ọchịchị. Nke a bụ ihe efu n’ihi na nzube ha ga-akụrịrị afọ n’ala. Ndị nile dị n’ụwa, hà pụrụ n’ezie inwe olileanya imeri mgbe ha na-eguzo onwe ha “imegide Jehova, na imegide onye Ya e tere mmanụ”?

2:7—Gịnị bụ ‘ụkpụrụ Jehova’? Ụkpụrụ a bụ ọgbụgba ndụ maka Alaeze, bụ́ nke Jehova na Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya, bụ́ Jizọs Kraịst gbara.—Luk 22:28, 29.

2:12—Olee otú ndị ọchịchị nke mba nile ga-esi ‘sutụ onye ahụ a họpụtara ọnụ’? N’oge Bible, mmadụ abụọ isutụ onwe ha ọnụ bụ ihe na-egosi na ha bụ enyi nakwa na ha kwesịrị ntụkwasị obi nye onwe ha. Ọ bụ ụzọ e si anabata ndị ọbịa. E nyere ndị eze nke ụwa iwu ka ha sutụ Onye ahụ A Họpụtara ọnụ—ya bụ, ka ha nabata ya dị ka Eze Mezaịa ahụ.

3:ihe e dekwasịrị n’elu ya—Olee ihe mere e ji edekwasị ihe n’elu abụ ọma ụfọdụ? Mgbe ụfọdụ ihe ahụ e dekwasịrị n’elu na-ekwu onye dere ya na ihe ndị mere mgbe e dere abụ ọma ahụ ma ọ bụkwanụ ya ekwuo nanị ihe ndị merenụ mgbe e dere ya, dị ka ọ dị n’Abụ Ọma nke 3. Ihe e dekwasịrị n’elu abụ ọma pụkwara ịkọwa nzube abụ ahụ ma ọ bụ ihe e ji ya eme (Abụ Ọma nke 4 na nke 5) nakwa ngwa egwú ndị e ji abụ ya (Abụ Ọma nke 6).

3:2—Gịnị bụ “Selah”? Ọtụtụ ndị kweere na okwu ahụ na-egosi ebe mmadụ ga-akwụsị iji chee echiche, ma ọ́ bụghị ịkwụsịtụ nanị abụ, ya abụrụ ịkwụsịtụ ma abụ ma ịkụ ngwá egwu e ji na-abụ ya. E ji nkwụsịtụ ahụ mesie okwu ma ọ bụ mmetụta a ka bụpụrụ n’abụ ahụ ike. Ọ dịghị mkpa ịgụpụta okwu ahụ agụpụta mgbe a na-agụ Abụ Ọma n’ihu ọha.

11:3—Olee ide ndị a na-akwada? Ọ bụ ide ndị ji ọha mmadụ—iwu, ụkpụrụ, na ikpe ziri ezi. Mgbe a na-agbasoghị ha, a na-enwe ọgba aghara, a na-enwekwa ikpe na-ezighị ezi. Mgbe e nwere ọnọdụ ndị dị otú ahụ, “onye ezi omume” aghaghị ịtụkwasị Chineke obi kpamkpam.—Abụ Ọma 11:4-7.

21:3—Gịnị ka “okpueze nke ọlaedo a nụchara anụcha” pụtara? E kwughị ma okpueze ahụ ọ̀ bụ okpueze nkịtị ka ọ̀ bụ ihe atụ nke ebube Devid nwetakwuru n’ihi ọtụtụ agha ndị o meriri na ha. Otú ọ dị, amaokwu a na-ebu amụma banyere okpueze Jehova ji chie Jizọs eze n’afọ 1914. Na e ji ọlaedo mee okpueze ahụ nwere ike ịpụta na ọchịchị ya bụ nnọọ ọchịchị kasị mma.

22:1, 2—Gịnị pụrụ imewo ka Devid chee na Jehova hapụrụ ya? Ndị iro Devid nọ nnọọ na-enye ya nsogbu nke na ‘obi ya ghọrọ ihe dị ka wax; ma lọọ mmiri n’etiti afọ ya.’ (Abụ Ọma 22:14) Ọ pụrụ iyi ya ka Jehova ọ̀ hapụla ya. Mgbe a na-akpọgbu Jizọs, o chekwara otú ahụ. (Matiu 27:46) Okwu Devid gosiri otú o si dịrị ya dị ka mmadụ mgbe ọ nọ n’ọnọdụ ọjọọ. Otú ọ dị, ekpere ya dị n’Abụ Ọma 22:16-21, gosiri nnọọ na Devid ka nwere okwukwe na Chineke.

Ihe Mmụta Ndị Dịịrị Anyị:

1:1. Anyị kwesịrị izere iso ndị na-ahụghị Jehova n’anya na-akpakọrịta.—1 Ndị Kọrint 15:33.

1:2. Anyị agaghị ekwe ka otu ụbọchị gafee n’atụleghị ihe metụtara ofufe Chineke.—Matiu 4:4.

4:4. Mgbe iwe na-ewe anyị, ọ ga-abụ ihe amamihe anyị ịkwa ire anyị nga, ka anyị wee ghara ikwu ihe anyị ga-emesị kwaara ụta.—Ndị Efesọs 4:26.

4:5. Àjà ndị anyị na-achụ n’ihe metụtara ofufe anyị na-efe Chineke ga-abụ “àjà ezi omume” nanị ma ọ bụrụ na anyị bu ezi ihe n’obi na-achụ ha ma na-eme ihe Jehova chọrọ.

6:5. Ọ dịghị ihe ọzọ mmadụ kwesịrị iji chọọ ịdịgide ndụ karịa ito Chineke.—Abụ Ọma 115:17.

9:12. Jehova na-ajụta ọbara ndị e gburu egbu iji taa ndị ikpe ọbara mara ahụhụ, ma ọ na-echeta “iti mkpu nke ndị e wedara n’ala.”

15:2, 3; 24:3-5. Ndị na-efe ezi ofufe aghaghị ịdị na-ekwu eziokwu ma zere ịṅụ iyi ụgha na nkwutọ.

15:4. Anyị kwesịrị ime ihe ọ bụla anyị pụrụ ime iji mezuo nkwa anyị kwere ọbụna ma a sị na ọ ga-esiri anyị ike imezu ya, ọ gwụla ma ànyị bịara ghọta na ihe ahụ megidere Akwụkwọ Nsọ.

15:5. Dị ka ndị na-efe Jehova, anyị kwesịrị izere iji ego eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi.

17:14, 15. Ndị “mmadụ nke ụwa” na-elekwasị anya n’ibi ndụ okomoko, inwe ezinụlọ, na inwe ihe ha ga-ahapụrụ ụmụ ha. Isi ihe Devid na-eche ná ndụ ya bụ ime ka ya na Chineke dị ná mma, ka o wee nwee ike ‘ịhụ ihu Ya,’ ma ọ bụ inweta ngọzi Jehova. Mgbe Devid “tetara” ma hụ mmezu nke nkwa ndị Jehova kwere, ‘afọ ga-eju ya ịhụ ụdị Ya,’ nke pụtara na ọ ga-aṅụrị ọṅụ na Jehova nọnyeere ya. Dị ka Devid, ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ilekwasị anya n’akụ̀ ime mmụọ?

19:1-6. Ọ bụrụ na ihe ndị e kere eke, bụ́ ndị na-adịghị ekwu okwu ma ọ bụ na-eche echiche, na-eto Jehova, ọ̀ bụ na anyị onwe anyị bụ́ ndị pụrụ iche echiche, ikwu okwu, na ife ofufe ekwesịghị ime otú ahụ karị?—Mkpughe 4:11.

19:7-11. Lee ka iwu Jehova si abara anyị uru!

19:12, 13. Anyị kwesịrị nnọọ izere mmehie na mpako.

19:14. Anyị kwesịrị ịdị na-echebara ihe anyị na-ekwu na ihe anyị na-eche, echiche, ọ bụghị nanị ihe anyị na-eme.

“N’IZU OKÈ M KA I JIDEWORO M”

(Abụ Ọma 25:1–41:13)

Lee ka Devid si gosipụta ọchịchọ obi ya na mkpebi siri ike o mere ịnọgide n’izu okè ya n’abụ ọma abụọ mbụ dị ná nkebi a! Ọ bụrụ, sị: “Ma mụ onwe m, n’izu okè m ka m ga-eje ije.” (Abụ Ọma 26:11) N’ekpere o ji rịọ ka a gbaghara ya mmehie ya, o kwetara, sị: “Mgbe m gbara nkịtị, ọkpụkpụ m nile kara nká site n’ọgbụgbọ ụja m ogologo ụbọchị nile.” (Abụ Ọma 32:3) Devid mesiri ndị na-ekwesị ntụkwasị obi nye Jehova obi ike, sị: “Anya abụọ nke Jehova dị n’ahụ́ ndị ezi omume, ntị Ya abụọ ghekwara oghe ná mkpu ha na-etiku Ya.”—Abụ Ọma 34:15.

Lee ka ndụmọdụ ahụ e nyere n’Abụ Ọma nke 37 si baara ma ndị Izrel ma anyị onwe anyị, bụ́ ndị bi “n’ụbọchị ikpeazụ” nke usoro ihe a, uru! (2 Timoti 3:1-5) Abụ Ọma nke 40:7, 8 buru amụma banyere Jizọs Kraịst, sị: “Lee abịawo m; n’akwụkwọ mpịakọta ka e deworo ihe banyere m: Ime ihe dị Gị ụtọ atọwo m ụtọ, Chineke; iwu Gị dịkwa n’ime obi m.” Abụ ọma nke ikpeazụ ná nkebi a na-ekwu banyere arịrịọ Devid rịọrọ Jehova ka o nyere ya aka n’afọ ndị sochiri mmehie ya na Bat-sheba bụ́ mgbe nsogbu zuru ya ahụ́. Ọ bụrụ, sị: “Ma mụ onwe m, n’izu okè m ka I jideworo m.”—Abụ Ọma 41:12.

A Zaa Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

26:6—Olee otú anyị si agba ebe ịchụàjà Jehova gburugburu n’ụzọ ihe atụ dị ka Devid mere? Ebe ịchụàjà ahụ na-anọchi anya uche Jehova n’ịnabata àjà mgbapụta Jizọs Kraịst maka ịgbapụta ụmụ mmadụ. (Ndị Hibru 8:5; 10:5-10) Anyị na-agba ebe ịchụàjà Jehova gburugburu site n’igosipụta okwukwe n’àjà ahụ.

29:3-9—Gịnị ka iji olu Jehova tụnyere égbè eluigwe bụ́ nke na-adachi ntị ma ọ gbaa na-egosi? Ọ pụrụ igosi nanị otu ihe: Ike dị egwu nke Jehova!

31:23—Olee otú e si akwụghachibịga onye mpako ókè? Ụgwọ ọrụ a na-ekwu okwu ya n’ebe a bụ ntaramahụhụ. Onye ezi omume na-enweta ụgwọ ọrụ nke mmejọ ọ na-elezighị anya mee n’ụdị ịdọ aka ná ntị sitere n’aka Jehova. Ebe ọ bụ na onye mpako adịghị echegharị n’ihe ọjọọ ya, a na-eji ntaramahụhụ siri ike akwụghachibiga ya ụgwọ ókè.—Ilu 11:31; 1 Pita 4:18.

33:6—Gịnị bụ “iku ume” nke ọnụ Jehova? Iku ume ahụ bụ ike Chineke nke nọ n’ọrụ, ma ọ bụ mmụọ nsọ ya, bụ́ nke o ji kee eluigwe nkịtị. (Jenesis 1:1, 2) A kpọrọ ya iku ume nke ọnụ ya n’ihi na, dị ka nku ume siri ike, a pụrụ izipụ ya ịrụ ọrụ n’ebe dị anya.

35:19—Gịnị ka arịrịọ ahụ Devid rịọrọ ka Jehova ghara ikwe ka ndị kpọrọ ya asị gbuo iku anya ha pụtara? Ndị iro Devid igbu iku anya ha ga-apụta na ha na-aṅụrị ọṅụ n’ihi na atụmatụ ọjọọ ndị ha tụrụ megide Devid na-aga nke ọma. Devid rịọrọ ka Chineke ghara ikwe ka nke ahụ mee.

Ihe Mmụta Ndị Dịịrị Anyị:

26:4. Ọ ga-abụ ihe amamihe dị na ya anyị izere iso ndị ihu abụọ ma ọ bụ ndị na-ezochi ihe ha bụ n’ebe ndị a na-ekwurịta okwu n’Intanet, ndị na-eji aghụghọ eme ka à ga-asị na ha bụ ezigbo ndị enyi anyị n’ụlọ akwụkwọ ma ọ bụ n’ebe ọrụ, ndị si n’ezi ofufe dapụ bụ́ ndị na-eme ka à ga-asị na ha na-ekwu eziokwu, na ndị na-ebi ụdị ndụ abụọ, na-akpakọ.

26:7, 12; 35:18; 40:9. Anyị aghaghị ito Jehova n’ihu ọha n’ọmụmụ ihe Ndị Kraịst.

26:8; 27:4. Ànyị na-enwe mmasị ịga ọmụmụ ihe?

26:11. Ka Devid na-ekwupụta mkpebi ya ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi, ọ rịọkwara maka mgbapụta. Ee, anyị pụrụ ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi n’agbanyeghị ezughị okè anyị.

29:10. Site na Jehova ịnọ ọdụ n’elu ‘Iju mmiri’ ọ na-egosi na ọ na-achịkwa ike ya n’ụzọ zuru ezu.

30:5. Àgwà bụ́ isi e ji mara Jehova bụ ịhụnanya—ọ bụghị iwe.

32:9. Jehova achọghị ka anyị dịrị ka ịnyịnya mule ma ọ bụ ịnyịnya ibu bụ́ ndị na-erube isi n’ihi bridle na ụtarị. Kama nke ahụ, ọ chọrọ ka anyị jiri aka anyị họrọ irubere ya isi n’ihi na anyị ghọtara uche ya.

33:17-19. Ọ dịghị òtù ọ bụla ụmụ mmadụ hiwere, n’agbanyeghị otú o siruru n’ike, nke pụrụ iweta nzọpụta. Anyị aghaghị ịtụkwasị Jehova na ndokwa o mere maka Alaeze ya obi.

34:10. Lee ka nke a si na-emesi ndị butere ihe banyere Alaeze ahụ ụzọ ná ndụ ha obi ike!

39:1, 2. Mgbe ndị na-emebi iwu na-achọ ịjụta ihe iji mee ụmụnna anyị ihe ọjọọ, ọ ga-abụ ihe amamihe dị na ya anyị ‘idebere ọnụ anyị ihe nkechi ọnụ’ ma gbachi nkịtị.

40:1, 2. Ile anya Jehova pụrụ inyere anyị aka ịnagide obi nkoropụ ma mee ka anyị si “n’olulu mbibi, n’apịtị nke ala ụrọ, rịgopụta.”

40:5, 12. N’agbanyeghị otú ahụhụ ma ọ bụ amaghị eme anyị dịruru ọtụtụ, ha agaghị akarị anyị ike ma ọ bụrụ na anyị ana-echeta mgbe nile na ngọzi ndị anyị na-enweta “karịrị ịgụ ọnụ.”

‘Onye A Gọziri Agọzi Ka Jehova Bụ’

Lee ka abụ ọma 41 dị ná nkebi mbụ nke akwụkwọ Abụ Ọma si na-akasi obi ma na-agba ume! Ma à na-anwa anyị ọnwụnwa ma ànyị na-enwe obi amamikpe, akụkụ a nke Okwu Chineke na-akpa ike pụrụ inye anyị ike ma gbaa anyị ume. (Ndị Hibru 4:12) Abụ ọma ndị a nwere ozi ndị na-enye nduzi kwesịrị ekwesị ná ndụ. E mesiri anyị obi ike ugboro ugboro na n’agbanyeghị ihe isi ike anyị na-enwe, Jehova agaghị ahapụ anyị.

Nkebi nke mbụ nke Abụ Ọma ji okwu ndị a mechie: “Onye a gọziri agọzi ka Jehova, bụ́ Chineke Izrel, bụ, site na mgbe ebighị ebi wee ruo mgbe ebighị ebi. Amen, na Amen.” (Abụ Ọma 41:13) Ka anyị tụlesịrị ha, ọ̀ bụ na ọ dịghị akpali anyị ịgọzi, ma ọ bụ ito Jehova?

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 7 Abụ Ọma nke 2 mezuru nke mbụ ya n’oge Devid.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 19]

Ọ bụrụ na ihe ndị e kere eke, bụ́ ndị na-adịghị ekwu okwu ma ọ bụ na-eche echiche na-eto Jehova, lee ka anyị kwesịrị isi too ya karị!

[Foto dị na peeji nke 17]

Ọ bụ Devid dere ihe ka ọtụtụ n’Abụ Ọma nke 1 ruo nke 41

[Foto dị na peeji nke 18]

Ị̀ maara abụ ọma nke kọwara Jehova dị ka Nnukwu Onye Ọzụzụ Atụrụ?

[Foto dị na peeji nke 20]

Anọla otu ụbọchị n’atụleghị ihe metụtara ofufe Chineke

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 17]

Kpakpando: Site n’ikike a natara United States Naval Observatory

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 19]

Kpakpando, peeji nke 18 na 19: Site n’ikike a natara United States Naval Observatory

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 20]

Kpakpando: Site n’ikike a natara United States Naval Observatory