Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Ka Alaeze Chineke Bụ?

Gịnị Ka Alaeze Chineke Bụ?

Gịnị Ka Alaeze Chineke Bụ?

ỌDACHI dị egwu dakwasịrị ụmụ mmadụ obere oge ka e kesịrị mmadụ mbụ! Otu mmụọ ozi nupụụrụ Onye kere ya isi. Onye nnupụisi a rafuru nwanyị mbụ, bụ́ Iv, iri mkpụrụ osisi ahụ a machibidoro iwu. Mmụọ ozi ahụ gwara nwanyị ahụ banyere ya na di ya, bụ́ Adam, sị: “Ọ dịghị ọnwụ unu na-aghaghị ịnwụ: n’ihi na Chineke maara na n’ụbọchị unu ga-eri mkpụrụ sitere na ya, mgbe ahụ ka a ga-emeghe anya unu, unu ewee dị ka Chineke, na-ama ezi ihe na ihe ọjọọ.” (Jenesis 2:16, 17; 3:1-5) E mesịrị na-akpọ mmụọ ozi nnupụisi ahụ Ekwensu na Setan.—Mkpughe 12:9.

Iv, ò kweere ihe Setan kwuru? Bible na-agwa anyị, sị: “Nwanyị wee hụ na osisi ahụ dị mma ihe oriri, na ọ bụkwa ihe na-agụ anya agụụ ile, na ihe a na-achọsi ike ka osisi ahụ bụkwa ime ka mmadụ nwee uche, o were ụfọdụ n’ime mkpụrụ ya, rie; o nyekwa di ya, tinyere onwe ya, o wee rie.” (Jenesis 3:6) Ee, di na nwunye mbụ ahụ, bụ́ Adam na Iv, sonyeere Setan ná nnupụisi ya. N’ihi ya, ha tụfuuru ma onwe ha ma ụmụ ha ohere ibi na Paradaịs. Ụmụ ha gaara amụ dị ka ndị zuru okè na ndị ga-adị ndụ ebighị ebi bịaziri keta mmehie na ọnwụ.—Ndị Rom 5:12.

Olee ihe Jehova Chineke, bụ́ Eze Na-achị eluigwe na ala, mere? O mere ndokwa maka mgbaghara mmehie. (Ndị Rom 5:8) Jehova Chineke emewokwa ndokwa maka ọchịchị ga-akwụsị nsogbu ahụ. A kpọrọ ndokwa a “alaeze Chineke.” (Luk 21:31) Alaeze a e hiwere dị ka akụkụ nke ọchịchị eluigwe na ala nke Chineke nwere otu nzube.

Olee ihe bụ́ nzube nke Alaeze Chineke? Gịnị bụ akụkụ ya ụfọdụ, e jirikwa ha tụnyere ọchịchị ụmụ mmadụ, olee nke ka mma? Olee mgbe Alaeze ahụ ga-amalite ịchị? A ga-atụle ajụjụ ndị a n’isiokwu na-esonụ.