Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Alaeze Chineke Karịrị Ọchịchị Ndị Ọzọ n’Ụzọ Nile

Alaeze Chineke Karịrị Ọchịchị Ndị Ọzọ n’Ụzọ Nile

Alaeze Chineke Karịrị Ọchịchị Ndị Ọzọ n’Ụzọ Nile

JIZỌS KRAỊST kụziiri ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ya mere, kpeenụ ekpere otú a: ‘Nna anyị nke nọ n’eluigwe, ka e doo aha gị nsọ. Ka alaeze gị bịa. Ka uche gị meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.’” (Matiu 6:9, 10) Ekpere a ọtụtụ ndị maara dị ka Nna Anyị nke Bi n’Eluigwe, ma ọ bụ Ekpere nke Onyenwe Anyị, na-akọwa nzube nke Alaeze Chineke.

A ga-eji Alaeze ahụ doo aha Chineke nsọ. A ga-ewepụ nkọcha nile a kọcharala ya n’ihi nnupụisi Setan na nke ụmụ mmadụ. Nke a dị nnọọ mkpa. Obi ụtọ ndị mmadụ gaje inwe dabeere na ha iwere aha Chineke dị ka ihe dị nsọ na ịdị njikere ikwenye na o ruuru ya ịchị achị.—Mkpughe 4:11.

Ọzọkwa, e hiwere Alaeze ahụ iji mee “ka uche [Chineke mee] n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.” Ma gịnị bụ uche Chineke ahụ? Ọ bụ ime ka ụmụ mmadụ na Chineke dịghachi ná mma, bụ́ adịm ná mma nke Adam tụfuru. Alaeze ahụ ga-emezukwa nzube nke Eze Eluigwe na Ala, bụ́ Jehova, nke bụ́ ime ka ụwa bụrụ paradaịs ebe ndị ezi mmadụ pụrụ ibi ruo mgbe ebighị ebi. Ee, Alaeze Chineke ga-emezi ihe nile mmehie mbụ ahụ mebiri ma mezuo ihe Chineke ji ịhụnanya zube maka ụwa. (1 Jọn 3:8) N’ezie, ozi bụ́ isi dị na Bible bụ Alaeze a na ihe ọ gaje ịrụzu.

Olee Otú O Si Karịa Ọchịchị Ndị Ọzọ?

Alaeze Chineke bụ ezigbo ọchịchị nke nwere ike dị ukwuu. Daniel onye amụma tụpenyere anyị nnọọ azụ banyere otú ọ dịruru n’ike. O buru amụma ogologo oge gara aga, sị: “Chineke nke eluigwe ga-eme ka otu alaeze bilie, nke . . . ga-etipịa alaeze [ụmụ mmadụ] nile mee ka ha gwụsịa.” Ọzọkwa, n’adịghị ka ọchịchị ụmụ mmadụ, bụ́ nke na-amalite ma kwụsị ka oge na-aga, “a gaghị emebi [Alaeze Chineke] emebi.” (Daniel 2:44) Ọ bụghị ebe ahụ ka ọ kwụsịrị. N’ihe nile, Alaeze a karịrị nnọọ ọchịchị ụmụ mmadụ.

Eze nke Alaeze Chineke ka eze ụmụ mmadụ elu. Tụlee onye Eze ahụ bụ. Daniel nọ ná “nrọ na ọhụụ” hụ Onye Ọchịchị nke Alaeze Chineke dị ka “otu onye, nke dị ka nwa nke mmadụ,” ka a kpọtara ya n’ihu Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile, e nyekwa ya “ọchịchị, na ebube, na alaeze.” (Daniel 7:1, 13, 14) Nwa nke mmadụ ahụ abụghị onye ọzọ ma e wezụga Jizọs Kraịst—bụ́ Mezaịa ahụ. (Matiu 16:13-17) Jehova Chineke họpụtara Ọkpara ya, bụ́ Jizọs, ịbụ Eze nke Alaeze Ya. Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, ọ gwara ndị Farisii dị obi ọjọọ, sị: “Alaeze Chineke dị n’etiti unu,” nke pụtara na ya, bụ́ Eze gaje ịchị n’Alaeze ahụ, nọ n’etiti ha.—Luk 17:21.

Olee mmadụ ruru eru ịbụ Onye Ọchịchị dị ka Jizọs? Jizọs adịla mbụ gosi na ya bụ nnọọ Onye Ndú na-eme ezi omume, nke a pụrụ ịtụkwasị obi, na nke nwere ọmịiko. Akụkụ Bible ndị kọrọ akụkọ ndụ ya gosiri na ọ bụ ma ekwu eme ma onye nwere ịhụnanya na ọmịiko. (Matiu 4:23; Mak 1:40, 41; 6:31-34; Luk 7:11-17) Ọzọkwa, ugbu a a kpọliterela Jizọs n’ọnwụ, ọ gaghị anwụ anwụ ọzọ ma ọ bụ nwee erughị eru ndị ụmụ mmadụ nwere.—Aịsaịa 9:6, 7.

Jizọs na ndị ha na ya so achị ga-anọ n’ebe ka elu na-achị. Daniel hụkwara ná nrọ nke ọhụụ ya na “alaeze ahụ, na ọchịchị ahụ, . . . ka a ga-enye ndị ahụ, bụ́ ndị nsọ.” (Daniel 7:27) Jizọs agaghị achị nanị ya. O nwere ndị ọzọ ga-eso ya chịa dị ka ndị eze ma jee ozi dị ka ndị nchụàjà. (Mkpughe 5:9, 10; 20:6) Jọn onyeozi dere banyere ha, sị: “M wee hụ, ma, lee! Nwa Atụrụ ahụ ka ọ na-eguzo n’elu Ugwu Zaịọn, ya na narị puku na iri puku anọ na anọ . . . bụ́ ndị a zụtaworo n’ụwa.”—Mkpughe 14:1-3.

Nwa Atụrụ ahụ bụ Jizọs Kraịst ka e chisịrị ya eze dị ka Eze nke Alaeze ahụ. (Jọn 1:29; Mkpughe 22:3) Ugwu Zaịọn ahụ bụ eluigwe. * (Ndị Hibru 12:22) Jizọs na narị puku na iri puku anọ na anọ ahụ ha na ya ga-eso chịa ga-anọ n’eluigwe achị ọchịchị ha. Lee ka ebe ha ga-anọ achị si dị elu! Ebe ọ bụ na ha ga-anọ n’eluigwe, ha ga na-ahụzu ihe karị. Ebe isi ọchịchị “alaeze Chineke” dị n’eluigwe, a na-akpọkwa ya “alaeze eluigwe.” (Luk 8:10; Matiu 13:11) Ọ dịghị ngwá agha, ọbụnadị agha nuklia, pụrụ imetụta ma bibie ọchịchị eluigwe ahụ. A pụghị imeri ya emeri, ọ ga-emezukwa nzube Jehova ji hiwe ya.—Ndị Hibru 12:28.

Alaeze Chineke nwere ndị a pụrụ ịtụkwasị obi na-anọchi anya ya n’ụwa. Olee otú anyị si mara nke a? Abụ Ọma 45:16 na-ekwu, sị: “Ị ga-edo . . . ndị isi n’ụwa nile.” Okwu ahụ bụ́ “ị” nke dị n’amụma a bụ Ọkpara Chineke. (Abụ Ọma 45:6, 7; Ndị Hibru 1:7, 8) Nke bụ́ na ọ bụ Jizọs Kraịst ga-eji aka ya họpụta ndị isi ahụ ga-abụ ndị nnọchianya ya. Anyị ji n’aka na ha ga-eji ikwesị ntụkwasị obi mee ihe ndị Jizọs gwara ha mee. Ọbụna taa, a na-akụziri ndị ikom ruru eru bụ́ ndị na-eje ozi dị ka ndị okenye ka ha ghara ‘ime ndị kwere ekwe ibe ha ka ha bụ ndị nwe ha,’ kama ka ha na-echebe ha, na-eme ka ha nwee ume ọhụrụ, ma na-akasi ha obi.—Matiu 20:25-28; Aịsaịa 32:2.

Alaeze ahụ ga-achị ndị ezi omume. Ha bụ ndị zuru okè na ndị ziri ezi n’anya Chineke. (Ilu 2:21, 22) Bible na-ekwu, sị: “Ndị dị umeala n’obi ga-enweta ala; ịba ụba nke udo ga-atọkwa ha ụtọ.” (Abụ Ọma 37:11) Ndị Alaeze ahụ ga-achị bụ ndị dị nwayọọ n’obi—ndị a pụrụ izi ihe na ndị dị umeala n’obi. Ihe kasị ha mkpa bụ ihe ndị metụtara ofufe ha na-efe Jehova. (Matiu 5:3) Ha chọrọ ime ihe ziri ezi, ha na-agbasokwa ntụziaka Chineke.

Iwu ndị na-achịkwa Alaeze Chineke dị elu karịa iwu ụmụ mmadụ. Ọ bụ Jehova Chineke n’onwe ya nyere iwu na ụkpụrụ ndị na-achịkwa Alaeze ahụ. Iwu ndị ahụ adịghị akpagide anyị akpagide, kama nke ahụ, ha na-abara anyị uru. (Abụ Ọma 19:7-11) Ọtụtụ ndị eritewelarị uru site n’ibi ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ ezi omume Jehova. Dị ka ihe atụ, di, nwunye, na ụmụ irube isi na ndụmọdụ ndị Bible nyere ha ga-eme ka ihe ka mma n’ezinụlọ anyị. (Ndị Efesọs 5:33–6:3) Mgbe anyị ṅara ntị n’iwu ahụ sịrị ka anyị ‘yikwasị onwe anyị ịhụnanya,’ mmekọrịta anyị na ndị ọzọ na-aka mma. (Ndị Kọlọsi 3:13, 14) Ka anyị na-etinye ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ n’ọrụ, anyị na-amụtakwa ịrụ ọrụ nke ọma na ile ego anya n’ụzọ ziri ezi. (Ilu 13:4; 1 Timoti 6:9, 10) Izere aṅụrụma, mmekọahụ rụrụ arụ, ụtaba, na ọgwụ ndị na-eri ahụ́ na-enyere anyị aka ichebe ahụ́ ike anyị.—Ilu 7:21-23; 23:29, 30; 2 Ndị Kọrint 7:1.

Alaeze Chineke bụ ọchịchị Chineke hiwere. Chineke na-atụ Eze ya—Mezaịa ahụ, bụ́ Jizọs Kraịst—na ndị nile ha na ya ga-eso chịa, anya n’aka ịhụ na e rubeere iwu ezi omume ya na ụkpụrụ ya ndị dabeere n’ịhụnanya isi. Ndị Alaeze ahụ ga-achị, nke gụnyere ndị nnọchianya ya nọ n’ụwa, ga-enwe obi ụtọ ibi ndụ kwekọrọ n’iwu Chineke. N’ihi ya, ihe kasị ndị ọchịchị ahụ na ndị Alaeze ahụ ga-achị mkpa bụ ime uche Chineke. Ya mere, Alaeze ahụ bụ ọchịchị Chineke n’ezie. Ọ ga-emezurịrị nzube e ji hiwe ya. Ma, olee mgbe Alaeze Chineke, bụ́kwa nke a maara dị ka Alaeze Mezaịa, ga-amalite ọchịchị ya?

Mgbe Alaeze ahụ Ga-amalite Ịchị

Ihe ga-enyere anyị aka ịghọta mgbe ọchịchị Alaeze ahụ ga-amalite dị n’okwu Jizọs kwuru. O kwuru, sị: “Ndị mba ọzọ ga-azọ Jeruselem ụkwụ, ruo mgbe oge a kara aka nke ndị mba ọzọ ga-ezu.” (Luk 21:24) Jeruselem bụ nanị obodo Chineke kpọrọ nke ya n’ụwa nile. (1 Ndị Eze 11:36; Matiu 5:35) Ọ bụ isi obodo nke alaeze Chineke nke dị n’ụwa. Ndị mba ọzọ ga-azọ obodo ahụ ụkwụ n’ihi na, ruo nwa oge, ọchịchị ụmụ mmadụ ga-anọchi ọchịchị Chineke na-achị ndị ya. Olee mgbe nke a ga-amalite?

A gwara eze ikpeazụ ga-achị n’ocheeze Jehova dị na Jeruselem, sị: “Wezụga ákwà nkuku isi ahụ, bupụ okpueze ahụ: . . . ọ gaghị adị ruo mgbe ọ ga-abịa, bụ́ onye o ruru aka; M ga-ewerekwa ya nye ya.” (Ezikiel 21:25-27) A gaje ikpupụ okpueze n’isi eze ahụ ma kwụsịtụ ọchịchị Chineke na-achị ndị Ya. Nke a mere n’afọ 607 T.O.A. mgbe ndị Babilọn bibiri Jeruselem. ‘N’oge a kara aka’ nke gaje isochi ya, Chineke agaghịkwa enwe ọchịchị na-anọchị anya ọchịchị ya n’elu ala. Ọ bụ nanị ná ngwụsị nke oge ndị ahụ ka Jehova ga-enye onye ahụ “o ruru aka”—bụ́ Jizọs Kraịst—ike ọchịchị. Olee otú oge ahụ ga-aha n’ogologo?

Otu amụma dị n’akwụkwọ Bible bụ́ Daniel kwuru, sị: “Gbutuonụ osisi ahụ, mebie ya; ma hapụnụ ogwe mkpọrọgwụ ya nile n’ala, ọbụna n’agbụ e kere ya nke ígwè na ọla . . . ruo mgbe oge asaa ga-agabiga n’isi ya.” (Daniel 4:23) Anyị ga-ahụ na “oge asaa” ahụ e kwuru banyere ya n’ebe a na “oge a kara aka nke ndị mba ọzọ” hà n’ogologo.

Na Bible, a na-eji osisi edochi anya ndị mmadụ, ndị ọchịchị, na alaeze mgbe ụfọdụ. (Abụ Ọma 1:3; Jeremaịa 17:7, 8; Ezikiel, isi 31) A pụrụ ịhụ osisi ihe atụ ahụ “anya site ná nsọtụ nke ụwa nke a nile.” (Daniel 4:11) Ya mere, ọchịchị nke osisi ahụ a gaje igbutu egbutu ma kee agbụ nọchiri anya ya ruru “ná nsọtụ ụwa,” bụ́ nke gụnyere alaeze nile nke ụmụ mmadụ. (Daniel 4:17, 20, 22) N’ihi ya, osisi ahụ nọchiri anya ọchịchị kasị elu nke Chineke, karịsịa ma a bịa n’otú o si metụta ụwa. Alaeze ahụ Jehova hiwere ịchị mba Izrel nọchiri anya ọchịchị a ruo oge ụfọdụ. E gbuturu osisi ihe atụ ahụ, e jikwa agbụ ígwè na ọla kee úkwù ya ka o wee ghara itolite. Nke a gosiri na ọchịchị ahụ nke nọchiri anya ọchịchị Chineke n’elu ala ga-akwụsị ịchị, bụ́ nke mere n’afọ 607 T.O.A.—ma ọ bụghị ruo mgbe ebighị ebi. A ga-eke osisi ahụ agbụ ruo mgbe “oge asaa” gasịrị. Mgbe oge ahụ gwụrụ, Jehova ga-enye Jizọs Kraịst, bụ́ onye o ruuru, ọchịchị. O doro anya na okwu ndị ahụ bụ́ “oge asaa” na “oge a kara aka nke ndị mba ọzọ” na-ekwu banyere otu oge.

Bible nyeere anyị aka ịghọta otú “oge asaa” ahụ hà n’ogologo. O gosiri na puku ụbọchị na narị ụbọchị abụọ na iri isii na “otu oge na oge abụọ na ọkara otu oge” hà n’ogologo—nke bụ́ “oge” atọ na ọkara. (Mkpughe 12:6, 14) Nke a pụtara na a gbakọta oge atọ na ọkara ahụ ụzọ abụọ, nke bụ́ oge asaa, ọ ga-apụta puku ụbọchị abụọ, narị ụbọchị ise na iri abụọ.

Ọ bụrụ na anyị amalite n’afọ 607 T.O.A. gụwa puku ụbọchị abụọ, narị ụbọchị ise na iri abụọ nkịtị, ọ ga-akwụsị n’afọ 600 T.O.A. Ma, oge asaa ahụ karịrị nnọọ otú ahụ n’ogologo. Oge ahụ ka na-aga n’ihu mgbe Jizọs kwuru banyere “oge a kara aka nke ndị mba ọzọ.” N’ihi ya, oge asaa ahụ bụ oge amụma. Ebe ọ dị otú ahụ, anyị aghaghị iji ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ mee ihe, nke bụ́: “Otu ụbọchị otu afọ.” (Ọnụ Ọgụgụ 14:34; Ezikiel 4:6) Ọ bụrụ na e si otú ahụ gụọ ya, oge asaa ahụ Chineke ga-ahapụ ndị ọchịchị bụ́ mmadụ ka ha na-achị ụwa ga-abụ puku afọ abụọ, narị afọ ise na iri abụọ. Ọ bụrụ na anyị amalite n’afọ 607 T.O.A. gụwa puku afọ abụọ, narị afọ ise na iri abụọ, ọ ga-eduga anyị n’afọ 1914 O.A. Ọ bụ n’afọ ahụ ka “oge a kara aka nke ndị mba ọzọ,” ma ọ bụ oge asaa, gwụsịrị. Nke ahụ pụtara na Jizọs Kraịst malitere ịchị dị ka Eze nke Alaeze Chineke n’afọ 1914.

“Ka Alaeze Gị Bịa”

Ebe ọ bụ na e hiwelarị Alaeze Mezaịa ahụ n’eluigwe, ànyị ka kwesịrị ịnọ na-ekpe ekpere ka ọ bịa, dị ka Jizọs ziri anyị n’ekpere nlereanya ahụ? (Matiu 6:9, 10) Ee. Arịrịọ ahụ kwesịrị ekwesị, ọ ka bakwara nnọọ uru. Alaeze Chineke ka ga-achị ụwa n’ụzọ zuru ezu.

Lee ka ụmụ mmadụ na-ekwesị ntụkwasị obi ga-esi nweta ọtụtụ ngọzi mgbe nke ahụ mezuru! Bible na-ekwu, sị: “Chineke n’onwe ya ga-anọnyekwara ha. Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri ọ bụla n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru újú ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ. Ihe mbụ agabigawo.” (Mkpughe 21:3, 4) N’oge ahụ, “onye obibi ya agaghị asị, Ana m arịa ọrịa.” (Aịsaịa 33:24) Ndị mere ihe Chineke na-achọ ga-adị ndụ ebighị ebi. (Jọn 17:3) Ka anyị na-eche mmezu nke amụma ndị a na amụma Bible ndị ọzọ magburu onwe ha, ka anyị ‘nọgide buru ụzọ na-achọ alaeze ahụ na ezi omume Chineke.’—Matiu 6:33.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 10 Eze Devid nke Izrel oge ochie naara ndị Jebus ebe e wusiri ike nke Ugwu Zaịọn elu ala ma mee ya isi obodo ya. (2 Samuel 5:6, 7, 9) O bufekwara Igbe nsọ ahụ n’ebe ahụ. (2 Samuel 6:17) Ebe ọ bụ na Igbe ahụ na-anọchi anya ọnụnọ Jehova, e weere Zaịọn dị ka ebe obibi Chineke, nke mere ka ọ bụrụ ihe atụ dabara adaba nke eluigwe.—Ọpụpụ 25:22; Levitikọs 16:2; Abụ Ọma 9:11; Mkpughe 11:19.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 4]

Jehova ahọpụtawo Jizọs Kraịst ịbụ Eze nke Alaeze Ya

[Ihe Osise/Foto ndị dị na peeji 6]

Afọ 2,520

October 607 ◀ T.O.A. O.A. ▸ October 1914

Afọ 606 na ọnwa atọ Afọ 1,913 na ọnwa itoolu

“Oge a kara aka nke ndị mba ọzọ” malitere na 607 T.O.A. ma gwụsịa na 1914 O.A.

[Foto dị na peeji nke 7]

Ndị Alaeze Chineke ga-achị n’elu ala ga-enweta ọtụtụ ngọzi