Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Gịnị ka ọgbakọ kwesịrị ime ma ọ bụrụ na Onye Kraịst na-akwọ ụgbọala enwee ihe mberede nke ndị mmadụ nwụrụ na ya?

Ọ dị ọgbakọ mkpa ịchọpụta ma ikpe ọbara ọ̀ mara ọkwọ ụgbọala ahụ n’ihi na ọ dị ọgbakọ mkpa izere ikpe ọmụma ọbara n’ihi ihe otu onye metara. (Deuterọnọmi 21:1-9; 22:8) Ikpe ọbara pụrụ ịma ọkwọ ụgbọala ji ụgbọala gbuo mmadụ ma ọ bụrụ na o jighị ihe kpọrọ ihe ma ọ bụ na ọ kpachaara anya daa otu n’ime iwu okporo ụzọ ndị Siza nyere. (Mak 12:14) Ma, ọ dị ihe ndị ọzọ a ga-atụle.

A ga-ekpe onye gburu mmadụ nke gbagara n’otu n’ime obodo mgbaba ndị dị n’Izrel ikpe. Ọ bụrụ na a chọpụta na o gburu onye ahụ n’amaghị ama, a ga-ekwe ka ọ nọgide n’obodo ahụ n’enweghị ihe onye ọ́bọ̀ ọbara ga-eme ya. (Ọnụ Ọgụgụ 35:6-25) N’ihi ya, ọ bụrụ na Onye Kraịst ejiri ụgbọala gbuo mmadụ, ndị okenye kwesịrị ịchọpụta ma ọ̀ dị ụzọ ọ bụla ikpe ọbara si ma ya. Otú ndị ọchịchị si lee okwu ahụ anya na ihe ụlọikpe kpebiri agaghị ekpebicha ihe ọgbakọ ga-eme.

Dị ka ihe atụ, ụlọikpe pụrụ ịma onye ahụ ikpe n’ihi ịda iwu okporo ụzọ, ma ndị okenye nyochara okwu ahụ pụrụ ikpebi na ikpe ọbara amaghị ya n’ihi na o nwechaghị ihe o nwere ike ime iji gbochie ihe mberede ahụ. Ma, ya bụrụgodị na ụlọikpe ekpebie na ikpe amaghị nwanna ahụ, ndị okenye ahụ pụrụ ikpebi na ikpe ọbara mara ya n’ezie.

Mkpebi ndị okenye nyochara okwu ahụ ga-eme kwesịrị ịdabere n’Akwụkwọ Nsọ nakwa n’ihe àmà ndị doro nnọọ anya e nwere—ihe nwanna ahụ na-akwọ ụgbọala kwetara na ya mere ma ọ bụ ihe ndị akaebe abụọ a pụrụ ịtụkwasị obi kwuru. (Deuterọnọmi 17:6; Matiu 18:15, 16) Ọ bụrụ na ndị okenye ahụ achọpụta na ikpe ọbara mara ya, e kwesịrị ihiwere ya òtù ikpe. Ọ bụrụ na òtù ikpe ahụ achọpụta na onye a ikpe ọbara mara gosiri nchegharị, ha ga-eji Akwụkwọ Nsọ nye ya ịdọ aka ná ntị kwesịrị ekwesị, ọ gaghịkwa eru eru inwe ihe ùgwù n’ọgbakọ. Ọ gakwaghị abụ okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi. A ga-egbochikwa ya ịrụ ọrụ ndị ọzọ n’ọgbakọ. Ọ ga-azakwa Chineke ajụjụ n’ihi akpachapụghị anya na n’ihi ejighị ihe kpọrọ ihe bụ́ nke kpatara ihe mberede ahụ mmadụ nwụrụ na ya.—Ndị Galeshia 6:5, 7.

Dị ka ihe atụ: Ya bụrụ na ọnọdụ ihu igwe adịghị mma n’oge ahụ ihe mberede ahụ mere, nwanna kwọ ụgbọala ahụ kwesịrị ịkpachakwuru anya. Ọ bụrụ na ụra na-atụ ya, o kwesịrị nnọọ ịkwụsị ma hipụ ụra ahụ, ma ọ bụ ya ahapụ onye ọzọ ka ọ nyata ụgbọala ahụ.

Gịnị ma ọ bụrụ na onye ọkwọ ụgbọala a kwọrọ ụgbọala ọnwụ ọnwụ? Ọ bụrụ na Onye Kraịst ọ bụla agbafee kilomita ole iwu kwuru ka a na-agba n’otu awa, ọ pụtara na ọ ‘kwụghachighị Siza ihe nke Siza.’ O gosikwara na o jighị ịdị nsọ nke ndụ kpọrọ ihe, n’ihi na nke ahụ nwere ike ịkpata ihe mberede okporo ụzọ nke nwere ike igbu mmadụ. (Matiu 22:21) Ka anyị tụlekwuo ihe ọzọ banyere okwu a. Olee ụdị ihe nlereanya okenye ga na-esetịpụrụ ìgwè atụrụ ọ na-elekọta ma ọ bụrụ na o jighị iwu okporo ụzọ ndị Siza nyere kpọrọ ihe ma ọ bụ na ọ na-ama ụma ada ha?—1 Pita 5:3.

Ndị Kraịst ekwesịghị ịgwa Ndị Kraịst ibe ha na ha ga-anọrịrị n’ebe dị otú a nakwa n’oge dị otú a, bụ́ nke doro anya na ọ gaghị ekwe omume ma ọ bụrụ na onye ahụ agbafeghị ihe iwu kwuru ka ụgbọala na-agba. Otú ọ dị, ihe ọ chọrọ mmadụ n’aka ọtụtụ mgbe bụ ịmalite nnọọ n’oge ma ọ bụ iyigharị ihe mmadụ dokwara ime iji nwee oge zuru ezu ọ ga-eji gaa. Ọ bụrụ na Onye Kraịst emee otú ahụ, ọ ga-eme ka ọ ghara ịgba ọnwụ ọnwụ otú ọ na-ekwesịghị ịgba, ọ ga-emekwa ka o rube isi n’iwu okporo ụzọ nke ndị ọchịchị, ma ọ bụ “ikike ndị ka elu,” nyere. (Ndị Rom 13:1, 5) Nke a ga-eme ka onye na-akwọ ụgbọala zere ihe mberede okporo ụzọ nke mmadụ nwere ike ịnwụ na ya bụ́ nke nwere ike ime ka ikpe ọbara ma ya. Ọ ga-emekwa ka o setịpụ ezi ihe nlereanya ma nọgide na-enwe akọnuche dị ọcha.—1 Pita 3:16.