Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Inweta Obi Ike Site n’Inwe Okwukwe na Ịtụ Egwu Chineke

Inweta Obi Ike Site n’Inwe Okwukwe na Ịtụ Egwu Chineke

Inweta Obi Ike Site n’Inwe Okwukwe na Ịtụ Egwu Chineke

“Dị ike, nweekwa ume . . . n’ihi na Jehova, bụ́ Chineke gị, nọnyeere gị.”—JOSHUA 1:9.

1, 2. (a) N’anya mmadụ, Izrel ọ̀ ga-emerili ndị Kenan n’agha? (b) Oleekwa otú e si mesie Jọshụa obi ike?

NA 1473 T.O.A., mba Izrel dị njikere ịbanye n’Ala Nkwa ahụ. Mozis chetaara ha ihe ịma aka ha ga-eche ihu. Ọ sịrị: “Gị onwe gị na-agabiga Jọdan taa, ịba ka i wee nweta mba dị iche iche dị ukwuu dịkwa ike karịa gị, obodo dị iche iche dị ukwuu nke e wusikwara ike ruo eluigwe; òtù ndị dị ukwuu dịkwa ogologo, bụ́ ụmụ ndị Anak, ndị gị onwe gị . . . nụwokwara okwu banyere ha, sị, Ònye ga-eguzo onwe ya n’ihu ụmụ Anak.” (Deuterọnọmi 9:1, 2) Ee, a ma ndị dike a ama. Tụkwasị na nke ahụ, ndị agha ndị Kenan nwere ngwa agha ndị bụ́ ọkpọka, dị ka ịnyịnya na ụgbọ ịnyịnya ndị wil ha bụ ígwè.—Ndị Ikpe 4:13.

2 Ma mba Izrel ha na-aga ibuso agha bụbu ndị ohu, ha ka nọchakwara nnọọ afọ iri anọ n’ịkpa. N’ihi ya, n’anya mmadụ, o yighị ka mba Izrel ga-achịta ájá n’agha ahụ. N’agbanyeghị nke ahụ, Mozis nwere okwukwe; o ji anya nke uche ‘hụ’ Jehova ka ọ na-edu ha. (Ndị Hibru 11:27) Mozis gwara ndị Izrel, sị: “Jehova, bụ́ Chineke gị, Ya onwe ya bụ onye na-agabiga n’ihu gị . . . Ya onwe ya ga-ekpochapụ ha, Ya onwe ya ga-emekwa ka ha huru ala n’ihu gị.” (Deuterọnọmi 9:3; Abụ Ọma 33:16, 17) Mgbe Mozis nwụsịrị, Jehova mesighachiri Jọshụa obi ike na Ya ga-anọgide na-akwado ya. Ọ gwara ya, sị: “Bilie, gabiga Jọdan nke a, gị onwe gị, na ndị nke a nile, ruo ala ahụ nke Mụ onwe m na-enye ha, bụ́ ụmụ Izrel. Ọ dịghị nwoke ọ bụla ga-eguzo onwe ya n’ihu gị ụbọchị nile nke ndụ gị: dị ka M nọnyeere Mozis, otú a ka M ga-anọnyere gị.”—Joshua 1:2, 5.

3. Gịnị nyeere Jọshụa aka inwe okwukwe na obi ike?

3 Iji nweta nkwado na nduzi Jehova, Jọshụa aghaghị ịgụ Iwu Chineke, tụgharịa uche na ya, ma mee ihe e dere na ya. Jehova kwuru, sị: “Mgbe ahụ ka ị ga-eme ka ije gị gaa nke ọma, mgbe ahụ ị ga-enwekwa uche. Ènyeghị m gị iwu? Dị ike, nweekwa ume; amala jijiji, atụkwala ụjọ: n’ihi na Jehova, bụ́ Chineke gị, nọnyeere gị n’ebe ọ bụla ị na-eje.” (Joshua 1:8, 9) Jọshụa nwere obi ike, dị ike, ma nwee ihe ịga nke ọma n’ihi na o gere Chineke ntị. Otú ọ dị, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị ya na ha bikọrọ ndụ egeghị ntị. N’ihi ya, ha enweghị ihe ịga nke ọma, ha nwụkwara n’ịkpa ahụ.

Ndị Na-enweghị Okwukwe na Obi Ike

4, 5. (a) Olee otú àgwà ndị nledo iri ahụ si dị iche na nke Jọshụa na Keleb? (b) Gịnị ka Jehova kwuru banyere okwukwe nke mba ahụ na-enweghị?

4 Ná mgbe mbụ ụmụ Izrel rutere Kenan nso n’afọ iri anọ gara aga tupu ugbu a ha chọrọ ịbanye n’ime ya, Mozis zigara ndị ikom iri na abụọ na Kenan ịga nyochaa ala ahụ. Mmadụ iri n’ime ha ji ụjọ lọta. Ha ji oké olu kwuo, sị: “Ndị nile anyị hụrụ n’etiti ya bụ ndị ikom toro ogologo. N’ebe ahụ ka anyị hụkwara ndị Nefilim, bụ́ ụmụ Anak, ndị sitere ná ndị Nefilim: anyị wee dị n’anya onwe anyị dị ka ogugu, ọ bụkwa otú a ka anyị dị n’anya ha.” “Ndị nile” bi n’ebe ahụ hà bụcha ndị dike ka ọ̀ bụ nanị ndị Anakịm bụ ndị dike? Ọ bụghị ha nile bụ ndị dike. Ndị Anakịm hà sitere n’agbụrụ ndị Nefilim bụ́ ndị dịrị ndụ tupu Iju Mmiri ahụ? Ọ dịghị ma ọlị. Ma n’ihi ụgha a ndị nledo ahụ ghara, egwu jidere ndị Izrel nile. Ọbụna ha chọwara ịlaghachi Ijipt, bụ́ ebe ha bụbu ndị ohu!—Ọnụ Ọgụgụ 13:31-14:4.

5 Otú ọ dị, abụọ n’ime ndị nledo ahụ, Jọshụa na Keleb, chọsiri ike ịbanye n’Ala Nkwa ahụ. Ha kwuru, sị: “Nri anyị ka [ndị Kenan] bụ: ihe nchegide ha ewezụgawo onwe ya n’ahụ́ ha, ma Jehova nọnyeere anyị: unu atụla egwu ha.” (Ọnụ Ọgụgụ 14:9) Jọshụa na Keleb ha na-atụ anya ihe na-apụghị ime eme? Ọ dịghị ma ọlị! Ha na ndị Izrel ndị ọzọ ejiwo anya ha hụ otú Jehova si menye Ijipt dị ike na chi ya dị iche iche ihere site n’iti ha Ihe Otiti Iri ahụ. Ha hụkwara ka Jehova si gbagbuo Fero na ụsụụ ndị agha ya n’Oké Osimiri Uhie. (Abụ Ọma 136:15) N’ụzọ doro anya, ndị nledo iri ahụ na ndị ọzọ gere ha ntị enweghị ihe mere ha ga-eji tụwa egwu. Jehova kwupụtara otú nke a si wute ya site n’ịjụ, sị: “Ruo ole mgbe ka ha na-agaghị ekwe na mụ, n’ihi ihe ịrịba ama nile nke M meworo n’etiti ha?”—Ọnụ Ọgụgụ 14:11.

6. N’ụzọ dị aṅaa ka obi ike na okwukwe si nwee njikọ, oleekwa otú nke a si apụta ìhè n’oge anyị a?

6 Jehova kwuru kpọmkwem ihe mere ndị Izrel ji kpaa ụdị àgwà a ha kpara. Egwu na-atụ ha gosiri na ha enweghị okwukwe. Ee, okwukwe na obi ike nwere njikọ chiri anya nke na Jọn onyeozi dere banyere Ndị Kraịst na agha ime mmụọ ha na-alụ, sị: “Nke a bụkwa mmeri ahụ nke meriworo ụwa, okwukwe anyị.” (1 Jọn 5:4) Taa, okwukwe yiri nke Jọshụa na Keleb emewo ka ihe karịrị nde Ndịàmà Jehova isii, ma ndị na-eto eto ma ndị agadi, ma ndị dị ike ma ndị na-adịghị ike, na-ekwusa ozi ọma Alaeze ahụ n’ụwa nile. Ọ dịbeghị onye iro nweworo ike ime ka ụsụụ ndị agha a nwere obi ike mechie ọnụ.—Ndị Rom 8:31.

Unu ‘Asụlala Azụ’

7. Gịnị ka ‘ịsụla azụ’ pụtara?

7 Ndị ohu Jehova taa na-eji obi ike ekwusa ozi ọma n’ihi na ha kweere ihe Pọl onyeozi kwuru, bụ́ onye dere, sị: “Anyị abụghị ụdị ndị na-asụla azụ gaa ná mbibi, kama ụdị ndị na-enwe okwukwe gaa n’ichebe mkpụrụ obi ndụ.” (Ndị Hibru 10:39) Dị ka Pọl kwuru, ‘ịsụla azụ’ apụtaghị ịtụtụ ụjọ, n’ihi na ọtụtụ ndị ohu Jehova kwesịrị ntụkwasị obi n’oge gara nwere mgbe ha tụtụrụ ụjọ. (1 Samuel 21:12; 1 Ndị Eze 19:1-4) Kama nke ahụ, dị ka otu akwụkwọ na-akọwa okwu ndị e ji mee ihe na Bible na-ekwu, ọ pụtara “ịla azụ, isepụ aka n’ihe” “ịghara ijisi eziokwu ahụ ike.” Ọ gbakwụnyere na ‘ịsụla azụ’ pụrụ ịbụ okwu yiri “ịtọtu àkwà ikuku ụgbọ mmiri, si otú ahụ mee ka ụgbọ jiri nwayọọ na-agba” ma a bịa n’ihe banyere ozi Chineke. N’ezie, ndị okwukwe ha siri ike adịghị eche echiche ‘ijiri ya nwayọọ’ mgbe ihe siiri ha ike—ma ihe isi ike ahụ ọ̀ bụ mkpagbu, ọrịa, ma ọ bụ ihe ndị ọzọ. Kama nke ahụ, ha na-anọgide na-ejere Jehova ozi ebe ha maara na ọ na-eche nnọọ banyere ha nakwa na ọ maara ebe ike ha ruru. (Abụ Ọma 55:22; 103:14) Ì nwere okwukwe dị otú ahụ?

8, 9. (a) Olee otú Jehova si mee ka okwukwe nke Ndị Kraịst narị afọ mbụ sikwuo ike? (b) Gịnị ka anyị pụrụ ime iji mee ka okwukwe anyị sikwuo ike?

8 N’otu oge, ndịozi chere na ha chọkwuru okwukwe, n’ihi ya, ha rịọrọ Jizọs, sị: “Nyekwuo anyị okwukwe.” (Luk 17:5) E mezuru arịrịọ a ha ji ezi obi rịọ karịsịa na Pentikọst nke afọ 33 O.A., mgbe mmụọ nsọ e kwere ná nkwa dakwasịrị ndị na-eso ụzọ Jizọs ma mee ka ha ghọtakwuo Okwu Chineke na nzube ya. (Jọn 14:26; Ọrụ 2:1-4) Mgbe e mesịrị ka okwukwe ha sikwuo ike, ndị na-eso ụzọ Jizọs malitere ikwusara “ihe nile e kere eke dị n’okpuru eluigwe” ozi ọma ahụ n’agbanyeghị mmegide ha nwetara.—Ndị Kọlọsi 1:23; Ọrụ 1:8; 28:22.

9 Iji mee ka okwukwe anyị siwanye ike na iji nọgide na-ezisa ozi ọma ahụ, anyị aghaghị ịmụ Bible ma na-atụgharị uche n’ihe ndị Akwụkwọ Nsọ kwuru ma na-ekpe ekpere ka e nye anyị mmụọ nsọ. Ọ bụ nanị site n’ime ka eziokwu Chineke gbanye mkpọrọgwụ n’uche na n’obi anyị—dị ka Jọshụa, Keleb, na Ndị Kraịst narị afọ mbụ mere—ka anyị ga-enwe ike inwe ụdị okwukwe nke ga-eme ka anyị nwee obi ike dị anyị mkpa iji nọgide na-alụ agha ime mmụọ a ma nwee mmeri na ya.—Ndị Rom 10:17.

Okwukwe Karịrị Ikwere na Chineke Dị

10. Gịnị ka ezi okwukwe gụnyere?

10 Dị ka ndị nọgidesiri ike na-eme ezi ihe n’oge gara aga gosiri, ụdị okwukwe nke na-eme ka mmadụ nwee obi ike na ntachi obi karịrị nanị ikwere na Chineke dị. (Jems 2:19) Ọ chọrọ ka anyị mara na Jehova bụ onye dị adị ma tụkwasị ya obi kpamkpam. (Abụ Ọma 78:5-8; Ilu 3:5, 6) Ọ pụtara iji obi anyị nile kwere na ịṅa ntị n’iwu Chineke na ụkpụrụ ndị dị na ya bụ maka ọdịmma anyị. (Aịsaịa 48:17, 18) Okwukwe gụnyekwara inwe nnọọ obi ike na Jehova ga-emezu ihe nile o kwere ná nkwa ma ghọọ “onye na-akwụghachi ndị na-achọsi ya ike ụgwọ ọrụ.”—Ndị Hibru 11:1, 6; Aịsaịa 55:11.

11. N’ụzọ dị aṅaa ka e si gọzie Jọshụa na Keleb n’ihi okwukwe na obi ike ha?

11 Okwukwe dị otú a na-eto eto. Ọ na-eto ka anyị na-ebi ndụ kwekọrọ n’eziokwu ahụ, ‘na-edetụ’ uru ọ na-aba ire, ‘na-ahụ’ ka a zara ekpere anyị, ma, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, na-ahụ ka Jehova na-eduzi anyị ná ndụ. (Abụ Ọma 34:8; 1 Jọn 5:14, 15) O doro anya na okwukwe Jọshụa na Keleb siwanyere ike mgbe ha hụrụ ịdị mma Chineke. (Joshua 23:14) Tụlee isi ihe ndị a: Ha anwụghị ná njem ahụ were afọ iri anọ ha ji ụkwụ mee n’ọzara, dị nnọọ ka Chineke kwere ha ná nkwa. (Ọnụ Ọgụgụ 14:27-30; 32:11, 12) Ha keere òkè pụtara ìhè ná mmeri were afọ isii ha meriri Kenan. Ka e mesịrị, ha dịrị ogologo ndụ ma nwee ezi ahụ́ ike, ọbụna nwetakwa ihe nketa nke ha. N’ezie, Jehova na-agọzi ndị ji ikwesị ntụkwasị obi na obi ike na-ejere ya ozi.—Joshua 14:6, 9-14; 19:49, 50; 24:29.

12. Olee otú Jehova si eme ka ‘okwu ọnụ ya dị ukwuu’?

12 Obiọma Chineke nwere n’ebe Jọshụa na Keleb nọ na-echetara anyị ihe ọbụ abụ ahụ kwuru. Ọ sịrị: “I mewo ka okwu ọnụ Gị dị ukwuu n’elu aha Gị nile.” (Abụ Ọma 138:2) Mgbe Jehova ji aha ya kwe nkwa, mmezu nke nkwa ahụ ‘na-adị ukwuu’ n’ụdị na ọ na-akarị ihe anyị tụrụ anya ya. (Ndị Efesọs 3:20) Ee, ọ dịtụbeghị mgbe Jehova na-ala azụ n’imezu nkwa o kwere ‘ndị ihe ya na-atọ ha ụtọ.’—Abụ Ọma 37:3, 4.

Nwoke nke ‘Mere Ihe Dị Chineke Ezi Mma’

13, 14. N’ihi gịnị ka okwukwe na obi ike ji dị Ịnọk mkpa?

13 Anyị pụrụ ịmụta ọtụtụ ihe banyere okwukwe na obi ike site n’ịtụle ihe nlereanya nke onyeàmà ọzọ dịrị ndụ tupu oge Ndị Kraịst—Ịnọk. Ọbụna tupu ya amalite ibu amụma, eleghị anya, Ịnọk maara na a ga-ele okwukwe na obi ike ya ule. Olee otú o si mara? Ọ bụ n’ihi na Jehova adịwo mbụ kwuo n’ogige Iden na iro ga-adị n’etiti ndị na-ejere Chineke ozi na ndị na-ejere Setan bụ́ Ekwensu ozi. (Jenesis 3:15) Ịnọk makwa na iro a malitere ịdị kemgbe e kere mmadụ, mgbe Ken gburu nwanne ya bụ́ Ebel. N’ezie, nna ha, bụ́ Adam, biri ndụ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ narị afọ atọ na iri ka a mụsịrị Ịnọk.—Jenesis 5:3-18.

14 Otú ọ dị, n’agbanyeghị nke a, Ịnọk ji obi ike ‘soro ezi Chineke ahụ jegharịa’ ma katọọ “ihe nile na-awụ akpata oyi” nke ndị mmadụ kwuru megide Jehova. (Jenesis 5:22; Jud 14, 15) O doro anya na nkwado a Ịnọk kwadoro ezi ofufe mere ka o nwee ọtụtụ ndị iro, bụ́ nke tinyere ndụ ya n’ihe ize ndụ. N’ihi nke a, Jehova mere ka onye amụma ya ghara ịnụ ụfụ ọnwụ. Mgbe Jehova mesịrị ka Ịnọk mara “na o mewo ihe dị Chineke ezi mma,” Jehova si ná ndụ ‘wega’ ya n’ọnwụ, ikekwe mgbe ọ ka nọ n’ọhụụ.—Ndị Hibru 11:5, 13; Jenesis 5:24.

15. Ezi ihe nlereanya dị aṅaa ka Ịnọk setịpụụrụ ndị ohu Jehova taa?

15 Ozugbo Pọl kwusịrị banyere otú e si were Ịnọk gaa n’ọnwụ, o mesighachiri ike mkpa ọ dị inwe okwukwe. Ọ sịrị: “Ọzọkwa, ma okwukwe adịghị ọ gaghị ekwe omume ime ihe dị [Chineke] ezi mma.” (Ndị Hibru 11:6) Ee, inwe okwukwe mere ka Ịnọk nwee obi ike iso Jehova jegharịa nakwa iji kpọsaa ikpe Jehova gwa ụwa nke na-adịghị asọpụrụ Chineke. Ịnọk setịpụụrụ anyị ezi ihe nlereanya na nke a. Anyị nwere ọrụ yiri nke ahụ ịrụ n’ime ụwa nke na-emegide ezi ofufe na nke jupụtara n’ụdị ihe ọjọọ nile.—Abụ Ọma 92:7; Matiu 24:14; Mkpughe 12:17.

Obi Ike nke A Na-enweta Site n’Ịtụ Egwu Chineke

16, 17. Ònye bụ Obadaịa, n’ọnọdụ dịkwa aṅaa ka ọ chọtara onwe ya?

16 E wezụga okwukwe, ọ dị ihe ọzọ na-eme ka mmadụ nwee obi ike, ọ bụ egwu Chineke. Ka anyị tụlee ihe banyere otu nwoke na-atụ egwu Chineke bụ́ onye dịrị ndụ n’oge Ịlaịja onye amụma nakwa n’oge Eze Ehab nke chịrị alaeze ebe ugwu nke Izrel. N’oge ọchịchị Ehab, ndị bi n’alaeze ebe ugwu fere Bel n’ọ̀tụ̀tụ̀ a na-ahụtụbeghị mbụ. Ọbụna narị ndị amụma Bel anọ na iri ise na narị ndị amụma anọ nke ogidi nsọ, bụ́ ihe oyiyi nke akụkụ ahụ́ e ji enwe mmekọahụ, “na-eri ihe na tebụl Jezibel,” bụ́ nwunye Ehab.—1 Ndị Eze 16:30-33; 18:19.

17 Jezibel, bụ́ ajọ onye iro nke Jehova, gbalịrị ikpochapụ ndị na-efe Jehova ofufe ná mba ahụ. O gburu ụfọdụ ndị amụma Jehova ọbụna nwaa igbu Ịlaịja, bụ́ onye zọọrọ isi ya site n’ịgbaga n’ofe Jọdan mgbe Chineke gwara ya ka o mee otú ahụ. (1 Ndị Eze 17:1-3; 18:13) Cheedị otú ọ ga-esiwo sie ike ịnọgide na-efe Jehova n’alaeze ebe ugwu n’oge ahụ. Nke ka njọ bụ ma ọ bụrụ na ị na-arụ ọrụ n’obí eze. Nke ahụ bụ ọnọdụ Obadaịa na-atụ egwu Chineke, * bụ́ onye na-elekọta ezinụlọ Ehab, chọtara onwe ya.—1 Ndị Eze 18:3.

18. Olee ihe mere ka ofufe Obadaịa na-efe Jehova dịrị ịrịba ama?

18 Ihe ịrụ ụka adịghị ya na Obadaịa ji akọ na-efe Jehova. Ma n’agbanyeghị ihe chere ya ihu, ọ kwụsịghị ife Jehova ofufe. Ndị Eze nke mbụ isi 18 amaokwu nke 3 na-agwa anyị, sị: “Obadaịa na-atụ egwu Jehova nke ukwuu.” Ee, Obadaịa na-atụ egwu Chineke n’ụzọ dị ịrịba ama! Egwu ziri ezi a ọ na-atụ Chineke meziri ka o nwee nnọọ obi ike, bụ́ nke pụtara ìhè ozugbo Jezibel gbusịrị ndị amụma Jehova.

19. Gịnị ka Obadaịa mere bụ́ nke gosiri na o nwere obi ike?

19 Anyị na-agụ, sị: “O wee ruo, mgbe Jezibel bipụrụ ndị amụma Jehova, na Obadaịa chịịrị [narị ndị amụma, zoo ha, iri ise iri ise n’otu ọgba], were achịcha na mmiri zụọ ha.” (1 Ndị Eze 18:4) Dị ka ị maara, ịzụ otu narị ndị ikom na nzuzo bụ ọrụ dị nnọọ ize ndụ. Ọ bụghị nanị na Obadaịa ga na-agbalị ịhụ na Ehab na Jezibel ejideghị ya, kamakwa ọ ghaghị ịgbalị ịhụ na narị ndị amụma ụgha asatọ na iri ise, bụ́ ndị na-echu obí eze ka mmiri, ejideghị ya. E wezụga nke ahụ, ọtụtụ ndị na-efe chi ụgha ná mba ahụ, site n’onye ukwu ruo n’onye nta, ga-achọ ịgbabọ Obadaịa ma ha hụ ya iji zụrụ ihu ọma eze na nwunye ya. N’agbanyeghị ndị a nile na-efe chi ụgha juru n’obí eze, Obadaịa ji obi ike lekọta ndị amụma Jehova. Nke a gosiri n’ezie na ịtụ egwu Chineke pụrụ ime ka mmadụ nwee obi ike dị ukwuu.

20. Olee otú egwu Obadaịa na-atụ Chineke si nyere ya aka, oleekwa otú ihe nlereanya ya si enyere gị aka?

20 Ebe ọ bụ na Obadaịa gosipụtara na ya nwere obi ike site n’ịtụ egwu Chineke, ihe ịrụ ụka adịghị ya na Jehova chebere ya ka ndị iro ya ghara ijide ya. Ilu 29:25 na-ekwu, sị: “Egwu mmadụ na-eweta ọnyà: ma onye na-atụkwasị Jehova obi, a ga-eme ka ọ nọrọ n’elu.” Obadaịa abụghị mmụọ; egwu na-atụ ya ka a ghara ijide ya ma gbuo ya, dị nnọọ ka anyị ga-eme ma ọ bụrụ anyị. (1 Ndị Eze 18:7-9, 12) Ma, egwu ọ na-atụ Chineke mere ka o nwee obi ike nke nyeere ya aka ịghara ikwe ka egwu mmadụ gbochie ya ime ihe ziri ezi. Obadaịa bụụrụ anyị nile, karịsịa ndị na-efe Jehova n’ebe ọ dị ize ndụ ime otú ahụ, ezi ihe nlereanya. (Matiu 24:9) Ee, ka anyị nile nọgidesie ike na-ejere Jehova ozi “site n’egwu Chineke na ụjọ.”—Ndị Hibru 12:28.

21. Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

21 Okwukwe na egwu Chineke abụghị nanị àgwà ndị na-enyere mmadụ aka inwe obi ike; ịhụnanya pụrụ ime ka e mee nke a karị. Pọl dere, sị: “Chineke nyere anyị, ọ bụghị mmụọ nke ụjọ, kama nke ike na nke ịhụnanya na nke uche zuru okè.” (2 Timoti 1:7) N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-ahụ otú ịhụnanya pụrụ isi nyere anyị aka iji obi ike na-ejere Jehova ozi n’ụbọchị ndị a siri ike obibi.—2 Timoti 3:1.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 17 Ọ bụghị Obadaịa onye amụma.

Ị̀ Pụrụ Ịza?

• Gịnị nyeere Jọshụa na Keleb aka inwe obi ike?

• Gịnị ka ezi okwukwe gụnyere?

• Gịnị mere Ịnọk atụghị egwu mgbe ọ na-ekwusa ikpe ọmụma Chineke?

• Olee otú egwu Chineke si enyere mmadụ aka inwe obi ike?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 16, 17]

Jehova nyere Jọshụa iwu, sị: “Dị ike, nweekwa ume”

[Foto dị na peeji nke 18]

Obadaịa lekọtara ma chebe ndị amụma Chineke

[Foto ndị dị na peeji nke 19]

Ịnọk ji obi ike kwusaa okwu Chineke