Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Obi Ike nke Ịhụnanya Mere Ka O Sikwuo Ike

Obi Ike nke Ịhụnanya Mere Ka O Sikwuo Ike

Obi Ike nke Ịhụnanya Mere Ka O Sikwuo Ike

“Chineke nyere anyị, ọ bụghị mmụọ nke ụjọ, kama nke ike na nke ịhụnanya na nke uche zuru okè.”—2 TIMOTI 1:7.

1, 2. (a) Gịnị ka ịhụnanya pụrụ ịkpali mmadụ ime? (b) Olee otú obi ike Jizọs si pụọ iche?

OTU di na nwunye ka lụrụ ọhụrụ nọ na-egwu mmiri n’otu obodo dị n’ebe ọwụwa anyanwụ nke ụsọ oké osimiri Australia. Mgbe ha na-achọ igwupụta, otu nnukwu azụ shak chụụrụ nke nwanyị gawa. Nke nwoke mere ihe dị egwu site n’ịkwapụ nwunye ya ma nọchie. Mgbe a na-ekwu okwu olili nwoke ahụ, nwunye ya nọ na-ebe àkwà, sị, “Ọ nwụrụ n’ihi m.”

2 Ee, ịhụnanya pụrụ ịkpali ụmụ mmadụ iji obi ike eme ihe dị egwu. Jizọs Kraịst n’onwe ya kwuru, sị: “Ọ dịghị onye nwere ịhụnanya ka nke a ukwuu, na mmadụ ga-atọgbọ mkpụrụ obi ya n’ihi ndị enyi ya.” (Jọn 15:13) N’ihe na-erughị otu ụbọchị ka o kwusịrị nke ahụ, Jizọs nyere ndụ ya, ọ bụghị n’ihi otu onye, kama n’ihi ihe a kpọrọ mmadụ. (Matiu 20:28) Jizọs emeghị omume obi ike a, nke bụ́ inye ndụ ya, n’echebaraghị ya echiche. O buwo ụzọ mara na a ga-akwa ya emo, kparịa ya, kpee ya ikpe na-ezighị ezi, ma kpọgbuo ya n’elu osisi ịta ahụhụ. Ọbụna ọ kwadebere ndị na-eso ụzọ maka ihe ndị a ga-emenụ. Ọ gwara ha, sị: “Lee, anyị na-agbago Jeruselem, a ga-enyefekwa Nwa nke mmadụ n’aka ndị isi nchụàjà na ndị odeakwụkwọ, ha ga-amakwa ya ikpe ọnwụ, ha ga-enyefekwa ya n’aka ndị mba ọzọ, ha ga-ejikwa ya mee ihe ọchị, gbụọkwa ya ọnụ mmiri, pịakwa ya ihe ma gbuo ya.”—Mak 10:33, 34.

3. Olee ihe ndị nyeere Jizọs aka igosipụta obi ike pụrụ iche?

3 Olee ihe ndị mere ka Jizọs gosipụta obi ike pụrụ iche otú a? Okwukwe na egwu Chineke so n’ihe ndị mere nnọọ ka o mee otú ahụ. (Ndị Hibru 5:7; 12:2) Ma isi ihe mere o ji jiri obi ike dị otú ahụ mee ihe bụ ịhụnanya o nwere n’ebe Chineke na ụmụ mmadụ ibe ya nọ. (1 Jọn 3:16) Ọ bụrụ na anyị azụlite ịhụnanya dị otú ahụ na okwukwe na egwu Chineke, anyị onwe anyị pụkwara igosipụta ụdị obi ike a Kraịst gosipụtara. (Ndị Efesọs 5:2) Olee otú anyị pụrụ isi zụlite ịhụnanya dị otú ahụ? Anỵị aghaghị ịmatagodị Onye ịhụnanya dị otú ahụ na-esite n’aka ya.

“Ịhụnanya Sitere na Chineke”

4. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na ịhụnanya sitere na Jehova?

4 Jehova bụ ma ịhụnanya n’onwe ya ma Onye ịhụnanya sitere n’aka ya. Jọn onyeozi dere, sị: “Ndị m hụrụ n’anya, ka anyị nọgide na-ahụrịta ibe anyị n’anya, n’ihi na ịhụnanya sitere na Chineke, a mụwokwa onye ọ bụla na-ahụ n’anya site na Chineke, o nwekwara ihe ọmụma banyere Chineke. Onye na-adịghị ahụ n’anya amabeghị Chineke, n’ihi na Chineke bụ ịhụnanya.” (1 Jọn 4:7, 8) Ya mere, mmadụ pụrụ ịzụlite ịhụnanya yiri nke Chineke nanị ma ọ bụrụ na onye ahụ abịaruo Jehova nso site n’inweta ezi ihe ọmụma ma mee ihe kwekọrọ n’ihe ọmụma dị otú ahụ site n’iji obi ya dum na-erube isi.—Ndị Filipaị 1:9; Jems 4:8; 1 Jọn 5:3.

5, 6. Gịnị nyeere ụmụazụ Jizọs na narị afọ mbụ aka ịzụlite ịhụnanya yiri nke Kraịst?

5 N’ekpere ikpeazụ o so ndịozi ya iri na otu kwesịrị ntụkwasị obi kpee, Jizọs gosiri otú ịmara Chineke na inwewanye ịhụnanya si nwee njikọ. Ọ sịrị: “Emewokwa m ka ha mara aha gị, m ga-emekwa ka a mara ya, ka ịhụnanya ị hụrụ m wee dịrị n’ime ha, mụ na ha adịkwa n’otu.” (Jọn 17:26) Jizọs nyeere ndị na-eso ụzọ ya aka ịzụlite ụdị ịhụnanya dị n’etiti ya na Nna ya, na-egosi site n’okwu ọnụ na n’omume ihe aha Chineke nọchiri anya ya—àgwà Chineke ndị na-enweghị atụ. N’ihi ya, Jizọs kwuru, sị: “Onye hụrụ m ahụwokwa Nna m.”—Jọn 14:9, 10; 17:8.

6 Mmụọ nsọ Chineke na-enyere mmadụ aka ịzụlite ịhụnanya yiri nke Kraịst. (Ndị Galeshia 5:22) Mgbe Ndị Kraịst narị afọ mbụ nwetara mmụọ nsọ nke e kwere ha ná nkwa na Pentikọst nke afọ 33 O.A., ọ bụghị nanị na ha chetara ihe ndị Jizọs kụziiri ha kamakwa ha ghọtara ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ nke ọma. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na nghọta ha nwere mere ka ịhụnanya ha nwere n’ebe Chineke nọ sikwuo ike. (Jọn 14:26; 15:26) Gịnị si na ya pụta? Ha ji obi ike na ịnụ ọkụ n’obi kwusaa ozi ọma ahụ n’agbanyeghị na nke a tinyere ndụ ha n’ihe ize ndụ.—Ọrụ 5:28, 29.

Igosipụta Obi Ike na Ịhụnanya

7. Gịnị ka Pọl na Banabas zutere mgbe ha na-ejekọ ozi ala ọzọ ọnụ?

7 Pọl onyeozi dere, sị: “Chineke nyere anyị, ọ bụghị mmụọ nke ụjọ, kama nke ike na nke ịhụnanya na nke uche zuru okè.” (2 Timoti 1:7) Pọl kwuru ihe a n’ihi ahụmahụ o nwere n’onwe ya. Tụlee ahụhụ ya na Banabas tara mgbe ha na-ejekọ ozi ala ọzọ ọnụ. Ha kwusara ozi ọma n’ọtụtụ obodo, gụnyere Antiọk, Aịkoniọm, na Listra. N’obodo nke ọ bụla, ụfọdụ ndị ghọrọ ndị kwere ekwe, ma ndị ọzọ megidere ha n’ụzọ kpụ ọkụ n’ọnụ. (Ọrụ 13:2, 14, 45, 50; 14:1, 5) Na Listra, ìgwè ndị iwe ji tụrụ Pọl nkume ma hapụ ya mgbe ha chere na ọ nwụọla. “Otú ọ dị, mgbe ndị ahụ na-eso ụzọ gbara ya gburugburu, o biliri ma banye n’ime obodo. N’echi ya kwa, ya na Banabas gawara Dabe.”—Ọrụ 14:6, 19, 20.

8. Olee otú obi ike Pọl na Banabas gosipụtara si gosi na ha hụrụ ndị mmadụ n’anya nke ukwuu?

8 Mgbalị a e mere igbu Pọl ò menyere ya na Banabas egwu ma mee ka ha kwụsị ime nkwusa? Ọ dịghị ma ọlị! Mgbe ha ‘mesịrị ka ọtụtụ ndị bụrụ ndị na-eso ụzọ’ na Dabe, ha abụọ “laghachiri na Listra nakwa n’Aịkoniọm nakwa n’Antiọk.” N’ihi gịnị? Ọ bụ iji gbaa ndị ọhụrụ ahụ ume ịnọgide na-eme ka okwukwe ha sie ike. Pọl na Banabas kwuru, sị: “Anyị aghaghị ịbanye n’alaeze Chineke site n’ọtụtụ mkpagbu.” Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ihe nyeere ha aka inwe obi ike bụ ịhụnanya miri emi ha nwere n’ebe “obere ụmụ atụrụ” Kraịst nọ. (Ọrụ 14:21-23; Jọn 21:15-17) Mgbe ha họpụtasịrị ndị okenye na nke ọ bụla n’ọgbakọ ndị ahụ e hiwere ọhụrụ, Pọl na Banabas na-eso ha kpee ekpere ma ‘nyefee ha n’aka Jehova bụ́ onye ha kwerewooro na ya.’

9. Olee otú ndị okenye si Efesọs si gosi na ha hụrụ Pọl n’anya dị ka o si hụ ha?

9 Pọl nwere ịhụnanya dị ukwuu na obi ike bụ́ nke mere ka Ndị Kraịst narị afọ mbụ hụ ya n’anya nke ukwuu. Cheta ihe mere ná nzukọ ahụ Pọl na ndị okenye si Efesọs nwere, bụ́ ebe o jere ozi ruo afọ atọ ma nweta mmegide kpụ ọkụ n’ọnụ. (Ọrụ 20:17-31) Mgbe Pọl gbasịrị ha ume ịzụ ìgwè atụrụ nke Chineke gwara ha lekọtawa, o sooro ha sekpuru ala ma kpee ekpere. Mgbe ha kpesịrị ekpere, “ịkwa ákwá dị ukwuu dara n’etiti ha nile, ha dakwasịkwara Pọl n’olu ma susuo ya ọnụ n’ụzọ dị nro, n’ihi na okwu ahụ o kwuworo wutere ha karịsịa, bụ́ na ha anaghị aga ịhụ ihu ya ọzọ.” Leenụ ụdị ịhụnanya ụmụnna ndị a nwere n’ebe Pọl nọ! N’ezie, mgbe oge ruru ka Pọl na onye ozi ibe ya lawa, ha ‘dọpụrụ onwe ha adọpụ,’ ndị okenye ahụ ekweghị ahapụ ha ka ha laa.—Ọrụ 20:36–21:1.

10. Olee otú Ndịàmà Jehova siworo jiri obi ike gosipụta ịhụnanya ha nwere n’ebe ibe ha nọ?

10 Taa, a hụrụ ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị, ndị okenye ọgbakọ, na ọtụtụ ndị ọzọ n’anya nke ukwuu n’ihi obi ike ha ji elekọta atụrụ Jehova. Dị ka ihe atụ, ná mba ebe ndị agha obodo kpaworo aka ọjọọ ma ọ bụ ebe ndị a machibidoro ọrụ nkwusa iwu, ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na ndị nwunye ha na-etinye ndụ ha n’ihe ize ndụ iji gaa leta ọgbakọ dị iche iche. N’otu aka ahụ, ọtụtụ Ndịàmà atawo ahụhụ n’aka ndị ọchịchị aka ike na ndị òtù ha n’ihi na ha ekweghị ekwu ebe Ndịàmà ibe ha nọ ma ọ bụ kwuo ebe ha si enweta nri ime mmụọ. A kpagbuwo ọtụtụ puku ndị ọzọ, mekpọọ ha ọnụ, ọbụna gbuo ha n’ihi na ha ekweghị akwụsị ikwusa ozi ọma nakwa n’ihi na ha ekweghị akwụsị iso ndị kwere ekwe ibe ha na-aga ọmụmụ ihe Ndị Kraịst. (Ọrụ 5:28, 29; Ndị Hibru 10:24, 25) Ka anyị ṅomie okwukwe na ịhụnanya nke ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị ndị dị otú ahụ nwere obi ike!—1 Ndị Tesalonaịka 1:6.

Unu Ekwela Ka Ịhụnanya Unu Jụọ Oyi

11. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka Setan si ebuso ndị ohu Jehova agha ime mmụọ, gịnịkwa ka nke a chọrọ ha n’aka?

11 Mgbe e si n’eluigwe chụda Setan ọ nọ na-ewesa ndị ohu Jehova iwe ọkụ n’ihi na ha ‘na-edebe ihe ndị Chineke nyere n’iwu ma na-agba àmà banyere Jizọs.’ (Mkpughe 12:9, 17) Otu n’ime ụzọ ndị Ekwensu ji eme ihe bụ mkpagbu. Otú ọ dị, atụmatụ a na-aghọkarị ya ahịa n’ihi na ọ na-eme ka ndị Chineke dịkwuo n’otu n’ihi ịhụnanya ha nwere n’ebe Ndị Kraịst ibe ha nọ ma na-akpali ọtụtụ n’ime ha ijikwu ịnụ ọkụ n’obi na-ejere Jehova ozi. Ụzọ ọzọ Setan si eme ihe bụ ime ka anyị nwee ọchịchọ ime mmehie. Iguzogide nke a chọrọ ụdị obi ike pụrụ iche n’ihi na ihe anyị na-alụso ọgụ dị n’ime anyị, ya bụ, anyị na-alụ ọgụ megide ọchịchọ ndị na-ezighị ezi ndị dị n’ime obi anyị ‘nke dị aghụghọ.’—Jeremaịa 17:9; Jems 1:14, 15.

12. Olee otú Setan si eji “mmụọ nke ụwa” eme ihe iji mee ka ịhụnanya anyị nwere n’ebe Chineke nọ jụọ oyi?

12 Setan nwekwara ngwá agha ọzọ dị egwu o ji eme ihe—“mmụọ nke ụwa,” ya bụ, ọchịchọ ya zuru ebe nile bụ́ nke na-emegide nnọọ mmụọ nsọ Chineke. (1 Ndị Kọrịnt 2:12) Mmụọ nke ụwa na-eme ka ndị mmadụ na-enwe anyaukwu ma na-ahụ ihe onwunwe n’anya, ya bụ, “ọchịchọ nke anya.” (1 Jọn 2:16; 1 Timoti 6:9, 10) Ọ bụ ezie na ihe onwunwe na ego adịghị njọ n’onwe ha, ọ bụrụ na anyị ahụ ha n’anya karịa ka anyị hụrụ Chineke, nke ahụ ga-apụta na Setan emeriela anyị. Ike ma ọ bụ “ikike” nke mmụọ nke ụwa na-apụta ìhè n’otú o si akpali ụmụ mmadụ inwe ọchịchọ ime mmehie, otú o si dị aghụghọ, otú o si esi ike iguzogide ya, nakwa otú o si jupụta ebe nile dị ka ikuku. Ekwela ka mmụọ nke ụwa mebie obi gị!—Ndị Efesọs 2:2, 3; Ilu 4:23.

13. Olee otú a pụrụ isi lee anyị ule ma ànyị nwekwara obi ike ịnọgide na-eme ihe ziri ezi?

13 Otú ọ dị, iji guzogide ma jụ mmụọ nke ụwa a jọgburu onwe ya, anyị aghaghị ịkata obi ịnọgide na-eme omume ọma. Dị ka ihe atụ, ọ chọrọ obi ike iji si n’ebe a na-egosi sinima pụọ ma ọ bụ gbanyụọ televishọn ma ọ bụ kọmputa mgbe e gosiwara ihe ndị rụrụ arụ. Ọ chọrọ obi ike iji ghara ikwe ka ndị ọgbọ duba anyị n’itinye aka n’ihe ọjọọ, nakwa iji zere mkpakọrịta ọjọọ. N’otu aka ahụ, ọ chọrọ obi ike iji nọgide na-eme ihe kwekọrọ n’iwu na ụkpụrụ Chineke n’agbanyeghị emo ụmụ akwụkwọ ibe anyị, ndị ọrụ ibe anyị, ndị agbata obi anyị, ma ọ bụ ndị ikwu anyị pụrụ ịkwa anyị.—1 Ndị Kọrịnt 15:33; 1 Jọn 5:19.

14. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na e nwere otú anyị si emetụ omume ka ndị nwere mmụọ nke ụwa?

14 N’ihi ya, ọ dị oké mkpa ka anyị mee ka ịhụnanya anyị nwere n’ebe Chineke na ụmụnna anyị nọ sie ike. Wepụta oge tụlee ihe mgbaru ọsọ gị na ụzọ ndụ gị iji hụ ma ò nwere otú isi emetụ omume ka onye nwere mmụọ nke ụwa. Ọ bụrụ na e nwere, rịọ Jehova ka o nye gị obi ike iji mee ka mmụọ ahụ hapụ gị ma ghara ịbịaghachi. Jehova agaghị eleghara ekpere dị otú ahụ sitere n’obi anya. (Abụ Ọma 51:17) Tụkwasị na nke ahụ, mmụọ ya ka nnọọ mmụọ nke ụwa ike.—1 Jọn 4:4.

Iji Obi Ike Na-anagide Ihe Isi Ike Ndị Bịara Anyị

15, 16. Olee otú ịhụnanya yiri nke Kraịst pụrụ isi nyere anyị aka ịnagide ihe isi ike? Nye ihe atụ.

15 Ihe ịma aka ndị ọzọ ndị ohu Jehova pụrụ iche ihu gụnyere ihe ndị ha na ezughị okè na ime agadi so aga, bụ́ ndị na-agụnyekarị ọrịa, ịghara inwe ike imeli ihe ụfọdụ ha na-emebu, ịda mbà n’obi, na ọtụtụ nsogbu ndị ọzọ. (Ndị Rom 8:22) Ịhụnanya yiri nke Kraịst pụrụ inyere anyị aka ịnagide ihe isi ike ndị a. Tụlee ihe banyere Namangolwa, bụ́ onye a zụlitere n’ezinụlọ Ndị Kraịst na Zambia. Mgbe ọ dị afọ abụọ, Namangolwa nwere nkwarụ. O kwuru, sị: “Ihere na-eme m, m na-eche na ọdịdị m ga na-eju ndị mmadụ anya. Ma ụmụnna m nyeere m aka ịghara ikwe ka nke ahụ na-enye m nsogbu n’obi. N’ihi ya, ihere kwụsịrị ime m, ka oge na-agakwa, e mere m baptizim.”

16 Ọ bụ ezie na Namangolwa nwere oche nkwagharị, ọ na-egberekarị igbe agafe n’ala uzuzu nke ruru unyí. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ na-arụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka ọ dịkarịa ala ọnwa abụọ n’afọ ọ bụla. Otu onye nwe ụlọ bere ákwá mgbe Namangolwa gbachaara ya àmà. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na okwukwe na obi ike nke nwanna anyị nwanyị a metụrụ ya n’ahụ́ nke ukwuu. Ihe gosiri na Jehova gọziri mgbalị Namangolwa n’ụzọ dị ukwuu bụ na e meela mmadụ ise n’ime ndị ọ na-amụrụ Bible baptizim, otu n’ime ha na-ejekwa ozi dị ka okenye ọgbakọ. O kwuru, sị: “Ụkwụ na-egbukarị m mgbu nke ukwuu ma adịghị m ekwe ka nke ahụ kwụsị m ime nkwusa.” Nwanna nwanyị a bụ otu n’ime ọtụtụ Ndịàmà e nwere n’ụwa nile bụ́ ndị ahụ́ na-ezuchaghị okè ma ha dị ike n’ụzọ ime mmụọ n’ihi ịhụnanya ha nwere n’ebe Chineke na ndị agbata obi ha nọ. N’ezie, ndị a nile bụ ihe a na-achọsi ike n’anya Jehova.—Hagaị 2:7.

17, 18. Gịnị na-enyere ọtụtụ ndị aka idi ọrịa na ihe isi ike ndị ọzọ? Nye ihe atụ ụfọdụ e nwere n’ógbè unu.

17 Ọrịa ndị na-adịghị ala ala pụkwara ịkụda mmụọ. Otu okenye kwuru, sị: “N’ìgwè ọmụmụ akwụkwọ ọgbakọ m so amụ ihe, e nwere otu nwanna nwanyị na-arịa ọrịa shuga na ọrịa akụrụ, otu nwanna nwanyị ọzọ na-arịa cancer, abụọ na-arịa ọrịa ogbu na nkwonkwo ndị ike ya, otu onye na-arịa otu ọrịa na-erekasị ahụ́ a na-akpọ lupus nakwa nke na-akụrisị ahụ́ a na-akpọ fibromyalgia. Mgbe ụfọdụ, ha na-enwe nkụda mmụọ. N’agbanyeghị nke ahụ, nanị mgbe ha na-aha ọmụmụ ihe bụ mgbe ezigbo ahụ́ jituru ha ma ọ bụ mgbe ha nọ n’ụlọ ọgwụ. Ha nile na-ejechi ozi ubi anya. Ha na-echetara m ihe banyere Pọl bụ́ onye kwuru, sị: ‘Mgbe m na-adịghị ike, mgbe ahụ ka m na-adị ike.’ Ịhụnanya na obi ike ha na-amasị m. Ikekwe ọnọdụ ha na-eme ka ha lekwasị nnọọ anya ná nzube nke ndụ na n’ihe ndị dị mkpa n’ezie.”—2 Ndị Kọrịnt 12:10.

18 Ọ bụrụ na gị na ọrịa ma ọ bụ nsogbu ndị ọzọ na-alụ, ‘na-ekpe ekpere n’akwụsịghị akwụsị’ ka Jehova nyere gị aka ka ịghara ịda mbà n’obi. (1 Ndị Tesalonaịka 5:14, 17) Nke bụ́ eziokwu bụ na ị pụrụ inwe ihe ndị ga na-enye gị nsogbu n’obi site n’oge ruo n’oge, ma gbalịa tinye uche gị n’ihe ndị na-agba ume, n’ihe ndị metụtara Jehova, karịsịa n’olileanya dị oké ọnụ ahịa nke Alaeze ahụ. Otu nwanna nwanyị kwuru, sị: “Ije ozi ubi bụụrụ m ọgwụ.” Ikwusara ndị ọzọ ozi ọma ahụ na-enyere ya aka ịnọgide na-enwe olileanya.

Ịhụnanya Na-enyere Ndị Mere Mmehie Aka Ịlọghachikwute Jehova

19, 20. (a) Gịnị pụrụ inyere ndị mere mmehie aka ịkata obi iji laghachikwuru Jehova? (b) Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

19 Ọ dịghịrị ụfọdụ ndị bụ́ ndị na-ejichaghịzi ozi Jehova kpọrọ ihe ma ọ bụ ndị tinyeworo aka ná mmehie mfe ịlọghachikwute Jehova. Ma ndị dị otú ahụ ga-enweta obi ike dị ha mkpa ma ọ bụrụ na ha echegharịa n’ezie ma nweghachi ịhụnanya n’ebe Chineke nọ. Tụlee ihe banyere Mario, * bụ́ onye bi na United States. Mario hapụrụ ọgbakọ, ghọọ onye aṅụrụma na onye na-aṅụ ọgwụ ọjọọ, mgbe afọ iri abụọ gasịkwara, a tụrụ ya mkpọrọ. Mario kwuru, sị: “Amalitere m ichebara ọdịnihu m echiche ma malitekwa ịgụ Bible ọzọ. Ka oge na-aga, abịara m ghọtawa ihe àgwà Jehova dị iche iche pụtara, karịsịa ebere ya, bụ́ nke m na-arịọkarị maka ya n’ekpere. Mgbe a tọhapụsịrị m, ahapụrụ m ndị enyi ochie m, ma malite ịga ọmụmụ ihe Ndị Kraịst, e mesịakwa nabataghachi m. Ọ bụ ezie na m ka na-ata ahụhụ ihe ụfọdụ ndị si n’omume ndị m mere n’oge gara pụta, ma ugbu a, ma ọ̀ dịghị ihe ọzọ, enwere m olileanya magburu onwe ya. M na-ekele Jehova nke ukwuu maka ọmịiko ya nakwa maka ịgbaghara m.”—Abụ Ọma 103:9-13; 130:3, 4; Ndị Galeshia 6:7, 8.

20 N’ezie, ọ chọrọ mgbalị siri ike n’aka ndị nọ n’ọnọdụ yiri nke Mario iji laghachikwute Jehova. Ma ịhụnanya ha maliteghachiri inwe n’ebe Jehova nọ—bụ́ nke ọmụmụ Bible, ekpere, na ntụgharị uche mere ka o kwe omume—ga-eme ka ha nwee obi ike ma kpebisie ike ịlaghachikwute Jehova. Olileanya Alaeze ahụ sokwa wusie Mario ike. Ee, olileanya, tinyere ịhụnanya, okwukwe na egwu Chineke, pụrụ nnọọ ime ka ndụ anyị ka mma. N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-elebakwu anya n’onyinye ime mmụọ a dị oké ọnụ ahịa nke bụ olileanya.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 19 A gbanwewo aha ahụ.

Ị̀ Pụrụ Ịza?

• Olee otú ịhụnanya si nyere Jizọs aka inwe obi ike dị ukwuu?

• Olee otú ịhụnanya Pọl na Banabas nwere n’ebe ụmụnna ha nọ si nyere ha aka inwe obi ike pụrụ iche?

• Site n’ụzọ ndị dị aṅaa ka Setan si agbalị ime ka ịhụnanya anyị nwere n’ebe Ndị Kraịst ibe anyị nọ jụọ oyi?

• Ihe isi ike ndị dị aṅaa ka ịhụnanya anyị nwere n’ebe Jehova nọ ga-enyere anyị aka ịnagide?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 23]

Ịhụnanya Pọl nwere n’ebe ndị ọzọ nọ mere ka o nwee obi ike iji nọgide na-ejere Jehova ozi

[Foto dị na peeji nke 24]

Ọ chọrọ obi ike iji nọgide na-eme ihe kwekọrọ n’ụkpụrụ Chineke

[Foto dị na peeji nke 24]

Namangolwa Sututu