Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Usoro Mbara Igwe Anyị Pụrụ Iche Otú O Si Malite

Usoro Mbara Igwe Anyị Pụrụ Iche Otú O Si Malite

Usoro Mbara Igwe Anyị Pụrụ Iche Otú O Si Malite

Ọ DỊ ọtụtụ ihe jikọrọ aka mee ka ụwa anyị gbapụ iche. Usoro mbara igwe nke ụwa anyị dị na ya dị n’ebe pụtatụrụ apụtatụ n’ụyọkọ kpakpando Milky Way nke gbara gburugburu bụ́ ebe kpakpando na-adịchaghị ọtụtụ na ya. Kpakpando nile anyị na-ahụ n’abalị dị nnọọ ebe dị anya nke na ha na-adị ka kpọm na-eke ọkụ ma e jiri onyokomita kasị ukwuu lee ha. Ọ̀ bụ otú ahụ ka o kwesịrị ịdị?

A sị na usoro mbara igwe nke ụwa anyị dị na ya dị nso n’etiti Milky Way, ọtụtụ kpakpando juru ebe ahụ ga na-enye anyị nsogbu. Dị ka ihe atụ, o nwere ike imetụta gburugburu ụwa na-agba, bụ́ nke gaara akpa ndụ ụmụ mmadụ aka ọjọọ. Ma, o yiri ka usoro mbara igwe anyị ọ̀ dị nnọọ n’ebe kwesịrị ekwesị n’ụyọkọ kpakpando anyị iji zere nke a na ihe ize ndụ ndị ọzọ, dị ka oké okpomọkụ ọ gaara ịdị na-enweta mgbe ọ na-agafe ìgwè gas dị iche iche na ịnọ kpakpando ndị na-agbawa agbawa nso na ihe ndị ọzọ nwere ike ime ka e nwee ụzarị ọkụ nke nwere ike igbu mmadụ.

Anyanwụ bụ kpakpando na-arụrụ anyị nnọọ ihe dị anyị mkpa. Ọ na-ere ọkụ mgbe nile, na-adịte aka, o bubigaghịkwa ibu ókè ma ọ bụ kpobiga ọkụ ókè. Ihe ka nnọọ ọtụtụ na kpakpando ndị dị n’ụyọkọ kpakpando anyị dị nnọọ obere karịa anyanwụ, ha anaghịkwa enye ụdị ìhè dị anyị mkpa nke ha ji enye okpomọkụ zuru ezu iji mee ka ndụ dịgide na mbara ala dị ka ụwa anyị. Ọzọkwa, e jikọtara ihe ka ọtụtụ na kpakpando na otu kpakpando ọzọ ma ọ bụ karịa, ha ana-agbakwa ibe ha gburugburu. Anyanwụ anyị adịghị otú ahụ, ọ nọọrọ onwe ya. O yighị ka usoro mbara igwe anyị ọ̀ gaara akwụsi ike ma a sị na e nwere anyanwụ abụọ ma ọ bụ karịa ndị ikike sitere na ha na-emetụta ya.

Ihe ọzọ mere usoro mbara igwe anyị ji pụọ iche bụ ebe nnukwu mbara ala ndị dị anya n’anyanwụ nọ na-agba anyanwụ gburugburu, bụ́kwa nke mere ka ikike sitere na ha ghara ịdị na-emetụta mbara ala ndị dị nso n’anyanwụ. * Kama mbara ala ndị ahụ dị anya n’anyanwụ inye ụwa nsogbu, ha na-anọchi ụwa na mbara ala ndị dị nso n’anyanwụ ka ihe ndị dị ka okwute ghara ịkụta ha. Ndị ọkà mmụta sayensị bụ́ Peter D. Ward na Donald Brownlee kọwara n’akwụkwọ ha bụ́ Rare Earth—Why Complex Life Is Uncommon in the Universe, sị: “Nnukwu mbara ala ndị gas jupụtara na ha bụ́ ndị dị n’ebe dị elu karịa ụwa anyị, dị ka Jupiter, na-eme ka okwute na ice na gas dị iche iche na-erugharị na mbara igwe ghara ịdị na-akụta ụwa anyị mgbe nile.” A chọpụtala usoro mbara igwe ndị ọzọ bụ́ ndị nwekwara nnukwu mbara ala dị iche iche. Ma otú ihe ka ọtụtụ n’ime ha si agba anyanwụ gburugburu gaara abụrụ mbara ala dị ka ụwa ihe ize ndụ.

Ọrụ Ọnwa Na-arụ

Kemgbe ụwa, ọnwa na-atụ ụmụ mmadụ n’anya. E jirila ya dee ma gụọ egwú. Dị ka ihe atụ, otu onye Hibru oge ochie na-ede egwú kọwara ọnwa dị ka ihe “ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi; [nakwa dị ka] Onye àmà Nke nọ na mbara igwe kwesịrị ntụkwasị obi.”—Abụ Ọma 89:37.

Otu ụzọ dị mkpa ọnwa si emetụta ndụ nke ihe ndị dị n’ụwa bụ na ikike sitere na ya na-eme ka a na-enwe ebili mmiri. A na-eche na ọ bụ ebili mmiri na-eme ka oké osimiri na-asọ asọ, bụ́kwanụ nke na-eme ka anyị na-enwe oge dị iche iche n’afọ.

Ọrụ ọzọ dị mkpa ọnwa na-arụ bụ na ikike sitere na ya na-eme ka ụwa kwụsie ike ebe ọ kwụ, bụ́ ebe ọ na-anọ na-agba anyanwụ gburugburu. Akwụkwọ nkà mmụta sayensị bụ́ Nature na-ekwu na e wezụga ọnwa, ka ogologo oge gasịrị ụwa agakwaghị nnọọ ehulata otú o hulatara na-agba anyanwụ gburugburu. Cheedị ihe gaara ime ma a sị na ụwa ehulataghị ehulata na-agba anyanwụ gburugburu! Anyị agaraghị enwe oge dị iche iche n’afọ, mmiri agakwaghị na-ezo otú kwesịrị ekwesị. Nhulata ụwa hulatara na-emekwa ka ụwa ghara ikpobiga ọkụ ókè ma ọ bụ jụbiga oyi ókè bụ́ nke gaara ịdị na-egbu ndị mmadụ. Onye na-enyocha mbara igwe bụ́ Jacques Laskar kwubiri, sị: “Ọ dị otu ihe mere ụwa anyị ji kwụsie ike ebe ọ kwụ: ọ bụ Ọnwa.” Iji nwee ike ime ka ụwa anyị kwụsie ike, ọnwa buru ibu—o buru ibu karịa ọnwa ndị na-agba mbara ala ndị ahụ buru ibu gburugburu.

Dị ka onye dere akwụkwọ Bible e dere n’oge ochie bụ́ Jenesis si kwuo, ọrụ ọzọkwa ọnwa na-arụrụ ụwa bụ inye ya ìhè n’abalị.—Jenesis 1:16.

Hà Pụtara na Mberede Ka Ọ̀ Bụ Onye Nwere Ọgụgụ Isi Kere Ha?

Olee ihe nwere ike ịbụ ya mere e ji nwee ọtụtụ ihe ndị na-eme ka e nwee ike ịdị ndụ n’ụwa, ọbụna na-ekpori ndụ na ya? O yiri ka è nwere ihe abụọ ọ ga-abụ ma ọ bụghị otu kpatara ya ya abụrụ nke ọzọ. Otu bụ na ihe a nile bịara na mberede, n’enweghị onye nwere ọgụgụ isi kere ha. Nke abụọ bụ na e nwere onye nwere ọgụgụ isi kere ihe ndị a.

Ọtụtụ puku afọ gara aga, Akwụkwọ Nsọ kwuru na ọ bụ otu Onye Okike chepụtara ma kee eluigwe na ụwa anyị—ya bụ Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile. Ya bụrụ na nke ahụ bụ eziokwu, ọ pụtara na ihe nile dị n’usoro mbara igwe anyị abịaghị na mberede, kama na e nwere onye nwere ọgụgụ isi nke kpachaara anya kee ha. Anyị pụrụ ikwu na Onye Okike depụtaara anyị ihe dị iche iche o mere iji mee ka ndụ dịrị n’ụwa. O nwere ike iju gị anya ịmata na n’agbanyeghị na e dere ihe ndị ahụ ihe dị ka puku afọ atọ na narị afọ ise gara aga, ihe ndị o kwuru banyere otú e si kee eluigwe na ụwa bụ nnọọ ihe ndị ọkà mmụta sayensị kwuru na ọ ghaghị ịbụ ihe merenụ. E dere ihe ndị a n’akwụkwọ Bible bụ́ Jenesis. Tụlee ihe o kwuru.

Akụkọ Okike Dị na Jenesis

“Na mbụ Chineke kere eluigwe na ụwa.” (Jenesis 1:1) Okwu ndị e ji malite Bible kwuru banyere okike nke usoro mbara igwe anyị, nke gụnyere ụwa anyị, na kpakpando ndị dị n’ọtụtụ ijeri ụyọkọ kpakpando ndị dị na mbara igwe. Bible kwuru na ọ dị mgbe ụwa bụ “ihe tọgbọrọ n’efu na ihe tọgbọrọ nkịtị.” E nweghị mpaghara ala akọrọ dị iche iche a na-akpọ kọntinent nke e jikwanụ enwe ala na-eme ihe. Ma okwu ndị ọzọ sochirinụ kọwara ihe ndị ọkà mmụta sayensị kwuru kasị mkpa a chọrọ na mbara ala nke ihe ndị dị ndụ nwere ike ịdịgide ndụ na ya—ọ ghaghị inwe mmiri ebe o buru ibu. Mmụọ Chineke “na-erugharịkwa n’elu mmiri.”—Jenesis 1:2.

Ka mmiri dị na mbara ala wee ghara ịkpụkọta akpụkọta, mbara ala ahụ aghaghị ịnọ ebe kwesịrị ekwesị site n’anyanwụ. Ọkà mmụta ihe ndị metụtara mbara ala bụ́ Andrew Ingersoll kọwara, sị: “Mars jụbigara oyi ókè, Venus kpobigara ọkụ ókè, Ụwa dị n’ebe kwesịrị nnọọ ekwesị.” N’otu aka ahụ, ka ahịhịa wee na-eto eto, a ghaghị inwe ìhè zuru ezu. Ọ bụkwa ihe dị ịrịba ama na akụkọ Bible ahụ kwuru na ná mmalite okike, Chineke mere ka ìhè anyanwụ chafee n’alụlụ nke kpuchiri oké osimiri dị ka “ákwà okike” e kere nwa ọhụrụ.—Job 38:4, 9; Jenesis 1:3-5.

N’amaokwu ndị ọzọ sochirinụ nke akwụkwọ Jenesis ahụ, anyị gụrụ na Onye Okike kere ihe Bible kpọrọ “mbara.” (Jenesis 1:6-8) Ihe jupụtara na mbara a bụ gas ndị dị n’ikuku na-eku n’ụwa.

Bible kọwaziri na Chineke mere ka ụwa ahụ tọgbọrọ n’efu ghọọ ala akọrọ. (Jenesis 1:9, 10) Ma eleghị anya, o mere ka okwute ndị dị n’elu ụwa kpụkọta ọnụ ma kewaa. O nwere ike ịbụ na nke ahụ mere ka e nwee nnukwu olulu dị iche iche, nnukwu mpaghara ala akọrọ dị iche iche a na-akpọ kọntinent esikwa n’oké osimiri pụta.—Abụ Ọma 104:6-8.

N’oge a na-amaghị ama gara aga, Chineke kere obere ahịhịa ndị dị n’okpuru oké osimiri bụ́ ndị a na-apụghị iji anya nkịtị hụ. Obere ahịhịa ndị a malitere iji ikike sitere n’anyanwụ agbanwe ikuku carbon dioxide ka ọ ghọọrọ ha nri na iwepụta ikuku oxygene n’ikuku. Okike e kere ahịhịa n’ụbọchị nke atọ bụ́ nke mechara ruchie elu ala mekwuru ka ikuku ndụ ahụ bakwuo ụba ngwa ngwa. Nke ahụ mere nnọọ ka ọ̀tụ̀tụ̀ ikuku oxygen dị na mbara ụwa mụbaa, bụ́ nke mmadụ na anụmanụ ga na-ekuru iji dịrị ndụ.—Jenesis 1:11, 12.

Iji mee ka ala na-emepụta ihe, Onye Okike kere ụmụ ihe dị iche iche anya nkịtị na-apụghị ịhụ ka ha biri n’ime ala. (Jeremaịa 51:15) Ụmụ ihe ndị ahụ dị ndụ na-agbari ihe nwụrụ anwụ ma mee ka ha ghọọ nri ala nke ga-eme ka ahịhịa na-eto eto. Ụdị ahụhụ ụfọdụ bi n’ime ala na-ekuru ikuku nitrogen ma mee ka ihe ọkụkụ dị iche iche nweta ikuku a dị ha mkpa iji na-eto eto. Ọ bụ ihe dị ịtụnanya na njuaka nke ájá na-eme nri nwere ike inwe ijeri isii nke obere ụmụ ahụhụ ndị anya nkịtị na-apụghị ịhụ!

Jenesis 1:14-19 kọwara na e kere anyanwụ, ọnwa na kpakpando n’oge nke anọ e ji kee ihe. Mgbe mbụ ị gụrụ ya, o nwere ike ịdị gị ka ọ̀ na-emegide ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru n’elu. Otú ọ dị, buru n’obi na Mozis bụ́ onye dere Jenesis kọrọ otú e si kee ụwa ka à ga-asị na ọ nọ n’ụwa na-ele ihe na-emenụ mgbe a na-eke ihe. O yiri ka à bịara hụwa anyanwụ, ọnwa na kpakpando na mbara ụwa n’oge ahụ.

Jenesis kwuru na e kere ihe dị iche iche bi n’oké osimiri n’oge nke ise e ji kee ihe, keekwanụ anụmanụ bi n’elu ala na mmadụ n’oge nke isii.—Jenesis 1:20-31.

E Kere Ụwa Ka E Kporie Ndụ na Ya

Ọ̀ bụ na o yighị gị ka ihe mere e ji kee ụwa otú ahụ Jenesis si kwuo e si kee ya ọ̀ bụ ka e wee kporie ndụ na ya? Ọ̀ dịtụla mgbe i biliri ọtọ n’ụbọchị anwụ na-achasi ike, kuru ikuku ndụ, ma nwee obi ụtọ na ị dị ndụ? Ikekwe, ị gagharịrị n’ubi okooko osisi, kirie ịma mma ya ma nụrụ ísìsì ọma ya. Ma ọ bụkwanụ na ị kpagharịrị n’ubi mkpụrụ osisi ma ghọrọ ụfọdụ mkpụrụ osisi na-atọ ụtọ. Ihe ndị dị otú ahụ agaraghị atọ gị ụtọ ma a sị na e nweghị ihe ndị na-esonụ: (1) mmiri buru ibu n’ụwa, (2) okpomọkụ na ìhè kwesịrị ekwesị sitere n’anyanwụ, (3) ikuku anyị nke nwere ọ̀tụ̀tụ̀ kwesịrị ekwesị nke gas dị iche iche, na (4) ala na-eme nri.

Ihe a nile—bụ́ ndị na-adịghị na Mars, Venus, na mbara ala ndị ọzọ dị anyị nso—abịaghị dịrị na mberede. E kere ha otú ha ga-eme nnọọ ka ịdị ndụ n’ụwa tọọ ụtọ. Dị ka isiokwu na-esonụ ga-egosi, Bible kwukwara na Onye Okike anyị kere ụwa anyị magburu onwe ya ịdị ruo mgbe ebighị ebi.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 Mbara ala anọ ndị dịbatara n’ime n’usoro mbara igwe anyị bụ—Mercury, Venus, Ụwa, na Mars—ha nile nwechara okwute n’ime ha. Nnukwu mbara ala ndị dịpụrụ adịpụ bụ—Jupiter, Saturn, Uranus, na Neptune—ọ bụ gas kasị dịrị na ha.

[Igbe dị na peeji nke 6]

“Ọ bụrụ na a gwa m dị ka onye ọkà mmụta ihe banyere ala, ka m kọwaa ná mkpirikpi echiche ọgbara ọhụrụ ndị anyị nwere banyere mmalite ụwa na mmalite ndụ na ya nye ndị nkịtị na-azụ atụrụ, dị ka agbụrụ ndị e degaara Akwụkwọ Jenesis, ọ ga-esiri m ike ime ihe ka mma karịa ịgbasochi okwu ndị e ji dee isi mbụ nke Jenesis anya.”—Ọkà mmụta ihe banyere ala bụ́ Wallace Pratt.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 7]

Ọ DỊKWA N’EBE KASỊ MMA ỊNỌ NYOCHAA MBARA IGWE

A sị na anyanwụ dị n’ebe ọzọ n’ụyọkọ kpakpando anyị, anyị agaraghị na-ahụ kpakpando nke ọma otú anyị si na-ahụ ya ugbu a. Akwụkwọ bụ́ The Privileged Planet kọwara, sị: “Ebe Usoro Mbara Igwe anyị dị . . . dị nnọọ anya n’ebe e nwere ọtụtụ uzuzu na ìhè na-adịghị mma, nke ahụ na-emekwa ka ọ dịrị anyị mfe ịhụ kpakpando ndị dị anyị nso na ebe ndị dị anya na mbara igwe nke ọma.”

Ma, ibu ọnwa buru na anya ọ dị site n’ụwa na-eme ka o kpuchie anyanwụ nke ọma bụ́ nke na-akpata chi iji n’ehihie mgbe ụfọdụ. Ihe ndị ahụ dị ịtụnanya na-adịghị eme mgbe nile na-enye ndị na-enyocha mbara igwe ohere ịmụ banyere anyanwụ. Nnyocha ndị dị otú ahụ enyerela ha aka ịchọpụta ọtụtụ ihe ha na-amabughị banyere otú kpakpando si enye ìhè.

[Foto dị na peeji nke 5]

Ọnwa buru ibu otú ọ ga-enwe ike ime ka ụwa nọgide n’ebe o hulatara na-agba anyanwụ gburugburu

[Foto ndị dị na peeji nke 7]

Gịnị mere ndụ ji dịrị n’ụwa? Ọ bụ inwe mmiri ebe o buru ibu, ìhè na okpomọkụ kwesịrị ekwesị, ikuku, na ala na-eme nri

[Ebe E Sigasị Nweta Foto]

Ụwa: Ọ dabeere na Foto NASA; ọka wit: Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.