Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Ndị Bụ́ Ụmụ, Na-eruberenụ Ndị Mụrụ Unu Isi”

“Ndị Bụ́ Ụmụ, Na-eruberenụ Ndị Mụrụ Unu Isi”

“Ndị Bụ́ Ụmụ, Na-eruberenụ Ndị Mụrụ Unu Isi”

“Ndị bụ́ ụmụ, na-eruberenụ ndị mụrụ unu isi n’ihe metụtara Onyenwe anyị, n’ihi na nke a bụ ezi omume.”—NDỊ EFESỌS 6:1.

1. Olee otú irube isi nwere ike isi chebe gị?

O NWERE ike ịbụ na ihe mere anyị ji dịrị ndụ ugbu a bụ na anyị rubere isi, nweekwa ike ịbụ na ihe mere ụfọdụ adịghị ndụ taa bụ na ha erubeghị isi. Gịnị ka anyị rubere isi na ya? N’ịdọ aka ná ntị, dị ka ihe atụ, n’ịdọ aka ná ntị nke ahụ́ anyị ‘e mere ka ọ bụrụ oké ọrụ’ nyere anyị. (Abụ Ọma 139:14) Anya anyị nwere ike ịhụ mgbe ihu igwe gbajiri, ntị anyị anụkwa ụda égbè eluigwe. Eluigwe ike ọkụ emezie ka akpata oyi wụọ anyị n’ahụ́. Ndị a kụziirila ihe ihe àmà ndị a pụtara na-ama na ha kwesịrị ịchọ ebe ha ga-agbaba ozugbo iji zere oké mmiri ozuzo, àmụ̀mà na àkụ́ mmiri bụ́ ndị nwere ike imerụ ha ahụ́.

2. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ka a dọọ ụmụaka aka ná ntị banyere ihe ụfọdụ, n’ihi gịnịkwa ka ha kwesịrị iji na-erubere ndị mụrụ ha isi?

2 Ọ dị unu bụ́ ụmụaka mkpa ka a dọọ unu aka ná ntị banyere ihe ndị nwere ike itinye unu ná nsogbu, ọ bụkwa ọrụ dịịrị ndị mụrụ unu ịdọ unu aka ná ntị banyere ihe ndị a. I nwere ike icheta mgbe a gwara gị, sị: “Emetụla ekwu aka. Ọ dị ọkụ.” “Agala ebe mmiri dị omimi. Ọ na-eri mmadụ.” “Lee anya n’aka nri na n’aka ekpe tupu ị na-agbafe n’ụzọ.” Ọ bụ ihe dị mwute na e nweela ụmụaka ndị e merụrụ ahụ́ ma ọ bụ ọbụna gbuo n’ihi na ha erubeghị isi. Irubere ndị mụrụ gị isi “bụ ezi omume”—ihe ziri ezi na ihe kwesịrị ekwesị. Ọ bụkwa ihe na-egosi na ị maara ihe. (Ilu 8:33) Amaokwu Bible ọzọ kwuru na ọ “na-amasị” Onyenwe anyị Jizọs Kraịst. N’ezie, Chineke nyere gị iwu irubere ndị mụrụ gị isi.—Ndị Kọlọsi 3:20; 1 Ndị Kọrint 8:6.

Uru Na-adịgide Adịgide A Na-erite Site n’Irube Isi

3. Nye ihe ka ọtụtụ n’ime anyị, olee ihe “ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie” ga-abụ, oleekwa ihe ụmụaka ga-eme iji nweta ya?

3 Irubere ndị mụrụ gị isi na-echebe “ndụ [ị] dị ugbu a,” ma irube isi ga-emekwa ka o kwe gị omume inweta ndụ nke “gaje ịbịa,” bụ́ nke a na-akpọ “ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie.” (1 Timoti 4:8; 6:19) Nye ọtụtụ n’ime anyị, ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie ga-abụ ndụ ebighị ebi n’ụwa ọhụrụ nke Chineke, bụ́ nke o kwere nkwa inye ndị ji ikwesị ntụkwasị obi rube isi n’iwu ya. Otu iwu dị mkpa so n’iwu ndị a bụ: “‘Sọpụrụ nna gị na nne gị’; nke bụ́ ihe mbụ e nyere n’iwu nke nwere nkwa: ‘Ka o wee gaara gị nke ọma, ka i wee nọọkwa ogologo oge n’elu ụwa.’” N’ihi ya, ọ bụrụ na i rubere ndị mụrụ gị isi, ị ga-enwe obi ụtọ. Ị ga-ejide ọdịnihu gị n’aka, ị ga-enwekwa ike inweta ndụ ebighị ebi n’ụwa paradaịs!—Ndị Efesọs 6:2, 3.

4. Olee otú ụmụaka nwere ike isi sọpụrụ Chineke ma rite uru na ya?

4 Mgbe ị na-asọpụrụ ndị mụrụ gị site n’irubere ha isi, ọ pụtakwara na ị na-erubere Chineke isi n’ihi na ọ bụ ya bụ onye nyere gị iwu ka i rubere ha isi. Ọ ga-abakwara gị uru. Bible na-ekwu, sị: “Mụ onwe m bụ Jehova, Chineke gị, Onye na-ezi gị ime ihe na-aba uru.” (Aịsaịa 48:17; 1 Jọn 5:3) Olee otú irube isi ga-esi baara gị uru? Ọ ga-eme nne gị na nna gị obi ụtọ, obi ụtọ ahụ ha nwere ga-emekwa nnọọ ka ha mekwuo gị obi ụtọ. (Ilu 23:22-25) Ma nke kasị mkpa bụ na nrubeisi gị na-eme ka Nna gị nke eluigwe nwee obi ụtọ, ọ ga-agọzikwa gị n’ụba! Ka anyị hụ otú Jehova si gọzie ma chebe Jizọs, bụ́ onye kwuru banyere onwe ya, sị: “M na-eme ihe dị ya mma mgbe nile.”—Jọn 8:29.

Jizọs Bụ Onye Na-arụsi Ọrụ Ike

5. Olee ihe ndị ga-eme ka anyị kwere na Jizọs bụ onye na-arụsi ọrụ ike?

5 Jizọs bụ nwa mbụ nke nne ya, bụ́ Meri. Di nne ya, bụ́ Josef, bụ ọkwá nkà. Jizọs ghọkwara ọkwá nkà, ikekwe ya abụrụ Josef kụziiri ya ọrụ ahụ. (Matiu 13:55; Mak 6:3; Luk 1:26-31) Olee ụdị ọkwá nkà i chere Jizọs bụ? Mgbe ọ nọ n’eluigwe, tupu e jiri ụzọ ọrụ ebube tinye ya n’akpa nwa nwanyị na-amaghị nwoke, bụ́ mgbe a kọwara ya dị ka amamihe, ọ kọwara, sị: “Anọkwa m n’akụkụ [Chineke], dị ka onye ọkà, M wee bụrụ ihe na-atọ Ya ụtọ kwa ụbọchị, na-egwuri egwu n’ihu Ya mgbe nile.” Jizọs rụsiri ọrụ ike n’eluigwe, ihe ya tọkwara Chineke ụtọ. Í cheghị na mgbe ọ bụ nwata n’elu ụwa na ọ gbalịkwara ịbụ onye na-arụsi ọrụ ike, ezigbo ọkwá nkà?—Ilu 8:30; Ndị Kọlọsi 1:15, 16.

6. (a) Olee ihe mere i ji kwere na ọ ga-abụ na Jizọs na-arụ ọrụ ndị dị n’ụlọ mgbe ọ bụ nwata? (b) Olee otú ụmụaka nwere ike isi ṅomie Jizọs?

6 O doro anya na Jizọs gwuriri egwu mgbe ụfọdụ mgbe ọ bụ nwata, dị nnọọ ka Bible kwuru na ụmụaka mere n’oge ochie. (Zekaraịa 8:5; Matiu 11:16, 17) N’agbanyeghị nke ahụ, dị ka nwa mbụ n’ezinụlọ buru ibu nke dara ogbenye, ọ ghaghị ịbụ na Jizọs nwere ọrụ ndị ọzọ ọ na-arụ n’abụghị nanị ịnara ọzụzụ n’aka Josef iji ghọọ ọkwá nkà. Ka e mesịrị, Jizọs ghọrọ onye na-ekwusa ozi ọma ma tinye oge ya nile n’ozi ya ruo n’ókè na o bighị ndụ ntụsara ahụ́. (Luk 9:58; Jọn 5:17) Ọ̀ dị ebe ndị ị hụrụ i nwere ike iṅomi Jizọs? Ndị mụrụ gị hà na-agwa gị ka ị zaa ụlọ gị ma ọ bụ rụọ ọrụ ndị ọzọ? Hà na-agba gị ume ife Chineke site n’ịga ọmụmụ ihe Ndị Kraịst na ịkọrọ ndị ọzọ ihe ndị i kweere? Olee ihe i chere Jizọs gaara eme mgbe ọ bụ obere nwa ma a sị na a gwara ya mee ihe ndị ahụ?

Onye Na-amụsi Bible Ike na Onye Na-ezi Ihe nke Ọma

7. (a) Olee ndị o nwere ike ịbụ na ha so Jizọs gaa Ememe Ngabiga? (b) Olee ebe Jizọs nọ mgbe ndị ọzọ lawara, n’ihi gịnịkwa ka o ji nọrọ ebe ahụ?

7 E nyere ndị Izrel nile bụ́ nwoke iwu ka ha gaa fee Jehova n’ụlọ nsọ ahụ n’oge ememe atọ nke ndị Juu. (Deuterọnọmi 16:16) Mgbe Jizọs dị afọ 12, ezinụlọ ha gara Jeruselem maka Ememe Ngabiga. O nwere ike ịbụ na ụmụnne Jizọs ndị nwoke na ndị nwanyị so gaa. Ma, o nwere ike ịbụ na Salomi, onye nwere ike ịbụ nwanne Meri so ezinụlọ Jizọs mee njem ahụ, tinyere di ya bụ́ Zebedi na ụmụ ha nwoke bụ́ Jems na Jọn, ndị mesịrị ghọọ ndịozi. * (Matiu 4:20, 21; 13:54-56; 27:56; Mak 15:40; Jọn 19:25) Mgbe ha na-alọta alọta, o nwere ike ịbụ na Josef na Meri chere na Jizọs so ndị ikwu ha, n’ihi ya, ná mmalite ha amaghị na o soghị ha na-alọta. Abalị atọ ka e mesịrị, mgbe Meri na Josef mechara chọta Jizọs, ọ nọ n’ụlọ nsọ, nọrọ “ọdụ n’etiti ndị nkụzi, na-egekwa ha ntị ma na-ajụ ha ajụjụ.”—Luk 2:44-46.

8. Gịnị ka Jizọs mere n’ụlọ nsọ, oleekwa ihe juru ndị mmadụ anya?

8 Olee otú Jizọs si “na-ajụ [ndị nkụzi ahụ] ajụjụ”? O nwere ike ajụjụ ya abụghị nanị iji mata ihe ndị ọ na-amaghị. Okwu Grik e ji mee ihe ebe a nwere ike ịpụta ụdị ajụjụ a na-ajụ mmadụ n’ụlọikpe, ọ pụkwara ịpụta ịgba mmadụ ajụjụ. Ee, ọbụna mgbe Jizọs ka bụ nwata, ọ ghọọla onye na-amụsi Bible ike bụ́ onye amamihe ya juru ndị nkụzi okpukpe gụrụ akwụkwọ anya! Bible kwuru, sị: “Nghọta ya na azịza ya nọgidere na-eju ndị nile na-ege ya ntị anya.”—Luk 2:47.

9. Olee otú i nwere ike isi gbasoo ihe nlereanya Jizọs n’ịmụ Bible?

9 Olee ihe i chere mere ihe Jizọs maara banyere Bible mgbe ọ bụ nwata jiri ju ọbụna ndị nkụzi nwere ahụmahụ anya? N’ezie, ọ bụ n’ihi na o nwere nne na nna na-atụ egwu Chineke bụ́ ndị malitere mgbe ọ bụ nwa ọhụrụ kụziwere ya ihe banyere Chineke. (Ọpụpụ 12:24-27; Deuterọnọmi 6:6-9; Matiu 1:18-20) Anyị ji n’aka na Josef ga na-akpọ Jizọs aga n’ụlọ nzukọ ndị Juu mgbe ọ ka dị obere ka ọ nụ ebe a na-agụ ma na-akọwa Akwụkwọ Nsọ. Ì nwere nne na nna na-amụrụ gị Bible ma na-akpọ gị aga ọmụmụ ihe Ndị Kraịst? Ì ji mgbalị ha na-eme akpọrọ ihe, dị ka Jizọs si jiri mgbalị nne na nna ya kpọrọ ihe? Ị̀ na-akụziri ndị ọzọ ihe ndị ị na-amụta, dị ka Jizọs mere?

Jizọs Doro Onwe Ya n’Okpuru

10. (a) N’ihi gịnị ka nne na nna Jizọs kwesịrị iji mara ebe ha ga-achọta ya? (b) Olee ezi ihe nlereanya Jizọs setịpụụrụ ụmụaka?

10 Olee otú i chere obi dị Meri na Josef mgbe ha hụrụ Jizọs n’ụlọ nsọ mgbe ha chọsịrịla ya ruo abalị atọ? O doro anya na obi ruru ha nnọọ ala. Ma, o juru Jizọs anya na ndị mụrụ ya amaghị ebe ọ nọ. Ha abụọ maara na a mụrụ Jizọs n’ụzọ ọrụ ebube. E wezụga nke ahụ, ọ bụ ezie na ha amaghị ihe nile banyere Jizọs, ọ ghaghị ịbụ na ha maara na ọ ga-abụ Onye Nzọpụta na Eze nke Alaeze Chineke n’ọdịnihu. (Matiu 1:21; Luk 1:32-35; 2:11) N’ihi ya, Jizọs jụrụ ha, sị: “Gịnị mere unu ji na-achọgharị m? Ọ̀ bụ na unu amaghị na aghaghị m ịnọ n’ụlọ Nna m?” Otú ọ dị, Jizọs rubeere nne na nna ya isi ma soro ha laghachi Nazaret. Bible kwuru, sị: “Ọ nọgidekwara na-edo onwe ya n’okpuru ha.” Ọzọkwa, “nne ya ji nlezianya debe okwu ndị a nile n’ime obi ya.”—Luk 2:48-51.

11. Olee ihe i nwere ike ịmụta n’aka Jizọs banyere nrubeisi?

11 Ọ̀ na-adịrị gị mfe iṅomi Jizọs, na-erubere ndị mụrụ gị isi mgbe nile? Ka ị̀ na-eche ọtụtụ mgbe na ha amaghị ihe na-aga n’ụwa ugbu a, nakwa na ị maara ihe karịa ha? Ee, i nwere ike ịma ihe ụfọdụ karịa ha—dị ka ihe atụ otú e si apị ekwe ntị, kọmputa, ma ọ bụ ihe ọgbara ọhụrụ ndị ọzọ. Ma chee echiche banyere Jizọs, bụ́ onye “nghọta ya na azịza ya” juru ndị nkụzi nwere ahụmahụ anya. I nwere ike ikweta na ọ dịghị ihe ị ma ma e jiri gị tụnyere ya. N’agbanyeghị nke ahụ, Jizọs doro onwe ya n’okpuru ndị mụrụ ya. Nke a apụtaghị na ihe nile ha sịrị ya mee dị ya mma. Ma, “ọ nọgidekwara na-edo onwe ya n’okpuru ha”—n’oge nile ọ na-eto eto. Olee ihe i chere i nwere ike ịmụta n’ihe nlereanya ya?—Deuterọnọmi 5:16, 29.

Ọ Na-esi Ike Irube Isi

12. Olee otú irube isi nwere ike isi chebe ndụ gị?

12 Ọ bụghị mgbe nile ka ọ na-adị mfe irube isi, dị ka ihe mere afọ ole na ole gara aga gosiri, bụ́ mgbe ụmụaka nwanyị abụọ na-achọ ịgbafere nnukwu okporo ụzọ awara awara kama isite n’àkwà ndị ụkwụ nke gafere n’elu ya gafee. Ha nọ na-akpọ otu nwatakịrị ha na ya so ka ọ na-aga ịgbago àkwà ahụ ndị ụkwụ na-eji agafe, sị: “John, bịanụ anyị gafee. Ị́ chọghị iso anyị ala?” Mgbe ọ na-ekweghị, otu n’ime ụmụaka nwanyị ahụ kwara ya emo, sị, “Ị bụ nnọọ onye ụjọ!” Ọ bụ ezie na ọ bụghị ụjọ na-atụ John, ọ gwara ha, sị, “Aghaghị m irubere nne m isi.” Obere oge ka nke ahụ gasịrị, John nọ n’elu àkwà ahụ ndị ụkwụ na-esi agafe nụ ụda ụkwụ ụgbọala na-akpụ n’ala ma letuo anya hụ mgbe otu ụgbọala kụụrụ ụmụaka nwanyị ahụ. Otu n’ime ụmụaka ahụ nwụrụ, nke ọzọ merụkwara nnọọ ahụ́ nke na a ghaghị igbubi ya ụkwụ. Nne ụmụaka nwanyị ahụ, bụ́ onye gwarala ha ka ha na-esi n’àkwà ndị ụkwụ ahụ dị n’elu na-agafe, mechara gwa nne John, sị, “Ọ dị m nnọọ ka ya bụrụ na ha rubere isi dị ka nwa gị nwoke.”—Ndị Efesọs 6:1.

13. (a) N’ihi gịnị ka i kwesịrị iji na-erubere ndị mụrụ gị isi? (b) Olee mgbe ọ ga-ekwesị ekwesị ka nwata ghara ime ihe nne ya ma ọ bụ nna ya gwara ya mee?

13 N’ihi gịnị ka Chineke ji kwuo, sị: “Ndị bụ́ ụmụ, na-eruberenụ ndị mụrụ unu isi”? Ọ bụrụ na ị na-erubere nne na nna gị isi, ọ pụtara na ị na-erubere Chineke isi. E wezụga nke ahụ, ndị mụrụ gị maara ihe karịa gị. Dị ka ihe atụ, nanị afọ ise tupu ihe ọghọm ahụ e kwuru banyere ya na paragraf bu nke a ụzọ emee, ọ dị enyi nne John nke ụgbọala gburu nwa ya ka ọ na-achọ ịgbafe otu ụzọ ahụ! Ee, o nwere ike ọ gaghị abụ mgbe nile ka ọ ga-adịrị gị mfe irubere ndị mụrụ gị isi, ma Chineke sịrị na i kwesịrị irubere ha isi. Ma, ya bụrụkwanụ na ndị mụrụ gị—ma ọ bụ ndị ọzọ—agwa gị ka ị ghaa ụgha, zuo ohi, ma ọ bụ mee ihe ọ bụla Chineke kpọrọ asị, ị ghaghị “irubere Chineke isi dị ka onye na-achị achị karịa mmadụ.” Ọ bụ ya mere mgbe Bible kwuchara, sị: “Na-eruberenụ ndị mụrụ unu isi,” o kwukwara, sị: “N’ihe metụtara Onyenwe anyị.” Nke a gụnyere irubere ndị mụrụ gị isi n’ihe nile kwekọrọ n’iwu Chineke.—Ọrụ 5:29.

14. N’ihi gịnị ka o ji dịrị onye zuru okè mfe karị irube isi, n’agbanyeghị nke ahụ, olee ihe mere ọ ga-eji dị mkpa ka ọ mụta ya amụta?

14 Ì chere na a sị na i zuru okè—ya bụ, bụrụ “onye a na-emerụghị emerụ, onye e kewapụrụ n’ebe ndị mmehie nọ,” dị ka Jizọs—na ọ ga-adịrị gị mfe ịdị na-erubere ndị mụrụ gị isi mgbe nile? (Ndị Hibru 7:26) A sị na i zuru okè, ị gaghị na-enwe ọchịchọ ime ihe ọjọọ, dị ka ị na-enwe ugbu a. (Jenesis 8:21; Abụ Ọma 51:5) Otú ọ dị, Jizọs mụtadịrị irube isi amụta. Bible kwuru, sị: “Ọ bụ ezie na [Jizọs] bụ Ọkpara, ọ mụtara nrubeisi site n’ahụhụ ndị ọ tara.” (Ndị Hibru 5:8) Olee otú ịta ahụhụ si nyere Jizọs aka ịmụta nrubeisi, bụ́ ihe ọ na-amụghị n’eluigwe?

15, 16. Olee otú Jizọs si mụta nrubeisi?

15 Site ná nduzi Jehova, Josef na Meri chebere Jizọs mgbe ọ ka bụ nwata ka ihe ọ bụla ghara ime ya. (Matiu 2:7-23) Otú ọ dị, ka e mesịrị, Chineke kwụsịrị ichebe Jizọs n’ụzọ ọrụ ebube. Ahụhụ Jizọs tara na nchegbu o nwere buru ibu nke na Bible kwuru na o “ji mkpu ákwá siri ike na anya mmiri kpesie ekpere ike ma rịọkwa . . . arịrịọ.” (Ndị Hibru 5:7) Olee mgbe nke a mere?

16 O mere kpọmkwem n’awa ndị ikpeazụ Jizọs dịrị ndụ n’ụwa mgbe Setan ji ike ya nile mee mgbalị ikpeazụ ime ka Jizọs kwụsị ikwesị ntụkwasị obi nye Chineke. O yiri ka Jizọs ò chegburu nnọọ onwe ya maka otú ọnwụ ya dị ka onye a kpọrọ omempụ ga-esi mebie aha Nna ya nke na ka “ọ nọgidere na-ekpesi ekpere ike [n’ogige Getsemeni] ọsụsọ ya dịkwa ka ntapụ ọbara nke na-atapụsị n’ala.” Awa ole na ole ka nke ahụ gasịrị, otú Jizọs si na-anwụ n’elu osisi ịta ahụhụ fụrụ ya ụfụ nke na o tiri “mkpu ákwá siri ike [ma bepụta] anya mmiri.” (Luk 22:42-44; Mak 15:34) O si otú ahụ ‘mụta nrubeisi site n’ahụhụ ndị ọ tara’ ma mee ka obi Nna ya ṅụrịa. Ugbu a Jizọs nọ n’eluigwe, ọ na-emetụ ya n’ahụ́ ịhụ ihe mgbu anyị na-enwe ka anyị na-agbalị mgbe mgbe irube isi.—Ilu 27:11; Ndị Hibru 2:18; 4:15.

Ịmụta Irube Isi

17. Olee otú anyị kwesịrị isi lee ịdọ aka ná ntị anya?

17 Mgbe nne gị na nna gị dọrọ gị aka ná ntị, ọ na-egosi na ha na-echere gị echiche ọma, na ha hụrụ gị n’anya. Bible jụrụ, sị: “Olee nwa nke nna ya na-adịghị adọ aka ná ntị?” Ọ́ gaghị ewute gị ma ọ bụrụ na ndị mụrụ gị ahụrughị gị n’anya nke iwepụta oge zuru ezu na ime mgbalị iji gbazie gị? N’otu aka ahụ, Jehova na-agbazi gị n’ihi na ọ hụrụ gị n’anya. “N’eziokwu, ọ dịghị ịdọ aka ná ntị ọ bụla na-eyi mgbe ahụ ka ọ bụ ihe ọṅụ, kama ihe mwute; ma n’ikpeazụ, nye ndị e jiworo ya zụọ, ọ na-amịrị ha mkpụrụ udo, ya bụ, ezi omume.”—Ndị Hibru 12:7-11.

18. (a) Olee ihe ịdọ aka ná ntị e ji ịhụnanya nye na-egosi? (b) Olee ihe ọma ndị ị hụrụla ụdị ịdọ aka ná ntị ahụ rụpụtara n’ime ndị mmadụ?

18 Otu eze chịrị Izrel n’oge ochie, bụ́ onye Jizọs kwuru na ọ maara ihe nke ukwuu, kwuru mkpa ọ dị nne na nna mmadụ iji ịhụnanya gbazie onye ahụ. Solomọn dere, sị: “Onye na-egbochi mkpanaka ya na-akpọ nwa ya asị: ma onye na-ahụ ya n’anya na-adọsi ya aka ná ntị ike.” Solomọn kwudịrị na onye na-ekwe ka a gbazie ya pụrụ ime ka a napụta mkpụrụ obi ya n’ọnwụ. (Ilu 13:24; 23:13, 14; Matiu 12:42) Otu nwanyị bụ́ Onye Kraịst chetara na mgbe ya kpara àgwà na-adịghị mma n’ọmụmụ ihe Ndị Kraịst mgbe ya ka dị obere, nna ya ga-agwa ya na ya ga-adọ ya aka ná ntị ma a laruo. Ugbu a, ọ na-eme ya obi ụtọ mgbe ọ bụla o chetara otú nna ya si jiri ịhụnanya dọọ ya aka ná ntị bụ́ nke mere ka ọ bụrụ ezigbo mmadụ.

19. Olee ihe kasị mkpa mere i kwesịrị iji rubere ndị mụrụ gị isi?

19 Ọ bụrụ na i nwere nne na nna hụrụ gị n’anya nke na ha ga-ewepụta oge ma mee mgbalị iji dọọ gị aka ná ntị, kelee Chineke. Rubere ha isi, ọbụna otú ahụ Onyenwe anyị Jizọs Kraịst si rubere nne na nna ya, bụ́ Josef na Meri, isi. Ma ka ihe kasị mkpa mere ị ga-eji na-erubere ha isi bụrụ na Nna anyị nke eluigwe, bụ́ Jehova Chineke, gwara gị ka i mee otú ahụ. Ọ bụrụ na i rubere ha isi, ị ga-abara onwe gị uru, ihe “[ewee] gaara gị nke ọma . . . i wee nọọkwa ogologo oge n’elu ụwa.”—Ndị Efesọs 6:2, 3.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 7 Lee akwụkwọ bụ́ Insight on the Scriptures, Mpịakọta nke 2, peeji nke 841, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

Olee Otú Ị Ga-esi Zaa?

• Olee uru ụmụaka nwere ike irite site n’irubere ndị mụrụ ha isi?

• Mgbe Jizọs bụ nwatakịrị, olee otú o si setịpụ ihe nlereanya n’irubere nne na nna ya isi?

• Olee otú Jizọs si mụta nrubeisi?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 24]

Jizọs maara Akwụkwọ Nsọ nke ọma mgbe ọ dị afọ iri na abụọ

[Foto dị na peeji nke 26]

Olee otú Jizọs si mụta nrubeisi site n’ahụhụ ndị ọ tara?