Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Enyemaka Sitere n’Aka “Chineke Onye Na-enye Ntachi Obi na Nkasi Obi”

Enyemaka Sitere n’Aka “Chineke Onye Na-enye Ntachi Obi na Nkasi Obi”

Enyemaka Sitere n’Aka “Chineke Onye Na-enye Ntachi Obi na Nkasi Obi”

IHE dị ka puku afọ abụọ gara aga, Pọl, bụ́ onye so dee Bible, kọwara Jehova dị ka “Chineke onye na-enye ntachi obi na nkasi obi.” (Ndị Rom 15:5) Ebe Bible mesiri anyị obi ike na Jehova adịghị agbanwe agbanwe, anyị pụrụ inwe obi ike na Chineke ka na-akasi ndị na-ejere ya ozi obi. (Jems 1:17) N’ezie, Bible gosiri na Jehova na-esi n’ụzọ dị iche iche akasi ndị nọ ná mkpa obi. Olee ụfọdụ n’ime ụzọ ndị a? Chineke na-enye ndị na-ekpegara ya ekpere maka enyemaka ume. Ọ na-akpalikwa ezi Ndị Kraịst ịkasi ndị kwere ekwe ibe ha obi. Jehova mekwara ka e dekọọ akụkọ ndị na-emesi obi ike n’Okwu ya bụ́ Bible, bụ́ nke na-akasi ndị na-eru uju n’ihi nwa ha nwụrụnụ obi karịsịa. Ngwa ka anyị tụlee ụzọ atọ ndị a Jehova si akasị anyị obi otu otu.

“Jehova Wee Nụrụ”

Eze Devid dere banyere Onye kere anyị bụ́ Jehova, sị: “Tụkwasịnụ Ya obi na mgbe nile, unu ndị ya; wụsịanụ obi unu n’ihu Ya dị ka mmiri: Chineke bụụrụ anyị ebe mgbaba.” (Abụ Ọma 62:8) Gịnị mere Devid ji tụkwasị Jehova obi otú a? Mgbe Devid na-ekwu banyere onwe ya, o dere, sị: “Onye a e wedara n’ala kpọrọ oku, Jehova wee nụrụ ya, wee si ná mkpagbu ya nile zọpụta ya.” (Abụ Ọma 34:6) N’ahụhụ nile Devid tara, ọ dịghị nke ọ na-ekpegaraghị Chineke ekpere maka enyemaka, Jehova nyekwaara ya aka mgbe nile imeri ha. Devid maara site n’ihe ndị ọ gabigara na Chineke ga-akwado ya ma nyere ya aka idi ihe ọ bụla bịara ya.

Ndị nne na nna na-eru uju kwesịrị ịmara na Jehova ga-akasi ha obi n’oge ndị ahụ ha nọ n’oké mwute dị ka ọ kasiri Devid. Ha pụrụ ijekwuru onye ukwu “Na-anụ ekpere,” na-enwe obi ike na ọ ga-enyere ha aka. (Abụ Ọma 65:2) William, bụ́ onye a kpọtụrụ aha n’isiokwu bu nke a ụzọ, kwuru, sị: “Ọtụtụ mgbe, echere m na m ga-ekubi ume ma ọ bụrụ na ahụghị m nwa m, arịọkwara m Jehova ka o nyere m aka inweta onwe m. Ọ nọgidela na-enye m ume na obi ike iji nọgide na-adị ndụ.” Ọ bụrụkwa na gị onwe gị ejiri okwukwe rịọ Jehova ka o nyere gị aka, Chineke ukwu anyị bi n’eluigwe ga-enyere gị aka. A sị kwuwe, Jehova Chineke kwere ndị na-agbalịsi ike ijere ya ozi nkwa, sị: “Mụ onwe m, Jehova, Chineke gị, na-ejidesi aka nri gị ike, bụ́ Onye na-asị gị, Atụla egwu, Mụ onwe m enyeworo gị aka.’”—Aịsaịa 41:13.

Nkwado Ezi Ndị Enyi Na-enye

Mgbe ụfọdụ ọ na-adị ndị nwa ha nwụnahụrụ mkpa ịnọrọ onwe ha ma ruo uju nwa ha. Ma ọ gaghị abụ ihe amamihe dị na ya ma ọ bụrụ na ha ezere iso ndị ọzọ na-akpakọrịta ruo ogologo oge. Dị ka Ilu 18:1 si kwuo, “onye na-ekewapụ onwe ya” nwere ike ịdaba ná nsogbu. N’ihi ya, ndị na-eru uju kwesịrị ịkpachara anya ka ha ghara ikewapụ onwe ha.

Ndị enyi na-atụ egwu Chineke pụrụ inyere ndị nọ ná nsogbu aka. Ilu 17:17 kwuru, sị: “Na mgbe nile ka enyi na-ahụ n’anya, a na-amụkwa nwanne banyere ahụhụ.” Mgbe nwa nwoke Lucy, bụ́ onye a kpọtụrụ aha n’isiokwu bu nke a ụzọ nwụrụ, ezi ndị enyi ya kasiri ya obi. O kwuru banyere ndị enyi ya nọ n’ọgbakọ, sị: “Ọbịbịa ha na-abịa eleta anyị nyere nnọọ aka, ọ bụ ezie na mgbe ụfọdụ ha adịghị ekwu ọtụtụ okwu ma ha bịa. Otu enyi m na-abịa eleta m n’ụbọchị ndị nanị m nọ. Ọ maara na m ga-anọ n’ụlọ na-ebe ákwá, ọ na-abịakarịkwa soro m bee ákwá. Onye nke ọzọ na-akpọ m na fon kwa ụbọchị iji gbaa m ume. Ndị ọzọ na-akpọ anyị ka anyị bịa rie nri n’ụlọ ha, ha ka nọgidekwara na-akpọ anyị.”

Ọ bụ ezie na mwute ndị nne na nna na-enwe ma nwa ha nwụọ adịghị apụ ha n’obi ngwa ngwa, ikpegara Chineke ekpere na iso ezi Ndị Kraịst na-akpakọrịta ga-akasi nnọọ ndị na-eru uju obi. Ọtụtụ ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst nwa ha nwụnahụrụ achọpụtala na Jehova ahapụghị ha. N’ezie, Jehova “na-eme ka ndị obi ha tiwara etiwa dịrị ndụ, Ọ na-ekechikwa ihe mgbu nile ha.”—Abụ Ọma 147:3.

Akụkọ Ndị Dị na Bible Bụ́ Ndị Na-akasi Obi

E wezuga ekpere na mkpakọrịta na-ewuli elu, Okwu Chineke e dere ede na-akasi ndị na-eru uju obi. Bible kọrọ ihe ndị gosiri na Jizọs chọsiri ike ma nwee ikike ịkwụsị ihe mgbu ndị nne na nna nwa ha nwụnahụrụ na-enwe site n’ịkọrọ anyị otú o si kpọlite ụmụ ha ndị nwụrụ anwụ. Akụkọ ndị a na-akasi nnọọ ndị na-eru uju obi. Ugbu a, ka anyị tụlee abụọ n’ime ha.

Luk isi 7 kọrọ ihe mere mgbe Jizọs zutere ndị na-aga ili ozu n’obodo Nen. Ndị ahụ na-aga ili nanị nwa nwoke otu nwanyị di ya nwụrụ mụrụ. Amaokwu nke 13 na-ekwu, sị: “Mgbe Onyenwe anyị hụkwara ya, o nwere ọmịiko n’ebe ọ nọ, o wee sị ya: ‘Kwụsị ịkwa ákwá.’”

Ọ bụ nanị mmadụ ole na ole ga-akata obi gwa nwanyị a chọrọ ili nwa ya ka ọ kwụsị ịkwa ákwá. Ma, gịnị mere Jizọs ji gwa ya nke a? Ọ bụ n’ihi na ọ maara na iru uju nwanyị ahụ na-aga ịkwụsị. Akụkọ ahụ gara n’ihu ikwu, sị: “[Jizọs] garuru nso ma bitụ ihe ahụ e ji ebu ozu aka, ndị bu ya wee guzoro n’otu ebe, o wee sị: ‘Nwa okorobịa, asị m gị, Bilie!’ Onye ahụ nwụrụ anwụ wee bilie nọrọ ọdụ ma malite ikwu okwu, o wee kpọnye ya nne ya.” (Luk 7:14, 15) Ọ ga-abụ na nwanyị ahụ bere ákwá ọzọ ozugbo Jizọs mere ihe a, ma na nke ugbu a, o bere ákwá n’ihi ọṅụ.

N’oge ọzọ, otu nwoke aha ya bụ́ Jeirọs bịakwutere Jizọs na-arịọ ya ka ọ bịa gwọọ nwa ya nwanyị dị afọ iri na abụọ nke nọ n’ọnụ ọnwụ. Obere oge ka ọ gwasịrị Jizọs nke a, e ziteere Jeirọs ozi na nwa ahụ anwụọla. Akụkọ a ọ nụrụ wutere ya nnọọ, ma Jizọs gwara ya, sị: “Atụla egwu, nanị gosipụta okwukwe.” Mgbe Jizọs rutere n’ụlọ Jeirọs, ọ bara n’ebe a dọwara nwa ahụ nwụrụ anwụ. O jidere ya n’aka ma kwuo, sị: “Obere nwaada, asị m gị, Bilie!” Gịnị meziri? “Ozugbo ahụkwa, obere nwaada ahụ biliri ma malite ije ije.” Gịnị ka ndị mụrụ ya mere? “Ha wee jupụta n’oké obi ụtọ.” Jeirọs na nwunye ya ji nnọọ obi ụtọ makụọ nwa ha nwanyị. Ọ dị ha nnọọ ka ọ bụ ná nrọ.—Mak 5:22-24, 35-43.

Ihe ndị a Bible kọrọ banyere ụmụaka ndị a kpọlitere n’ọnwụ na-egosi ndị nne na nna na-eru uju taa ihe ha pụrụ ịdị na-atụ anya ya. Jizọs kwuru, sị: “Oge awa na-abịa mgbe ndị nile nọ n’ili ncheta ga-anụ olu ya wee pụta.” (Jọn 5:28, 29) Nzube Jehova bụ na Ọkpara ya ga-eme ka ndị nwụrụ anwụ dịghachi ndụ. Ọtụtụ nde ụmụaka nwụrụ anwụ “ga-anụ olu ya” mgbe ọ ga-agwa ha sị: “Asị m gị, Bilie!” Ha ga-amaliteghachi ịga ije na ikwu okwu. Dịkwa nnọọ ka Jeirọs na nwunye ya, ndị mụrụ ụmụ ndị a ‘ga-ejupụta n’oké obi ụtọ.’

Ọ bụrụ na e nwere nwa gị nwoke ma ọ bụ nwa gị nwanyị nwụnahụrụ gị, biko mara na Jehova pụrụ iji mbilite n’ọnwụ mee ka iru uju gị ghọọ ọṅụ. Iji rite uru na-atụmanya a dị ebube, ị ghaghị ime ihe a ọbụ abụ ahụ gbara ume ya: “Na-achọnụ Jehova na ike Ya; chọọnụ ihu Ya mgbe nile. Chetanụ oké ọrụ Ya nile nke Ọ rụworo, ihe ebube Ya nile.” (Abụ Ọma 105:4, 5) Kpebie ịdị na-ejere ezi Chineke ahụ bụ́ Jehova ozi, ma na-efe ya n’ụzọ ọ na-anakwere.

Olee uru i ga-erite ugbu a ma ọ bụrụ na ị ‘chọọ Jehova’? Ikpegara Chineke ekpere ga-enye gị ume, ndị enyi na-ahụ n’anya bụ́ ezi Ndị Kraịst ga-akasi gị obi, ịmụ Okwu Chineke ga-emekwa ka ahụ́ ruo gị ala. Ọbụna n’ọdịnihu dị nso, ị ga-ahụ ‘oké ọrụ na ọrụ ebube’ Jehova ga-arụ maka ọdịmma ebighị ebi gị na nke ụmụ ndị ahụ nwụnahụrụ gị.

[Igbe dị na peeji nke 5]

“Kpọọrọ M Nwanyị ahụ Ụmụ Ya Abụọ Nwụrụ”

Na Nigeria, e nwere di na nwunye bụ́ Ndịàmà Jehova aha ha bụ́ Kehinde na Bintu. Abụọ n’ime ụmụ ha anọ nwụrụ n’ihe mberede ụgbọala. Kemgbe ahụ, ha nọ nnọọ ná n’oké mwute n’ihi ọnwụ ụmụ ha. Ma, ntụkwasị obi ha nwere n’ebe Jehova nọ nyeere ha aka idi ihe dakwasịrị ha ma nọgide na-ekwusara ndị agbata obi ha ozi olileanya dị na Bible.

Ndị ọzọ chọpụtara na Kehinde na Bintu nwere nnọọ obi ike na mmụọ dị jụụ. Otu ụbọchị otu nwanyị a na-akpọ Oriakụ Ukoli gwara otu n’ime ndị enyi Bintu, sị: “Kpọọrọ m nwanyị ahụ ụmụ ya abụọ nwụrụ n’otu oge ma ya aka nọgide na-ekwusa ozi ọma. Achọrọ m ịma ihe nyere ya obi ike idi ya.” Mgbe Bintu rutere, Oriakụ Ukoli gwara ya, sị: “Achọrọ m ịma ihe ị ka ji nọgide na-ekwusa banyere Chineke nke gburu ụmụ gị. Chineke gburu nanị otu nwa nwanyị m mụrụ. Kemgbe ahụ, o nweghị ihe ọ bụla jikọrọ mụ na Chineke.” Bintu jiri Bible kọwaara ya ihe mere ndị mmadụ ji na-anwụ na ihe mere anyị ga-eji nwee olileanya na a ga-akpọlite ndị anyị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ.—Ọrụ 24:15; Ndị Rom 5:12.

Mgbe ọ kọwachaara ya nke a, Oriakụ Ukoli kwuru, sị: “Anaara m eche na ọ bụ Chineke na-egbu ndị mmadụ. Ma ugbu a amatala m nke bụ́ eziokwu.” O kpebiri iso Ndịàmà Jehova na-amụ Bible iji matakwuo banyere nkwa ndị Chineke kwere.

[Igbe dị na peeji nke 6]

‘Achọrọ M Inye Aka, Ma Amaghị M Otú M Ga-esi Enye Ya’

Ka ndị ezinụlọ na-eru újú n’ihi ọnwụ onye ezinụlọ ha, ndị enyi ha pụrụ ịdị na-eche ihe ha ga-eme iji nyere ha aka. Ha chọrọ inyere ha aka ma ụjọ ji ha na ha kwuo ihe na-adịghị mma ma ọ bụ ghara imete ihe ụfọdụ, ọ pụrụ ime ka ndị a nọrọkwuo ná mwute. Lee ụfọdụ aro ndị a tụụrụ ndị pụrụ ịdị na-eche, sị, ‘Achọrọ m inye aka, ma amaghị m otú m ga-esi enye ya.’

❖ Agbarala ndị ahụ mmadụ nwụnahụrụ ọsọ n’ihi na ị maghị ihe ị ga-ekwu ma ọ bụ ihe ị ga-eme. Nanị ịga nọnyere ha ezuola ịkasi ha obi. Ọ̀ na-esiri gị ike icheta ihe ị ga-ekwu? Ịnọkete ha nso ma ọ bụ ijide ha aka ma sị ha “ndo” na-eme ka ha ghọta na ihe mere ha na-ewute gị. Ụjọ ọ̀ na-atụ gị na ị ga-emekwu ka obi na-ajọ ha njọ ma i bewe àkwà? Bible kwuru, sị: “Soronụ ndị na-akwa ákwá kwaa ákwá.” (Ndị Rom 12:15) Anya mmiri ahụ na-agba gị na-egosi na ihe a mere ha na-ewute gị, ọ na-akasikwa ha obi.

❖ Echela ka a gwa gị ihe ị ga-eme agwa. Ì nwere ike isiri ha nri? Ì nwere ike ịsara ha efere? Ì nwere ike ịgara ha ozi ụfọdụ? Ekwula sị, “Gwanụ m mgbe unu chọrọ enyemaka m.” Ihe a i kwuru pụrụ isi gị n’obi, ma otú ọtụtụ n’ime ha ga-esi ghọta ya bụ́ na i nweghị ohere inyere ha aka. Kama jụọ ha, sị, “Gịnị ka m ga-emere unu ugbu a?” Meekwara ha ihe ha rịọrọ. Mgbe ị na-enyere ha aka, abanyela ebe ndị nwe ụlọ na-adịghị ekwe ka ndị ọzọ banye ma ọ bụ nyonyewe anya n’okwu ndị na-agbasaghị gị.

❖ Agwala ha na ị maara otú ọ dị ha n’obi. Anyị nile nwere otú dị iche anyị si eme ma onye anyị hụrụ n’anya nwụọ. A sịgodị na enweela nwa gị nwụrụnụ, ị maghị kpọmkwem otú nke ha dị ha n’obi.

❖ Ọ ga-ewe oge tupu ha amalitekwa ime otú ha naara eme. Nọgide na-enyere ha aka ruo oké ike kwere gị. Ndị mmadụ na-agakarị anọnyere ndị mmadụ nwụnahụrụ mgbe onye ha nwụrụ ọhụrụ, ma a chọrọ ka a na-eleta ha mgbe nile ọ bụghị nanị ụbọchị ole na ole ma ọ bụ izu ole na ole ihe ahụ mesịrị. Chọpụta ihe ndị dị ha mkpa n’izu na n’ọnwa ndị na-abịa n’ihu. *

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 29 Iji matakwuo otú e kwesịrị isi nyere ndị na-eru újú n’ihi ọnwụ nwa ha aka, lee isiokwu bụ́ “Olee Otú Ndị Ọzọ Pụrụ Isi Nye Aka?” na peeji nke 20-24 nke broshuọ Ndịàmà Jehova bipụtara aha ya bụ́ Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ.

[Foto ndị dị na peeji nke 7]

Bible kọrọ ihe ndị gosiri na Jizọs nwere ikike na ọchịchọ ịkpọlite ụmụaka n’ọnwụ