Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Unu Atọsala Ihe Chineke Kekọtara

Unu Atọsala Ihe Chineke Kekọtara

Unu Atọsala Ihe Chineke Kekọtara

“Ha abụkwaghị anụ ahụ́ abụọ, kama otu. Ya mere, ihe Chineke kekọtaworo, mmadụ ọ bụla atọsala ya.”—MATIU 19:6.

1, 2. Gịnị mere o ji bụrụ ma ihe Akwụkwọ Nsọ kwadoro ma ihe ezi uche dị na ya ịtụ anya na ndị di na nwunye ga-enwe nsogbu mgbe ụfọdụ?

KA E were ya na ị na-achọ iji ụgbọala eme njem dị anya. Ị̀ ga-enwe nsogbu n’ụzọ? Ọ ga-abụ ihe amamihe na-adịghị na ya iche na ị gaghị enwe. Dị ka ihe atụ, oké mmiri ozuzo pụrụ ịmalite, bụ́ nke ga-eme ka ọ dị mkpa na ị ga-eji nwayọ na-agba ma na-elezi anya. Ka ị na-aga, ụgbọala gị nwere ike ịmalite inye nsogbu nke ị na-agaghị arụzili, bụ́ nke ga-achọ ka ị chọta onye na-arụzi ụgbọala. Ihe ndị a hà kwesịrị ime ka i chee na ị garaghị amalite njem ahụ ma mee ka ị hapụ ụgbọala ahụ n’okporo ụzọ? Mbanụ. Mgbe ị na-eme njem dị anya, ị ga-atụ anya na ị ga-enwe nsogbu, nke a ga-emekwa ka i jiri amamihe mara ihe ị ga-eme banyere nsogbu ndị ahụ.

2 Otú ahụ ka ọ dị n’alụmdi na nwunye. A ga-enwerịrị nsogbu, ọ bụkwa ihe ezi uche na-adịghị na ya ma ndị na-achọ ịlụ di na nwunye chee na ha agaghị enwe nsogbu ọ bụla. Ná 1 Ndị Kọrint 7:28, Bible kwuru hoo haa na ndị di na nwunye ga-enwe “mkpagbu n’anụ ahụ́ ha.” N’ihi gịnị ka ọ ga-eji dị otú ahụ? Igbu ya na nkenke, ọ bụ n’ihi na di na nwunye ahụ ezughị okè, anyị na-ebikwa ‘n’oge pụrụ iche nke siri ike obibi.’ (2 Timoti 3:1; Ndị Rom 3:23) N’ihi ya, ọbụna di na nwunye na-ebi nnọọ n’udo ma na-atụ egwu Chineke ga-enwe ihe isi ike mgbe ụfọdụ.

3. (a) Olee otú ọtụtụ ndị n’ụwa si ele alụmdi na nwunye anya? (b) N’ihi gịnị ka Ndị Kraịst ji agbalịsi ike ịhụ na alụmdi na nwunye ha atọsaghị?

3 Taa, di na nwunye ụfọdụ nwee nsogbu, ihe mbụ na-agbata ha n’obi bụ ịgba alụkwaghịm. N’ọtụtụ mba, ọnụ ọgụgụ ndị na-agba alụkwaghịm na-arị elu n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị egwu. Ma ezi Ndị Kraịst na-agbalị idozi nsogbu ha kama ịgba alụkwaghịm. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ha weere alụmdi na nwunye dị ka onyinye dị nsọ nke sitere n’aka Jehova. Jizọs kwuru okwu banyere ndị lụrụ di na nwunye, sị: “Ihe Chineke kekọtaworo, mmadụ ọ bụla atọsala ya.” (Matiu 19:6) Ọ bụ eziokwu na ọ bụghị mgbe nile ka ọ na-adị mfe ime ihe a Jizọs kwuru. Dị ka ihe atụ, ndị ikwu na ndị ọzọ—gụnyere ụfọdụ ndị na-enye ndị lụrụ di na nwunye ndụmọdụ—bụ́ ndị na-ejighị ụkpụrụ Bible kpọrọ ihe, na-agbakarị di na nwunye ume ịgba alụkwaghịm n’ihi ihe Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị. * Ma Ndị Kraịst maara na ọ ka nnọọ mma idozi nsogbu dapụtara n’etiti di na nwunye karịa ịgba alụkwaghị m ozugbo nsogbu dapụtara. N’ezie, ọ dị oké mkpa ka anyị si ná mmalite kpebie ime uche Jehova—ọ bụghị ịgbaso ndụmọdụ ndị ọzọ nyere.—Ilu 14:12.

Imeri Ihe Isi Ike

4, 5. (a) Olee ihe ịma aka ndị anyị ga-ezuterịrị n’alụmdi na nwunye? (b) N’ihi gịnị ka ụkpụrụ ndị dị n’Okwu Chineke ji enye aka ọbụna mgbe di na nwunye nwere nsogbu?

4 Nke bụ́ eziokwu bụ na alụmdi na nwunye ọ bụla chọrọ ka a na-elebara ya anya nke ọma site n’oge ruo n’oge. Ọtụtụ mgbe, nke a na-agụnye idozi ụmụ obere nghọtahie e nwere. Otú ọ dị, a pụrụ inwe nsogbu ndị siri oké ike bụ́ ndị ga-achọ itisa alụmdi na nwunye ụfọdụ. Mgbe ụfọdụ, unu pụrụ ịrịọ okenye ọgbakọ lụrụ nwanyị ka o nyere unu aka. Otú ọ dị, inwe nsogbu ndị dị otú a apụtaghị na alụmdi na nwunye gị akụọla afọ n’ala. Nanị ihe ha na-eme ka ọ pụta ìhè bụ mkpa ọ dị ịgbasochi ụkpụrụ Bible anya n’idozi nsogbu.

5 Dị ka onye kere mmadụ na Onye malitere alụmdi na nwunye, Jehova maara ihe dị anyị mkpa iji mee ka alụmdi na nwunye anyị na-aga nke ọma karịa ka onye ọ bụla ọzọ maara. Ma ajụjụ bụ, Ànyị ga-aṅa ntị na ndụmọdụ ndị dị n’Okwu ya ma jiri ha na-eme ihe? Ọ ga-abara anyị uru n’ezie ma ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ. Jehova gwara ndị ohu ya n’oge ochie, sị: “Ọ ga-adị m nnọọ mma ma a sị na ị ṅararịị ntị n’ihe nile M nyere n’iwu! udo gị ewee dịworịị ka osimiri, ezi omume gị adịkwa ka mmali mmiri nile nke oké osimiri.” (Aịsaịa 48:18) Ịgbaso ntụziaka ndị e depụtara na Bible pụrụ ime ka alụmdi na nwunye anyị gaa nke ọma. Ka anyị buru ụzọ tụlee ndụmọdụ Bible na-enye ndị bụ́ di.

“Nọgidenụ Na-ahụ Nwunye Unu n’Anya”

6. Olee ndụmọdụ Akwụkwọ Nsọ nyere ndị bụ́ di?

6 Pọl onyeozi nyere ndị bụ́ di ntụziaka doro anya n’Akwụkwọ ozi o degaara ndị Efesọs. O dere, sị: “Ndị bụ́ di, nọgidenụ na-ahụ nwunye unu n’anya, dị nnọọ ka Kraịst ahụ hụkwara ọgbakọ ahụ n’anya ma nyefee onwe ya maka ya. N’ụzọ dị otú a, ndị bụ́ di kwesịrị ịdị na-ahụ nwunye ha n’anya dị ka ahụ́ nke ha. Onye hụrụ nwunye ya n’anya hụrụ onwe ya n’anya, n’ihi na ọ dịghị nwoke kpọtụworo anụ ahụ́ nke ya asị; kama ọ na-azụ ma na-elezi ya anya, dị ka Kraịst ahụ na-emekwara ọgbakọ ahụ. Otú o sina dị, ka onye ọ bụla n’ime unu n’otu n’otu sikwa otú ahụ hụ nwunye ya n’anya dị ka o si hụ onwe ya n’anya.”—Ndị Efesọs 5:25, 28, 29, 33.

7. (a) Gịnị kwesịrị ịbụ otu ihe dị oké mkpa nke ga-adị n’alụmdi na nwunye Ndị Kraịst? (b) Olee otú ndị bụ́ di si anọgide na-ahụ nwunye ha n’anya?

7 Pọl ekwughị okwu banyere nsogbu nile pụrụ ibilite n’etiti di na nwunye. Kama ọ rụtụrụ aka kpọmkwem n’otu ihe dị oké mkpa kwesịrị ịdị n’alụmdi na nwunye Onye Kraịst ọ bụla, ya bụ́, ịhụnanya. N’ezie, a kpọtụrụ ịhụnanya aha ugboro isii n’amaokwu ndị a e hotara na paragraf nke isii. Rịbakwa ama na Pọl gwara ndị bụ́ di, sị: “Nọgidenụ na-ahụ nwunye unu n’anya.” Ihe ịrụ ụka adịghị ya na Pọl ma na ọ dị mfe ịmalite ịhụ mmadụ n’anya karịa ịnọgide na-ahụ onye ahụ n’anya. Nke a bụ eziokwu karịsịa “n’ụbọchị ikpeazụ” a, mgbe ọtụtụ mmadụ bụ “ndị hụrụ onwe ha n’anya” na “ndị na-adịghị njikere ime nkwekọrịta ọ bụla.” (2 Timoti 3:1-3) Àgwà ọjọọ ndị dị otú a na-akpa alụmdi na nwunye aka ọjọọ taa, ma di nke hụrụ nwunye ya n’anya agaghị ekwe ka àgwà ịchọ ọdịmma onwe onye nanị nke e ji mara ụwa a mee ka ọ na-eche echiche ma ọ bụ na-akpa àgwà dị ka ụwa si chọọ.—Ndị Rom 12:2.

Olee Otú Ị Ga-esi Na-enye Nwunye Gị Ihe Ndị Na-akpa Ya?

8, 9. Olee ụzọ ndị Onye Kraịst bụ́ di si enye nwunye ya ihe ndị na-akpa ya?

8 Ọ bụrụ na ị bụ Onye Kraịst bụ́ di, olee otú ị ga-esi zere ọchịchọ ime ihe ga-adị nanị onwe gị mma ma gosi na ị hụrụ nwunye gị n’anya miri emi n’ebe nwunye gị nọ? N’akwụkwọ ozi ahụ Pọl degaara ndị Efesọs, bụ́ nke e hotara na paragraf nke 7, Pọl kwuru ihe abụọ ọ dị mkpa ka i mee—na-enye nwunye gị ihe ndị na-akpa ya, jirikwa ya kpọrọ ihe dị ka i ji ahụ́ nke onwe gị kpọrọ ihe. Olee otú ị ga-esi na-enye nwunye gị ihe ndị na-akpa ya? Otu ụzọ bụ site n’igbo mkpa anụ ahụ́ nwunye gị. Pọl degaara Timoti akwụkwọ, sị: “N’ezie, ọ bụrụ na onye ọ bụla adịghị egboro ndị nke ya mkpa ha, karịsịakwa ndị bụ́ ndị ezinụlọ ya, ọ jụwo okwukwe, jọkarịakwa onye na-ekweghị ekwe ná njọ.”—1 Timoti 5:8.

9 Ma a chọrọ ihe karịrị nanị inye ya nri, uwe na ụlọ. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na onye bụ́ di pụrụ ịdị na-eme nke ọma n’inye nwunye ya ihe ndị a ma ghara ịdị na-echebara mmetụta ndị ọ na-enwe echiche na ihe ndị ga-enyere ya aka ime ka mmekọrịta ya na Jehova sie ike. Ọ dị nnọọ oké mkpa ka onye bụ́ di na-eme ihe ndị a. N’ezie, ọtụtụ Ndị nwoke bụ́ Ndị Kraịst na-arụsi ọrụ ike n’ibu ibu ọrụ ndị dị n’ọgbakọ. Na onye bụ́ di nwere ọrụ dị ukwuu ịrụ n’ọgbakọ apụtaghị na ọ ga-eleghara ọrụ Chineke nyere ya dị ka onyeisi ezinụlọ anya. (1 Timoti 3:5, 12) Afọ ole na ole gara aga, Ụlọ Nche kwuru banyere nke a, sị: “N’ụzọ kwekọrọ n’ihe ndị Bible chọrọ n’aka ha, a pụrụ ịsị na ‘nleta ọzụzụ atụrụ na-amalite n’ụlọ.’ Ọ bụrụ na onye okenye eleghara ezinụlọ ya anya, ọ pụrụ itinye nhọpụta ahụ a họpụtara ya n’ihe ize ndụ.” * O doro anya na ọ dị oké mkpa ka ị na-enye nwunye gị ihe ndị na-akpa ya nke gụnyere inye ya ihe ndị e ji elekọta anụ ahụ́, ichebara mmetụta ndị ọ na-enwe echiche, nakwa nke ka mkpa, inyere ya aka ime ka mmekọrịta ya na Jehova sie ike.

Gịnị Ka Iji Nwunye Gị Kpọrọ Ihe Pụtara?

10. Olee otú di pụrụ isi jiri nwunye ya kpọrọ ihe?

10 Ọ bụrụ na i ji nwunye gị kpọrọ ihe, ị ga na-elekọta ya n’ihi na ị hụrụ ya n’anya. E nwere ọtụtụ ụzọ ị pụrụ isi mee nke a. Nke mbụ, wepụta ezigbo oge na-anọnyere nwunye gị. Ọ bụrụ na i leghara nwunye gị anya n’akụkụ a, ịhụnanya o nwere n’ebe ị nọ pụrụ ịjụ oyi. Marakwa na ogologo oge i chere i kwesịrị iji nọnyere nwunye gị nwere ike ịdị iche n’ihe nwunye gị chere n’onwe ya. O bighị n’ikwu ya n’ọnụ na i ji nwunye gị kpọrọ ihe. Nwunye gị kwesịrị ịchọpụta n’ezie na i ji ya kpọrọ ihe. Pọl dere, sị: “Ka onye ọ bụla nọgide na-achọ, ọ bụghị uru nke ya, kama nke onye nke ọzọ.” (1 Ndị Kọrịnt 10:24) Iji gosi na ị bụ di na-ahụ n’anya, ị ga-agbalị chọpụta ihe na-akpa nwunye gị n’ezie.—Ndị Filipaị 2:4.

11. Olee otú ụzọ di si emeso nwunye ya ihe si emetụta mmekọrịta ya na Chineke nakwa ọnọdụ ya n’ọgbakọ?

11 Ụzọ ọzọ ị ga-esi gosi na i ji nwunye gị kpọrọ ihe bụ site n’imeso ya ihe n’ụzọ dị nro, ma n’okwu ọnụ ma n’omume. (Ilu 12:18) Pọl degaara ndị Kọlọsi akwụkwọ, sị: “Unu ndị bụ́ di, nọgidenụ na-ahụ nwunye unu n’anya, unu adịkwala na-eweso ha iwe n’ụzọ dị ilu.” (Ndị Kọlọsi 3:19) Dị ka otu akwụkwọ si kwuo, a pụrụ ikwu na akụkụ ikpeazụ nke okwu Pọl ahụ pụtara “emesola ya ihe ka ọ̀ bụ odibo” ma ọ bụ “ejila ya emere odibo.” Di nke ji aka ike na-emeso nwunye ya ihe—ma ọ bụ mgbe nanị ya na nwunye ya nọ ma ọ bụ n’ihu ndị ọzọ—adịghị egosi ma ọlị na ya ji nwunye ya kpọrọ ihe. Ọ bụrụ na o jiri aka ike na-emeso nwunye ya ihe, ọ pụrụ imebi mmekọrịta ya na Chineke. Pita onyeozi degaara ndị bụ́ di akwụkwọ ozi, sị: “Unu ndị bụ́ di, nọgidenụ soro ha na-ebi n’otu ụzọ ahụ dị ka ihe ọmụma si dị, na-ekenye ha nsọpụrụ dị ka ihe ka bụrụ nke na-esighị ike, ihe bụ́ nwanyị, ebe unu so ha bụrụ ndị nketa nke ihu ọma na-erughịrị mmadụ nke ndụ, ka e wee ghara igbochi ekpere unu.” *1 Pita 3:7.

12. Gịnị ka Onye Kraịst bụ́ di pụrụ ịmụta site n’otú Jizọs si mesoo ọgbakọ Ndị Kraịst ihe?

12 Ejila ịhụnanya nwunye gị nwere n’ebe ị nọ egwuri egwu. Na-emesi ya obi ike na ị ga-anọgide na-ahụ ya n’anya. Jizọs setịpụụrụ Ndị Kraịst bụ́ di ihe nlereanya site n’ụzọ o si mesoo ọgbakọ Ndị Kraịst ihe. Ọ dị nwayọọ, nwee obiọma ma na-agbaghara mmehie—ọbụna mgbe ụmụazụ ya kpara àgwà na-adịghị mma ugboro ugboro. Àgwà ndị a Jizọs nwere mere ka o nwee ike ịgwa ndị ọzọ, sị: “Bịakwutenụ m, . . . n’ihi na enwere m obi dị nwayọọ, m dịkwa umeala n’obi, unu ga-enwetakwara mkpụrụ obi unu ume ọhụrụ.” (Matiu 11:28, 29) Iji gosi na ọ na-eṅomi Jizọs, Onye Kraịst bụ́ di ga na-emeso nwunye ya ihe n’ụzọ Jizọs si mesoo ọgbakọ ya ihe. Nwoke ọ bụla ji nwunye ya kpọrọ ihe n’ezie ga na-eme ka nwunye ya na-enwe nnọọ ume ọhụrụ.

Ndị Nwunye, Bụ́ Ndị Na-etinye Ụkpụrụ Bible n’Ọrụ

13. Olee ụkpụrụ ndị dị na Bible bụ́ ndị pụrụ inyere ndị bụ́ nwunye aka?

13 E nwekwara ụkpụrụ ndị dị na Bible bụ́ ndị pụrụ inyere ndị bụ́ nwunye aka. Ndị Efesọs 5:22-24, 33 na-ekwu, sị: “Ka ndị bụ́ nwunye na-edo onwe ha n’okpuru ndị di ha dị ka n’okpuru Onyenwe anyị, n’ihi na di bụ isi nke nwunye ya dị ka Kraịst bụkwa isi nke ọgbakọ ahụ, ebe ọ bụ onye nzọpụta nke ahụ́ a. N’eziokwu, dị ka ọgbakọ ahụ si na-edo onwe ya n’okpuru Kraịst ahụ, ka ndị bụ́ nwunye sikwa otú ahụ na-edo onwe ha n’okpuru di ha n’ihe ọ bụla. . . . Onye bụ́ nwunye kwesịrị inwe nkwanye ùgwù miri emi maka di ya.”

14. Gịnị mere na ụkpụrụ ahụ dị n’Akwụkwọ Nsọ nke chọrọ ka ụmụ nwanyị na-edo onwe ha n’okpuru adịghị egosi na a na-eleda ha anya?

14 Rịba ama otú Pọl si kwusie okwu ike banyere nwunye ido onwe ya n’okpuru di ya na ịkwanyere di ya ùgwù. E chetaara onye bụ́ nwunye ka ọ na-edo onwe ya n’okpuru di ya. Nke a kwekọrọ ná ndokwa Chineke mere. Onye ọ bụla e kere eke n’eluigwe na n’ụwa nwere onye ọ na-edo onwe ya n’okpuru ya. Ọbụna Jizọs na-edo onwe ya n’okpuru Jehova Chineke. (1 Ndị Kọrint 11:3) N’ezie, di nke na-achị isi n’ụzọ kwesịrị ekwesị ga-eme ka ọ dịrị nwunye ya mfe ịnọgide na-edo onwe ya n’okpuru.

15. Olee ụfọdụ ndụmọdụ e nyere ndị bụ́ nwunye na Bible?

15 Pọl kwukwara na nwunye “kwesịrị inwe nkwanye ùgwù miri emi maka di ya.” Onye Kraịst bụ́ nwunye kwesịrị inwe “mmụọ dị jụụ na nke dị nwayọọ,” ọ gaghị eji nkamanya na-ama di ya aka ma ọ bụ na-eme ihe otú o si masị ya. (1 Pita 3:4) Nwunye na-atụ egwu Chineke na-arụsi ọrụ ike iji hụ na ihe na-adịrị ezinụlọ ya mma nakwa iji sọpụrụ di ya. (Taịtọs 2:4, 5) Ọ ga-agbalị ịdị na-ekwu okwu ọma banyere di ya ma si otú ahụ ghara ime ihe ga-eme ka ndị ọzọ na-akparị di ya. Ọ ga na-arụsikwa ọrụ ike iji mee ka mkpebi ndị di ya na-eme gaa nke ọma.—Ilu 14:1.

16. Olee ihe Ndị Kraịst bụ́ nwunye pụrụ ịmụta n’ihe nlereanya Sera na Ribeka?

16 Inwe mmụọ dị jụụ na nke dị nwayọọ apụtaghị na Onye Kraịst bụ́ nwanyị agaghị enwe echiche nke ya ma ọ bụkwanụ na echiche ya adịghị mkpa. Ụmụ nwanyị ndị na-atụ egwu Chineke n’oge ochie, ndị dị ka Sera na Ribeka, kwupụtara echiche ha na ihe na-enye ha nsogbu n’obi, ihe ndị e dekọkwara na Bible gosiri na Jehova nabatara ihe ha mere. (Jenesis 21:8-12; 27:46–28:4) Ndị Kraịst bụ́ nwunye pụkwara ikwupụta echiche ha. Ma, ha kwesịrị iji nkwanye ùgwù mee nke ahụ ọ bụghị n’ụzọ mkparị. Ọ bụrụ na ha emee otú ahụ, eleghị anya ha ga-achọpụta na mkparịta ụka ha ga na-adaba adaba ma na-arụpụta ezi ihe.

Ihe Iji Alụmdi na Nwunye Gị Kpọrọ Ihe Na-arụpụta

17, 18. Olee ụzọ ụfọdụ ndị di na nwunye pụrụ isi guzogide mgbalị Setan na-eme iji tisaa alụmdi na nwunye ha?

17 Alụmdi na nwunye bụ nkekọ na-adịgide adịgide. N’ihi ya, ma di ma nwunye kwesịrị ịchọsi nnọọ ike ime ihe nile ha nwere ike ime iji hụ na alụmdi na nwunye ha na-aga nke ọma. Ọ bụrụ na di na nwunye adịghị akparịta ụka, nsogbu ndị ha na-enwe pụrụ ịka njọ ma ghọọ oké ihe. Ihe a na-ahụkarị bụ na ndị di na nwunye na-akwụsị ịkparịta ụka mgbe ha nwere nsogbu n’etiti onwe ha, nke a na-akpatakwa ibu iwe n’obi. Ọbụna di na nwunye ụfọdụ na-achọ ụzọ isi hapụ onye ha lụrụ, ikekwe malite inwe mmasị n’ebe onye ọzọ nọ. Jizọs dọrọ aka ná ntị, sị: “Onye ọ bụla nke nọgidere na-ele nwanyị anya nke na agụụ iso ya nwee mmekọahụ gụrụ ya esoroworị ya kwaa iko n’obi ya.”—Matiu 5:28.

18 Pọl onyeozi dọrọ Ndị Kraịst nile, gụnyere ndị lụworo di na nwunye, aka ná ntị, sị: “Weenụ iwe, ma unu emehiekwala; ka anyanwụ ghara ịda n’ebe unu nọ n’ọnọdụ mkpasu iwe, unu enyekwala Ekwensu ohere.” (Ndị Efesọs 4:26, 27) Ajọ onye iro anyị, bụ́ Setan, na-agbalị ịhụ na obere nsogbu ọ bụla bilitere n’etiti Ndị Kraịst ghọrọ nnukwu nsogbu. Unu ekwela ya! Mgbe ọ bụla nsogbu bilitere, jirinụ akwụkwọ ndị e ji amụ Bible chọpụta ihe Jehova chere n’okwu ahụ. Jirinụ nwayọọ kwurịta nsogbu ọ bụla unu nwere, unu ezochikwarala ibe unu ihe ọ bụla. Gbalịanụ itinye ụkpụrụ Jehova ndị unu maara n’ọrụ. (Jems 1:22-25) A bịa n’alụmdi na nwunye unu, kpebisienụ ike ịnọgide soro Chineke na-eje ije, unu ekwekwala ka onye ọ bụla ma ọ bụ ihe ọ bụla tọsaa ihe o kekọtara!—Maịka 6:8.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Lee igbe bụ́ “Ịgba Alụkwaghịm na Nkewa” na Teta! nke February 8, 2002, peeji nke 10, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

^ par. 9 Lee Ụlọ Nche nke May 15, 1989, peeji nke 12.

^ par. 11 Iji ruo eruo maka ihe ùgwù n’ọgbakọ, nwoke agaghị abụ “onye na-eti mmadụ ihe”—ya bụ, onye na-akụ ndị ọzọ ihe ma ọ bụ onye na-agwa ha okwu na-egbu mmụọ. N’ihi ya, Ụlọ Nche nke September 1, 1990, kwuru na peeji nke 25, sị: “Mmadụ adịghị eru eru ma ọ bụrụ na ọ na-akpa àgwà nsọpụrụ Chineke n’ebe ọzọ ma bụrụ onye ọchịchị aka ike n’ụlọ.”—1 Timoti 3:2-5, 12.

Ì Chetara?

• Gịnị mere ọbụna di na nwunye bụ́ Ndị Kraịst ga-eji nwee nsogbu?

• Olee otú onye bụ́ di pụrụ isi na-enye nwunye ya ihe ndị na-akpa ya ma gosi na ya ji nwunye ya kpọrọ ihe?

• Gịnị ka onye bụ́ nwunye pụrụ ime iji gosi na ya na-akwanyere di ya ùgwù n’ụzọ miri emi?

• Olee otú di na nwunye pụrụ isi mee ka alụmdi na nwunye ha bụrụ a kwaa akwụrụ?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 20]

Onye bụ́ di kwesịrị inye nwunye ya ihe anụ ahụ́ ndị na-akpa ya, kwesịkwa inyere nwunye ya aka ime ka mmekọrịta ya na Jehova sie ike

[Foto dị na peeji nke 21]

Nwoke nke ji nwunye ya kpọrọ ihe na-eme ka obi na-adị ya mma

[Foto dị na peeji nke 23]

Ndị Kraịst bụ́ nwunye na-eji nkwanye ùgwù ekwupụta echiche ha