Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

À Pụrụ Inwe Ihe E Kere Eke n’Enweghị Onye Okike?

À Pụrụ Inwe Ihe E Kere Eke n’Enweghị Onye Okike?

À Pụrụ Inwe Ihe E Kere Eke n’Enweghị Onye Okike?

Ọ FỌRỌ obere ka ọ bụrụ otu narị afọ na iri ise kemgbe Charles Darwin kwuru na ọ bụ nhọrọ ebumpụta ụwa mere e ji nwee ihe ndị dịgasị iche dị mgbagwoju anya dị ndụ. Ma na nso nso a, ndị kweere na otú ihe ndị dị ndụ si nnọọ na-arụ ọrụ nke ọma na-egosi na a kpachaara anya kee ha amalitela ịgba ozizi evolushọn ụkwụ, n’agbanyeghị otú e sirila mezigharịa ozizi ahụ n’oge a. Ọbụnadị ọtụtụ ndị ọkà mmụta sayensị maara nke a na-akọ ekwetaghị na ọtụtụ ihe ndị dị iche iche anyị na-ahụ n’ụwa nọkatara dịrị n’onwe ha.

Ụfọdụ ndị ọkà mmụta sayensị dị otú ahụ na-ekwu na e nwere ihe ọzọ mere e ji nwee ọtụtụ ihe dị iche iche dị ndụ—bụ́ nke ha na-akpọ ihe ndị e ji ọgụgụ isi kee—na-ekwu na ihe ọmụmụ nke ihe ndị dị ndụ, mgbakọ na mwepụ, na ọgụgụ isi nkịtị kwadochara na e ji ọgụgụ isi kee ihe ndị dị ndụ. Ha na-agba ume ka a na-akụzi echiche dị otú a n’ụlọ akwụkwọ. Ebe ndị a kasị arụrịta ụka banyere ozizi evolushọn bụ na United States, e kwukwara na a na-arụkwa ụka banyere ya n’England, Netherlands, Pakistan, Serbia, nakwa na Turkey.

Ihe Dị Mkpa E Leghaara Anya

Otú ọ dị, ọ dị otu ihe dị mkpa e leghaara anya ná nkọwa ahụ a kpachapụrụ anya nye banyere ihe ndị e ji ọgụgụ isi kee. Ọ bụ na e kwughị onye kere ha. Ì kweere na a pụrụ inwe ihe e kere eke n’enweghị onye okike? Akwụkwọ akụkọ bụ́ The New York Times Magazine kwuru na ndị kweere n’ihe ndị e ji ọgụgụ isi kee “anaghị ekwu hoo haa ihe ma ọ bụ onye ọ pụrụ ịbụ ya kere ihe ndị ahụ.” Onye edemede bụ́ Claudia Wallis kwuru na ndị kweere n’ihe ndị e ji ọgụgụ isi kee “na-akpachara anya ịghara ịkpọtụ Chineke aha mgbe gị na ha na-ekwu okwu.” Magazin Newsweek kwukwara na “ozizi nke ihe ndị e ji ọgụgụ isi kee anaghị ekwu ihe ọ bụla banyere onye kere ihe ndị ahụ.”

Otú ọ dị, ị pụrụ ịghọta na ọ ga-abụ ihe na-abaghị uru ileghara ihe banyere onye okike anya. Olee otú a ga-esi kọwaa ihe ndị e kere eke dị n’eluigwe na ala nakwa ndụ n’onwe ya nke ọma ma ọ bụrụ na e kpuchie ihe banyere ịdị adị nke onye okike ma ọ bụ gharadị ịtụle ya atụle?

Ruo n’ókè ụfọdụ, ụka a na-arụ ma è nwere onye okike ma ọ bụ na e nweghị ga-eme ka anyị tụlee ajụjụ ndị a: Ikweta na e nwere onye okike karịrị mmadụ ọ̀ ga-egbochi ọganihu nke nkà mmụta sayensị ma mee ka ndị mmadụ kwụsị iche echiche? Ànyị kwesịrị ikweta na e nwere onye okike nwere ọgụgụ isi nanị mgbe anyị na-apụghị ịkọwa otú ihe ụfọdụ si malite? Ọ̀ bụ ihe ezi uche dị na ya ikwubi na e nwere onye okike n’ihi ihe ndị e kere eke? Isiokwu na-esonụ ga-atụle ajụjụ ndị a nakwa ndị ọzọ.

[Foto ndị dị na peeji nke 3]

Charles Darwin kweere na ọ bụ nhọrọ ebumpụta ụwa mere e ji nwee ihe ndị dịgasị iche dị mgbagwoju anya dị ndụ

[Ebe E Si Nweta Foto]

Darwin: Foto Oriakụ J. M. Cameron sere/Foto Ebe Ndebe Ihe Ochie Mba U.S.