Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị Pụrụ Idi Ikpe Na-ezighị Ezi!

Ị Pụrụ Idi Ikpe Na-ezighị Ezi!

Ị Pụrụ Idi Ikpe Na-ezighị Ezi!

OLEE onye a na-ekpetụbeghị ikpe na-ezighị ezi ná ndụ ya? Ọ bụ ezie na mgbe ụfọdụ, mmadụ pụrụ iche na e kpere ya ikpe na-ezighị ezi mgbe ọ na-adịkwanụghị ikpe na-ezighị ezi e kpere ya, e nwere nnọọ ikpe na-ezighị ezi ndị doro anya.

Mgbe ọ bụla e kpere anyị ikpe na-ezighị ezi, ọ na-ewute anyị, ọ pụkwara imetụta mmekọrịta anyị na Chineke. Anyị pụrụ inwe ọchịchọ siri ike imezi ọnọdụ ahụ. N’ihi gịnị? Otu ihe kpatara ya bụ na Onye Okike anyị, bụ́ Jehova Chineke, bụ́ onye “na-enweghị ajọ omume,” kenyere ikpe ziri ezi n’ime ụmụ mmadụ. (Deuterọnọmi 32:4; Jenesis 1:26) Ma, anyị nwere ike ịhụ ọnọdụ ụfọdụ ebe anyị chere na e kpeghị ikpe ziri ezi. Otu onye amamihe kwuru n’otu oge, sị: “Mụ onwe m wee laghachi hụ mmegbu nile a na-emegbu n’okpuru anyanwụ: ma, lee, anya mmiri nke ndị a na-emegbu, ma ọ dịghị onye nkasi obi ha nwere; ma n’akụkụ ndị na-emegbu ha ka ike dị, ma ọ dịghị onye nkasi obi ha nwere.” (Eklisiastis 4:1) Oleezi otú anyị nwere ike isi die ikpe na-ezighị ezi?

Gịnị n’Ezie Bụ Ikpe Na-ezighị Ezi?

Ikpe na-ezighị ezi bụ agbasoghị ụkpụrụ nke ihe ndị ziri ezi. Olee ihe ga-abụ ụkpụrụ nke ihe ziri ezi ụmụ mmadụ kwesịrị ịgbaso? O doro anya na ọ bụ Onye Okike anyị, bụ́ onye ezi omume na onye na-adịghị agbanwe agbanwe ka ọ dịịrị isetịpụ ụkpụrụ nke ihe ndị ziri ezi na ihe na-ezighị ezi. N’anya ya, ije ije “n’ụkpụrụ nile nke ndụ” gụnyere ‘ịghara ime ajọ omume.’ (Ezikiel 33:15) Ya mere, mgbe Jehova kere mmadụ mbụ, O kenyere ya akọnuche—bụ́ ihe dị n’ime ya nke ga na-enyere ya aka ịmata ọdịiche dị n’etiti ihe ọma na ihe ọjọọ. (Ndị Rom 2:14, 15) Ọzọkwa, Jehova kwuru ihe ndị bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ n’Okwu ya, bụ́ Bible.

Gịnị ma ọ bụrụ na anyị echee na e kpere anyị ikpe na-ezighị ezi? Ọ dị mma ka anyị were ezi uche lee okwu ahụ anya nke ọma iji mara ma è kpere anyị ikpe na-ezighị ezi n’ezie. Were ọnọdụ onye amụma Hibru bụ́ Jona chọtara onwe ya na ya dị ka ihe atụ. Jehova gwara ya ka ọ gaa kọọrọ ndị Ninive na a gaje ibibi ha. Na mbụ, Jona gbahapụrụ ọrụ ahụ ma gbaa ọsọ. Ma, o mechara gaa Ninive ma dọọ ndị obodo ahụ aka ná ntị banyere mbibi ahụ. Mgbe ha chegharịrị, Jehova kpebiri ịghara ibibi obodo ahụ na ndị bi na ya. Olee otú obi dị Jona? “O wee jọọ Jona njọ nke ukwuu, iwe ya ewee dị ọkụ.” (Jona 4:1) O chere na Jehova ekpeela nnọọ ikpe na-ezighị ezi.

O doro anya na Jehova, bụ́ onye pụrụ inyocha obi na onye “na-ahụ ezi omume na ezi ikpe n’anya,” mere ihe ziri ezi. (Abụ Ọma 33:5) Jona bịara mụta na mkpebi ahụ Jehova mere kwekọrọ n’ikpe ziri ezi. Mgbe anyị chere na e kpeela anyị ikpe na-ezighị ezi, anyị pụrụ ịjụ onwe anyị, sị, ‘Ọ̀ ga-abụ na Jehova ga-ele okwu ahụ anya n’ụzọ dị iche?’

Ndị E Kpere Ikpe Na-ezighị Ezi

Bible kwuru banyere ọtụtụ ndị e kpere ikpe na-ezighị ezi. Anyị pụrụ ịmụta ọtụtụ ihe na ha site n’ịtụle otú ha si die nsogbu ndị ahụ tara akpụ ha nwere. Tụlee ọnọdụ Josef, bụ́ onye ụmụnne ya na-emere ya anyaụfụ rere ịbụ ohu n’Ijipt. Mgbe Josef nọ n’Ijipt, nwunye nna ya ukwu nwara ime ka ya na ya kwaa iko, mgbe ọ jụrụ, o boro ya ebubo ụgha na ọ chọrọ idina ya n’ike. Nke ahụ mere ka a tụọ Josef mkpọrọ. Ma, mkpọrọ ahụ a tụrụ ya emeghị ka ọ daa mbà n’okwukwe ya. O kweghị ka ikpe na-ezighị ezi e kpere ya belata mmekọrịta ya na Chineke ma ọ bụkwanụ mee ka ọ kwụsị ịtụkwasị Jehova obi.—Jenesis 37:18-28; 39:4-20; Abụ Ọma 105:17-19.

Onye ọzọ e kpere ikpe na-ezighị ezi bụ Nebọt. Jezibel, bụ́ nwunye Eze Ehab nke Izrel, ji nnọọ aghụghọ tinye ya ná nsogbu. Eze ahụ chọrọ nnọọ inweta ala Nebọt ketara n’aka ndị nna ya ochie, bụ́ nke dị n’azụ obí ya. Iwu machibidoro onye Izrel ọ bụla ire ihe nketa ya kpamkpam, n’ihi ya, Nebọt jụrụ iresị eze ahụ ala ahụ. (Levitikọs 25:23) Nke ahụ mere ka ajọ nwunye Ehab họpụta ndị àmà ụgha boro Nebọt ebube na o kwuluru Chineke na eze. Nke ahụ mere ka e gbuo Nebọt na ụmụ ya. Cheedị otú obi na-aghaghị ịdị Nebọt mgbe ndị mmadụ na-atụtụrụ nkume ha ga-eji tụgbuo ya!—1 Ndị Eze 21:1-14; 2 Ndị Eze 9:26.

Ma, ihe atụ ndị ahụ enwedịghị ihe ha bụ ma e were ha tụnyere ikpe na-ezighị ezi e kpere Kraịst Jizọs. Ikpe ọnwụ a mara ya gụnyere ebubo ụgha na ikpe na-ezighị ezi e kpere ya. Onye ọchịchị Rom kpere ya ikpe enweghị obi ike ikpe ikpe ziri ezi. (Jọn 18:38-40) Ee, Setan kpere Kraịst Jizọs ikpe na-ezighị ezi kasịnụ, bụ́ ụdị a na-ekpetụbeghị onye ọ bụla!

Ihe atụ ndị a hà na-egosi na ikpe na-ezighị ezi a na-ekpe ndị mmadụ anaghị emetụ Jehova n’ahụ́? Ee e! Otú Jehova si lee ọnọdụ ndị ahụ anya dị iche n’otú mmadụ si ele ihe anya. (Aịsaịa 55:8, 9) Orire e rere Josef n’ohu mere ka o nwee ike ịzọpụta ezinụlọ ya. Ọ ghọrọ onye na-elekọta nri n’Ijipt tupu nnukwu ụnwụ ahụ metụtara ezinụlọ ya adaa. Cheedị echiche, ọ bụrụ na Jehova ekweghị ka e kpee Josef ikpe na-ezighị ezi ahụ, a garaghị atụ ya mkpọrọ. Ọ bụ ebe ahụ ka ọ nọ kọwaara ndị mkpọrọ abụọ ọzọ nrọ ha rọrọ, nke otu n’ime ha mesịrị kọọrọ Fero banyere Josef, bụ́ nke dugara n’ime Josef onye na-elekọta nri.—Jenesis 40:1; 41:9-14; 45:4-8.

Gịnịkwanụ banyere Nebọt? Ọzọkwa, gbalịa lee okwu ahụ anya otú Jehova si lee ya. N’anya Jehova, bụ́ onye nwere ike ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ, Nebọt ka dị nnọọ ndụ, ọbụna mgbe ahụ ozu ya tọgbọ n’ala. (1 Ndị Eze 21:19; Luk 20:37, 38) Nebọt ga-echere ruo oge Jehova ga-akpọlite ya n’ọnwụ, ma oge ahụ ọ ga-eji chere ga-adị mkpirikpi, n’ihi na ndị nwụrụ anwụ adịghị ama ihe ọ bụla. (Eklisiastis 9:5) E wezụgakwa nke ahụ, Jehova bọrọ ọ́bọ̀ ọbara Nebọt site n’ikpe Ehab na ezinụlọ ya ikpe.—2 Ndị Eze 9:21, 24, 26, 35, 36; 10:1-11; Jọn 5:28, 29.

A bịa n’ebe Jizọs nọ, ọ nwụrụ. N’agbanyeghị nke ahụ, Chineke kpọlitere ya n’ọnwụ ma bulie ya elu “karịa ọchịchị na ikike na ike na ịbụisi ọ bụla na aha ọ bụla a kpọrọ.” (Ndị Efesọs 1:20, 21) Ikpe na-ezighị ezi Setan kpere Kraịst Jizọs egbochilighị Jehova ịkwụghachi Ọkpara ya ụgwọ. Obi siri Jizọs ike na Jehova nwere ike ime ka njide ahụ na-ezighị ezi e jidere ya kụọ afọ n’ala ozugbo ma ọ bụrụ na ọ bụ uche Ya. Ma, Kraịst makwaara na Jehova nwere oge ọ ga-eji emezu ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ na oge ọ ga-akagbu ikpe na-ezighị ezi ọ bụla e kpere mmadụ.

Ee, Setan na ndị ozi ya kpere ndị ezi omume ikpe na-ezighị ezi, ma Jehova mesịrị dozie okwu ahụ, ọ ga-emesịkwa mezie ihe nile ikpe na-ezighị ezi mebiri. Ya mere, anyị aghaghị ichere Chineke, iji mezie ikpe na-ezighị ezi.—Deuterọnọmi 25:16; Ndị Rom 12:17-19.

Ihe Nwere Ike Ime Ka Jehova Kwere Ka E Kpee Mmadụ Ikpe Na-ezighị Ezi

Jehova nwedịrị ike inwe ihe ndị mere o ji ghara idozi ọnọdụ ụfọdụ. Ọ pụrụ ikwe ka e kpee anyị ikpe na-ezighị ezi iji nye anyị ọzụzụ dị ka Ndị Kraịst. N’ezie, ‘Chineke adịghịkwa anwa onye ọ bụla.’ (Jems 1:13) Ma, ọ pụrụ ikwe ka ọnọdụ ụfọdụ dịrị ma ghara itinye aka na ha, ọ pụkwara ịkwado ndị nabatara ọzụzụ dị otú ahụ. Bible na-emesi anyị obi ike, sị: “Mgbe unu tasịworo ahụhụ ruo nwa oge, Chineke nke obiọma nile na-erughịrị mmadụ . . . ga-enyesị unu ọzụzụ unu n’onwe ya, ọ ga-eme ka unu guzosie ike, ọ ga-eme ka unu sie ike.”—1 Pita 5:10.

Ọzọkwa, Jehova ikwere ka e kpee ụfọdụ ikpe na-ezighị ezi pụrụ inye ndị na-ekpe ikpe na-ezighị ezi ohere ichegharị. Ndụmọdụ Pita nyere ndị Juu gere ya ntị nanị izu ole na ole Jizọs nwụsịrị, ‘dụpuru obi’ ha. Ha ji obi ha nile nakwere Okwu Chineke, e meekwa ha baptizim.—Ọrụ 2:36-42.

O doro anya na ọ bụghị ndị nile na-ekpe ikpe na-ezighị ezi ga-echegharị. Ụfọdụ nwedịrị ike ịkata obi kpee ikpe na-ezighị ezi ndị dị oké njọ. N’agbanyeghị nke ahụ, Ilu 29:1 na-ekwu, sị: “Onye a na-abara mba ọtụtụ mgbe ma ọ na-ekwesi olu ya ike, n’otu ntabi anya ka a ga-etipịa ya, ọ dịghịkwa ngwọta dị.” N’ezie, Jehova ga-emesị mee ihe ma bibie ndị nọgidere na-eme omume na-ezighị ezi.—Eklisiastis 8:11-13.

N’agbanyeghị oge ọ ga-ewe iji die ikpe na-ezighị ezi, anyị ji n’aka na Jehova maara otú ọ ga-esi nyere anyị aka idi ya. Ọ ga-akagburịrị ikpe na-ezighị ezi ọ bụla a pụrụ ikpe anyị n’ụwa ọjọọ a. O kwere anyị nkwa ndụ ebighị ebi n’ụwa ọhụrụ nke ‘ezi omume gajekwa ibi n’ime ya.’—2 Pita 3:13.

[Foto dị na peeji nke 16, 17]

Olee otú obi na-aghaghị ịdịwo Nebọt mgbe e kpere ya ikpe na-ezighị ezi?