Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Anyị Pụrụ Irite Uru Site n’Idi Ahụhụ

Anyị Pụrụ Irite Uru Site n’Idi Ahụhụ

Anyị Pụrụ Irite Uru Site n’Idi Ahụhụ

“Anyị na-akpọ ndị tachiworo obi ndị obi ụtọ.”—JEMS 5:11.

1, 2. Olee ihe gosiri na Jehova ezubeghị ka mmadụ taa ahụhụ?

O NWEGHỊ onye isi dị mma ga-achọ ịta ahụhụ; Onye Okike anyị, bụ́ Jehova Chineke, anakwanụghị achọ ka ụmụ mmadụ na-ata ahụhụ. Anyị pụrụ ịhụ nke a mgbe anyị tụlere Okwu ya e dere n’ike mmụọ nsọ ma hụ ihe mere mgbe o kesịrị nwoke na nwanyị mbụ. Chineke buru ụzọ kee nwoke. “Jehova, bụ́ Chineke, wee were ájá sitere n’ala kpụọ mmadụ, O wee kuo ume ndụ nye n’oghere imi ya abụọ; mmadụ ahụ wee ghọọ mkpụrụ obi dị ndụ.” (Jenesis 2:7) Adam zuru okè n’anụ ahụ́ na n’uche, ọ gaghị arịa ọrịa ma ọ bụ nwụọ anwụọ.

2 Olee maka ebe Adam bi? “Jehova, bụ́ Chineke, wee kụọ ubi nke a gbara ogige n’Iden, n’Ihu anyanwụ; O wee tinye mmadụ ahụ n’ebe ahụ, bụ́ onye Ọ kpụrụrịị. Jehova, bụ́ Chineke, wee mee ka osisi nile ọ bụla si n’ala puo, bụ́ nke a na-achọsi ike n’ile anya, nke dịkwa mma ihe oriri.” (Jenesis 2:8, 9) Ee, ebe Adam bi magburu onwe ya. Ahụhụ adịghị n’Iden.

3. Olee ihe di na nwunye mbụ ahụ ga-enwe ike ịrụzu?

3 Jenesis 2:18 gwara anyị, sị: “Jehova, bụ́ Chineke, wee sị, Ọ dịghị mma ka mmadụ ahụ nọrọ nanị ya; M ga-emere ya onye inyeaka kwesịrị ya.” Jehova wee keere Adam nwunye zuru okè, mee ka o kwe ha omume inwe ezinụlọ nwere obi ụtọ. (Jenesis 2:21-23) Bible gara n’ihu ịgwa anyị, sị: “Chineke wee gọzie ha: Chineke wee sị ha, Mụọnụ ọmụmụ, baanụ ụba, jupụta ụwa, buda ya n’okpuru onwe unu.” (Jenesis 1:28) Di na nwunye mbụ ahụ nwere ihe ùgwù magburu onwe ya nke ịgbasa Paradaịs ahụ dị n’Iden ruo mgbe ọ ga-ezu ụwa nile, mee ka e nwee paradaịs zuru ụwa ọnụ. Ha ga-amụkwa ụmụ ndị nwere obi ụtọ, bụ́ ndị na-agaghị ata ahụhụ. Lee ka ihe nile si magbuo onwe ya ná mmalite!—Jenesis 1:31.

Otú Ahụhụ Si Malite

4. Olee ihe anyị ga-aghọta mgbe anyị tụlere akụkọ ụmụ mmadụ?

4 N’agbanyeghị nke ahụ, mgbe anyị tụlere akụkọ nke ụmụ mmadụ, o doro anya na ọ dị nnọọ ihe mebirinụ. Ihe ọjọọ dị iche iche emeela, ụmụ mmadụ ataakwala ahụhụ dị egwu. Kemgbe ọtụtụ narị afọ, ụmụ nile nke Adam na Iv arịala ọrịa, kaa nká, ma mesịa nwụọ. Ụwa abụtụghị paradaịs nke ndị nwere obi ụtọ jupụtara. Ndị Rom 8:22 kọwara ọnọdụ anyị nke ọma, sị: “Ihe nile e kere eke nọgidere na-asụkọ ude ma na-anọkọ n’ihe mgbu ruo ugbu a.”

5. Olee otú nne na nna anyị mbụ si soro webata ahụhụ n’etiti ụmụ mmadụ?

5 Ọ bụghị Jehova ka ụta dịịrị maka oké ahụhụ ndị mmadụ taworo kemgbe ọtụtụ afọ. (2 Samuel 22:31) Ọ bụ ụmụ mmadụ kpatara ụfọdụ n’ime ha. “Ha ebibiwo onwe ha, ha emewo ka omume ha bụrụ ihe arụ.” (Abụ Ọma 14:1) E nyere nne na nna anyị mbụ ezi ihe nile mgbe e kere ha. Nanị ihe a chọrọ ha n’aka ka ha wee nọgide na-enwe ezi ihe ndị ahụ bụ irubere Chineke isi, ma Adam na Iv họọrọ ịgbakụta Jehova azụ. Ebe ọ bụ na nne na nna anyị mbụ gbakụtara Jehova azụ, Jehova agakwaghị agụ ha ná ndị zuru okè. Ha ga-akawa nká ruo mgbe ọnwụ ga-egburu ha. Ha bufere anyị ezughị okè.—Jenesis 3:17-19; Ndị Rom 5:12.

6. Olee otú Setan si tinye aka n’iweta ahụhụ?

6 Onye ọzọ so weta ahụhụ nile ụmụ mmadụ na-ata bụ mmụọ ahụ na-enupụ isi bụ́ onye e mesịrị kpọwa Setan bụ́ Ekwensu. E nyere ya ikike nke ịhọrọ ihe ọ chọrọ. Ma, o ji ikike ahụ mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi ebe ọ na-achọ ka e fewe ya ofufe. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ bụ nanị Jehova ka e kwesịrị ife ofufe, ọ bụghị ihe ndị o kere eke. Ọ bụ Setan dubara Adam na Iv n’ịgbakụta Jehova azụ, ka à ga-asị na nke ahụ ga-eme ka ha “dị ka Chineke, na-ama ezi ihe na ihe ọjọọ.”—Jenesis 3:5.

Ọ Bụ Nanị Jehova Ka O Ruuru Ịchị

7. Olee ihe ihe ndị sirila n’inupụrụ Jehova isi pụta na-egosi?

7 Ihe ọjọọ ndị sirila ná nnupụisi pụta na-egosi na ọ bụ nanị Jehova, bụ́ Eze Eluigwe na Ala, ka o ruuru ịchị nakwa na ọ bụ nanị ọchịchị ya ziri ezi. Puku afọ ndị a garala aga egosila na Setan, bụ́ onye ghọrọ “onye na-achị ụwa a,” ewepụtala ọchịchị obi ọjọọ, nke ajọ omume, na nke na-eme ihe ike bụ́ nke gwụrụla ụmụ mmadụ ike. (Jọn 12:31) Ogologo oge ụmụ mmadụ jirila chịa ajọ ọchịchị n’okpuru Setan egosikwala na ha apụghị ịchị ọchịchị ezi omume. (Jeremaịa 10:23) N’ihi ya, ụdị ọchịchị ọ bụla na-abụghị nke Jehova ga-akụrịrị afọ n’ala. Akụkọ ihe mere eme egosila nnọọ nke a.

8. Olee ihe Jehova zubere banyere ụdị ọchịchị nile nke ụmụ mmadụ, oleekwa otú ọ ga-esi mezuo nzube ahụ?

8 Ugbu a Jehova hapụrụla ụmụ mmadụ ka ha chịa onwe ha n’enweghị enyemaka ya ruo ọtụtụ puku afọ, ikpe agaghị ama ya ma ọ bụrụ na o kpochapụ ụdị ọchịchị a nile ma jiri ọchịchị nke ya dochie ha. Otu amụma e buru banyere nke a kwuru, sị: “N’ụbọchị ha, bụ́ eze ndị a [ọchịchị ụmụ mmadụ], ka Chineke nke eluigwe ga-eme ka otu alaeze [ọchịchị eluigwe ya nke dị n’aka Kraịst] bilie, nke a gaghị emebi emebi ruo mgbe ebighị ebi, . . . ọ ga-etipịa alaeze ndị a nile mee ka ha gwụsịa, ma ya onwe ya ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi.” (Daniel 2:44) Ọchịchị ndị mmụọ ọjọọ na nke ụmụ mmadụ ga-akwụsị, ọ bụkwa nanị Alaeze Chineke nke dị n’eluigwe ga na-achị ụwa. Kraịst ga-abụ Eze, ọ ga-enwekwa ndị kwesịrị ntụkwasị obi e si n’ụwa kpọta ga-eso ya chịa dị narị puku na iri puku anọ na anọ.—Mkpughe 14:1.

Irite Uru n’Ahụhụ

9, 10. Olee otú Jizọs si rite uru site n’ahụhụ ndị ọ tara?

9 Anyị ga-enwe obi ụtọ ịtụle iru eru nke ndị ga-achị Alaeze eluigwe ahụ. Nke mbụ, Kraịst Jizọs gosiri nnọọ na o ruru eru ịbụ Eze nke Alaeze ahụ. Ọ nọwo n’akụkụ Jehova ruo ọtụtụ afọ na-eme uche Nna ya, bụrụ “onye ọkà” Ya. (Ilu 8:22-31) Mgbe Jehova mere ndokwa ka Jizọs bịa n’ụwa, o ji obi ya nile bịa. Mgbe ọ nọ n’ụwa ebe a, o lekwasịrị anya n’ịgwa ndị mmadụ banyere ọbụbụeze na Alaeze Jehova. Jizọs setịpụụrụ anyị ihe nlereanya magburu onwe ya site n’ido onwe ya kpamkpam n’okpuru ọbụbụeze ahụ.—Matiu 4:17; 6:9.

10 A kpagburu Jizọs ma mesịa gbuo ya. N’oge ọ na-eje ozi ya, ọ hụrụ ọnọdụ ọjọọ ụmụ mmadụ nọ na ya. Ọ̀ dị uru ihe ndị ahụ ọ hụrụ na ahụhụ ndị ya onwe ya tara baara ya? Ee. Ndị Hibru 5:8 kwuru, sị: “Ọ bụ ezie na ọ bụ Ọkpara [Chineke], ọ mụtara nrubeisi site n’ahụhụ ndị ọ tara.” Ihe ndị Jizọs hụrụ mgbe ọ nọ n’ụwa mere ka ọ ghọtakwuo ọnọdụ ụmụ mmadụ ma nwekwuo ọmịiko. O ji anya ya hụ ọnọdụ ụmụ mmadụ nọ na ya. Ọ ga-enwe ike imere ndị na-ata ahụhụ ọmịiko ma ghọtakwuo ọrụ ya dị ka Onye Nzọpụta ha. Lee otú Pọl onyeozi si mee ka nke a pụta ìhè n’akwụkwọ Ndị Hibru: “O ji ụgwọ ịdị ka ‘ụmụnna’ ya n’ụzọ nile, ka o wee ghọọ nnukwu onye nchụàjà na-eme ebere nke na-ekwesịkwa ntụkwasị obi n’ihe ndị metụtara Chineke, iji wee chụọ àjà ime udo maka mmehie nke ndị mmadụ. N’ihi na ebe ya onwe ya taworo ahụhụ mgbe a na-ele ya ule, o nwere ike ịgbatara ndị a na-ele ule ọsọ enyemaka.” “Anyị nwere dị ka nnukwu onye nchụàjà, ọ bụghị onye na-apụghị imetara anyị ebere n’adịghị ike anyị, kama onye a nwaleworo n’ụzọ nile dị ka anyị onwe anyị, ma o nweghị mmehie. Ya mere, ka anyị jiri nkwuwa okwu na-abịaru nso n’ocheeze nke obiọma na-erughịrị mmadụ, ka e wee meere anyị ebere, anyị enwetakwa obiọma na-erughịrị mmadụ maka enyemaka n’oge kwesịrị ekwesị.”—Ndị Hibru 2:17, 18; 4:14-16; Matiu 9:36; 11:28-30.

11. Olee otú ihe ndị ahụ gaje ịbụ ndị eze na ndị nchụàjà gabigara n’ụwa ga-esi baara ha uru dị ka ndị ọchịchị?

11 A pụkwara ikwu otu ihe ahụ banyere narị puku na iri puku anọ na anọ ahụ, bụ́ ndị e si n’ụwa “zụta” iso Kraịst Jizọs chịa n’Alaeze eluigwe ahụ. (Mkpughe 14:4) A mụrụ ha nile dị ka ụmụ mmadụ n’ụwa, ha toro n’ụwa nke ahụhụ jupụtara, taakwa ahụhụ n’onwe ha. A kpagburu ọtụtụ n’ime ha, gbuokwa ụfọdụ n’ime ha n’ihi ikwesị ntụkwasị obi nye Jehova na ịdị njikere iso Jizọs. Ma ‘ihere emeghị ha ịgbara Onyenwe ha àmà, na-ekere òkè n’ịhụju anya n’ihi ozi ọma.’ (2 Timoti 1:8) Ihe ha gabigara n’ụwa mere nnọọ ka ha ruo eruo ikpe ndị mmadụ ikpe site n’eluigwe. Ha enwekwuola ọmịiko, dịkwuo obiọma, ma dịkwuo njikere inyere ndị mmadụ aka.—Mkpughe 5:10; 14:2-5; 20:6.

Obi Ụtọ nke Ndị Nwere Olileanya Ibi n’Ụwa

12, 13. Olee otú ndị nwere olileanya ibi n’ụwa ga-esi rite uru site n’ịta ahụhụ?

12 Ọ̀ dị uru ndị nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa paradaịs ebe ọrịa, iru újú, na ọnwụ na-agaghị adị ga-erite site n’ịta ahụhụ? Ihe mgbu na nhụjuanya ahụhụ na-eweta anaghị atọ ụtọ. Ma mgbe anyị diri ahụhụ dị otú ahụ, ezi àgwà ndị anyị nwere na-aka mma, anyị na-enwekwukwa obi ụtọ.

13 Tụlee ihe Okwu Chineke e dere n’ike mmụọ nsọ kwuru banyere nke a: “Ma ọ bụrụgodị na unu ataa ahụhụ n’ihi ezi omume, obi dị unu ụtọ.” “Ọ bụrụ na a na-akọcha unu n’ihi aha Kraịst, obi dị unu ụtọ.” (1 Pita 3:14; 4:14) “Obi ụtọ na-adịrị unu mgbe ndị mmadụ na-akọcha unu ma na-akpagbu unu, jirikwa ụgha na-ekwu ụdị ihe ọjọọ ọ bụla megide unu n’ihi m. Na-aṅụrịnụ ọṅụ, na-amalikwanụ elu n’ọṅụ, ebe ọ bụ na ụgwọ ọrụ unu dị ukwuu n’eluigwe.” (Matiu 5:11, 12) “Obi ụtọ na-adịrị onye nọgidere na-atachi obi n’ọnwụnwa, n’ihi na n’ịbụ onye a nwapụtara, ọ ga-anata okpueze bụ́ ndụ.”—Jems 1:12.

14. Olee ihe na-eme ka ndị na-efe Jehova na-enwe obi ụtọ mgbe ha na-ata ahụhụ?

14 N’ezie, ọ bụghị ahụhụ anyị na-ata na-enye anyị obi ụtọ. Ihe na-enye anyị obi ụtọ na afọ ojuju bụ ịmara na anyị na-ata ahụhụ n’ihi ime uche Jehova na ịgbaso ihe nlereanya Jizọs. Dị ka ihe atụ, na narị afọ mbụ, a tụrụ ndịozi ụfọdụ mkpọrọ ma mesịa kpụpụta ha n’ihu ụlọikpe ukwu ndị Juu ma katọọ ha maka ikwusa ozi ọma banyere Jizọs Kraịst. A pịara ha ụtarị ma hapụ ha ka ha laa. Olee otú obi dị ha? Bible gwara anyị na ha “si n’ihu Sanhedrin ahụ pụọ, na-aṅụrị ọṅụ n’ihi na a gụwo ha ná ndị ruru eru ịbụ ndị a ga-emenye ihere n’ihi aha ya.” (Ọrụ 5:17-41) Ihe mere ha obi ụtọ abụghị ihe ahụ a pịara ha na ụfụ ọ fụrụ ha, kama ọ bụ na ha maara na ihe mere ihe a ji mee ha bụ na ha kwesịrị ntụkwasị obi nye Jehova ma gbasoo nzọụkwụ Jizọs.—Ọrụ 16:25; 2 Ndị Kọrint 12:10; 1 Pita 4:13.

15. Olee otú anyị idi ahụhụ ugbu a pụrụ isi baara anyị uru n’ọdịnihu?

15 Ọ bụrụ na anyị ejiri obi ziri ezi die mmegide na mkpagbu, ọ pụrụ ime ka anyị nwekwuo ndidi. Nke a ga-enyere anyị aka idi ahụhụ ndị ga-abịa n’ọdịnihu. Anyị na-agụ, sị: “Gụọnụ ya dị ka nanị ihe ọṅụ, ụmụnna m, mgbe unu zutere ọnwụnwa dị iche iche, ebe unu maara na ọdịdị okwukwe unu a bụ́ nke e lere ule na-arụpụta ntachi obi.” (Jems 1:2, 3) Ndị Rom 5:3-5 gwakwara anyị ihe yiri nke ahụ, sị: “Ka anyị na-enwe aṅụrị mgbe anyị nọ ná mkpagbu, ebe anyị maara na mkpagbu na-arụpụta ntachi obi; ntachi obi, n’aka nke ya, na-arụpụta ọnọdụ a nwapụtara anwapụta; ọnọdụ ahụ a nwapụtara anwapụta, n’aka nke ya, na-arụpụta olileanya, olileanya ahụ adịghịkwa eduga ná mmechuihu.” Ya mere, ka anyị na-atachikwu obi n’ule ugbu a n’ihi ịbụ Ndị Kraịst, otú ahụ ka anyị ga na-adịkwu njikere ịtachi obi n’ule ndị ọzọ n’ajọ ụwa a.

Jehova Ga-akwụghachi Anyị

16. Olee ihe Jehova ga-emere ndị ahụ ga-abụ ndị eze na ndị nchụàjà n’ọdịnihu nke ga-eme ka ha chefuo ahụhụ ha tara?

16 Ya bụrụgodị na ihe onwunwe anyị efunahụ anyị n’ihi mmegide ma ọ bụ mkpagbu anyị nwetara n’ihi ịnọgide na-agbaso ụkpụrụ Ndị Kraịst, anyị pụrụ inwe afọ ojuju n’ihi na anyị maara na Jehova ga-akwụghachicha anyị ihe nile funahụrụ anyị. Dị ka ihe atụ, Pọl onyeozi degaara ụfọdụ ndị nwere olileanya ịga eluigwe akwụkwọ ozi, sị: “Unu . . . jiri ọṅụ nara mbukọ e bukọọrọ ihe unu nwere, ebe unu maara na unu onwe unu nwere ihe onwunwe ka mma na nke na-adịgide adịgide” dị ka ndị ọchịchị nke Alaeze Chineke. (Ndị Hibru 10:34) Cheekwa echiche ụdị ọṅụ ha ga-enwe mgbe Jehova na Kraịst ga-eduzi ha iso nye ndị bi n’ụwa ngọzi ndị dị ebube n’ụwa ọhụrụ. Lee ka ihe a Pọl onyeozi gwara Ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi si bụrụ eziokwu: “Ana m ewere ya na ahụhụ nke oge a a kara aka enweghị ihe ọ bụ ma e were ya tụnyere ebube ahụ nke a gaje ikpughe n’ime anyị.”—Ndị Rom 8:18.

17. Olee ihe Jehova ga-emere ndị nwere olileanya ibi n’ụwa bụ́ ndị jeere ya ozi n’ikwesị ntụkwasị obi ugbu a?

17 N’otu aka ahụ, n’agbanyeghị ihe funahụrụ ndị nwere olileanya ibi n’ụwa ma ọ bụ nke ha ji aka ha hapụ n’ihi ijere Jehova ozi, ọ ga-eji ihe ọ ga-eme n’ọdịnihu kwụghachi ha n’ụba. Ọ ga-enye ha ndụ ebighị ebi n’izu okè n’ụwa paradaịs. N’ụwa ọhụrụ, Jehova “ga-ehichapụkwa anya mmiri ọ bụla n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru újú ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ.” (Mkpughe 21:4) Lee nkwa magburu onwe ya nke ahụ bụ! Ọ dịghị ihe anyị ji aka anyị hapụ ma ọ bụ nke a manyere anyị ịhapụ n’ụwa nke oge a n’ihi Jehova nke a ga-eji tụnyere ezi ndụ nke anyị ga-enweta n’ọdịnihu, bụ́ nke Chineke ga-enye ndị ohu ya na-ekwesị ntụkwasị obi bụ́ ndị diri ahụhụ.

18. Olee nkwa na-akasi obi Jehova kwere anyị n’Okwu ya?

18 Ahụhụ ọ bụla anyị ka ga-ata adịghị otú ọ ga-esi metụta ndụ ebighị ebi anyị ga-enweta n’ụwa ọhụrụ Chineke. Ọnọdụ magburu onwe ya anyị ga-anọ n’ụwa ọhụrụ agatụghị ekwe ka anyị cheta ihe ndị dị otú ahụ. Aịsaịa 65:17, 18 gwara anyị, sị: “A gaghị echetakwa ihe mbụ nile, ha agaghị abatakwa n’obi. Ma otú ọ dị, ka obi tọọ unu ụtọ, tegharịakwanụ egwú ọṅụ ruo mgbe ebighị ebi n’ihi ihe nke Mụ onwe m na-eke.” N’ihi ya, o kwesịrị nnọọ ekwesị na onye otu nne ji ya na Jizọs bụ́ Jems kwuru, sị: “Anyị na-akpọ ndị tachiworo obi ndị obi ụtọ.” (Jems 5:11) Ee, ọ bụrụ na anyị ejiri ikwesị ntụkwasị obi die ahụhụ ndị anyị na-ata n’oge a, anyị ga-erite uru n’ọdịnihu.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

• Olee otú ụmụ mmadụ si malite ịta ahụhụ?

• Olee uru ahụhụ pụrụ ịbara ndị ga-achị ụwa n’ọdịnihu na ndị ha ga-achị?

• Olee ihe mere anyị nwere ike iji nwee obi ụtọ ugbu a n’agbanyeghị na anyị na-ata ahụhụ?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 27]

Nne na nna anyị mbụ nwere olileanya magburu onwe ya

[Foto dị na peeji nke 29]

Ịhụ ahụhụ kwadebere Jizọs ịbụ ezi Eze na Nnukwu Onye Nchụàjà

[Foto dị na peeji nke 31]

Ndịozi ahụ ‘ṅụrịrị ọṅụ n’ihi na a gụrụ ha ná ndị ruru eru ka e menye ha ihere’ n’ihi okwukwe ha