Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

‘E Dere Ya Iji Nye Anyị Ntụziaka’

‘E Dere Ya Iji Nye Anyị Ntụziaka’

‘E Dere Ya Iji Nye Anyị Ntụziaka’

“IME ọtụtụ akwụkwọ enweghị ọgwụgwụ.” (Eklisiastis 12:12) Imerime akwụkwọ juru ebe nile taa mere ka okwu a bụrụ eziokwu taa dị nnọọ ka ọ bụ mgbe e dere ya. Oleezi otú onye maara ihe nke nwere mmasị ịgụ akwụkwọ ga-esi kpebie akwụkwọ nke kwesịrị ọgụgụ?

Ọtụtụ ndị na-achọ ibu ụzọ mara ihe ụfọdụ banyere onye dere akwụkwọ ha na-achọ ịgụ. Ndị na-ebipụta akwụkwọ pụrụ idenye obere paragraf nke na-akọ banyere ebe onye dere akwụkwọ ahụ si, ebe ọ gụruru n’akwụkwọ, na akwụkwọ ya ndị ọzọ e bipụtarala. Otu ihe na-egosi na ọ dị ndị na-agụ akwụkwọ oké mkpa ịma onye dere akwụkwọ ha na-agụ bụ na ụmụ nwanyị ndị na-ede akwụkwọ n’oge gboo na-eji aha ndị nwoke edochi aha ha ka onye na-agụ akwụkwọ ha ghara iche na akwụkwọ ahụ akatachaghị ahụ́ n’ihi na ọ bụ nwanyị dere ya.

Ọ dị mwute na, dị ka anyị hụrụ n’isiokwu bu ụzọ, ụfọdụ ndị na-eleghara Akwụkwọ Nsọ Hibru anya n’ihi na ha kweere na Chineke e kwuru banyere ya n’ebe ahụ bụ chi obi fere azụ, onye na-ala ndị iro ya n’iyi n’emeghị ebere. * Ka anyị tụlee ihe Akwụkwọ Nsọ Hibru na Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst nwere ịgwa anyị banyere Onye Bible sitere n’aka ya.

Banyere Onye O Sitere n’Aka Ya

Dị ka Akwụkwọ Nsọ Hibru si kwuo, Chineke gwara mba Izrel, sị: “Mụ onwe m, bụ́ Jehova, agbanweghị.” (Malakaị 3:6) Mgbe ihe dị ka narị afọ ise gasịrị, onye so dee Bible bụ́ Jems dere banyere Chineke, sị: “E nweghịkwa mgbanwe nke ntụgharị nke onyinyo n’ebe ọ nọ.” (Jems 1:17) Gịnịzi mere ụfọdụ ji eche na Chineke e kwuru okwu ya n’Akwụkwọ Nsọ Hibru dị iche na Chineke nke e kwuru okwu ya n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst?

Azịza ya bụ na a kọwara àgwà dị iche iche Chineke nwere n’akụkụ dị iche iche na Bible. Nanị n’akwụkwọ Jenesis, a kọwara ya dị ka onye ‘ihe na-ewute n’obi,’ “Onye nwe eluigwe na ụwa,” na “Onyeikpe ụwa nile.” (Jenesis 6:6; 14:22; 18:25) Ọ̀ bụ otu Chineke ahụ ka a na-ekwu okwu ya n’ebe ndị a? Ee, ọ bụ ya.

Iji maa atụ: Ndị nwerela okwu ikpe n’ụlọikpe pụrụ ile otu ọkàikpe anya dị ka onye na-akwụsi ike n’ihe iwu kwuru mgbe ọ na-ekpe ikpe. Ma, ụmụ ya pụrụ ile ya anya dị ka nna na-ahụ n’anya na onye na-emesapụ aka. O nwere ike ndị enyi ya ma ya dị ka onye ọ na-adị mfe ịbịakwute na onye na-eme ihe ọchị. Ọ bụ otu onye a bụ ya bụ ọkàikpe, nna, na enyi. Ihe merenụ bụ na àgwà ya dị iche iche na-apụta ìhè na-adabere ná ndị ya na ha nọ.

N’otu aka ahụ, Akwụkwọ Nsọ Hibru kọwara Jehova dị ka “Chineke nke nwere obi ebere, Onye na-eme amara, Onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, Onye na-aba ụba n’ebere na eziokwu.” Ma, anyị gụtakwara na “ọ dịghị ụzọ ọ bụla Ọ ga-agụ ndị ikpe mara na ha bụ ndị ikpe na-amaghị.” (Ọpụpụ 34:6, 7) Àgwà ndị a na-eme ka ihe aha Chineke pụtara dokwuo anya. “Jehova” pụtara n’ụzọ nkịtị “Ọ Na-eme Ka Ọ Ghọọ.” Ya bụ na Chineke na-aghọ ihe ọ bụla dị mkpa iji mezuo nkwa ya. (Ọpụpụ 3:13-15) Ma ọ ka bụ otu Chineke ahụ. Jizọs kwuru, sị: “Jehova bụ́ Chineke anyị bụ otu Jehova.”—Mak 12:29.

È Dochiela Anya Akwụkwọ Nsọ Hibru?

Ihe a na-ahụkarị n’ụwa taa bụ na a na-eji akwụkwọ ọhụrụ edochi anya nke ochie mgbe a chọpụtara ihe ọhụrụ ma ọ bụ mgbe otú ndị mmadụ si ele ihe anya gbanwere. Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst o sila otú a nọchie anya Akwụkwọ Nsọ Hibru? Mba.

Ọ bụrụ na Jizọs chọrọ ka e jiri ihe ndekọ banyere ozi ya na akwụkwọ ndị ndị na-eso ụzọ ya dere dochie anya Akwụkwọ Nsọ Hibru, ọ gaara ekwu nnọọ otú ahụ. Ma, Luk dere banyere ihe Jizọs mere obere oge tupu ya arịgoo n’eluigwe, sị: “N’ibidokwa n’ihe Mozis dere na n’akwụkwọ ndị amụma nile [bú ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ Hibru], ọ kọwaara [mmadụ abụọ n’ime ndị na-eso ụzọ ya] ihe ndị metụtara ya onwe ya n’ime Akwụkwọ Nsọ dum.” Jizọs mesịrị pụta n’ihu ndịozi ya kwesịrị ntụkwasị obi na ndị ọzọ. Luk gara n’ihu ikwu, sị: “O wee sị ha: ‘Ndị a bụ okwu m bụ́ ndị m gwara unu mgbe mụ na unu ka nọ, na ihe nile e dere n’iwu Mozis na n’akwụkwọ ndị amụma na Abụ Ọma banyere m aghaghị imezu.’” (Luk 24:27, 44) Ọ bụrụ na Akwụkwọ Nsọ Hibru abaghịzi uru, Jizọs ọ̀ gaara eji ya eme ihe ná ngwụsị ozi elu ala ya?

Mgbe e hiwesịrị ọgbakọ Ndị Kraịst, ụmụazụ Jizọs nọgidere jiri Akwụkwọ Nsọ Hibru na-eme ihe iji mee ka a mata amụma ndị na-emezubeghị, iji kọwaa ụkpụrụ ndị dị n’Iwu Mozis bụ́ ndị na-akụziri anyị ihe bara uru, nakwa iji kọọ banyere ndị ohu Chineke n’oge ochie, bụ́ ndị ezi ihe nlereanya ha na-agba Ndị Kraịst ume ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi. (Ọrụ 2:16-21; 1 Ndị Kọrint 9:9, 10; Ndị Hibru 11:1–12:1) Pọl onyeozi dere, sị: “Akwụkwọ Nsọ dum sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke, baakwa uru.” * (2 Timoti 3:16) Olee uru Akwụkwọ Nsọ Hibru bara taa?

Ndụmọdụ Bara Uru Maka Otú A Ga-esi Na-ebi Ndụ Kwa Ụbọchị

Tụlee ihe banyere ịkpa ókè agbụrụ e nwere taa. N’otu obodo dị n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe, otu nwa okorobịa dị afọ iri abụọ na otu, onye bụ́ onye Etiopia, kwuru, sị: “Ọ bụrụ na anyị achọọ ịpụ apụ, anyị na-apụ n’ìgwè. O nwere ike ha hụ anyị n’ìgwè ha agaghị alụso anyị ọgụ.” O kwukwara, sị: “Anyị anaghị apụ apụ ma ọ gafee elekere isii nke uhuruchi, karịsịa anyị adịghị agba ụgbọ okporo ígwè. Ndị mmadụ hụ anyị, nanị ebe ha na-elekwasị anya bụ n’ụcha akpụkpọ ahụ́ anyị.” È nwere ihe Akwụkwọ Nsọ Hibru kwuru banyere nsogbu a tara akpụ?

A gwara ndị Izrel oge ochie, sị: “Mgbe ọbịa ga-anọnyere gị dị ka ọbịa n’ala unu, unu emela ya ihe ike. Dị ka onye a mụrụ n’ala site n’ahụ́ unu ka ọbịa ga-adịrị unu, bụ́ onye nọ dị ka ọbịa n’etiti unu, ị ga-ahụkwa ya n’anya dị ka onwe gị; n’ihi na ndị ọbịa ka unu burịị n’ala Ijipt.” (Levitikọs 19:33, 34) Ee, n’Izrel oge ochie, iwu ahụ e nyere ndị Izrel chọrọ ka ha na-akwanyere ndị si esi kwabata n’Izrel ma ọ bụ “ndị ọbịa” ùgwù, e chekwakwara iwu ahụ n’Akwụkwọ Nsọ Hibru. Ì kweghị na ụkpụrụ ndị dị n’iwu ahụ pụrụ inye aka kwụsị ịkpọasị agbụrụ nke e nwere taa?

Ọ bụ eziokwu na Akwụkwọ Nsọ Hibru ekwughị ihe nile mmadụ ga-eme n’ihe banyere ego, o nyere ntụziaka bara uru banyere otú mmadụ ga-esi jiri amamihe mee ihe mgbe a bịara n’ihe banyere ego. Dị ka ihe atụ, n’Ilu 22:7, anyị na-agụ, sị: “Ohu ka onye na-ebiri ego bụụrụ onye mbinye.” Ọtụtụ ndị na-enye ndị mmadụ ndụmọdụ otú ha ga-esi na-ejikwa ego ha kweere na ịzụ ihe n’aka aghara aghara na-eme ka mmadụ daa ogbenye.

Tụkwasị na nke ahụ, otu onye so ná ndị kasị baa ọgaranya bitụrụla n’ụwa a, bụ́ Eze Solomọn, kwuru nnọọ okwu n’ihe banyere ịchụ ego ọnwụ ọnwụ nke ọtụtụ ndị na-eme taa. O dere, sị: “Onye na-ahụ ego n’anya, ego agaghị eju ya afọ; ọzọ, onye na-ahụ inwe ihe bara ụba n’anya, ihe omume agaghị eju ya afọ: nke a bụkwa ihe efu.” (Eklisiastis 5:10) Nke a bụ nnọọ ịdọ aka ná ntị amamihe dị na ya.

Olileanya Maka Ọdịnihu

Bible dum nwere otu isiokwu: Alaeze nke Jizọs Kraịst ga-achị bụ ihe Chineke ga-eji gosi na ọ bụ ya ka o ruuru ịchị eluigwe na ala, ọ bụkwa ihe Chineke ga-eji doo aha ya nsọ.—Daniel 2:44; Mkpughe 11:15.

Site n’Akwụkwọ Nsọ Hibru, anyị na-amụta otú ndụ ga-adị n’Alaeze Chineke, bụ́ nke na-akasi anyị obi ma na-eme ka anyị bịarukwuo Onye nkasi obi ahụ si n’aka ya, bụ́ Jehova Chineke, nso. Dị ka ihe atụ, Aịsaịa onye amụma buru amụma na a ga-enwe udo n’etiti ụmụ anụmanụ na ụmụ mmadụ: “Anụ ọhịa wolf na nwa atụrụ ga-anọkwa, agụ na nwa ewu ga-amakpukọkwa; nwa ehi na nwa ọdụm na nwa anụ e mere ka ọ maa abụba ga-adịkwa n’otu ebe; nwatakịrị ga na-edukwa ha.” (Aịsaịa 11:6-8) Nke a bụ olileanya magburu nnọọ onwe ya!

Gịnị ka Akwụkwọ Nsọ Hibru nwere ikwu banyere ndị a kpọrọ asị n’ihi agbụrụ ha, ndị ọrịa jisiri ike, ma ọ bụ ndị nsogbu akụ̀ na ụba na-esi ọnụ n’ala? Akwụkwọ Nsọ Hibru buru amụma banyere Jizọs Kraịst, sị: “Ọ ga-anapụta ogbenye mgbe ọ na-etiku ya; ọ ga-anapụtakwa onye e wedara n’ala mgbe ọ dịghị onye na-enyere ya aka. Ọ ga-emere onye na-enweghị ike na ogbenye ebere, ọ bụkwa mkpụrụ obi ndị ogbenye ka ọ ga-azọpụta.” (Abụ Ọma 72:12, 13) Nkwa ndị a bara uru nke ukwuu n’ihi na ha na-enyere ndị kweere na ha aka inwe olileanya na obi ike na ihe ga-adị mma n’ọdịnihu.—Ndị Hibru 11:6.

Ka a sịkwa ihe mere Pọl onyeozi ji dee site n’ike mmụọ nsọ, sị: “Ihe nile e dere tupu oge ha eruo ka e dere iji nye anyị ntụziaka, ka anyị wee site ná ntachi obi anyị na site ná nkasi obi sitere n’Akwụkwọ Nsọ nwee olileanya”! (Ndị Rom 15:4) Ee, Akwụkwọ Nsọ Hibru ka bụ akụkụ dị oké mkpa nke Okwu Chineke e dere n’ike mmụọ nsọ, bụ́ Bible. Ha baara anyị uru dị ukwuu taa. Anyị nwere olileanya na ị ga-agbalịsi ike ịmụtakwu ihe Bible dum na-akụzi ma si otú ahụ bịarukwuo Onye o sitere n’aka ya, bụ́ Jehova Chineke, nso.—Abụ Ọma 119:111, 112.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji nke]

^ par. 4 N’isiokwu a, ihe anyị na-akpọ Agba Ochie bụ Akwụkwọ Nsọ Hibru. (Lee igbe bụ́ “Ọ̀ Bụ Agba Ochie Ka Ọ̀ Bụ Akwụkwọ Nsọ Hibru?” nke dị na peeji nke 6.) N’otu aka ahụ, Ndịàmà Jehova na-akpọ Agba Ọhụrụ Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst.

^ par. 13 N’Akwụkwọ Nsọ Hibru, e nwere ọtụtụ ụkpụrụ ndị bara nnọọ uru taa. Otú ọ dị, anyị kwesịrị ịmata na Ndị Kraịst anọghịzi n’okpuru Iwu ahụ Chineke si n’aka Mozis nye mba Izrel.

[Igbe dị na peeji nke 6]

Ọ̀ BỤ AGBA OCHIE KA Ọ̀ BỤ AKWỤKWỌ NSỌ HIBRU?

A na-achọta okwu ahụ bụ́ “agba ochie” ná 2 Ndị Kọrint 3:14 na Bible King James Version. N’ebe ahụ, okwu ahụ bụ́ “agba” ka e ji sụgharịa okwu Grik bụ́ di·a·theʹke. Otú ọ dị, ọtụtụ nsụgharị ndị e nwere n’oge a, ndị dị ka New International Version, sụgharịrị di·a·theʹke ịbụ “ọgbụgba ndụ” kama ịbụ “agba.” N’ihi gịnị?

Onye na-ede akwụkwọ ọkọwa okwu bụ́ Edward Robinson kwuru, sị: “Ebe ọ bụ na ọgbụgba ndụ ochie ahụ dị n’akwụkwọ Mozis, [di·a·theʹke] pụtara akwụkwọ ọgbụgba ndụ ahụ, ihe odide Mozis, ya bụ, iwu ahụ.” Ná 2 Ndị Kọrint 3:14, ihe Pọl onyeozi na-ekwu okwu ya bụ Iwu Mozis, nke ihe ọ bụ bụ nanị otu akụkụ nke Akwụkwụ Nsọ e nwere tupu oge Ndị Kraịst.

Oleezi aha kwesịrị ekwesị a ga-akpọ akwụkwọ iri atọ na itolu mbụ dị na Bible Nsọ? Kama ikwu ihe na-eme ka e chewe na akụkụ Bible a emeela ochie ma ọ bụ gharazie ịba uru, Jizọs Kraịst na ụmụazụ ya kpọrọ akụkụ Bible a “Akwụkwọ Nsọ.” (Matiu 21:42; Ndị Rom 1:2) N’ihi ya, n’ikwekọ n’okwu ndị a e dere n’ike mmụọ nsọ, Ndịàmà Jehova na-akpọ Agba Ochie Akwụkwọ Nsọ Hibru n’ihi na ọ bụ asụsụ Hibru bụ asụsụ mbụ e ji dee ihe ka ukwuu n’akụkụ Bible a. N’otu aka ahụ, ha na-akpọ akụkụ nke a sị na ọ bụ Agba Ọhụrụ Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst n’ihi na ọ bụ Grik ka ndị Chineke nyere ike mmụọ nsọ ji dee akụkụ Bible a.

[Foto ndi ḍị na peeji nke 4]

Mmadụ pụrụ ịbụ onyeikpe na-akwụsi ike n’ihe iwu kwuru, nna na-ahụ n’anya, na enyi

[Foto dị na peeji nke 5]

Jizọs ji Akwụkwọ Nsọ Hibru mee ihe n’oge nile o jere ozi

[Foto ndị dị na peeji nke 7]

Olee ụkpụrụ Bible ndị pụrụ inyere mmadụ aka ime mkpebi ndị ziri ezi?