Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jehova Nyeere Anyị Aka Ịlanahụ Ọchịchị Aka Ike

Jehova Nyeere Anyị Aka Ịlanahụ Ọchịchị Aka Ike

Akụkọ Ndụ

Jehova Nyeere Anyị Aka Ịlanahụ Ọchịchị Aka Ike

Dị Ka Henryk Dornik Si Kọọ

A MỤRỤ m na 1926. Ndị mụrụ m na-ekpechi okpukpe Roman Katọlik anya. Ha bi na Ruda Slaska, bụ́ obodo a na-egwupụta akụ̀ ndị dị n’ime ala, nke dị nso obodo Katowice, n’ebe ndịda Poland. Ha kụziiri m, nwanne m nwoke nke okenye bụ́ Bernard na ụmụnne m ndị nwanyị abụọ dị obere, bụ́ Róża na Edyta, ka anyị na-ekpe ekpere, na-aga chọọchị ma na-edowe sakramentị nke penansị.

Eziokwu Bible Erute n’Ụlọ Anyị

Otu ụbọchị na January 1937, bụ́ mgbe m dị afọ iri, papa m ji nnọọ obi ụtọ lọta. O welatara otu nnukwu akwụkwọ Ndịàmà Jehova nyere ya. Ọ gwara anyị, sị: “Ụmụ m, lekwanụ Akwụkwọ Nsọ m nwetara.” Nke ahụ bụ nke mbụ anya m hụtụrụ Bible.

Ọ dịla anya Chọọchị Katọlik kpawara ike na Ruda Slaska na n’obodo ndị dị ya gburugburu. Ndị ụkọchukwu na ndị nwe ụlọ ọrụ ndị dị n’ebe ahụ a na-egwu akụ́ ndị dị n’ala dị nnọọ ná mma, ha na-agwakwa ndị na-arụ ọrụ n’ụlọ ọrụ ndị ahụ ka ha na ndị ezinụlọ ha na-eme ihe nile chọọchị sịrị ka e mee. Ọ bụrụ na onye ọrụ agaghị Mas ma ọ bụ jụ ịga mee nkwupụta, ha na-ewere onye ahụ dị ka onye na-ekweghị ekwe, ma gụnye ya ná ndị a ga-achụ n’ọrụ. Papa m bịara soro ná ndị a pụrụ ịchụ n’ọrụ n’ihi na ya na Ndịàmà Jehova na-akpa. Ma, mgbe otu onye ụkọchukwu bịara n’ụlọ anyị, papa m gbara ozizi ụgha ya n’anwụ n’ihu mmadụ nile. Onye ụkọchukwu ahụ ihere jidere achọghịzi ka e were okwu ahụ gaa n’ihu, n’ihi ya achụghị papa m n’ọrụ.

Ekpebisikwuru m ike ịmụ Bible mgbe m gechara arụmụka ahụ papa m na onye ụkọchukwu ahụ nwere. Abịara m hụwa Jehova n’anya, ma soro ya na-emekọrịta ihe. Ọnwa ole na ole ka papa m na onye ụkọchukwu ahụ kparịtachara ụka, anyị gara Ncheta ọnwụ Kraịst. Ọ bụ n’ebe a ka otu onye gwara mmadụ iri atọ ndị ọzọ banyere papa m, sị: “Onye a bụ onye Jonadab.” N’oge na-adịghị anya, abịara m ghọta na ọ bụ Ndị Kraịst olileanya ha bụ ịdị ndụ ebighị ebi n’elu ụwa ka a na-akpọ “ndị Jonadab,” ghọtakwa na ha ga-emecha buo ibu n’ọnụ ọgụgụ. *2 Ndị Eze 10:15-17.

“Nnaa, Ị̀ Marakwalanụ Ihe Bụ́ Baptizim?”

Mgbe papa m natachara eziokwu ahụ, ọ kwụsịrị ịṅụ mmanya na-aba n’anya ma ghọọ ezigbo di na ezigbo nna. Ma mama m achọghị ka ọ bụrụ Onyeàmà Jehova, ọ na-ekwukarị na ọ kaara ya mma ka papa m na-akpa àgwà otú ọ naara akpa ma nọgide na-ekpe Roman Katọlik. Otú ọ dị, mgbe a malitere ịlụ Agha Ụwa nke Abụọ, ọ chọpụtara na otu ndị ụkọchukwu ahụ bụ́ ndị kpere ekpere ka ndị Poland merie ndị Germany bụkwa ha na-ekele Chineke otú Hitler sizi merie. Ka e mechara na 1941, mama m sooro anyị na-ejere Jehova ozi.

Tupu oge ahụ, ọ gụrụ m agụụ ime baptizim iji gosi na ararala m onwe m nye Chineke, ma ndị okenye nọ n’ọgbakọ anyị kwuru na m ka bụ obere nwa. Ha sịrị m ka cheretụ. Ka e mechara na December 10, 1940, Konrad Grabowy (nwanna nwoke kwesịrị ntụkwasị obi ruo ọnwụ ya n’ogige ịta ahụhụ) kpọbara m n’otu obere ụlọ ma jiri akọ jụta m ihe ụfọdụ. Ọ jụrụ m ajụjụ ise, ihe ndị m zara jukwara ya afọ n’ihi ya kwa, e mere m baptizim. Otu n’ime ihe ndị ọ jụrụ m bụ, “Nnaa, ị marakwalanụ ihe bụ́ baptizim?” Ihe ọzọ ọ jụrụ m bụ, “Ị̀ ma na ugbu a a na-alụ agha, i ga-ekpebi n’oge na-adịghị anya ma ị ga-adịnyere Hitler ka ị ga-adịnyere Jehova, mkpebi gị nwekwara ike iri isi gị?” N’egbughịdị oge ọ bụla, azara m sị, “Ama m.”

Mkpagbu Ebiri Ọkụ

Gịnị mere Konrad Grabowy ji jụọ m ajụjụ ndị a n’ezoghị ihe ọ bụla? Ndị agha ndị Germany wakporo Poland na 1939, mgbe nke ahụ mesịrị, anyị bịara zute ule kpụ ọkụ n’ọnụ nke nwalere ma okwukwe anyị ò sikwara ike nakwa ma ànyị ga-anọgide na-ejere Jehova ozi. N’ụbọchị ọ bụla, obi adịghị eru anyị ala ka anyị na-anụ banyere ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị a kpụụrụ, ndị nke a gbaara ụgbọ nwa mkpi na ndị nke a kpọchiri n’ụlọ mkpọrọ ma ọ bụ n’ogige ịta ahụhụ. Anyị maara na n’oge na-adịghị anya, a gajekwa ile anyị onwe anyị otu ụdị ule ahụ.

Ndị Nazi chọrọ ime ka ndị na-eto eto—nke gụnyere mụ na ụmụnne m atọ—na-akwadosi ọchịchị Hitler ike. Ebe ọ bụ na ọtụtụ mgbe papa m na mama m ekweghị abịanye aka na Volkslist (akwụkwọ e ji depụtasịa aha ndị ghọrọla ma ọ bụ kwetara ịghọ ụmụ amaala Germany), ha ekweghị ka ha kpọrọ anyị bụ́ ụmụ ha zụọ. A kpọgara papa m n’ogige ịta ahụhụ dị n’Auschwitz. Na February 1944, a kpọgara mụ na nwanne m nwoke n’ebe a na-edebe ụmụaka nnupụisi na Grodków (Grottkau), bụ́ nke dị nso na Nysa, ha kpọgakwara ụmụnne m ndị nwanyị n’ebe obibi ndị nọn Katọlik dị na Czarnowąsy (Klosterbrück) bụ́ nke dị nso n’obodo Opole. Ihe mere ha jiri mee nke a bụ iji mee ka anyị chefuo ihe ndị ọchịchị na-akpọ “echiche na-eduhie eduhie nke ndị mụrụ anyị.” A hapụrụ nanị mama m n’ụlọ.

N’ụtụtụ ọ bụla n’ebe ahụ a kpọgara anyị, ha na-eweli ọkọlọtọ swastika elu ma gwa anyị ka anyị na-ekele ọkọlọtọ ahụ site n’iweli aka nri anyị elu ma na-ekwu “Heil Hitler.” Nke ahụ bụ nnọọ ule tara akpụ a na-ele okwukwe anyị, ma mụ na Bernard jụwapụrụ isi na anyị agaghị eme ya. Ha kụrụ anyị ezigbo ihe n’ihi na anyị ‘emeghị ihe ha sịrị anyị mee.’ Mgbalị ndị ọzọ ha mere iji kụda anyị mmụọ kụrụ afọ n’ala, n’ihi ya ìgwè ndị nche ndị Germany a na-akpọ ndị SS mechara gwa anyị, sị, “A ga-akpọga unu n’ogige ịta ahụhụ, ọ gwụkwala ma unu tinyere aka n’akwụkwọ na unu na-adịnyere Ọchịchị Germany ma sonyere ndị Wehrmacht [ndị agha ndị Germany].”

N’August 1944 mgbe ndị ọchịchị kwekọrịtara ka a kpọga anyị n’ogige ịta ahụhụ, ha kwuru, sị: “Anyị enweghị ike ịmanye ha ime ihe ọ bụla. Ahụhụ a na-ata ha n’ihi okwukwe ha na-enye ha ọṅụ. Isi ike ha pụrụ ibute ezigbo nsogbu n’ebe a.” Ọ bụ ezie na achọghị m ịghọ onye e gburu n’ihi okwukwe ya, iji obi ike na-ata ahụhụ na ùgwù a na-akwanyere m n’ihi irubere Jehova isi nyere m ọṅụ. (Ọrụ 5:41) Ọ dịtụghị otú m ga-esi dilie ahụhụ ndị m ka gaje ịta n’ike aka m. Ikpesi ekpere ike mekwara ka m bịarukwuo Jehova nso, Jehova gosikwara nnọọ na ya bụ Onye enyemaka a pụrụ ịtụkwasị obi.—Ndị Hibru 13:6.

A Kpọga Anyị n’Ogige Ịta Ahụhụ

N’oge na-adịghị anya, a kpọgara m n’ogige ịta ahụhụ Gross-Rosen bụ́ nke dị na Silesia. N’ebe ahụ, e nyere m nọmba mkpọrọ na purple triangle bụ́ nke na-egosi na m bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova. Ndị nche SS nyere m ohere ịhọrọ ihe m ga-eme. Ha kwuru na a ga-atọhapụ m ọbụna mee m ọfịsa ndị agha Nazi ma ọ bụrụ na m ga-ekwe eme otu ihe. “Ị ga-ajụrịrị nkwenkwe Ndị Mmụta Bible bụ́ nke na-emegide ọchịchị Hitler.” Ọ dịghị onye mkpọrọ ọ bụla ọzọ ha kwere ụdị nkwa a ha kwere m. Ọ bụ nanị Ndịàmà Jehova ka e nyere ohere isi n’ụlọ mkpọrọ ahụ pụọ. Ma, ajụwapụrụ m isi ịnabata “ihe ùgwù” a, dị nnọọ ka ọtụtụ puku ndị ọzọ mere. Ihe ndị nche ahụ gwara m bụ́: “Legodị mpio a anwụrụ ọkụ si apụ bụ́ ebe a na-akpọ ndị nwụrụ anwụ ọkụ. Chebara ihe anyị gwara gị echiche ọzọ, ma ọ bụghị ya, ị ga-esi ebe ahụ laa.” Ajụkwara m ọzọ, ozugbo ahụ, enwere m nnọọ “udo nke Chineke nke karịrị echiche nile.”—Ndị Filipaị 4:6, 7.

Ekpere m ekpere ka m hụ Ndịàmà ibe m nọ n’ogige ahụ, Jehova mekwara ka m hụ ha. Otu n’ime Ndịàmà ibe m a bụ otu nwanna nwoke na-ekwesị ntụkwasị obi aha ya bụ Gustaw Baumert, bụ́ onye lekọtara m nnọọ nke ọma. Ihe ịrụ ụka ọ bụla adịghị ya na Jehova ghọọrọ m “Nna nke obi ebere na Chineke nke nkasi obi nile.”—2 Ndị Kọrint 1:3.

Ka ọnwa ole na ole gasịrị, ndị agha Russia ji ike na-abịa mere ka ndị Nazi si n’ogige ahụ gbapụ n’egbughị oge. Ka anyị na-akwadebe isi n’ogige ahụ pụọ, anyị bụ́ ụmụnna nwoke tinyere ndụ anyị n’ihe ize ndụ site n’ikpebi na anyị ga-aga n’ogige ebe a kpọchiri ụmụ nwanyị ma lee otú ụmụnna anyị ndị nwanyị ruru iri mmadụ abụọ dị. Elsa Abt na Gertrud Ott so ná ndị a. * Mgbe ha hụrụ anyị, ha jiri ọsọ bịa zute anyị, mgbe anyị gbarịtachara onwe anyị ume ruo obere oge, anyị bụkọrọ abụ Alaeze ahụ kwuru, sị: “Onye nwere okwukwe, nke dị ọcha n’obi, adịghị mgbe ọ ga na-atụ egwu.” * Ọ dịghị onye n’ime anyị anya mmiri na-agbaghị!

A Kpọga Anyị n’Ogige Ọzọ

Ndị Nazi kpojuru anyị bụ́ ndị mkpọrọ dị site n’otu narị ruo otu narị na iri ise n’otu ọnụ ụlọ nke ụgbọ okporo ìgwè e ji ebu kol na-enyeghị onye ọ bụla n’ime anyị nri ma ọ bụ mmiri, ezigbo oyi na-atụkwa n’ihi na ụdị mmiri na-ezonụ abụghị ihe e ji ọnụ akọ. Akpịrị ịkpọ nkụ na ahụ́ ọkụ mesiri anyị nnọọ ike. Ohere bịara dịtụ n’ụgbọ okporo ìgwè ahụ ka ndị mkpọrọ ahụ́ na-adịghị na ndị nke agụụ gụgburu na-ada ma na-anwụ. Ụkwụ m na nkwonkwo m zajuru nnọọ nke na enweghị m ike iguzo ọtọ. Ka anyị mesịrị njem were anyị abalị iri, ndị mkpọrọ ole na ole na-anwụghị na njem ahụ rutere n’ogige a na-anọ ata ndị mkpọrọ ahụhụ na Mittelbau-Dora bụ́ nke dị na Nordhausen. Ogige a dị nso na Weimar bụ́ nke dị n’obodo Thuringia. Otu ihe dị ịtụnanya merenụ bụ́ na ọ dịghị nwanna ọ bụla nwụrụ n’oge ahụ anyị mere ogologo njem ọjọọ ahụ.

Ozugbo m nwetara onwe m n’ogologo njem ahụ anyị mere, ọrịa ọnyụnyụ ọbara tiwapụrụ n’ogige ahụ, ọrịa a bịakwara ụfọdụ ụmụnna anyị, tinyere m. A gwara anyị kwụsịgodị iri ofe a na-adị ekesa n’ogige ahụ ma na-ata nanị bred a hụrụ n’ọkụ. Emere m ihe ahụ a gwara anyị ma gbakee ngwa ngwa. Na March 1945 anyị nụrụ na ebe e si nweta isiokwu nke afọ ije ozi ahụ bụ na Matiu 28:19: “Ya mere gaanụ mee ndị nke mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m.” Eleghị anya, n’oge na-adịghị anya ọnụ ụzọ ámá ogige ahụ gaje imepe, anyị anọgidekwa na-ekwusa ozi ọma ahụ! Nke a mere ka anyị nwee ọṅụ dị ukwuu na olileanya n’ihi na anyị cheburu na Agha Ụwa nke Abụọ ahụ ga-eduga n’Amagedọn. Jehova gbara anyị nnọọ ume n’oge ndị ahụ tara akpụ.

A Tọhapụ Anyị n’Ogige Ahụ

N’April 1, 1945, ndị agha ndị na-alụso ndị Germany ọgụ tụrụ bọmbụ n’ebe ndị SS bi nakwa n’ogige ebe anyị bi, bụ́ nke dị nso ebe ahụ. E gburu ọtụtụ mmadụ merụọkwa ọtụtụ ndị ọzọ ahụ́. N’echi ya, a tụgasịrị bọmbụ n’ebe ahụ anyị bi, ọ bụkwa n’oge a ka otu bọmbụ gbawaranụ tụliri m elu.

Otu n’ime ụmụnna ndị anyị na ha nọ, bụ́ Fritz Ulrich, bịara nyere m aka. Ọ gbalịrị igwupụta m n’ime ebe bọmbụ ahụ liri m n’ihi na o nwere olileanya na m ka dị ndụ. O mechara chọta m n’ime mkpọmkpọ na mkpọmkpọ ndị ahụ bọmbụ gbariri ma dọpụta m. Mgbe m matara onwe m, achọpụtara m na ihu m na ahụ́ m gwụrụ agwụ, adịghịzikwa m anụ ihe. Ụ̀zụ̀ bọmbụ ahụ gbawaranụ asụchiela m udu ntị. Ntị m nyegidere m nsogbu ruo ọtụtụ afọ tupu ya e mechaa laa.

Ọ bụ nanị mmadụ ole na ole n’ime ọtụtụ puku ndị mkpọrọ nọ n’ogige ahụ ka bọmbụ ahụ na-egbughị. Ụfọdụ ụmụnna anyị nwụrụ, ezigbo nwanna m bụ́ Gustaw Baumert so ná ndị a nwụrụnụ. Ihe ndị ahụ merụsịrị m ahụ́ kpataara m ọrịa na oké ahụ́ ọkụ. N’oge na-adịghị anya, ndị agha ahụ na-alụso ndị Germany ọgụ hụrụ anyị ma tọhapụ anyị. Ka ọ dịgodị, ajọ ọrịa ahụ́ ọkụ tiwapụrụ n’ogige ahụ n’ihi ozu ndị mkpọrọ rere ere juru ebe nile, ma ndị nke nwụụrụ onwe ha ma ndị nke e gburu egbu. Ebutekwara m ọrịa a. E bugara mụ na ndị ọrịa ndị ọzọ n’ụlọ ọgwụ. N’agbanyeghị ihe nile ndị dọkịta gbalịrị, ọ bụ nanị mmadụ atọ n’ime anyị gbakere n’ọrịa ahụ. Obi dị m nnọọ ụtọ na Jehova wusiri m ike ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi nye ya n’oge ndị ahụ tara nnọọ akpụ! Ana m ekelekwa Jehova na ọ napụtara m na “ndagwurugwu onyinyo” ọnwụ.—Abụ Ọma 23:4.

M Laruo Ụlọ n’Ikpeazụ

Mgbe ndị Germany mechara chịlie aka elu, obi m nile bụ ịlaghachi ụlọ ngwa ngwa o kwere mee, ma ọ dịghịrị m mfe otú m si tụọ anya ya. Ụfọdụ ndị bụbu ndị mkpọrọ, bụ́ ndị so n’òtù a na-akpọ Catholic Action hụrụ m. Ha tiri mkpu, sị, “Kụgbuonụ ya!” Ha kụturu m n’ala, ma chọọ iji ụkwụ zọgbuo m. Otu nwoke gbatara ma napụta m n’aka ha, ma o were m ọtụtụ oge iji gbakee n’ihi na ha merụsịrị m ahụ́, enwetachabeghịkwa m onwe m n’ihi oké ahụ́ ọkụ ahụ rịara m. Ma emechara m laruo ụlọ anyị. Enwere m nnọọ obi ụtọ ịhụ ndị ezinụlọ m ọzọ! Ha nile nwere nnọọ obi ụtọ ịhụ m n’ihi na ha chere na anwụọla m.

O teghị aka anyị amaliteghachi ọrụ nkwusa, ọtụtụ ndị ji obi ha nile na-achọ eziokwu nabatakwara ihe anyị kụziiri ha. E nyefere m ọrụ nke ịdị na-aga ebugara ọgbakọ dị iche iche akwụkwọ ndị e ji amụ Bible. Mụ na ụmụnna ndị ọzọ nwere ihe ùgwù ịga Weimar gaa zute ndị nnọchianya si n’alaka ụlọ ọrụ dị na Germany, ọ bụkwa n’ebe ahụ ka anyị siri bubata Ụlọ Nche mbụ ndị e bipụtara n’asụsụ German mgbe a lụchara Agha Ụwa nke Abụọ na Poland. A sụgharịrị ha ozugbo, kwadebe stencil e ji ebi ha, ma bipụta ha. Mgbe a malitere ịnọ n’ọfịs anyị nọ na Lodz na-ebi akwụkwọ nile a ga-eji na-eme ihe na Poland, ọgbakọ nile nọ na Poland bịaziri na-enweta akwụkwọ ndị e ji amụ Bible n’oge o kwesịrị. Abịara m jewe ozi dị ka onye ọsụ ụzọ pụrụ iche, ma ọ bụ onye ozi oge nile, na-eje ozi ná nnukwu obodo bụ́ Silesia, bụ́ nke akụkụ ya ka ukwuu so na Poland mgbe ahụ.

Otú ọ dị, n’oge na-adịghị anya, a bịakwara kpagbuwe Ndịàmà Jehova ọzọ, ná nke ugbu a ọ bụ ndị ọchịchị Kọmunist weghaara ọchịchị na Poland na-akpagbu ha. Na 1948, a tụrụ m mkpọrọ afọ abụọ n’ihi na achọghị m itinye aka ná ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Mgbe m nọ n’ụlọ mkpọrọ, enyeere m ọtụtụ ndị mkpọrọ ndị ọzọ aka ịbịaru Chineke nso. Otu n’ime ha tinyere ihe ndị ọ na-amụta n’ọrụ ma mechaa rara onwe ya nye Jehova, e mekwaa ya baptizim.

Na 1952, a tụkwara m mkpọrọ ọzọ, na nke ugbu a e boro m ebubo na m bụ onye nledo nke mba United States. Ka m nọ na-eche ka oge a ga-ekpe m ikpe ruo, e tinyere m n’ụlọ mkpọrọ otu onye nanị na-anọ ma na-agba m ajụjụ ehihie na abalị. Otú ọ dị, Jehova napụtakwara m ọzọ n’aka ndị a na-akpagbu m, enwetaghịkwa m ụdị mkpagbu a ọzọ n’afọ ndị sochirinụ.

Ihe Nyeere M Aka Ịtachi Obi

Ka m na-echetaghachi afọ ndị ahụ m nwetara ọtụtụ ule na ihe isi ike, apụrụ m icheta ihe ụfọdụ bụ́ isi gbara m ume. Jehova na Okwu ya bụ́ Bible bụ ebe mbụ m siri nweta agbamume. Ịnọgide na-ekpegara “Chineke nke nkasi obi nile” ekpere na ịmụ Okwu ya n’ụbọchị nile nyeere mụ na ndị ọzọ aka ịnọgidesi ike n’ihe anyị kweere. Anyị gụtakwara ọtụtụ ihe ndị dị anyị mkpa iji wusie okwukwe anyị ike n’Ụlọ Nche ndị e ji aka dee. N’ogige ịta ahụhụ ahụ, ụmụnna ibe m na-ahụ n’anya bụ́ ndị dị njikere inye aka wusiri m ike.

Onye ọzọ Jehova jirila gọzie m bụ nwunye m bụ́, Maria. Mụ na ya gbara akwụkwọ n’October 1950 ma mechaa mụta otu nwa nwanyị aha ya bụ Halina. Mgbe Halina tolitere, ọ hụrụ Jehova n’anya ma na-ejere ya ozi. Mụ na Maria bụ di na nwunye ruo iri afọ atọ na ise tupu ya anwụọ mgbe ọ rịasịrị ọrịa ruo ogologo oge. Ọnwụ ya gbawara m nnọọ obi. Ọ bụ ezie na ruo nwa oge ọ dị m ka ‘a kwadara m,’ ma ‘e bibighị m.’ (2 Ndị Kọrint 4:9) N’oge ndị ahụ tara akpụ, ndị nyeere m aka bụ ezigbo nwa m nwanyị, di ya, na ụmụ ya—ha nile ji ikwesị ntụkwasị obi na-ejere Jehova ozi.

Kemgbe 1990, m na-eje ozi n’alaka ụlọ ọrụ dị na Poland. Iso ọmarịcha ezinụlọ Betel na-emekọ ihe n’ụbọchị nile bụ nnọọ ngọzi dị ukwuu. Mgbe ụfọdụ, ọrịa na-eme ka m yie ugo ike na-adịghị ife efe. Ma eji m obi ike na-elepụ anya n’ọdịnihu, m ‘na-abụkukwa Jehova abụ, n’ihi na O mesowo m nke ọma’ ruokwa taa. (Abụ Ọma 13:6) M na-atụ anya mgbe Jehova, Onye na-enyere m aka, ga-akwụsị ihe ọjọọ nile ọchịchị nchịgbu Setan kpatarala.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji nke]

^ par. 8 Lee Ụlọ Nche nke January 1, 1998, peeji nke 13, paragraf nke 6.

^ par. 20 Lee akụkọ ndụ Elsa Abt n’Ụlọ Nche nke October 15, 1980, peeji nke 27-30.

^ par. 20 Abụ a bụ abụ nke 101 n’akwụkwọ abụ nke e bipụtara na 1928 nke a kpọrọ Ịbụku Jehova Abụ Otuto, bụ́ nke Ndịàmà Jehova bipụtara. N’akwụkwọ abụ nke anyị ji na-eme ihe ugbu a, ọ bụ abụ nke 56.

[Foto dị na peeji nke 10]

E nyere m nọmba a na purple triangle n’ogige ịta ahụhụ

[Foto dị na peeji nke 12]

Mụ na nwunye m bụ́ Maria, na 1980