Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

E Ji Aha Chineke Mee Ihe n’Egwú Ndị Russia

E Ji Aha Chineke Mee Ihe n’Egwú Ndị Russia

E Ji Aha Chineke Mee Ihe n’Egwú Ndị Russia

NA 1877, otu onye Russia a ma ama na-ede uri, onye aha ya bụ Modest Mussorgsky, bipụtara otu uri nke sitere n’akụkọ banyere ihe ndị mere n’ala ndị a kpọtụrụ aha ha na Bible. O degaara otu enyi ya akwụkwọ, sị: “Edeela m otu ihe nkiri sitere na Bible banyere onye a na-akpọ Jesus Navinus [Joshua], agbasoro m nnọọ ihe Bible kwuru dee akụkọ ahụ ọbụna dee nnọọ ụzọ ndị Navinus si gaa mgbe ọ meriri ọtụtụ ala ndị dị na Kenan.” N’ihe ndị ọzọ Mussorgsky dere, bụ́ nke gụnyere “Otú E Si Merie Senakerib,” ọ gbasokwara ihe Bible kwuru, kwuokwa banyere ndị a kọrọ akụkọ ha na Bible mgbe ọ na-ede ha.

Ọ dị ihe e kwesịrị ịhụwa ama Mussorgsky mere mgbe ọ na-ekwu banyere Chineke n’ihe o dere banyere “Jesus Navinus,” nakwa na nke o bipụtara na 1874 banyere “Otú E Si Merie Senakerib,” o jiri otú ndị Russia si akpọ aha Chineke bụ́ nke e ji mgbochiume anọ—יהוה (YHWH)—dee n’Akwụkwọ Nsọ Hibru mee ihe. Ọ fọrọ obere ka ebe ndị aha a pụtara n’Akwụkwọ Nsọ Hibru ruo puku asaa.

N’ihi ya, ihe ndị a Mussorgsky dere na-egosi na ndị Russia amarala na aha Chineke e dekọrọ na Bible bụ Jehovah, ọbụna tupu abata na narị afọ nke iri abụọ. Nke ahụ dabara nnọọ adaba, n’ihi na Jehova jiri aka ya gwa Mozis, sị: “Nke a bụ aha m ruo mgbe ebighị ebi, nke a bụkwa ihe ncheta m ruo ọgbọ nile.”—Ọpụpụ 3:15.

[Foto dị na peeji nke 32]

Otú St. Petersburg Conservatory dị na 1913, bụ́ ebe e debere akwụkwọ egwú Mussorgsky nke e biri ebi

[Ebe E Si Nweta Foto dị na peeji nke 32]

Akwụkwọ egwú: The Scientific Music Library nke Saint-Petersburg State Conservatory nke a gụrụ aha N.A. Rimsky-Korsakov; okporo ámá: National Library of Russia, St. Petersburg