Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Gịnị ka Jizọs bu n’uche mgbe o kwuru na ohu ya na-ekwesị ntụkwasị obi ‘ga-enwe uche’?

Jizọs jụrụ, sị: “Ònye n’ezie bụ ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche, bụ́ onye nna ya ukwu mere onye na-elekọta ezinụlọ ya, inye ha nri ha n’oge kwesịrị ekwesị?” (Matiu 24:45) “Ohu” ahụ nke na-enye “nri” ime mmụọ bụ ọgbakọ nke Ndị Kraịst e ji mmụọ nsọ tee mmanụ mejupụtara. Gịnị mere Jizọs ji kpọọ ha ndị nwere uche? *

Anyị pụrụ isite n’ihe ndị Jizọs kụziri ghọta nnọọ ihe o bu n’uche mgbe o kwuru banyere ‘inwe uche.’ Dị ka ihe atụ, mgbe Jizọs kwuru banyere “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche,” ọ tụrụ ilu banyere ụmụ agbọghọ iri na-amaghị nwoke bụ́ ndị nọ na-echere ịnabata nwoke na-alụ nwanyị ọhụrụ. Ụmụ agbọghọ ahụ na-amaghị nwoke na-echetara anyị ihe banyere Ndị Kraịst e tere mmanụ nọ ndụ tupu 1914, bụ́ ndị na-atụsi anya ike maka ọbịbịa nke nwoke ahụ ka ukwuu na-alụ nwanyị ọhụrụ, bụ́ Jizọs Kraịst. N’ime ụmụ nwanyị iri ahụ na-amaghị nwoke, ise enweghị mmanụ ọkụ ga-ezuru ha mgbe nwoke ahụ na-alụ nwanyị ọhụrụ bịarutere, ha esoghịzikwa gaa oriri agbamakwụkwọ ahụ. Ise ndị nke ọzọ nwere uche. Ha wetara mmanụ ọkụ ga-ezuru ha, bụ́ nke ga-eme ka ọkụ ha nọgide na-enwu mgbe nwoke ahụ na-alụ nwanyị ọhụrụ rutere, e kwekwara ka ha banye n’oriri agbamakwụkwọ ahụ.—Matiu 25:10-12.

Mgbe Jizọs malitere ịchị n’Alaeze ya na 1914, ọtụtụ n’ime Ndị Kraịst e tere mmanụ nọ na-atụ anya isonyere ya ozugbo n’eluigwe. Ma, e nwere ọtụtụ ọrụ ha ga-arụ n’ụwa, ụfọdụ adịghịkwa njikere maka ya. Dị nnọọ ka ụmụ agbọghọ ahụ na-enweghị uche, ha ebughị ụzọ mee ka mmekọrịta ha na Chineke sie ike, n’ihi ya, ha adịghị njikere ịnọgide na-enwu dị ka ndị na-enye ìhè. Ma ọtụtụ n’ime ha ji ezi uche mee ihe, ya bụ, ha ji amamihe na ọgụgụ isi mee ihe, bụ́ nke mere ka Chineke wusikwuo okwukwe ha ike. Mgbe ha chọpụtara na e nwekwuru ọrụ ha ga-arụ, ha jiri obi ụtọ gaa n’ihu ịrụ ya. N’ihi ya, ha gosiri na ha bụ “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche.”

Tụleekwa otú Jizọs si jiri okwu ahụ bụ́ ‘inwe uche’ mee ihe na Matiu 7:24. Jizọs sịrị: “Onye ọ bụla nke na-anụ okwu m ndị a ma na-eme ha, a ga-eji ya tụnyere nwoke nwere uche, bụ́ onye wuru ụlọ ya n’elu oké nkume.” Nwoke ahụ nwere uche wusiri ụlọ ya ike, adịghị ama ama oké ifufe abịa. Ma, nwoke ahụ na-enweghị uche wuru nke ya n’elu ájá, ụlọ ya adakasịakwa. N’ihi ya, onye na-eso ụzọ Jizọs nke nwere uche na-ebu ụzọ achọpụta ọdachi ndị ọ ga-ezute ma ọ gbasoo amamihe mmadụ. Iji nghọta na ezi uche eme ihe na-eme ka okwukwe ya, omume ya, na ihe ndị ọ na-akụzi na-egosi na o kwenyesiri ike n’ihe ndị Jizọs kụziri. Otú ahụkwa ka “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi nke nwekwara uche” na-eme.

Leekwa otú e si jiri okwu ahụ a sụgharịrị ịbụ ‘inwe uche’ mee ihe n’ọtụtụ ebe n’Akwụkwọ Nsọ Hibru. Dị ka ihe atụ, Fero họpụtara Josef dị ka onye ga na-elekọta ihe oriri n’Ijipt. Nke a so ná ndokwa Jehova mere iji mee ka ndị ya nweta nri. Gịnị mere e ji họrọ Josef? Fero gwara ya, sị: “Ọ dịghị onye nwere nghọta, nke makwaara ihe, dị ka gị.” (Jenesis 41:33-39; 45:5) Bible kwukwara na Abigail “nwere ezi uche.” O nyere onye Jehova e tere mmanụ bụ́ Devid na ndị ikom ya nri. (1 Samuel 25:3, 11, 18) A pụrụ ịkpọ Josef na Abigail ndị nwere ezi uche n’ihi na ha ghọtara ihe bụ́ uche Chineke ma jiri nghọta na amamihe mee ihe.

N’ihi ya, mgbe Jizọs kọwara ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi dị ka onye nwere uche, ihe ọ na-ekwu bụ na ndị na-anọchi anya ohu ahụ ga-eji nghọta na amamihe eme ihe n’ihi na okwukwe ha, omume ha, na ihe ndị ha na-akụzi na-egosi na ha kwenyesiri ike na ihe e dere n’Okwu Chineke bụ eziokwu.

[Ihe e dere n’ala ala peeji nke]

^ par. 3 Okwu Grik e si na ya sụgharịta okwu ahụ bụ́ ‘inwe uche’ bụ phroʹni·mos. Akwụkwọ bụ́ Word Studies in the New Testament, nke M. R. Vincent dere, kwuru na okwu a na-ezokarị aka n’iji amamihe na akọ eme ihe.