Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Na-eme Ebere—N’ụzọ Dị Aṅaa?

Na-eme Ebere—N’ụzọ Dị Aṅaa?

Na-eme Ebere—N’ụzọ Dị Aṅaa?

“Ka anyị na-eme ihe ọma n’ebe mmadụ nile nọ, ma karịsịa n’ebe ndị ezinụlọ anyị n’okwukwe nọ.”—NDỊ GALESHIA 6:10.

1, 2. Gịnị ka ilu banyere onye Sameria ahụ bụ́ ezigbo onye agbata obi na-akụziri anyị banyere ebere?

MGBE otu nwoke maara Iwu ahụ nke ọma na Jizọs na-akparịta ụka, ọ jụrụ Jizọs, sị: “Ònye n’ezie bụ onye agbata obi m?” Iji zaa ajụjụ ahụ, Jizọs tụụrụ ya ilu a: “Otu nwoke si Jeruselem na-agbada Jeriko ma daba n’aka ndị na-apụnara mmadụ ihe, bụ́ ndị gbara ya ọtọ, kụọkwa ya ihe, wee pụọ, hapụ ya ọdị ndụ ọnwụ ka mma. Ma, ná ndapụta, otu onye nchụàjà na-agbada n’okporo ụzọ ahụ, ma, mgbe ọ hụrụ ya, o si n’akụkụ nke ọzọ gafere. N’otu aka ahụ, onye Livaị kwa, mgbe o rutere ebe ahụ hụ ya, siri n’akụkụ nke ọzọ gafere. Ma otu onye Sameria nke na-eme njem n’ụzọ ahụ bịakwutere ya na mberede, mgbe ọ hụrụ ya, o nwere ọmịiko. Ya mere ọ gakwuuru ya wee kechie ọnyá ya, na-awụkwasị ha mmanụ na mmanya. O wee kukwasị ya n’anụ ụlọ nke ya ma kpọta ya n’ụlọ ndị njem wee lekọta ya. N’echi ya kwa, o wepụtara mkpụrụ ego dinarịọs abụọ, nye ha onye na-elekọta ụlọ ndị njem ahụ, wee sị, ‘Lekọta ya, m ga-akwụghachikwa gị ihe ọ bụla i mefuru n’elu nke a mgbe m ga-abịaghachi n’ebe a.’” Jizọs jụziri nwoke ahụ, sị: “Ònye n’ime mmadụ atọ a yiri gị onye meworo onwe ya onye agbata obi nke nwoke ahụ dabara n’aka ndị na-apụnara mmadụ ihe?” Nwoke ahụ zara, sị: “Onye ahụ nke mesoro ya ihe n’obi ebere.”—Luk 10:25, 29-37a.

2 Nlekọta onye Sameria ahụ lekọtara nwoke ahụ e merụrụ ahụ́ gosiri nnọọ ihe ezi ebere bụ! Obi ebere, ma ọ bụ ọmịiko, onye Sameria ahụ nwere kpaliri ya ime ihe iji nyere nwoke ahụ e merụrụ ahụ́ aka. Ọzọkwa, nwoke ahụ e merụrụ ahụ́ amabughị onye Sameria ahụ. Ọdịiche nke mba, okpukpe, ma ọ bụ omenala anaghị egbochi ebere. Mgbe Jizọs nyechara ihe atụ nke onye Sameria ahụ bụ́ ezigbo onye agbata obi, ọ dụrụ nwoke ahụ ọdụ, sị: “Gawara onwe gị, na-emekwa otú ahụ n’onwe gị.” (Luk 10:37b) Anyị pụkwara ịnabata ndụmọdụ ahụ ma na-agbalị imere ndị ọzọ ebere. Ma olee otú anyị ga-esi na-eme nke a? Olee ụzọ dị iche iche anyị nwere ike isi na-eme ebere kwa ụbọchị?

“Ọ Bụrụ na Nwanna . . . Na-agba Ọtọ”

3, 4. Gịnị mere o kwesịrị iji dị anyị mkpa ime ebere karịsịa n’ime ọgbakọ Ndị Kraịst?

3 Pọl onyeozi kwuru, sị: “Ọ bụrụhaala na anyị nwere oge dị mma maka ya, ka anyị na-eme ihe ọma n’ebe mmadụ nile nọ, ma karịsịa n’ebe ndị ezinụlọ anyị n’okwukwe nọ.” (Ndị Galeshia 6:10) Ka anyị burugodị ụzọ tụlee otú anyị nwere ike isi na-arụkwu ọrụ ebere n’ebe ndị ezinụlọ anyị n’okwukwe nọ.

4 Mgbe Jems onye na-eso ụzọ na-agba ezi Ndị Kraịst ume ka ha na-emere ibe ha ebere, o dere, sị: “A ga-eji emeghị ebere kpee ikpe nke onye na-adịghị eme ebere.” (Jems 2:13) Okwu ndị a sitere n’ike mmụọ nsọ na-agwa anyị ụzọ ụfọdụ anyị nwere ike isi na-eme ebere. Dị ka ihe atụ, na Jems 1:27, anyị na-agụ, sị: “Ụdị ofufe nke dị ọcha, nke a na-emerụghịkwa emerụ site n’ụzọ Chineke na Nna anyị si ele ihe anya bụ nke a: ilekọta ụmụ mgbei na ụmụ nwanyị di ha nwụrụ ná mkpagbu ha, na mmadụ idebe onwe ya n’enweghị ntụpọ n’ebe ụwa dị.” Jems 2:15, 16 kwuru, sị: “Ọ bụrụ na nwanna nwoke ma ọ bụ nwanna nwanyị na-agba ọtọ, n’enweghịkwa ihe oriri zuru ezu maka ụbọchị ahụ, ma otu onye n’ime unu agwa ha, sị: ‘Laanụ n’udo, nyaanụ ọkụ, rijuokwanụ afọ,’ ma unu adịghị enye ha ihe na-akpa ahụ́ ha, olee uru ọ bara?”

5, 6. Olee otú anyị nwere ike isi na-arụkwu ọrụ ebere n’ebe ndị anyị na ha nọ n’ọgbakọ nọ?

5 Ilekọta ndị ọzọ na inyere ndị nọ ná mkpa aka bụ otu n’ime ihe ndị e ji amata ezi okpukpe. Ụdị ofufe anyị na-efe anaghị ekwe anyị iji ọnụ efu agwa ndị ọzọ na ihe nile ga-adịcha mma ma ghara inyere ha aka. Kama nke ahụ, ọmịiko sitere n’ịhụnanya na-akwali anyị inyere ndị nọ nnọọ ná mkpa aka. (1 Jọn 3:17, 18) Ee, isiri onye na-arịa ọrịa nri, ịgara onye mere agadi ozi ndị dị n’ụlọ ya, ịkwọga ya n’ọmụmụ ihe Ndị Kraịst mgbe ọ dị mkpa ka e mee otú ahụ, na ịghara ịkwụkwụchi aka gị n’ebe ndị kwesịrị ka e nyere ha aka nọ bụcha ọrụ ebere anyị kwesịrị ịdị na-arụkwu.—Deuterọnọmi 15:7-10.

6 Inyere ụmụnna anyị nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst na-amụba amụba aka n’ofufe ha na-efe Chineke dị mkpa karịa inyere ha aka n’ụzọ ihe onwunwe. A gbara anyị ume ka anyị ‘na-agụgụ mkpụrụ obi ndị dara mbà, na-akwado ndị na-adịghị ike.’ (1 Ndị Tesalonaịka 5:14) A gbara “ndị nwanyị meworo agadi” ume ka ha bụrụ “ndị na-akụzi ihe dị mma.” (Taịtọs 2:3) Bible kwuru banyere Ndị Kraịst bụ́ ndị nlekọta, sị: “Otu onye ga-adịkwa ka ebe izonahụ ifufe, na ebe nzuzo ịpụ n’oké mmiri ozuzo.”—Aịsaịa 32:2.

7. Gịnị ka anyị na-amụta banyere ime ebere n’ihe ndị na-eso ụzọ nọ na Siria nke Antiọk mere?

7 E wezụga inyere ndị inyom di ha nwụrụ, ụmụ mgbei, na ndị enyemaka na agbamume dị mkpa, aka, bụ́ ndị nọ n’ógbè ha, ọgbakọ ndị dị na narị afọ mbụ haziri ihe enyemaka maka ndị kwere ekwe nọ n’ebe ndị ọzọ mgbe ụfọdụ. Dị ka ihe atụ, mgbe Agabọs onye amụma buru amụma na “oké ụnwụ nri na-aga ịbịakwasị elu ụwa dum mmadụ bi,” ndị na-eso ụzọ nọ na Siria nke Antiọk “kpebisiri ike, onye ọ bụla n’ime ha dị ka onye ọ bụla nwere ike inye, izigara ụmụnna bi na Judia ihe enyemaka.” E sitere “n’aka Banabas na Sọl” zigara ya ndị okenye nọ n’ebe ahụ. (Ọrụ 11:28-30) Oleekwanụ maka taa? “Ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche” ahaziela kọmitii enyemaka iji lekọta ụmụnna anyị bụ́ ndị ọdachi ndị na-emere onwe ha, dị ka ajọ ifufe, ala ọma jijiji, ma ọ bụ ala ọma jijiji na-eme n’oké osimiri, dakwasịrị. (Matiu 24:45) Anyị inye oge anyị, mgbalị anyị, na ihe onwunwe anyị iji kwado ndokwa a bụ ụzọ dị mma anyị pụrụ isi gosi ebere.

“Ọ Bụrụ na Unu Anọgide Na-emelara Mmadụ Ihe”

8. Olee otú imelara mmadụ ihe si emegide ebere?

8 Mgbe Jems na-adọ aka ná ntị banyere otu ihe na-emegide ebere na “iwu nke eze ahụ” bụ́ ịhụnanya, o dere, sị: “Ọ bụrụ na unu anọgide na-emelara mmadụ ihe, unu na-eme mmehie, n’ihi na iwu ahụ na-akatọ unu dị ka ndị na-emebi iwu.” (Jems 2:8, 9) Imelara ndị ọgaranya ma ọ bụ ndị a ma ama ihe nwere ike ime ka anyị mechie ntị anyị “n’iti mkpu nke onye na-enweghị ike.” (Ilu 21:13) Imelara mmadụ ihe na-egbochi mmụọ nke ime ebere. Anyị na-eme ebere site n’imeso ndị ọzọ ihe n’eleghị mmadụ anya n’ihu.

9. Olee ihe mere ọ na-ejighị dị njọ ịkwanyere ụfọdụ ndị ùgwù pụrụ iche?

9 Eleghị mmadụ anya n’ihu ọ̀ pụtara na anyị ekwesịtụghị imeso onye ọ bụla ihe n’ụzọ pụrụ iche? Ee e. Pọl onyeozi degaara Ndị Kraịst nọ na Filipaị akwụkwọ ozi banyere onye ọrụ ibe ya bụ́ Epafrọdaịtọs, sị: “Nọgidekwanụ na-ewere ndị dị otú ahụ ná ndị dị oké ọnụ ahịa.” N’ihi gịnị? “N’ihi na ọ bụ maka ọrụ Onyenwe anyị ka ọ bịaruru nnọọ ọnwụ nso, na-ekpughe mkpụrụ obi ya nye ihe ize ndụ, ka o wee nọchite anya ọnụnọ unu na-anọghị n’ebe a ijere m ozi.” (Ndị Filipaị 2:25, 29, 30) E kwesịrị ịkwanyere Epafrọdaịtọs ùgwù pụrụ iche n’ihi ozi o ji ikwesị ntụkwasị obi jee. Ọzọkwa, na 1 Timoti 5:17, anyị na-agụ, sị: “Ka a gụọ ndị okenye bụ́ ndị na-arụ ọrụ nlekọta n’ụzọ dị mma ná ndị ruru eru inweta nsọpụrụ okpukpu abụọ, karịsịa ndị na-arụsi ọrụ ike n’ikwu okwu na izi ihe.” E kwesịkwara ịkwanyere onye nwere àgwà ọma ndị na-ewetara Chineke otuto ùgwù. Nkwanye ùgwù dị otú ahụ abụghị imelara mmadụ ihe.

‘Amamihe nke Sitere n’Elu Jupụtara n’Ebere’

10. Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-achịkwa ire anyị?

10 Jems kwuru banyere ire, sị: “Ọ bụ ihe ọjọọ siri ike nchịkwa, o jupụtara ná nsí na-eweta ọnwụ. Anyị na-eji ya agọzi Jehova, bụ́ Nna anyị, anyị na-ejikwa ya abụ ụmụ mmadụ ọnụ, bụ́ ndị dị adị ‘n’ọdịdị Chineke.’ N’otu ọnụ ahụ ka ngọzi na ịbụ ọnụ si apụta.” Mgbe Jems ka na-ekwu banyere ọnọdụ a, o kwuru, sị: “Ọ bụrụ na unu nwere ekworo dị ilu na esemokwu n’obi unu, unu adịla na-etu ọnụ ma na-agha ụgha megide eziokwu ahụ. Nke a abụghị amamihe nke na-esi n’elu abịa, kama ọ bụ nke ụwa, nke anụ ahụ́, nke ndị mmụọ ọjọọ. N’ihi na n’ebe e nwere ekworo na esemokwu, n’ebe ahụ ka e nwere ọgba aghara na ihe ọjọọ nile. Ma amamihe nke sitere n’elu bu ụzọ dị ọcha, na-emekwa udo, nwee ezi uche, dị njikere irube isi, jupụta n’ebere na ezi mkpụrụ, ọ dịghị eji ile mmadụ anya n’ihu na-eme nkewa, ọ dịghị ihu abụọ.”—Jems 3:8-10a, 14-17.

11. Olee otú anyị ga-esi jiri ebere na-ekwu okwu?

11 N’ihi ya, otú anyị si agwa ndị ọzọ okwu bụ ihe na-egosi ma anyị nwere amamihe ‘jupụtara n’ebere.’ Gịnị ma ọ bụrụ na ekworo ma ọ bụ esemokwu emee ka anyị tuwe ọnụ, na-agha ụgha, ma ọ bụ na-agbasa asịrị na-emerụ ahụ́? Abụ Ọma 94:4 kwuru, sị: “Ndị nile nke na-arụ ajọ ihe na-anya isi.” Okwu ọjọọ nwere ike imebi aha ọma nke onye aka ya dị ọcha n’egbughị oge! (Abụ Ọma 64:2-4) Ọzọkwa, cheedị ihe ọjọọ nwere ike ịdapụtanụ site n’aka “onye àmà okwu ụgha [onye] na-ekupụ okwu ụgha dị ka ume.” (Ilu 14:5; 1 Ndị Eze 21:7-13) Mgbe Jems kwuchara banyere mmadụ ikwu okwu ọjọọ, ọ sịrị: “O kwesịghị ekwesị, ụmụnna m, ka ihe ndị a nọgide na-ewere ọnọdụ otú a.” (Jems 3:10b) Ezi ebere na-achọ ka anyị na-ekwu okwu dị ọcha, okwu na-akwalite udo, na nke ezi uche dị na ya. Jizọs kwuru, sị: “Asị m unu na okwu ọ bụla na-abaghị uru nke ụmụ mmadụ na-ekwu, ha ga-aza ajụjụ banyere ya n’Ụbọchị Ikpe.” (Matiu 12:36) Ọ dị mkpa ka anyị jiri ebere na-ekwu okwu!

“Na-agbaghara Ndị Mmadụ Njehie Ha”

12, 13. (a) Gịnị ka anyị na-amụta banyere ebere site n’ilu nke ohu ahụ ji nna ya ukwu ụgwọ buru ibu? (b) Gịnị ka ịgbaghara ụmụnna anyị “ruo ugboro iri asaa na asaa” pụtara?

12 Ilu Jizọs tụrụ banyere otu ohu nke ji nna ya ukwu, bụ́ eze, ụgwọ nde dinarịọs iri isii na-egosi ụzọ ọzọ a ga-esi na-eme ebere. Ebe ohu ahụ na-enweghị ụzọ ọ ga-esi akwụ ụgwọ ahụ, ọ rịọrọ ka e meere ya ebere. “N’ịbụ onye nwere ọmịiko mgbe ọ nụrụ nke a,” nna ukwu nke ohu ahụ gbaghaara ya ụgwọ ahụ o ji. Ma ohu ahụ pụrụ ma hụ ohu ibe ya ji ya otu narị dinarịọs ma jiri obi ọjọọ tụba ya n’ụlọ mkpọrọ. Mgbe nna ya ukwu nụrụ ihe merenụ, ọ kpọrọ ohu ahụ ọ gbaghaara, ma sị ya: “Ajọ ohu, m kagbuuru gị ụgwọ nile ahụ, mgbe ị rịọsiri m arịrịọ ike. Ọ̀ bụ na i kwesịghị, n’aka nke gị, imere ohu ibe gị ebere, dị ka m mewokwaara gị ebere?” N’ihi ya, nna ukwu ahụ nyefere ya n’aka ndị na-elekọta ụlọ nga. Jizọs ji okwu a mechie ilu ahụ: “N’ụzọ yiri nke ahụ ka Nna m nke eluigwe ga-emesokwa unu ma ọ bụrụ na onye ọ bụla n’ime unu adịghị agbaghara nwanna ya site n’obi unu.”—Matiu 18:23-35.

13 Ilu ahụ e kwuru banyere ya n’elu mere nnọọ ka o doo anya na ime ebere gụnyere mmadụ ịdị njikere ịgbaghara mmadụ! Jehova agbaghaworo anyị ụgwọ nke mmehie buru ibu. Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghịkwa ‘ịgbaghara ndị mmadụ njehie ha’? (Matiu 6:14, 15) Tupu Jizọs atụọ ilu nke ohu ahụ na-adịghị eme ebere, Pita jụrụ ya, sị: “Onyenwe anyị, ugboro ole ka nwanna m ga-emehie megide m, mụ agbaghara ya? Ọ̀ bụ ruo ugboro asaa?” Jizọs zara, sị: “Asị m gị, ọ bụghị, Ruo ugboro asaa, kama, Ruo ugboro iri asaa na asaa.” (Matiu 18:21, 22) Ee, onye na-eme ebere na-adị njikere ịgbaghara mmadụ “ruo ugboro iri asaa na asaa,” ya bụ́, ịgbaghara mgbe nile.

14. Dị ka ihe dị na Matiu 7:1-4 gosiri, olee otú anyị nwere ike isi na-eme ebere kwa ụbọchị?

14 Iji gosi ụzọ ọzọ a pụrụ isi na-eme ebere, Jizọs kwuru n’Ozizi Elu Ugwu ya, sị: “Kwụsịnụ ikpe ikpe ka e wee ghara ikpe unu ikpe; n’ihi na ihe unu ji ekpe ikpe, ya ka a ga-eji kpee unu ikpe . . . Gịnịzi mere i ji ele irighiri ahịhịa nke dị n’anya nwanna gị, ma i chebaraghị ntụhie dị n’anya nke gị echiche? Ma ọ bụ olee otú ị pụrụ isi sị nwanna gị, ‘Kwe ka m wepụ irighiri ahịhịa n’anya gị’; mgbe, lee! ntụhie dị n’anya nke gị?” (Matiu 7:1-4) N’ihi ya, anyị nwere ike ịdị na-eme ebere ụbọchị nile site n’idi mmejọ nke ndị ọzọ ma ghara ịkatọ ha.

“Na-eme Ihe Ọma n’Ebe Mmadụ Nile Nọ”

15. Gịnị mere na ọ bụghị nanị ndị kwere ekwe ibe anyị ka anyị kwesịrị ịdị na-emere ebere?

15 Ọ bụ ezie na akwụkwọ Bible bụ́ Jems kwuru na ndị kwere ekwe ga na-emere ibe ha ebere, nke a apụtaghị na ọ bụ nanị ndị nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst ka anyị ga na-emere ebere. Abụ Ọma 145:9 kwuru na “Jehova dị mma n’ebe ihe nile e kere eke dị; obi ebere Ya nile dịkwasịkwara n’ọrụ Ya nile.” A gbara anyị ume ka anyị ‘ghọọ ndị na-eṅomi Chineke’ ma “na-eme ihe ọma n’ebe mmadụ nile nọ.” (Ndị Efesọs 5:1; Ndị Galeshia 6:10) Ọ bụ ezie na anyị ahụghị “ụwa ma ọ bụ ihe ndị dị n’ụwa n’anya,” ọ pụtaghị na mkpa ndị mmadụ nọ n’ụwa nwere adịghị emetụ anyị n’obi.—1 Jọn 2:15.

16. Olee ihe ndị na-emetụta otú anyị ga-esi na-emere ndị ọzọ ebere?

16 Dị ka Ndị Kraịst, anyị anaghị ala azụ ime ihe nile anyị nwere ike ime iji nyere ndị ihe ọjọọ dakwasịrị n’ihi “mgbe na ihe ndapụta” ma ọ bụ ndị nọ n’ọnọdụ ọjọọ aka. (Eklisiastis 9:11) N’ezie, ọnọdụ anyị ga-ekpebi ihe anyị nwere ike ime na ókè anyị nwere ike imeru ya. (Ilu 3:27) Mgbe anyị na-enyere ndị ọzọ aka n’ụzọ ihe onwunwe, anyị ga-elezi anya ka ihe ọma anyị na-achọ ime ghara ịbụ ihe ga na-agba ndị mmadụ ume ịdị umengwụ. (Ilu 20:1, 4; 2 Ndị Tesalọnaịka 3:10-12) N’ihi ya, ezi ebere bụ omume nke ọmịiko na ichezi echiche echezi kpaliri.

17. Olee ụzọ kasị mma isi meere ndị na-anọghị n’ọgbakọ Ndị Kraịst ebere?

17 Ụzọ kasị mma isi na-emere ndị na-anọghị n’ọgbakọ Ndị Kraịst ebere bụ ịgwa ha eziokwu dị na Bible. N’ihi gịnị? N’ihi na ihe ka ọtụtụ n’ụmụ mmadụ taa na-asọgharị ìsì n’ihi amaghị Chineke. Ihe ka ọtụtụ n’ụmụ mmadụ bụ ndị ‘a gbara akpụkpọ, a chụsasịakwa ha dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha’ n’ihi na ha enweghị ike igbo mkpa ndị na-eche ha ihu, ha enweghịkwa ezi olileanya maka ọdịnihu. (Matiu 9:36) Ozi dị n’Okwu Chineke nwere ike ịbụ ‘oriọna dịịrị ụkwụ ha,’ na-enyere ha aka idi nsogbu ndị a na-enwe ná ndụ. O nwekwara ike ịbụ ‘ìhè dịịrị okporo ụzọ ha’ n’ihi na Bible ebuola amụma ihe bụ́ nzube Chineke maka ọdịnihu, na-agwa ha ihe mere ha ga-eji nwee olileanya magburu onwe ya. (Abụ Ọma 119:105) Ọ bụ ihe ùgwù iwere ozi eziokwu a magburu onwe ya gakwuru ndị ọ dị nnọọ mkpa! Ebe ọ bụ na “oké mkpagbu” na-eru nnọọ nso, ugbu a bụ oge e kwesịrị iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma Alaeze ahụ ma na-eme ndị na-eso ụzọ. (Matiu 24:3-8, 21, 22, 36-41; 28:19, 20) Ọ dịghị ebere karịrị nke a.

Nye “Ihe Ndị Dị n’Ime”

18, 19. Gịnị mere anyị kwesịrị iji rụọ ọrụ iji na-emekwu ebere ná ndụ anyị?

18 Jizọs kwuru, sị: “Nyenụ ihe ndị dị n’ime dị ka onyinye ebere.” (Luk 11:41) Ka ihe e meere mmadụ wee bụrụ ezi ebere, ọ ga-abụrịrị onyinye sitere n’ime—ya bụ nke sitere n’ịhụnanya na n’ala ala obi. (2 Ndị Kọrint 9:7) Ebere dị otú ahụ na-eme ka obi ruo mmadụ ala n’ụwa e ji obi ọjọọ, anyaukwu, na àgwà nke echebaraghị ndị na-ata ahụhụ na ndị nọ ná nsogbu echiche mara!

19 N’ihi ya, ka anyị rụsie ọrụ ike iji na-emekwu ebere ná ndụ anyị. Ka anyị na-emekwu ebere, ọ bụ otú ahụ ka anyị ga na-aghọkwu ndị dị ka Chineke. Nke a ga-enyere anyị aka ibi ndụ nwere isi na nke rijuru afọ.—Matiu 5:7.

Gịnị Ka Ị Mụtara?

• Gịnị mere o ji dị mkpa karịsịa imere ndị kwere ekwe ibe anyị ebere?

• Olee otú anyị nwere ike isi meere ndị nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst ebere?

• Olee otú anyị nwere ike isi na-eme ihe ọma n’ebe ndị na-anọghị n’ọgbakọ nọ?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 26]

Onye Sameria ahụ mere ebere

[Foto ndị dị na peeji nke 27]

Ndị Kraịst na-arụ nnọọ ọrụ ebere

[Foto dị na peeji nke 30]

Ebere kasịnụ anyị nwere ike imere ndị na-anọghị n’ọgbakọ bụ ịgwa ha eziokwu dị na Bible