Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mmadụ Pụrụ Ibi Ndụ Na-eju Afọ!

Mmadụ Pụrụ Ibi Ndụ Na-eju Afọ!

Mmadụ Pụrụ Ibi Ndụ Na-eju Afọ!

NZUBE nke ọtụtụ ndị ná ndụ bụ inweta ego na ihe ego pụrụ ịzụta. Ụfọdụ ndị na-etinye ndụ ha nile n’ịghọ ndị a ma ama n’ụwa. Ndị ọzọ na-etinye ndụ ha nile n’ịghọ ọkà n’ọrụ nkà ha. E nwekwara ndị nke na-etinye ndụ ha n’inyere ndị ọzọ aka. Ma ọtụtụ ndị amaghị ihe ha ji dịrị ndụ ma ọ bụ ihe ha nọ n’ụwa eme.

Gịnịkwanụ banyere gị? Ọ̀ dịtụla mgbe i chesiri echiche ike banyere ihe ị nọ n’ụwa eme? Gịnị ma ị tụlee ihe ụfọdụ ụmụ mmadụ na-achụso iji mara ma hà na-eme ka mmadụ nwee afọ ojuju? Gịnị na-eme ka mmadụ na-ebi ndụ na-eju afọ?

Ego na Ihe Ụtọ Dị Mkpa

Bible kwuru n’Eklisiastis 7:12, sị: “Amamihe bụ ndò, ego bụkwa ndò: ma ọkaaka nke ihe ọmụma bụ, na amamihe na-eme ka onye nwe ya dị ndụ.” Ee, ego bara uru. Ego dị gị mkpa iji dịrị ndụ, karịsịa ma ọ bụrụ na i nwere ezinụlọ ị na-elekọta.—1 Timoti 5:8.

Olee otú ndụ ga-adị ma e nweghị ihe ndị na-enye obi ụtọ ego pụrụ ịzụta? Ọ bụ ezie na Jizọs Kraịst, bụ́ Onye Hiwere Iso Ụzọ Kraịst kwuru na ya enweghị ebe ọ bụla ịtọgbọ isi ya, o riri ezigbo nri ma ṅụọ ezigbo mmanya mgbe ụfọdụ. Ọzọkwa, o yiri uwe dara oké ọnụ.—Matiu 8:20; Jọn 2:1-11; 19:23, 24.

N’agbanyeghị nke ahụ, Jizọs etinyeghị ndụ ya n’ịchụso ihe ụtọ. Ọ maara nnọọ ihe ndị ka ya mkpa ná ndụ. Jizọs kwuru, sị: “Ọbụna mgbe mmadụ nwere ihe n’ụba, ndụ ya adịghị esi n’ihe ndị o nwere apụta.” Ọ nyeziri ihe atụ banyere otu nwoke bara ọgaranya nke ala ya mepụtara ihe nke ọma, ya echeekwa n’ime onwe ya, sị: “Gịnị ka m ga-eme, ebe ọ bụ na enweghị m ebe ọ bụla m ga-achịkọta ihe ubi m? . . . M ga-etidasị ụlọ nkwakọba ihe m ma wuo ndị ka ibu, n’ebe ahụkwa ka m ga-achịkọta mkpụrụ m nile na ezi ihe m nile; m ga-agwakwa mkpụrụ obi m, sị: ‘Mkpụrụ obi, i nwere ọtụtụ ezi ihe a kpakọbara maka ọtụtụ afọ; tụsara ahụ́, rie ihe, ṅụọ ihe ọṅụṅụ, mee onwe gị obi ụtọ.’” Olee ihe dị njọ n’echiche nwoke a? Ihe atụ ahụ gara n’ihu kwuo, sị: “Chineke sịrị [nwoke ahụ bara ọgaranya], ‘Onye na-enweghị ezi uche, n’abalị a ka ha na-achọ mkpụrụ obi gị n’aka gị. Ònye ga-enwezi ihe ndị ị kwakọbara?’” Ọ bụrụgodị na nwoke ahụ akwakọba mkpụrụ ya, mgbe ọ nwụrụ, o nweghị ike iri akụ̀ ndị ahụ ọ kpakọbara. Ná mmechi, Jizọs mere ka ndị na-ege ya ntị mụta ihe a: “Otú ahụ ka ọ ga-adịrị onye na-akpakọbara onwe ya akụ̀ ma ghara ịbụ ọgaranya n’ebe Chineke nọ.”—Luk 12:13-21.

Ee, ego dị anyị mkpa, ikpori ndụ bakwara uru. Otú ọ dị, ma ego ma ihe ụtọ abụghị ihe kasị mkpa ná ndụ. Ịbụ ọgaranya n’ebe Chineke nọ, ya bụ, ibi ndụ nke ga-eme ka ihe anyị dị Chineke mma, bụ nnọọ ihe kasị mkpa mmadụ kwesịrị iji ndụ ya nile chụsoo.

Ọ̀ Dị Mkpa Mmadụ Imere Onwe Ya Aha?

Ọtụtụ ndị na-emere onwe ha aha. Mmadụ inwe ọchịchọ imere onwe ya aha, ya bụ ịchọ ka ndị ọzọ na-echeta ya, adịchaghị njọ. Bible kwuru, sị: “Ezi aha dị mma karịa ezi mmanụ otite na-esi ísì ụtọ; ọzọ, ụbọchị ọnwụ mmadụ dị mma karịa ụbọchị a mụrụ ya.”—Eklisiastis 7:1.

Ụbọchị mmadụ nwụrụ, a matala ụdị ndụ o biri. Ọ bụrụ na mmadụ mere ihe ndị dị mma, ụbọchị ọnwụ ya ga-adị nnọọ mma karịa ụbọchị a mụrụ ya bụ́ mgbe ọ na-adịbeghị onye maara ụdị mmadụ ọ ga-abụ.

Ọ bụ Eze Solomọn dere akwụkwọ Bible bụ́ Eklisiastis. Absalọm bụ́ onye tọrọ Solomọn ná nna chọrọ imere onwe ya aha. Ma, ụmụ ya nwoke atọ, bụ́ ndị gaara ime ka aha ya dịgide ruo ọgbọ ndị dị n’ihu nwụrụ nnọọ mgbe ha ka dị obere. N’ihi ya, gịnị ka Absalọm mere? Akwụkwọ Nsọ kwuru, sị: “Absalọm . . . weere ogidi nke dị na ndagwurugwu eze guzoro onwe ya: n’ihi na ọ sịrị, enweghị m nwa nwoke ime ka e cheta aha m: o wee kpọọ ogidi ahụ n’aha ya.” (2 Samuel 14:27; 18:18) A chọtabeghị ogidi a. N’ebe Absalọm nọ, ndị na-amụ Bible maara ya dị ka onye nnupụisi a ma ama kpara nkata ọjọọ ịkwatu nna ya Devid n’ọchịchị ma nọchie.

Ọtụtụ taa na-agbalị ka e jiri ihe ndị ha rụzuru na-echeta ha. Ha na-achọ otuto nke ụmụ mmadụ bụ́ ndị ihe ndị na-amasị ha na-agbanwe site n’oge ruo n’oge. N’agbanyeghị nke ahụ, gịnị na-eme otuto dị otú ahụ? Christopher Lasch dere n’akwụkwọ bụ́ The Culture of Narcissism, sị: “N’oge anyị a, bụ́ mgbe ihe e ji ama onye ihe na-agara nke ọma na-abụkarị ịbụ okoro ma ọ bụ agbọghọ, ihe mara mma, na ihe gbapụrụ iche, otuto na-apụ n’anya ngwa ngwa otú ọ na-adịtụbeghị, ndị ghọkwara ndị a ma ama n’anya ọhaneze na-echegbukarị onwe ha na ọhaneze ga-akwụsị inwe mmasị n’ebe ha nọ.” N’ihi ya, ọtụtụ ndị a ma ama na-eme egwuregwu na-aṅụzi ọgwụ ike na mmanya na-aba n’anya, bụ́ ndị na-eme ha ịnwụkarị ọnwụ ike. N’ezie, ọ baghị uru ịchọ ịbụ onye a ma ama.

Ònyezi ka anyị kwesịrị imere onwe anyị ezi aha n’ebe ọ nọ? Jehova sitere n’aka onye amụma ya bụ́ Aịzaịa kwuo banyere ụfọdụ ndị na-edebe Iwu ya, sị: “M ga-enye ha n’ụlọ m na n’ime mgbidi m nile ihe ncheta na aha . . . aha ebighị ebi ka M ga-enye ha n’otu n’otu, nke a na-agaghị ebipụ.” (Aịsaịa 56:4, 5) N’ihi nrubeisi nke ndị Chineke na-anara nke ọma nye Ya, ha ga-enwe “ihe ncheta na aha.” Chineke ga-echeta aha ha “ruo mgbe ebighị ebi” ka a ghara ibipụ ha. Nke ahụ bụ ụdị aha Bible na-agba anyị ume ka anyị meere onwe anyị—ezi aha n’ebe Jehova, bụ́ Onye Okike anyị, nọ.

Aịzaịa buru amụma banyere oge ụmụ mmadụ kwesịrị ntụkwasị obi ga-enweta ndụ ebighị ebi na Paradaịs n’elu ala. “Ndụ ebighị ebi” n’ime Paradaịs ahụ bụ “ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie”—bụ́ ụdị ndụ Chineke kwadebere maka ụmụ mmadụ mgbe o kere ha. (1 Timoti 6:12, 19) Kama ịdị ndụ na-apụ n’anya ngwa ngwa na nke na-adịghị eju afọ, ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ịchọ inweta ndụ ebighị ebi?

Ịrụ Ọrụ Nkà Ma Ọ Bụ Mmadụ Ịghọ Omepụrụ Onye Ọ Dịịrị Ezughị

Ọtụtụ ndị na-arụ ọrụ nkà na-achọ imeziwanye ọrụ ha ka o ruo ebe ha lere anya dị ka ebe ọ gwụrụ. Ndụ anyị na-adị ugbu a dị nnọọ mkpụmkpụ maka ime nke ahụ. Mgbe Hideo bụ́ onye na-ese ihe a kpọtụrụ aha n’isiokwu bú nke a ụzọ nọ n’iri afọ itoolu na ụma ya, ọ rụsịrị ọrụ ike iji meziwanye ọrụ nkà ya. Ọ bụrụgodị na onye ọrụ nkà arụruo ọrụ ya ebe o juru ya afọ, o nwere ike mgbe ahụ ọ gaghịzi na-arụpụta ihe otú ọ na-arụpụtabu mgbe ọ ka bụ okorobịa. Ma gịnịkwanụ ma ọ bụrụ na o nwere ndụ ebighị ebi? Chee echiche banyere oge nile ọ ga-enwe iji rụrụ ọrụ ya ruo ebe ọ gwụrụ!

Gịnị maka ịghọ omepụrụ onye ọ dịịrị? Ọ dị mma ịja onye tinyere oge ya n’ilebara ndị ogbenye anya ma jiri akụ̀ ya na-enyere ndị nọ ná mkpa aka mma. Bible kwuru, sị: “A na-enwe obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enwe n’ịnara ihe.” (Ọrụ 20:35) Ichebara ọdịmma nke ndị ọzọ echiche pụrụ nnọọ ime ka mmadụ nweta afọ ojuju. Ma, mmadụ ole ka otu onye nwere ike inyere aka ma a sịgodị na o jiri ndụ ya nile rụọ ọrụ ebere? Ihe anyị bụ́ ụmụ mmadụ nwere ike ime iji belata ahụhụ ndị ọzọ na-ata ebughị ibu. Ọ dịghị onyinye ga-egbo mkpa bụ́ isi ndị mmadụ nwere bụ́ nke ihe ka ọtụtụ n’ime ụmụ mmadụ na-eleghara anya, bụ́ nke ọ na-adịghị onye na-egboro ha ya ná ndụ ha. Gịnị bụ mkpa ahụ?

Anyị Aghaghị Igbo Otu Mkpa Anyị Bu Pụta Ụwa

N’Ozizi Elu Ugwu Jizọs, o kwuru banyere otu mkpa bụ́ isi anyị bu pụta ụwa mgbe o kwuru, sị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị maara mkpa nke ime mmụọ ha, ebe ọ bụ na alaeze nke eluigwe bụ nke ha.” (Matiu 5:3) N’ihi ya, dị ka Bible si kwuo, ezi obi ụtọ adabereghị n’inweta akụnụba, n’ịghọ onye a ma ama, n’ịrụzu ọrụ nkà ma ọ bụ n’itinye oge iji ghọọ omepụrụ onye ọ dịịrị. Kama nke ahụ, ọ dabeere n’anyị igbo mkpa ime mmụọ anyị—mkpa ife Chineke.

Pọl onyeozi gbara ndị na-amaghị Onye Okike ume ka ha chọọ ya. Pọl kwuru, sị: “[Chineke] sitekwara n’otu mmadụ mee mba ọ bụla nke ụmụ mmadụ, ka ha biri n’elu ala dum, o kpebikwara oge a kara aka na ókè a kpaara ebe obibi nke ụmụ mmadụ, ka ha wee chọọ Chineke, ma ọ bụrụ na ha ga-asọ ìsì ma chọta ya n’ezie, ọ bụ ezie na, n’eziokwu, ọ nọghị n’ebe dị anya n’ebe onye ọ bụla n’ime anyị nọ. N’ihi na site n’aka ya ka anyị nwere ndụ, na-ejegharị, na-adịkwa ndụ.”—Ọrụ 17:26-28.

Igbo mkpa anyị nwere maka ife ezi Chineke bụ isi ihe na-eweta ezi obi ụtọ ná ndụ. Igbo mkpa ime mmụọ anyị na-emekwa ka anyị nwee olileanya maka inweta “ndụ nke bụ́ ndụ n’ezie.” Tụlee ihe atụ Teresa, bụ́ onye ghọrọ onye a ma ama ná mba ya site n’ịghọ nwanyị Africa America mbụ pụtara n’ihe nkiri televishọn na-ewe otu awa nke ya onwe ya dere. O gbughị oge ya ahapụ ihe nile ahụ. N’ihi gịnị? O kwuru, sị: “O doro m anya na ige ntị na ndụmọdụ nke Okwu Chineke bụ ihe kasị mma ná ndụ.” Teresa achọghị itinye mmekọrịta ya na Chineke n’ihe ize ndụ site n’ime ihe nkiri televishọn nke na-akwalite mmekọahụ na ime ihe ike. Ọ kwụsịrị ịpụta n’ihe nkiri televishọn, ma malite ibi ndụ na-eju afọ, n’ihi na o jere ozi dị ka onye nkwusa oge nile nke ozi ọma Alaeze Chineke, na-agbalị inyere ndị ọzọ aka ime ka ha na Chineke dị ná mma.

Otu n’ime ndị ha na Teresa na-esobu eme egwuregwu kwuru banyere mkpebi Teresa mere ịkwụsị ime ihe nkiri, sị: “Obi gbawara m, n’ihi na o wutere m ịhụ ka ọ na-atụfu ihe m chere na o nwere. Ma o doro anya na ọ chọtara ihe ka nke ahụ ukwuu na ihe ka ya mma.” Teresa mesịrị nwụọ. Ma mgbe Teresa nwụsịrị, onye ahụ ya na ya na-esobu eme egwuregwu kwuru, sị: “O nwere obi ụtọ, nke ahụ bụkwa ihe onye ọ bụla na-achọ inweta ná ndụ. Mmadụ ole n’ime anyị nwere ike ikwu na ha nwere obi ụtọ otú ahụ?” Nye ndị butere mmekọrịta ha na Chineke ụzọ ná ndụ ha ma mesịa nwụọ, e nwere olileanya magburu onwe ya nke mbilite n’ọnwụ n’okpuru ọchịchị Alaeze ahụ.—Jọn 5:28, 29.

Onye Okike nwere ihe o zubere maka ụwa na ụmụ mmadụ bi n’ime ya. Ọ chọrọ ka ị ghọta nzube a ma dịrị ndụ ebighị ebi na Paradaịs n’elu ala. (Abụ Ọma 37:10, 11, 29) Ugbu a bụ oge ị ga-eji mụtakwuo ihe banyere Jehova, bụ́ Onye Okike nke eluigwe na ala, nakwa ihe o zubere maka gị. Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị ga-enwe obi ụtọ inyere gị aka inweta ihe ọmụma ahụ. Biko kpọtụrụ ha, ma ọ bụ i degara ndị bipụtara magazin a akwụkwọ.

[Foto dị na peeji nke 5]

Olee ihe dị njọ n’echiche nwoke ahụ bara ọgaranya n’ihe atụ ahụ Jizọs nyere?

[Foto dị na peeji nke 7]

Ọ̀ ga-amasị gị ịdị ndụ ebighị ebi na Paradaịs n’elu ala?