Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Nehum, Habakuk, na Zefanaịa

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Nehum, Habakuk, na Zefanaịa

Okwu Jehova Dị Ndụ

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Nehum, Habakuk, na Zefanaịa

IKE ọchịchị ụwa Asiria ebibielarị Sameria, bụ́ isi obodo nke alaeze ebo iri nke Izrel. Ọ dịkwala nnọọ anya Asiria yiwere Juda egwu. Onye amụma bụ́ Nehum nke Juda nwere ozi ọ ga-ezi isi obodo Asiria, bụ́ Ninive. Akwụkwọ Bible bụ́ Nehum, bụ́ nke e dere tupu afọ 632 T.O.A., bu ozi ahụ.

Ike ọchịchị ụwa ọzọ a ga-enwe bụ Alaeze Ukwu Babilọn, bụ́ nke eze ndị si Kaldia chịrị mgbe ụfọdụ. Akwụkwọ Habakuk, bụ́ nke e dere ikekwe n’afọ 628 T.O.A., buru amụma banyere otú Jehova ga-esi jiri ike ọchịchị ụwa ahụ a ga-enwe n’ọdịnihu mezuo ihe o kpere n’ikpe na ihe ga-emesị mee Babilọn.

Zefanaịa onye amụma nke Juda bu ma Nehum ma Habakuk ụzọ buwe amụma. O buru amụma ihe karịrị iri afọ anọ tupu mbibi Jeruselem n’afọ 607 T.O.A., ọ kpọsara ma ozi mbibi ma ozi olileanya nye Juda. Akwụkwọ Bible bụ́ Zefanaịa bukwa ozi amamikpe megide mba ndị ọzọ.

“AHỤHỤ DỊRỊ OBODO ỌBARA”

(Nehum 1:1–3:19)

“Ibu e boro Ninive” si n’aka Jehova Chineke, bụ́ onye ‘na-adịghị ewe iwe ọsọsọ na onye dị ukwuu n’ike.’ Ọ bụ ezie na Jehova bụ “ebe e wusiri ike n’ụbọchị ahụhụ” nye ndị na-agbaba n’ime ya, a ga-ebibi Ninive.—Nehum 1:1, 3, 7.

“Jehova na-eme ka mbili elu nke Jekọb lọta [weghachi ya].” Otú ọ dị, dị ka ‘ọdụm na-adọgbu adọgbu,’ Asiria eyiela mba nke ndị Chineke egwu. Jehova “ga-esurekwa ụgbọala [Ninive] n’anwụrụ ọkụ, ọ bụkwa ụmụ ọdụm [ya] ka mma agha ga-eripịa.” (Nehum 2:2, 12, 13) “Ahụhụ dịrị obodo ọbara”—ya bụ Ninive. “Ndị nile ndị na-anụ ihe ọnụnụ banyere [ya] ga-akụkpọ aka ha” ma ṅụrịa ọṅụ.—Nehum 3:1, 19.

Azịza nke Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

1:9—Olee ihe ‘ngwụsị ahụ’ e kwuru banyere Ninive pụtara nye Juda? Ọ ga-apụta nnwere onwe kpamkpam pụọ n’aka Asiria; “mkpagbu agaghị ebili nke ugboro abụọ.” Mgbe Nehum na-ekwu dị ka à ga-asị na Ninive adịkwaghị, o dere, sị: “Lee, n’elu ugwu ka ụkwụ nke onye na-ezisa ozi ọma dị, bụ́ onye na-eme ka a nụrụ okwu udo! Mee ememe gị nile, gị Juda.”—Nehum 1:15.

2:6—Olee “ọnụ ụzọ ámá nile nke osimiri nile” nke e meghere? Ọnụ ụzọ ámá ndị a pụtara ebe ndị Osimiri Taịgris tipuru mgbidi Ninive. N’afọ 632 T.O.A. mgbe ndị agha Babilọn na ndị agha Midia jikọrọ aka ibuso Ninive agha, ọ dịghị ụjọ ọ bụla tụrụ Ninive. N’ihi nnukwu mgbidi gbara ya gburugburu, o lere onwe ya anya dị ka obodo a na-apụghị ịbanye abanye. Otú ọ dị, nnukwu mmiri ozuzo mere ka Osimiri Taịgris tojubiga ókè. Dị ka ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Diodorus si kwuo, “osimiri a rikpuru akụkụ ụfọdụ nke obodo ahụ ma kwada mgbidi ya ruo ebe dị anya.” Otú ahụ ka ọnụ ụzọ ámá nile nke osimiri nile si meghee, dịkwa ka e buru n’amụma, e bibiri Ninive n’otu ntabi anya dị ka ọkụ si erepịa ahịhịa ọka kpọnwụrụ akpọnwụ.—Nehum 1:8-10.

3:4—Olee otú Ninive si yie nwanyị na-akwa iko? Ninive ghọgburu mba dị iche iche site n’ikwe ha nkwa inyere ha aka na ime ka ya na ha dịrị ná mma ma ihe ọ na-eme n’ezie bụ ịkpagbu ha. Dị ka ihe atụ, Asiria nyeere Eze Ehaz nke Juda aka imebi izu ndị Siria na Izrel gbara megide ya. Ma mgbe e mesịrị, “eze Asiria, wee bịakwute [Ehaz], kpagbuo ya.”—2 Ihe E Mere 28:20.

Ihe Ndị Anyị Mụtara:

1:2-6. Ọ́bọ̀ Jehova bọrọ n’isi ndị iro ya, bụ́ ndị jụrụ inye ya ofufe a na-akewaghị ekewa, na-egosi na ọ chọrọ ka ndị na-efe ya na-enye ya ofufe a na-akewaghị ekewa.—Ọpụpụ 20:5.

1:10. Nnukwu mgbidi nwere ọtụtụ narị ụlọ elu egbochilighị mmezu nke okwu Jehova megide Ninive. Ndị iro nke ndị Jehova taa agaghị enwe ike ịgbanahụ ikpe ọmụma Chineke.—Ilu 2:22; Daniel 2:44.

‘ONYE EZI OMUME GA-ADỊ NDỤ’

(Habakuk 1:1–3:19)

Isi abụọ mbụ nke akwụkwọ Habakuk bụ mkparịta ụka dị n’etiti onye amụma ahụ na Jehova Chineke. N’ihi otú ihe na-eme na Juda si na-enye ya nsogbu n’obi, Habakuk jụrụ Chineke, sị: “N’ihi gịnị ka Ị na-eme ka m hụ ajọ ihe? N’ihi gịnị ka Ị na-elegide mmegbu?” Jehova zara ya, sị: “M gaje ime ka ndị Kaldia bilie, bụ́ mba ahụ dị ilu nke na-emekwa ngwa ngwa.” Onye amụma ahụ kwuru na o juru ya anya na Chineke ga-eji “ndị na-aghọgbu aghọgbu” mee ihe ịta Juda ahụhụ. (Habakuk 1:3, 6, 13) E mesiri Habakuk obi ike na onye ezi omume ga-adị ndụ, ma onye iro agaghị alanahụ ntaramahụhụ. Ọzọkwa, Habakuk dekọrọ ahụhụ ise a ga-ata onye iro Kaldia.—Habakuk 2:4.

N’ekpere Habakuk kpegaara Chineke ka o meere ha ebere, o ji “abụ iru uju” cheta ike dị ukwuu Jehova kpara n’oge gara aga n’Oké Osimiri Uhie, n’ọzara, nakwa na Jeriko. Onye amụma ahụ bukwara amụma banyere otú Jehova ga-esi jiri oké iwe pụta ibu agha Amagedọn. O ji okwu ndị a mechie ekpere ya: “Jehova, bụ́ Onyenwe anyị, bụ ike m, Ọ na-emekwa ụkwụ m abụọ ka ha dị ka ụkwụ ele, ọ bụkwa n’ebe m nile dị elu ka Ọ ga-eme ka m zọọ ije.”—Habakuk 3:1, 19.

Azịza nke Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

1:5, 6—Gịnị mere ọ ga-eji siere ndị Juu ike ikweta na ndị Kaldia ga-abịa ibuso Jeruselem agha? Ka ọ na-erule n’oge Habakuk malitere ibu amụma, ndị Juda na ndị Ijipt enwewo mmekọrịta chiri anya. (2 Ndị Eze 23:29, 30, 34) Ọ bụ ezie na ndị Babilọn ka na-apụta apụta, ma ndị agha ha emeribeghị Fero Neko n’agha. (Jeremaịa 46:2) Ọzọkwa, ụlọ nsọ Jehova dị na Jeruselem, usoro ndị eze nke si n’ezinụlọ Devid achịala n’ebe ahụ n’akwụsịghị akwụsị. Nye ndị Juu nọ n’oge ahụ, “aka ọrụ” Chineke nke bụ́ ikwe ka ndị Kaldia bibie Jeruselem ga-esiri ha ike ikweta. Ma n’agbanyeghị otú okwu Habakuk si siere ha ike ikwere, ọhụụ ahụ ọ hụrụ banyere mbibi ndị Babilọn ga-ebibi Jeruselem ‘bịara’ nnọọ n’afọ 607 T.O.A.—Habakuk 2:3.

2:5—Ònye bụ “nwoke” ahụ, gịnịkwa mere ‘ọ gaghị anọ n’ụlọ [ma ọ bụ ruo ihe mgbaru ọsọ ya]’? Ndị Babilọn bụ́ ndị ji nkà ha n’ibu agha bibie ọtụtụ mba bụ “nwoke ahụ” ọtụtụ ndị mejupụtara. Imeri ọtụtụ mba n’agha mere ka o yie onye mmanya na-egbu. Otú ọ dị, ọ gaghị enwe ihe ịga nke ọma n’ịchịkọta mba nile n’ebe ọ nọ, n’ihi na Jehova ga-eji ndị Midia na ndị Peshia kwatuo ya. “Nwoke” oge a nke ọtụtụ ndị mejupụtara bụ ike ọchịchị dị iche iche. Obi ike na mpako na-egbukwa ya onwe ya dị ka mmanya, ọ na-agụkwa ya nnọọ agụụ ịgbasawanye ọchịchị ya. Ma ọ gaghị eru ihe mgbaru ọsọ ya nke bụ́ “ime ka mba nile zukọta n’ebe ọ nọ.” Ọ bụ nanị Alaeze Chineke ga-ejikọta ụmụ mmadụ.—Matiu 6:9, 10.

Ihe Ndị Anyị Mụtara:

1:1-4; 1:12–2:1. Habakuk ji ezi obi jụọ Chineke ajụjụ, Jehova zakwara ya ajụjụ ya. Ezi Chineke na-ege ntị n’ekpere ndị ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi na-ekpegara ya.

2:1. Dị ka Habakuk, anyị kwesịrị iji ịnụ ọkụ n’obi nọgide na-ejere Chineke ozi. Anyị kwesịkwara ịdị njikere ime ka echiche anyị kwekọọ na “ndụmọdụ” ọ bụla ma ọ bụ mgbazi ọ bụla a pụrụ inye anyị.

2:3; 3:16. Ka anyị ji okwukwe na-echere ọbịbịa nke ụbọchị Jehova, ka anyị na-eburu ịdị nso nke ụbọchị ahụ n’uche.

2:4. Iji lanahụ ụbọchị ikpe Jehova na-abịanụ, anyị aghaghị ịtachi obi n’ikwesị ntụkwasị obi.—Ndị Hibru 10:36-38.

2:6, 7, 9, 12, 15, 19. A ga-atarịrị onye nwere anyaukwu maka uru aghụghọ, onye hụrụ ime ihe ike n’anya, onye na-eme omume rụrụ arụ, ma ọ bụ onye na-ekpere arụsị ahụhụ. Anyị aghaghị ịmụrụ anya iji zere àgwà na omume ndị a.

2:11. Ọ bụrụ na anyị aghara ikpughe ajọ omume nke ụwa a, “nkume ga-esi ná mgbidi tie mkpu.” Ọ dị mkpa ka anyị jiri obi ike nọgide na-ekwusa ozi Alaeze ahụ!

3:6. Ọ dịghị ihe ga-anọchiliri Jehova ụzọ mgbe ọ ga-emezu ihe o kpere n’ikpe, ọbụna òtù ụmụ mmadụ ndị yiri ihe ndị ga-adịgide adịgide dị ka ugwu.

3:13. E mesiri anyị obi ike na Amagedọn agaghị ebibi ndị mmadụ aghara aghara. Jehova ga-echebe ndị ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi.

3:17-19. Ọ bụ ezie na ihe isi ike nwere ike ịdakwasị anyị tupu ma ọ bụ n’oge agha Amagedọn, anyị nwere obi ike na Jehova ga-enye anyị “ike” ka anyị ji ọṅụ nọgide na-ejere ya ozi.

“ỤBỌCHỊ JEHOVA DỊ NSO”

(Zefanaịa 1:1–3:20)

Ofufe Bel jupụtara ebe nile na Juda. Jehova si n’aka onye amụma ya bụ́ Zefanaịa kwuo, sị: “M ga-esetịkwa aka m imegide Juda, na imegide ndị nile bi na Jeruselem.” Zefanaịa dọrọ aka ná ntị, sị: “Ụbọchị Jehova dị nso.” (Zefanaịa 1:4, 7, 14) Nanị ndị mere ihe Chineke na-achọ ka “a ga-ezobe” n’ụbọchị ahụ.—Zefanaịa 2:3.

“Ahụhụ dịrị . . . obodo ahụ nke na-eme ihe ike”—ya bụ Jeruselem! “Cherenụ m, (ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta), cherenụ ụbọchị mgbe M ga-ebili ọtọ ịkwata ihe: n’ihi na ikpe m bụ ime ka mba nile zukọta . . . ịwụsa ha oké iwe m.” Ma Chineke kwere nkwa, sị: “M ga-eme ka unu ghọọ aha, ghọọkwa otuto n’etiti ndị nile dị iche iche nke ụwa, mgbe M ga-eme ka ndị unu a dọtara n’agha lata n’anya unu.”—Zefanaịa 3:1, 8, 20.

Azịza nke Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

2:13, 14—Olee ndị “olu ha na-abụ abụ” na Ninive e bibirila kpamkpam? Ebe ọ bụ na Ninive ga-aghọ ụlọ anụ ọhịa na nke ụmụ nnụnụ, olu ndị na-abụ abụ na ya na-ezo aka n’abụ ụmụ nnụnụ na-abụ nakwa ma eleghị anya ná mkpọtụ windo ndị dị n’ụlọ na-enweghị ndị bi na ha na-eme mgbe ikuku na-akwagharị ha.

3:9—Gịnị bụ “egbugbere ọnụ dị ọcha,” oleekwa otú e si eji ya ekwu okwu? Ọ bụ eziokwu nke Chineke dị n’Okwu ya, bụ́ Bible. Ọ gụnyere ozizi Bible nile. Anyị na-eji ya ekwu okwu site n’ikwere n’eziokwu ahụ, site n’ịkụziri ya ndị ọzọ nke ọma, nakwa site n’ibi ndụ kwekọrọ n’uche Chineke.

Ihe Ndị Anyị Mụtara:

1:8. Ụfọdụ ndị oge Zefanaịa na-achọ ime ka mba ndị gbara ha gburugburu nabata ha site ‘n’iyi uwe ala ọzọ.’ Lee ihe nzuzu ọ ga-abụrụ ndị na-efe Jehova taa ịgbalị ime ka ụwa nabata ha site n’iji ejiji otú ndị ụwa si eji!

1:12; 3:5, 16. Jehova zigaara ndị ya ndị amụma ya ugboro ugboro iji dọọ ha aka ná ntị banyere ikpe ya. O mere otú ahụ n’agbanyeghị na—dị ka ụmụ irighiri ihe ndị dị n’ala mmanya doro edo—ọtụtụ ndị Juu aghọọla ndị onwe ha juru afọ, ha enwekwaghị mmasị n’ozi ahụ. Ka oké ụbọchị Jehova na-eru nso, kama ikwe ka àgwà ndị onwe ha juru afọ ndị mmadụ na-akpa mee ka ‘aka anyị abụọ kụda’ site n’ime ka anyị kwụsị ịrụ ọrụ, ọ dị anyị mkpa ịnọgide na-ekwusa ozi Alaeze ahụ n’esepụghị aka.

2:3. Ọ bụ nanị Jehova nwere ike ichebe anyị n’ụbọchị iwe ya. Iji nọgide na-eme ka ihe anyị na-adị ya mma, ọ dị anyị mkpa ‘ịchọ Jehova’ site n’iji nlezianya na-amụ Okwu ya, bụ́ Bible; ịrịọ ya nduzi ya n’ekpere; nakwa ịbịaru ya nso. Anyị aghaghị ‘ịchọ ezi omume’ site n’ibi ndụ dị ọcha. Ọ dịkwa anyị mkpa ‘ịchọ umeala n’obi’ site n’ịzụlite ịdị umeala n’obi nakwa ido onwe anyị n’okpuru Chineke.

2:4-15; 3:1-5. N’ụbọchị Jehova ga-emezu ihe o kpere n’ikpe, a ga-ebibi Krisendọm nakwa mba nile ndị kpagburu ndị Chineke otú ahụ e si bibie Jeruselem oge ochie na mba ndị gbara ya gburugburu. (Mkpughe 16:14, 16; 18:4-8) Anyị kwesịrị ịnọgide na-ekwusa ikpe Chineke n’atụghị egwu.

3:8, 9. Ka anyị na-echere ụbọchị Jehova, anyị na-akwadebe maka ịlanahụ ya site n’inwe “egbugbere ọnụ dị ọcha” nakwa ‘ịkpọku aha Chineke’ site n’ịrara onwe anyị nye ya. Anyị na-efekwa Jehova “n’otu ubu” site n’iso ndị ya na-akpachi anya ma na-enye ya “mkpụrụ egbugbere ọnụ” dị ka onyinye.—Ndị Hibru 13:15.

“Ọ Na-emekwa Ngwa”

Ọbụ abụ bụrụ, sị: “Ọ fọdụrụ nwa mgbe, onye na-emebi iwu agaghị adịkwa: ị ga-elekwasịkwa ọnọdụ ya anya, ma ọ gaghị anọ.” (Abụ Ọma 37:10) Mgbe anyị chetara ihe e buru n’amụma ga-eme Ninive n’akwụkwọ Nehum nakwa nke e kwuru ga-eme Babilọn na Juda si n’ezi ofufe dapụ n’akwụkwọ Habakuk, o doro anyị anya na okwu ọbụ abụ ahụ ga-emezurịrị. Ma, olee mgbe anyị ga-echeru?

Zefanaịa 1:14 kwuru, sị: “Oké ụbọchị Jehova dị nso, ọ dị nso, ọ na-emekwa ngwa nke ukwuu.” Akwụkwọ Zefanaịa gosikwara anyị otú a pụrụ isi chebe anyị n’ụbọchị ahụ nakwa ihe anyị na-aghaghị ime ugbu a iji jikere maka ịlanahụ ya. N’ezie, “okwu Chineke dị ndụ ma na-akpa ike.”—Ndị Hibru 4:12.

[Foto ndị dị na peeji nke 8]

Nnukwu mgbidi Ninive egbochilighị amụma Nehum imezu

[Ebe E Si Nweta Foto]

Randy Olson/National Geographic Image Collection