Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọmịiko n’Ụwa Obi Tara Mmiri

Ọmịiko n’Ụwa Obi Tara Mmiri

Ọmịiko n’Ụwa Obi Tara Mmiri

ỊBA jituru otu nwoke bi na Burundi. Ọ dị mkpa ka e buga ya ụlọ ọgwụ ozugbo. Ma olee otú a ga-esi ebuga ya? Ọ dịghị ụgbọala dịnụ iji buga ya. Ezi ndị enyi ya abụọ gbataara ya ọsọ enyemaka. Ha kukwasịrị ya n’elu ígwè rịa ugwu na-agbaji úkwù ruo awa ise. Ha bu ya ruo n’ebe ha tinyere ya n’otu ụgbọala bọs bugara ya n’ụlọ ọgwụ kasị nso. Ụbọchị ole na ole ka e mesịrị, o nwetatụrụ nnọọ onwe ya.

Ná mpaghara ọzọ nke ụwa, mgbe Oké Ifufe Katrina, nke bibiri ebe Ọwa Mmiri United States n’August 2005, gasịrị, otu ìgwè ndị ọrụ afọ ofufo hụrụ otu ụlọ osisi dakasịrị. Ndị ọrụ afọ ofufo ahụ, bụ́ ndị na-amatụghị onye nwe ụlọ ahụ mbụ, jiri otu ụbọchị were njin osisi kwọbisịa osisi ndị ahụ ma kwapụ ha n’elu ụlọ ahụ. Onye nwe ụlọ ahụ kwuru, sị: “Amaghị m otú m ga-esi kelee [ndị] a.”

Akụkọ ndị na-adọrọ mmasị a na-akọ n’ụlọ ọrụ mgbasa ozi na-elekwasịkarị anya n’akụkọ banyere arụ ndị mmadụ kpara na omume obi ọjọọ ha mere. Akụkọ ndị a na-ekpuchikarị omume ọmịiko na obiọma ndị mmadụ na-eme kwa ụbọchị. Ma, nke a agbanweghị eziokwu ahụ bụ́ na ịhụnanya na ọmịiko na-agụsi ndị mmadụ agụụ ike n’ebe nile n’ụwa. Ọmịiko na-agụ anyị agụụ! Ndị mmadụ nwere ike ịdị na-egosi àgwà ndị dị otú ahụ karịsịa n’oge Krismas, bụ́ mgbe ọtụtụ ndị na-ekwu ma ọ bụ na-abụ abụ banyere ‘udo n’elu ụwa n’etiti ndị ihe ha dị Chineke ezi mma.’—Luk 2:14, Bible Nsọ nke Union Version.

Ime ọmịiko n’ụwa nke e ji obi ọjọọ na obi ịta mmiri mara nwere ike isi ike. Ihe ọtụtụ ndị kweere bụ na ị chọọ inwe ihe ịga nke ọma, obi aghaghị ife gị azụ. O yiri ka ọtụtụ hà kweere na ọ ka nnọọ mma mmadụ inwe obi ọjọọ karịa ịdị ọmịiko. Anyaukwu na ịchọ ọdịmma onwe onye nanị na-emekarị ka ndị mmadụ kwụsị inwe ọmịiko n’ahụ́ ndị ọzọ.

N’ihi ya, ọtụtụ ndị na-ebute ọdịmma onwe ha ụzọ, ọbụna mgbe ọ ga-egbu mmụọ ndị ọzọ ma ọ bụ mee ka ihe siere ha ike. A na-ewerekarị ndị nwoke na-eme egwuregwu na ndị a ma ama n’ime ihe nkiri dị ka ndị “bụ́ nwoke n’ezie” (ndị dike) bụ́ ndị na-adịghị eme ebere. Ọ bụkwa otú ahụ ka ụfọdụ ndị ọchịchị dị.

N’ihi ya, ọ dị mma anyị ịjụ, sị: Olee ihe mere anyị ga-eji na-emere ndị ọzọ ebere? Ọmịiko ọ̀ na-arụpụta ezi ihe? Oleekwa ihe pụrụ inyere anyị aka inwe ọmịiko? Isiokwu na-eso nke a ga-aza ajụjụ ndị a.

[Igbe dị na peeji nke 3]

•Mmadụ ime ọmịiko ọ̀ pụtara na onye ahụ bụ onye na-adịghị ike?

•Ọmịiko ò nwere ikike ịrụpụta ezi ihe?

•Olee ụzọ ndị a hụrụ anya i nwere ike isi meere ndị ọzọ ebere?